Ndị a bụ nna nna Jisos onye nzọpụta nwa Devidi na Eberaham. Eberaham mụrụ Aizik, Aịzik mụrụ Jekọb, Jekọb mụrụ Juda na ụmụnna ya. Juda sitere na nwụnye ya Tema mụọ Perez na Zera. Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram. Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn. Salmọn mụrụ Boaz site na nwụnye ya Rehaab, Boaz mụrụ Obed site na Rut nwụnye ya. Obed amụọ Jeesi. Jeesi mụrụ Devidi, Devidi amụọ Solomọn site na Bịasheba, onye bụ rị nwụnye Ụraya tupu Devidi alụọ ya. Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abaija, Abaija mụrụ Esa. Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Uzaya. Uzaya mụrụ Jotam, Jotam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya. Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya. Mgbe e mere ka ha gaa biri nꞌala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya. Mgbe ha lọtara Jekonaya mụrụ Shealitiel, Shealitiel amụọ Zerubabel. Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakim, Eliakim amụọ Azoa. Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akim, Akim amụọ Aliud. Aliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb. Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisos onye nzọpụta. Ya mere, site nꞌEberaham ruo na Devidi e nwere ụgbọ iri na anọ. Ma site nꞌoge Devidi ruo mgbe e mere ka ha gaa biri nꞌala Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nꞌoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Jisọs bụkwa ọgbọ iri na anọ. Banyere ọmụmụ Jisos onye nzọpụta, Chineke mere ka Meri nne ya bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke dịrị ime site nꞌike Mmụọ Nsọ, mgbe otu nwoke a na-akpọ Josef na-achọ ịlụ ya. Ma nwoke a na-achọ ịlụ Meri bụ ezi mmadụ. Nꞌihi ya, mgbe ọ chọpụtara na Meri dị ime, o zubere ịhapụ ya na nzuzo, nꞌihi na ọ chọghị ka ndị mmadụ mata ihe bụ ọnọdụ Meri. Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devidi, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye gị, nꞌihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ. Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nꞌihi na ọ ga-azọpụta ndị ya site na mmehie ha. Ọmụmụ nwa a ga-emezu ihe ahụ Chineke kwuru site nꞌọnụ onye amụma ya sị, ‘Lee, nwagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke. A ga-akpọ aha ya Ịmanụelụ, nke bụ ma asụgharịa ya, Chineke nọnyeere anyị.’ ” Mgbe Josef si nꞌụra teta, o mere dị ka mmụọ ozi ahụ nyere ya nꞌiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye ya. Ma ha abụọ edinakọkwaghị tutuu ruo mgbe Meri mụsịrị nwa ahụ, onye Josef kpọrọ aha ya Jisọs. A mụrụ Jisọs na Betilehem nke Judia nꞌoge Herọd bụ eze. Mgbe ahụ, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịara na-ajụ ajụjụ sị, “Ebee ka a nọ mụọ eze ọhụrụ ndị Juu ahụ? Anyị hụrụrị kpakpando ya nꞌọwụwa anyanwụ. Ugbu a anyị bịara ka anyị kpọọ isi ala nye ya.” Ajụjụ ha wutere Herọd nke ukwuu. O jukwara ndị nile bi na Jerusalem anya. Herọd kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu jụọ ha sị, “Ebee ka ndị amụma kwuru na a ga-anọ mụọ Onye nzọpụta ahụ?” Ha zara sị ya, “Betileham, nꞌala Judia! Nꞌihi na Maịka onye amụma dere sị, ‘Ọ̀ bụ ezie na ị dị nta gị obodo nta Betileham, ma ị bụ obodo dị mkpa na Judia, nꞌihi na ọ bụ site na gị ka onye ga-achị ndị m Izirel ga-esi pụta.’ ” Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụọ ha oge ha hụrụ kpakpando ahụ. Emesịa, ọ sịrị ha. “Gaanụ Betileham chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isi ala nye ya.” Mgbe Herọd gwasịrị ha okwu ndị a, ndị amamihe ahụ pụrụ. Nꞌezi, ha hụrụ kpakpando ahụ ọzọ, nke ha buru ụzọ hụ, ka o guzo na mbara eluigwe obodo Betilehem. Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu! Ha jeruru Betilehem, banye nꞌụlọ ebe nwantakịrị ahụ na nne ya nọ, daa nꞌala kpọọ isi ala nye nwa ọhụrụ ahụ. Ha meghere akpa ha nye ya onyinye ọlaedo, ọkpụrụkpụ eso osisi abụọ na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na maar. Mgbe ndị amamihe a chọrọ ịlaghachi obodo ha, ha esikwaghị Jerusalem ịkọrọ Herọd ihe ha hụrụ. Nꞌihi na Onyenwe anyị nyere ha iwu na nrọ sị ha site ụzọ ọzọ laa. Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Chineke mere ka Josef hụ ya na nrọ. O nyere Josef iwu sị, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipti. Alọghachila tutuu ruo mgbe m ga-agwa gị, nꞌihi na Herọd na-achọ igbu nwantakịrị a.” Nꞌabalị ahụ, Josef mere ngwangwa kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipti. Ebe ahụ ka ha nọgidere tutuu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nꞌọnụ onye amụma mezuo, “Ọ bụ site nꞌIjipti ka m kpọpụtara nwa m.” Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ alọghachighị kọọrọ ya ihe ha hụrụ. Nꞌihi ya o zipụrụ ndị agha ya ka ha gaa Betilehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị nile nọ nꞌobodo ndị a, bụ ndị gbara site nꞌafọ abụọ rịda, nꞌihi na ndị amamihe ahụ gwara ya rị na ha hụrụ kpakpando ahụ afọ abụọ gara aga. E sitekwara nꞌiwu a Herọd nyere mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị, “Ịkwa akwa na iru uju dị nꞌobodo Rema. Rechel na-akwa akwa nꞌihi ụmụ ya. Ọ dịghị nkasịobi ọ bụla dịrị ya nꞌihi na e gburu ha.” Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nꞌobodo Ijipti sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi Izirel nꞌihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.” Josef biliri malite ịlaghachi Izirel, ya na Jisọs na nne ya. Mgbe ha nọ nꞌụzọ, Josef nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd bụ nwa ya a na-akpọ Akelus. Nke a mere ụjọ ji tụọ Josef ịlaghachi Betilehem. Ma na nrọ ọzọ, Chineke dọrọ ya aka na ntị ka ọ hapụ ịlaghachi Judia, kama ka ọ laa Galili. Mgbe o ruru Galili, ha gara biri nꞌobodo nta Nazaret. Site nꞌụzọ dị otu a, ihe ndị amụma kwuru banyere Onye nzọpụta mezuru. Nꞌihi na ha buru amụma sị, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.” Nꞌoge mgbe ahụ, Jọn omee baptizim bidoro ikwusa okwu Chineke nꞌọzara Judia. Isi okwu ya bụ, “Chegharịanụ, bịakwutenụ Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe dị nso.” Aịzaya onye amụma gbararị ama banyere ọrụ Jọn mgbe o buru amụma sị, “O nwere onye na-eti mkpu nꞌọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ Onyenwe anyị, meenụ ka okporo ụzọ ya dị larịị.’ ” Jọn yi uwe e ji ajị inyinya kamel mee. O kekwara akpụkpọ anụ dị warara nꞌukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ anụ. Nꞌoge ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ, ndị sitere Jerusalem na ndị si nꞌakụkụ Jọdan, na obodo ndị ọzọ na Judia, bịara ige ya ntị. Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha nile, o mere ha baptizim nꞌosimiri Jọdan. Ma mgbe ọ hụrụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha bịara ka e mee ha baptizim, o bidoro ịkọcha ha sị, “Unu ụmụ ajụala, onye si unu gbanarị iwe Chineke nke na-abịa? Tupuu e mee unu baptizim, zipụtanụ nꞌomume unu na unu echegharịala. Unu echekwala nꞌobi unu na ọ dịrị unu mfe ịsị, ‘Anyị bụ ụmụ Eberaham’, nꞌihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Eberaham ụmụ. Lee ugbu a, mma iwe Chineke adịla nꞌukwu osisi ọ bụla nke na-adịghị amị mkpụrụ ọma. A ga-egbutukwa ya, kpọọ ya ọkụ. Ana m eme nanị ndị chegharịrị site na mmehie ha baptizim, ma onye ka m ukwuu na-abịa. Ọ dị nnọọ ukwuu na etorughị m ibu akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim. Ọ ga-ekewapụ ezi mkpụrụ ọka site nꞌigbugbo ọka. Ọ ga-afụchapụ igbugbo ọka ahụ, zakọtaa ha, kpọọ ha ọkụ ebighị ebi. Ma ọ ga-edozikwa mkpụrụ ọka ndị dị mma.” Mgbe ahụ, Jisọs sitere Galili bịa nꞌosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim. Ma Jọn achọghị ime nke a. Ọ sịrị Jisọs, “Ọ bụghị m kwesịrị ime gị baptizim, gịnị mere i ji bịakwute m ka m mee gị baptizim?” Ma Jisọs zara sị ya, “Biko mee m baptizim, nꞌihi na ọ dị mma ime ihe Chineke chọrọ.” Jọn mere ya baptizim. Mgbe Jisọs sitere na mmiri ahụ pụta, lee, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ Chineke ka o si nꞌelu fedata dị ka nduru bekwasị Jisọs nꞌisi. Nꞌotu oge ahụ kwa, olu sitere nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, nke m hụrụ nꞌanya. Ihe ya dị m ezi mma.” Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisos baa nꞌọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, Jisọs nọrọ na-erighị nri ọ bụla. Agụụ gụrụ ya nke ukwuu. Mgbe ahụ ekwensu bịara nwaa ya ọnwụnwa sị ya, “Ọ bụrụ nꞌezie na ị bụ Ọkpara Chineke meenụ ka nkume ndị a ghọọrọ gị nri.” Ma Jisọs sịrị ya, “Lee, akwụkwọ nsọ gwara anyị na ọ bụ nanị site nꞌirube isi nꞌokwu Chineke ka mkpụrụ obi mmadụ ga-eji dị ndụ, ọ bụghị site nꞌiri nri.” Ọzọ, ekwensu duuru ya gaa guzo nꞌebe dịkarịsịrị elu nke ụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem sị ya, “Site nꞌebe a tụda onwe gị igosi na ị bụ Ọkpara Chineke. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha ghọta gị. Ha ga-echebe gị, ka ị ghara ịmerụ ahụ.’ ” Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ” Ọzọ, ekwensu kpọọrọ ya gaa nꞌelu ugwu dị elu, gosi ya ụwa nile na ịma mma ya. Ọ sịrị Jisọs, “Aga m enye gị ha nile ma ọ bụrụ na ị daa nꞌala kpọọ isi ala nye m.” Ma Jisọs zara sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ, ekwensu. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ nanị Onyenwe gị Chineke ka ị ga-akpọ isi ala nye, nanị ya kwa ka ị ga-efe.’ ” Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere Jisọs inyere ya aka. Mgbe Jisọs nụrụ na e jidela Jọn omee baptizim, ọ hapụrụ Judia laghachi Galili gaa biri na Nazaret. Emesịa, ọ hapụrụ Nazaret gaa biri na Kapanọm. Kapanọm bụ obodo dị nꞌakụkụ osimiri Galili. Ọ dị nso nꞌoke ala Zebulọn na Naftali. Nꞌụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sị, “Ala Zebulọn na Naftalị, nke dị nꞌakụkụ osimiri Jọdan na Galili, ebe ọtụtụ ndị mba ọzọ bi. Nꞌebe ahụ, ndị nọ nꞌọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị nọ nꞌala ọnwụ ka ìhè ahụ nwukwasịrị.” Site nꞌoge ahụ gaa nꞌihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, sitenụ na mmehie unu bịakwute Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe na-abịa nso.” Otu ụbọchị, mgbe Jisọs na-agafe nꞌakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pita, na Anduru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ igbu azụ, ebe ha nọ nꞌụgbọ mmiri na-egbu azụ. Jisọs sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” Ha hapụrụ ngwa ọrụ ha otu mgbe ahụ soro ya. Mgbe ọ gara nꞌihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemes na Jọn, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nꞌime ụgbọ mmiri na-emezi ihe ha ji egbu azụ. Jisọs kpọkwara ha. Otu mgbe ahụ ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya. Jisọs jegharịrị nꞌobodo Galili nile na-ezi ihe nꞌọgbakọ ndị Juu nile. Ọ na-ekwusa ozi ọma nke alaeze eluigwe nꞌebe ọ bụla ọ gara. Ọ gwọkwara ọrịa dị iche iche. Akụkọ banyere ihe ịrịba ndị a fesara jezuo akụkụ Siria nile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị nile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha nile. Ọtụtụ mmadụ na-eso ya ebe nile ọ bụla ọ na-aga. Ndị sitere Galili, na Dekapolis, na Jerusalem, na Judia, na ọ bụladị nꞌofe osimiri Jọdan, bịara soro ya. Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, o rigooro nꞌelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. O bidoro izi ha ihe sị, “Ndị ogbenye nꞌime mmụọ ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Ndị na-eru uju bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akasị ha obi. Ndị dị nwayọọ nꞌobi bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ha ga-eketa ụwa. “Ndị agụụ ezi omume na-agụ bụkwa ndị a gọzịrị agọzi, nꞌihi na afọ ga-eju ha. Ndị na-enwe obi ebere bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ha ka a ga-emere ebere. Ndị dị ọcha nꞌobi bụkwa ndị a gọziri agọzị, nꞌihi na ha ga-ahụ Chineke anya. Ndị na-achọ udo nꞌetiti mmadụ na ibe ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. Ndị a na-akpagbu nꞌihi ezi omume ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. “Ndị a gọziri agọzi ka unu bụ ma ọ bụrụ na a na-ata unu ụta, na-esogbu unu, ma na-ekwukwa okwu ụgha megide unu nꞌihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi ya. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Nꞌihi na ụgwụ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Chetanụ na e si nꞌụzọ dị otu a sogbuo ndị amụma bu unu ụzọ. “Unu bụ nnu nke ụwa, nꞌihi nke a unu etufula ụtọ unu. Ọ bụrụ na unu etufuo ụtọ unu, unu agaghị aba uru ọ bụla. A ga-etufu unu nꞌezi, zọokwa unu ụkwụ. Unu bụ ìhè nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nꞌelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo. Ndị mmadụ adịghị amụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nꞌelu ihe ịdọba iheọkụ, ka o nye ndị nile nọ nꞌụlọ ahụ ìhè. Ya mere, unu ezokwala ìhè unu. Kwerenụ ka ìhè unu nwuore mmadụ nile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu bi nꞌeluigwe. “Unu echela na abịara m ịkagbu iwu Mosisi, ma ọ bụ ịkagbu ịdọ aka na ntị nke ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha. Ana m ekwusi nke a ike na tutuu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị iwu ọ bụla ga-agafe ma o mezughị. Nꞌihi ya, ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie iwu dịkarịsịrị nta, ma zikwa ndị ọzọ imebi ya, a ga-agụ onye ahụ nꞌọnye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu Chineke nꞌonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nꞌalaeze eluigwe. “Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu apụtaghị ìhè karịa ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị iketa alaeze eluigwe ma ọlị. “Iwu Mosisi sị onye ọ bụla egbula mmadụ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla egbuo mmadụ, a ga-akpọta ya nꞌihu ndị ga-ekpe ya ikpe. Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ. “Ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nꞌụlọ nsọ Chineke, ma i cheta nꞌebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nꞌudo, hapụ onyinye gị nꞌebe ịchụ aja laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu dịrị nꞌudo, laghachi bịa nye onyinye gị. Mee ọsịịsọ ka gi na onye iro gị kpezie mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nꞌaka okpe ikpe onye ga-enyefe gị nꞌaka ndị ga-etinye gị nꞌụlọ mkpọrọ. Nꞌezie, ọ bụrụ na ikpe gị eruo ụlọ ikpe, ị gaghị e si nꞌebe ahụ pụta, ma ị kwụsịghị ụgwọ nile i ji. “Iwu Mosisi sịrị onye ọ bụla akwala iko. Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ. Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ. Ọ bụrụ na aka nri gị achọọ ime ka i mehie, gbupu ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu aka baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji aka abụọ baa nꞌọkụ. “Nꞌime iwu Mosisi e kwuru na ọ bụrụ na nwoke ọ bụla achọọ ikewapụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, ọ ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ nkewa ma ọ bụ akwụkwọ achọghị m nye ya. Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko. “Nꞌime iwu Mosisi a sịrị unu mezuo iyi nile unu ṅụrụ nye Chineke. Ma asị m unu aṅụla iyi ọ bụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nꞌihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị. Ejikwala ụwa aṅụ iyi nꞌihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala isi gị aṅụ iyi nꞌihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha ma ọ bụ dị oji. Aṅụla iyi ọ bụla. Kama ka ee gị bụrụ ee gị, ka é, è, gị bụrụ é, è gị. Ihe ọ bụla gafere nke a sitere nꞌekwensu. “Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’ Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ agbaara gị akwụkwọ nꞌụlọ ikpe ka ọ nara gị uwe ime ahụ gị, nyekwa ya uwe elu ahụ gị. Ọ bụrụ na mmadụ esite nꞌike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii, ma ọ bụrụ na nke a ga-eme ka udo dịrị. Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka ị binye ha ego. “A gwara unu sị, ‘Hụnụ ndị enyi unu nꞌanya, ma kpọọkwanụ ndị iro unu asị.’ Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, kpeekwaranụ ndị na-esogbu unu ekpere. Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke nna unu bi nꞌeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọra ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Ọ bụrụ nanị ndị hụrụ unu nꞌanya ka unu na-ahụ nꞌanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-eme otu a. Ọ bụrụkwa na unu na-ekele nanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọ bụla dị iche nꞌebe unu na ndị ọzọ nọ. Nꞌihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ. Unu kwesịrị izu oke nꞌịrụ ọrụ ọma, dị ka Nna unu bi nꞌeluigwe si zuokwa oke. “Unu arụla ọrụ ọma unu nꞌebe ndị mmadụ ga-ahụ unu malite ito unu. Nꞌihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọ bụla site nꞌaka Nna unu bi nꞌeluigwe. Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị ogbenye onyinye, nꞌihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-achọ ka ndị mmadụ too ha. Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, mmenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime. Chineke bụ Nna gị, onye maara ihe nzuzo nile, ga-akwụghachi gị ụgwọ zuru ezu. “Mgbe ọ bụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ịhụ abụọ, ndị na-ekpe ekpere nꞌakụkụ ụzọ na nꞌime ụlọ ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha nụkwa ekpere ha, kwuo na ha bụ ndị dị nsọ. Nꞌezie, otuto a bụ nanị ụgwọ ọrụ ha ga-anata. Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nꞌime ime ụlọ unu, Mechiekwanụ ụzọ unu, kpeere Chineke Nna unu ekpere na nzuzo. Ọ maara ihe nzuzo nke obi unu nile. Ọ ga-azakwa ekpere unu, nyekwa unu ụgwọ ọrụ ruuru unu. “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwkwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na Chineke ga-anụ ekpere ha nꞌihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọ bụla, Nna unu bi nꞌeluigwe mmara ihe na-akpa unu. *** “Sinụ otu a kpee ekpere: Nna anyị nke bi nꞌeluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nꞌụwa, dị ka e si eme ya nꞌeluigwe. Nye anyị nri nke ụbọchị taa. Gbaghara anyị mmehie anyị, dị ka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị. Edubala anyị nꞌime ọnwụnwa, kama zọpụta anyị site nꞌọnwụnwa nke onye iro. Amin. Nna unu bi nꞌeluigwe ga-agbaghara unu mmehie unu ma ọ bụrụ na unu agbagharakwa ndị na-emehie megide unu. Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ịgbaghara ndị na-emehie megide unu, ọ gaghị agbaghara unu. *** “Banyere ibu ọnụ: mgbe unu na-ebu ọnụ, unu adịkwala ka ndị na-anwụ anwụ, ma ọ bụ dị ka ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Nke a bụ ihe ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-eme ka ihu ha zipụta na ha na-ebu ọnụ. Ka e site na nke a nwee ọmiko nꞌebe ha nọ. Nꞌezie, ọmiko ahụ ndị mmadụ nwere nꞌebe ha nọ bụ ụgwọ ọrụ ha. Ma mgbe unu na-ebu ọnụ, dịnụ mma ile anya. Ka mmadụ ọ bụla hapụ ịmata na unu na-ebu ọnụ. Nna unu, onye maara ihe nile, ga-akwụghachikwa unu ụgwọ. “Unu akpadola akụ nꞌụwa nꞌihi na akụ a kpadoro nꞌụwa a pụrụ ịta ajarị, nla pụrụ iri ha, ndị ohi pụkwara izu ha. Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa. *** “Anya unu dị ka iheọkụ nke anụ ahụ unu. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, obi gị ga-ejupụta nꞌìhè. Ma ọ bụrụ na echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ gị ekpuchie anya gị, gbochie ya ịbụrụ gị ìhè, ị ga-anọ nꞌọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adịkwa ukwuu! “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ. “Nꞌihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụkwanụ uwe unu ga-eji kpuchie ahụ unu. Ndụ karịrị ihe e ji azụ ya. Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịma atụ. Ha adịghị echegbu onwe ha banyere ihe oriri. Ọ dịghị mgbe ha na-akụ mkpụrụ nꞌubi ọ dịkwaghị mgbe ha na-ewe mkpụrụ nꞌubi. Ma Nna unu bi nꞌeluigwe na-azụ ha. Ọ̀ bụ na unu adịghị oke ọnụ ahịa karịa ha? Ònye nꞌetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nꞌogologo ụbọchị nke ndụ ya site nꞌichegbu onwe ya? “Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ Hoge nile maka uwe? Leenụ okoko osisi ọhịa. Ha adịghị echegbu onwe ha maka uwe. Ma asị m unu na ọ bụladị Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya nile, eyighị uwe ọ bụla dị mma dị ka okoko osisi ọhịa ndị a. Ya mere, ọ bụrụ na Chineke sitere nꞌebere ya mee ka okoko osisi ndị a maa mma ile anya, bụ okoko osisi dị ndụ taa, nke pụkwara ịkpọnwụ mgbe chi echi bọrọ, gịnị mere unu jiri chee na ọ gaghị emere unu karịa nke a, unu ndị okwukwe nta? “Nꞌihi nke a, unu echegbula onwe unu na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Gịnịkwa ka anyị ga-eyi? Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile. Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ. “Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere ihe na-aga ime echi. Ọ bụrụ na Chineke emee ka ị dịrị ndụ taa, ọ ga-azụkwa gị echi. “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị. Gịnị mere i ji na-esogbu onwe gị banyere ntakịrị ahịhịa dị nwanne gị nꞌanya mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị onwe gị nꞌanya? Olee otu ị ga-esi gwa ya sị ya, ‘Nwanne m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nꞌanya,’ mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị nꞌanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ? Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ihe dị gị nꞌanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ ịtụpụ nke dị nwanne gị nꞌanya. “Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụ ahịa. Ha ga-azọ ha ụkwụ ma lusịkwa gị ọgụ. “Rịọọ, ị ga-arịọta, chọọ, ị ga-achọta. Kụọọ aka, a ga-emeghere gị ụzọ. Onye ọ bụla na-arịọ na-arịọta. Onye na-achọ na-achọtakwa. Onye na-akụ aka ka a ga-emeghere ụzọ. Ọ bụrụ na nwantakịrị arịọọ nna ya beredi, ọ ga-enye ya nkume? Ọ bụrụkwa na ọ rịọọ ya azụ, ọ ga-enye ya agwọ? Ebe unu ndị mmehie pụrụ inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nꞌeluigwe ga-enyekwa unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya. “Meere ndị ọzọ dị ka i si chọọ ka ha meere gị. Nke a bụ ihe Mosisi na ndị amụma ziri. “Ụzọ dị warara na-eduba nꞌeluigwe. Site na ya baa. Ụzọ dị obosara na-eduba nꞌọkụ. Ọtụtụ mmadụ na-esoro ya nꞌihi na ọ dị mfe. Ole na ole na-achọta ụzọ na-eduba na ndụ, nꞌihi na ọ dị warara. “Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nꞌụdị atụrụ, ma ha bụ agụ. Ozizi ha pụrụ iduhie unu. Unu ga-amata ha site nꞌụdị ndụ ha na-ebi. A na amara osisi ọ bụla site na mkpụrụ ya. Ị gaghị ahụ mkpụrụ ose kpọọ ya mkpụrụ aṅara. A na-esite na mkpụrụ nke osisi mịpụtara mata ụdị osisi ọ bụ. Osisi na-amụ mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịkwaghị amị mkpụrụ ọma. Ma osisi ọ bụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka ga-egbutu tụnye nꞌọkụ. Ụzọ e si amata osisi ọma ma ọ bụ mmadụ ọma bụ site na mkpụrụ ya. “Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee. Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’ Ma aga m asị ha, sitenụ nꞌihu m pụọ, amaghị m unu, nꞌihi na ọrụ unu dị njọ. “Onye ọ bụla ṅara ntị nꞌokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nꞌelu nkume sịrị ike. Mmiri zosikwara ike nꞌelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara gburugburu ụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nꞌihi na e wuru ya nꞌelu nkume. “Ma ndị nile nụrụ okwu ndị a, ma lefuo ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu aja. Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike, ma ụlọ ahụ dara daruo ala.” Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru ndị mmadụ ahụ nile anya. Nꞌihi na Jisọs ziri ha ihe dị ka onye ike nile dị nꞌaka. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi ndị Juu. Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nꞌugwu ahụ rịdata. Mgbe ha na-aga nꞌụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere Jisọs kpọọ isi ala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jisọs bikwasịrị ya aka sị ya, “Achọrọr m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha.” Ngwangwa ekpenta ahụ lara. Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Jekwuru onyeisi nchụaja, akọkwarala onye ọ bụla nꞌụzọ. Were onyinye gị mgbe ị na-aga dị ka e dere ya nꞌiwu Mosisi. Gaa ka onyeisi nchụaja lee gị ahụ, kwuokwara ọha na ị dịla ọcha.” Mgbe Jisọs chọrọ ịbanye na Kapanọm, otu ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya nwoke, onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, onye nọkwa nꞌoge ahụ nꞌoke ihe mgbu. *** Jisọs zara sị ya, “Aga m abịa.” Ma ọchịagha ahụ gwara Jisọs okwu sị ya, “Ekwesịghị m ka ị bata nꞌụlọ m. Nanị nọdụ nꞌebe a kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa ohu m nwoke ike. Dị ka ọchịagha nke m bụ, ọ bụrụ na m asị onye agha nọ nꞌokpuru m bịa, ọ na-abịa, nꞌihi na ọ nọ nꞌokpuru m. Ma i nwere ike karịrị nke a ịchụpụ ọrịa ahụ na-enye ohu m nsogbu.” Okwu a juru Jisọs anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị ha, “Nꞌezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọ bụla, ọ bụladị nꞌala Izirel nile. Nꞌezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nꞌakụkụ nile nke ụwa bịa soro Eberaham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nꞌalaeze eluigwe, ma ọtụtụ ndị si nꞌala Izirel, bụ ndị a na-akwadoro alaeze ahụ, ka a ga-atụba nꞌọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.” Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị ohu ya mma nꞌotu ntabi anya ahụ. Mgbe Jisọs ruru nꞌụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwụnye Pita nwere ahụ ọkụ. Jisọs gara metụ ya aka mee ka ahụ ọkụ ahụ hapụ ya. Nne nwụnye Pita biliri siere ha nri. Nꞌoge anyasị, ha kpọtaara ya ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ nile, gwọọkwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ na-esogbu. Nke a mezuru amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ ọrịa anyị, burukwa ahụ mgbu anyị.” Mgbe Jisọs hụrụ na ndị mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Jikerenụ ka anyị gafee osimiri!” Nꞌoge ahụ, otu onyeisi nꞌetiti ndị Juu bịakwutere ya sị ya, “Onye ozizi, aga m eso gị gaa ebe ọ bụla ị na-aga.” Ma Jisọs zara sị ya, “Ewi nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nwekwara akwụ, ma mụ onwe m enweghị ebe obibi.” Otu onye ọzọ nꞌime ndị so ya na-agagharị gwara ya okwu sị ya, “Aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a, hapụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ ha ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.” Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs banyere nꞌụgbọ mmiri ịkwọfe osimiri ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya. Ọ dịghị anya ebili mmiri malitere na-amagharị. Oke ifufe bidokwara ife, na-ebuli mmiri elu. Ma Jisọs nọ nꞌụra mgbe ihe ndị a na-eme. Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya kpọtee ya sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee na ụgbọ anyị na-achọ imikpụ.” Ma Jisọs zara sị ha, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” O biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe nile deere jii. O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ, onye ifufe na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.” Emesịa, ha rutere obodo Gadarin, nke dị nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ. Nꞌebe ahụ, e nwere mmadụ abụọ bi nꞌebe a na-eli ozu. Ọ dịkwaghị onye na-esite ụzọ ahụ agafe, nꞌihi na ha na-akpa ike nke ukwuu. Mgbe ha hụrụ Jisọs, ha tiri mkpu bido na-ajụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupuu i bido ịta anyị ahụhụ?” Igwe ezi nọ nꞌakụkụ ebe ahụ na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs arịrịọ sị ya, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nꞌime ezi ndị a.” Jisọs nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nꞌime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nꞌime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ nile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nꞌime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nꞌime ya. Ndị na-azụ igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ ọsọ gbalaa nꞌobodo gaa gwa ndị nile nọ nꞌime obodo ahụ ihe mere nꞌebe ahụ. Ya mere ndị nile nọ nꞌobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nꞌobodo ha. Jisọs banyekwara nꞌụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo na Kapanọm. Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.” Ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulukwanụ Chineke.” Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ jụrụ ha ajụjụ sị ha, “Gịnị mere echiche ọjọọ ji jupụta unu obi? Olee nke karịrị ịdị mfe ikwu? Ọ bụ ịsị na a gbagharala nwoke a mmehie ya, ka ọ bụ ịsị ya bilie gaa ije? Ma ime ka unu mata na m nwere ike ịgbaghara mmadụ mmehie ya nꞌụwa a, ana m asị gị, nwoke, bilie, chịrị ute gị laa!” Onye ọrịa ahụ biliri, chịrị ute ya laa nꞌụlọ ya! Mgbe ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe Jisọs mere, akpata oyi pụrụ ha nꞌahụ nꞌihi egwu. Ha toro Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ike dị otu a. Mgbe Jisọs si nꞌebe ahụ pụọ ịga nꞌihu nꞌije ya, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọ nꞌụlọ ebe ọ nọ na-arụ ọrụ ịnakọta ụtụ. Jisọs kpọrọ ya sị ya, “Soro m bịa bụrụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ m.” Na-atụfughị oge Matiu hapụrụ ihe nile soro ya. Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nꞌụlọ Matiu iri nri. Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie sooro Jisọs nọdụ na-eri nri. Mgbe ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị a na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri nri?” Mgbe Jisọs nụrụ ajụjụ ha, ọ zara sị ha, “Mkpa dibia adịghị akpa ndị ahụ dị mma. Kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibia na-akpa. Ma gaanụ chọpụta ihe akwụkwọ nsọ chọrọ ka unu mụta mgbe ọ sịrị, ‘Achọghị m aja unu, kama achọrọ m ka unu nwee obi ebere.’ Unu chọpụta ya, unu ga-aghọta na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ime ka ndị mmehie si na mmehie ha chegharịa.” Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara jụọ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ dị ka anyị onwe anyị na ndị Farisii na-eme?” Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “O kwesịrị ka ndị enyi onye na-alụ nwụnye ọhụrụ nọọ na mwute na-erighị nri, mgbe ha na di nwanyị nọ? Oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ m nꞌetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ. “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-adụkọta akwa ochie na nke ọhụrụ. Nꞌihi na akwa ahụ ga-esi nꞌebe a dụrụ ya dọwaa, mee ka ọ dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Ọ dịkwaghị onye ga-etinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ochie nꞌihi na karama ochie ahụ ga-agbawa mee ka mmanya ọhụrụ ahụ wufuo. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ, nke ga-eche ha abụọ nke ọma.” Mgbe Jisọs nọ na-ekwu okwu, otu onyeisi nꞌetiti ndị Juu bịara kpọọ isi ala nye ya sị ya, “Ọ dịbeghị anya kemgbe nwa m nwanyị nwụrụ. Ọ bụrụ na ị ga-abịa metụ ya aka ọ ga-ebili dịrịkwa ndụ ọzọ.” Nꞌihi nke a, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya biliri soro nwoke ahụ malite ịga nꞌụlọ ya. Ma o nwere otu nwanyị onye ahụ na-esighị ike. Nwanyị a anọọla nꞌọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ọrịa ịgba ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị ka ọ na-arịa. Nwanyị a sitere nꞌazụ bịaruo Jisọs nso, metụ ọnụ uwe ya aka. Nꞌihi na o kwuolarị nꞌime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ uwe ya aka ahụ ga-adị m mma.” Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, atụla egwu, nꞌihi na e sitela nꞌokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nꞌoge ahụ. Emesịa, Jisọs rutere nꞌụlọ onyeisi ndị Juu ahụ ebe ọ hụrụ ndị bịara ịkwa akwa na ndị na-abụ abụ olili ozu. Jisọs gwara ha okwu sị ha, “Pụọnụ nꞌezi, nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra.” Mgbe Jisọs kwuru okwu a, ndị nọ nꞌebe ahụ chịrị ya ọchị. Ma mgbe ndị nọ nꞌebe ahụ pụrụ dị ka a gwara ha, Jisọs banyere nꞌụlọ ebe nwanta nwanyị ahụ dina. O jidere ya nꞌaka, selite ya elu. Nwanta nwanyị ahụ dịkwara ndụ ọzọ. A kọrọ akụkọ ọrụ ebube a nꞌebe nile nꞌobodo ahụ. Mgbe Jisọs hapụrụ ụlọ ebe o mere ka nwanta nwanyị ahụ site nꞌọnwụ bilie, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru isi sooro ya. Ha tikuru ya na-asị, “Nwa Devidi, meere anyị ebere!” Ha sooro Jisọs bata nꞌụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kweere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?” Ha zara sị ya, “Ee, Onyenwe anyị, anyị kweere.” Jisọs metụrụ ha aka nꞌanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.” Ngwangwa ndị ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. Jisọs maara ha ọkwa sị ha agwakwala onye ọ bụla. Ma ha pụrụ gbasaa akụkọ a ebe nile nꞌobodo ahụ. Mgbe ndị a sitere nꞌebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere Jisọs nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nꞌime ya. Mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ nꞌahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a na ndụ anyị nile.” Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ na-enye ya ike ime ihe ndị a nile.” Jisọs jegharịrị nꞌobodo nile dị nꞌebe ahụ, ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ. Ebe ọ bụla ọ gara, ọ gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche ndị mmadụ na-arịa. Mgbe ọ hụrụ igwe mmadụ nile na-abịakwute ya, o nwere ọmiko nꞌahụ ha, nꞌihi na ha bụ ndị a na-esogbu, ndị na-enweghị onye inyeaka, ndị dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Lee na mkpụrụ obi a ga-eritere Chineke nꞌuru dị ukwuu. Ma ndị ga-ezisa ozi ọma bụ nanị mmadụ ole na ole. Ya mere, kpeerenụ Chineke ekpere ka o zite ndị ọrụ ga-abịa nꞌubi a irite mkpụrụ obi ndị mmadụ nꞌuru.” Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. O nyekwara ha ike ịgwọ ọrịa dị iche iche. Nke a bụ aha ndị ozi iri na abụọ ahụ: Saịmọn, onye a na-akpọkwa Pita, Anduru nwanne Saịmọn, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwanne ya. Filip, na Batalomi, na Tọmọs, na Matiu onye ọnaụtụ. Jemes nwa Alfiọs, na Tadịọs. Saịmọn onye so nꞌotu ndị Juu chọrọ iji ike kwatuo ọchịchị ndị Rom, na Judas Iskariọt, nwoke raara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya. Jisọs zipụrụ ha, maara ha ọkwa sị ha, “Unu agala nꞌebe ndị mba ọzọ, ma ọ bụ nꞌebe ndị Sameria nọ. Kama jekwurunụ ụmụ Izirel, ndị bụ atụrụ furu efu nke Chineke. Kwusaara ha na alaeze eluigwe dị nso. Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. O fughị unu ihe ọ bụla ịnata ike ime ihe ndị a. Otu a kwa, meenụ ka ndị ọzọ nata nꞌaka unu nꞌefu. “Mgbe unu na-aga, unu etinyela ego ọ bụla nꞌakpa unu, ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo. Ma ọ bụkwa ụdị ego ọzọ dị iche. Unu ejikwala uwe abụọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ abụọ, ma ọ bụ mkpa nꞌaka. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ ndị unu na-enyere aka inye unu nri, na ilekọta unu. Mgbe ọ bụla unu ruru obodo ọ bụla, chọọnụ onye na-asọpụrụ Chineke bi nꞌobodo ahụ. Nọdụnụ nꞌụlọ onye ahụ tutuu ruo mgbe unu ga-esi nꞌobodo ahụ pụọ. Mgbe unu na-arịọ ịnọdụ nꞌụlọ onye ọ bụla gosinụ na unu ji obi ọcha bịa, na unu bụ ndị udo. Ọ bụrụ na ndị nọ nꞌụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka ngọzi unu dịkwasị ụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, deberenụ onwe unu ngọzi unu. Obodo ọ bụla ma ọ bụ ụlọ ọ bụla nke jụrụ ịnabata unu, ma ọ bụ ịnụ okwu unu, kụpụsịanụ aja nke obodo ahụ nꞌụkwụ unu mgbe unu na-ahapụ ya. Nꞌeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nꞌụbọchị ikpe karịa obodo ọjọọ nke Sodọm na Gomora. “Ana m ezipụ unu dị ka a ga-asị na ọ bụ atụrụ ka m na-ezipụ nꞌetiti agụ. Nweenụ uche dị ka agwọ. Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị mmadụ pụrụ ijide unu kpọrọ unu gaa nꞌụlọ ikpe, ma tiekwa unu ihe nꞌụlọ ekpere ha. A ga-ekpe unu ikpe nꞌihu ndị na-achị achị na nꞌihu ndị eze nꞌihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. Ee, nke a ga-enyere unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị ụwa. “Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu. A ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nꞌoge ahụ. Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nꞌonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nꞌigwe ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu. “Nwanne ga-agbagide nwanne ya ama, mee ka ọ nwụọ. Ndị bụ nna ga-ararakwa ụmụ ha nye. Ụmụ ga-ebili imegide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ. Ụmụ mmadụ ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m. Ma ndị nile ga-anọgide nꞌokwukwe ha ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. “Ọ bụrụ na ndị mmadụ esogbuo unu nꞌotu obodo gbaranụ ọsọ gaa nꞌobodo ọzọ. Unu agaghị agazucha obodo ndị a nile tupu m lọghachi. Nwanta akwụkwọ akarịghị onye ziri ya ihe. Ohu akarịkwaghị nna ya ukwu. Ihe ọ bụla dakwasịrị onye nkuzi na-adakwasị nwanta akwụkwọ ya. Otu a kwa ohu na-eketa oke nꞌihe dakwasịrị nna ya ukwu. Ebe ha kpọrọ m ekwensu, ha ga-enyekwa unu aha ọjọọ karịrị nke a. “Unu atụla egwu ndị na-emenye unu ụjọ. Oge na-abịa mgbe a ga-ekpughe eziokwu nile. A ga-emekwa ka izuzu obi nile zoro ezo pụta ìhè. “Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nꞌelu ụlọ tisasịa ya. “Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu nanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Chineke nanị, onye nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụ obi unu, tụbakwa ha nꞌọkụ ala mmụọ. Ọ bụ otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ, ma otu nꞌime ha agaghị ada nꞌala ma ọ bụrụ na nna unu bi nꞌeluigwe amaghị. Ọ bụladị agịrị isi dị nꞌisi unu ka a maara ọnụ ọgụgụ ha. Ya mere, unu echegbula onwe unu. Unu dị oke ọnụ ahịa nꞌanya Chineke karịa ọtụtụ ụmụ nnụnụ. “Onye ọ bụla nabatara m nꞌihu mmadụ nile dị ka enyi ya, ka mụ onwe m ga-anabatakwa dị ka enyi m nꞌihu Nna m bi nꞌeluigwe. Ma onye ọ bụla jụrụ m nꞌihu mmadụ nile, mụ onwe m ga-ajụkwa ya nꞌihu Nna m bi nꞌeluigwe. “Unu echekwala na m bịara iweta udo nꞌụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha. Abịara m ime ka nwanta nwoke megide nna ya, ka nwanta nwanyị megide nne ya, ka nwụnye nwa megide nne di ya. Site ugbu a gaa nꞌihu, onye iro mmadụ nke kachasị njọ, ga-anọ nꞌime ezinụlọ onye ahụ. Ọ bụrụ na ị hụrụ nna gị na nne gị nꞌanya karịa m, ị kwesịghị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, ma ọ bụ nwa gị nwanyị nꞌanya karịa m, ị kwesịghị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị jụ iburu obe gị soro m, ị bụghị onye nke m. “Ndụ gị ga-efunarị gị ma ọ bụrụ na ị hụ ya nꞌanya karịa m. Kama ọ bụrụ na ị tufuo ya nꞌihi m, ị ga-achọta ya. Ndị nile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Chineke onye zitere m ka ha na-anabata. Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nꞌihi na ọ bụ onye ozi Chineke, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata ndị ezi omume nꞌihi ezi omume ha, unu ga-esorokwa ha nata ụgwọ ọrụ nke ndị ezi omume. Chetakwanụ nke a! Onye ọ bụla kunyere otu nꞌime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nꞌihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, ga-anata ụgwọ ọrụ ya.” Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ, bido na-ejegharị nꞌobodo dị iche iche izisa ozi ọma. Jọn omee baptizim nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube nile Jisọs na-arụ, o ziri ndị na-eso ụzọ ya ozi ka ha gaa jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ̀ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ya, ka ọ dị onye ọzọ anyị kwesịrị ile anya ọbịbịa ya?” Jisọs gwara ndị ahụ Jọn zitere okwu sị, “Laghachikwanụ azụ gwa Jọn ihe banyere ọrụ ebube unu hụrụ m na-arụ. Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ dị ndị ekpenta ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, kwuokwa okwu ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ Jọn ihe banyere ozi ọma a na-ezisara ndị ogbenye. Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzi na-adịrị ndị na-enweghị obi abụọ nꞌebe m nọ.” Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nꞌọzara ileta Jọn gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ̀ bụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị? Ka ùnu lere anya ịhụ onye yi uwe ndị eze? Ndị na-eyi uwe ndị eze bi nꞌobi eze. Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ̀ bụ onye amụma? Ọ bụrụ otu a, unu hụrụ onye karịrị onye amụma. Nꞌihi na Jọn bụ onye ahụ e kwuru ihe banyere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Lee ana m ezite onyeozi m nꞌihu gị onye ga-edoziri gị ụzọ.’ “Nꞌezie, ọ dịghị nwoke ọ bụla nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe dị ukwuu karịa Jọn. Site nꞌoge Jọn omee baptizim malitere izisa ozi ọma ruo ugbu a, ndị ụwa ji ike na-egbochi ọganihu alaeze eluigwe. Ma ọ bụkwa nanị ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na-eji ike abanye nꞌime ya. Nꞌihi na tupu Jọn abịa, Mosisi na ndị amụma nile kwuru okwu banyere alaeze a. Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ihe iwu ahụ na ndị amụma kwuru, Jọn bụ Ịlaịja ahụ, nke ha gbara ama na ọ ga-abịa. Ọ bụrụ na unu nwere ntị ịnụ ihe, nụrụnụ okwu a. “Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nꞌọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nꞌama, ndị na-asị ibe ha, ‘Anyị na-afụrụ unu opi, ma unu ekweghị ite egwu. Anyị na-abụrụ unu abụ ili ozu, ma unu akwaghị akwa.’ Jọn bịara nọọ nꞌetiti unu, o soghị unu rie nri, o sokwaghị unu ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Nꞌihi nke a unu sịrị na Jọn bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị. Ma Nwa nke mmadụ bịara soro ndị mmadụ na-eri nri, na-anụkwa ihe ọṅụṅụ, ma gịnị ka unu na-ekwu banyere m? ‘Lee onye na-eri oke nri, na onye oke aṅụmaṅụ abịala!’ Unu na-akpọkwa m enyi ndị ọnaụtụ, na enyi ndị mmehie. Otu ọ dị, e sitela nꞌọrụ ọma a rụpụtara gosi na ụzọ ọ bụla Chineke si arụ ọrụ ya ziri ezi.” Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọcha obodo nile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, nꞌihi na obodo ndị a echegharịghị bịakwute Chineke. “Ahụhụ dịrị gị obodo Korazin, ahụhụ dịkwara gị obodo Betsaida, nꞌihi na a si na ọ bụ nꞌime obodo Taịa na Saịdọn ka m rụrụ ọrụ ebube nile m rụrụ nꞌime unu, ha gaara echegharị gosi nchegharị ha site nꞌiyi uwe nkịkara, na ikpokwasị onwe ha ntụ nꞌisi. Nꞌezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nꞌụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn. Ọ bụ ezie na gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, ma ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nꞌime gị nꞌobodo Sodọm, agaraghị ala ya nꞌiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. Nꞌezie, ọ ga-adịrị gị njọ nꞌụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sodọm.” Nꞌoge ahụ, Jisọs kpere ekpere sị, “Nna, Onyenwe igwe na ala, ekelee m gị, nꞌihi na i zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị. Ee, Nna, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nꞌụzọ dị otu a. “Nna m enyefeela m ihe nile nꞌaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. Bịakwutenụ m unu nile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị unu. Aga m enyekwa unu izuike. Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site nꞌaka m. Nꞌihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nꞌobi. Unu ga-achọtakwara obi unu izuike. Nꞌihi na ụzọ m dị mfe, ibu m ga-ebokwasịkwa unu adịghị arọ.” Mgbe oge ahụ gafesịrị, ọ dịghị anya Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ sitere nꞌubi a kụrụ ọka na-agafe nꞌụbọchị izuike. Ebe ọ bụ na agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ ya, ha ghọọrọ ụfọdụ ọka taa. Ma ụfọdụ nꞌime ndị Farisịi hụrụ ha mgbe ha na-eme nke a, gwa Jisọs sị, “Lee ihe ndị na-eso ụzọ gị na-eme! Ha na-emebi iwu! Ha na-aghọ ọka nꞌụbọchị izuike!” Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ gwara anyị na eze Devidi na ndị enyi ya mere mgbe agụụ gụrụ ha? A gwara anyị nꞌakwụkwọ nsọ na Devidi na ndị enyi ya banyere nꞌime ụlọ nsọ Chineke rie beredi dị nsọ e ji chụọra Chineke aja. Beredi nke nanị ndị nchụaja kwesịrị iri. Ma Devidi mebiri iwu site nꞌiri beredi ahụ, ya na ndị so ya. Ọzọ, ọ bụ na unu agụtabeghị ebe e dere ya nꞌime akwụkwọ iwu Mosisi na ndị nchụaja na-emebi iwu site nꞌịrụ ọrụ nꞌụbọchị izuike? Ma ọ dịghị onye na-agụ ha dị ka ndị na-emebi iwu. Ma ana m agwa unu na onye dị ukwuu karịa ụlọ nsọ ukwu Chineke nọ nꞌebe a. Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Achọrọ m ka unu buru ndị na-eme ebere karịa ndị na-achụ aja’, unu agaghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. Nꞌihi na Nwa nke mmadụ ka ọ dịrị ikpebi ihe e kwesịrị ime nꞌụbọchị izuike.” Jisọs sitere nꞌebe ahụ pụọ banye nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Nꞌebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nꞌebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị ya, “O ziri ezi nꞌiwu ịgwọ mmadụ nꞌụbọchị izuike?” Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụrụ na otu onye nꞌime unu enwee otu atụrụ danyere nꞌime olulu nꞌụbọchị izuike gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ ga-ahapụ ya nꞌebe ahụ? Ọ gaghị agbalị wepụta ya? Mmadụ ọ̀ dịghị mkpa karịa atụrụ? Ya mere, ọ dị mma ịrụ ọrụ ọma nꞌụbọchị izuike.” Ọ kpọrọ nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Setipụ aka gị!” Nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ. Ma ndị Farisii sitere nꞌebe ahụ pụọ, kpọọ nzukọ ịgba izu otu ha ga-esi jide Jisọs gbuo ya. Ma Jisọs maara ihe ha na-ezube ime. Nꞌihi ya o sitere nꞌụlọ ekpere ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịrịa ha nile. Ma o nyere ha iwu sị ha agbasala akụkọ ọrụ ebube ọ na-arụ. Nke a mere ka amụma ahụ Aịzaya buru banyere ya mezuo. Nꞌihi na Aịzaya buru amụma sị, “Onye a bụ ohu m, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nꞌanya. Ọ bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye mmụọ m nꞌime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba nile aka. Ọ gaghị ese okwu, ma ọ bụ lụọ ọgụ. O nweghị onye ga-anụ oke okwu ya nꞌezi. Ọ gaghị emegide ndị na-adịghị ike. Ọ ga-akwali ndị olileanya ha dị nta, tutuu ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi merie. Ọ bụkwa site nꞌịkpọ aha ya ka mba nile dị nꞌụwa ga-enwe olileanya.” Emesịa, ha kpọtaara Jisọs otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Jisọs gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ. O mekwara ka o bido ikwu okwu. Ọrụ a Jisọs rụrụ juru igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ anya. Nꞌihi ya, ha kwuru sị, “Ọ̀ ga-abụ na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ, Nwa Devidi?” Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ha kwuru, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nꞌihi na ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.” Ma Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Mba ọ bụla ndị bi nꞌime ya na-alụrịta ọgụ enweghị ike ịdịgide ruo oge dị anya. Obodo ọ bụla, ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla e nwere nkewa na ịlụ ọgụ, nke ndị bi nꞌime ya na-egburita ibe ha, agaghị adịgide. Otu a kwa, ọ bụrụ na ụfọdụ mmụọ ọjọọ nꞌime alaeze ekwensu na-alụso ibe ha ọgụ na-emegide ha, nke a na-egosi ha ọdịda alaeze ahụ adịghị anya, nꞌihi na nkewa dị egwu abatala nꞌime alaeze ahụ. Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nꞌike ekwensu, ọ̀ bụ nꞌike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nꞌihi okwu a unu kwuru. Kama ọ bụrụ na m na-esite nꞌike Mmụọ Nsọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nꞌetiti unu. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịbanye nꞌụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo nile dị nꞌụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ. Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo nile dị nꞌụlọ nwoke ahụ. Onye na-adịghị adịnyere m na-emegide m. Otu a kwa, onye na-adịghị enyere m aka ikpokọta ekpokọta na-achụsasị achụsasị. “Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmadụ mmehie ya nile, ma ọ bụ nkwulu ya nile. Ma onye ọ bụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara. Onye ọ bụla kwuluru Nwa nke mmadụ ga-anata mgbaghara, ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara nꞌọgbọ a, ma ọ bụ nꞌọgbọ nke na-abịa. “Osisi ọma na-amị mkpụrụ ọma. Osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọjọọ. A na-amata osisi ọ bụla site na mkpụrụ ọ na-amịpụta. Ụmụ ajụala, olee otu ndị dị njọ dị ka unu ga-esi kwuo okwu ọma? Nꞌihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nꞌobi pụta. Ezi mmadụ na-ekwupụta ezi ihe dị ya nꞌime obi. Ajọ mmadụ na-esitekwa nꞌajọ okwu ya kpughee ajọ ihe dị ya nꞌobi. Ma ana m agwa unu sị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, onye ọ bụla ga-akọwa onwe ya, banyere okwu nile na-enweghị isi o kwuru. Nꞌihi na okwu unu kwuru ka a ga-eji kpee unu ikpe nꞌụbọchị ahụ, igosi unu dị ka ndị ikpe mara, ma ọ bụ dị ka ndị ikpe na-amaghị.” Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs okwu sị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ọrụ ebube ọzọ.” Ma Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nanị ajọ mba nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịba ama ọzọ. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịba ama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịba ama Jona onye amụma. Nꞌihi na dị ka Jona siri nọọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, nꞌime afọ azụ, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nꞌime ala. Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ndị Ninive ga-ebili kpee unu ikpe. Ha ga-amakwa unu ikpe. Nꞌihi na mgbe Jona gwara ha okwu Chineke, ha chegharịrị, tụgharịa, bịakwute Chineke, ma ugbu a onye karịrị Jona ukwuu nọ nꞌebe a ma unu achọghị ya. Nꞌụbọchị ikpe ahụ kwa, eze nwanyị Sheba ga-ebili boo unu ebubo. Ọ ga-amakwa unu ikpe. Nꞌihi na o si nꞌebe dị anya bịa nụrụ okwu amamihe Solomọn. Ma ugbu a onye ahụ dị ukwuu karịa Solomọn nọ nꞌebe a, ma unu jụrụ ikwere na ya. “Mba ọjọọ nke a! Unu yiri nwoke mmụọ ọjọọ na-achị! Nꞌihi na mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime nwoke ahụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-aga nꞌọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe ọ ga-ezuru ike mgbe ọ na-achọtaghị ebe izuike, ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alọghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’ Mmụọ ọjọọ ahụ na-alọghachikwa jekwuru nwoke ahụ. Mgbe o ruru nꞌebe nwoke ahụ nọ, ọ ga-ahụ na e meela ka obi nwoke ahụ dị ọcha, ma ọ tọgbọrọ nꞌefu, nꞌihi na ọ dịghị ihe ọzọ e tinyere nꞌime ya, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụọ na mbụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ na o si otu a dịrị, ọ na-apụ gaa chọtakwa mmụọ ọjọọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha nile na-abata bịa biri nꞌime nwoke ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị unu ndị bi nꞌọgbọ a jọrọ njọ.” Mgbe Jisọs nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzo nꞌezi na-eche ka ha gwa ya okwu. Otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ gwara Jisọs okwu sị ya, “Lee nne gị na ụmụnne gị na-achọ ịhụ gị nꞌezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.” Ma Jisọs zara ya sị, “Onye bụ nne m? Òlee ndị bụ ụmụnne m?” Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka sị, “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m. Nꞌihi na onye ọ bụla na-eme ihe Nna m bi nꞌeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.” Emesịa, nꞌụbọchị ahụ kwa, Jisọs hapụrụ ụlọ ahụ gaa nꞌọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala na-ezi ndị mmadụ ihe. Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa nꞌime ụgbọ mmiri. Nꞌime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ nꞌọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị, ihe. O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịgha mkpụrụ nꞌubi ya. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nꞌime ha dara nꞌakụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrụ ha loo. Ma ụfọdụ nꞌime ha dara nꞌala dị nkume nkume. Ọ dịghị anya ha pupụtara, too, nꞌihi na aja dị nꞌebe ahụ emighị emi. Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nꞌihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nꞌime ala. Mkpụrụ ụfọdụ danyere nꞌala ebe ogwu ogwu dị. Mgbe ha topụtara, ogwu ahụ kpagburu ha. Ma ụfọdụ mkpụrụ dara nꞌezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị iri mkpụrụ atọ, ụfọdụ iri mkpụrụ isii, ụfọdụ kwa narị mkpụrụ. Onye nwere ntị ya nụrụ.” Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nꞌilu?” Jisọs zara ha sị, “Nanị unu ka ọ dịrị ịghọta ihe omimi nke alaeze Chineke. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya. “Nꞌihi na onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nweta hie nne. Ma onye na-enweghị ihe ọ bụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere. Ana m agwa ha okwu nꞌilu nꞌihi na ọ bụ ezie na ha nwere anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa ezie na ha na-anụ ihe m na-ekwu ma ha adịghị aghọta ya. Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, ‘Ha ga-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta. Ha ga-ele anya leekwa anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọ bụla. Nꞌihi na obi ha gbara abụba, dịkwa rọ. Ha mechiri ntị ha, ka ha ghara ịnụ ihe. Ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ha mechiri obi ha, ka ha ghara ịghọta ma tụgharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’ Ma a gọziri anya unu na ntị unu agọzi, nꞌihi na ha na-ahụ ụzọ, na-anụkwa ihe. *** Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-agwa unu sị, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe ndị a anya unu na-ahụ ugbu a, na ịnụ ihe ndị a ntị unu na-anụ, ma ha enweghị ike. “Ugbu a geenụ ntị mgbe m na-akọwara unu ihe banyere ilu onye ọrụ ubi ahụ nke gara ghaa mkpụrụ nꞌubi ya. Mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke. Ala ebe mkpụrụ ahụ dara nọchiri anya obi mmadụ. Mkpụrụ nke dara nꞌụzọ, nke ụmụ nnụnụ bịara tụrụ loo, nọchiri anya ndụ nụrụ eziokwu nke alaeze ahụ, ma ha aghọtaghị ya. Emesịa ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nꞌobi. Mkpụrụ nke dara nꞌala nkume nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya. Ma mgbọrọgwụ okwu ahụ gbara nꞌime obi ya esighị ike. Mgbe nsogbu na mkpagbu bịara nꞌihi okwukwe ya, ịnụ ọkụ nke obi ya na-anwụ, onye ahụ adịghị anọgidekwa. Mkpụrụ nke dara nꞌala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nꞌakụ nke ụwa, kpagidere okwu dị nꞌime ya, mee ka ọ hapụ ịmị mkpụrụ. Ma mkpụrụ dara nꞌala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nꞌozi ọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-apụ kpọta iri mmadụ anọ, ma ọ bụ iri mmadụ isii, ma ọ bụ narị mmadụ, ndị a ga-eme ka ha baa nꞌalaeze ahụ.” Jisọs tụrụ ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka onye ọrụ ubi nke kụrụ ezi mkpụrụ ọka nꞌubi ya. Ma nꞌotu abalị, mgbe onye ọrụ ubi ahụ nọ nꞌụra, onye iro ya gara nꞌubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nꞌetiti ezi mkpụrụ ọka ahụ ọ kụrụ. Mgbe mkpụrụ ọka ndị ahụ bidoro ito, ahịhịa ahụ bidokwara ito. “Ma ndị na-ejere onye ọrụ ubi ahụ ozi bịara jụọ ya ajụjụ sị, ‘Nna anyị ukwu, ọ̀ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’ “Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, ‘Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’ Ndị na-ejere ya ozi sịrị, ‘Ka anyị gaanụ fopụtasịa ha.’ “Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị! nꞌihi na mgbe unu na-achọ ifopụ ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site nꞌamaghị ama fopụ ezi mkpụrụ. Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ tokọtaa, tutuu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nꞌoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunụ ụzọ fopụtasịa ahịhịa ndị a nile, kee ha nꞌukwu nꞌukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpọkọtaanụ ọka ndị a tinye ha nꞌọba.’ ” Jisọs tukwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọsụtadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nꞌubi ya. Ọ bụ ezie ha ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi nile, ọ dị nta dị ka mkpụrụ aṅara ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe nile a kụrụ nꞌubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-arụ akwụ ha nꞌalaka ya.” Ọzọ kwa, Jisọs ji alaeze eluigwe tụnyere ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere gwakọtaa nꞌụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ koo. Oge nile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọ bụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. O mere nke a ka okwu ndị amụma kwuru mezuo, nꞌihi na ha buru amụma sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọ bụla na-amaghị site nꞌoge e kere ụwa.” Emesịa, Jisọs hapụrụ igwe mmadụ ahụ nꞌezi baa nꞌụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nꞌubi a kụrụ ọka.” Jisọs zara ha sị, “Ọ dị mma. Lee ihe nkọwa ya bụ: nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ mụ onwe m. Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nꞌubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nꞌubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ekwensu. Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. “Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. Aga m ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa chịkọtaa ndị nile na-eme ka ndị mmadụ mee mmehie, na ndị nile na-arụ ọrụ ọjọọ. Ha ga-atụba ndị a nꞌime ọkụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze. Ma ndị nile bụ ụmụ Chineke ga-enwụ dị ka anyanwụ nꞌime alaeze Nna ha. Ndị nwere ntị ịnụ ihe ha nụrụ. “Ala eze eluigwe dị ka akụ e zoro nꞌotu ibiribe ala, nke otu nwoke chọpụtara. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe nile o nwere, ma gaa zụọ ibiribe ala ahụ. “Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụ ahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara. Mgbe ọ hụrụ nkume a, o rere ihe nile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụ ahịa. “Ọzọ kwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke onye ọkụ azụ wụnyere nꞌime mmiri, jiri ya jide azụ dị iche iche, ndị a na-eri eri na ndị a na-adịghị eri eri. Mgbe ụgbụ a juru, onye ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya, nọdụ ala họpụtasịa ndị a na-eri eri ma na-etufụ ndị a na-adịghị eri eri. Otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nꞌetiti ụmụ Chineke. A ga-atụba ndị ọjọọ nꞌime ọkụ. Nꞌebe ahụ ka ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze. Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha azara sị ya, “Ee, anyị ghọtara.” Jisọs sịrị ha, “Ya mere, onye ozizi iwu Mosisi ọ bụla soro bụrụ onye na-eso ụzọ nke alaeze eluigwe, ga-adị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nꞌọba ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ laghachiri nꞌobodo Nazaret, gaa izi ndị mmadụ ihe nꞌime ụlọ ekpere. Amamihe ya na ọrụ ebube ọ rụrụ juru onye ọ bụla anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a nile? *** “Nwoke a ọ̀ bụghị nwa Josef, onye ọkwa nka? Ọ̀ bụghị Meri bụ nne ya? Jemes, na Josef, na Saịmọn, na Judas, ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amakwaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha bi nꞌebe a? Ebee ka o si nweta oke amamihe dị otu a?” Iwe were ha nꞌebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nꞌebe nile, ma a dịghị asọpụrụ ya nꞌala a mụrụ ya, na nꞌetiti ndị ikwu ya.” Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nꞌebe ahụ, nꞌihi na ha enweghị okwukwe nꞌime ya. Ọ bụ nꞌoge a ka Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. Ọ ga-abụ na o sitela nꞌọnwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ebube ndị a.” Nꞌihi na, na mbụ, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ, maka ime ka obi tọọ nwụnye ya Herodias ụtọ. Herodias bụ rịị nwụnye Filip nwanne Herọd. Ma Herọd mere ka Herodias site nꞌaka Filip gbapụta bịa bụrụ nwụnye nke ya. Herọd jidere Jọn nꞌihi na Jọn gwara ya na o zighị ezi ka ọ lụọ Herodias nwụnye nwanne ya. Herọd chọrịrị igbu Jọn, ma ọ tụrụ egwu na obi agaghị atọ ndị Juu ụtọ, nꞌihi na mmadụ nile kweere na Jọn bụ onye amụma. Ma otu ụbọchị, mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herọd, nke Herodias mụtara, tere egwu nꞌihu nna ya Herọd, na nꞌihu ndị ọbịa bịara nꞌụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. Nke a mere o ji ṅụọ iyi gwa ada ya okwu sị, “Ana m aṅụ iyi na-asị na m ga-enye gị ihe ọ bụla ị rịọrọ m.” Nwagbọghọ ahụ gara jụọ nne ya ihe ọ ga-arịọ nna ya. Mgbe nne ya gwasịrị ya ihe ọ ga-arịọ, ada Herọd lọghachiri gwa nna okwu sị ya, “Achọrọ m ka i nye m ugbu a, nꞌime efere, isi Jọn omee baptizim.” Arịrịọ a wutere Herọd, nye ya nsogbu nꞌobi. Ma ebe ọ bụ na ọ ṅụrụ iyi nꞌihu ndị ọbịa ya nile, ọ chọghị ịla azụ nꞌokwu ya. O nyere iwu ka e meere ada ya ihe ọ chọrọ. Ya mere, a gara nꞌụlọ mkpọrọ gbupụ Jọn isi. E tinyere isi ya nꞌefere bunye nwagbọghọ ahụ. Ada Herọd naara ya bulaara nne ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn omee baptizim nụrụ otu o si nwụọ, ha bịara buru ozu ya gaa lie ya. Emesịa, ha gara gwa Jisọs ihe nile dị ka o si mee. Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma igwe mmadụ ndị si obodo dị iche iche nụrụ ya soro ya, kama ha si ụzọ elu ala jeruo ebe ọ nọ. Mgbe Jisọs sitere nꞌụgbọ mmiri ahụ wụda, ọ hụrụ igwe mmadụ ndị a ka ha nọ na-eche ha. Nꞌoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji, ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nꞌọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nꞌime obodo zụọra onwe ha nri.” Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụ nanị ogbe beredi ise na azụ abụọ ka anyị nwere.” Jisọs sịrị ha, “Wetara m ha.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nꞌahịhịa. O weere ogbe beredi ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu, rịọ Chineke ka ọ gọzie ha. Ọ nyawara beredi ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ. Onye ọ bụla rijuru afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe beredi dara nꞌala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. Ọ bụkwa puku dimkpa ise ka Jisọs nyere nri nꞌụbọchị ahụ. A gụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụaka nile, ndị soro rie nri a. Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nꞌụgbụ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ. Mgbe ndị a lara, Jisọs rigooro nꞌugwu ikpe ekpere, nanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, Jisọs nọkwa nꞌugwu ahụ na-ekpe ekpere, nanị ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs ruru nꞌetiti osimiri, ebili mmiri dị egwu malitere ịmali elu, na-ebugharị ụgbọ mmiri ahụ, nꞌihi na ifufe na-efesi ike. Ma ihe dị ka site nꞌelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, ma ọ bụkwa nꞌelu osimiri ahụ ka ọ na-aga ije. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-abịa, oke egwu jidere ha. Ha tiri mkpu sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha chere na Jisọs bụ mmụọ. Ma Jisọs sịrị ha, “Unu atụla egwu! Ọ bụ m.” Mgbe ha hụrụ na ọ bụ Jisọs nꞌezie, Pita pụtaziri gwa Jisọs okwu sị ya, “Onyenwe anyị, ebe ọ bụ gị nꞌezie, biko, nyenụ iwu nke ga-eme ka m bịakwute gị.” Onyenwe anyị sịrị Pita, “Bịaa!” Pita sitere nꞌụgbọ pụta bido ịga ije nꞌelu mmiri ijekwuru Jisọs. Ma mgbe Pita hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị, ụjọ tụrụ ya. O bidokwara imikpu nꞌime mmiri ahụ. Nꞌihi nke a o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!” Na-atụfụghị oge, Jisọs setipụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ gwara Pita okwu sị ya, “Lee ka okwukwe gị siri dị nta! Gịnị mere i ji nwee obi abụọ?” Ha abụọ banyere nꞌụgbọ mmiri ahụ. Ma mgbe ha banyere nꞌụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara. Ndị ahụ ya na ha so nọdụ nꞌụgbọ ahụ kpọrọ isi ala nye ya sị, “Nꞌezie, ị bụ Ọkpara Chineke!” Ha gafere osimiri ahụ jeruo Genesaret. Ngwangwa akụkọ ọbịbịa ha gbasara ebe nile nꞌobodo ahụ. Ndị mmadụ bidoro ịgbagharị na-agwa ibe ha ka ha dute ndị ọrịa ha ka Jisọs gwọọ ha Ọtụtụ mmadụ kpọtara ndị ahụ na-esighị ike. Ha rịọrọ Jisọs ka o kwenye ka ndị ọrịa a metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị nile metụrụ ya aka ka a gwọrọ. Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị Juu si Jerusalem bịara ịjụ Jisọs ajụjụ. Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nꞌomenala ndị okenye anyị? Tupuu mmadụ erie nri, ọ bụ omenala anyị na onye ahụ ga-ebu ụzọ kwọọ aka. Ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị eme nke a.” Jisọs zara ha sị, “Gịnị mekwaranụ unu ji na-emebi iwu Chineke nꞌihi omenala unu? Nꞌihi na Chineke nyere unu iwu sị, ‘Sọpụrụnụ nne na nna unu, onye ọ bụla kwujọrọ ndị mụrụ ya ka a ga-egbu.’ Ma nꞌọnọdụ iwu a, unu na-ezi ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla enwee ihe ọ ga-eji nyere ndị mụrụ ya aka, onye ahụ nwere ike ịjụ inyere ha aka ma ọ bụrụ na o kwuo na ihe ọ bụla o nwere bụ nke Chineke.’ Nꞌọmenala unu onye mere ihe dị otu a mere ihe ziri ezi, mgbe ọ jụrụ iji ihe o nwere sọpụrụ ndị mụrụ ya. Gịnị ka nke a na-egosi? Ọ̀ bụghị na unu emeela ka iwu Chineke bụrụ ihe dị ala karịa omenala unu? “Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya kwuo sị, ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya site nꞌebe m nọ. Ịkpọ isi ala ha bụ ihe efu, nꞌihi na ọ bụ ozizi mmadụ ka ha na-ezi nꞌọnọdụ iwu Chineke.’ ” Mgbe ahụ, Jisọs kpọrọ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ sị ha, “Geenụ ntị nꞌihe m na-ekwu. Ghọtakwanụ okwu m! Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nꞌọnụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si nꞌọnụ onye ahụ pụta, ya na ihe onye ahụ chere nꞌobi ya.” Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwaara na obi adịghị ndị Farisii mma nꞌihi okwu ahụ i kwuru.” Ma Jisọs zara sị ha, “Osisi ọ bụla Nna m na-ejighị aka ya kụọ ka a ga-efopụ. Ya mere, unu echegbula onwe unu, nꞌihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Mgbe ọ bụla kwa onye ìsì na-edu onye ìsì ibe ya ha abụọ aghaghị ịdaba nꞌime olulu.” Pita sịrị ya, “Kọwaaranụ anyị ihe okwu a pụtara. ‘Ọ bụghị ihe mmadụ riri na-emerụ ya.’ ” Jisọs jụrụ ya sị, “Ọ̀ bụ na ị ghọtaghị? Ọ̀ ga-abụ na o nweghị ihe dị iche nꞌetiti gị na ha nꞌịghọta eziokwu? Ọ̀ ga-abụ na unu aghọtaghị na ihe ọ bụla mmadụ riri nꞌọnụ ya na-abanye ya nꞌime afọ, emesịa o sitekwa ya nꞌike pụọ? Ma ihe si mmadụ nꞌọnụ pụta na-esi ya nꞌobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ. Nꞌihi na ọ bụ nꞌobi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko, ịchụ nwanyị, na isogharị nwoke, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwutọ. Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupuu o rie nri, ma ọ bụ na ọ kwọghị.” Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nꞌebe ọzọ dị obodo Taịa na Saịdọn nso. Nꞌebe ahụ, otu nwanyị onye Kena bi nꞌobodo ahụ bịakwutere Jisọs rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devidi, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nꞌime ya nke na-esogbu ya oge nile.” Ma Jisọs egheghị nwanyị ahụ ọnụ. Ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya rịọọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si esogharị anyị na-enye anyị nsogbu site nꞌarịrịọ ya!” Jisọs sịrị nwanyị ahụ, “Ezitere m nanị inyere ndị Juu aka, ndị bụ atụrụ furu efu nke Izirel.” Ma nwanyị a bịara daa nꞌụkwụ Jisọs rịọọ ya arịrịọ sị ya, “Onyenwe m, nyere m aka!” Jisọs zara sị ya, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.” Nwanyị ahụ zara ya sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọọ nꞌokpuru tebulu rie ibiribe nri nke na-esi nꞌelu tebulu ahụ daa nꞌala.” Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meerala gị ihe ị na-arịọ.” Nꞌotu oge ahụ a gwọrọ ada ya. Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nꞌakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nꞌelu ugwu nꞌọdụ ala. Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ọrịa, na ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Jisọs gwọkwara ha nile. Ọ tụrụ mmadụ nile nꞌanya mgbe ha hụrụ na ndị ogbi nile bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ. O jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izirel. Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a ebere, nꞌihi na mụ na ha anọọla abalị atọ nꞌebe a, ma ha eribeghị nri ọ bụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nꞌihi na ụfọdụ ha nwere ike ịda nꞌụzọ.” Ndị na-eso ụzọ ya sịị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru ha nꞌọzara a?” Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nri unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe beredi asaa na azụ ole na ole.” Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere beredi asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ. Onye ọ bụla nꞌime ha rijuru afọ. Ha dị puku dimkpa anọ riri nri ahụ. Ma a gụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị. Mgbe ha risịrị nri, a tụtụkọtara ibiribe nri dara nꞌala. Ha juru nkata asaa. Jisọs zilagara ha, baa nꞌụgbọ mmiri gafee osimiri, bịaruo nꞌobodo Magadan. Otu ụbọchị, ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara Jisọs sị ya, “Gosi anyị ihe ịrịba ama si nꞌelu, nke ga-ezi anyị na ị bụ onye ị sị na ị bụ.” Jisọs zara sị ha, “Ihe unu maara nke ọma bụ nanị ịkọwa ihu eluigwe. Nꞌanyasị unu na-sị, ‘Mmiri agaghị ezo nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie.’ Nꞌụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie na oji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nꞌihe ịrịba ama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nꞌime ya pụtara. Ajọ ọgbọ nke jupụtara nꞌekweghị ekwe, nke na-arịọkwa ka e mee ihe ịrịba ama na mbara eluigwe. Ọ dịghị ihe ịrịba ama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịba ama Jona.” Mgbe ahụ Jisọs sitere nꞌebe ahụ ha nọ pụọ. Mgbe ha gafesịrị nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị ihe oriri ọ bụla. Nꞌoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya nꞌebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii dị.” Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe Jisọs na-agwa ha. Ha chere na ọ na-ekwu okwu a nꞌihi na ha chefuru iweta nri ha ga-eri. Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nꞌihi na unu enweghị ihe oriri? Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ̀ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe beredi ise mee ka ha rijuo afọ? Unu echetakwaghị na m ji ogbe beredi asaa zụọ puku mmadụ anọ? Ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara? Gịnị mere unu ji chee na ọ bụ ihe banyere nri ka m na-ekwu? Ka m kwuokwa okwu m kwuru ọzọ, cheenụ onwe unu nche nꞌebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.” Nꞌikpeazụ ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ọjọọ ndị Farisii na ndị Sadusii. Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipaị, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?” Ha zara sị ya, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, ma ọ bụ otu nꞌime ndị amụma.” Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Onye kwanụ ka unu onwe unu na-eche na m bụ?” Saịmọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” Jisọs gwara Pita okwu sị ya, “Saịmọn Pita, ị bụ onye Chineke gọzịrị agọzi, nꞌihi na eziokwu a i kwuru ugbu a esiteghị nꞌaka mmadụ efu rute gị. Kama ọ bụ Nna m bi nꞌeluigwe mere ka ị mata ya. Ma ka m gwa gị eziokwu, aha gị bụ Pita, nke pụtara ma a sụgharịa ya, Nkume. Ọ bụkwa nꞌelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike nile nke ọkụ ala mmụọ apụkwaghị iguzo megide ya. Aga m enye gị mkpịsị igodo alaeze eluigwe. Ihe ọ bụla dị nꞌụwa ị jụrụ na ọ gaghị abata nꞌeluigwe agaghị abata nꞌebe ahụ. Ihe ọ bụla kwa ị nabatara nꞌụwa, ya ka a ga-anabatakwa nꞌeluigwe.” Mgbe ahụ, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka ndị ọzọ mata na ya bụ Onye nzọpụta ahụ. Site nꞌoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere Jerusalem. O mere ka ha mata na ọ ga-ahụ ahụhụ dị iche iche site nꞌaka ndị isi ndị Juu. Ọ gwara ha sị, “Ndị isi ndị Juu ga-egbu m. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, aga m esite nꞌọnwụ bilie.” Mgbe Jisọs gwasịrị ha okwu a, Pita duuru ya pụọ gaa nꞌotu akụkụ, nọdụ nꞌebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!” Ma Jisọs chigharịrị lee Pita anya sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ nnọọ ajọ mmadụ nꞌebe m nọ. Nꞌihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ nanị echiche mmadụ, ọ bụghị echiche Chineke.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buliekwa obe ya soro m nꞌazụ. Nꞌihi na onye ọ bụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla tụfuru ndụ ya nꞌihi m, ga-enwetakwa ya. Nꞌihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa nile nꞌuru ma tufuo ndụ ya? Gịnị bụ ihe ahụ dị nꞌụwa a ga-eji gbanwere ndụ mmadụ? Nꞌihi na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi m. Mgbe ahụ ka m ga-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị. Ụfọdụ nꞌime unu ndị guzo nꞌebe a ugbu a ga-adị ndụ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa dị ka eze nꞌalaeze ya.” Mgbe ụbọchị isii gafesịrị, Jisọs kpọrọ Pita na Jemes na Jọn rigoro nꞌelu ugwu, ebe nanị ha nọdụrụ. Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ na-ele Jisọs anya nꞌelu ugwu ahụ, mmadụ atọ ndị a hụrụ ka anụ ahụ Jisọs gbanwere. Ihu ya nwupụrụ ọcha dị ka akpụkpọ eluigwe. Uwe ya chakwara ọcha dị ka ogho. Na mberede, mgbe ha nọkwa na-ele ya anya, ha hụrụ Mosisi na Ịlaịja ka ha bịara soro Jisọs na-ekwurita okwu nꞌelu ugwu ahụ. Mgbe ahụ Pita tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Onyenwe anyị! Ọ dị mma ka anyị nile nọdụ nꞌebe a! Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ọnụ ụlọ atọ nꞌebe a. Otu nꞌime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosisi, nke ọzọ nke Ịlaịja.” Mgbe Pita kpụ okwu a nꞌọnụ, igwe ojii kpuchiri ha nile. Ha nụrụ olu sitere nꞌigwe daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya! Ihe ya dịkwa m ezi mma. Nụrụnụ olu ya.” Mgbe Pita na Jemes, na Jọn nụrụ olu a, ha dara nꞌala kpuchie ihu ha nꞌihi egwu. Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.” Mgbe ha lelitere anya ha, ọ bụ nanị Jisọs ka ha hụrụ. Ọ nwekwaghị onye ọzọ ya na ya guzo. Ma mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe ha hụrụ tutuu ruo mgbe o siri nꞌọnwụ bilie. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị isi ndị Juu ji na-ekwu na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa tupuu Onyenwe anyị abịa?” Jisọs zara ha sị, “Ihe ha kwuru bụ eziokwu. Ịlaịja kwesịrị ibu ụzọ bịa idozi ihe nile nꞌụsoro. Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ọtụtụ mmaụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ ga-esi hụọ ahụhụ site nꞌaka ha.” Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka Jisọs na-ekwu ihe banyere ya. Mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ rịda, ha hụrụ igwe mmadụ nọ na ndagwurugwu ugwu ahụ na-eche ha. Otu nwoke sitere nꞌetiti igwe mmadụ ahụ bịakwute Jisọs gbuo ikpere nꞌihu ya, rịọọ ya sị, “Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nꞌihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nꞌime ọkụ ma ọ bụ nꞌime mmiri. Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.” Jisọs zara sị, “Ụmụ ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi! Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kutere m nwanta ahụ nꞌebe a!” Mgbe ha kutere ya, Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nꞌime nwanta ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, ahụ dịrị nwanta ahụ mma. Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?” Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nꞌihi na okwukwe unu nwere ehighị nne. Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke dịkarịsịrị nta, nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike nye ugwu a iwu sị ya, ‘Site nꞌebe a wezụga onwe gị,’ ọ ga-apụkwa. Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị nanị site nꞌikpe ekpere na ibu ọnụ.” Mgbe ha nọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara m bụ nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị ga-egbu m. Ha ga-egbukwa m, ma nꞌụbọchị nke atọ aga m esite nꞌọnwụ bilie.” Okwu a wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu. Mgbe ha bịaruru Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nꞌihi ụlọ nsọ ukwu Chineke bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ̀ na-atụkwa ụtụ?” Pita zara ha sị, “Ee, ọ na-atụ ụtụ.” Ọ banyere nꞌụlọ ịgwa Jisọs banyere nke a. Ma tupuu Pita ekwuo ihe ọ bụla, Jisọs jụrụ ya ajụjụsị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Pita? Ọ̀ bụ nꞌaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ? Ọ̀ bụ nꞌaka ụmụ ha, ka ọ bụ nꞌaka ndị ọbịa e meriri emeri?” Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nꞌaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị, “Ọ dị mma, iwu ejighị ụmụ ha. Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nꞌosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nꞌime ya. Meghee ọnụ azụ nke mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nꞌime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.” Nꞌoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ onye nꞌetiti anyị ga-enwe ọnọdụ dị ukwuu karịa ndị ọzọ nꞌalaeze eluigwe?” Jisọs kpọrọ otu nwantakịrị ka ọ bịakwute ya. O mere ka nwanta ahụ guzo nꞌetiti ha. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị abata nꞌime alaeze eluigwe. Onye ọ bụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nꞌalaeze eluigwe. Onye ọ bụla naabatara nwantakịrị dị otu a nꞌihi m, bụ onye nabatara m, na onye lezikwara m anya. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee ka otu nꞌime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, daa mba nꞌokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume nꞌolu, tụnye ya nꞌoke osimiri ka mmiri rie ya. “Ahụhụ dịrị ụwa nꞌihi mmehie nile dị nꞌime ya. Ọnwụnwa na-eduba mmadụ ime ihe ọjọọ na-adị oge nile. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ na-ewetara ibe ya ihe ọnwụnwa. Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị ga-eme ka i mehie, gbupụ ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-abanye nꞌalaeze eluigwe na-enweghị ụkwụ na aka, karịa na ị ga-enwe aka na ụkwụ ma banye nꞌọkụ ala mmụọ. Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị ga-eme ka ị mehie, ghụpụta ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-eji otu anya banye alaeze eluigwe karịa na ị ga-enwe anya abụọ, banye nꞌọkụ ala mmụọ. “Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile. Nꞌihi na mụ, Nwa nke mmadụ, bịara ịzọpụta ndị furu efu. “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nꞌime ha akapfuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị ahapụ iri atụrụ toolu na toolu fọdụrụ pụọ jegharịa nꞌugwu na ndịda nile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu? Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-aṅụrị ọṅụ nꞌihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ toolu na toolu ndị nọ nꞌụlọ. Otu a ka ọ dịkwa nꞌebe Nna m nọ; ọ bụghị ọchịchọ ya na otu nꞌime ndị a dịkarịsịrị nta ga-ala nꞌiyi. “Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru. Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nꞌebe ọ nọ, meekwa ka ihe nile i kwuru nꞌihu ndị akaebe a doo ya anya. Ọ bụrụkwa na ọ nọgidesie ike jụ ige gị ntị, were ikpe gị jekwuru ndị chọọchị. Ọ bụrụ na ọ nabataghị ikpe ndị chọọchị kpere, gụọ ya dị ka onye mba ọzọ, onye na-amaghại Chineke. Nꞌezie, asị m unu, na ihe ọ bụla unu kere agbụ nꞌụwa, e keela ya rị agbụ nꞌeluigwe. Ihe ọ bụla kwa unu tọpụrụ, a tọpụkwala ya rị nꞌeluigwe. “Ana m agwa unu nke a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nꞌetiti unu ekwekọọ nꞌụwa banyere ihe ọ bụla unu na-arịọ nꞌekpere, Nna m bi nꞌeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ. Nꞌihi na ebe ọ bụla mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara nꞌaha m, mụ onwe m nọ nꞌetiti ha.” Mgbe ahụ Pita bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onywenwe anyị, ọ bụ ugbo ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ̀ bụ ugbo asaa?” Jisọs zara sị ya, “Ọ dịghị, ọ bụghị ugbo asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa uzọ asaa. “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị na-ejere ya ozi gụzie ego ya ha ji. Mgbe ha malitere na-apịazi, a kọtaara eze ahụ otu nꞌime ndị ohu ya ji ya ụgwọ ruru nde naịra abụọ. Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Eze ahụ nyere iwu ka e refuo ya na nwụnye, na ụmụ ya, na ihe nile o nwere, nꞌihi ụgwọ o ji. “Ma nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu eze ahụ, gbuokwa ikpere ya nꞌala rịọọ eze ahụ arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachi obi nꞌebe m nọ. Aga m akwụghachịkwa gị ụgwọ nile m ji gị.’ “Eze ahụ jupụtara nꞌọmiko nꞌebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ. “Ma mgbe ohu ahụ sitere nꞌihu eze ahụ pụọ, o jekwuuru otu nwoke ji ya ụgwọ otu puku naịra. O jidere ya nꞌaka ike, machie ya aka nꞌakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a!’ “Nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Biko enyi m, nwee ntachi obi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’ “Ma nwoke ahụ e ji ụgwọ achọghị ichere! O jidere nwoke ahụ, tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji ya. “Mgbe ndị enyi nwoke ahụ e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụrụ ihe mere enyi ha, ha jekwuuru eze ahụ, kọọrọ ya ihe nile ha hụrụ. Eze ahụ kpọrọ nwoke a, nke ọ gbaghara ụgwọ nile o ji na mbụ sị ya, ‘Ajọ ohu! Nꞌebe a ka m nọ gbaghara gị. Ebe m gbaghara gị ụgwọ i ji m, o kwesịghị ka i nwee obi ebere nꞌebe ndị ọzọ nọ, dị ka m si nwee obi ebere nꞌebe ị nọ?’ “Mgbe abụ, eze ahụ oke iwe juru obi, zipụrụ nwoke ahụ ka a taa ya ahụhụ, tutuu ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji, na-afọdụghị otu kobo. Otu a ka Nna m bi nꞌeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị ụmụnne unu.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judia, nke dị ma a gafee osimiri Jọdan. Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nꞌetiti ha. Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ iji ịnwa ya sị, “O ziri ezi nꞌiwu na nwoke ga-agbara nwụnye ya achọkwaghị m nꞌihi ihe ọ bụla?” Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu adịghị agụ akwụkwọ nsọ? Nꞌime ya ka e dere sị, ‘Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị. Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya rapara nꞌahụ nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.’ Ya mere, ha abụọ ga-abụ otu onye. Ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ. Ya mere, ihe ahụ Chineke jikọtara ọnụ onye ọ bụla atọsala ya.” Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere Mosisi ji nye iwu sị na nwoke ọ bụla nwere ohere ide akwụkwọ achọkwaghị m nye nwụnye ya?” Jisọs zara sị ha, “Mosisi mere nke a nꞌihi na ọ chọpụtara na obi unu siri ike ịnabata ozizi Chineke. Ma site na mbụ Chineke enyeghị iwu dị otu a. Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.” Ndị na-eso ụzọ Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwụnye ma ọlị.” Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ nile ga-anagide okwu a. Nanị ndị Chineke nyere ike ime ya ga-anagide ya. Ụfọdụ ka a mụrụ dị ka ndị na-enweghị ike ịmụta nwa site nꞌafọ nne ha. Ndị ọzọ dịkwa, ndị jiri aka ha họrọ na ha agaghị amụta ụmụ nꞌihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla pụrụ ịnagide okwu a, ya nagide ya.” Mgbe ahụ e kuteere Jisọs ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba sị, “Unu esogbula Onyenwe anyị.” Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” Jisọs bikwasịrị ha aka nꞌisi gọzie ha nile tupuu ọ hapụ ha pụọ. Otu nwoke bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ banyere ihe ziri ezi? Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye. Ọ bụrụ na ị chọrọ iketa alaeze eluigwe gaa debe iwu nile Chineke nyere.” Nwoke ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara sị ya, “Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha. Sọpụrụ nna gị na nne gị. Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.” Nwoke ahụ sịrị ya, “Iwu ndị a ka m deberela siterị na mgbe m dị na nwanta. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuru oke nꞌezie, laa nꞌụlọ gị ree ihe nile i nwere. Nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ na ụba nꞌeluigwe. Bịakwa soro m.” Mgbe nwoke ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ọ lara na mwute, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke. Nꞌezie asị m unu, ọ dịrị inyinya mfe ịgafe nꞌanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nꞌalaeze Chineke.” Okwu a Jisọs kwuru mere ka egwu tụọ ndị na-eso ụzọ ya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” Jisọs legidere ha anya sị ha, “E jiri anya mmadụ lee ya ọ bụ ihe siri ike. Ma nꞌebe Chineke nọ ọ dịghị ihe rara ya ahụ ime.” Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe nile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?” Jisọs zara sị ya, “Mgbe mụ bụ nwa nke mmadụ ga-anọkwasị nꞌelu ocheeze ebube m, nꞌalaeze ahụ, nꞌezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nꞌelu ocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ Izirel ikpe. Onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nna ya na nne ya, na nwụnye ya, na ụmụntakịrị ya, ma ọ bụ ala o nwere, soro m, ga-anata ụgwọ ọrụ karịrị ihe ọ hapụrụ. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ bido ugbu a, ga-abụ ndị ikpeazụ.” “Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nꞌisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nꞌubi ya. Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha naịra abụọ nꞌihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nꞌubi ya. “Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, nꞌihe dị ka elekere toolu ụtụtụ, o sitere nꞌebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro na-eche onye ga-akpọ ha ọrụ. Ọ kpọrọ ha ziga ha nꞌubi ya sị ha, ‘Ihe ọ bụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu, mgbe unu rụsịrị ọrụ.’ Nꞌelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie ụbọchị ahụ, ọ hụkwara ndị ọzọ, ziga ha nꞌubi ya. “Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu arụghị ọrụ taa?’ “Ha zara sị ya, ‘Nꞌihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ Ọ gwara ha sị, ‘Gaanụ soro ndị ọzọ rụọ ọrụ nꞌubi m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’ “Nꞌabalị ụbọchị ahụ, nwoke a gwara onye na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ ka ọ kwụọ ha nile ụgwọ. O mekwara ka onye na-akwụ ụgwọ malite nꞌonye ikpeazụ bịara ọrụ nꞌubi ahụ ruo na ndị buru ụzọ bido ọrụ nꞌụtụtụ. Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nꞌelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha naịra abụọ, naịra abụọ. Nꞌihi ya mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nꞌisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha nile naịra abụọ abụọ. “Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamụrụ ntamụ megide nna nwe ụlọ sị, ‘Ndị a rụrụ ọrọ nanị otu awa, ma ị kwụrụ ha ụgwọ dị ka anyị bụ ndị rụrụ ọrụ site nꞌụtụtụ ruo anyasị.’ “Nna nwe ụlọ zara otu nꞌime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọ bụla. Ọ̀ bụghị gị kwere na ị ga-arụ ọrụ ụbọchị taa nile? Ọ̀ bụghị gị kwekwaara na ị ga-anara naịra abụọ? Were ego gị laa. Ọ bụrụ na m akwụọ mmadụ nile otu ihe ahụ, ọ̀ dị iwu megidere m, nꞌihi na m nyere ego m dị ka m si chọọ? Ị̀ na-ewe iwe nꞌihi na m meere ndị mmadụ ebere?’ ” Jisọs kwukwara sị, “Otu a ka ọ ga-adị, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.” Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya gaa nꞌotu akụkụ, kọọrọ ha ihe nile ga-adakwasị ya mgbe ha ruru Jerusalem. Ọ sịrị ha, “A ga-arara m nye nꞌaka ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ha ga-amakwa m ikpe ọnwụ. Ha ga-arara m nye nꞌaka ndị mba ọzọ ndị ga-eji m mee ihe ọchị, ndị ga-apịakwa m ihe, kpọgide m nꞌobe. Ma aga m esite nꞌọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gafere.” Emesịa, nne Jemes na Jọn, ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya bịakwute Jisọs, kpọọ isi ala nye ya, rịọọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha. Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ zara sị, “Nꞌalaeze gị, mgbe ị ga-abụ eze, ị ga-ekwe m nkwa na ụmụ m abụọ ga-anọdụ nso ocheeze gị, otu nꞌaka nri gị, nke ọzọ nꞌaka ekpe gị?” Jisọs zara sị ya, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ ka m meere unu.” O chigharịrị lee Jemes na Jọn anya, jụọ ha ajụjụ sị, “Ùnu pụrụ ịṅụ site nꞌiko a dị oke egwu nke m ga-aṅụ?” Ha zara sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.” Ma Jisọs zara sị ha, “Nꞌezie unu nwere ike ịṅụ site nꞌiko ahụ, ma ọ dịghị nꞌike aka m ịsị na unu ga-anọ nꞌaka nri m, ma ọ bụ nꞌaka ekpe m. Ọnọdụ dị otu a, nke unu na-arịọ, bụ nke Nna m debere iche nye ndị ọ họpụtara.” Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs fọdụrụ nụrụ ihe Jemes na Jọn na-arịọ ka Jisọs meere ha, ha were iwe nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a. Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara ọ gwara ha okwu sị, “Nꞌetiti ndị na-ekweghị ekwe, ndị isi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nꞌuche. Ndị ukwu nꞌetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nꞌokpuru ha. Ma nꞌetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọ bụla nꞌetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-eburu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu nile ozi. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye dị ukwuu karịa ndị ọzọ, ị ga-ebu ụzọ jeere ha ozi dị ka onye ọrụ e goro ego. Omume unu kwesịrị ịdị ka nke m. Nꞌihi na mụ, Nwa nke mmadụ, abịaghị ka e jeere m ozi, kama abịara m ijere ndị ọzọ ozi na inye ndụ m dị ka aja mgbapụta nꞌọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụsịrị Jeriko, igwe mmadụ sooro ya nꞌazụ. Ndị ìsì abụọ nọ nꞌakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nꞌoke olu na-asi, “Onyenwe anyị, Nwa Devidi, biko meere anyị ebere!” Igwe mmadụ ahụ so Jisọs gbọchiri ha ọnụ, sị ha mechie ọnụ ha. Ma ndị ìsì ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, meere anyị ebere!” Mgbe Jisọs bịaruru nꞌebe ha nọ, o guzoro nꞌụzọ kpọọ ha, jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.” Jisọs nwere ọmiko nꞌahụ ha. O metụrụ ha aka nꞌanya. Ngwangwa ha malitere ịhụ ụzọ, bidokwa iso Jisọs. Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere obodo Betfeji nke dị nꞌugwu Olivu. Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa nꞌobodo nta dị nꞌihu ha. Ọ gwara mmadụ abụọ a sị, “Meenụ ngwangwa baa nꞌime obodo ahụ dị anyị nꞌihu. Nꞌebe ahụ unu ga-ahụ otu inyinya ibu nke ya na nwa ya nọ nꞌotu ebe. Tọpụta inyinya ibu ahụ kpụta ya nꞌebe a. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu ihe unu na-eme, nanị ihe unu ga-agwa ya bụ na inyinya ahụ dị Onyenwe unu mkpa. Ọ ga-ahapụkwa ka unu kpụrụ ya.” E mere nke a ka okwu e kwuru site nꞌọnụ ndị amụma mezuo. Nꞌihi na ha buru amụma sị, “Gwanụ ada Zayọn sị, lee eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ nọkwasịkwara nꞌelu inyinya ibu, ee, nꞌelu nwa anụ na-ebu ibu.” Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sị ha mee. Ha kpụtara inyinya ibu ahụ na nwa ya. Ha wụkwasịkwara uwe ha nꞌelu ya kukwasị Jisọs nꞌelu ya. Ọtụtụ nꞌime igwe mmadụ ahụ so Jisọs, tụsara uwe ha nꞌokporo ụzọ. Ndị ọzọ ghuturu alaka osisi, tụsaa ha nꞌụzọ, nꞌihu ya. Ụfọdụ nꞌime igwe mmadụ ahụ nọ Jisọs nꞌihu, ndị ọzọ sokwa ya nꞌazụ. Ha nile nọkwa na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Otuto dịrị Nwa Devidi! Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị! Otuto nꞌebe kachasị ihe nile elu!” Mgbe Jisọs batara nꞌime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ nile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ nwoke a?” Igwe mmadụ ahụ so Jisọs zara sị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ si Nazaret, obodo dị nꞌime Galili.” Jisọs banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem malite ịchụpụ ndị nile na-ere ahia na ndị na-azụ ihe ahia nꞌebe ahụ. O kpuru tebulu ndị na-agbanwe ego ihu nꞌala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru. Ọ gwara ha okwu sị ha, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ụlọ Nna m ga-abụ ụlọ ekpere’, ma unu na-eme ya ka ọ bụrụ ogige ndị ohi!” Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nꞌebe ahụ. O mekwara ka ahụ dị ha ike. Ma mgbe ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịba ama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Otuto dịrị Nwa Devidi!” Iwe were ha nke ukwuu. Ha bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ị̀ na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “Ee, ana m anụ ya. Ọ̀ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru? Nꞌime ya ka e kwuru sị, ‘A ga-esite nꞌọnụ ụmụ a mụrụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara nye Chineke otutu dị ebube.’ ” Emesịa, Jisọs hapụrụ Jerusalem laghachi nꞌobodo nta Betani, ebe o dinara nꞌabalị ahụ. Nꞌụtụtụ echi ya, mgbe Jisọs si Betani na-alaghachi Jerusalem, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. Ma o lepụrụ anya hụ otu osisi a na-akpọ fiigi ka ọ dị nꞌakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere ebe osisi ahụ dị, o jeruru nso nꞌukwu ya ịchọpụta ma ọ mịrị mkpụrụ. Ma ihe ọ hụrụ bụ nanị ahihia ndụ. Mkpụrụ ọ bụla adịghị nꞌelu ya. Ya mere, Jisọs bụrụ osisi ahụ ọnụ sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ka osisi ahụ kpọnwụrụ, ha tụrụ egwu, jụọ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị mere osisi fiigi a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?” Jisọs zara sị ha, “Eziokwu ka m na-ekwu, mgbe m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, unu ga-eme ihe karịrị nke a. Unu pụrụ inye ugwu olivu a iwu sị ya, ‘Si nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa danye nꞌoke osimiri,’ ọ ga-emezukwa. Ihe ọ bụla kwa unu sitere nꞌokwukwe rịọọ Chineke nꞌekpere, unu ga-anatakwa ya.” Emesịa, Jisọs lọghachiri nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, nọdụ nꞌebe ahụ na-ezi ihe. Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Onye nyere gị ike i ji na-eme ihe ndị a nile ị na-eme?” Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ajụjụ m, aga m azakwa unu ajụjụ unu, gwa unu ebe m siri nweta ike m.” Nke a bụ ajụjụ m, “Ònye zitere Jọn omee baptizim, nye ya ike ime ndị mmadụ baptizim? Ọ bụ Chineke ka ọ bụ mmadụ?” Ndị isi ahụ gbarịtara izu banyere ajụjụ a. Ha kpebiri sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na ọ bụ Chineke zitere ya, ọ ga-ajụ anyị ihe mere anyị ji jụ ịnabata ihe Jọn kwuru. Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na ọ bụ mmadụ zitere ya, igwe mmadụ ndị a ga-abịakwasị anyị nꞌiwe, nꞌihi na mmadụ nile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.” Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu onye nyere m ike ime ihe ndị a.” Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m gaa rụọ ọrụ nꞌubi m taa.’ Nwa ahụ zara nna ya sị, ‘Agaghị m aga’. Ma mgbe e mesịrị, ọ gbanwere obi ya gaa. Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta sị ya, ‘Nwa m, gaa rụọ ọrụ nꞌubi m taa.’ Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga.’ Ma nꞌikpeazụ ọ gaghị. Ònye nꞌime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ha, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nꞌezie, ndị ọnaụtụ na ụmụ nwanyị akwụla ga-ebu unu ụzọ banye nꞌalaeze Chineke. Nꞌihi na Jọn bịakwutere unu gwa unu ka unu chegharịa, lọghachikwute Chineke, ma unu ekweghị. Ndị ọnaụtụ, na ụmụ nwanyị akwụla chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ ha, nke a emekwaghị ka unu chegharịa kwere.” “Ugbu a geekwanụ ntị nꞌilu ọzọ. Otu nwoke dị nke nwere ala ubi. Nwoke a kụrụ osisi oroma nꞌubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, wuokwa mbadamba ebe a ga-anọ mee mmanya nꞌime ya. O wukwara ụlọ nche nꞌime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nꞌaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa biri nꞌala ọzọ. “Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị na-ejere ya ozi ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nꞌubi ahụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị ozi ya ahụ tie otu onye nꞌime ha ihe, gbuokwa onye ọzọ nꞌime ha. Ha tụkwara otu nꞌime ha nkume. “Emesịa, nwoke a zigakwara ọtụtụ ndị ozi karịrị ndị nke mbụ nꞌọnụ ọgụgụ, ịnata mkpụrụ ruuru ya. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. Nꞌikpeazụ nwoke ahụ zigara ọkpara ya. Echiche ya bụ na ndị na-elekọta ubi ahụ ga-asọpụrụ ya. “Ma mgbe ndị a na-elekọta ubi ahụ lepụrụ anya hụ ọkpara nwoke a ka ọ na-abịa, ha gbara izu nꞌetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye ga-eketa ihe nile onyenwe ubi a nwere. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ubi a bụrụkwa nke anyị.’ Mgbe ọkpara nwoke ahụ bịarutere, ha jidere ya nꞌike, kpụrụ ya gafee nꞌazụ ubi ahụ, gbuo ya nꞌebe ahụ. “Mgbe nwoke nwe ubi ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” Ndị nọ nꞌebe ahụ zara sị ya, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nꞌiyi nꞌụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi ya tinye nꞌaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nꞌoge ya.” Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ̀ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, ka e mere ka ọ bụrụ nkume dị mkpa nꞌụlọ ahụ? Nke a bụ ọrụ nke nanị Onyenwe anyị rụrụ. Ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nꞌanya anyị!’ “Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-enyeghachikwa Chineke mkpụrụ ruuru ya. Ndị nile ga-adakwasị nkume eziokwu ahụ ka a ga-etiwasị. Ma ndị nkume ahụ dakwasịrị ka a ga-egwepịa dị ka ntụ.” Mgbe ndị isi nchụaja na ndị Farisii ghọtara na okwu ndị a Jisọs kwuru bụ banyere ha, ha chọrọ ijide ya. Ma ha tụrụ oke egwu, nꞌihi na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ kweere na Jisọs bụ onye amụma. Jisọs tụrụ ilu dị iche iche iji kọwaa ihe alaeze eluigwe yiri. Nke a bụkwa ilu ọzọ: “Alaeze eluigwe dị ka otu nwoke bụ eze, nke kpọrọ oriri ọlụlụ nwụnye, nꞌihi ọkpara ya. Ọ kpọkwara ọtụtụ ndị mmadụ ka ha bịa oriri ahụ. Mgbe ọ kwadosịrị ihe oriri, o zipụrụ ndị ozi ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha nile achọghị ịbịa. Eze ahụ zipụkwara ndị ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Ihe nile dị na-eche unu, bịanụ ọsịịsọ.’ “Ma ndị ahụ nile a kpọrọ oriri chịrị ọchị, lefuo ya anya. Onye ọ bụla nꞌime ha jewere ime mkpa ya. Otu onye gara nꞌubi ya, nke ọzọ nꞌụlọ ahia ya. Ndị ọzọ tiri ndị ozi eze ahụ ihe, mee ha ihe ihere. Ụfọdụ gbukwara ndị ozi ahụ eze zitere. “Mgbe eze ahụ nụrụ ihe ha mere ndị ozi ya, o were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nꞌiyi, rechapụkwa obodo ha nꞌọkụ. Emesịa, ọ kpọrọ ndị na-ejere ya ozi si ha, ‘Edoziri m oriri ọlụlụ nwụnye a ma ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa rie ya ekwesịghị ugwu e nyere ha. Ugbu a, gaanụ nꞌakụkụ ụzọ nile, kpọbatanụ ndị nile unu hụrụ, ka ha bịa nꞌoriri ọlụlụ nwụnye a.’ “Ndị na-ejere eze ahụ ozi pụrụ gaa nꞌokporo ụzọ nile kpọbata mmadụ nile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ. Mgbe eze ahụ batara ileta ndị nile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwụnye. “Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nꞌebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwụnye?’ Nwoke ahụ mechiri ọnụ ya nꞌihi na o nweghị ihe ọ ga-asa. “Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ nwoke a eriri, aka na ụkwụ, wepụkwanụ ya, gaa tụnye ya nꞌime ọchịchịrị, ebe ọ ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze. Nꞌihi na ọ bụ ezie na a kpọrọ ọtụtụ mmadụ, ma ọ bụ mmadụ ole na ole ka a na-ahọrọ.’ ” Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka Jisọs kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya. Ha kpebiri iziga ụfọdụ mmadụ ndị si nꞌotu Herọd. Ndị a bịara jụọ ya ajụjụ a, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu. Ị na-ezikwa eziokwu, na-echeghị echiche ihe ọjọọ ga-adakwasị gị. Ị dịghị asọkwa onye ọ bụla anya, nꞌihi na ị dịghị ele mmadụ anya nꞌihu. Ugbu a anyị chọrọ ka ị gwa anyị, ò ziri ezi nꞌiwu ịtụ ụtụ nye Siza?” Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nꞌobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? Gosinụ m ego ụtụ unu.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ònye ka e sekwasịrị onyinyo ya nꞌelu ego a? Aha onye kwa dị nꞌokpuru onyinyo a?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe nile bụ nke ruuru Chineke.” Ọsịsa Jisọs nyere ha juru ha anya nke ukwuu. Nꞌihi ya ha hapụrụ ya pụọ, jeere onwe ha. Nꞌụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nꞌọnwụ adịghị, bịakwutere Jisọs ịghụ ya ọnụ. Ha gwara ya sị, “Onye ozizi, Mosisi kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọ bụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne nwoke ahụ ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ. Ụmụ ọ bụla nwanyị a mụtara site na di ọhụrụ ya ga-erite ihe nile nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwere. *** Ma ọ dị otu ezinụlọ ebe e nwere ụmụnne nwoke asaa. Nwoke nke mbụ lụrụ nwụnye, ma ọ nwụrụ na-amụtaghị nwa. Nꞌihi nke a nwanyị ahụ ghọrọ nwụnye nwanne ha nwoke nke abụọ. Nwanne ha nwoke nke abụọ nwụkwara na-amụtaghị nwa ọ bụla. Nke a mere ka onye nke atọ lụọ nwanyị ahụ. Otu a ka o dị, tutuu ruo mgbe nwanyị ahụ mesịrị bụrụ nwụnye ụmụnne nwoke asaa ahụ. Ugbu a, ajụjụ anyị bụ nke a, nꞌoge ahụ dị nꞌihu, mgbe a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilite dịrị ndụ ọzọ, nwụnye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a buzuru di ya mgbe ọ nọ nꞌụwa?” Jisọs zara ha sị, “Ihe mere unu ji na-ejehie ụzọ bụ nꞌihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere. Nꞌihi na mgbe e mere ka ndị mmadụ site nꞌọnwụ bilie, ịlụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌihi na mmadụ nile ndị a ga-adị ka ndị mmụọ ozi nꞌeluigwe. Ugbu a ka m nye unu ọsịsa banyere ajụjụ unu ma mbilite nꞌọnwụ ọ ga-adị. Ọ bụ na unu adịghị agụ ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ? Ùnu echetaghị na Chineke gwara unu okwu nꞌime ya sị, ‘Mụ onwe m bụ Chineke Eberaham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb.’ Ihe okwu Chineke a na-egosi bụ na Chineke abụghị Chineke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ Chineke ndị dị ndụ.” Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ ihe Jisọs zara ha, ozizi ya juru ha anya. Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na Jisọs emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha zukọtara ichepụta ajụjụ ọzọ ha ga-ajụ ya. Otu onye nꞌime ha bụ onye ozizi iwu bịara jụọ Jisọs ajụjụ iji nwaa ya sị, “Onye ozizi, olee iwu kachasị mkpa nꞌime iwu nile Mosisi nyere anyị?” Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu nke na-asị, ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nꞌanya site nꞌobi gị nile na site na mkpụrụ obi gị nile, na site nꞌụche gị nile.’ Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu nile. Iwu ọzọ na-eso nke a nꞌịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya.’ Iwu ndị ọzọ nile na ihe nile ndị amụma chọrọ ka unu mee dabeere nꞌebe iwu abụọ ndị a dị.” Mgbe ahụ ndị Farisii gbara ya gburugburu, Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị ka unu na-eche banyere Onye nzọpụta ahụ? Nwa onye ka ọ bụ?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devidi.” Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị mekwaranụ Devidi jiri kpọọ ya Onyenwe m, nꞌihi na Devidi sitere na ntụzi Mmụọ Nsọ kwuo sị, ‘Chineke gwara Onyenwe m okwu sị ya, nọdụ nꞌebe a nꞌakụkụ aka nri m tutuu ruo mgbe m mere ka ndị iro gị bụụrụ gị ihe idokwasị ụkwụ?’ Ọ bụrụ na Devidi kpọrọ ya Onyenwe anyị, oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?” Ha amakwaghị ihe ha ga-asa ya. Sitekwa nꞌoge ahụ, ọ dịghị onye ọ bụla jụrụ ya ajụjụ ọzọ. Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ nile na ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ndị ozizi iwu na ndị Farisii bụ ndị e nyere ike ịkọwa iwu Mosisi. Ya mere, meenụ ihe nile ha si unu mee. Ma nke kachasị nke, unu esokwala omume ha. Nꞌihi na adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekwu otu ihe ma na-eme ihe ọzọ. Ha na-ebokwasị unu iwu nke mmadụ na-apụghị idebe, ma ha onwe ha adịghị agbalị idebe iwu ndị a. “Ihe nile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ too ha. Ha na-ejegharị dị ka ndị dị nsọ. Leenụ ka igbe ha kekwasịrị nꞌegedege ihu ha na nꞌaka ha siri buo ibu. Igbe ebe ha tinyere amaokwu ha depụtara site nꞌakwụkwọ nsọ! Ha hụrụ ịnọdụ nꞌisi oche nꞌoge oriri nꞌanya. Ọ na-atọ ha ụtọ mgbe a na-ekele ha ekele pụrụ iche, nꞌakụkụ ụzọ ma ọ bụ nꞌahịa. Ọ na-atọkwa ha ụtọ mgbe a na-akpọ ha ‘Onye ozizi, Onye ozizi.’ Unu ekwela ka onye ọ bụ kpọọ unu aha dị otu a. Nꞌihi na ọ bụ nanị Chineke bụ onye ozizi unu nwere. Unu nile bụkwa ụmụnne. Ọ dịghị onye ka ibe ya ukwuu. Unu akpọkwala onye ọ bụla nꞌụwa a Nna, nꞌihi na ọ bụ nanị Chineke dị nꞌeluigwe ka unu nwere dị ka Nna unu. Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nꞌihi na ọ bụ nanị otu onyendu ka unu nwere, onye bụ Onye nzọpụta ahụ. “Onye dị ukwuu nꞌetiti unu kwesịrị ịbụ onye na-ejere unu ozi. Ma onye ọ bụla mere onwe ya onwe ukwu ka a ga-eweda nꞌala. Ma onye ọ bụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu. “Ahụhụ dịrụ unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha gasi bata nꞌalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata, unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ịbata. Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-eme dị ka ndị dị nsọ site nꞌikpe ogologo ekpere nꞌakụkụ ụzọ nile ka mmadụ hụ unu. Ma unu na-eripịa akụ dị nꞌụlọ ndị inyom di ha nwụrụ. Unu ga-anata ikpe ọmụma. *** Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-agbalsị ike nꞌụzọ nile, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee onye ahụ ka ọ jọọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ndu kpuru isi! Nꞌihi na unu na-asị, ‘Onye ọ bụla jiri ụlọ nsọ ukwu Chineke ṅụọ iyi, iyi ọ ṅụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọ bụla jiri ọlaedo dị nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ ṅụọ iyi kwesịrị imezu iyi ahụ ọ ṅụrụ.’ Ndị nzuzu kpuru isi! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ bụ ọlaedo ahụ, ka ọ bụ ụlọ nsọ ahụ e debere ya ime ya ka ọ bụrụ ihe dị nsọ? Unu na-ezikwa ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, iyi ahụ ọ nụrụ bụ ihe efu. Ma onye ọ bụla ga-eji onyinye dị nꞌelu ebe ịchụ aja ṅụọ iyi ga-emezu iyi ahụ ọ nụrụ.’ Leenụ ka unu si bụrụ ndị ìsì! Olee nke karịrị ukwuu? Ọ̀ bụ onyinye dị nꞌelu ebe ịchụ aja ka ọ̀ bụ ebe ịchụ aja na-edo onyinye ahụ nsọ? Ya mere, mgbe onye ọ bụla ji ebe ịchụ aja ṅụọ iyi, ọ bụ ebe ịchụ aja ahụ na onyinye dị nꞌelu ya ka o ji ṅụọ iyi ahụ. Otu a kwa, onye ji ụlọ nsọ ahụ ṅụọ iyi jikwa ụlọ nsọ ahụ na Chineke bi nꞌime ya na-aṅụ iyi. Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nꞌelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi. “Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri unu ruo nꞌakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nꞌubi unu, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na ikwesị ntụkwasị obi ihe dị mkpa. Ee, unu kwesịrị inye onyinye unu. Ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe kachasị mkpa. Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda inyinya! “Ahụhụ ga-adakwasị unu, ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-elezi anya nke ọma mee ka azụ iko mmiri unu, na azụ efere unu dị ọcha, ma ime ha jupụtara na ịpụnarị mmadụ ihe nꞌike na ọchịchọ ọjọọ nile. “Gị onye ìsì na-akpọ onwe gị onye Farisii! Buru ụzọ mee ka ime iko na efere gị dị ọcha, mgbe ahụ ha ga-adị ọcha ihu na azụ. “Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe mara mma, ma ime ha jupụtara nꞌọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe rere ure nile. Nꞌụzọ dị otu a, unu na-egosi ndị mmadụ onwe unu dị ka ndị dị nsọ, na ndị ezi omume, ma nꞌime obi unu, unu jupụtara nꞌihu abụọ na mmehie. “Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-ewu ili ndị amụma ahụ nna unu ha gburu, na-atụkwasị okoko osisi nꞌili ahụ e liri ndị ezi omume ahụ nna unu ha gburu. Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nꞌoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wụfuo ọbara ndị amụma. “Site nꞌokwu ọnụ unu unu na-ezipụta onwe unu na unu bụ ụmụ ndị ajọ omume ahụ gburu ndị amụma. Gaanụ sorokwa nzọ ụkwụ nna unu ha, ka unu rụzuo ọrụ ọjọọ ahụ ha malitere. Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe ịba nꞌọkụ ala mmụọ? “Ya mere, ana m agwa unu sị, aga m ezitere unu ndị amamihe nd ndị ozizi. Ụfọdụ nꞌime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nꞌobe. Ndị ọzọ kwa ka unu ga-eyipụ uwe ha, tie ha ihe otiti nꞌazụ, nꞌime ụlọ ekpere unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nꞌotu obodo gaa nꞌobodo ọzọ. Ka ọgbọ a bụrụ ndị ikpe mara nꞌihi ọbara ndị amụma Chineke nile unu kwafuru, site nꞌọbara Ebel ruo na nke Zakaraya nwa Barakaya, onye unu gburu nꞌetiti ụlọ nsọ na ebe ịchụ aja unu. Nꞌezie, asị m unu, ikpe banyere ihe ndị a nile, nke na-amụba site nꞌoge gara aga, ga-abịakwasị ọgbọ a. “Oo Jerusalem, Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma, na nke na-atụ ndị nile Chineke ziteere gị nkume. Ugbu ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị ọnụ dị ka nne ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya nꞌokpuru nku ya ichebe ha, ma ị chọghị ka m mee otu a! Lee ugbu a, a ga-ahapụrụ gị ụlọ gị ka ọ tọgbọrọ nꞌefu! Nꞌihi na asị m gị, na ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ tutuu ruo mgbe i jikeere ịnabata m na ịsịkwa, ‘Ngọzi na-adịrị onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị.’ ” Mgbe Jisọs si nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ahụ na-apụta, ndị na-eso ụzọ ya duruu ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọ nsọ ukwu ahụ. Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu hụrụ ụlọ ukwu a? Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nꞌelu ibe ya.” Mgbe ọ nọdụrụ ala nꞌelu ugwu olivu, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị kwa ga-abụ ihe ga-egosi anyị na oge i ji alọghachi na ọgwụgwụ ụwa eruola?” Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu. Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa ndị ga-asịkwa, ‘Abụ m Onye nzọpụta ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ọzọ. Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nꞌihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha egosighị na oge nlọghachi m eruola. Obodo ga-alụso obodo ibe ya ọgụ, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; ọke ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa nꞌọtụtụ ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a nile bụ nanị mmalịte ịta ahụhụ nke ga-abịa. “Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-ejide unu nyefee unu nꞌaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbu ụfọdụ nꞌime unu, meekwa ndị ọzọ ka ha bụrụ ọdịndụ ọnwụkamma. Elu ụwa nile ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m. Ọtụtụ ga-ada site nꞌokwukwe ha nꞌoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha maa nꞌọnya, kpọọkwa ibe ha asị. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ nꞌokwukwe ha. Mmehie ga-aba ụba nꞌebe nile, mee ka ịhụnanya ndị mmadụ nꞌebe ibe ha nọ jụọ oyi nke ukwuu. Ma ndị nwere ntachi obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. “A ga-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke nꞌebe nile ụwa sọtụrụ, nꞌụzọ onye ọ bụla ga-anụ ya. Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ oge ga-abịa nꞌikpeazụ. “Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe unu na-ahụbeghị mbụ, nke e kwuru okwu ya site nꞌọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nꞌebe nsọ, (onye na-agụ tụgharịa uche ghọta ihe ọ pụtara), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia were ọsọ gbalaga nꞌelu ugwu. Ka ndị nọ nꞌelu ụlọ hapụ ịrịdata ịbanye nꞌime ụlọ ha ịkwapụta ngwongwo ha, tupuu ha amalite ịgbalaga nꞌelu ugwu. Ka ndị nọ nꞌubi hapụ ịlọghachi nꞌụlọ ha ịchịrị uwe ha. “Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụ ara nꞌụbọchị ahụ. Kpeerenụ Chineke ekpere ka unu ghara ịgba ọsọ a nꞌoge oke oyi, ma ọ bụ nꞌụbọchị izuike. Nꞌihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ. “Nꞌezie, ọ bụ nanị ma e mere ka ụbọchị ahụ dị mkpụmkpụ, ma ọ bụghị otu a, mmadụ nile ga-ala nꞌiyi. Ma Chineke ga-eme ka ha dịrị mkpụmkpụ nꞌihi ndị ya ọ họpụtara. “Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Ahụrụ m Onye nzọpụta ahụ, ọ nọ nꞌebe a, ma ọ bụ nꞌebe ọzọ’ unu ekwela. Nꞌihi na ndị ga-asị na ha bụ Onye nzọpụta, ha na dị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe ịtụnanya dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ gaara ekwe mee, ha ga-esite nꞌọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ Chineke họpụtara. Chetakwanụ na agwala m unu ihe ndị a nile, tupuu ha emezuo. “Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu na Onye nzọpụta abịala, na ọ nọ nꞌime ọzara, ma ọ bụ na ọ dị ebe o zoro onwe ya, unu ekwela. Nꞌihi na mụ, bụ Nwa nke mmadụ, ga-abịa dị ka amụma eluigwe, nke a na-ahụ anya site nꞌọwụwa anyanwụ ruo nꞌọdịda anyanwụ. Chetakwanụ na ebe ọ ụla ozu dị ebe ahụ ka udele na-ezukọta. “Ngwangwa, mgbe mkpagbu nke ụbọchị ahụ nile gabigasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè na mbara eluigwe. Ndị nile nọ nꞌụwa ga-eru uju nꞌụbọchị ahụ, mgbe mba dị iche iche ga-ahụ m, ka m na-abịa nꞌike na ebube, site nꞌime igwe ojii nke eluigwe. *** Aga m ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke eluigwe na ụwa. “Ugbu a mụtanụ ihe site nꞌosisi fiigi. Mgbe ọ bụla alaka ya jupụtara nꞌahịhịa ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso. Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a nile ka ha na-eme marakwanụ na anọ m nso, na ọbịbịa m dị nnọọ nso. Ihe ndị a nile aghaghị imezu tupuu ọgbọ a agabiga. “Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m nile ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. “Ma o nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ahụ, ma ọ bụ oge mgbe ọgwụgwụ ihe nile ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi amaghị ya. Ọkpara Chineke amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna ya maara. “Ọbịbịa m ga-adị ka ihe mere nꞌoge Noa. Nꞌoge ahụ ndị bi nꞌụwa ga na-ebi ndụ ha. Ha ga na-akpọkwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ụfọdụ ga na-alụ di na nwụnye ha dị ka ọ dị nꞌoge Noa. Ma na mberede, oke mmiri ahụ bịakwasịrị ha, ma Noa banyere nꞌime ụgbọ mmiri ya. Ndị mmadụ ekwenyeghị na ọ dị ihe ga-eme tutuu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha nile. Otu ahụ ka ọbịbịa m ga-adị. “Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nꞌubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ. Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka ha nꞌụlọ igwe na-akwọ ọka, a ga-ewepụ otu, ma hapụ nke ọzọ. Nꞌihi nke a, na-echenụ nche, nꞌihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. “Dị ka nna nwe ụlọ pụrụ isi gbochie ndị ohi ka ha ghara igbuka ụlọ ya site nꞌịnọ na nche abalị nile, otu a ka unu onwe unu pụrụ isi gbanarị nsogbu site nꞌịnọgide na nche oge nile, nꞌihi na unu amaghị oge m ga-abịa. “Ị̀ bụ ohu ahụ maara ihe, nke kwesịkwara ntụkwasị obi, onye e mere onyeisi ezinụlọ m, ka ị na-enye ụmụntakịrị m nri nꞌoge ha chọrọ ya? Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, ma ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ gị nꞌeziokwu mgbe m ga-alọghachi. Nꞌezie, aga m eme gị onyeisi ihe nile m nwere. “Ma ị bụrụ ohu nke na-asị nꞌobi ya, ‘Onyenwe m ga-anọ tee anya tupuu ọ lọta’, ị malite na-eti ndị ohu ibe gị ihe, sorokwa ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-eri, na-aṅụkwa, Onyenwe gị ga-alọta nꞌụbọchị ị na-atụghị anya ya. Ọ ga-etikwa gị oke ihe otiti, zipụ gị ka e kpee gị ikpe dị ka onye ihu abụọ. Nꞌebe ahụ ka ị ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze.” “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere iheọkụ ha pụta izute onye na-alụ nwụnye ọhụrụ. Ise nꞌime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. Ise ndị nzuzu ahụ weere iheọkụ ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ ga-ezuru ha. Ise ndị maara ihe wụjuru mmanụ nꞌiheọkụ ha, ma tinyekwara onwe ha karama mmanụ ọkụ ọzọ. “Mgbe onye na-alụ nwụnye ọhụrụ ahụ nọrọ tee anya nꞌọbịbịa ya, ụmụ agbọghọ nile ahụ dinara ala rahụ ụra. Nꞌetiti abalị e tiri mkpu nꞌoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwụnye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’ “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ nile biliri mụnye ọkụ ha. Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nꞌime mmanụ ọkụ unu, lee na iheọkụ anyị na-anyụ anyụ.’ “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Ọ̀ dịghị! Mmanụ ọkụ anyị nwere adịghị ukwuu, ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ nꞌebe a na-ere mmanụ ọkụ zụrụ nke ga-ezuru unu.’ “Ụmụ agbọghọ ndị nzuzu ahụ gara. Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwụnye ọhụrụ bịarutere. Ụmụ agbọghọ ndị jikeere ejike gara zute ya, sorokwa nꞌoriri ọlụlụ nwụnye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ. “Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri guzo nꞌezi kụọ aka nꞌụzọ, kpọọkwa oku sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ!’ “Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Amaghị m ndị unu bụ.’ “Ya mere, na-anọgidenụ na che, nꞌihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, ma ọ bụ oge ahụ m ga-alọghachi. “A ga-ewerekwa alaeze eluigwe tụnyere akụkọ otu nwoke chọrọ ịga obodo ọzọ. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya nile nye ha ego nꞌotu nꞌotu, ka ha jiri ya malite ịzụ ahịa tutuu ruo mgbe ọ ga-alọta. “O nyere ohu ya nke mbụ narị naịra ise. Ohu nke abụọ ka o nyere narị naịra abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu narị naịra. O nyere ha nꞌotu nꞌotu dị ka ike ha ha. Mgbe o mesịrị otu a, ọ hapụrụ ha gaa ije ya. Ohu ahụ natara narị naịra ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o ritere narị naịra ise ọzọ nꞌuru. Otu a kwa, onye nke e nyere narị naịra abụọ zụpụtakwara narị naịra abụọ ọzọ nꞌuru. “Ma ohu ahụ natara otu narị naịra gara gwuo ala lie ya, nꞌihi ichezi ya nke oma. “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ha ukwu lọtara site nꞌije ya. Ọ kpọkọtara ha nile ka ha gụzie ego ya. Nwoke ahụ o nyere narị naịra ise batara wetakwa narị naịra ise ọzọ. Ọ gwara nna ya ukwu sị, ‘I nyere m narị naịra ise, ma ugbu a azụpụtala m narị naịra ise ọzọ.’ “Nna ya ukwu toro ya, nꞌihi ọrụ ọma ọ rụrụ sị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga na-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro m ṅụrịa ọṅụ.’ “Onye nke e nyere narị naịra abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m narị naịra abụọ. Lee nꞌebe a, azụpụtala narị naịra abụọ ọzọ nꞌuru.’ “Nna ya ukwu sịrị, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’ “Onye e nyere otu narị naịra batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nꞌebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nꞌebe ị na-agbasaghị. Atụrụ m egwu gị, nꞌihi na amaara m onye ị bụ. Ya mere eweere m ego gị liere gị nꞌala. Lee ya nꞌebe a!’ “Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ! Ị maara na m na-ewe ihe ubi nꞌebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nꞌebe m na-agbasaghị. Ị gaara etinye ego m nꞌaka ndị na-eche ego, ndị gaara akwụghachi ya na ụma ya. Napụtanụ ya narị naịra ahụ o ji, ma were ya nye nwoke ahụ ji narị naịra ise! Nꞌihi na nwoke ahụ na-ejizi ihe e nyere ya ka a ga-enye ihe ọzọ. Ọ ga-enwebigakwa ihe oke. Ma site nꞌaka nwoke ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka a ga-anapụ, ọ bụladị ihe nta ahụ e nyere ya. Chụpụnụ ohu ọjọọ a na-abaghị uru nꞌọchịchịrị ebe ọ ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze ya.’ “Mgbe mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube m, mụ na ndị mmụọ ozi nile dị nsọ, mgbe ahụ ka m ga-anọ nꞌelu ocheeze ebube m. Mba nile nke ụwa ga-ezukọtakwa nꞌihu m. M ga-ekewapụta ha, otu obodo site nꞌibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụta ụmụ atụrụ site nꞌụmụ ewu. M ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nꞌakụkụ aka nri m, ma ụmụ ewu ga-anọ nꞌaka ekpe m. “Mgbe ahụ, mụ bụ eze, ga-asị ndị nọ nꞌaka nrị m, batanụ nꞌime alaeze m, unu ndị Nna unu gọziri agọzi. Batanụ nꞌime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. Nꞌihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nrị. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m mmiri ọṅụṅụ. Mgbe m na-agba ọtọ, unu zụtara uwe nye m, mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nꞌụlọ mkpọrọ unu bịara leta m. *** “Ndị ezi omume ahụ ga-ajụ m sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị nꞌime ụlọ anyị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị na-agba ọtọ anyị enye gị uwe? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nꞌọrịa, ma ọ bụ nꞌụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ “Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ. “Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. Nꞌihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọ bụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. Mgbe m nọ dị ka ọbịa unu akpọbataghi m nꞌulo unu, mgbe m na-agba ọtọ unu enyeghị m uwe ka m kpuchie ọtọ m. Mgbe ahụ na-esighị m ike unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m. “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, ma ọ bụ oge ị bụ onye ọbịa, ma ọ bụ oge ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ oge ị nọ nꞌọrịa, ma ọ bụ ị nọ nꞌụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ “M ga-aza ha sị, eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nꞌime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ inyere aka. “Ndị a ga-aba nꞌita ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Dị ka unu maara nke ọma, mmemme ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nꞌoge ahụ a ga-ararakwa m nye ka a kpọgide m nꞌobe.” Nꞌoge ahụ, ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu, na ndị okenye ndị Juu zukọtara nꞌime ụlọ Kaịfas onyeisi nchụaja. Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya. Ha kwekọrịta sị, “Anyị agaghị egbu ya tutuu mmemme ngabiga agafechaa, ka ọ hapụ iweta ọgba aghara nꞌetiti ndị bịara maka mmemme ahụ.” Jisọs jere Betanị, banye nꞌụlọ nwoke a na-akpọ Saịmọn, onye ekpenta. Mgbe ọ nọ na-eri nri nꞌebe ahụ, otu nwanyị batara nꞌime ụlọ ahụ. O ji karama mmanụ otite dị oke ọnụ ahịa nꞌaka ya. O meghere mmanụ ahụ wụọ ha nile nꞌisi Jisọs. Ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe nwanyị a mere wee iwe nke ukwuu nꞌihi ya. Ha sịrị, “Nke a bụ nnọọ itufu ego! A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara nyere ndị ogbenye aka.” Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nꞌobi ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ata nwanyị ụta? Ọ̀ bụ nꞌihi na ọ na-emere ihe ọma? Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge nile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe nile. Ihe nwanyị a mere, ịwụ m mmanụ a nꞌahụ, bụ idozi ahụ m nꞌihi olili nke a ga-eli ya. Nꞌezie, ana m agwa unu sị, na ebe ọ bụla e zisara ozi ọma a nꞌuwa nile, a ga na-echeta nwanyị a nꞌihi ihe ọma a o meere m.” Mgbe ahụ otu nꞌime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Juda Iskariọt, jekwuuru ndị isi nchụaja. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ego ole ka unu ga-akwụ m ma ọ bụrụ na m arara Jisọs nye nꞌaka unu?” Ha kwekọrịtara kwụọ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Site nꞌụbọchị ahụ, Judas chọgidesịrị ohere ike ịrara Jisọs nye nꞌaka ha. Nꞌụbọchị mbụ nke mmemme ngabiga, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị nọrọ dozie ihe nꞌihi oriri anyị?” Jisọs zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nꞌime obodo sị ya, Onye ozizi anyị sịri na oge m abịala. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri mmemme ngabiga anyị nꞌụlọ gị.” Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka ọ gwara ha, doziekwa oriri anyasị ahụ nꞌebe ahu. Nꞌanyasị ụbọchị ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala na-eri oriri ahụ. Mgbe ha na-eri nri, Jisọs kwuru sị, “Ana m agwa unu eziokwu, otu onye nꞌime unu ga-arara m nye nꞌaka ndị ga-egbu m.” Okwu a wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu. Ha malitere ịjụ ya nꞌotu nꞌotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m? Ọ bụ m?” Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-erikọ nri nꞌotu efere. Lee na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-anwụ dị ka e si buo ya nꞌamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esite nꞌaka ya rara m nye nꞌaka ndị ga-egbu m. Ọ gaara akara ya onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” Judas, onye ahụ ga-arara ya nye biliri ọtụ jụọ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Jisọs zara sị, “Ee, ọ bụ gị.” Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe beredi gọzie ya. Ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ beredi a rie, nꞌihi na nke a bụ anụ ahụ m.” Mgbe ahụ kwa, ọ naara iko mmanya vaịnị nye Chineke ekele nꞌihi ya, nyekwa ha ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu nile ṅụọnụ site nꞌiko a. Nꞌihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya nꞌihi mgbaghara mmehie ọtụtụ mmadụ. Ana m agwa unu eziokwu mgbe m na-asị na agaghị m aṅụ mmanya a ọzọ tutuu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nꞌụzọ dị iche nꞌalaeze Nna m.” Mgbe ha bụsịrị abụ, ha sitere nꞌebe ahụ pụọ gawa nꞌelu ugwu olivu. Nꞌebe ahụ ka Jisọs nọ gwa ha okwu sị, “Nꞌabalị taa unu ga-agba ọsọ hapụ nanị m. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Aga m egbu onye ọzụzụ atụrụ ahụ, mee ka igwe atụrụ ya gbasasịa.’ Ma mgbe e mere ka m si na ndị nwụrụ anwụ bilie, aga m aga Galili izute unu nꞌebe ahụ.” Pita jiri oke olu kwuo okwu sị, “Ọ bụrụ na mmadụ nile ahapụ gị gbalaa, agaghị m ahapụ gị.” Jisọs gwara ya sị, “Nꞌabalị taa, tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa nꞌisi ụtụtụ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Ma Pita nọgidesịrị ike nꞌokwu ya sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ agaghị m agọnarị gị.” Ndị na-eso ụzọ ya nile kwuru otu ihe ahụ. Mgbe Jisọs bịara nꞌogige ahụ a na-akpọ Getsamane, ọ gwara ndị na-eso ụzọ okwu sị ha, “Nꞌọdụnụ nꞌebe a ka m gaa nꞌihu nke nta kpee ekpere.” Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ, Jemes na Jọn. Ọ malitere inwe obi mwute nꞌime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri. Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi ruo nꞌọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nꞌebe a soro m na-eche nche.” Ọ gara nꞌihu nke nta daa nꞌala, kpuo ihu ya nꞌala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị uche m ka m chọrọ ka o mee, kama ka e mee ihe ị na-achọ.” Mgbe ọ lọghachiri nꞌebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, ọ hụrụ ha ka ha nọ na-arahụ ụra. Ọ kpọrọ Pita sị ya, “Gịnị mere unu mmadụ atọ enweghị ike soro m chee nche, ọ bụladị nwa oge nta? Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka ọnwụnwa ghara imeri unu. Nꞌihi na site nꞌime mmụọ m ọ na-agụ m agụụ imezu uche Chineke, ma anụ ahụ m adịghị ike ịnagide ya.” Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya ka e mee uche gị.” Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arahụ ụra, nꞌihi na ha enweghị ike ighewe anya ha oghe. Jisọs hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ. Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara ha okwu sị, “Unu nọrịrị na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Mbaa! Lee, oge ahụ abịala! Oge a ga-arara m nye nꞌaka ndị mmehie. Bilienụ ka anyị na-aga nꞌihu! Lee, nwoke ahụ na-arara m nye na-abịa ugbu a!” Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nꞌime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndị isi nchuaja na ndị okenye ndị Juu nile zitere ha. Judas agwala ha rị na nzuzo sị, “Nwoke ahụ m ga-esutu ọnụ bụ onye unu na-achọ, jidesienụ ya aka ike!” Ya mere, mgbe Judas bịaruru, ọ bịakwutere Jisọs sị ya, “Ekele, onye ozizi!” O sutukwara ya ọnụ. Jisọs zara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ ndị ahụ ha na Judas so bịara jide Jisọs nꞌike. Otu onye nꞌime ndị ha na Jisọs nọ mịpụtara mma agha ya jiri ya bipụ ntị ohu onyeisi nchụaja. Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nꞌọbọ ya, nꞌihi na mmadụ ọ bụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya, ga-anwụ site na mma. I cheghị na m pụrụ ịkpọ Nna m oku ka o zitere m igwe ndị mmụọ ozi, ka ha bịa napụta m? Ọ bụrụkwanụ na m emee otu a, a ga-esi aṅaa mee ka ihe akwụkwọ nsọ kwuru mezuo? Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ihe ndị a na-eme ugbu a aghaghị imezu otu a.” Mgbe ahụ Jisọs jụrụ igwe mmadụ ahụ ajụjụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na osisi bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọ m ziekwa ihe nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m. Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo.” Nꞌoge ihe ndị a nile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya nile hapụrụ ya gbalaga. Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nꞌụlọ Kaifas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nꞌebe ahụ. Pita sogidere Jisọs nꞌazụ site nꞌebe dị anya. O rutere nꞌobi onyeisi nchụaja, baa nꞌime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwee ike ịhụ ihe ha ga-eme Jisọs. Ndị isi nchụaja, ndị okenye na ndị ụlọ ikpe ndị Juu gbalịsiri ike ịchọpụta ebubo ụgha dị iche iche ha ga-ebo Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ma ha achọtaghị ihe ọ bụla. Ọ bụ ezie na ha chọtara ọtụtụ mmadụ ndị gbalịrị ibo ya ebubo ụgha. Nꞌikpeazụ nanị mmadụ abụọ nọgidesịrị ike kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọ nsọ ukwu Chineke, wughachikwa ya nꞌụbọchị atọ.’ ” *** Onyeisi nchụaja biliri ọtọ jụọ Jisọs sị, “I nweghị ihe ọ bụla ị ga-ekwu banyere ebubo ndị a ha na-ebo gị?” Ma Jisọs ekwụghị ihe ọ bụla. Onyeisi nchụaja jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị, “Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, gwa anyị, ị bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke?” Jisọs zara ya sị, “Ee, abụ m ya. Nꞌezie asị m unu, na mgbe na-adịghị anya, unu ga-ahụ m, bụ Onye nzọpụta ahụ, ka m na-anọdụ nꞌaka nri Chineke. Unu ga-ahụkwa m mgbe m ga-abịa nꞌigwe ojii nke eluigwe.” Mgbe o kwusịrị okwu a, onyeisi nchụaja dọwara uwe o yi nꞌahụ nꞌiwe, kwụo sị, “O kwuluola Chineke! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara ajọ okwu sị ya nꞌọnụ pụta? Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “Ikpe mara ya, o kwesịrị ka ọ nwụọ!” Mgbe ahụ ha malitere ịbụ ya ọnụ mmiri nꞌihu, na iti ya oke ihe otiti. Ndị ji ọbụaka ha tie ya ihe jụrụ ya sị, “Ị bụrụ onye amụma nꞌezie, bụrụkwa Onye nzọpụta ahụ, kpọọ aha onye tiri gị ihe.” Mgbe ihe ndị a na-eme, Pita nọ nꞌime obi onyeisi nchụaja ahụ. Otu nꞌime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịakwutere ya sị ya, “Ị bụkwanụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.” Ma Pita gọrọ nꞌihu ha nile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” O biliri ọtọ si nꞌebe ahụ pụọ. Mgbe ọ pụrụ nꞌezi, nwagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nwoke nọ nꞌebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret anọkọkwaala.” Ọzọ kwa Pita weere ịṅụ iyi gọọ sị, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.” Mgbe oge nta gasịrị, ndị nwoke guzo nꞌebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nꞌezie, ị bụ otu nꞌime ha. Anyị esitela nꞌasụsụ ị na-asụ ghọta na ị bụ onye Galili.” Pita malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a ma ọlị.” Mgbe ahụ kwa oke ọkụkọ kwara akwa. Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O siri nꞌebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu. Nꞌisi ụtụtụ echi ya, ndị isi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zukọtara. Ha chepụtara ụzọ kachasị mma ha nwere ike isi kwagide Pailet ka ọ maa Jisọs ikpe ọnwụ. Ha tụrụ Jisọs mkpọrọ igwe duru ya nyefee ya Pailet nꞌaka. Pailet bụkwanụ onye nọchiri anya ọchịchị ndị Rom nꞌakụkụ Judia nile nꞌoge ahụ. Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, nụrụ na a mara Jisọs ikpe ọnwụ, o chigharịrị weghachikwara ndị isi nchụaja na ndị okenye ego ahụ ha kwụrụ ya. Ọ gwara ha sị, “Emehiela m, nꞌihi na araara m nwoke na-emeghị ihe ọjọ ọ bụla nye nꞌaka ọnwụ.” Ma ha zara ya sị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ ihe dịrị gị.” Judas tụnyere ego ahụ ha kwụrụ ya nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, pụọ gaa kwụgbuo onwe ya. Ndị isi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nꞌime ụlọ ego anyị, nꞌihi na ọ bụ ego ọbara.” Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara iwere ego ahụ zụta ala nꞌaka otu ọkpụite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa. Nke a mere e ji akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara” ruo taa. Nꞌụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nꞌọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. Nꞌihi na Jeremaya kwuru sị, “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ bụ ọnụ ahia ụmụ Izirel kpebiri na ha ga-akwụ nꞌisi onye ahụ. Ha ji ego ahụ zụọ ala onye ọkpụite, dị ka Onyenwe anyị buru ụzọ gwa m.” Nꞌoge a Jisọs guzo nꞌihu Pailet onye na-achị Judia nile. Pailet jụrụ ya ajụjụ sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs zara sị ya, “Ee, abụ m ya.” Mgbe ndị isi nchụaja na ndị okenye boro Jisọs ebubo ụgha, Jisọs ekwughị ihe ọ bụla iji gọrọ onwe ya. Ya mere, Pailet jụrụ ya sị, “Ị naghị anụ ihe ndị a nile ha na-ebo gị?” Ma Jisọs ekwughị otu mkpụrụ okwu. Nke a juru Pailet anya nke ukwuu. Nꞌoge mmemme ngabiga ọ bụla, ọ bụ omenala na onyeisi ọchịchị obodo na-ahapụrụ ndị Juu otu onye mkpọrọ ndị Juu chọrọ. Ma nꞌoge a e nwere otu nwoke nọ nꞌụlọ mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara, onye aha ya bụ Barabas. Mgbe ndị Juu nile zukọrọ, Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ̀ bụ Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Onye nzọpụta?” Nꞌihi na Pailet maara nke ọma na ndị isi ndị Juu raara Jisọs nye nꞌaka ya site nꞌekworo. Mgbe Pailet nọkwasịrị nꞌelu oche ikpe ya, nwụnye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nꞌisi nwoke ọma ahụ. Nꞌihi na ahụjuru m anya na nrọ nꞌabalị gara aga nꞌihi ya.” Ma ndị isi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọọ Pailet ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya. Pailet jụkwara ha ọzọ sị, “Nꞌime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha nile jiri otu olu sị ya, “Barabas!” Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m jiri Jisọs Onye nzọpụta mee?” Ha nile tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Kpọgide ya nꞌobe!” Pailet jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe ọjọọ o mere?” Ma ha nọgidesịrị ike na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe! Kpọgide ya nꞌobe!” Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọzọ ọ pụrụ ime o kpebiri imere ha ihe ga-eme ka ọgba aghara hapụ ịmalite nꞌetiti ha. O weere mmiri kwọọ aka ya nꞌihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nꞌebe ọbara nwoke a dị. Ihe ọ bụla unu mere ya dị unu nꞌisi.” Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nꞌotu olu sị, “Ee! Ka ọbara ya dị nꞌisi anyị na nꞌisi ụmụ anyị!” Mgbe ahụ Pailet hapụụrụ ha Barabas. Mgbe o tisiri Jisọs ihe o weere ya nyefee nꞌaka ndị agha Rom ka ha kpọgide ya nꞌobe. Ihe isi mbụ ndị agha mere bụ iduru Jisọs baa nꞌebe ndị agha bi. Nꞌebe ahụ ndị agha nile gbara ya gburugburu. Ha yipụrụ Jisọs uwe ya, yikwasị ya uwe na-acha uhie uhie. Ha chịkọtara alaka osisi nwere ogwu kpaara ya okpu. Ha yikwasịrị ya okpu ogwu ahụ nꞌisi, ka ọ bụrụ okpu eze ya. Ha tinyekwara ya osisi nꞌaka, ka ọ bụrụ mkpa nꞌaka eze ya. Mgbe ha mechara ihe ndị a, ha gburu ikpere nꞌala nꞌihu ya. Nꞌọnọdụ ịkwa ya emu ha kelere ya sị ya, “Ka eze ndị Juu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!” Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri, narakwa ya osisi ahụ tie ya nꞌisi. Mgbe ha mechara Jisọs ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ na-acha uhie uhie, yikwasịkwa ya uwe nke aka ya. Ha duuru ya pụọ, ịkpọgide ya nꞌobe. Mgbe ha du ya na-aga nꞌụzọ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini nke dị nꞌime Afirika. Aha nwoke a bụ Saịmọn. Ndị agha ahụ kwagidere Saịmọn ka o buru obe Jisọs. Emesịa, ha bịarutere nꞌebe a na-akpọ Golgota, nke pụtara, Ebe okpokoro isi. Nꞌebe ahụ ka ndị agha ahụ nyere Jisọs mmanya a gwara ọgwụ ka ọ ṅụọ. Mgbe Jisọs detụrụ ya ire, ọ jụrụ ịṅụ ya. Nꞌikpeazụ, ha kpọgidere Jisọs nꞌelu obe. Ndị agha ahụ fere nza nke ha jiri kee uwe ya nꞌetiti onwe ha. Mgbe ha mesịrị nke a, ha nọgidere nꞌebe ahụ na-eche ya nche. Nꞌelu obe ahụ ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere: Onye a bụ Jisọs eze ndị Juu. Ha kpọgidekwara mmadụ abụọ ọzọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nꞌike nꞌobe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌakụkụ aka nri Jisọs. Onye nke ọzọ nꞌakụkụ aka ekpe ya. Ndị mmadụ si ebe ahụ a kpọgidere Jisọs nꞌobe na-agafe nọgidere na-ekwulu ya. Ha na-ekwe nꞌisi na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọ nsọ ukwu Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nꞌelu obe ahụ rịdata!” *** Ndị isi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme Jisọs ihe ọchị, na-asị ya, “Ọ na-azọpụta ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ị bụkwaghị eze ndị Juu? Ọ dị mma, si nꞌelu obe rịdata, anyị ga-ekwerekwa na ị bụ Onye nzọpụta. Ọ na-atụkwasị Chineke obi, na-asị na ya bụ Ọkpara Chineke. Ka anyị leenụ ma Chineke ọ ga-azọpụta ya ugbu a!” Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na Jisọs nꞌobe nọkwa na-akparị ya. Nꞌụbọchị ahụ, site nꞌelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nꞌelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachiri obodo Jerusalem nile. Nꞌoge dị ka elekere anọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Elai, Elai, lama sabaktani!” Nke a pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ nanị m nꞌebe a?” Ụfọdụ ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ nụrụ mkpu akwa a sị na ọ bụ Ịlaija ka ọ na-akpọ ka ọ bịa nyere ya aka. Nꞌotu oge ahụ kwa otu onye nꞌime ha gbaara ọsọ were ọza detu ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nꞌosisi, welie ya elu, ime ka Jisọs miri ya ṅụọ. Ma ndị ọzọ sịrị, “Cherenụ ka anyị lee ma Ịlaija ọ ga-abịa ịzọpụta ya.” Mgbe Jisọs jiri oke olu tie mkpu ọzọ, o kubiri ume, nwụọ. Nꞌotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi e ji kebichie ebe nsọ site nꞌebe kachasị nsọ nke ụlọ nsọ ukwu Chineke, gbawara site nꞌelu ruo nꞌala. Ọtụtụ ili meghere. Ọtụtụ ụmụ Chineke, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nꞌọnwụ bile. Mgbe Jisọs sitere nꞌọnwụ bile, ndị ahụ sitere nꞌọnwụ bilie hapụrụ ili ha bata Jerusalem. Ọtụtụ ndị mmadụ hụkwara ha. Mgbe ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị agha ya nọ nꞌebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe nile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nꞌezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!” Ọ dị ọtụtụ ụmụ nwanyị si Galili soro Jisọs na-enyere ya aka. Ha nọ ebe dị anya na-ele ya anya nꞌelu obe. Nꞌime ha bụ Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Josef, na nne Jemes na Jọn bụ ụmụ Zebedi. Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya si Arimatia aha ya bụ Josef, onye bụkwa otu nꞌime ndị na-eso Jisọs, jekwuuru Pailet rịọọ ya ka e bunye ya ozu Jisọs. Pailet nyere ike ka e were ozu Jisọs nye Josef. Josef buuru ozu Jisọs, were ezi akwa ọcha na-enwu enwu kee ya. O nyibere ya nꞌili nke aka ya, bụ nke o gwuru ọhụrụ nꞌime nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kwachie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa. Meri Magdalini na Meri nke ọzọ nọdụkwara ala na-ele ili ahụ anya. Nꞌechi ya, nke bụ abalị isii nꞌizu ụka, ndị isi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet. Ha gwara Pailet sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nꞌọnwụ bile mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị chee ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ahụ ya. Ka ha ghara ịsịkwa na o sitela nꞌọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.” Pailet zara ha sị, “Werenụ ndị nche unu, ndị na-eche nche nꞌụlọ nsọ ukwu unu, ka ha gaa chezie ili ahụ dị ka unu si chọọ.” Ya mere, ha gara mechizie ọnụ ili ahụ nꞌụzọ dị iche iche. Ha kakwasịrị akara dị iche iche nꞌelu nkume ahụ. Ndị agha guzokwara nꞌakụkụ ya nile na-eche nche. Nꞌisi ụtụtụ Sọnde, mgbe chi na-abọ nke nta nke nta, Meri Magdalini na Meri nke ọzọ, gara ile anya nꞌili ahụ. Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nꞌeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ e nyibere Jisọs, nọkwasịkwa nꞌelu ya. Ihu mmụọ ozi ahụ na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka ogho. Mgbe ndị na-eche ili ahụ nche hụrụ mmụọ ozi a ha tụrụ oke egwu. Ha makwara jijiji, daa nꞌala, nọọ dị ka ndị nwụrụ anwụ. Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ okwu sị ha, “Unu atụla egwu, nꞌihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nꞌelu obe ka unu na-achọ. Ọ nọkwaghị nꞌebe a. O sitela nꞌọnwụ bilie, dị ka ọ gwara unu. Bịanụ lee ebe ha nyibere ahụ ya mgbe ha bubatara ya na mbụ. Gaanụ ngwangwa mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata na o sitela nꞌonwụ bilie. O burula unu ụzọ gaa Galili. Ebe ahụ kwa ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.” Ụmụ nwanyị ahụ jiri oke egwu na ọṅụ gbara ọsọ gaa izi ndị na-eso ụzọ Jisọs ozi a mmụọ ozi ahụ ziri ha. Mgbe ha na-aga nꞌụzọ, na mberede, Jisọs zutere ha sị ga, “Ndeewonụ!” Ha nile dara nꞌala nꞌihu ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isi ala nye ya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Kama gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nꞌebe ahụ.” Mgbe ụmụ nwanyị ahụ nọ nꞌụzọ na-alọghachi, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nꞌime obodo. Ha gara kọọrọ ndị isi nchụaja ihe nile mere. Emesịa, ndị isi nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ego, ka ndị agha ahụ ghaa ụgha sị na ha na-arahụ ụra nꞌabalị ahụ mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs bịara buru ozu ya. Ha kwekwara ndị agha ahụ nkwa sị, “Ọ bụrụ na onyeisi ọchịchị obodo anụ ihe mere, anyị bụ ndị isi nchụaja na ndị okenye obodo ga-anọchite anya unu nꞌihu ya. Unu echegbula onwe unu, nꞌihi na ihe nile ga-adịcha mma.” Ya mere, ndị agha ahụ naara ego e nyere ha. Ha pụrụ kọkwaara ndị Juu nile ihe ndị isi nchụaja na ndị okenye gwara ha. Ụgha ahụ ha ghara gbasara nꞌala ndị Juu nile ruo taa. Ndị Juu nabatakwara okwu ahụ ndị agha ahụ kwuru dị ka eziokwu. Ndị na-eso ụzọ Jisọs iri na otu fọdụrụ gaara nꞌelu ugwu dị na Galili, ebe Jisọs gwara ha na ha ga-achọta ya. Mgbe ha hụrụ Jisọs, ha kpọrọ isi ala nye ya. Ma ụfọdụ nꞌime ha nwere obi abụọ. Jisọs bịara ha nso, gwa ha okwu sị, “E werela ike nile dị nꞌeluigwe na nꞌelu ụwa nye m. Ya mere, gaanụ mee ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Meenụ ha baptizim baa nꞌaha Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe nile, ruo ọgwụgwụ ụwa.” Akụkọ m chọrọ ịkọrọ unu ugbu a bụ akụkọ banyere Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke. Amụma ahụ Aịzaya onye amụma buru emezuola. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya gbaa ama sị na mgbe ọbịbịa Jisọs ruru, ọ ga-ezite otu onye ga-ekwusara mmadụ nile na oge ọbịbịa ya eruola. Nwoke a, dị ka Aịzaya siri kwuo ga-esite nꞌọzara ebe ọ ga-ebi kwuo okwu. Isi okwu ya ga-abụkwa: “Dozienu ụzọ maka ọbịbịa Onyenwe anyi, meenụ ka okporo ụzọ ọ ga-agbaso guzozie.” Nwoke ahụ Chineke zitere bụ Jọn omee baptizim. O bi nꞌọzara, sitekwa nꞌebe ahụ jegharịa ebe nile. Ọ na-akpọku ndị mmadụ ka ha site na mmehie ha chegharịa, ka e mee ha baptizim, ka Chineke gbaghara ha. Ọtụtụ mmadụ sitere Judia na obodo nile dị Jerusalem gburugburu bịakwute ya. Ha jekwuuru ya nꞌosimiri Jọdan ebe ọ nọ na-ekwusa nkwusa ya. Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha o mere ha baptizim. Uwe Jọn yi nꞌahụ ya bụ nke e mere site nꞌajị inyinya a na-akpọ kamel. O kekwara belịtị dị warara nꞌukwu ya. Nri ọ na-eri bụ nanị igurube na mmanụ aṅụ a na-azaghị aza. Mgbe ndị mmadụ na-abịakwute ya, Jọn kwusaara ha na-asị, “Ọ dị nwoke dị ukwuu ga-abịa nꞌoge na-adịghị anya. Ọ dị ukwuu karịa m. Ọ dị nnọọ ukwuu na enweghị m ike ịtọpụ eriri e jiri kechie akpụkpọ ụkwụ ya. Ugbu a ana m eji mmiri efu na-eme unu baptizim, ma mgbe nwoke ahụ dị ukwuu bịara, ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.” Otu ụbọchị, Jisọs sitere Nazaret obodo dị nꞌime Galili bịa nꞌosimiri Jọdan. Ọ bịara ka Jọn mee ya baptizim. Jọn mekwara ya baptizim. Mgbe Jisọs si nꞌime mmiri ahụ na-apụta, oge Jọn mechara ya baptizim, ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ka Mmụọ Nsọ si nꞌeluigwe rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi. Nꞌotu oge ahụ kwa, olu dị ukwuu sitere nꞌeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-enye m obi ụtọ.” Ọ dịghị anya mgbe ihe ndị a mesịrị, Mmụọ Nsọ kwaliri Jisọs ka ọ gaa nꞌime ọzara. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Nanị ya nọ nꞌebe ahụ, mmadụ ọ bụla anọkwaghị ya, kariakwa ụmụ anụ ọhịa. Ma ndị mmụọ ozi bịakwara nyere ya aka. Emesịa, mgbe e jidere Jọn tụnye ya nꞌụlọ mkpọrọ, Jisọs gara Galili. Ebe ahụ ka ọ nọ na-ekwusa ozi ọma Chineke. Nke a bụ isi okwu ya, “Oge ahụ eruola. Oge Chineke ga-ebido ọchịchị ya nꞌụwa. Chegharịanụ, nabatakwaranụ onwe unu ozi ọma a!” Mgbe ọ na-aga ije nꞌakụkụ ọnụ mmiri osimiri Galili ọ hụrụ Saịmọn na Anduru nwanne ya. Ha bụ ndị ọkụ azụ. Jisọs hụrụ ha mgbe ha na-awụnye ụgbụ ha ji egbu azụ nꞌime mmiri. Jisọs kpọrọ ha sị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme ka unu ghọọ ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha soro Jisọs. Mgbe Jisọs hapụrụ ebe ahụ gatụ nꞌihu nke nta, ọ hụrụ Jemes na Jọn nwanne ya. Ha abụọ bụ ụmụ Zebedi. Ha bụkwa ndị ọkụ azụ. Nꞌoge Jisọs hụrụ ha ha nọ na-adụchi ụgbụ ha dọkara adọka. Otu ihe ahụ Jisọs gwara Saịmọn na Anduru ka ọ gwakwara Jemes na Jọn. Na-atụfughị oge Jemes na Jọn hapụrụ nna ha nꞌime ụgbọ mmiri ha ji egbu azụ soro Jisọs. Nna Jemes na Jọn nwere ndị o goro ọrụ so ya na-arụ ọrụ nꞌoge a. Mgbe oge nta gasịrị, Jisọs na ndị so ya bịaruru Kapanọm. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, nke bụ ụbọchị Satọde, bụrụkwa ụbọchị ịga nꞌụlọ ekpere, Jisọs na ndị na-eso ya jere nꞌụlọ ekpere dị nꞌebe ahụ. Nꞌebe ahụ, Jisọs ziri ndị bịara okwu Chineke. O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya otu Jisọs si kwuo okwu Chineke. Nꞌihi na o zighị ha dị ka ndị ozizi ndị Juu si ezi. Kama o ziri ha dị ka onye maara ihe nile. Ma nꞌụlọ ekpere ahụ e nwere otu nwoke nọ nꞌime ya nke mmụọ ọjọọ na-esogbu. Mgbe nwoke a nụrụ ihe Jisọs na-ezi, o tiri mkpu akwa sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Jisọs onye Nazaret? Ị̀ bịara nꞌebe a ka ị laa anyị nꞌiyi? Amaara m gị, ị bụ Ọkpara Chineke dị ndụ!” Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ si nꞌime nwoke a pụta!” Nꞌotu oge ahụ mmụọ ọjọọ ahụ mere ka akwụkwụ dọọ nwoke ahụ. Emesịa ọ kwara akwa nꞌoke olu hapụ nwoke ahụ. O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Anyị ga-esi aṅaa kọwaa ihe anya anyị hụrụ taa? Nꞌezie, nke a bụ nnọọ ozizi ọhụrụ! Lee, okwu ọnụ efu ka o ji nye iwu ka mmụọ ọjọọ site nꞌahụ mmadụ pụọ, ha pụkwara!” Ọ dịghị anya akụkọ ọrụ a Jisọs rụrụ gbasara ruo ebe nile. Ndị mmadụ bi nꞌakụkụ Galili nile nụrụ ihe banyere ya. Mgbe ha si nꞌụlọ ekpere ahụ pụta, Jisọs gara nꞌụlọ Saịmọn na Anduru. Jemes na Jọn sokwa ya gaa. Mgbe ha jeruru nꞌụlọ ahụ, ha hụrụ nne nwụnye Saịmọn ka o dina nꞌihe ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha gwara Jisọs banyere nke a. Jisọs gara nso ebe nwanyị a dina, jide ya nꞌaka, selie ya elu inyere ya aka ịnọdụ ala. Otu mgbe ahụ, ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị. Nwanyị ahụ bilikwara gaa siere ha nri anyasị. Nꞌoge anyasị, mgbe anwụ dara, ndị mmadụ butere ndị ha ahụ na-esighị ike, dote ha nꞌihu ụlọ ebe ahụ Jisọs nọ. Ha butekwara ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. Nꞌanyasị ahụ kwa, a pụrụ ịsị na ndị nile bi na Kapanọm zukọrọ nꞌihu ụlọ ahụ ịhụ Jisọs na ịnụ okwu si ya nꞌọnụ na-apụta. Jisọs pụtara nꞌezi gwọọ ndị nile ọrịa dị iche iche na-arịa. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ site nꞌahụ ndị ọ na-enye nsogbu. Ebe ọ bụ na mmụọ ọjọọ ndị a maara onye Jisọs bụ, o kweghị ka ha kwuo okwu ọ bụla mgbe ọ na-achụpụ ha. Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị nke ọzọ ya, mgbe mmadụ nile nọ na-arahụ ụra, mgbe ìhè ọ bụla na-adịghị, Jisọs sitere nꞌụra teta. O sitere nꞌụlọ ahụ ọ nọ pụta, pụọ, gaa ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, nanị ya. Nꞌebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere. Mgbe chi bọziri Saịmọn na ndị ọzọ nọ nꞌụlọ ahụ chọgharịrị ya, ma ha ahụghị ya. Ha pụrụ jegharịa ịchọ ya. Mgbe oge nta gasịrị, ha hụrụ ya, gwa ya okwu sị, “Lee na ndị mmadụ jupụtara nꞌihu ụlọ ahụ na-eche gị!” Ma Jisọs gwara ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, ka anyị gaanụ nꞌobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m kwusaakwara ha ozi ọma. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji bịa.” Ya mere, ha pụrụ jegharịa nꞌebe dị iche iche na Galili. Ebe ọ bụla ha jeruru, Jisọs kwusara ozi ọma nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ. Otu ụbọchị, otu onye ekpenta bịakwutere Jisọs rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jisọs nwere ọmiko nꞌahụ ya. O setipụrụ aka ya metụ onye ekpenta ahụ aka sị ya, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịkwa ọcha.” Nꞌotu oge ahụ, ọrịa ekpenta ahụ lara. Ahụ dịkwara nwoke ahụ mma! Mgbe ahụ kwa, Jisọs dọrọ nwoke ahụ ọ gwọrọ aka na ntị sị ya, “Lee, agwakwala onye ọ bụla banyere ọgwụgwọ m gwọrọ gị. Kama laa ugbu a, gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Imekwa ka ndị ọzọ mata na a gwọọla gị gaa nye onyinye dị ka Mosisi nyere nꞌiwu na ndị a gwọrọ ọrịa ekpenta ga-enye.” Ma nwoke ahụ lara kọsaa akụkọ ọgwụgwọ ya ebe nile. Nꞌihi nke a ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Nke a mere ka o siere Jisọs ike ịbanye nꞌobodo ọ bụla mgbe ìhè dị. Ya mere, ọ nọdụrụ nꞌebe ndị mmadụ na-ebighị. Ma ọtụtụ igwe mmadụ sitekwara ebe nile bịakwute ya nꞌebe ahụ. Mgbe ụfọdụ ụbọchị gasịrị, Jisọs lọghachiri na Kapanọm. Ọ dịkwaghị anya site nꞌoge ọ lọtara ọtụtụ mmadụ matara na ọ lọtala. Nꞌihi ya, igwe mmadụ zukọtara nꞌime ụlọ ahụ ọ nọ. Ndị mmadụ dị nnọọ ukwuu. Ha nọchiri ụzọ e si abanye nꞌụlọ ahụ. Mmadụ enwekwaghị ike isite nꞌọnụ ụzọ ahụ bata. Jisọs kwusaara ha ozi ọma. Ọ dịghị anya mmadụ anọ bịarutere nꞌebe igwe mmadụ ndị a gbakọrọ. Ha bu enyi ha nꞌute, bụ onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe ha bịara nso ọnụ ụzọ ahụ, ha chọpụtara na ha enweghị ike isite na ya gafee, baa nꞌime ụlọ ahụ. Nꞌihi ya, ha rigooro elu ụlọ ahụ Jisọs nọ nꞌime ya, gwupuo elu ụlọ ahụ. Ha kenyere ụdọ dị ogologo nꞌute ahụ enyi ha dina nꞌime ya, sitekwa nꞌoghere ahụ ha mere wetuo ute ahu. Mgbe Jisọs hụrụ na ndị a nwere okwukwe dị ukwuu nꞌime ya ịgwọ enyi ha nwoke, ọ sịrị onye ọrịa ahụ, “Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị.” Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ enweghị ọṅụ nꞌobi ha nꞌihi okwu a Jisọs kwuru. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Gịnị mere nwoke a ji esi otu a ekwu okwu ikwulu Chineke? Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie ya.” Ngwangwa Jisọs ghọtara ihe ha na-eche nꞌobi ha. Ọ jụrụ ha ajụjụ a, “Gịnị mere okwu m kwuru jiri wetara unu obi ọjọọ? Olee nke dị mfe ikwu? Ọ̀ bụ ịgwa nwoke a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ na a gbagharala ya mmehie ya, ka ọ bụ ịgwa ya ka o bilie chịrị ute ya laa? Ma igosi unu na Nwa nke mmadụ nwere ike nꞌụwa ịgbaghara mmehie, ana m asị gị, onye ọrịa, bilie ọtọ, chịrị ute gị laa!” Nꞌotu mgbe ahụ nwoke a, onye ọrịa ahụ, biliri. Ọ chịlitere ute ya pụọ nꞌihu mmadụ nile. Nke a juru ndị nile nọ nꞌebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!” Emesịa, Jisọs pụrụ gaa nꞌakụkụ osimiri ahụ, kwusaara ndị gbara ya gburugburu ozi ọma. Mgbe ọ na-agakwa nꞌihu, Jisọs hụrụ Livayị nwa Alfeọs ebe ọ nọdụrụ nꞌụlọ ndị ọnaụtụ, nke bụkwa ebe ọ na-arụ ọrụ. Jisọs sịrị ya, “Soro m.” Ngwangwa Livayị sooro ya. Nꞌabalị ahụ, Livayị kpọrọ Jisọs oriri nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara ọtụtụ ndị enyi ya, ndị ọnaụtụ dị ka ya onwe ya, na ọtụtụ ndị mmehie. Ha nile na Jisọs nọkọkwara nꞌotu tebulu na-eri nri. Ndị a ha na Jisọs na-erikọ nri bụkwa ụdị ndị na-esogharị ya ebe ọ bụla ọ na-ekwusa ozi ọma. Mgbe ndị ozizi iwu na ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-erikọ nri?” Mgbe Jisọs nụrụ ajụjụ ha na-ajụ, ọ sịrị ha, “Mkpa dibia adịghị akpa ndị ahụ dị mma, kama ọ bụ ndị ọrịa ka ọ na-akpa. Abịaghị m ịgwa ndị ezi omume ka ha chegharịa, kama abịara m ịgwa ndị mmehie ka ha si na mmehie ha chegharịa.” Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ oge nile. Ya mere, otu ụbọchị, ụfọdụ mmadụ bịakwutere Jisọs jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ?” Jisọs zara ha sị, “Ò ziri ezi ka ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwụnye hapụ iri ihe mgbe di nwanyị nọ nꞌebe ahụ? Ya mere, mgbe di nwanyị nọ ya ibu ọnụ adịghị mkpa nꞌihi na ọ ga-enye ha ihe oriri. Ma oge na-abịa mgbe di nwanyị na-agaghị anọ. Nꞌoge ahụ ha ga-ebu ọnụ. O zighị ezi iji akwa ọhụrụ duchie ebe akwa ochie siri dọkaa nꞌihi na nke a ga-eme ka akwa ochie ahụ jọọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a kwa, ndị mmadụ adịghị etinye mmanya ọhụrụ dị ike nꞌime karama akpụkpọ ochie, nꞌihi na ike mmanya ọhụrụ a ga-eme ka karama akpụkpọ ochie ahụ gbawaa. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ.” Otu ụbọchị, nꞌụbọchị izuike ndị Juu, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌubi a kụrụ ọka na-agafe. Mgbe ha na-agafe, ndị na-eso uzọ ya bidoro ịghọ ụfọdụ nꞌime ọka ndị ahụ na-ata. Ma ụfọdụ ndị Farisii hụrụ ha mgbe ha na-eme nke a. Ha kpọkuru Jisọs sị ya, “Ị̀ na-ahụkwa ihe ndị na-eso ụzọ gị na-eme? O megidere iwu iwe ihe ubi nꞌụbọchị izuike anyị!” Ma Jisọs sịrị ha, “Unu agụtaghị nꞌakwụkwọ nsọ ihe Devidi na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha? Nꞌoge Abịata bụ onyeisi nchụaja Devidi na ndị so ya banyere nꞌụlọ nsọ Chineke. Nꞌebe ahụ ha tara beredi e chere nꞌihu Chineke. Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ kwesịrị ịta beredi nsọ ahụ karịakwa ndị nchụaja. Ma Devidi banyere nꞌebe ahụ were ya taa, nyetụkwa ndị ya na ha so.” Jisọs gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka ọdịmma ndị mmadụ. E meghị mmadụ nꞌihi idebe ụbọchị izuike nsọ nanị. Ọzọ kwa Nwa nke mmadụ ka ọ dịrị ikpebi ihe e kwesịrị ime nꞌụbọchị izuike, nꞌihi na ạbụ m Onyenwe ụbọchị izuike a!” Ọzọ kwa, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Nꞌime ya ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ụfọdọ mmadụ nọ na-ele ya anya ịhụ ihe ọ ga-eme. Ha chọrọ ịmata ma Jisọs ọ ga-agwọ nwoke a nꞌụbọchị izuike. Ha na-echekwa ibo ya ebubo mmebi iwu maka edebeghị ụbọchị izuike nsọ. Ma Jisọs gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Bilie, bịa guzo nꞌetiti ụlọ ekpere a.” Mgbe nwoke ahụ pụtara guzo ebe Jisọs ziri ya, Jisọs tụgharịrị jụọ ndị mmadụ ajụjụ sị, “Olee ihe unu chere bụ ihe dị mma? Ọ̀ bụ inyere mmadụ aka nꞌụbọchị izuike ka ọ bụ imerụ mmadụ ahụ? Ọ̀ bụ ịzọpụta mmadụ ka ọ bụ igbu ya?” O nweghị onye kwuru okwu nꞌetiti ndị ahụ nile. Jisọs lere ha anya nꞌiwe. Enweghị ọmiko ha were ya iwe nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Setipụ aka gị!” Nꞌotu mgbe ahụ nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Mgbe ọ na-eme nke a aka ya dizikwara nke ọma. Ngwangwa, ndị Farisii nọ nꞌụlọ nzukọ ahụ sitere nꞌebe ahụ pụọ nꞌiwe. Ha gara soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi gbuo Jisọs. Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌebe ahụ pụọ gaa nọdụ nꞌakụkụ osimiri. Ọtụtụ mmadụ sooro ya, ndị sitere Galili, na Judia, na Jerusalem, na Idumia, na ofe Jọdan. Na ndị sitere nꞌakụkụ Taịa na Saịdọn. Ọtụtụ ndị a bịakwutere Jisọs nꞌihi na ha anụla akụkọ ọrụ ebube nile ọ na-arụ. Nꞌihi ịdị ukwuu nke igwe mmadụ ahụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha doo ụgbọ mmiri nso. Ọ ga-abanye nꞌụgbọ mmiri ma ọ bụrụ na ọ raa ya ahụ iguzokwa nꞌelu ala, nꞌihi na ọtụtụ mmadụ na-enute nꞌebe ọ nọ. Ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa. Nꞌihi ya ọtụtụ ndị nwere ọrịa na-agbalịkwa ịbịarute ya nso ịmetụ ya aka. Mgbe ọ bụla kwa ndị mmụọ ọjọọ na-achị hụrụ Jisọs ha na-ada nꞌala nꞌihu ya na-eti mkpu akwa na-asị, “Ị bụ Okpara Chineke!” Ma Jisọs na-abara ha mba, nyekwa ha iwu ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ. Emesịa, Jisọs rigooro nꞌelu ugwu. Nꞌebe ahụ ọ kpọrọ nye onwe ya ụfọdụ nꞌime igwe mmadụ ahụ, ndị ọ chọrọ. Ha bịakwutekwara ya. Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ. Ndị a bụ ndị ya na ha ga-anọ. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa ozi ọma ahụ. Ndị a ka ọ ga-enyekwa ike ịgwọ ọrịa, na ịchụpụ mmụọ ọjọọ. Ndị a bụ aha mmadụ iri na abụọ ọ họpụtara: Saịmọn, onye Jisọs nyere aha ọzọ, nke bụ Pita. Jemes na Jọn ụmụ Zebedi. Jisọs nyere ha aha ọzọ, nke bụ, Ụmụ egbe eluigwe. Anduru na Filip, Batolomiu na Matiu, Tọmọs na Jemes nwa Alfiọs. Tadịọs na Saịmọn. Saịmọn a bụ onye so nꞌotu ndị Juu chọrọ iji ike kwatuo ọchịchị ndị Rom. Na Judas Iskarịọt nwoke ahụ mesịrị rara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya. Mgbe nke a gasịrị, Jisọs laghachiri nꞌụlọ ahụ o bi. Ọ dịghị anya ndị mmadụ bidoro na-abịakwutekwa ya. Ndị mmadụ dị nnọọ ukwuu mee ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụ inwe ohere iri ihe. Mgbe ndị ikwu Jisọs nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nꞌụlọ ha. Ha sịrị, “Isi adịghị ya mma.” Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “O bu ekwensu nꞌisi. Ọ bụkwa ekwensu a na-enye ya ike o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” Ma Jisọs kpọrọ ndị kwuru okwu a ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu nꞌilu, nꞌụzọ ha ghọtara, jụọ ha ajụjụ sị, “Ekwensu ọ̀ ga-esi aṅaa chụpụ ekwensu? Alaeze nke ọgba aghara dị nꞌime ya enweghị ike iguzo. Otu a kwa, ezinụlọ nke ịlụ ọgụ dị nꞌime ya enweghị ike iguzo. Ọ bụrụkwa na ịlụ ọgụ adịrị nꞌezinụlọ ekwensu, ekwensu ọ̀ pụrụ ịrụpụta ihe ọ bụla? Mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịbanye nꞌụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo o ji biri, ma o nwere ike ime nke a ma o buru ụzọ mee otu ihe. O buru ụzọ kee nwoke ahụ dị ike eriri, o nwere ike banye bukọrọ ngwongwo dị nꞌụlọ ya. “Ana m agwasị unu okwu a ike na-asị na mmehie ọ bụla adịghị nke mmadụ mere megide Chineke nke mgbaghara na-adịghị. Ọ dịkwaghị ụdị nkwulu ọ bụla Chineke na-agaghị agbaghara. Ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara. A gaghị agbaghara ya mmehie nkwulu a nꞌụwa a ma ọ bụ nꞌụwa ọzọ.” Jisọs kwuru nke a nꞌihi na ndị ozizi iwu sịrị na ọrụ ebube nile ọ na-arụ bụ site nꞌike ekwensu bi nime ya. Mgbe ahụ nne Jisọs na ụmụnne ya bịara nꞌebe ọ nọ na-ezi ihe, guzoro nꞌezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya. Ndị mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ozi ahụ bịara sịrị ya, “Lee, nne gị na ụmụnne gị guzo nꞌezi. Ha chọrọ ịhụ gị.” Ma Jisọs zara sị ha, “Onye bụ nne m? Ndị ole bụkwa ụmụnne m?” O lere anya nꞌihu ndị nọ ya gburugburu sị, Ndị a bụ nne m na umunne m. “Onye ọ bụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị, na nne m.” Ọzọ kwa, Jisọs gara nꞌakụkụ osimiri Galili bido izi ihe. Ọtụtụ mmadụ gbakwara ya gburugburu. Nꞌihi nke a ọ banyere nꞌụgbọ mmiri ahụ. O ziri ha ọtụtụ ihe. Ọ bụkwa ilu ka o ji zie ha ihe. Nke a bụ otu nꞌime ihe o ziri ha. “Geenụ ntị! Otu nwoke gara nꞌubi ya ikụ ọka. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ọka ndị a, ụfọdụ dara nꞌakụkụ ụzọ. Ngwangwa ụmụ nnụnụ bịara tụrụ ha loo. *** Ụfọdụ mkpụrụ ọka ahụ dara nꞌala dị nkume nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ọsịịsọ nꞌihi na ala dị nꞌebe ahụ emighị emi. Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha mee anwụ wara, ọ chagburu ha mee ka ha kpọọ, nꞌihi na mgbọrọgwu ha emikpughị emikpu nꞌala. Ụfọdụ nꞌime ọka ahụ dara nꞌala ebe ogwu ogwu dị. Mgbe ha pupụtara too, ogwu dị nꞌebe ahụ kpagburu ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ. “Ma ụfọdụ ọka ahụ dara nꞌezi ala, puo, too, mịakwa mkpụrụ. Ụfọdụ nꞌime ha mịrị iri mkpụrụ ọka atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ narị.” Jisọs sịrị ha, “Onye ọ bụla nwere ntị ịnụ ihe ya nụrụ.” Emesịa, mgbe nanị Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ, ụfọdụ ndị nụrụ ozizi ya, ha na ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka mkpụrụ ahụ a ghara pụtara?” Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụ unu ka ọ dịrị ịmata ihe omimi nile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ, ndị na-anọghị nꞌebe a ugbu a, bụ ndị ga-anụ ha nꞌilu. Nꞌihi na Aịzaya buru amụma banyere ha sị, ‘Ha ga-ele anya lekwasị, ma ha agaghị ahụ ihe ọ bụla. Ha ga-ege ntị, gesiekwa ike, ma ha agaghị aghọta ihe ọ bụla. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha aghọta, ha agaghị echegharị bịakwute Chineke ka ọ gbaghara ha.’ ” Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ndị ahụ ya na ha nọ ajụjụ sị, “Ọ bụrụ na o siiri unu ike ịghọta ilu ntakịrị a, unu ga-esikwanụ aṅaa ghọta okwu nile m na-aga ikwu nꞌoge dị nꞌihu?” Jisọs kọwara ilu ahụ sị, “Ọgha mkpụrụ ahụ bụ onye ọ bụla na-ekwusa ozi ọma Chineke. Ozi ọma Chineke bụkwa ọka ahụ. Ọgha mkpụrụ na-agagharị na-agbalị ikwusara ndị mmadụ okwu Chineke. Mkpụrụ ọka nke dara nꞌakụkụ ụzọ nọchiri anya obi ndị ahụ nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara wepụ okwu ahụ ha nụrụ nꞌobi ha ka ọ hapụ ịbara ha uru. Obi ndị ọzọ dị ka ala nkume nkume ebe ụfọdụ mkpụrụ ọka ahụ danyere. Ndị a bụ ndị jiri ọṅụ nabata ozi ọma ahụ. Ma okwu ahụ ha nụrụ adabanyeghị nke ọma nꞌala ala obi ha ọ dịghị anọgidekwa. Ya mere, mgbe nsogbu na mkpagbu bidoro nꞌihi ime ihe ahụ ha nụrụ na Chineke chọrọ ka ha mee, ha na-akwụsị. “Obi ndị ọzọ dị ka ala ahụ ogwu dị, ebe ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ọka ahụ danyere. Ndị a bụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ nabatakwa ya. Ma echiche banyere ihe dị nꞌụwa a, ya na agụụ ịba ụba, na echiche ọjọọ dị iche iche, na-akpagbu okwu ha nụrụ. Ha adịghị amịkwa mkpụrụ. “Obi ụfọdụ dị ka ala ọma ahụ. Ndị a bụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ, nabata ya nꞌobi ha. Ha na-eji okwu ha nụrụ rụpụta ezi ọrụ. Ụfọdụ na-amị iri mkpụrụ atọ, ndị ọzọ iri mkpụrụ isii, ndị ọzọ narị mkpụrụ karịa nke a kụrụ.” Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ha sị, “Ò ziri ezi ịmụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, ma ọ bụ nꞌokpụrụ ihe ndina? É, è! Nꞌihi na ebe e kwesịrị ịdọba iheọkụ bụ nꞌelu tebulu. “Ihe ọ bụla zoro ezo ga-emesi pụta ìhè. Ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesiakwa kpughee. Onye ọ bụla nwere ntị ịnụ ihe ya nụrụ.” Ọ gwakwara ha sị, “Kpacharanụ anya banyere ihe unu ji okwu unu na-anụ eme. Nꞌihi na ọ bụ ụzọ unu siri mesoo ndị mmadụ mmeso ka a ga-esi mesoo unu. Nꞌezie, mmeso Chineke ga-emeso unu ga-adị ukwuu karịa. Onye nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma nwoke ahụ na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe nke o nwere.” Jisọs gara nꞌihu gwa ha sị, “Alaeze Chineke dị ka nwoke gara nꞌubi ya ghaa mkpụrụ. Emesịa, ọ na-alaghachi nꞌụlọ ya chefuo ihe nile banyere mkpụrụ ahụ ọ ghara. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gafere, mkpụrụ ahụ na-epuputa too, ma onye ọrụ ubi ahụ amaghị otu o si puo, ma ọ bụ otu o si too, nꞌihi na ọ dịghị ihe ọzọ ọ na-eme inyere mkpụrụ ọka ahụ aka ipu. Ọ bụ ala ahụ na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Na mbụ ọ na-epupụta, emesịa, o too, ma nꞌikpeazụ, ọ na-amị mkpụrụ. Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, nwoke a na-eji mma ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọọkwa mkpụrụ ọka laa, nꞌihi na oge iwe ihe nꞌubi eruola.” “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya? Anyị nwere ike ịsị na alaeze Chineke dị ka mkpụrụ mọsụtadị. Ọ bụ otu nꞌime mkpụrụ dịkarịsịrị nta nꞌụwa. Ma mgbe mmadụ weere ya kụọ, ọ na-eto buo nnọọ ibu. Ọ na-enwe alaka dị ogologo. Ụmụ nnụnụ na-abịakwa wuo akwụ ha nꞌalaka ya.” Jisọs jiri ọtụtụ ilu gwa ndị mmadụ ahụ okwu. Ọ gwara ha okwu ole na ole ha nwere ike ịnụ. Oge nile ọ gwara ha okwu, o ji ilu kwuo okwu ahụ. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya nanị nọdụ, ọ na-akọwara ihe ihe nile. Nꞌoge anyasị ụbọchị ahụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị banyenụ nꞌụgbọ mmiri gafee nꞌofe ọzọ nke osimiri a.” Ndị na-eso ụzọ ya mere ihe o kwuru. Ha na Jisọs banyere nꞌụgbọ, hapụ igwe mmadụ ahụ. Ụfọdụ ụgbọ mmiri sokwara ha nꞌazụ. Mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga, oke ifufe dị ike bidoro ife. Ebili mmiri bidoro na-amagharị, mmiri bidokwara ịbanye nꞌime ụgbọ ha. Mmiri banyere nꞌụgbọ ha dị ukwuu ruo na ụgbọ ha chọrọ imikpu nꞌime mmiri. Mgbe ihe ndị a nile na-eme, Jisọs nọrị nꞌime ụgbọ ahụ na-arahụ ụra. O jiri akwa a fụkọtara afụkọta hinye nꞌisi ya. Ndị na-eso ụzọ ya tụrụ oke egwu mgbe ihe ndị a na-eme, gbaara ọsọ tie mkpu kpọtee ya, na-asị, “Nna anyị ukwu! Ọ dịghị emetụ gị nꞌobi na anyị nile ga-anwụ ma ụgbọ anyị mikpuo?” Jisọs biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sị, “Dere jii!” Ngwangwa, ifufe ahụ kwụsịrị ifegharị, ebe nile dekwaara jii. Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu? Ebee ka okwukwe unu gara?” Ha nile tụrụ egwu, jụrịtaa onwe ha sị, “Onye ka nwoke a bụ? Nwoke a ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu?” Emesịa, ha jeruru ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ebe ha kwụsịrị bụ nꞌobodo Gerazin. Otu mgbe ahụ ha si nꞌime ụgbọ ha wụdata, onye buru ụzọ zute ha bụ nwoke mmụọ ọjọọ na-achị. O sitere nꞌebe a na-eli ozu pụta. Nꞌihi na ogige ili ahụ bụ ebe o ji mere ebe obibi ya. Ọ bụkwa nwoke dị ike. Mmadụ ọ bụla enweghị ike iji, ọ bụladi eriri igwe kee ya agbụ. Nꞌihi na mgbe ọ bụla e kere ụkwụ na aka ya, ọ na-adọbisi eriri e ji kee ya. Ọ na-akpakwa ike nke ukwuu. Oge nile, ehihie na abalị, ọ na-agagharị nꞌogige ili ahụ, na nꞌugwu dị gburugburu ebe ahụ, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ. Mgbe Jisọs nọ nꞌebe dị anya, nwoke ahụ hụrụ ya gbara ọsọ bịa daa nꞌụkwụ ya, na-eti mkpu na-asị, “Gịnị ka ị chọrọ iji m mee, Jisọs, Ọkpara Chineke dị elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko atala m ahụhụ dị ukwuu.” Mmụọ ọjọọ ahụ siri otu a kwuo okwu nꞌihi na Jisọs nyere ya iwu ka o site nꞌime nwoke ahụ pụta. Jisọs jụrụ mmụọ ọjọọ ahụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zara sị, “Aha m bụ igwe, nꞌihi na anyị dị ọtụtụ.” Mmụọ ọjọọ ndị a rịọsiri Jisọs arịrịọ ike ka ọ hapụ iziga ha nꞌebe dị anya. Igwe ezi nọ nso nꞌebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nꞌebe ahụ. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs sị, “Biko, ziga anyị nꞌime igwe ezi a.” Jisọs kwenyere ka ha banye nꞌime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị a bara nꞌime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ nile ọnụ ọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nꞌime osimiri, ebe mmiri riri ha nile. Ndị nọ na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa nꞌime obodo, kọsaa akụkọ ihe Jisọs mere nꞌobodo nile dị ebe ahụ gburugburu. Nꞌihi nke a ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere. Mgbe ha pụtara, ha hụrụ Jisọs. Ha hụkwara nwoke ahụ Jisọs sitere nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ. O yi uwe, nọdụ ala dị ka onye isi zuru oke. Ndị ahụ nọ mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ kọọrọ mmadụ nile ihe mere nwoke ahụ. Ha kọkwaara ha akụkọ banyere mmụọ ọjọọ ndị ahụ a chụpụrụ, na ihe mere igwe ezi ndị ahụ. Nꞌihi ya, ndị mmadụ ahụ bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nꞌala ha, gaa ebe ọzọ. Nꞌihi ya, Jisọs banyekwara nꞌime ụgbọ mmiri. Ma nwoke ahụ Jisọs si nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ rịọrọ Jisọs ka o soro ha. Ma Jisọs sịrị ya, “É, è, kama laghachikwuru ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Chineke meere gị. Na otu Chineke siri meere gị ebere.” Nwoke ahụ hapụrụ ha laa. O sitere nꞌobodo iri ahụ, bụ Dekapolis, na-akọ akụkọ ihe Jisọs meere ya. Ndị nile nụkwara okwu ya ka akụkọ ahụ juru anya nke ukwuu. Mgbe Jisọs rukwara nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ, igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu. Otu onyeisi ụlọ ekpere ndị Juu aha ya bụ Jairọs bịara daa nꞌala nꞌihu ya. Ọ rịọsịrị Jisọs arịrịọ ike sị ya, “Biko, ada m nwanyị nọ ugbu a nꞌọnụ ọnwụ bịa ngwangwa ka i metụ ya aka ka ọ dịkwa ndụ.” Jisọs sooro nwoke a. Mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga, oke igwe mmadụ sooro ha. Nꞌime igwe mmadụ ahụ otu nwanyị nọ ya onye nọrọrị nꞌọrịa afọ iri na abụọ. Ọrịa ya bụ oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị dibia agbalịala inyere ya aka ma o nweghị onye ọ bụla nwere ike gwọọ ya. O mefuokwala ego nile o nwere maka ịgwọ onwe ya. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ nile Jisọs na-arụ, o sooro igwe mmadụ ahụ, site nꞌetiti ha bịaruo nso nꞌazụ Jisọs, metụ uwe ya aka. Nꞌihi na nwanyị a ekwuolarị nꞌobi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ uwe ya aka amaara m na ahụ ga-adị m mma.” Ihe nile mekwara dị ka nwanyị a si chee ya nꞌobi ya. Nꞌihi na mgbe o metụrụ Jisọs aka ọbara ahụ kwụsịrị ịgba. Ọ matakwara na ahụ adịla ya mma. Mgbe ahụ kwa Jisọs nꞌonwe ya matara na ike esitela ya nꞌahụ pụọ. Ọ tụgharịrị jụọ ajụjụ sị, “Ònye metụrụ uwe m aka?” Ndị na-eso ụzọ ya gwara ya sị, “Lee na ọtụtụ mmadụ na-eso gị nꞌazụ, gịnị bụkwa uru ịjụ ajụjụ banyere onye metụrụ gị aka?” Ma Jisọs tụgharịrị hụ nwanyị ahụ metụrụ ya aka. Ụjọ tụrụ nwanyị ahụ. Ọ nọkwa na-ama jijiji. Ma ebe ọ maara na e sitela nꞌaka ahụ o metụrụ Jisọs gwọọ ya, ọ bịakwutere Jisọs daa nꞌala nꞌụkwụ ya kọọrọ ya ihe nile dị ka o siri mee. Jisọs zara sị, “Ada m, okwukwe gị emeela ka ahụ dị gị mma. Laa nꞌudo. Bụrụkwa onye nweere onwe ya site na nrịrịa!” Mgbe Jisọs nọ na-agwa nwanyị ahụ okwu, ndị ozi sitere nꞌụlọ Jaịrọs bịarute. Ha gwara Jaịrọs okwu sị, “Enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ, nꞌihi na ada gị anwụọla.” Mgbe Jisọs nụrụ ozi ahụ, ọ gwara Jaịrọs okwu sị, “Atụla egwu. Nanị ihe ị ga-eme bụ inwe okwukwe.” Mgbe ahụ Jisọs nyere iwu ka onye ọ bụla kwụsị iso ya gaa nꞌụlọ ahụ. Ma ọ kpọọrọ Pita, na Jemes, na Jọn. Mgbe ha bịarutere nꞌụlọ ahụ, Jisọs hụrụ na ebelebe egbuola. Ndị mmadụ nọ na-akwa akwa, na-etikwa mkpu akwa. Jisọs banyere nꞌụlọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!” Mgbe ahụ, ndị nọ nꞌebe ahụ bidoro iji Jisọs ime ihe ọchị. Nꞌihi ya Jisọs chụpụrụ ha site nꞌụlọ ahụ. Ọ kpọọrọ nne na nna nwanta ahụ na Pita na Jemes na Jọn banye nꞌime ụlọ ahụ ebe nwanta ahụ dina. O selitere nwanta ahụ nꞌaka sị ya, “Nwanta nwanyị bilie ọtọ!” Nwanta nwanyị a agbaala afọ iri na abụọ. Otu mgbe ahụ nwanta ahụ biliri ọtọ bido na-ejegharị nꞌime ụlọ ahụ. Ọṅụ jupụtara obi nne na nna ya. Ma Jisọs dọrọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie!” Jisọs sitere nꞌebe ahụ pụọ laghachi nꞌobodo nke a mụrụ ya, bụ Nazaret. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa. Nꞌụbọchị izuike, ọ banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu dị nꞌebe ahụ, bido ikwu okwu Chineke. Ọtụtụ ndị gere ya ntị ka o juru anya bụ okwu si ya nꞌọnụ na-apụta. Ha jụrụ sị, “Ebee ka nwoke a nọrọ mụọ ihe ndị a nile? Ònye nyere ya amamihe a? Ebee ka o siri nweta ike ịrụ ọrụ ịrịba ama ndị a nile? “Onye a ọ̀ bụghị nwa Josef onye kapinta? Meri ọ̀ bụkwaghị nne ya? Jemes, na Josis, na Jud, na Saịmọn ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha nọ nꞌebe a?” Obi jọrọ ha njọ nꞌebe ọ nọ. Ma Jisọs zara ha sị, “A na-asọpụrụ onye amụma nꞌebe nile, ma onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọ bụla nꞌala a mụrụ ya, na nꞌetiti ndị ikwu ya na nꞌezinụlọ o siri pụta.” Ọ rụghị ọrụ ịtụnanya ọ bụla nꞌebe ahụ. Ihe o mere bụ nanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nꞌisi ma gwọọ ha. O juru Jisọs anya na ndị a ekwereghị na ya. Mgbe ahụ Jisọs jegharịrị nꞌobodo nta nile dị nꞌebe ahụ na-ezi ndị mmadụ ihe. Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. Ọ gwara ha sị, “Unu ejila ihe ọ bụla mgbe unu na-aga njem a. Werenụ nanị mkpa nꞌaka unu. Unu ewerekwala nri ma ọ bụ akpa. Unu etinyekwala ego nꞌakpa unu. Werenụ nanị akpụkpọ ụkwụ unu yi nꞌụkwụ unu. Unu ewekwala karịa otu uwe. “Mgbe ọ bụla unu batara nꞌobodo ọ bụla nọdụnụ nꞌime ụlọ a nabatara unu tutuu ruo mgbe unu si nꞌobodo ahụ pụọ. Obodo ọ bụla ndị bi nꞌime ya juru ịnabata unu, ma ọ bụ nke ndị bi nꞌime ya jụrụ ige unu ntị, sitenụ nꞌime ya pụọ. Mgbe unu na-ahapụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nꞌụkwụ unu nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Nke a ga-abụ ihe ama igosi na ha jụrụ Chineke na ozi ya.” Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-agwa ndị mmadụ ka ha si na mmehie ha chegharịa. Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, wụkwasịkwa ndị ahụ na-esighị ike mmanụ olivu, gwọọ ha. Ọ dịghị anya eze Herọd nụrụ akụkọ banyere Jisọs, nꞌihi na nꞌoge a ndị mmadụ nọ ebe nile na-ekwu okwu banyere ọrụ ebube ọ na-arụ. Ụfọdụ mmadụ sịrị, “Jisọs bụ Jọn omee baptizim. O sitela nꞌọnwụ dịrị ndụ ọzọ. Ọ bụ nke a mere o ji arụ ọrụ ịtụnanya ndị a nile ọ na-arụ.” Ndị ụfọdụ sịrị, “Jisọs bụ Ịlaịja onye amụma ukwu nke mgbe ochie ahụ.” Ndị ọzọ sịkwara, “Jisọs bụ onye amụma ọhụrụ, dị ka ndị amụma nke mgbe ochie ahụ.” Ma mgbe Herọd nụrụ ihe banyere Jisọs, ọ sịrị, “Nwoke a ga-abụkwanụ Jọn omee baptizim, onye m bipụrụ isi. O sitela nꞌọnwụ bilie!” Ọ bụ Herọd nꞌonwe ya nyere iwu ka e jide Jọn. Ọ bụ ya nyere iwu ka e kee ya agbụ tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ. Herọd mere nke a nꞌihi Herodịas nwụnye ọ lụrụ. Herodịas bụrị nwụnye Filip nwanne Herọd tupuu Herọd emegharịa ya anya, gwa ya ka ọ hapụ Filip ka ya onwe ya, bụ Herọd, lụwa ya. Nꞌoge ahụ, Jọn kwuru okwu megide ihe ọjọọ ahụ Herọd mere. Ọ gwara Herọd sị, “O zighị ezi na ị ga-alụ nwụnye nwanne gị.” Nꞌihi nke a obi jọrọ Herodịas njọ megide Jọn. Ọ chọkwara igbu Jọn nꞌihi okwu ahụ o kwuru. Ma Herọd ekweghị ka e gbuo Jọn. Nꞌihi na Herọd tụrụ egwu Jọn. Ọ maara na Jọn bụ ezi mmadụ, na onye dị nsọ. Nꞌihi nke a o tinyere ya nꞌụlọ mkpọrọ ichebe ndụ ya. Site nꞌoge ruo nꞌoge, Herọd na-akpọpụta Jọn ka ya na ya kparịa ụka. Ma ọ bụ ezie na Herọd adịghị enwe obi udo mgbe ọ bụla ya na Jọn kaparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ịna anụ ihe Jọn na-ekwu. Otu ụbọchị, Herodịas nwetara ihe ọ na-achọ. Nꞌụbọchị ncheta ọmụmụ Herọd, ọ kpọrọ oriri. Ọ kpọrọ ndị a maara aha ha nọ nꞌobi eze, na ndị ọchịagha ya, na ndị mmadụ dị mkpa bi na Galili ka ha bịa nꞌoriri ahụ. Nꞌoge oriri ahụ, ada Herọd, nke Herodịas mụtara, pụtara tee egwu nꞌihu Herọd na nꞌihu ndị ọbịa ya. Obi tọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ụtọ nꞌihu egwu o tere. Ya mere, Herọd gwara ada ya nwanyị okwu sị ya, “Kpọọ ihe ọ bụla ị chọrọ aha, aga m enye gị ya. Ejikeere m inye gị ọ bụladị otu mpaghara nke ihe nile dị nꞌalaeze m.” Nwanta nwanyị ahụ gbaara ọsọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ nna m ka o nye m?” Nne ya zara ya sị, “Laghachi azụ rịọ ya ka o nye gị isi Jọn omee baptizim ahụ!” Ngwangwa nwanta nwanyị ahụ laghachiri gwa Herọd nna ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nꞌime efere, isi Jọn omee baptizim.” O wutere eze Herọd mgbe ọ nụrụ ihe ada ya chọrọ ka o meere ya. Ma ebe ọ bụ na o kwere nkwa inye ya ihe ọ bụla nꞌihu ndị ọbịa ya, ọ chọghị ka ha chee na ọ bụ eze nke na-adịghị eme ihe o kwuru. O zipụrụ onye agha na-eche nche ka ọ gaa ngwangwa weta isi Jọn. Onye ahụ gara gbuo Jọn, bipu ya isi. Tinye isi ahụ nꞌime efere butere nwagbọghọ ahụ, onye naara ya bulaara nne ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ ihe mere, ha bịara buru ozu Jọn gaa lie ya. Ndị ozi ahụ Jisọs zipụrụ lọghachiri. Ha gbara Jisọs gburugburu kọọrọ ya ihe nile ha mere, na ihe ha ziri ndị mmadụ. Nꞌoge ahụ ọtụtụ ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ. Ụfọdụ na-abịakwute Jisọs, ụfọdụ na-esitekwa nꞌebe ọ nọ na-apụ. Nꞌihi nke a ndị na-eso ụzọ ya enweghị ohere iri nri. Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Baịanụ soro m. Ka anyị sitenụ nꞌetiti ndị mmadụ a pụọ, gaa ebe anyị ga-ezu ike.” Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ, baa nꞌime ụgbọ mmiri, gaa nꞌebe ha ga-anọdụrụ onwe ha. Ma ọtụtụ mmadụ hụrụ ha mgbe ha na-apụ. Ebe ha maara ebe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-aga, ha sitere nꞌobodo nile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ site ụzọ ọzọ gbaruo ebe ahụ tupuu Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo. Mgbe Jisọs sitere nꞌụgbọ mmiri wụdata, ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmiko nꞌebe ha nọ, nꞌihi na ha dị ka ụmụ ọkụkọ na-enweghị nne. O bidokwara izi ha ihe mgbe ahụ. Nꞌoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba. Nꞌihi ya ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere Jisọs sị ya, “Chi na-akwado iji, ebe a bụkwa ọzara. Zilaganụ ndị a ka ha gaa chọọrọ onwe ha ebe ha ga-azụta nri nꞌobodo ndị a dị anyị gburugburu.” Ma Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Chọọrọnụ ha ihe ha ga-eri.” Ndị na-eso ụzọ ya zara ya sị, “Esi aṅaa eme nke a? Ònye pụrụ ịzụ igwe mmadụ ha otu a nri? Ọ ga-efu oke ego inye ndị a nri!” Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị na gịnị ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Ọ dịghị anya ha bịaghachiri gwa ya sị, “Anyị nwere nanị ogbe beredi ise na azụ abụọ!” Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gwa igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. Ngwangwa ndị ahụ nọdụrụ ala nꞌigwe nꞌigwe. Ihe ruru iri mmadụ ise nọdụkọrọ nꞌotu ebe, ebe ọzọ kwa ihe ruru narị mmadụ nọdụkọrọ. Otu a ka ha nile siri nọdụchaa. Jisọs naara ogbe beredi ise na azụ abụọ ndị a welie anya ya elu kpee ekpere gọzie ha. Ọ nyawara beredi ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu a kwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha nile. Mmadụ nile riri rijuo afọ. Mgbe ha risịrị ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara ibiribe beredi na azụ dapụrụ nꞌala tụtụjuo ya nkata iri na abụọ. Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ riri nri ahụ dị puku mmadụ ise. Emesịa, na-atụfughị oge, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nꞌụgbọ mmiri bido ịga Betsaida. Ya onwe ya nọdụrụ chere izilaga ndị mmadụ ahụ. Mgbe ndị a nile lara, Jisọs hapụrụ ebe ahụ gaa nꞌelu ugwu ikpe ekpere. Nꞌabalị ahụ, mgbe ndị na-eso ụzọ ya nọ nꞌụgbọ mmiri, nꞌetiti osimiri ahụ, Jisọs nọrị nanị ya nꞌelu ala. Site nꞌebe ọ nọ nꞌelu ala, Jisọs hụrụ ka ndị na-eso ụzọ ya na ebili mmiri na-agba mgba. Ọ hụrụ na ndị na-eso ụzọ ya nọ na nsogbu, hụkwa na ikuku na-efe nꞌụzọ na-emegide ha. Nꞌihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nꞌelu mmiri ịbịakwute ndị na-eso ụzọ ya. Emesịa, o rutere ebe ha nọ, mee dị ka ọ chọrọ ịgafe ha. Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nꞌelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha hụrụ. Nꞌihi ya ha bidoro iti mkpu akwa. Ọ bụkwa ha nile hụrụ ya. Ụjọ tụkwara ha nile. Ma ngwangwa, Jisọs gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Unu atụla egwu, ọ bụ m.” Emesịa, ọ rigobatara nꞌime ụgbọ mmiri ahụ, soro ha nọdụ. Otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ndị na-eso ụzọ ya anya nke ukwuu. Nꞌihi na ha aghọtabeghị onye Jisọs bụ, ọ bụladị mgbe o nyesịrị puku mmadụ ise ahụ nri. Ha emegheghị obi ha ịnabata ihe nile anya ha hụrụ. Mgbe ha ruru nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ, ọ bụ nꞌobodo Genasaret ka ha kwụsịrị, kenye ụgbọ mmiri ha nꞌosisi. Mgbe ha pụtasịrị, ndị nọ nꞌebe ahụ matara onye Jisọs bụ. Ha gbaara ọsọ gaa nꞌobodo nta nile dị ebe ahụ gburugburu, ịkọsa akụkọ na Jisọs alọtala. Ha bidoro ibutere Jisọs ndị ọrịa nꞌute. Ebe ọ bụla Jisọs gara, nꞌobodo ukwu na obodo nta, ma ọ bụ nꞌubi, ndị mmadụ na-ebupụta ndị ọrịa ha nyibe ha nꞌahịa na nꞌakụkụ ụzọ. Ha rịọrọ Jisọs ka o kwere ka ndị ọrịa ahụ metụ ọnụ uwe ya aka. Ndị nile siri otu a metụ ya aka ka ahụ dịrị mma. Otu ụbọchị, ndị Farisii na ụfọdụ ndị ozizi iwu sitere Jerusalem bịa ịhụ Jisọs. Mgbe ha gbara ya gburugburu, ha hụrụ ụfọdụ nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs ka ha ji aka na-adịghị ọcha na-eri nri. Ha akwọghị aka tupuu ha erie ihe, dị ka omenala ndị Juu sịrị dị. Ọ bụ omenala ndị Juu, nke ka nke ndị Farisii, na tupuu mmadụ erie ihe, ọ ga-ebu ụzọ kwọọ aka ya. Omenala a bidororị nꞌoge dị anya. Ọ bụrụ na ndị Juu esite nꞌahịa lọta, ha agaghị eri ihe ọ bụla tutuu ha akwọọ aka ha. Ọ dịkwa omenala ọzọ dị iche iche ha nwere dị ka omenala ịsacha iko, ma ọ bụ ịsacha ite na efere. Nꞌihi na ndị na-eso ụzọ Jisọs edebeghị omenala ndị Juu a, ndị Farisii jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị edebe omenala ndị okenye anyị? Gịnị mere ha jiri were aka rụrụ arụ na-eri nri?” Jisọs zara sị ha, “Okwu ahụ Aịzaya kwuru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu. Nꞌihi na Aịzaya buru amụma sị, ‘Ndị a ji ire dị ụtọ na-ekwu okwu banyere m, ma nꞌime obi ha, ha ahụghị m nꞌanya. Ofufe ha na-efe m esiteghị nꞌobi ha pụta. Ihe ha na-ezikwa ndị mmadụ abụghị iwu m, kama ọ bụ iwu nke aka ha, nke ha chepụtara nꞌụche ha.’ Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa omenala unu ike.” Mgbe ahụ Jisọs gwakwara ha okwu sị, “Ihe unu na-eme bụ iwezụga iwu Chineke ka unu were omenala unu dochie nꞌọnọdụ ya. Dị ka ịma atụ, Mosisi nyere unu iwu sị, ‘Sọpụrụnụ nne na nna unu, onye ọ bụla kwujọrọ nne ya na nna ya ga-anwụ.’ Ma unu na-ewezụga iwu Chineke a mgbe unu na-ezi ndị mmadụ sị, Ọ̀ bụ ihe ziri ezi ka mmadụ ọ bụla gwa nne ya na nna ya mkpa na-akpa sị, ‘Lee, ego nile m nwere ugbu a bụ nke Chineke. Enweghị m ihe ọ bụla m ga-enye unu.’ Nꞌụzọ dị otu a unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka nꞌọnọdụ mkpa ha. Nꞌụzọ dị otu a kwa, unu na-ewezụga iwu Chineke were omenala unu dochie nꞌọnọdụ ya. Ọ dịkwa ọtụtụ ụzọ ọzọ unu si ewezụga iwu Chineke ma na-ewerekwa omenala unu dochie nꞌọnọdụ ya.” Mgbe ahụ Jisọs kpọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ka ha bịa ya nso. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị, “Geenụ ntị, unu nile! Ghọtakwanụ ihe m ga-ekwuru unu ugbu a. Ọ dịghị ihe ọ bụla banyere nꞌime mmadụ pụrụ ịmerụ ya. Nri ọ bụla adịghị nke pụrụ ịmerụ mmadụ. Kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nꞌime ya na-apụta, ihe ọ na-eche nꞌobi ya na nke ọ na-ekwupụta nꞌọnụ ya.” *** Emesịa, Jisọs hapụrụ ndị mmadụ ahụ banye nꞌime otu ụlọ. Nꞌebe ahụ ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya ka ọ kọwaara ha ihe okwu ahụ o kwuru pụtara. Jisọs jụrụ ha sị, “Unu na-akọwa na unu aghọtaghị okwu ahụ? Ọ̀ bụ na unu aghọtaghị na ihe ọ bụla unu riri apụghị ịmerụ unu? Nꞌihi na ihe unu riri na-abanye nꞌafọ unu, ọ bụghị nꞌobi unu. Ihe ọ bụla banyekwara nꞌafọ na-emesịa pụọ.” (Ihe Jisọs na-akọwa nꞌebe a bụ na ụdị nri ọ bụla dị ọcha dịkwa mma oriri.) Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ihe sitere nꞌime mmadụ pụta na-emerụ ya. Ya bụ, echiche mmadụ na ọchịchọ ya. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌime obi mmadụ ka echiche ọjọọ nile si apụta, ya na ịkwa iko nile dị iche iche, na izu ohi, na igbu mmadụ na ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye, na ịchị ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, na ekworo, na aghụghọ nile, na adịghị ọcha nile, na inwe anya ụfụ nꞌebe ndị ọzọ nọ, na nkwulu nile, na nganga, ya na enweghị uche ọ bụla. Ihe ọjọọ ndị a nile na-esite nꞌime mmadụ pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.” Jisọs hapụrụ ebe ahụ gaa akụkụ obodo Taịa. Nꞌebe ahụ ọ banyere nꞌime otu ụlọ. Ọ chọkwaghị ka ndị mmadụ mata na ọ nọ nꞌebe ahụ. Ma o nweghị ike zoo onwe ya. Ọtụtụ mmadụ chọpụtara ya, kọsaa akụkọ na ọ nọ nꞌebe ahụ. Ọ dịghị anya otu nwanyị bịakwutere ya. Nwanyị a nwere otu nwa nwanyị ntakịrị onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ nụla akụkọ banyere ọrụ Jisọs na-arụ, ya mere, ọ bịakwutere ya daa nꞌala nꞌụkwụ ya. Ọ rịọrọ Jisọs ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ bị nꞌime nwa ya nwanyị. (Nwanyị a bụ onye obodo Siria Fonisia. Ọ bụkwa onye mba ọzọ e ledara anya.) Jisọs sịrị ya, “Mkpa m ugbu a bụ inyere ndị m, bụ ndị Juu aka. O zighị ezi iwere nri e debeere ụmụaka tụpụrụ nkịta ka o rie ya.” Nwanyị ahụ zara sị, “Nke a bụ eziokwu Onyenwe m. Ma ụmụ nkịta na-erikwa ibiribe nri ụmụntakiri si na tebulu tụpụ nꞌala.” Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, ị zara nke ọma. Nꞌihi ọsịsa gị, ahụ adịla nwa gị nwanyị mma ugbu a. Laa nꞌụlọ gị.” Nwanyị ahụ laghachiri nꞌụlọ ya. Mgbe o ruru ọ hụrụ nwa ya nwanyị ahụ ka o dina nꞌelu ihe ndina. Mmụọ ọjọọ ahụ esitekwala nꞌebe ọ nọ pụọ. Emesịa, Jisọs sitere na Taịa lọghachi Saịdọn, sitekwa nꞌebe ahụ gabiga mpaghara Dekapolis jeruo nꞌosimiri Galili. Nꞌebe ahụ ka ọ nọ mgbe e kuteere ya otu nwoke ntị chiri, onye na-asụkwa nsụ. Ndị kutere ya rịọrọ Jisọs ka o bikwasị ya aka, gwọọ ya. Jisọs duuru nwoke ahụ pụọ nꞌebe igwe mmadụ ahụ nọ, ebe ha abụọ nọpụrụ iche. Nꞌebe ahụ Jisọs rụnyere nwoke ahụ mkpịsị aka nꞌime ntị ya abụọ. Jisọs gbụpụkwara ọnụ mmiri, metụkwa nwoke ahụ aka nꞌire. Mgbe ọ na-eme ihe ndị a o leliri anya nꞌeluigwe sụọ ude nꞌime onwe ya gwa nwoke ahụ okwu sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!” Ngwangwa, ntị nwoke ahụ meghere. Ọ kwụsịkwara ịsụ nsụ, bido na-ekwu okwu nke ọma. Emesịa, Jisọs nyere ndị ahụ iwu sị ha agwakwala onye ọ bụla ihe gbasara ọrụ ịrịba ama ọ rụrụ. Ma iwu dị otu a egbochighị ha, nꞌihi na ha gara kọsaa akụkọ ọrụ ịrịba ama nile ọ rụrụ. Nke ka nke, ọrụ ịrịba ama Jisọs rụrụ jubigara ha anya oke, mee ka ha kwuo sị, “Ihe nile ọ na-eme mara mma. Ọ na-eme ka ọ bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, na-emekwa ka ndị ogbi kwuo okwu.” Nꞌoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, ọ sịrị, “Enwere m ọmiko nꞌebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a ọ dịkwaghị ihe fọdụrụ ha ga-eri. Ọ bụrụ na m sị ha laa, ụfọdụ nꞌime ha ga-ada nꞌụzọ nꞌihi agụụ. Nꞌihi na ụfọdụ ha si nꞌebe dị anya bịa.” Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ọ̀ pụrụ ime bụ ịchọta nri ga-ezuru ha nꞌọzara a?” Jisọs zara sị ha, “Ogbe beredi ole ka unu nwere?” Ha zara sị ya, “Asaa.” Jisọs nyere iwu ka igwe mmadụ ahụ nọdụ ala. O weere ogbe beredi ahụ kpee ekpere nye Chineke ekele. Ọ nyawara beredi ahụ ntakịrị ntakịrị, nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ nile. Ndị na-eso ụzọ ya kekwara ya. Ha nwekwara azụ ntakịrị. Jisọs weere ya kpee ekpere, nyekwa Chineke ekele. Emesịa ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ya. Igwe mmadụ ahụ riri ihe tutuu ha erijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara ibiribe beredi dafuru nꞌebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa. Ndị riri nri a dị puku mmadụ anọ. Emesịa, Jisọs zipụrụ ha ka ha laa. Emesịakwa, Jisọs banyere nꞌụgbọ mmiri ya na ndị na-eso ụzọ ya, gaa nꞌakụkụ obodo Dalmanuta. Mgbe Jisọs ruru nꞌebe ahụ, ndị Farisii bịakwutere ya bido ịjụ ya ajụjụ. Ha gwara Jisọs okwu sị ya, “Ị bụrụ ihe ahụ ị sị na ị bụ, mee ka ihe dị egwu mee na mbara eluigwe. Mgbe ahụ anyị ga-ekwere na ị bụ onye ahụ.” Mgbe Jisọs nụrụ ihe ha chọrọ ka o mee, ọ sụrụ ude nke ukwuu nꞌime onwe ya sị ha, “Gịnị mere ndị ọgbọ a ji na-arịọ m ka m gosi ha ihe ịrịba ama tupu ha ekwere na m? Ka m gwa unu eziokwu, ọ dịghị ihe ịrịba ama a ga-egosi unu.” Ọ hapụrụ ha nꞌebe ahụ banyekwa nꞌụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ. Mgbe ha nọ nꞌụgbọ mmiri na-aga, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha chefuru iwere beredi. Ọ bụ nanị otu ogbe beredi fọdụụrụ ha. Mgbe ha nọ na-eche ihe banyere ya, Jisọs sịrị ha, “Ka m dọọ unu aka na ntị, kpacharanụ anya. Unu ekwela ka e jiri ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke ndị otu Herọd duhie unu.” Ndị na-eso ụzọ ya leritara onwe ha anya jụrịtaa onwe ha, “Gịnị ka ọ na-ekwu? Ọ̀ na-ekwu okwu a nꞌihi na anyị ewetaghị nri ga-ezuru anyị?” Mgbe Jisọs ghọtara na okwu ha na nke ya adakọtaghị, ọ gwara ha okwu sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu banyere ejighị beredi? Ọ̀ pụtara na unu adịghị aghọta? Ọ̀ pụtara na obi unu siri ike ịnabata okwu m? Ùnu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Ùnu nwere ntị nke na-ajụ ịnụ ihe? Ọ̀ ga-abụ na unu echefuola ngwangwa otu a? “Mgbe m ji beredi ise zụọ puku mmadụ ise ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.” Jisọs jụkwara ajụjụ ọzọ sị ha, “Mgbe m ji ogbe beredi asaa zụọ puku mmadụ anọ, ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.” Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụrụ na o si otu a dị, ùnu na-eche na nsogbu m bụ nꞌihi na unu chefuru iweta nri?” Emesịa, ha ruru Betsaida. Nꞌebe ahụ ụfọdụ mmadụ kpọtaara Jisọs otu onye ìs ì rịọọ ya ka o metụ ya aka, ka o bido ịhụ ụzọ. Jisọs duuru onye ìsì ahụ nꞌaka pụọ nꞌobodo ahụ. Mgbe ahu ọ gbụsara ọnụ mmiri nꞌanya nwoke ahụ metụkwa ya aka nꞌanya. Jisọs jụrụ nwoke ahụ sị, “Ị na-ahụ ihe ọ bụla?” Nwoke ahụ leliri anya elu sị Jisọs, “Ana m ahụ ndị mmadụ ka ha na-agagharị agagharị. Kama ha toro ogologo dị ka osisi.” Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara nwoke ahụ aka nꞌanya. Mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe nile nke ọma. Jisọs zilagara ya sị ya, “Alaghachikwala azụ nꞌime obodo.” Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipaị. Mgbe ha na-aga nꞌụzọ Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?” Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-eche na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ na-eche na ị bụ Ịlaịja ma ọ bụ otu nꞌime ndị amụma.” Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Onye ka unu onwe unu na-eche na m bụ?” Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst, Onye nzọpụta ahụ anyị na-ele anya ya!” Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọ bụla. Emesịa, Jisọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere otu ọ ga-esi hụọ ahụhụ, na otu ndị okenye, na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-esi jụ ya. Ọ gwara ha ihe banyere otu ha ga-esi gbuo ya, na otu ọ ga-esi site nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị nke atọ. Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ Jisọs pụọ nꞌotu akụkụ, bido ịbara ya mba na-asị, “Gịnị mere i ji na-ekwu ụdị okwu a?” Ma Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa Pita okwu nꞌụzọ ịba mba sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.” Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ ka ha bịa nso. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ ya buru obe ya so m nꞌazụ. Nꞌihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọ bụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nꞌihi m, na nꞌihi ozi ọma m, ga-ahụ ndụ nꞌụtọ ya. “Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ irite ụwa nile nꞌuru ma tufuo mkpụrụ obi ya? Ọ̀ dị ihe ọzọ dị nꞌụwa mmadụ nwere iji gbanworo ndụ ya? Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọ bụla nꞌihi m, na nꞌihi okwu m nꞌụwa ọjọọ a, na nꞌụwa mmehie a, ọ ga-abụkwara mụ bụ Nwa nke mmadụ ihe ihere mụ na onye ahụ inwekọ ihe ọ bụla, mgbe m ga-abịaghachi nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi dị nsọ.” Emesịa, Jisọs gwara ha sị, “Eziokwu ka m na-agwa unu, mgbe m na-asị, na e nwere ụfọdụ nꞌime ndị guzo nꞌebe a, ugbu a, ndị na-agaghị anwụ, tutuu ha ahụ ka alaeze Chineke ji ike bịa.” Mgbe abalị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemes na Jọn, duru ha rigoro nꞌelu ugwu. Nꞌebe ahụ ka ha nọdụrụ nanị ha. Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ, ha hụrụ Jisọs ka ọdịdị ya gbanwere nꞌihu anya ha. Uwe ya nwupụkwara ọcha karịa uwe ọcha ọ bụla nke anya hụrụla. Na mberede, ha hụrụ Ịlaịja na Mosisi ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu. Mgbe ahụ Pita tiri mkpu sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nꞌebe a ka anyị wuo ọnụ ụlọ nta atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu nke Mosisi, nke ọzọ kwa nke Ịlaịja.” *** Pita amakwaghịnụ ihe ọ na-ekwu, nꞌihi na oke egwu tụrụ ha atọ. Ma mgbe Pita kpụ okwu ya nꞌọnụ, igwe ojii kpuchigidere ha nile. Site nꞌime igwe ojii ahụ, ha nụrụ olu kwuru okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya! Geenụ ntị nꞌokwu ya.” Na mberede, mmadụ atọ ahụ lere anya gburugburu ha, ma ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa Jisọs. Mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs gwara ha sị, “Ka ntị ọ bụla hapụ ịnụ ihe banyere ihe a anya unu hụrụ taa, tutuu ruo mgbe m sitere nꞌọnwụ bilie.” Mmadụ atọ ahụ, Pita, na Jemes na Jọn agwaghị onye ọ bụla ihe ha hụrụ. Ma ha kwurịtara okwu nꞌetiti onwe ha itule ihe Jisọs bu nꞌuche mgbe ọ sị na ọ ga-esi nꞌọnwụ bilie. Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa?” Jisọs zara sị ha, “Nꞌezie, Ịlaịja kwesịrị ibu ụzọ bịa idozi ihe nile. Ma nꞌuche unu, gịnị mere ndị amụma jiri dee na Nwa nke mmadụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ? Ka m gwa unu eziokwu, Ịlaịja abịalarị. Ma ndị mmadụ mesokwara ya mmeso dị ka ndị amụma kwuru na ha ga-emeso ya.” Mgbe ha bịaruru nꞌebe ndị na-eso ụzọ Jisọs toolu ahụ nọ, ha hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ka ha gbara ha gburugburu. Nꞌetiti igwe mmadụ ahụ, ha hụrụ ndị ozizi iwu ka ha na ndị ozi ahụ nọ na-arụrịta ụka. Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ Jisọs, ọdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya. Jisọs juru ndị ozizi iwu ahụ ajụjụ sị, “Gịnị ka unu na ndị na-eso ụzọ m na-ekwu?” Otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi, akpọtaara m gị nwa m nwoke a ka ị gwọọ ya. Mmụọ ọjọọ na-esogbu ya. O mekwara ka ọ daa ogbi. Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nꞌala. Mgbe ahụ ọ na-agbọ ụfụfụ nꞌọnụ ya, na-ata ikikiri eze. Anụ ahụ ya na-adị sisiriri dị ka onye nwụrụ anwụ. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.” Jisọs sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Lee ka okwukwe unu si dị nta! Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupuu unu ekwere? Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-edi ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwanta nwoke ahụ!” Ha kpọtaara ya nwanta ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ Jisọs, o nugharịrị nwanta ahụ nke ukwuu. Nwanta ahụ dara nꞌala na-atụrụ onwe ya nꞌala, na-agbọkwa ụfụfụ nꞌọnụ ya. Jisọs jụrụ nna nwanta ahụ, “Olee mgbe ihe a bidoro?” Nna ya zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwanta nta. Mmụọ ọjọọ a na-eme ya ka ọ daba nꞌọkụ, ma ọ bụ na mmiri, ime ka ọ nwụọ. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.” Jisọs jụrụ nna nwanta ahụ sị, “Gịnị mere i ji na-asị Ọ̀ bụrụ na i nwere ike? Ọ dịghị ihe onye ọ bụla nwere okwukwe na-agaghị enweta.” Nna nwanta ahụ zara sị, “Ekweere m, biko mee ka m nwee okwukwe karịa.” Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ ahụ na-agba ọsọ na-abịa nꞌebe ọ nọ, ọ baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nꞌime nwanta a pụta! Abanyekwala nꞌime ya ọzọ!” Mmụọ ọjọọ ahụ tiri mkpu akwa, nugharịa nwanta ahụ ọzọ, site nꞌime ya pụta. Nwanta ahụ dara tọgbọrọ nꞌala dị ka onye nwụrụ anwụ. Ndị nile nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!” Ma Jisọs jidere ya nꞌaka selite ya elu, mee ka o guzo nꞌụkwụ ya. Nwanta ahụ guzokwara. Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nꞌebe ahụ pụọ. Mgbe ha batara nꞌụlọ ebe ha na-anọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya na nzuzo sị ya, “Gịnị mere o jiri siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?” Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nanị site nꞌike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị mmụọ ọjọọ ahụ.” Ha siri nꞌebe ahụ pụọ gafee Galili. Jisọs achọghị ka onye ọ bụla mata ebe ha nọ, nꞌihi na o ji oge ahụ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị ga-egbu ya, ha ga-egbukwa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nꞌọnwụ bilie.” Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Ha tụkwara egwu ịgwa ya ka ọ kọwaa ihe ọ na-ekwu. Emesịa, ha ruru Kapanọm. Mgbe ha banyere nꞌụlọ, Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya mgbe anyị nọ nꞌụzọ?” Ọ dịghị onye ọ bụla nꞌetiti ha kwuru ihe ọ bụla. Nꞌihi na mgbe ha nọ nꞌụzọ, ha na-arụrịta ụka banyere onye ka ibe ya ukwuu nꞌime ha. Jisọs nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya ka ha bịa nọdụ ya gburugburu. Mgbe ha nọdụsịrị ala, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu achọọ ịbụ onye ka ibe ya ukwuu, onye ahụ ga-eburu ụzọ bụrụ onye dịkarịsịrị nta, na onye na-ejere ibe ya ozi.” Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzo nꞌetiti ha. O kuuru nwanta ahụ nꞌaka ya sị ha, “Onye ọ bụla nabatara otu nꞌime ụmụntakịrị ndị a nꞌaha m, na-anabata m. Ma onye ọ bụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata Chineke onye zitere m.” Jọn, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya gwara Jisọs sị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ ma anyị kwụsịrị ya, nꞌihi na ọ bụghị otu nꞌime ndị na-eso anyị.” Ma Jisọs zara sị ya, “Ị garaghị akwụsị ya. Nꞌihi na onye ọ bụla ji aha m na-arụ ọrụ ịrịba ama agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m. Nꞌihi na onye ọ bụla na-adịghị emegide m, dịnyeere m. Eziokwu ka m na-agwa unu, onye ọ bụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nꞌaha m, nꞌihi na unu bụ ndị nke m, ga-anatakwa ụgwọ ọru ya. “Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emee ka otu nꞌime ndị a dị nta kweere na m, mehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume buru ibu nꞌolu ya, tụnye ya nꞌime osimiri, ebe mmiri ga-eri ya. “Ọ bụrụ na aka gị emee ka i mehie, gbupụ ya. Ọ dịrị gị mma iji otu aka dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, karịa na ị ga-eji aka abụọ banye nꞌọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ na-adịghị anyụ anyụ. *** “Ọ bụrụ na ụkwụ gị emee ka i mehie gbupụ ya tụfuo, nꞌihi na ọ kara gị mma ịbụ onye ụkwụ rụrụ karịa na ị ga-abụ onye nwezuru ụkwụ ya abụọ e tinyekọtaa gị na ha nꞌọkụ ala mmụọ. *** “Ọ bụrụkwa na anya gị emee ka i mehie, ghụpụ ya tụfuo ya. Ọ dịrị gị mma na i ji otu anya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi nꞌalaeze Chineke, karịa na i ga-enwe anya abụọ a tụba gị nꞌọkụ ala mmụọ, ebe a na-adịghị emenyụ ọkụ ahụ emenyụ. *** Ebe a ga-eji ọkụ nụọ onye ọ bụla dị ka ite. “Nnu bụ ihe dị mma. Ma ọ bụrụ na nnụ etufuo ụtọ ya, gịnị ka a ga-eji mee ka ọ dị ụtọ ọzọ? Ya mere, unu etufula ụtọ unu. Unu na ibe unu biri nꞌudo.” Emesịa, Jisọs sitere Kapanọm pụọ gaa nꞌakụkụ Judia, ebe dị nꞌakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ọ bụladị nꞌebe a, igwe mmadụ bịakwutere ya. Dị ka o si emekwa ebe ọ bụla ọ gara, Jisọs ziri ha ihe. Ụfọdụ dị Farisii bịara nꞌebe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe jụọ ya sị, “O ziri ezi ka nwoke gbaara nwụnye ya achọkwaghị m?” Ha jụrụ ya ajụjụ a nꞌihi na ha chọrọ ka ha site nꞌihe ọ ga-ekwu jide ya. Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị ka Mosisi kwuru nꞌiwu ya banyere ịgba achọghị m?” Ha zara sị ya, “Mosisi kwenyere ka nwoke dee akwụkwọ achọkwaghị m nye nwụnye ya, ma ọ bụrụ na ọ chọkwaghị ịlụ ya ọzọ.” Jisọs jụrụ ha sị, “Ùnu maara ihe mere Mosisi jiri nye unu iwu dị otu ahụ? Ọ bụ nꞌihi na unu bụ ndị afọ tara mmiri. Na mbụ, mgbe Chineke kere nwoke na nwanyị, o sighị otu a dịrị. Chineke mere nwoke na nwanyị ka e jikọtaa ha nꞌotu, ka ha abụọ bụrụ otu nꞌọlụlụ di na nwụnye. Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, ka e jikọtaa ya na nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. Mgbe ahụ ha agaghị abụkwa mmadụ abụọ, kama ha ga-abụ otu. Ya mere, ihe ọ bụla Chineke jikọtara, ka mmadụ ọ bụla hapụ ịtọsa ya.” Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya batara nꞌụlọ, ha jụrụ ya ka ọ kọwaara ha ihe o kwuru banyere nkewa nke di na nwụnye. Jisọs gwara ha sị, “Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya nꞌebe nwụnye ya nọ, lụọ onye ọzọ, na-eme mmehie ịkwa iko megide nwụnye ya ahụ o si na ya kewapụ onwe ya. Nwanyị ọ bụla kwa, kewapụrụ onwe ya site nꞌebe di ya nọ lụọ nwoke ọzọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.” Otu ụbọchị, ụfọdụ ụmụ nwanyị kuuru ụmụ ha na-abịakwute Jisọs ka o metụ ha aka gọzie ha. Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ha, ha chụpụrụ ụmụ nwanyị ndị a, gwa ha na o kwesịghị ka ha nye Jisọs nsogbu. Ma mgbe Jisọs hụrụ ihe a ndị na-eso ụzọ ya mere, o wutere mmụọ ya. Ọ baara ha mba sị, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nꞌihi na alaeze Chineke dịịrị ndị dị otu a. Eziokwu ka m na-agwa unu, onye ọ bụla na-anabataghị alaeze Chineke dị ka ụmụaka ga-esi nabata ya, agaghị abanye nꞌime ya.” Mgbe ahụ Jisọs kuuru ụmụntakịrị ahụ nꞌaka ya. O bikwasịrị ha aka nꞌisi, gọzie ha. Mgbe Jisọs sitere nꞌebe ahụ na-apụ, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nꞌihu ya. Ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m nwee ike iketa ndụ ebighị ebi?” Jisọs jụrụ ya, “Gịnị mere i ji na-akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọ bụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị nanị Chineke. Ma banyere ajụjụ ị jụrụ m, ị maara ihe banyere iwu ndị a nke na-asị, egbula mmadụ, akwala iko, agbala ama ụgha, aghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nna gị na nne gị?” Nwoke ahụ zara sị ya, “Ee, Onye ozizi, amaara m ihe banyere ha. Edebezuchaala m ha nile siterị na mgbe m bụ nwanta.” Jisọs lere nwoke ahụ anya, hụ ya nꞌanya. Mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ sị, “Ọ fọdụrụ nanị otu ihe ị ga-eme. Laa ugbu a, ree ihe nile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nꞌeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.” Mgbe nwoke ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ihu ya gbarụrụ. O sitere nꞌebe ahụ pụọ nꞌobi ọjọọ. Nꞌihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụ na ụba. Mgbe ahụ Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Lee ka o siri bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke.” Okwu a Jisọs kwuru juru ndị na-eso ụzọ ya anya. Ma Jisọs kwugharịkwara okwu ahụ ọzọ sị, “Ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ na ndị ahụ na-atụkwasị obi ha na akụ na ụba ha ga-abanye alaeze Chineke. Nꞌezie ọ dịịrị inyinya mfe isite nꞌanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanya nꞌalaeze Chineke!” Okwu a Jisọs kwuru ugbo abụọ juru ndị na-eso ụzọ ya anya karịa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ọ ga-arara ndị ọgaranya ahụ ịbanye, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Ọ bụrụ na anyị jiri anya mmadụ lee ya, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nꞌebe Chineke nọ, ihe nile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.” Pita zara ya sị, “Ugbu a anyị ahapụla ihe nile soro gị!” Jisọs zara ya sị, “Ana m agwa gị eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya, ụmụnne ya nwoke, ụmụnne ya nwanyị, nne ya, nna ya, ụmụ ya, na ala ubi ya nꞌihi m, na nꞌihi ozi ọma a, nke na-agaghị anataghachikwa nꞌụwa a, ụlọ, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị, ndị nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nꞌụwa ọzọ. Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazu, ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.” Ha nọ nꞌụzọ na-aga Jerusalem mgbe ihe ndị a na-eme. Jisọs kpo ihu, ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi so ya nꞌazụ. Otu a kwa ndị mmadụ nile na-abịa ha nꞌazụ tụkwara ụjọ. Ọzọ kwa, Jisọs kpọọrọ ndị na-eso ụzọ ya pụọ nꞌebe ndị mmadụ nọ bido na-agwa ha ihe na-akwado ịdakwasị ya. Ọ gwara ha sị, “Ugbu a anyị na-aga Jerusalem. Nꞌebe ahụ ka a ga-arara mụ, bụ Nwa nke mmadụ, nye nꞌaka ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama m ikpe ọnwụ, nyefee m nꞌaka ndị mba ọzọ ka ha gbuo m. Ndị a ga-enyefe m nꞌaka ha, ga-eji m mee ihe ọchị. Ha ga-agbụ m asụ, pịakwa m ihe. Emesịa ha ga-egbukwa m. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, aga m esite nꞌọnwụ bilie.” Mgbe ahụ, Jemes na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere Jisọs. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, ọ dị otu ihe anyị chọrọ ka i meere anyị.” Jisọs zara sị ha, “Gịnị ka ọ bụ? Kwuonụ ka m nụ.” Ha zara sị ya, “Nꞌoge ahụ, mgbe ị ga-abụ eze, nọkwasị nꞌocheeze gị, anyị chọrọ ịnọdụ nꞌakụkụ gị, otu onye nꞌime anyị nꞌoche dị nꞌakụkụ aka nri gị, onye ọzọ, nꞌoche dị nꞌaka ekpe gị.” Jisọs sịrị ha, “Echeghị m na unu ghọtara ihe unu na-arịọ ka m meere unu. Ùnu chere na unu pụrụ ịṅụ site nꞌiko ilu nke obi ọjọọ, nke mụ onwe m na-aga ịṅụ? Ùnu chere na unu pụrụ ịnagide ụdị ahụhụ nile nke ga-abịakwasị m?” Ha zara sị ya, “Ee, Onyenwe anyị, anyị pụrụ ime ihe ndị a nile.” Ma Jisọs zara sị ha, “Nꞌezie, unu ga-enwe ike ṅụọ site nꞌiko ahụ, nke m ga-aṅụ, unu ga-enwekwa ike hụọ ụdị ahụhụ nke m na-aga ịhụ. Ma ọ bụghị m ka ọ dịrị ikwu onye ga-anọ nꞌaka nri m, ma ọ bụ nꞌaka ekpe m. Chineke ekpebielarị ndị ga-anọ nꞌebe ndị a.” Mgbe ndị na-eso ụzọ iri ahụ fọdụrụ nụrụ ihe Jemes na Jọn na-arịọ Jisọs ka o meere ha, iwe were ha nke ukwuu megide ụmụnne abụọ ahụ. Ma Jisọs kpọkọtara ha nile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze ụwa a, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike achị ndị nọ nꞌokpuru ha. Ma nꞌetiti onwe unu ọ gaghị esi otu a dịrị. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịbụ onye ukwu, ọ ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu ozi. Onye ọ bụla kwa chọrọ ịbụ onye dị ukwuu karịa unu nile, kwesịrị ịbụ onye na-ejere onye ọ bụla nꞌime unu ozi. Nꞌihi na mụ onwe m, Nwa nke mmadụ, abịaghị nꞌụwa ka ndị mmadụ jeere m ozi. Kama abịara m ijere ndị mmadụ ozi, na inye ndụ m ka ọ bụrụ ihe a ga-eji gbapụta ọtụtụ mmadụ.” Mgbe ahụ ha ruru Jeriko. Mgbe ha nọtụsịrị nꞌebe ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, na ọtụtụ igwe mmadụ bidoro isite nꞌobodo ahụ pụọ. Ma o nwere otu nwoke kpuru ìsì aha ya bụ Batimiọs, nke pụtara nwa Timiọs, onye nọ nꞌakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. Mgbe Batimiọs nụrụ na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe, o bidoro iti mkpu na-asị, “Jisọs nwa Devidi, meere m ebere!” Ọtụtụ mmadụ baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ gị!” Ma Batimiọs nọgidere na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devidi, meere m ebere!” Jisọs kwụsịrị gwa ndị mmadụ okwu sị, “Kpọọnụ ya!” Ha kpọrọ onye ìsì ahụ sị, “Enyi, taa bụrụ gị ụbọchị ọma. Bilie ọtọ, ọ na-akpọ gị!” Batimiọs tụpụrụ akwa ochie ya nꞌotu akụkụ, wulie elu bịakwute Jisọs. Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Batimiọs zara sị, “Onye ozizi, arịọ m gị, achọrọ m ịhụ ụzọ!” “Laa!” Ka Jisọs gwara ya, “Okwukwe gị agwọọla gị!” Nꞌotu oge ahụ Batimiọs bidoro ịhụ ụzọ, soro Jisọs na-agbada ụzọ ahụ. Mgbe ha bịaruru nso Jerusalem, ha rutere obodo nta Betfeji nke dị na Betani. Emesịa, ha bịarutere ugwu olivu. Nꞌebe ahụ ka Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nꞌime obodo nta dị nꞌihu anyị. Mgbe unu na-abanye nꞌime obodo ahụ, unu ga-ahụ nwa inyinya ibu, nke onye ọ bụla na-arịkwasịbeghi nꞌelu ya. Tọpụnụ ya nꞌagbụ kpụtara m ya. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu ihe mere unu jiri na-atọpụ ya nꞌagbụ, sịnụ onye ahụ, na ọ dị nna unu ukwu mkpa. Anyị ga-akpụghachi ya ma emesịa.” Ndị ahụ e ziri ozi gara nꞌobodo nta ahụ, hụ inyinya ibu ebe Jisọs sị na ha ga-ahụ ya. E kenyere ya nꞌosisi dị nꞌihu otu ụlọ. Mgbe ndị ahụ bidoro ịtọpụ ya, ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ inyinya ibu ahụ?” Ha gwara ndị ahụ ihe Jisọs gwara ha ka ha kwuo. Ndị ahụ hapụrụ ha ka ha tọrọ inyinya ibu ahụ. Mgbe ahụ ha kpụtaara Jisọs inyinya ibu ahụ, tụsaa uwe ha nꞌazụ ya. Jisọs nọkwasịrị nꞌelu inyinya ibu ahụ. Mgbe ahụ kwa, ọtụtụ mmadụ nꞌime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nꞌụzọ, ndị ọzọ tụsara alaka osisi ha gbutere nꞌọhia. Ndị nọ Jisọs nꞌihu na ndị na-eso ya nꞌazụ, tiri mkpu na-asị, “Ka Chineke gọzie ya! Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị! “Ngọzi dịrị alaeze ahụ na-abịa, alaeze nna anyị Devidi! Ka Chineke site nꞌeluigwe gọzie ya!” Otu a ka Jisọs siri banye Jerusalem, gaa nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke. O legharịrị anya nꞌihe nile dị nꞌebe ahụ, emesịa, ọ hapụrụ Jerusalem gaa Betani, ya na ndị na-eso ụzọ ya, nꞌihi na chi ebidola iji. Nꞌụtụtụ echi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ bidoro ịgụ Jisọs. Site nꞌebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiigi nꞌihu ya nke nwere ahịhịa ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gara nꞌukwu ya ile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nꞌelu ya. Mgbe o ruru nꞌukwu osisi ahụ, ọ hụghị mkpụrụ ọ bụla, nanị ahịhiạ ndụ, nꞌihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ. Mgbe ahụ Jisọs gwara osisi a okwu sị, “Site nꞌụbọchị taa gaa nꞌihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe Jisọs kwuru okwu a. Ha sitere nꞌebe ahụ pụọ na-aga nꞌihu nꞌije ha ịga Jerusalem. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jisọs banyere nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, bido ịchụpụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa nꞌebe ahụ. O kpugharịrị tebulu ndị na-agbanwe ego, kwatuokwa ọdụ ahịa ndị na-ere nduru. O gbochikwara onye ọ bụla iwebata ngwongwo ahịa orire nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ. Ọ gwara ndị nọ nꞌebe ahụ sị, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ụlọ nsọ m ga-abụ ụlọ ekpere nye mba nile,’ ma unu emeela ya ka ọ ghọọ ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike.” Mgbe ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha bidoro ịchọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ha tụrụ egwu na Jisọs pụrụ ime ka ọgba aghara bido, nꞌihi na ọtụtụ mmadụ na-anabata okwu ya nke ọma. Nꞌanyasị ụbọchị ahụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Jerusalem pụọ. Nꞌisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha sitere nꞌakụkụ osisi fiigi ahụ Jisọs bụrụ ọnụ na-agafe, ha hụrụ na osisi a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ ruo nꞌalaka ya. Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru ụnyaahụ, gwa Jisọs okwu sị, “Onye ozizi, lee anya! Osisi fiigi ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!” Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Nweenụ okwukwe nꞌime Chineke. Nꞌihi na m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe nꞌime Chineke, unu pụrụ ịgwa ugwu olivu a okwu sị, ‘Site nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa daba nꞌime osimiri.’ Ọ bụrụ na unu enweghị obi abụọ, kama kwere na ihe unu kwuru ga-emezu, ọ ga-emezukwa dị ka unu siri kwuo ya. “Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọ bụla unu rịọrọ mgbe unu kpere ekpere, nweenụ okwukwe na unu anatala ya, ọ ga-emezukwara unu dị ka unu siri kpee ya. Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu. “Ma ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaghara, Nna unu bi nꞌeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.” Nꞌoge a ha erutela Jerusalem ọzọ. Mgbe Jisọs nọ na-ejegharị nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ, ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya. Ha jụrụ ya ajụjụ sị, “Ebee ka i si nweta ike i ji eme ihe ndị a ị na-eme? Onye nyere gị ike ime ha?” Jisọs zara ha sị, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ. Unu zaa m ajụjụ m, aga m aza unu ajụjụ unu, gwakwa unu onye nyere m ike m ji mee ihe m mere.” Nke a bụ ajụjụ Jisọs jụrụ ha, “Ònye zitere Jọn omee baptizim? Ò bụ Chineke ka ọ bụ onye ọzọ? Gwanụ m!” Ndị isi nchụaja ahụ na ndị ozizi iwu na ndị okenye ahụ tulere okwu a kpebie sị, “Ọ bụrụ na anyị asaa ya na ọ bụ Chineke zitere Jọn omee baptizim, ọ ga-ajụ anyị ihe mere anyị jiri jụ ịnabata ozi ya. Ọ bụrụkwa na anyị asị na ọ bụghị Chineke zitere ya, anyị na-etinye onwe anyị na nsogbu, nꞌihi na igwe mmadụ ndị a ga-ebido ọgba aghara.” Nꞌihi na ndị mmadụ kweere na Jọn bụ onye amụma. Ya mere ha zara Jisọs sị ya, “Anyị enweghị ike ịsa ajụjụ gị. Anyị amaghị.” Jisọs zakwara sị ha, “Mgbe ahụ mụ onwe m agakwaghị agwa unu onye nyere m ike ịrụ ọrụ ndị a nile.” Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọrọ ndị mmadụ ahụ akụkọ. Nke a bụ otu nꞌime akụkọ ọ kọọrọ ha. “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nꞌubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O wukwara mbadamba ala ebe a ga-anọ na-apịpụta mmiri vaịnị ahụ, wuokwa ụlọ ebe ndị nche ga-anọ. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o nyefere ubi ahụ nꞌaka ụfọdụ mmadụ ka ha lekọtaa ya anya. Mgbe oge ịghọ mkpụrụ vaịnị ahụ ruru, onyenwe ubi ahụ zipụrụ otu onye na-ejere ya ozi ka o jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata ha ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ubi ahụ. Ma ndị ahụ jidere onyeozi a tie ya ihe. Emesịa, ha zipụrụ ya nꞌaka efu. “Emesịakwa, onyenwe ubi ahụ zipụkwara onye ọzọ na-ejere ya ozi. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ tikwara ya ihe, tụọ ya nkume, tụwaa ya isi, meekwa ya ihe ihere. Onyenwe ubi ahụ zigakwara onye ọzọ, ma ha gburu ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ozi, ma ndị na-elekọta ubi ahụ gburu ụfọdụ, tie ndị ọzọ ihe. Tutuu ruo mgbe onyenwe ubi ahụ nwere nanị otu onye ọzọ fọdụrụ nke ọ ga-eziga, nke bụ ọkpara ya ọ hụrụ nꞌanya. O zigara ya nꞌebe ndị na-elekọta ubi ahụ. Echiche ya bụ na ha ga-asọpụrụ ọkpara ya. “Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara nwoke a ka ọ na-abịa, ha sịrịtara onwe ha, ‘Lee! onye a na-abịa bụ onye ga-eketa ihe nile onyenwe ubi a nwere. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ubi a bụrụkwa nke anyị.’ Ha jidere ya gbuo ya, tufee ahụ nꞌazụ mgbidi ubi ahụ. “Gịnị ka unu chere onyenwe ubi ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa laa ndị ajọ mmadụ ahụ nꞌiyi. Ọ ga-enyefekwa ndị ọzọ ubi ahụ nꞌaka. Unu chetara ihe akwụkwọ nsọ kwuru? Ọ sịrị na ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ iji ime ihe ọ bụla, abụrụla nkume dị mkpa nꞌụlọ ahụ ugbu a. Ọ bụ Onyenwe anyị rụrụ ọrụ a, nke dị mma nꞌanya anyị.’ ” Mgbe ahụ ndị isi ndị Juu ahụ chọrọ ụzọ ijide ya, nꞌihi na ha maara na ọ bụ ha ka Jisọs ji atụnye ndị mmadụ ọjọọ ahụ na-elekọta ubi nꞌime akụkọ ahụ ọ kọrọ. Ma ha emetụghị ya aka nꞌihi na ha tụrụ egwu ihe ndị mmadụ ga-eme ha. Ya mere, ha hapụrụ ya pụọ. Ma ndị isi Juu mesịrị zite ụfọdụ mmadụ site nꞌotu ndị Farisii na ndị otu Herọd ka ha gwa ya okwu, ile ma ha ga-esite nꞌokwu ọnụ ya jide ya. Ndị a bịakwutere Jisọs sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ nwoke na-ekwu eziokwu na-atụghị egwu. Ị dịghị echegbu onwe gị banyere ihe ndị mmadụ na-ezu megide gị, nꞌihi na ị naghị ele mmadụ anya nꞌihu. Kama ị ji obi ọcha na-ezi otu mmadụ ga-esi mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ma ugbu a, anyị chọrọ ka ị gwa anyị, o ziri ezi ịtụ ụtụ nye Siza, ka o zighị ezi. “O ziri ezi ka anyị tụọ, ka ị sị anyị hapụ ịtụ?” Ma Jisọs ghọtara ajụjụ aghụghọ ha. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji chọọ ịghụ m ọnụ? Wetaranụ m otu mkpụrụ ego ka m lee ya anya.” Ha wepụtara otu mkpụrụ ego nye ya. Jisọs lere ego ahụ anya jụọ ha ajụjụ sị, “Ihu onye na aha onye ka e bikwasịrị nꞌego a?” Ha zara sị, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ Jisọs zara ha sị, “Nyenụ Siza ihe ruuru Siza. Ma nyekwanụ Chineke ihe ruuru ya.” Ọsịsa Jisọs juru ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ anya. Emesịa, ndị Sadusii pụtara ịjụ ya ajụjụ. Ndị Sadusii bụ ndị na-ekwenyeghị na mbilite nꞌọnwụ dị. Nke a bụ ajụjụ ha jụrụ Jisọs. “Onye ozizi, Mosisi nyere anyị iwu sị na ọ bụrụ na nwoke ọ bụla anwụọ na-amụtaghị nwa nwanne ya nwoke ga-alụ nwụnye nwoke ahụ, mụta ụmụ ndị ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ. Ugbu a e nwere ụmụnne asaa. Nke mbụ lụrụ nwụnye ma ọ nwụrụ na-amụtaghị nwa. Nke abụọ lụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ma ya onwe ya nwụkwara na-amụtaghị nwa. Ihe ndị a siri otu a mee tutuu ụmụnne asaa ahụ alụọ nwanyị ahụ, ma o nweghị onye nꞌime ha mụtara nwa. Emesịa, nwanyị ahụ nꞌonwe ya nwụkwara. “Ugbu a, nꞌụbọchị mbilite nꞌọnwụ ònye nꞌime mmadụ asaa ahụ ka nwanyị a ga-alakwuru ka ọ bụrụ di ya?” Jisọs zara sị ha, “Ihe na-enye unu nsogbu bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu amakwaghị ihe ọ bụla banyere ike Chineke. Nꞌihi na mgbe ụmụnne asaa ahụ ga-esi nꞌọnwụ bilie, ha agaghị alụkwa di na nwụnye, nꞌihi na ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe. “Ma banyere ndị nwụrụ anwụ isite nꞌọnwụ bilile, ọ̀ bụ na unu agụtabeghị nꞌakwụkwọ Ọpụpụ ihe Chineke gwara Mosisi mgbe o gosiri Mosisi onwe ya nꞌọkụ ahụ na-enwụ nꞌosisi? Chineke gwara ya sị, ‘Abụ m Chineke Eberaham, Chineke Aizik, na Chineke Jekọb.’ “Ihe Chineke na-akọwara Mosisi nꞌoge ahụ bụ na ya bụ Chineke ndị dị ndụ, ọ bụghị Chineke ndị nwụrụ anwụ. Nꞌebe a ka unu dahiere nꞌechiche unu!” Otu nꞌime ndị ozizi iwu bịara nꞌebe ahụ nꞌoge ha na-ekwu okwu ahụ, guzo gee ntị nꞌihe ha na-ekwu. Mgbe ọ hụrụ na Jisọs nyere ndị Sadusii ahụ ezi ọsịsa, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Nꞌime iwu nile olee nke kachasị mkpa?” Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu ahụ kwuru sị, ‘Geenụ ntị ndị Izirel! Onyenwe anyị bụ nanị otu Chineke. Unu kwesịrị iji obi unu nile na mkpụrụ obi unu nile, na echiche obi unu nile, na ike unu nile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nꞌanya.’ “Iwu ṅke abụọ, nke dịkwa mkpa, bụ nke sị, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.’ Iwu ọ bụla ọzọ adịghị nke karịrị ndị a mkpa.” Nwoke ahụ zara sị, “Ị zara nke ọma mgbe i kwuru na Chineke bụ nanị otu, na e nweghị chi ọzọ di karịa ya. Ị zakwara nke ọma mgbe ị zara na ịhụ ya nꞌanya dị mkpa karịa aja nsure ọkụ na onyinye ọchụchụ aja nile.” Mgbe Jisọs hụrụ na nwoke a ghọtara ihe ndị a nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Mgbe nke a gasịrị, ọ dịkwaghị onye ọ bụla ọzọ nwere obi ike ịjụ ya ajụụ ọzọ. Emesịa, mgbe Jisọs nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu unu ji na-sị na Onye nzọpụta ahụ na-abịa bụ nwa Devidi? Devidi nꞌonwe ya sitere nꞌike Mmụọ Nsọ kwuo sị, ‘Chineke gwara Onyenwe m okwu sị ya, nọdụ nꞌakụkụ m tutuu ruo mgbe m mere ka ndị iro gị bụụrụ gị ihe ịtụkwasị ụkwụ.’ Devidi nꞌọnwe ya kpọrọ Onye nzọpụta a Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ Onye nzọpụta siri bụrụ nwa Devidi?” Ụdị okwu a tọrọ ndị na-ege Jisọs ntị ụtọ nꞌobi. O mekwara ka ha gezie ntị nke ọma. Emesịa, Jisọs gwara ndị mmadụ ahụ okwu sị, “Kpacharanụ anya unu nꞌebe ndị ozizi iwu nọ. Nꞌihi na ọ na-atọ ha ụtọ iyi uwe buru ibu na-agagharị. Ọ na-atọ ha ụtọ ka e kelee ha ekele pụrụ iche nꞌahịa. Ọ na-atọkwa ha ụtọ ka e nye ha oche dị mkpa nꞌụlọ ekpere unu na nꞌoge mmemme ọ bụla. Ma ha bụ ndị na-abanye nꞌụlọ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ pụnarị ha ihe ha nwere. Ha na-ezo ihe ha bụ, ma na-ekpe ogologo ekpere nꞌọha. Nꞌihi ihe ndị a nile ha na-eme, ahụhụ ha ga-adị ukwuu!” Emesịa, Jisọs gara nọdụ ala nꞌebe ọ ga-anọ na-ahụ ndị mmadụ mgbe ha na-etinye onyinye ha nꞌime igbe onyinye. Ọtụtụ ndị ọgaranya bịara tụnye ego buru ibu. Ma otu nwanyị batara. Ọ bụ ogbenye, bụrụkwa onye di ya nwụrụ. Ọ tụnyere mkpụrụ ego ọla abụọ ntakịrị nke ruru otu kobo. Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nwanyị ahụ atụnyela ego dị ukwuu karịa ndị nile tụnyere ego nꞌime igbe onyinye a. Nꞌihi na ndị ọzọ sitere nꞌịba ụba nke ego ha nwere tụnye, ma nwanyị a tụnyere ego nile o nwere nꞌụlọ ya.” Mgbe Jisọs sitere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ na-apụ nꞌụbọchị ahụ, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ ndị a si maa mma! Lee ụdị nkume ọma e ji wuo ha!” Jisọs zara sị ya, “Unu hụrụ ụlọ ndị a, oge na-abịa mgbe unu na-agaghị ahụ ọ bụladị otu nkume nke e ji wuo ụlọ ndị a nꞌelu ibe ya, nꞌihi na a ga-ala ha nꞌiyi.” Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ ala nꞌugwu olivu, na ncherita ihu ụlọ nsọ ukwu dị na Jerusalem, Pita na Jemes, na Jọn na Anduru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a i kwuru ga-emezu! Anyị ga-esi aṅaa mata na ihe ndị a na-aga ime?” Jisọs sịrị ha, “Lezienụ anya ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu. Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa nꞌaha m sị na ha bụ Onye nzọpụta ahụ. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ ndị ga-ege ha nti. *** Unu ga-anụ, hụkwa mkpọtụ agha dị iche iche. Ma ka ụjọ hapụ ịtụ unu. Ihe dị otu a aghaghị ime. Ma o gosighị na ọgwụgwụ oge ihe nile eruola. “Mba ga-ebili lụso mba ọsọ agha. Alaeze ga-ebilikwa buso alaeze ọzọ agha. A ga-enwe ala ọma jijiji nꞌọtụtụ obodo dị iche iche. Ụnwụ ga-adịkwa. Ma ihe ndị a nile bụ nanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa nꞌoge dị nꞌihu. Ma mgbe ihe ndị a na-eme, lezienụ anya! A ga-akpụrụ unu gaa nꞌụlọ ikpe, tiekwa unu ihe nꞌụlọ ekpere dị iche iche. Nꞌihi m kwa, a ga-agbara unu akwụkwọ nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị. Oge a bụkwa oge unu ga-eji gwa ha ozi ọma ahụ. Nꞌihi na a ga-ebu ụzọ kwusaa ozi ọma nye mmadụ nile tupu ọgwụgwụ oge ihe nile eruo. Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nꞌụlọ ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji sara ọnụ unu. Kama gwanụ ha ihe ọ bụla Chineke tinyere nꞌọnụ unu ikwu nꞌoge ahụ. Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu. “Ụmụnne ga-arara ụmụnne ha nye ka e gbuo ha. Nna ga-arara nwa ya nye. Ụmụ ga-ararakwa nna ha nye ka e gbuo ha. Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m. Ma ndị nile nọgidere bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ruo nꞌogwụgwụ ihe nile, ndị jụrụ ịgọnarị m nꞌoge a, ka a ga-azọpụta. “Mgbe unu hụrụ ihe arụ ahụ ka o guzo nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, ka onye na-agụ ghọta ihe nke a pụtara, gbalaganụ! Gbaranụ ọsọ gaa nꞌugwu Judia! Ọ bụrụ na ị nọ nꞌelu ụlọ agbalịkwala ịrịdata ịbanye nꞌụlọ gị iwere ihe ọ bụla, kama gbaa nnọọ ọsọ dị ka ike gị ha! Ọ bụrụ na ị nọ nꞌubi alaghachila azụ nꞌụlọ ịchịrị uwe i ji achụ oyi. “Ụbọchị ahụ ga-adị nnọọ oke egwu nye ụmụ nwanyị ndị dị ime, na ụmụ nwanyị na-enye ụmụaka ara. Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nꞌoge oyi. Nꞌihi na ahụhụ nke ụbọchị ndị ahụ ga-adị ukwuu karịa ahụhụ ọ bụla mmadụ hụrụla site na mgbe ụwa bidoro. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gwụchaala ma Onyenwe anyị mere ka oge ahụhụ ahụ dị mkpirikpi. Ma ọ bụghị ya, ọ dịghị onye ọ bụla ga-afọdụ ndụ nꞌụwa. Ma nꞌihi ndị ya, bụ ndị ọ họpụtara, Chineke emeela ka oge ndị ahụ dị mkpirikpi. “Nꞌoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu sị, ‘Lee! onye a bụ Onye nzọpụta ahụ, ma ọ bụ onye ahụ bụ Onye nzọpụta ahụ,’ unu ekwela. Nꞌihi na ọtụtụ ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta ìhè nꞌoge ahụ. Ha ga-arụ ọrụ ebube ha ga-eji gbalịa ịghọgbu ndị Chineke họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Kpacharanụ anya! Adọọla m unu aka na ntị!” “Mgbe ahụhụ nke ụbọchị ahụ gasịrị, ọchịchịrị ga-agba nꞌebe nile, nꞌihi na anwụ agaghị enyekwa ìhè. Otu a kwa ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya ọzọ. Kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa. Mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. “Nꞌoge ahụ, mmadụ nile, nꞌebe nile, ga-ahụ m, Nwa nke mmadụ, ka m ji ike dị ukwuu na ebube na-abịa nꞌime igwe ojii nke eluigwe. Mgbe ahụ ka m ga-ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke ụwa, site nꞌotu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ. “Ugbu a mụtanụ ihe site nꞌosisi fiigi. Mgbe ọ bụla alaka ya gbụrụ akwụkwọ ya nile ma malite iwepụta ahịhịa ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso. Nꞌụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a nile m gwara unu ka ha bidoro ime, matanụ na ọggwụgwụ oge ihe nile dị nso, nꞌezie ọ dị nnọọ nso! “Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tutuu ihe ndị a emezuo. Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide tutuu ihe nile m kwuru emezuo. “O nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ihe ndị a ga-eme, ma ọ bụ oge ha ga-emezu. Ndị mmụọ ozi amaghị, Nwa nke mmadụ amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna m maara. Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọọnụ na nche ụbọchị nile. Unu arahụkwala ụra. “Ọbịbịa m ka a ga-eji tụnyere otu nwoke hapụrụ ụlọ ya gaa mba ọzọ. Tupu ọ pụọ, ọ kpọrọ ndị ọrụ ya nye ha ọrụ ha ga-arụ tupuu ọ lọta. Emesịa, ọ gwara onye na-eche ụlọ ya nche ka ọ na-ele anya nlọghachi ya. Ya mere, unu onwe unu kwesịrị iche nche, nꞌihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nꞌanyasị, ma ọ bụ nꞌetiti abalị, ma ọ bụ mgbe ọkụkọ kwara akwa, ma ọ bụ nꞌụtụtụ. Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nꞌụra. Ya mere, ihe m na-agwa unu ugbu a kọsaaranụ ya mmadụ nile nꞌebe nile. Na-elenụ anya maka nlọghachi m.” Abalị abụọ tupu e mee mmemme ngabiga, nke bụ oge ndị Juu na-eri beredi a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi jide Jisọs ka ha gbuo ya. Ma ha gwarịtara onwe ha sị, “Anyị agaghị eme nke a nꞌoge mmemme a, ka ọgba aghara hapụ ịdị.” Nꞌoge ahụ Jisọs nọ na Betani nꞌụlọ Saịmọn onye ekpenta. Nꞌoge ha na-eri nri anyasị, otu nwanyị batara nꞌime ụlọ ahụ. O bu karama mmanụ otite dị oke ọnụ ahịa. Ọ kụwara karama mmanụ ahụ, wụọ Jisọs mmanụ ahụ nile nꞌisi. Ụfọdụ ndị nọ nꞌebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “A ga-akpọ nke a gịnị? Nke a bụ nnọọ oke mmebi! A gaara ere mmanụ a ihe karịrị nari naịra atọ, were ego e retara nye ndị ogbenye.” Ha tamuru ntamu megide ya. Ma Jisọs sịrị ha, “Hapụnụ nwanyị a aka. Unu enyela ya nsogbu. Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụụrụ m. Unu na ndị ogbenye na-anọ oge nile. Unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọ bụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya. “Nwanyị a na-agbalị ime ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ a ugbu a iji kwadoo ahụ m maka olili a ga-eli ya. Ana m agwa unu eziokwu na ebe ọ bụla e kwusara ozi ọma a nꞌụwa nile, ọrụ a nwanyị a rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe o mere.” Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ndị isi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara Jisọs nye ha nꞌaka. Mgbe ndị isi nchụaja nụrụ okwu o ji bịa ha ṅụrịrị ọṅụ kwe ya nkwa inye ya ego. Site nꞌụbọchị ahụ Judas bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara Jisọs nye. Nꞌụbọchị mbụ nke mmemme ngabiga, mgbe ndị Juu na-egbu atụrụ ha ji achụ aja ngabiga ahụ, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa doziere gị ihe, maka iri ori ngabiga?” Jisọs ziri mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya ozi sị ha, “Gaanụ nꞌime obodo. Mgbe unu na-aga nꞌụzọ unu ga-ezute otu nwoke bu ite mmiri. Soronụ ya gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Mgbe unu rutere nꞌụlọ ebe ọ banyere, gwanụ onyenwe ụlọ ahụ sị, Onye ozizi anyị sị ka anyị jụọ gị ebe ị kwadoro ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ rikọọ oriri ngabiga anyasị. Nwoke ahụ ga-egosi unu otu ọnụ ụlọ buru ibu nꞌelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe nile. Kwadoonụ nri anyị nꞌebe ahụ.” Ndị na-eso ụzọ ya abụọ ahụ hapụrụ ebe ahụ baa nꞌime obodo. Ha hụrụ nwoke ahụ dị ka Jisọs gwara ha. Mgbe ha ruru nꞌụlọ ahụ ha bidokwara ịkwado nri anyasị ahụ. Nꞌanyasị, Jisọs bịarutere nꞌụlọ ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Eziokwu ka m na-agwa unu, otu onye nꞌime unu ga-arara m nye. Ee, otu onye so m ugbu a na-eri nri!” Okwu a Jisọs kwuru mere ka obi jọọ ndị na-eso ụzọ ya njọ. Ha bidoro ịjụ ya nꞌotu nꞌotu sị, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?” Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ otu onye nꞌime unu iri na abụọ. Otu onye mụ na ya na-amanyekọta aka nꞌime otu efere nri a. Leenụ! mụ bụ Nwa nke mmadụ na-aga ịnwụ dị ka ndị amụma si kwuo ya nꞌoge gara aga. Ma lee ụdị ahụhụ na-eche nwoke ahụ e sitere nꞌaka ya rara m nye! Nꞌezie, ọ gaara adịrị ya mma ma a sị na a mụghị ya!” Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs weere otu ogbe beredi kelee Chineke ekele nꞌihi ya, nyawaa ya. O nyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Werenụ beredi a taa, nꞌihi na ọ nọchiri anya anụ ahụ m.” Emesịa, o buuru iko mmanya nye Chineke eleke nꞌihi ya, bunyekwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nile sitere nꞌiko ahụ ṅụọ mmanya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Mmanya a unu ṅụrụ nọchiri anya ọbara a na-awụsị nꞌihi ọtụtụ mmadụ. Ọbara a na-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị nꞌetiti Chineke na mmadụ guzosie ike. Eziokwu ka m na-agwa unu na agaghị aṅụkwa mmanya a ọzọ tutuu ruo mgbe m ga-aṅụ mmanya ọzọ karịrị ya mma nꞌalaeze Chineke.” Emesịa, ha bụrụ abụ, site nꞌebe ahụ pụọ, gaa nꞌugwu olivu. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Na mgbe na-adịghị anya ugbu a, unu nile ga-ahapụ m gbalaa, nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ndị amụma kwuo sị, ‘Aga m egbu onye ọzụzụ atụrụ, mee ka igwe atụrụ ya gbasasịa.’ Ma mgbe m si nꞌọnwụ bilie, aga m aga Galili izute unu nꞌebe ahụ.” Pita gwara ya sị, “A sịkwa na ndị ọzọ a nile ahapụ gị gbalaa, ọ dịghị mgbe m ga-ahapụ gị gbalaa!” Jisọs sịrị Pita, “Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na taa, ọ bụghị echi, tupu oke ọkụkọ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Pita kwusiri ike sị, “Ọ dịghị! Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ndị ọzọ bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs kwukwara otu okwu ahụ. Emesịa, ha gara ije rute ebe a na-akpọ Getsemanị. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nọdụnụ nꞌebe a ka m gaa nꞌihu nke nta ikpe ekpere.” Ọ gwara Pita na Jemes, na Jọn ka ha soro ya. Mgbe o bidoro ịga nꞌihu o bidokwara inwe obi ọjọọ na obi ịlọ mmiri nke ukwuu. Ọ gwara mmadụ atọ ahụ sị, “Obi m na-achọ itiwa ruo nꞌọnwụ nꞌihi ihe mgbu dị nꞌime ya. Nọdụnụ nꞌebe a soro m chee nche.” Ọ hapụrụ ha gaa nꞌihu nke nta, daa nꞌala. O kpere ekpere rịọ ma ọ ga-ekwe mee ka ihe ọjọọ na-akwado ịdakwasị ya gabiga, hapụ ịbịakwasị ya. O kpere ekpere sị, “Nna, o nweghị ihe nyịrị gị ime. Ekwela ka ihe ọjọọ a bịakwasị m. Ma ọ bụghị uche m ka m chọrọ ka o mezuo, kama ka uche gị mezuo.” Emesịa, ọ lọghachiri azụ nꞌebe mmadụ atọ ahụ nọ, chọpụta na ha nọ nꞌụra. Ọ kpọrọ Pita sị ya, “Pita, ọ̀ bụ ụra ka ị na-arahụ? Ọ̀ bụ na i nweghị ike soro m chee nche otu awa? Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa. Ọ na-agụ mmụọ m agụụ ime ihe Chineke chọrọ, ma anụ ahụ adịghị ike.” Ọ hapụkwara ha ọzọ gaakwa nꞌihu, kpeekwa otu ụdị ekpere ahụ. Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nꞌihi na ike gwụrụ ha. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya. Ọ hapụkwara ha gaa kpeekwa ekpere ọzọ. Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ gwara ha sị, “Ùnu nọrịrị na-arahụ ụra ma na-ezukwa ike? O zuola! Bilienụ! Oge ịrahụ ụra agafeela! Lee! A rarala mụ bụ Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị mmadụ ọjọọ. Bilienụ! Bịanụ ka anyị pụọ! Lee! Onye ahụ raara m nye na-abịa!” Mgbe ọ kpụ okwu a nꞌọnụ, lee Judas, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya bịara. Ya na igwe mmadụ so. Ụfọdụ nꞌime ha ji mma, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zitere ha ijide Jisọs. Tupuu ha abịaruo ebe Jisọs nọ Judas gwara ha sị, “Onye unu ga-ejide bụ onye ahụ m ga-ekele. Kpụrụnụ ya pụọ!” Ya mere, Judas bịakwutere Jisọs nꞌotu oge ahụ sị ya, “Onye ozizi!” Ọ bakụrụ ya. Nꞌotu oge ahụ, igwe mmadụ ahụ jiri aka ike jide Jisọs. Ma otu onye nꞌime ndị nọ nꞌebe ahụ mịpụtara mma ya gbupụ ntị otu onye na-ejere onyeisi nchụaja ozi. Jisọs jụrụ ndị ahụ jidere ya ajụjụ sị, “Abụ m onye na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike unu jiri buru mma na osisi pụta ijide m? Ụbọchị nile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nꞌụlọ nso ukwu Chineke, ma unu ejideghị m. Ma ihe ndị a na-eme ugbu a ime ka ihe akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-eme mezuo.” Nꞌoge a ndị na-eso ụzọ ya nile ahapụla ya gbalaa. Ma ọ dị otu nwokorọbịa soro ha. Ọ ma akwa. Mgbe ndị ahụ chọrọ ijide ya ọ gbara ọsọ. Ma akwa ya dapụrụ, ya agbara ọtọ ihu na azụ gbalaa. Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nꞌụlọ onyeisi nchụaja ebe ndị isi nchụaja nile na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ. Pita sooro ha, ma ọ nọ ebe dị anya. O sooro ha bata nꞌezi onyeisi nchụaja. Nꞌezi ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ. Ndị isi nchụaja na ndị isi ikpe ụlọ ikpe ukwu ndị Juu zukọrọ na-agbalị ịchọpụta ebubo ha ga-ebo Jisọs, ka ha site na ya gbuo ya. Ma o nweghị ihe ha chọpụtara. Ọtụtụ mmadụ bịara gbaa ama ụgha, ma o nweghị onye ama nke ya na nke ibe ya dakọtara. Nꞌikpeazụ, ụfọdụ mmadụ biliri boo ya ebubo ụgha a, ha sịrị, “Anyị nụrụ mgbe nwoke a kwuru sị, ‘Aga m ala ụlọ nsọ ukwu a mmadụ wuru nꞌiyi, ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị aga m ewukwa ụlọ nsọ ọzọ, nke a na-ejighị aka mmadụ wuo.’ ” Otu ọ dị, ama ha adakọtakwaghị. Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nꞌihu ha jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ị̀ chọghị ikwu okwu? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ebubo ndị a e boro gị?” Ma Jisọs ekwughị okwu ọ bụla. Ọzọ kwa, onyeisi nchụaja jụrụ Jisọs sị, “Ị̀ bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke bụ Onye a gọziri agọzi?” Jisọs zara sị ya, “Ee, abụ m ya. Ọ bụkwa eziokwu ka m na-agwa unu mgbe m na-asị, na unu ga-ahụ m, bụ Nwa nke mmadụ, ka m sooro Chineke nọdụ nꞌaka nri ocheeze ya nꞌeluigwe. Unu ga-ahụkwa m ka m na-abịaghachi nꞌigwe ojii nke mbara eluigwe.” Mgbe onyeisi nchụaja nụrụ okwu a Jisọs kwuru, ọ dọwara uwe ya nꞌiwe, tie mkpu sị, “Gịnị ọzọ ka anyị na-achọ? Ọ bara uru ịchọkwa ndị ọzọ ga-agbagide ya ama? Unu anụla okwu arụ si ya nꞌọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha nile tiri mkpu sị, “O kwesịrị ọnwụ!” Mgbe ahụ ụfọdụ nꞌime ha bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri. Ndị ọzọ jiri akwa kechie anya ya, bido jiri aka ha na-eti ya ihe. Mgbe ha na-eti ya ihe, ha na-agwa ya sị, “Onye amụma, gwa anyị, ònye tiri gị ihe?” Ọ bụladị ndị nche nọ nꞌebe ahụ kpụpụtara ya nꞌezi na-eti ya ihe. Mgbe Pita nọ nꞌezi nꞌakụkụ ọkụ, otu nꞌime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ. Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, ọ bịara nso lezie ya anya nke ọma. Mgbe ahụ ọ gwara Pita sị, “Ị bụ otu nꞌime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret.” Ma Pita gọrọ agọ sị ya, “Amaghị m, aghọtaghị m ihe ị na-ekwu.” Mgbe Pita na-ekwu okwu, o ji azụ azụ pụọ gaa guzo nꞌakụkụ ụzọ e si abata nꞌezi ụlọ ahụ. Mgbe nwagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nꞌebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs.” Ma Pita gọkwara agọ nke ụgboro abụọ. Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nꞌezie, ị bụ otu nꞌime ndị na-eso Jisọs, nꞌihi na ị bụ onye Galili.” Mgbe ahụ Pita bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụrụ ndị ahụ iyi na-asị, “Nꞌezie, amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.” Nꞌotu oge ahụ kwa, oke ọkụkọ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara ihe Jisọs gwara ya. Nꞌihi na Jisọs gwara ya sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị ugboro atọ.” Mgbe Pita tụlere okwu ndị a nꞌobi ya, o bidoro ịkwa akwa. Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị nke ọzọ ya, ndị isi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu na ndị nile na-eso ha anọdụ nꞌụlọ ikpe ndị Juu zukọtara ikpebi ihe ọzọ ha ga-eme. Ha kpebiri iji ndị nche duru Jisọs jekwuru Paịlet, bụ onye na-achị obodo ndị Juu nꞌoge a. Mgbe Pailet hụrụ Jisọs, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs zara sị ya, “Ee, ọ bụ dị ka i siri kwuo ya.” Mgbe ahụ ndị isi nchụaja bidoro ikwu ọtụtụ ihe ọjọọ ha sị na Jisọs mere. Ma Jisọs emegheghị ọnụ ya ịgọrọ onwe ya. Nke a mere Pailet jiri jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ị̀ dịghị ekwu okwu? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị!” Ma Jisọs ekwughị ihe ọ bụla. Nke a juru Pailet anya. Nꞌoge ahụ, ọ bụ omenala na Pailet ga-ahapụrụ ndị Juu otu onye nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌoge mmemme ngabiga. Onye mkpọrọ Pailet na-ahapụ na-abụ onye ahụ ndị Juu chọrọ. Nꞌoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nꞌụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị na-ebu aghara, ndi gbukwara mmadụ nꞌoge ọgba aghara ahụ. Igwe mmadụ gbakọrọ na-ajụ Pailet ka o mezuo omenala ahụ site nꞌịhapụrụ ha otu onye. Mgbe ahụ Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?” Nꞌihi na Pailet maara na ndị isi nchụaja sitere nꞌekworo chọọ igbu Jisọs, nꞌihi na ihe banyere ya dị ọtụtụ mmadụ mma. Ma ndị isi nchụaja kwaliri igwe mmadụ ka ha kwagide Pailet ka ọ hapụrụ ha Barabas kama Jisọs. Pailet jụrụ ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m jiri nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu mee?” Ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nꞌobe!” Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Nꞌihi gịnị? Gịnị bụ ihe ọjọọ o mere?” Ma igwe mmadụ ahụ tiri mkpu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe!” Ebe ọ bụ na Pailet chọrọ ime ka obi tọọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụrụ Barabas. Emesịa, o nyere ndị agha ya iwu ka ha pịa Jisọs ihe. Nꞌikpeazụ, o nyefere ya ka a kpọgide ya nꞌobe. Ndị agha ndị Rom ahụ duuru Jisọs baa nꞌime ime ogige ụlọ onye ọchichị ahụ. Ha kpọkọtara ndị agha nile nọ nꞌebe ahụ. Ha yikwasịrị Jisọs uwe ndị eze, nke na-acha uhie uhie. Ha jikwa ogwu kpaa okpu ha kpukwasịrị ya nꞌisi. Emesịa, ha bidoro ikele ya, na-eti mkpu na-asị, “Ka eze ndị Juu nwee ogologo ndụ!” Mgbe ha nọ na-eme ya ihe ọchị a, ha jikwa osisi na-eti ya nꞌisi ọtụtụ mgbe, na-agbụkwa ya ọnụ mmiri. Ha gburu ikpere nꞌihu ya na-akpọ isi ala na-enye ya. Mgbe ike gwụrụ ha iji ya mee ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe uhie uhie ahụ, yikwasịkwa ya uwe nke aka ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ, ịkpọgide ya nꞌobe. Mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga ebe ha ga-anọ kpọgide ya nꞌobe, ha zutere otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye Sirini. Nwoke a bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ndị agha kwagidere ya ka o buru obe Jisọs. Nꞌikpeazụ, ha duuru Jisọs rute ebe a na-akpọ Gọlgọta, nke pụtara, ebe okpokoro isi. Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ, nke ga-egbochi ya inwe ihe mgbu, ma Jisọs jụrụ ịṅụ ya. Emesịa, ha kpọgidere ya nꞌosisi. Ndị agha ahụ kere uwe ya nꞌetiti onwe ha, fee nza ịchọpụta onye ga-enwe nke ọ ga-enwe. Ọ bụ nꞌelekere toolu nke ụtụtụ ka ha jiri kpọgide ya nꞌosisi. Ọ dị ihe e dere kụpanye nꞌelu osisi ahụ. Ebe ahụ ka e dere ebubo e boro Jisọs. Nke a bụ ihe ha dere, “EZE NDỊ JUU”. A kpọgidekwara mmadụ abụọ na-apụnarị mmadụ ihe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌaka nri Jisọs, onye nke ọzọ nꞌaka ekpe ya. Nꞌụzọ dị otu a, e mezuru ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “A gụkọtara ya na ndị mmadụ ọjọọ.” Ndị mmadụ si nꞌebe ahụ ha kpọgidere ya nꞌobe gafee fufere isi ha na-akwa ya emu na-asị, “Leenụ ya ugbu a! Nke a bụ nwoke ahụ sị na ya ga-akwatụ ụlọ nsọ ukwu Chineke wụgharịa ya nꞌime ụbọchị atọ! Gịnị ka ị nọ nꞌelu obe ahụ na-eme? A sị na ị bụ onye ahụ ị na-akpọ onwe gị, site nꞌelu obe ahụ rịdata! Zọpụtanụ onwe gị!” Ọ bụladị ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu kwakwara ya emu na-asị, “O nwere ike ịzọpụta ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya.” Ha tikuru Jisọs sị ya, “Bịa, Onye nzọpụta, eze Izirel, si nꞌelu obe ahụ rịdata! Anyị ga-ekwerekwa na ị bụ ihe nile i kwuru na ị bụ.” Ndị ahụ akpọgidekọrọ ha na Jisọs nꞌobe nọkwa na-abụ ya ọnụ. Nꞌihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara ebe nile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nꞌelekere atọ nke ehihie. Nꞌelekere atọ nke ehihie ụbọchị ahụ, Jisọs tiri mkpu akwa nꞌoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” Nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ nanị m nꞌebe a?” Ma ụfọdụ ndị guzo nso ebe a kpọgidere ya nꞌobe nụrụ okwu a Jisọs kwuru. Ha sịrị, “Geenụ ntị, ọ na-akpọ Ịlaịja!” Ya mere, otu onye nꞌime ha gbara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nꞌime mmanya gbara ụka, fanye ya nꞌogologo osisi, welie ya elu detụ ya nꞌọnụ Jisọs. Mgbe ọ na-eme nke a, ọ sịrị, “Ka anyị leenụ ma Ịlaịja ọ ga-abịa wetuo ya nꞌosisi a!” Mgbe Jisọs tikwara mkpu ọzọ, o kubiri ume, nwụọ. Nꞌotu mgbe ahụ, akwa mgbochi ụlọ nsọ ukwu Chineke, bụ nke dị nꞌetiti ebe nsọ na ebe kachasị nsọ, sitere nꞌelu gbawaa abụọ ruo nꞌọnụ ala ala ya. Mgbe ọchịagha ndị Rom guzo nso nꞌobe ahụ hụrụ otu Jisọs siri nwụọ, ọ sịrị, “Nꞌezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!” Ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nꞌebe dị anya na-ele ihe ndị a nile ka ha na-eme. Ndị a bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemes nke nta, na Joses, na Salomi. Ụmụ nwanyị ndị a bụ ndị naara eso Jisọs na-ahụ maka mkpa ya, mgbe ọ nọ na Galili. Ha na ụmụ nwanyị ndị ọzọ ndị nọkwa nꞌebe ahụ so Jisọs bịa Jerusalem. Ihe ndị a nile mere nꞌụbọchị ọ ga-abụ o jie bọọ, ọ bụrụ ụbọchị izuike ndị Juu. Ọ bụkwa nꞌoge anyasị ka ha mere. Josef, onye Arimatia, otu nꞌime ndị na-anọ nꞌụlọ ikpe ndị Juu, na onye a na-asọpụrụ, onye bụkwa onye na-ele anya ọbịbịa alaeze ahụ, jiri obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o nye ya ike ibudata ahụ Jisọs. Ọ juru Pailet anya ịnụ na Jisọs anwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ndị Rom jụọ ya ma ọ bụ eziokwu na Jisọs anwụọla. Mgbe ọchịagha ahụ gwara Pailet na Jisọs anwụọla, Pailet nyere Josef ike iwetu ahụ Jisọs na ili ya. Josef zụtara akwa ọcha dị ogologo. O wedatara ahụ Jisọs, jiri akwa ọcha ahụ kee ya. Emesịa, o buuru ozu Jisọs buba ya nꞌime ili nke aka ya, nke o gwuru nꞌime nkume. Nꞌikpeazụ, o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ili ahụ. Meri Magdalin na Meri nne Jisọs guzo nꞌebe ahụ na-ele anya, hụ ebe e bubara ozu Jisọs. Nꞌoge anyasị ụbọchị nke ọzọ ya, Meri Magdalin, Meri nne Jemes na Salomi gara zụta ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ Jisọs mmanụ. Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị Sọnde, mgbe anyanwụ wara, ụmụ nwanyị ndị a buuru ihe ahụ ha zụrụ bido ịga nꞌili ahụ. Mgbe ha nọ nꞌụzọ, ha juru onwe ha ajụjụ sị, “Onye ga-enugharịrị anyị nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ?” Ma mgbe ha bịarutere lelie anya elu, ha hụrụ na e nugharịala nkume ukwu ahụ. Ha banyere nꞌime ili ahụ. Nꞌime ya ha hụrụ nwokorọbịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nꞌakụkụ aka nri ili ahụ. Ụjọ tụrụ ụmụ nwanyị a! Ma nwokorọbịa ahụ gwara ha sị, “Unu atụla ụjọ, amaara m na ọ bụ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nꞌobe ka unu na-achọ. Ọ nọkwaghị nꞌebe a, o sitela nꞌọnwụ bilie! Lee ebe e nyibere ya na mbụ. Ugbu a laghachinụ kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya, ha na Pita. Gwa ha na Jisọs eburula ha ụzọ gaa Galili izute ha. Unu ga-ahụ ya nꞌebe ahụ dị ka ọ gwara unu tupuu ọ nwụọ.” Ụmụ nwanyị ahụ gbapụtara site nꞌili ahụ nꞌọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọ bụla ihe ọ bụla, nꞌihi na ụjọ jupụtara ha obi. Nꞌụbọchị mbụ nꞌizu ụka, mgbe Jisọs si nꞌọnwụ bilie, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, nwanyị ahụ o sitere nꞌahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa. Meri lara gaa chọpụta ndị na-eso ụzọ Jisọs ka ha nọ nꞌọnọdụ iru uju na ịkwa akwa, gwa ha na Jisọs esitela nꞌọnwụ bilie. Mgbe ha nụrụ ihe Meri kwuru, ha ekwenyeghị na ọ bụ eziokwu. Mgbe nke a gasịrị, Jisọs mere ka mmadụ abụọ nꞌime ha hụ ya anya, mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga otu obodo nta. Ma Jisọs gosiri ha onwe ya dị ka onye ọbia. Mgbe mmadụ abụọ a chọpụtara na ọ bụ Jisọs ka ha hụrụ, ha gbaghachiri Jerusalem gaa kọọrọ ndị ọzọ, ma ha ekwenyeghị. Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ha, mgbe ha nile nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nꞌihi enweghị okwukwe ha, na nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌihe Meri na ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha banyere mbilite nꞌọnwụ ya. Emesịakwa, ọ gwara ha sị, “Gaanụ nꞌime ụwa nile kwusaa ozi ọma nye onye ọ bụla nꞌebe ọ bụla. Ndị kweere na ndị e mere baptizim ka a ga-azọpụta. Ma ndị jụrụ ikwere ka ọmụma ikpe dịrị. “Ndị kweere ga-enwekwa ihe iriba ama a ga-egosi okwukwe ha. Ha ga-esite nꞌaha m chụpụ mmụọ ọjọọ. Ha ga-ekwukwa okwu nꞌasụsụ ọhụrụ dị iche iche. Aka ha ka ha ga-eji tụtụlie agwọ, ma ọ gaghị ata ha. Ọ bụrụ na ha aṅụọ nsi, ọ gaghị egbu ha. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka nꞌahụ, mee ka ahụ dị ha mma.” Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nꞌeluigwe, ebe ọ nọdụrụ nꞌakụkụ aka nri Chineke. Mgbe ihe ndị a gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya pụrụ kwusaa ozi ọma nꞌebe nile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha. O gosiri na okwu ha bụ eziokwu site nꞌinye ha ike ịrụ ọrụ ebube nke ya na nkwusa ozi ọma ahụ so. Tiofilọs onyenwe m, ọtụtụ agbalịala otu ha nwere ike idetu nꞌakwụkwọ, akụkọ banyere ihe nile Chineke sitere nꞌaka Jisọs mezuo nꞌetiti anyị. Ndị ahụ dere ihe a, dere gwa anyị ihe ha hụrụ na nke ha nụrụ site nꞌọnụ ndị ji anya ha hụ ihe ndị a mgbe ha mezuru. Ha dekwara ihe ha nụrụ site nꞌọnụ ndị ozi Jisọs ndị kwusara ozi ọma ahụ. Ebe ọ bụkwa na mụ onwe m eleziela anya nke ọma nyochaa akụkọ ndị a nile, site na mgbe ihe nile bidoro ruo nꞌọgwụgwụ ya, ekpebiela m idere gị akụkọ ahụ nile nꞌusoro dị ka ihe nile siri mee. Ana m eme nke a nꞌihi na achọrọ m ka i nwee afọ ojuju na ihe nile e ziri gị banyere ozi ọma ahụ bụ eziokwu. Akụkọ a bidoro nꞌoge eze Herọd na-achị ala Judia nile. Nꞌoge ahụ kwa, e nwere otu onye nchụaja ndị Juu a na-akpọ Zakaraya. O so nꞌotu ndị nchụaja a na-akpọ Abaija. Otu a na-ejekwa ozi nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem. Zakaraya nwere nwụnye aha ya bụ Elizabet, onye a mụkwara nꞌezinụlọ ndị nchụaja. Zakaraya na nwụnye ya biri ezi ndụ nꞌihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụru nile Chineke nyere na-enweghị ntụpọ ọ bụla. Kama ha amụtaghị nwa, nꞌihi na Elizabet enweghị ike ịtụrụ ime. Nꞌoge akụkọ a bidoro, Zakaraya na Elizabet emeela nnọọ agadi. Otu ụbọchị, mgbe òtu Abaija ketara ịrụ ọrụ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, Zakaraya sokwara na-arụ ọrụ nke o ketara ịrụ dị ka onye nchụaja nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Nꞌoge ahụ kwa a họpụtara Zakaraya ka ọ bụrụ onye ga-abanye nꞌime ime ụlọ nsọ ahụ ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ. *** Mgbe Zakaraya banyere ịchụ aja ahụ, igwe ndị mmadụ bịara ife Chineke nꞌụbọchị ahụ nọ nꞌezi na-ekpe ekpere, nꞌihi na ọ bụ omenala na mgbe ọ bụla onye nchụaja banyere ịchụ ụdị aja a, ndị mmadụ ga-anọ nꞌezi na-ekpe ekpere. Mgbe Zakaraya nọ nꞌime ime ụlọ nsọ ahụ na-achụ aja ya, mmụọ ozi Chineke mere ka Zakaraya hụ ya anya. Mmụọ ozi a bịara guzo nꞌakụkụ aka nri ebe nchụaja ahụ Zakaraya nọ na-achụ aja nsure ọkụ ya. Mgbe Zakaraya hụrụ mmụọ ozi a, obi fepụrụ ya. Ọ tụkwara oke egwu. *** Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu sị, “Zakaraya, atụla egwu! Nꞌihi na abịara m ịgwa gị na Chineke anụla ekpere gị. Ọ ga-emekwa ka Elizabet nwụnye gị tụrụ ime, mụtara gị nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jọn. Ọmụmụ nwanta a ga-ewetara unu oke ọṅụ na obi ụtọ. Ọtụtụ mmadụ ga-esorokwa unu ṅụrịa ọṅụ. Nꞌihi na nwanta ahụ ga-abụ onye dị ukwuu nꞌanya Chineke. Ọ gaghị emetụ mmanya ọ bụla aka, ọ gaghị aṅụkwa mmanya na-egbu egbu, nꞌihi na site nꞌafọ nne ya, Chineke ga-emejupụta ya na Mmụọ Nsọ. Ọrụ ya ga-abụ ịkpọghachite ọtụtụ ụmụ Izirel nꞌebe Onyenwe ha na Chineke ha nọ. Dị ka Ịlaija siri bụrụ nwoke dị ike, na onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, otu a ka Jọn ga-adị. Ọ bụ ya ga-aga nꞌihu Onye nzọpụta ahụ na-abịa, kwadoo ndị mmadụ ịnabata Onyenwe anyị. Jọn ga-emekwa ka udo dịrị nꞌetiti ndị nna na ụmụ ha, ọ ga-akpọghachitekwa ndị na-enupụ isi mee ka ha bụrụ ndị ga-eche uche dị ka ndị ezi omume.” Zakaraya jụrụ mmụọ ozi ahụ ajụjụ sị ya, “Olee otu m ga-esi mata na ihe ị gwara m bụ eziokwu? Ị hụlanụ na abụrụla m agadi nwụnye m bụkwa agadi.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Aha m bụ Geburel. Ọ bụ nꞌihu Chineke, onye zitere m iwetara gị akụkọ ọma a ka m na-anọ ụbọchị nile. Geekwa ntị ka m gwa gị! Ebe ị jụrụ ikwenye nꞌihe m gwara gị, a ga-anapụ gị ike ikwu okwu. Ị gaghị ekwukwa okwu ọ bụla, tutuu ruo mgbe okwu a m gwara gị mezuru. Nꞌihi na okwu a m gwara gị ga-emezu mgbe oge ya ruru.” Mgbe ihe ndị a nile na-eme, ndị mmadụ ahụ gbakọrọ nꞌezi na-ekpe ekpere, nọkwa na-eche Zakaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nꞌime ime ụlọ nsọ ukwu ahụ. Mgbe Zakaraya mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Nꞌihi na ọ bụ aka ya ka o ji gwa ha okwu. Ha ghọtara na ọ ga-abụ na Zakaraya ahụla ọhụ nꞌime ụlọ nsọ ahụ. Mgbe oge ịrụ ọrụ ya nꞌụlọ nsọ ahụ gwụsịrị, Zakaraya laghachiri azụ nꞌụlọ ya. Ọ dịkwaghị anya site nꞌoge Zakaraya lara, Elizabet nwụnye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nꞌime ụlọ ha ọnwa ise. Mgbe ihe si otu a mee, mkpu ọṅụ si nꞌọnụ Elizabet pụta. O kwuru sị, “Lee ka Onyenwe anyị siri meere m ebere! O wepụla ihe ihere gaara abụ nke m nꞌihi amụtaghị nwa.” Mgbe ime Elizabet ruru ọnwa isii, Chineke zikwara mmụọ ozi ya Geburel, ka ọ gaa nꞌobodo Nazaret nke dị nꞌime Galili. Chineke ziri ya ka o jekwuru otu nwagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ndị mụrụ ya kwere nkwa ịkpọnye Josef nwa nwa Devidi, ka ọ bụrụ nwụnye ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutere nwagbọghọ ahụ sị ya, “Nwagbọghọ, ekele! Gị onye ihuọma Onyenwe anyị dịkwasịrị. Chineke nọnyekwaara gị!” Meri enweghị udo nꞌobi ya mgbe ọ nụrụ okwu a mmụọ ozi kwuru. O bidokwara ịtụgharị nꞌuche ya ihe ekele a pụtara. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, nꞌihi na Chineke ekpebiela imere gị ihe ọma! Lee anya, ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, onye aha ị ga-agụ ya bụ Jisọs. Nwa nwoke a ga-abụ onye ukwu, onye a ga-akpọkwa Ọkpara Chineke kachasị elu. Chineke ga-eme ya ka ọ bụrụ eze. Ọ ga-enyekwa ya ocheeze Devidi nna nna ya. Ọ ga-abụ onye ga-achị ndị Izirel ruo mgbe ebighị ebi. Ọchịchị ya agakwaghị agwụ agwụ.” Meri jụrụ mmụọ ozi ahụ ajụjụ sị, “Ebe m na-enweghị di, aga m esikwanụ aṅaa mụta nwa?” Mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke ga-abịakwasị gị, ike Chineke ga-ekpuchikwa gị. Mgbe ahụ nwa ahụ ị ga-amụ ga-abụ onye dị nsọ. A ga-akpọkwa ya Ọkpara Chineke. I chetara Elizabet onye ikwu gị? Agadi ahụ? Ndị mmadụ sị na ọ gaghị amụlitekwa nwa, ma gịnị mere ugbu a? Ọ dị ime ọnwa isii ugbu a o merela agadi. O si otu a mee nꞌihi na ọ dịghi ihe nyịrị Chineke ime.” Meri zara sị, “Ahụ m na mkpụrụ obi m bụ nke Onyenwe anyị. Ejikeere m ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ka m mee. Ka ihe nile mezuokwa dị ka i si kwuo!” Na-atụfughị oge, Meri jikeere jiri ọsọ gaa nꞌotu obodo nta dị nꞌugwu Judia. Mgbe o ruru nꞌobodo nta ahụ, ọ banyere nꞌụlọ Zakaraya, kelee Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa ahụ ọ dị ime ya megharịrị ahụ. Mgbe ahụ kwa e mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ Nsọ. O tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nꞌetiti ụmụ nwanyị nile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị ga-amụ bụkwa. Onye kwanụ ka m bụ, o ji bụrụ na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? Nꞌihi na mgbe m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nꞌafọ wuliri elu nꞌọṅụ. Ọṅụ dịịrị nwanyị ahụ kwenyere na Chineke ga-emezu ihe o kwere nkwa ime.” Mgbe ahụ Meri bidoro ikwu okwu sị, “Lee ka obi m siri jupụta nꞌekele nye Onyenwe m. Obi ụtọ ejupụtala mkpụrụ obi m nꞌihi Chineke Onye nzọpụta m. Nꞌihi na Chineke eledatala anya ya, lekwasị m, bụ ohu ya, dị ala. Site ugbu a gaa nꞌihu ọgbọ nile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. Nꞌihi na Chineke Onye pụrụ ime ihe nile emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. Nꞌezie, nꞌọgbọ nile, Chineke na-emere ndị nile na-atụ egwu ya ebere. “O gosipụtala ike aka ya; ọ chụsasịala ndị mpako, meekwa ka ihe nile ha na-ezube nꞌobi ha bụrụ ihe efu. Ọ na-esite nꞌocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nꞌobi elu. Ọ na-eji ihe dị mma na-enyeju ndị agụụ na-agụ afọ. Ma ndị ọgaranya ka ọ na-ezipụ nꞌaka efu. O nyerela Izirel ohu ya aka. O chefukwaghị nkwa o kwere na ya ga-emere ha ebere. Nꞌihi na o kwere nkwa na ya ga-emere Eberaham na ụmụ ụmụ ya ebere ruo mgbe ebighị ebi.” Meri nọnyeere Elizabet ọnwa atọ. Mgbe oge a gasịrị, ọ laghachiri azụ nꞌobodo nke aka ya. Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. Ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ihuọma, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ. Mgbe nwa ọhụrụ ahụ nọzuru abalị asatọ, ndị ikwu ha nile na ndị enyi ha bịara, nꞌihi na ọ bụ nꞌụbọchị ahụ ka a ga-agụ nwa ọhụrụ ahụ aha. Dị ka omenala si dị, ndị ahụ bịara abịa kpebiri na a ga-agụ ya Zakaraya, nke bụkwa aha nna ya. Ma Elizabet fufere isi sị ha, “É, è! A ga-agụ ya Jọn.” Ndị ahụ jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Nke a ọ bụ nꞌihi gịnị? O nwekwanụghị onye ọ bụla nꞌetiti ndị ikwu unu na-aza ụdị aha ahụ.” Ya mere, ha jụrụ Zakaraya nna nwanta ahụ. Ma ebe ọ bụ na ọ naghị anụ ihe ha na-ekwu, ha ji aka ha jụọ ya ajụjụ a. Zakaraya rịọrọ ka ha wetara ya mpempe akwụkwọ. Mgbe ha wetara ya, o depụtara aha nwanta ahụ nꞌakwụkwọ ahụ. Aha ọ sị na a ga-akpọ ya bụ “Jọn”. Nke a juru mmadụ nile anya. Ma nꞌoge ahụ kwa Zakaraya nꞌonwe ya bidokwara ikwu okwu, malite na-eto Chineke. Ibubo nwụrụ ndị nile nọ nꞌebe ahụ nꞌahụ. Otu a kwa akụkọ ihe ndị a mere gbasara ruo ndị nile bi nꞌobodo dị ebe ahụ gburugburu ntị. Onye ọ bụla nụrụ akụkọ a chere nꞌobi ya sị, “Ụdị nwanta dị aṅaa ka nke a ga-abụ? Gịnị ka ọ ga-abụ? O were anya na Chineke nọnyeere ya nꞌụzọ dị iche.” Mgbe ahụ kwa e mere ka Zakaraya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma kwuo sị, “Ka anyị toonụ Onyenwe anyị Chineke Izirel otuto, nꞌihi na ọ bịala inyere ndị ya aka, na ịgbapụta ha. O nyela anyị Onye nzọpụta dị ike site nꞌezinụlọ ohu ya nwoke bụ Devidi, dị ka o kwuru na ọ ga-eme site nꞌọnụ ndị amụma ya dị nsọ, na ọ ga-azọpụta anyị site nꞌaka ndị iro anyị na sitekwa nꞌaka ndị nile kpọrọ anyị asị. “O kwekwara nkwa na ya ga-emere nna nna anyị ha ebere, chetakwa ọgbụgba ndụ ya na ha gbara. Ọ ṅụkwara iyi nye Eberaham nna anyị sị, na ya ga-adọpụta anyị site nꞌaka ndị iro anyị mee anyị ka anyị bụrụ ndị ga-efe ya ofufe na-atụghị egwu, nꞌụzọ dị nsọ na nꞌụzọ ezi omume. Ka anyị si otu a bụrụ ndị ga-eguzo nꞌihu ya ụbọchị nile nke ndụ anyị. “Gị nwa m nwoke, a ga-akpọ gị onye amụma nke Chineke kachasị ihe nile elu. Nꞌihi na ị ga-aga nꞌihu Onye nzọpụta ahụ, ikwado ụzọ maka ọbịbịa ya. Ịgwa ndị mmadụ otu ha ga-esi chọta nzọpụta site nꞌinwe mgbaghara nꞌihi mmehie ha. Nꞌihi na site nꞌoke obiọma Chineke, anyị ga-abanye na mgbe na-adịghị anya, nꞌụbọchị ọhụrụ nke na-eweta nzọpụta si nꞌeluigwe bịa. Ụbọchị ọhụrụ nke ga-ewetara ndị nọ nꞌọchịchịrị, na ndị nọ na ndagwurugwu nke ọnwụ ìhè. Ụbọchị ọhụrụ nke ga-edu anyị nꞌụzọ ga-eweta udo.” Nwanta ahụ toro bụrụ onye dị ike nꞌime mmụọ. O biri nanị ya nꞌime ọzara tutuu oge ahụ eruo mgbe ọ ga-ebido ọrụ ya nꞌetiti ụmụ Izirel. Nꞌoge a, Siza Ọgọstọs onye bụ onye na-achị alaeze ndị Rom, nyere iwu ka a gụọ onye ọ bụla nọ nꞌalaeze ya ọnụ. (Nke a bụ igụ mmadụ onụ nke mbụ e nyere iwu ya mgbe Kwirinus na-achi akụkụ Siria.) Nꞌihi iwu ịgụ mmadụ ọnụ a, onye ọ bụla gara nꞌobodo nke a mụrụ ya idenye aha ya nꞌakwụkwọ. Josef onye bi nꞌobodo Nazaret nke dị na Galili, hapụrụ ebe ahụ gaa Judia. Na Judia, ọ gakwara nꞌobodo nke a mụrụ ya, bụ Betilehem. Betilehem bụkwa ebe a nọ mụọ Devidi. Ya mere, Josef gara Betilehem nꞌihi na o si nꞌagbụrụ Devidi. Josef gara ebe ahụ idenye aha ya nꞌakwụkwọ. Ya na Meri nwagbọghọ ọ na-achọ ịlụ sokwa gaa. Nꞌoge a Meri dị ime. Mgbe ha nọ na Betilehem maka ịgụ ọnụ a, oge Meri ga-eji mụọ nwa ya zuru. Ọ mụpụtakwara nwa mbụ ya, nwa nwoke. O ji akwa kee ya, nyibe ya nꞌụlọ a na-edebe anụ ụlọ, nꞌihi na ha enwetaghị ebe ndina nꞌụlọ ndị ije dị nꞌobodo Betilehem. Nꞌoge a, e nwere ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ nọ na-elekọta igwe atụrụ ha, nꞌazụ obodo nta Betilehem nꞌabalị ụbọchị ahụ. Na mberede, ndị ọzụzụ atụrụ a hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ọ bịara guzo nꞌihu ha. Ebube Chineke gbakwara ha gburugburu mee ka ìhè jupụta nꞌebe ahụ ha nọ dị ka a ga-asị na ọ bụkwaghị abalị. Oke egwu tụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ. Ma mmụọ ozi ahụ gwara ha okwu sị ha, “Unu atụla egwu nìhi na ewtaara m unu ozi oma nke na-eweta oke ọṅụ, bụ ọṅụ ga-adịrị mmadụ nile. Nꞌihi na taa, na Betilehem, obodo Devidi, ka a nọ mụọra unu onye nzọpụta nke bụ onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara! Unu ga-esi aṅaa chọta ya? Ọ bụrụ na unu abaa nꞌime obodo, unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e jiri akwa kee, nyibe ya nꞌala nꞌụlọ a na-edebe anụ.” Mgbe mmụọ ozi a kpụ okwu ndị a nꞌọnụ na-ekwu, na mberede, igwe mmụọ ozi pụtara soro mmụọ ozi a, ee, ọtụtụ igwe mmụọ ozi nke eluigwe pụtara, soro mmụọ ozi a bido ịbụ abụ na ito Chineke na-asị, “Otuto dịrị Chineke nꞌebe kachasị elu nke eluigwe, udo nꞌelu ụwa nye ndị nile ihe ha dị Chineke mma.” Mgbe ndị mmụọ ozi a laghachiri nꞌeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betilehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a dị egwu nke Onyenwe anyị gwara anyị site nꞌọnụ mmụọ ozi.” Ha jiri ọsọ jeruo Betilehem. Ha chọtara Meri na Josef, hụkwa nwa ọhụrụ ahụ ka o dina nꞌụlọ anụ. Mgbe ha kelesịrị ya, ha pụrụ kọọrọ onye ọ bụla ha hụrụ ihe mmụọ ozi ahụ gwara ha banyere nwanta a. Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị nile nụrụ ya anya. Ma Meri nꞌonwe ya debere ihe ndị a nile nꞌobi ya, cheekwa echiche banyere ha. Nꞌikpeazụ, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri azụ nꞌebe igwe atụrụ ha nọ. Mgbe ha na-aga, ha na-eto Chineke nꞌihi ihe ha nụrụ, na nꞌihi ihe ha hụkwara. Nꞌihi na ihe nile ha hụrụ dị, dị ka mmụọ ozi ahụ gwara ha. Nꞌụbọchị nke asatọ ya, mgbe oge ruru ibi nwanta ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi sị na a ga-akpọ ya tupuu Meri adịrị ime. Mgbe oge ruru inye onyinye nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem, Meri na Josef na nwa ọhụrụ ahụ gara Jerusalem. Meri gara inye onyinye maka ịdị ọcha dị ka e nyere nꞌiwu Mosisi na nwanyị ọ bụla mụrụ nwa ọhụrụ ga-enye, na ikuputa nwa ọhụrụ ahụ nꞌihu Chineke. Ikupụta nwa ọhụrụ ahụ bụkwa imezu iwu nke sị, “Ọ bụrụ na nwa mbụ nwanyị mụrụ bụ nwoke, nwa ahụ bụ nke Chineke.” Meri na Josef gara ka ha jiri ụmụ kpalakwukwu abụọ ma ọ bụ ụmụ nduru abụọ nye Chineke onyinye dị ka e nyere ya nꞌiwu. Nꞌoge ahụ kwa, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Simiọn bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye ji obi ya nile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya ịhụ mgbe Chineke ga-azọpụta ndị Izirel. Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka Simiọn mata na ọ gaghị anwụ tutuu ruo mgbe ọ hụrụ Onye nzọpụta ahụ Chineke kwere nkwa izite. Nꞌụbọchị ahụ Meri na Josef kuuru Jisọs bịa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, imere ya ihe iwu kwuru, Mmụọ Nsọ kwalikwara Simiọn, mee ya ka ọ bịa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Mgbe Simiọn batara hụ nwanta ahụ, o kuuru ya nꞌaka ya, welie olu ya, nye Chineke otuto sị, “Onyenwe m, i meela dị ka i kwuru. Ugbu a kwere ka m nwụọ nꞌụdọ. Nꞌihi na anya m ahụla nzọpụta ahụ i kwere na nkwa izite, nke i kwadoro nꞌihi ndị bi nꞌụwa. *** Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ gị, ìhè nke ga-ewetakwara ndị gị Izirel otuto gị.” O juru Josef na Meri anya ịnụ ihe ndị a Simiọn kwuru banyere nwa ọhụrụ a. Emesịa, Simiọn gọziri ha, tụgharịa gwa Meri okwu sị ya, “Ị hụrụ nwanta a? Ọ bụ onye Chineke họpụtara ịbụ ụzọ nzọpụta na ịla nꞌiyi nye ọtụtụ ndị Izirel. Nꞌihi na ụdị ụzọ e si enwe ndụ ọhụrụ nke ọ ga-egosi ndị mmadụ, bụ ụzọ nke ọtụtụ mmadụ ga-ekwukwa okwu megide. Ọ bụkwa site nꞌụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche zoro ezo nke ọtụtụ mmadụ, mee ka ọ pụta ìhè. Obibi ndụ ya ga-ewetakwara gị, bụ nne ya, iru uju. Iru uju gị ga-adị ukwuu dị ka a ga-asị na e ji mma ihu abụọ dụwaa gị mkpụrụ obi.” O nwekwara otu agadi nwanyị ọzọ nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ nꞌụbọchị ahụ. Aha ya bụ Ana. Ọ bụ onye amụma, bụrụkwa nwa Fanuel nke si nꞌebo Asha. Ana enweghị di, nꞌihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri nanị afọ asaa. Site na mgbe di ya nwụrụ ruo ụbọchị ahụ ọ bịara ụlọ nsọ ukwu Chineke, iri afọ asatọ na anọ agafeela. Oge ndị a nile, Ana jiri ụlọ nsọ ukwu ahụ mere ebe obibi ya. Ebe a ka ọ nọ na-efe Chineke ehihie na abalị, ọ nọkwa na-ekpe ekpere na-ebukwa ọnụ. *** Nꞌotu awa ahụ kwa Ana bịarutere nꞌulọ nsọ ahụ kelee Chineke ekete. O kwuru okwu banyere nwa ọhụrụ ahụ nye ndị nile na-echere ka Chineke mee ka Jerusalem nwere onwe ya. Mgbe Josef na Meri mesịrị ihe nile iwu Chineke chọrọ ka ha mee, ha laghachiri Galili gaakwa biri na Nazaret, obodo nke aka ha. Nꞌebe ahụ ka nwa ọhụrụ ahụ nọ too, bụrụ onye dị ike. Ọ bụkwa onye jupụtara nꞌamamihe, bụrụkwa onye ngọzi Chineke dịnyeere. Nꞌafọ nile, ndị mụrụ Jisọs na-aga Jerusalem nꞌihi mmemme ngabiga. Mgbe Jisọs ruru afọ iri na abụọ, o sooro ndị mụrụ ya gaa Jerusalem dị ka ha dị mbụ eme. Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ndị mụrụ ya malitere ịlaghachi azụ nꞌobodo nke aka ha, ma Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Kama ndị mụrụ ya amaghị na o soghị ha na-alọta. Ha chere nꞌobi ha na o so ndị enyi ha ọzọ ndị na-alaghachikwa Nazaret. Mgbe ha gasịrị ije otu ụbọchị, ha chọrọ ya ma ha ahụghị ya. Ha bidoro ịchọ ya nꞌetiti ndị ikwu ha na ndị enyi ha. Mgbe ha na-achọtaghị ya, ha tụgharịrị azụ bido ịgaghachikwa Jerusalem ịchọ ya nꞌebe ahụ. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha chọtara ya nꞌụlọ nsọ ukwu dị na Jerusalem ebe ya na ndị ozizi iwu nọ. Ọ nọ nꞌetiti ha na-ege ntị nꞌihe ha na-ekwu ma na-ajụkwa ha ajụjụ. Nghọta na ọsịsa gbara ọkpụrụkpu nke si nꞌọnụ Jisọs na-apụta juru ndị nile nụrụ okwi ya anya. Ndị mụrụ ya amaghị ihe ha ga-ekwu mgbe ha hụrụ ya. Ma Meri gwara ya sị, “Gịnị bụ ihe a i mere? Lee na mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị ebe nile!” Jisọs zara sị ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ m? Ọ bụ na unu amaghị na m ga-anọ nꞌebe a, nꞌụlọ nsọ Nna m?” Ma ha aghọtaghị ihe okwu ahụ pụtara. Emesịa, Jisọs sooro ha laa Nazaret. O rubeere ha isi, meekwara ha ihe nile ha chọrọ ka o mee. Ma nne ya debere ihe ndị a nile nꞌobi ya. Jisọs toro, gbaa dimkpa, bụrụkwa onye maara ihe. O tokwara bụrụ onye ihe ya dị Chineke na mmadụ, ndị maara ya, mma. Nꞌafọ iri na ise nke Tiberius nọrọ dị ka eze na-achị alaeze ndị Rom, Chineke ziri Jọn nwa Zakaraya ozi a nꞌọzara ebe o bi. Ozi Chineke a rutere Jọn mgbe Pọntus Pailet bụ onye na-achị akụkụ Judia, mgbe Herọd bụ onye na-achị Galili, mgbe Filip nwanne Herọd na-achị Iturịa na Trakonitis, mgbe Laisania na-achị Abilin na mgbe Anas na Kaifas bụ ndị isi nchụaja. Nꞌihi ozi a, Jọn biliri gaa nꞌobodo nile dị nꞌakụkụ osimiri Jọdan na-ekwusa, na-agwa ndị mmadụ sị, “Sitenụ na mmehie unu chegharịa ka e mee unu baptisim, ka Chineke gbaghara unu mmehie unu.” Dị ka e si dee ya nꞌakwụkwọ Aịzaya onye amụma, otu onye na-eti mkpu nꞌọzara sị, “Dozienụ ụzọ Onyenwe anyị, meenụ ka okporo ụzọ ya guzozie, kpojuonụ ngwukoro nile. Kwazeenụ ugwu nile. Meenụ ka ụzọ gbagọrọ aghagọ guzozie nke ọma, ka ụzọ ọjọ nile dị larịị. Mmadụ nile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke!” Igwe mmadụ pụtara bịakwute Jọn ka o mee ha baptizim. Ma Jọn gwara ha sị, “Ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị iwe Chineke nke na-akwado ịbịa? Burunụ ụzọ zipụta na ndụ unu, na unu echegharịala. Unu echekwala na a ga-azọpụta unu nꞌihi na Eberaham bụ nna nna unu. Nꞌihi na eziokwu ahụ bụ nke a, Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Eberaham ụmụ. Nꞌihi na dị ka mmadụ pụrụ isite na mgbọrọgwụ osisi gbutuo ya, otu a ka Chineke jikekwaara ikpe unu ikpe laa unu nꞌiyi. Nꞌihi na dị ka e si egbutu osisi nile na-adịghị amị mkpụrụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka Chineke ga-esi maa ndị ajọ omume ikpe, tụnye ha nꞌọkụ.” Ndị mmadụ ahụ jụrụ Jọn sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka anyị mee?” Jọn zara sị ha, “Ọ bụrụ na i nwere uwe abụọ, nye onye na-enweghị uwe ọ bụla otu. Ọ bụrụkwa na i nwere nri, kenye ndị agụụ na-agụ.” Ụfọdụ nꞌime ndị ọnaụtụ, ndị a maara nꞌihi ndụ ọjọọ ha na-ebi bịakwara ka Jọn mee ha baptizim. Ha jụrụ Jọn sị ya, “Onye ozizi, gịnị ka ị chọrọ ka anyị mee?” Jọn zara sị ha, “Doonụ aka unu ọcha. Unu anakwala ndị mmadụ ego karịrị nke ha kwesịrị ịkwụ.” Ụfọdụ ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Ginị ka i kwuru maka anyi? Ginị ka anyị kwesịrị ime?” Jọn Zara sị ha, “Unu ejikwala ike apụnarị ndi mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ihe ahụ unu maara na ha emeghị. Ka afọ ju unu nꞌụgwọ a na-akwụ unu.” Nꞌoge a, onye ọ bụla nọ na-ele ọbịbịa Onye nzọpụta ahụ. Ha nọkwa na-atule nꞌobi ha ma Jọn ọ bụ Onye nzọpụta ahụ. Nꞌihi nke a, Jọn gwara ha sị, “Eji m mmiri efu na-eme unu baptizim, ma ọ dị otu onye dị ukwuu karịa m, onye ga-abịa na mgbe na-adịghị anya. Ọ dị nnọọ ukwuu karịa m, nꞌihi na etozughị m ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nzọ na ọkụ mee unu baptizim. Ọ ga-ekewapụta igbugbo ọka site nꞌezi mkpụrụ ọka. Ọ ga-ekponye ezi mkpụrụ ọka nꞌọba, kpọọ igbugbo ọka ahụ ọkụ nke na-agaghị anyụ anyụ.” Okwu a na okwu ọzọ dị iche ka Jọn gwara ndị mmadụ. Ọ dọrọ ha aka na ntị, kwusaakwara ha ozi ọma. Ma Jọn kwuru okwu megide ihe ọjọọ nile Herọd eze na-achị Galili na-eme. O kwukwara okwu megide ọlụlụ nke Herọd lụrụ Herodịas nwụnye nwanna ya. Nꞌihi okwu a Jọn kwuru, Herọd mekwara ihe ọjọọ karịrị ndị o mere na mbụ, site nꞌinye iwu ka e jide Jọn tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ. Otu ụbọchị Jisọs sooro igwe mmadụ bịa ka Jọn mee ya baptizim. Mgbe Jọn mesịrị ndị mmadụ baptizim, o mekwara Jisọs baptizim. Ma mgbe Jisọs nọ na-ekpe ekpere, oge e mesịrị ya baptizim, eluigwe meghere. Mmụọ Nsọ sikwa nꞌelu rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi. Nꞌotu oge ahụ olu sitere nꞌelu daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-atọ m ụtọ.” Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Nꞌoge ndị a nile ndị mmadụ na-akpọ Jisọs nwa Josef onye bụ nwa Heli; Heli bụkwa nwa Matat, Matat abụrụ nwa Livayị, Livayị bụ nwa Meliki, Meliki abụrụ nwa Janayị, Janayị bụ nwa Josef; Josef bụkwa nwa Matatias, Matatias bụ nwa Emọs, Emọs abụrụ nwa Nahum, Nahum bụ nwa Esili, Esili bụ nwa Nagayị; Nagayị bụ nwa Maat, Maat abụrụ nwa Matatias, Matatias bụ nwa Semein, Semein bụkwa nwa Josef, Josef abụrụ nwa Joda; Joda bụ nwa Joanan, Joanan bụ nwa Resa, Resa abụrụ nwa Zerubabel, Zerubabel bụ nwa Shealitiel, Shealitiel abụrụ nwa Neri; Neri bụ nwa Meliki, Meliki abụrụ nwa Adi, Adi bụ nwa Kosam, Kosam bụkwa nwa Elumadam, Elumadam abụrụ nwa Ea; Ea bụ nwa Joshua, Joshua abụrụ nwa Elieza, Elieza bụ nwa Jorim, Jorim abụrụ nwa Matat, Matat bụ nwa Livayị; Livayị abụrụ nwa Simiọn, Simiọn bụ nwa Juda, Juda abụrụ nwa Josef, Josef bụ nwa Jonam Jonam abụrụ nwa Eliakim; Eliakim bụ nwa Melea, Melea abụrụ nwa Mena, Mena bụ nwa Matata, Matata abụrụ nwa Netan, Netan bụ nwa Devidi; Devidi abụrụ nwa Jeesi, Jeesi bụ nwa Obed, Obed abụrụ nwa Boaz, Boaz bụ nwa Salmọn, Salmọn abụrụ nwa Nashọn; Nashọn bụ nwa Aminadab, Aminadab abụrụ nwa Ram, Ram bụ nwa Hezrọn, Hezrọn, abụrụ nwa Perez, Perez bụ nwa Juda; Juda abụrụ nwa Jekọb, Jekọb bụ nwa Eberaham, Eberaham abụrụ nwa Tera, Tera bụ nwa Nahọ; Nahọ abụrụ nwa Serug, Serug bụ nwa Reu, Reu abụrụ nwa Peleg, Peleg bụ nwa Eba, Eba abụrụ nwa Shela; Shela bụ nwa Kenan, Kenan abụrụ nwa Apakzad, Apakzad bụ nwa Shem, Shem abụrụ nwa Noa, Noa bụ nwa Lamek; Lamek abụrụ nwa Metusela, Metusela bụ nwa Enọk, Enọk abụrụ nwa Jared, Jared bụ nwa Mahalaleel, Mahalaleel abụrụ nwa Kenan; Kenan bụ nwa Enọs, Enọs abụrụ nwa Set, Set bụ nwa Adam, Adam abụrụ nwa Chineke. Mgbe ahụ Jisọs onye jupụtara nꞌike Mmụọ nsọ si nꞌosimiri Jọdan obe a nọ mee ya baptizim pụọ. Mmụọ Nsọ duuru ya baa nꞌime ọzara. Ebe ahụ ka ọ nọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Iri ụbọchị anọ ndị a nile o righị nri ọ bụla. Nꞌikpeazụ, agụụ gụrụ ya. Mgbe ahụ ekwensu bịara gwa ya sị, “Ọ̀ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a okwu ka ha ghọọrọ gị nri.” Ma Jisọs zara ya sị, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ̀ bụghị nanị site nꞌiri nri ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ” Nꞌotu mgbe ahụ ekwensu duuru ya gaa nꞌebe dị elu, ebe ọ nọ mee ka Jisọs hụ alaeze nile dị nꞌụwa nꞌotu ntabi anya. Ọ gwara Jisọs sị, “Alaeze ndị a nile bụ nke m, ma ejikeere m inye gị alaeze ọma ndị a nile ya na akụ na ụba nile dị nꞌime ha, ma ọ bụrụ na ị ga-akpọ isi ala nye m.” *** Ma Jisọs zara sị, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụ nanị Chineke ka anyị ga-akpọ isi ala nye, ọ bụkwa nanị ya ka anyị ga-efe.’ ” Mgbe ahụ ekwensu duuru Jisọs gaa Jerusalem, mee ka o guzo nꞌebe kachasị elu nke elu ụlọ nsọ ukwu ahụ. Ọ gwara Jisọs sị, “Ọ bụrụ nꞌezie na ị bụ Ọkpara Chineke, si nꞌebe a tụda onwe gị nꞌala. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha chebe gị. Ha ga-aghọtakwa gị nꞌaka ha ka ị ghara ịdaru ala merụọ ahụ.’ ” Jisọs zara sị ya, “Akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘I kwesịghị ịnwa Onyenwe gị Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ” Mgbe ike gwụrụ ekwensu ịnwa Jisọs ọnwụnwa, ọ hapụrụ ya laa tutuu ruo mgbe ọ ga-enweta ohere ọzọ. Mgbe ahụ Jisọs lọghachiri na Galili. Nꞌoge a, o jupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ Galili nile. Ọ banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu na-ezi ndị mmadụ ihe. Mmadụ nile tokwara ya. Mgbe ahụ Jisọs gara ije rute Nazaret, obodo nke aka ya, ebe ọ nọ too. Nꞌụbọchị izuike, ọ gara nꞌụlọ ekpere dị nꞌebe ahụ, dị ka ọ dị mbụ eme. Nꞌebe ahụ, o guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. Ndị isi ụlọ ekpere ahụ nyere ya akwụkwọ nsọ nke Aịzaya onye amụma dere. Jisọs meghere ya, bido ịgụ ebe Aịzaya dere ihe ndị a, “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nꞌahụ m, nꞌihi na ọ họpụtala m ikwusa ozi ọma nye ndị ogbenye, Ọ họpụtala m ikwusa na ndị e kere agbụ ga-enwere onwe ha, na ndị kpuru ìsì ga-ahụkwa ụzọ ọzọ, na ndị a na-emegbu ga-esite nꞌaka ndị na-emegbu ha nwere onwe ha, ikwusa na Chineke kwadoro ugbu a ịgọzi ndị nile ga-abịakwute ya.” Jisọs mechiri akwụkwọ ahụ nyekwa ya onyeisi ụlọ ekpere ahụ, nọdụ ala. Ndị mmadụ nile nọ nꞌụlọ ekpere ahụ legidere ya nnọọ anya. Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịgwa ha okwu sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nꞌakwụkwọ nsọ, nke m gụpụtara, mezuru.” Ndị ahụ nile bịara nꞌụlọ ekpere ahụ kwuru okwu ọma banyere ya. O juru ha anya na okwu ọma dị otu a si ya nꞌọnụ pụta. Ha sịrị, “Onye a ò bụghị nwa Josef?” Ma Jisọs gwara ha sị, “Amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a nke sịrị, ‘Dibịa gwọọnụ onwe gị. Gosinụ anyị ihe ị bụ. Gosinụ anyị nꞌobodo nke aka gị, ihe ahụ nile anyị nụrụ na ị na-eme na Kapanọm.’ Ma ka m gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọ bụla a na-anara nke ọma nꞌobodo nke aka ya. Chetakwanụ ihe mere nꞌoge Ịlaịja onye amụma. E nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị e kwesịrị inyere aka nꞌoge ụnwụ ahụ, mgbe mmiri na-ezoghị nꞌala Izirel afọ atọ na mkpirisi. Ma Chineke ezigaghị Ịlaịja inyere onye ọ bụla nꞌime ha aka. Kama Chineke zigara Ịlaịja ka ọ gaa nꞌala Saidọn nyere otu nwanyị onye mba ọzọ di ya nwụrụ anwụ aka. *** Chetakwanụ ihe mere nꞌoge Ịlaisha onye amụma. Nꞌoge ahụ, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nꞌala Izirel, ma o nweghi onye a gwọrọ nꞌetiti hạ kariakwa Neeman onye Siria.” Mgbe ndị mmadụ nụrụ okwu ndị a, iwe were ha nke ukwuu. Ha nile biliri ọtọ otu mgbe ahụ, jide Jisọs, dọkpụrụ ya pụọ nꞌobodo, gaa nꞌelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ, ka ha site nꞌebe ahụ tụpụ ya. Ma Jisọs sitere nꞌetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, hapụ ha nꞌebe ahụ. O sitere nꞌebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyekwara nꞌụlọ ekpere ha bido izi ndị mmadụ ihe. Ihe o ziri ha juru ndị mmadụ anya. Nꞌihi na o ziri ha ihe dị ka onye maara ihe bụ eziokwu, dị ka ọpụtaobie, ọ bụghị dị ka onye na-ekwu site nꞌihe ọ nụrụ nꞌọnụ ndị ọzọ. Otu ụbọchị mgbe ọ nọ na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu, otu nwoke nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya bịara nso ebe ọ nọ bido na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Chei! Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara nꞌebe a ka ị laa anyị nꞌịyi? Amaara m onye ị bụ. Ị bụ Ọkpara Chineke dị nsọ.” Ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ gị si nꞌime ya pụta!” Mmụọ ọjọọ ahụ tụrụ nwoke a nꞌala nꞌihu ndị nọ nꞌebe ahụ, site nꞌime nwoke ahụ pụta, ma o merụghị ya ahụ. Nke a juru mmadụ nile anya mee ka ha sịrịta onwe ha, “Gịnị dị nꞌokwu ọnụ nwoke a, lee na o ji ike na-enye mmụọ ọjọọ ndị a iwu, ha na-apụkwa!” Akụkọ ọrụ a Jisọs rụrụ gbasara jeruo obodo nile dị ebe ahụ gburugburu. Mgbe Jisọs si nꞌụlọ ekpere ahụ pụta, ọ gara nꞌụlọ Saimọn. Nꞌebe ahụ ọ chọpụtara na nne nwụnye Saimọn nwere ahụ ọkụ. Jisọs gara guzo nꞌakụkụ ihe ndina nwanyị ahụ baara ahụ ọkụ ahụ mba. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ nwanyị ahụ. O biliri kwadooro ha ihe oriri. Nꞌụbọchị ahụ kwa, nꞌoge anyasị, ndị nile nwere enyi nke ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, buteere ha Jisọs ka ọ gwọọ ha. O bikwasịrị ha aka gwọọ ha. Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nꞌime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” Ma Jisọs baara ha mba, kwụsị ha ikwu okwu, nꞌihi na ha maara na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ. Nꞌisi ụtụtụ echi ya, Jisọs si nꞌụlọ Saimọn pụọ gaa ebe ọ ga-anọrọ onwe ya. Mgbe chi bọrọ ndị mmadụ bidoro ịchọgharị ya. Mgbe ha hụrụ ya, ha rịọrọ ya ka ọ ghara ịhapụ ha kama ka o soro ha nọdụ na Kapanọm. Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ dị mkpa na m ga-aga gwa ndị nọ nꞌobodo ọzọ akụkọ banyere alaeze Chineke nꞌihi na ọ bụ ime nke a ka m ji bịa.” Site nꞌebe ahụ, o bidoro na-agagharị ebe nile na-ekwusa okwu Chineke nꞌụlọ nzukọ nile dị na Galili. Otu ụbọchị, Jisọs guzoro nꞌakụkụ iyi ukwu Genasaret na-agwa ndị mmadụ okwu. Ndị bịara nꞌebe ahụ dị ukwuu, nke mere ka ha na-enu onwe ha aka inwe ike ịbịaru ya nso, ka ha nụrụ ihe ọ na-ekwu. Mgbe ahụ Jisọs hụrụ ụgbọ mmiri abụọ e kenyere nꞌosisi dị nꞌakụkụ iyi ukwu ahụ. Ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ ha pụọ ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ mmiri. Jisọs banyere nꞌime otu ụgbọ mmiri, rịọ Saimọn onyenwe ụgbọ ahụ ka o nuru ụgbọ ahụ banyetụ ntakịrị nꞌime mmiri. Jisọs nọdụrụ ala nꞌime ya bido na-ezi ndị mmadụ ihe. Mgbe o kwusịrị okwu, ọ gwara Saimọn sị ya, “Banyetụkwa nꞌime mmiri ọzọ tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.” Saimọn zara sị ya, “Onyenwe m, site nꞌabalị ụnyaahụ nile rute nꞌụtụtụ taa ka anyị gbalịrị ike anyị, ma o nweghị azụ anyị gbutere. Ma aga m atụnyekwa ụgbụ m dị ka i kwuru.” Mgbe Saimọn wụnyere ụgbụ azụ ha na mmiri ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere ka ụgbụ azụ ha chọọ ịdọwa. Mgbe ahụ Saimọn kpọrọ ndị enyi ha nọ nꞌụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ndị ha kpọrọ bịara nyere ha aka. Ha sepụtara ụgbụ ahụ wụnye azụ ha gbutere nꞌime ụgbọ mmiri ha. Azụ ahụ juru ụgbọ mmiri abụọ ahụ, mee ka ụgbọ mmiri ndị ahụ chọọ imikpu na mmiri. Mgbe Pita hụrụ azụ nile ndị a nꞌime ụgbọ mmiri ndị a, o gburu ikpere nꞌihu Jisọs sị ya, “Onyenwe m biko site nꞌebe m nọ pụọ, nꞌihi na abụ m onye mmehie.” Nꞌihi na o juru Pita na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. Ee, ọ bụladị Jemes na Jọn ụmụ Zebedi ndị ha na Pita so, ka azụ a ha gbutere juru anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu, nꞌihi na site taa gaa nꞌihu, ọrụ unu ga-abụ ịkpọbata mmadụ nꞌalaeze Chineke.” Mgbe ha nyaara ụgbọ mmiri ha rute nꞌọnụ mmiri, ha hapụrụ ihe nile soro Jisọs. Emesịa, mgbe Jisọs bịarutere otu obodo, o zutere otu nwoke onye ekpenta. Mgbe nwoke a hụrụ Jisọs, ọ bịakwutere ya daa nꞌala nꞌihu ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jisọs setipụrụ aka ya metụ ya aka, sị ya, “Achọrọ m ka ahụ dị gị mma, bụrụkwa onye a gwọrọ ọrịa ya.” Nꞌotu oge ahụ ọrịa ekpenta ahụ lara. Mgbe ahụ Jisọs dọrọ nwoke ahụ aka na ntị sị ya, “Agwakwala onye ọ bụla ihe m meere gị. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, nyekwa onyinye Mosisi nyere nꞌiwu na ndị a gwọrọ ọrịa ekpenta ga-enye, igosi ndị mmadụ na a gwọọla gị ugbu a.” Ma akụkọ banyere Jisọs na ọrụ ya gbasara ruo ọtụtụ mmadụ ntị. Nꞌihi ya igwe mmadụ zụkọrọ ịnụrụ ihe ọ na-ekwu. Ha zukọkwara ka ọ gwọọ ha. Ma site nꞌoge ruo nꞌoge, Jisọs na-ahapụ igwe mmadụ ndị a gaa nꞌebe ọ ga-anọ nanị ya ikpe ekpere. Otu ụbọchị, mgbe Jisọs nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ụfọdụ nꞌime ndị Farisii na ndị ozizi iwu sokwara igwe mmadụ Jisọs na-ezi ihe nọdụ na-ege ntị. (Ọtụtụ mmadụ ndị a si nꞌobodo nta nile dị na Galili na Judia na Jerusalem bịakwute Jisọs.) Ike Chineke dịnyekwaara Jisọs nꞌụbọchị ahụ ịgwọ ndị ọrịa. Nꞌoge ahụ, ụfọdụ mmadụ ndị bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nꞌihe ndina ya, bịara gbalịa isite nꞌọnụ ụzọ ụlọ ahụ Jisọs nọ ịbubata enyi ha ahụ nso ebe Jisọs nọ. Ma nke a ekweghị ha omume, nꞌihi na igwe mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Ya mere, ndị a rigoro elu ụlọ ahụ Jisọs nọ nꞌime ya, dọkapụ ụfọdụ nꞌime ute e jiri kpuchie ụlọ ahụ. Ha kenyere eriri nꞌute ahụ enyi ha dina, site nꞌoghere ha mere nꞌelu ụlọ ahụ, wetuo nwoke ahụ. Ha mere ka nwoke ahụ nwee ike ịbịa nso ebe Jisọs nọ nꞌetiti igwe mmadụ ahụ gbara ya gburugburu. Mgbe Jisọs hụrụ na ndị a nwere okwukwe na ya nwere ike ịgwọ enyi ha nwoke, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.” Ndị Farisii na ndị ozizi iwu nọ nꞌebe ahụ leritara onwe ha anya jụọ sị, “Ònye bụ nwoke a na-adịghị asọpụrụ Chineke? Ònye pụrụ igbaghara mmadụ mmehie ma ọ bụghị nanị Chineke?” Ebe Jisọs ghọtara ihe ha na-eche, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche nꞌobi unu na m adịghị asọpụrụ Chineke? Olee nke karịrị mfe ikwu? Ọ̀ bụ ịgwa nwoke a sị, ‘Agbagharala m gị mmehie gị ka ọ bụ ịgwa ya sị, bilie gaa ije?’ Ugbu a aga m egosi unu na Nwa nke mmadụ nwere ike nꞌụwa ịgbaghara mmehie site nꞌigosi unu ike m nwere ịgwọ ọria.” Jisos chigharịrị gwa onye ọrịa ahu okwu sị “Nwoke, bilie, chịrị ute gị laa nꞌụlọ gi!” Ngwangwa, nwoke ahụ wụliri elu. Ọ chịlịrị ute ya bido na-eto Chineke na-ala nꞌụlọ ya. Ọrụ a tụrụ ndị nile nọ nꞌebe ahụ nꞌanya. Ha bidokwara na-eto Chineke. Oke egwu jupụtara ha nꞌobi, mee ka ha kwuo sị, “Anya anyị ahụla ihe ọ na-ahụbeghị mbụ, ọrụ ebube dị ukwuu!” Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs siri nꞌebe ahụ pụọ. Mgbe ọ na-aga nꞌụzọ, ọ hụrụ Livayị onye ọnaụtụ ka ọ nọ nꞌụlọ ọrụ ya. Jisọs gwara ya sị, “Bịa soro m.” Ngwangwa, Livayị hapụrụ ihe nile, soro ya. Emesịa, Livayị kpọrọ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oriri nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara ndị ọnaụtụ ibe ya, na ndị ọzọ kwa. Mgbe ndị Farisii na ndị ozizi iwu hụrụ ka Jisọs so Livayị na ndị enyi ya na-eri nri, ha bidoro na-ajụ ndị na-eso ụzụ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere unu na nna unu ukwu ji na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri?” Ma Jisọs zara ha sị, “Ndị ahụ dị mma anaghị achọ dibịa. Ọ bụ ndị ọrịa ka mkpa dibịa na-akpa. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.” Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji na-ebu ọnụ, na-ekpekwa ekpere oge nile, ma ndị na-eso ụzọ gị nọ nnọọ nꞌoriri na ọṅụṅụ?” Jisọs zara ha sị, “Ọ bụghị ezi ihe na ndị a kpọrọ oriri nꞌebe a na-alụ nwanyị ọhụrụ ga-ebu ọnụ mgbe ha na di nwanyị nọ. Ma oge na-abịa mgbe a ga-ewepụ m nꞌetiti ha, mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.” Mgbe ahụ Jisọs tụụrụ ha ilu sị, “O nweghị onye na-adọkata akwa ọhụrụ jiri ya dụchie akwa ochie. Ọ bụrụ na o mee nke a, ọ ga-adọwa akwa ọhụrụ ahụ, ma mpempe akwa ọhụrụ ahụ ọ dọkatara, na akwa ochie ahụ agaghị adakọta. Nꞌụzọ dị otu a kwa, mmadụ adịghị etinye mmanya ọhụrụ dị ike nꞌime karama akpụkpọ ochie. Nꞌihi na ike si na mmanya ọhụrụ ahụ ga-eme ka karama ahụ gbawaa. Mmanya ahụ ga-awụfukwa mgbe karama ahụ gbawara. Ma ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ, ichebe ha abụọ. O nweghị onye ṅụsịrị mmanya ochie ga-achọ ịṅụ mmanya ọhụrụ, nꞌihi na nꞌuche onye dị otu a, mmanya ochie ahụ ka nke ọhụrụ mma.” Nꞌụbọchị Satọde, nke bụ ụbọchị izuike ndị Juu, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌubi a kụrụ ọka gafee. Mgbe ha na-agafe, ndị na-eso Jisọs ghọọrọ ụfọdụ ọka taa. Ma mgbe ha na-eme nke a, ụfọdụ ndị Farisii hụrụ ha, tie mkpu sị, “Gịnị mere unu ji na-emebi iwu? Gịnị mere unu ji na-eme ihe megidere iwu nꞌụbọchị izuike?” Jisọs zara ha sị, “Ọ̀ bụ na unu agụtaghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru na Devidi mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya? Ọ banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke were beredi e nyere Chineke dị ka onyinye taa, nyekwa ndị so ya ka ha taa. Ma ọ dịghị onye ọzọ kwesịrị iri achịcha ahụ karịakwa ndị nchụaja.” Mgbe ahụ Jisọs gwakwara ha okwu sị ha, “Ọ bụ Nwa nke mmadụ ka ọ dịrị ikpebi ihe e kwesịrị ime nꞌụbọchị izuike nꞌihi na ọ bụ ya bụ Onyenwe ụbọchị izuike!” Nꞌụbọchị Satọde ọzọ, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu bido na-ezi okwu Chineke. Nꞌụlọ ahụ, otu nwoke nọ ya, onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị Farisii na ndị ozizi iwu nọ na-ele Jisọs anya ịhụ ihe ọ ga-eme. Ha chọrọ ịmata ma ọ ga-agwọ nwoke ahụ nꞌụbọchị izuike ka ha site na ya nweta ebubo ha ga-ebo ya. Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube nꞌobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Pụta bịa guzoro nꞌetiti ụlọ ekpere a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe Jisọs sị ya guzo. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị nọ nꞌebe ahụ okwu sị, “Achọrọ m ịjụ unu otu ajụjụ: o ziri ezi ime ihe ọma nꞌụbọchị izuike ka iwu ọ sị anyị mee ihe ọjọọ nꞌụbọchị izuike? O ziri ezi ịzọpụta mmadụ nꞌụbọchị izuike ka ọ ka mma ịla ndụ mmadụ nꞌiyi nꞌụbọchị ahụ?” Mgbe ahụ Jisọs lere anya gburugburu nꞌiwe sị nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Setịpụ aka gị.” Mgbe nwoke ahụ setịpụrụ aka ya, ọ dịkwara ya mma ọzọ. Mgbe ndị iro Jisọs hụrụ ihe Jisọs mere, ọnụma jupụtara ha obi. Ha zukọtara ikwu otu ha ga-esi jide Jisọs, gbuo ya. Mgbe ọzọ kwa, Jisọs gara rigoro nꞌelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọgidere nꞌebe ahụ abalị nile. Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị nile na-eso ụzọ ya, site nꞌime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya. Ndị a bụ aha ndị ọ họpụtara, Saimọn, (onye ọ gụgharịrị Pita) na Anduru nwanne ya, Jemes na Jọn, Filip na Batalomiu. Matiu na Tọmọs, Jemes nwa Alfiọs na Saimọn onye so nꞌotu ndị Juu chọrọ iji ike kwatuo ọchịchị ndị Rom. Na Judas nwanne Jemes, na Judas Isikariọt, nwoke ahụ mesịrị rara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya. Emesịa, Jisọs na ndị ozi iri na abụọ ahụ si nꞌugwu ahụ rịdata. Na ndịda ugwu ebe ha guzo, ọtụtụ ndị na-eso Jisọs gbara ha gburugburu, ha na ndị nile si Judia, Jerusalem, na obodo Taịa na Saidọn bịa ịnụ ihe Jisọs na-ekwu, na ndị bịara ka Jisọs gwọọ ha. Jisọs chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ site nꞌime ndị ha na-esogbu. Ọtụtụ mmadụ nꞌime igwe ndị ahụ gbara ya gburugburu gbalịrị imetụ ya ka, nꞌihi na ike dị ukwuu si Jisọs nꞌahụ na-apụ na-eme ka ahụ dị ndị ọrịa nile metụrụ ya aka mma. Mgbe ihe ndị a na-eme, Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa ha okwu sị, “Lee obi ụtọ dịrị unu, ndị ogbenye, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke unu. “Lee obi ụtọ dịrị unu, unu ndị agụụ na-agụ nꞌihi na afọ ga-eju unu. Leekwa obi ụtọ dị na-eche unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, na mgbe a na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-asịkwa na unu bụ ajọ mmadụ nꞌihi na unu na-eso m *** Nụrịanụ ọṅụ mgbe ihe ndị a na-adakwasị unu, teekwanụ egwu ọṅụ, nꞌihi na ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Nꞌihi na ọ bụkwa otu a ka nna nna ha siri meso ndị amụma. “Ma lee ka ahụhụ na-eche ndị ọgaranya siri dị ukwuu! Nꞌihi na ha eketala oke ọṅụ ha nꞌụwa a. Oke ahụhụ dịkwa na-eche ndị ọgaranya nꞌihi afọ ojuju nke ha na-enwe ugbu a, agụụ ga-agụkwa ha. Ha na-achị ọchị ugbu a, ma ha ga-akwa akwa, tie aka nꞌobi nꞌiru uju. Lee ka ahụhụ si na-eche ndị ahụ ụmụ mmadụ na-eto, ndị ha na-ekwu okwu ọma banyere. Nꞌihi na site na mgbe ochie ọ bụ ndị amụma ụgha ka a na-eto otuto. “Geenụ ntị nꞌihe m chọrọ ikwu, unu nile nọ nꞌebe a ugbu a. Hụnụ ndị iro unu nꞌanya, meekwaranụ ndị na-akpọ unu asị ihe ọma. Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpeekwaranụ ndị ahụ na-akọcha unu ekpere. “Ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị. Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya, hapụrụ ya ihe ahụ. Otu ọ bụla unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu mmeso, sitekwanụ otu ahụ mesoo mmadụ ibe unu. “Ọ bụrụ nanị ndị na-ahụ unu nꞌanya ka unu na-ahụ nꞌanya, unu atụkwala anya na Chineke ga-asị na unu mere nke ọma, nꞌihi na ndị mmehie na-ahụkwa ndị hụrụ ha nꞌanya nꞌanya. Ọ bụrụkwa nanị ndị na-enyere unu aka ka unu na-enyere aka, obi ò ga-atọ Chineke ụtọ nꞌebe unu nọ? É, è. Nꞌihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka. Ọ bụrụkwa nanị onye nwere ike ịkwụghachi unu ka unu na-agbazinye ihe, ụdị ihe ọma a abụghị nke e kwesịrị ikele unu ekele nꞌihi ya, nꞌihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmadụ ego, ka onye ha gbazinyere kwụghachikwa ha. “Ma iwu m na-enye unu bụ nke a, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, nyekwaranụ ndị ọzọ aka, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Unu mee nke a, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ Chineke nꞌezie, nꞌihi na Chineke na-emere ndị na-eme ihe ọjọọ ihe ọma, na-egosikwa ndị na-adịghị ekele ya ekele obi ebere. “Ya mere, nweenụ obi ebere dị ka nna unu bi nꞌeluigwe si enwe obi ebere. “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. Amala ndị ozọ ikpe ka a ghara ima unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu. Kenyenụ ndị ọzọ ihe unu nwere, Chineke ga-enyeghachikwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ onyinye juru juru eju, nke a bịadara nke ọma, nke a yọgharịrị mee ka o jubiga oke, na nke na-asọgharị. Kama ọ bụ ụdị onyinye unu nyere, onyinye ukwu ma ọ bụ onyinye nta, ka Chineke ga-enyeghachikwa unu.” Mgbe ahụ Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Onye ìsì enweghị ike idu onye ìsì ibe ya, nihi na ha abụọ ga-adaba nꞌime olulu. Nwanta akwụkwọ enweghị oge ọ ga-ama ihe karịa onye na-ezi ya ihe, kama mgbe ọ mụsịrị akwụkwọ ya ọ ga-amata ihe dị ka onye ziri ya ihe. “Gịnị mere i ji legide anya na ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya, ma ọ dịghị ihe ọ bụla ị na-eme banyere ibe osisi dachiri gị anya? Ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, biko kwere ka m tụpụta gị ahịhịa ntakịrị dị gị nꞌanya mgbe ibe osisi dachiri gị nꞌanya adịghị ekwe gị hụ ụzọ? Buru ụzọ wepụta ibe osisi dachiri gị nꞌanya, mgbe ahụ ị ga-ahụ ụzọ nke ọma iwepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya. “Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ mkpụrụ osisi mịrị ka e ji ama ụdị osisi ọ bụ. Ndị mmadụ adịghị aghọta oroma nꞌosisi ụdara, otu a kwa o nweghị onye na-aghọta aṅara nꞌahịhịa ogwu. Ezi mmadụ na-esite nꞌakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ihe, otu a kwa ajọ mmadụ na-esite nꞌobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ihe. Nꞌihi na ihe ọ bụla dị mmadụ nꞌobi bụ ihe na-apụta nꞌọnụ ya. “Gịnị mere unu ji na-akpọ m Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ma unu adịghị eme ihe m gwara unu? Achọrọ m igosi unu ihe onye na-abịakwute m nke na-anụ okwu m, ma na-ejikwa ihe ọ na-anụ eme ihe, yiri. Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu ntọ ala dị mma, onye gwumiri ala, doo ntọ ala ụlọ ahụ nꞌelu nkume. Mmiri ga-ezo, tojuo iyi nile, meekwa ka ide mmiri sọọ gburugburu ụlọ ahụ, ma ọ gaghị eme ka ụlọ ahụ maa jijiji, nꞌihi na e wukwasịrị ya nꞌelu nkume. “Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nꞌelu aja, nke na-enweghị ntọ ala ọ bụla. Mgbe ide mmiri sọrọ ụlọ ahụ gburugburu, ụlọ ahụ na-ada nnọọ gbirigidim!” Mgbe Jisọs gwasịrị ndị mmadụ ihe ndị a, ọ banyere obodo Kapanọm. Na Kapanọm, ọ dị otu ọchịagha ndị Rom nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nꞌanya. Ohu a nọ nꞌọrịa, nꞌọnụ ọnwụ. Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na Jisọs abịarutela Kapanọm, o zigara ụfọdụ nꞌime ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya Jisọs ka ọ bịa gwọọ ohu ya a. Ndị okenye ndị Juu ahụ bịara rịọ Jisọs sị ya, “Nwoke a kwesịrị ka i nyere ya aka, nꞌihi na ọ hụrụ ndị Juu nile nꞌanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.” Jisọs sooro ndị okenye ahụ bido ịga nꞌụlọ ọchịagha ahụ. Ma mgbe ha nọ nso nꞌụlọ ya, ha zutere ndị ọchịagha ahụ zitere, ndị gwara Jisọs okwu sị, “Onyeisi anyị ziri anyị ka anyị bịa zie gị ka ị hapụ inye onwe gị nsogbu ịbata nꞌụlọ ya nꞌihi na ya etorughị onye ị ga-abata nꞌụlọ ya. Ọ sị anyị ziekwa gị na ya echeghị na ya toruru ịpụta ịbịa izute gị. Ya mere, ọ sị anyị rịọ gị ka ị nọdụ nꞌebe a nye iwu nke ga-eme ka ahụ dị ohu ya mma. Ọ sịkwa anyị zie gị na ya onwe ya bụ onye nọ nꞌokpuru ndị dị ukwuu karịa ya, ndị na-enye ya iwu ihe o kwesịrị ime nke ọ na-emekwa. Otu a kwa, ya onwe ya nwekwara ndị nọ nꞌokpuru ya ndị ọ na-ezi ozi ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ sị otu onye gaa ọ na-agakwa, ọ sịkwa onye ọzọ bịa, ọ na-abịa. Ọ bụrụkwa na ọ sị odibo ya mee ihe a, ọ na-eme ya.” Mgbe Jisọs nụrụ ozi ọchịagha ahụ ziri ka e zie ya, o juru ya anya nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ tụgharịrị lee ndị mmadụ na-eso ya anya sị ha, “Nꞌezie, o nwebeghị oge m hụrụ onye nwere okwukwe dị ka ọchịagha a si nwee okwukwe. Nꞌezie ahụbeghị m ụdị okwukwe a nꞌala Izirel nile.” Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nꞌụlọ nna ha ukwu, ha chọpụtara na ọrịa na-enye odibo ọchịagha ahụ nsogbu alaala. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, Jisọs gara nꞌobodo a na-akpọ Neen. Ọtụtụ nꞌime ndị na-eso ya na ọtụtụ igwe mmadụ ọzọ so ya gaa. Mgbe Jisọs na-abịaru nso nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ, ọ hụrụ ndị mmadụ ka ha bu igbe ozu nke ha na-aga ili. Nwoke e tinyere nꞌigbe ahụ bụ nanị nwa nke nne ya mụtara. Di nwanyị a anwụọkwala. Mgbe Jisọs hụrụ nwanyị a ka ọ na-akwa akwa, o nwere ọmiko nꞌahụ ya, jekwuru ya, gwa ya okwu sị, “Nne, akwakwala akwa ọzọ.” Mgbe ahụ Jisọs gara nso metụ igbe ozu ahụ aka. Ndị bu ya kwụsịrị. Jisọs gwara nwoke ahụ nwụrụ anwụ okwu nꞌoke olu sị, “Nwokorọbịa, asị m gị si nꞌọnwụ bilie!” Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu. Jisọs kpọnyere ya nne ya. Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe a, ụjọ dị ukwuu tụrụ ha. Ha bidokwara ito Chineke na-asị, “Chineke abịala inyere ndị ya aka! Ọ kpọlitela onye amụma dị ukwuu!” A kọrọ akụkọ ọrụ ebube a Jisọs rụrụ nꞌakụkụ Judia nile. Ndị na-eso ụzọ Jọn omee baptizim bịara kọọrọ Jọn ihe Jisọs na-eme. Mgbe ahụ Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nꞌime ha zie ha ka ha jekwuru Jisọs jụọ ya ajụjụ sị: “Ọ̀ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya? Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?” Mgbe ndị ozi Jọn bịakwutere Jisọs, ha ziri ozi e ziri ha sị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị bịa jụọ gị ma ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ya, ka anyị ga-ele anya maka ọbịbịa onye ọzọ?” Mgbe ahụ, ndị ozi ahụ Jọn zitere nọ nꞌebe ahụ Jisọs nọ hụ ka Jisọs siri gwọọ ọtụtụ ndị ọrịa, hụkwa ka o si chụpụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ. Ha hụkwara ka o si mee ka ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ. Emesịa Jisọs gwara ha sị, “Laghachinụ azụ kọọrọ Jọn ihe unu ji anya unu hụrụ na ihe unu ji ntị unu nụrụ. Kọọrọnụ ya na a na-eme ka ndị kpuru isi hụ ụzọ, na ndị ngwụrọ na-agakwa ije, na a na-emekwa ka ndị ekpenta dị ọcha, na ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, na a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie, na a na-ekwusakwara ndị ogbenye ozi ọma. Gwakwanụ Jọn na ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke na-adịghị enwe obi abụọ banyere m.” Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn lawara, Jisọs bidoro ịgwa ndị mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Mgbe unu gara nꞌọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya ịhụ? Ọ̀ bụ ihu nwoke dị ka ahịhịa nke ikuku na-ebugharị? Gịnị ka unu lere anya ịhụ? Ọ̀ bụ nwoke yi uwe mara mma? Lee na ndị na-eyi uwe mara mma nọ nꞌobi eze. Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ̀ bụ onye amụma? Nꞌezie unu hụrụ onye karịrị onye amụma. Nꞌihi na Jọn bụ nwoke ahụ e dere ihe banyere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Lee ana m ezite onye ozi m nke ga-ebu ụzọ bịa ịkwado ihe nile tupuu ị bịa.’ Ka m gwa unu eziokwu, nꞌime ndị nile nwanyị mụrụ e nwebeghị onye amụma ọ bụla dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya. “Ndị Juu nile nụrụ okwu Jọn, na ndị ọnaụtụ gere ya ntị, kwenyere na ihe Chineke chọrọ ziri ezi. Nꞌihi ya, ha nyere Jọn onwe ha ka o mee ha baptizim. Ee, mmadụ nile nabatara okwu Jọn nye onwe ha, kama ọ bụ nanị ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ịnabata okwu ya. Ha jụkwara ịnabata nzube ọma Chineke na-ezube banyere ha, mgbe ha jụrụ na Jọn ga-eme ha baptizim. “Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nꞌọgbọ a? Gịnị ka m ga-asị na ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nꞌama na-egwu egwu, ndị na-akpọ ibe ha na-asị, ‘Anyị na-afụrụ unu opi ma unu adịghị ete egwu, anyị na-abụrụ unu abụ ili ozu ma unu adịghị akwa akwa.’ Mgbe Jọn bịakwutere unu o soghị unu rie ihe, o sokwaghị unu ṅụọ mmanya, ma gịni ka unu kwuru banyere ya? Unu sị na ọ bụ onye isi mebiri, onye ara. Ma ugbu a Nwa nke mmadụ abịala soro unu na-eri ma na-aṅụkwa, ma gịnị ka unu na-ekwu banyere m? ‘Lee onye oke nri na onye aṅụrụma mmanya abịala, enyị ndị ọnaụtụ na ndị mmehie!’ Otu ọ dị, ọrụ a rụpụtara na-egosi na ụzọ ọ bụla Chineke si arụ ọrụ ya dị mma.” Otu onye nꞌime ndị Farisii kpọrọ Jisọs ka ọ bịa rie ihe nꞌụlọ ya. Jisọs gara, soro ya nọdụ ala iri nri. Mgbe Jisọs nọ nꞌụlọ ahụ, otu nwanyị akwụla bi nꞌobodo ahụ onye maara na Jisọs nọ nꞌụlọ onye Farisii ahụ, jiri otu karama mmanụ otite na-esi ezigbo isi bata nꞌụlọ ahụ jee nꞌazụ Jisọs, gbuo ikpere nꞌebe ụkwụ ya dị. Anya mmiri sikwa nꞌanya ya na-awụpụta na-awụkwasị Jisọs nꞌụkwụ. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri a dị nꞌụkwụ Jisọs, werekwa ọnụ ya na-esutu Jisọs nꞌụkwụ. Emesịa ọ wụrụ mmanụ ahụ nile nꞌụkwụ Jisọs. *** Mgbe nwoke onye Farisii ahụ Jisọs nọ nꞌụlọ ya na-eri nri hụrụ ihe nwanyị a na-eme, o kwuru nꞌobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma nꞌezie, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, ọ gaara amata na nwanyị a bụ akwụla.” Ma Jisọs gwara onye Farisii ahụ okwu sị, “Saimọn, ọ dị ihe m chọrọ ịgwa gị.” Saimọn zara ya sị, “Kwuo ihe dị gị nꞌobi, ana m ege ntị.” Jisọs gwara ya sị, “E nwere otu nwoke ọrụ ya bụ ibinye ndị mmadụ ego. Otu ụbọchị nwoke a gbazinyere mmadụ abụọ ego. Ọ gbazinyere onye nke mbụ iri naịra ise, gbazinye onye nke ọzọ naịra iri. Mgbe oge ruru ka ndị a kwụghachi ụgwọ ha ji, ha enweghị ego ha ga-eji kwụghachi. Nwoke ahụ gbazinyere ha ego kpọrọ ha gwa ha na ya achọkwaghị ka ha kwụọ ya ụgwọ ahụ, na ọ gbagharala ha ụgwọ ha ji ya. Ugbu a, gwa m, onye nꞌime mmadụ abụọ a ka i che ga-ahụ nwoke ahụ nꞌanya karịa ibe ya?” Saimọn onye Farisii ahụ zara sị ya, “Nꞌuche m, ọ bụ onye ji ụgwọ iri naịra ise.” Jisọs zara sị ya, “Ị zara nke ọma.” Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị lee nwanyị ahụ anya meghee ọnụ gwa Saimọn okwu sị, “Saimọn, ị hụrụ nwanyị a? Mgbe m batara nꞌụlọ gị i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha. Mgbe m batara nꞌụlọ gị, i jighị isutu ọnụ kelee m, ma kemgbe m batara nꞌụlọ a, nwanyị a ezubeghị ike iji ọnụ ya na-esutu ụkwụ m. Mgbe m batara nꞌụlọ gị, ị wụkwasịghị m mmanụ ọ bụla nꞌisi, ma lee na nwanyị a eteela m mmanụ nꞌụkwụ. Nꞌihi ihe ndị a nwanyị a mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya nile o mehiere, nꞌihi na ọ hụrụ m nꞌanya nke ukwuu. Ma nwoke ahụ hụrụ m nꞌanya nke nta, ka a ga-agbaghara nanị nke nta.” Mgbe ahụ Jisọs gwara nwanyị ahụ okwu sị, “A gbagharala gị mmehie gị nile.” Ndị ọzọ soro Jisọs nọdụ na-eri nri ahụ bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Gịnị ka nwoke a na-eche na ọ bụ? Ịgbaghara mmadụ mmehie ha!” Ma Jisọs gwara nwanyị ahụ sị, “Ọ bụ okwukwe i nwere nꞌime m zọpụtara gị.” Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gara nꞌobodo ukwu nile na nꞌobodo nta nile na-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke. Ndị ozi ya iri na abụọ ahụ sokwa ya. Ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a Jisọs gwọrọ ọrịa na-enye ha nsogbu, onye dị ka Meri Magdalin onye o sitere nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa, na Joana nwụnye nwoke a na-akpọ Chuza onye na-elekọta obi eze Herọd na akụ ya nile, na Suzana, na ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị ọzọ so Jisọs na-egboro ya mkpa ya. Mgbe igwe mmadụ sitere nꞌọtụtụ obodo gbaa Jisọs gburugburu, Jisọs meghere ọnụ ya jiri ilu gwa ha okwu sị, “Otu onye ọrụ ubi gara nꞌubi ya ịgha mkpụrụ, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ahụ dara nꞌakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo. Ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ndị a dakwasịrị nꞌelu nkume. Mgbe ha toro ha kpọnwụrụ nꞌihi na aja dị nꞌelu nkume ahụ enweghị ike ịmịta mmiri nke mkpụrụ ahụ ji adị ndụ. Ụfọdụ nꞌime mkpụrụ a dara nꞌala ebe ogwu ogwu dị. Ogwu ndị a tokwara kpagbuo ha. Ụfọdụ mkpụrụ dara nꞌezi ala. Ha pupụtara, too, mịa mkpụrụ dị narị nꞌọnụ ụgụgụ karịa nke a kụrụ.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, ọ gwara ha sị, “Onye ọ bụla nꞌime unụ nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ ihe ndị a m kwuru.” Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Kọwaara anyị ihe ilu mkpụrụ a a ghara pụtara.” Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ unu ka ọ dịrị ịmata ihe omimi nile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya nanị nꞌilu. Site nꞌụzọ dị otu a, ha ga-ele anya leekwa ma ha agaghị ahụ ihe ọ bụla. Ha ga-egekwa ntị gee, ma ha agaghị aghọta. “Ugbu a nụrụnụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke. Mkpụrụ dara nꞌakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị na-anụ okwu Chineke, ma ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nꞌobi ha, ka ha ghara ikwere ka a zọpụta ha. Mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌelu nkume nọchiri anya ndị ahụ nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya. Ma okwu ahụ ha nụrụ abanyeghị nꞌime obi ha gbaa mgbọrọgwụ. Ha na-ekwere nanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara nꞌihi ihe ha kweere nꞌime ya, ha adịghị agakwa nꞌihu. Ha na-ada nꞌokwukwe ha. Mkpụrụ nke dara nꞌebe ogwu ogwu dị nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke kwere nꞌihe ha nụrụ. Ma oke echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ ha nụrụ. Ha adịghị enwekwa ike nyere ndị ọzọ aka ịmata na ikwere nꞌozi ọma Chineke. “Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌezi ala nọchiri anya ndị mmadụ jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma gaakwa nꞌihu ime ihe okwu ahụ kwuru. Ndị a na-apụ jiri ntachi obi gbasaa ozi ọma ahụ, rite ndị ọzọ nꞌuru. “Mmadụ ọ bụla adịghị, nke na-amụnye iheọkụ zoo ya nꞌime igbe ma ọ bụ dọnye ya nꞌokpuru ihe ndina. Kama mgbe mmadụ mụnyere iheọkụ ọ na-adọkwasị ya nꞌelu tebulu ka ndị ọ bụla na-abata nꞌụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ. Ọ dịghị ihe ọ bụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọ bụla mmadụ mere nke ọ dị ka e kpugidere ihe ugbu a, nke mmadụ nile na-agaghị emesịa mata. Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nꞌihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye ọzọ, ma onye ahụ na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o chere na o nwere.” Nꞌoge a, nne Jisọs na ụmụ nne ya bịara nꞌebe ọ nọ. Ma ha enweghị ike ịbịaru ya nso nꞌihi na ọtụtụ mmadụ gbara ya gburugburu. Mgbe ahụ otu onye nꞌime ndị ahụ gbara Jisọs gburugburu kpọrọ Jisọs gwa ya sị, “Lee na nne gị na ụmụnne gị guzo nꞌezi. Ha na-achọ ịhụ gị.” Jisọs zara ya sị, “Nne m na ụmụnna m bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ihe ha nụrụ mee ihe Chineke na-achọ.” Otu ụbọchị Jisọs na mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya biliri banye nꞌụgbọ mmiri. Jisọs gwara ha sị, “Ka anyị gafeenụ nꞌofe ọzọ nke osimiri.” Ha kwọliri ụgbọ ha bido ije. Mgbe ha nọ nꞌụzọ, Jisọs bidoro ịrahụ ụra. Oke ifufe bidoro ife nke na-ebugharị mmiri ahụ mee ka mmiri bido ịbanye nꞌụgbọ mmiri ha, tutuu ruo mgbe ụgbọ ha chọrọ imikpu. Ndị na-eso ụzọ Jisọs jiri ọsọ na iti mkpu jeruo nꞌebe Jisọs dina kpọtee ya sị ya, “Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Lee na anyị alaala nꞌiyi!” Jisos tetara baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe nile deere jii. Mgbe ahụ Jisos jụrụ ndị na-eso ụzọ ya si, “Ebeekwanụ ka okwukwe uni di?” Ma ha tụrụ nnọọ oke egwu sịritaa onwe ha, “Onye ka nwoke a bụ, onye ikuku na ebili mmiri na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.” Emesia, ha rutere nꞌobodo Gadarin nke dị nꞌofe nke ọzọ, nke ya na Galili na-echerita ihu. Mgbe Jisọs si nꞌugbọ mmiri na-arịpụta onye zutere ya bụ otu nwoke obodo ahụ mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Ọ gba ọtọ. O bighị nꞌụlọ ọ bụla, kama ebe o jiri mere ụlọ ya bụ ebe a na-eli ozu. Mgbe nwoke a hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nꞌihu ya kwaa akwa nꞌoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs Ọkpara Chineke dị elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ dị ukwuu.” Nwoke a si otu a kwuo okwu nꞌihi na Jisọs enyela mmụọ ọjọọ ahụ bi nꞌime ya iwu ka o site nꞌime ya pụta. Ọ dị mgbe mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike. Nꞌoge a, ọ bụrụ na e jiri ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ, mmụọ ọjọọ a na-enyere ya akạ ịdọbisi ụdọ igwe ahụ. Ọ na-enyekwara ya aka isi nꞌụlọ mkpọrọ ahụ tikapụta. Ọ pụtakwa, ọ na-eduru ya gaa nꞌọzara. Jisọs jụrụ nwoke ahụ ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ nọ nꞌime nwoke ahụ zara sị ya, “Aha m bụ ìgwe, nꞌihi na anyị dị ọtụtụ.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ rịọrọ Jisọs ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nꞌolulu dị omimi ahụ nke na-enweghị njedebe. Nꞌoge ahụ, ọ dị igwe ezi nọ nꞌakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nꞌime ezi ndị ahụ. Jisọs nyere ha ike. Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nꞌime nwoke ahụ pụọ, banye nꞌime ezi ndị ahụ. Otu mgbe ahụ ha banyere, igwe ezi ahụ nile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nꞌime mmiri ahụ, ebe osimiri riri ha. Mgbe ndị na-elekọta ezi ahụ hụrụ ihe mere, ha gbaara ọsọ gaa nꞌobodo nile dị gburugburu ebe ahụ, kọọrọ ha ihe mere. Ọtụtụ mmadụ sitere nꞌobodo ndị a pụta, ka ha jiri anya ha hụ ihe mere. Mgbe ha bịara nꞌebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ. Ọ nọ ala nꞌakụkụ ebe ụkwụ Jisọs dị. O yi uwe, nọdụkwa nꞌanya udo. Ụjọ tụrụ ndị mmadụ ahụ nile. Ndị nọ nꞌebe ahụ mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọ ndị ahụ, kọọrọ ndị si nꞌime obodo pụta otu Jisọs siri gwọọ nwoke ahụ. Mgbe ahụ ndị nile bi na Gadarin na nꞌobodo gbara ebe ahụ gburugburu rịọrọ Jisọs ka ọ hapụrụ ha obodo ha, nꞌihi na ụjọ dị ukwuu tụrụ ha. Jisọs banyekwara nꞌime ụgbọ mmiri ahụ bido ịgaghachi ebe o si bịa. Mgbe Jisọs na-abanye nꞌụgbọ, nwoke ahụ o sitere nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ, bịara rịọ ya sị, “Biko kwerenụ ka m soro gị.” Ma Jisọs ekweghi. Kama ọ gwara ya sị, “Laghachi nꞌezinụlọ gị kọọrọ ha ihe Chineke meere gị.” Nwoke ahụ lara, gbasaa akụkọ ihe Jisọs meere ya nꞌobodo ahụ nile. Emesịa, Jisọs lọghachiri nꞌobodo Kapanọm. Nꞌebe ahụ ndị mmadụ jiri ọṅụ nabata ya, nꞌihi na ha na-ele anya ọbịbịa ya. Mgbe ahụ otu onyeisi ụlọ ekpere ndị Juu a na-akpọ Jairọs, bịara daa nꞌala nꞌụkwụ Jisọs, rịọ ya ka ọ bịa nꞌụlọ ya. Jairọs mụtara nanị otu nwanta nwanyị, onye gbara afọ iri na abụọ nꞌoge ahụ. Nwanta nwanyị a nọkwa nꞌọnụ ọnwụ. Mgbe Jisọs so Jairọs na-aga nꞌụlọ ya, ọtụtụ ndị so Jisọs na-enu ibe ha aka, na-achọ ịbịaru Jisọs nso. Nꞌime igwe mmadụ a, o nwere otu nwanyị nọrọla nꞌọrịa afọ iri na abụọ. Ọrịa ọ na-arịa bụ ịgba ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị. O mefuola ego dị ukwuu nꞌaka ndị dibia dị iche iche, ma o nwebeghị onye nwere ike gwọọ ya. O jisiri ike site nꞌetiti ndị mmadụ bịa nꞌazụ Jisọs metụ ọnụ uwe Jisọs aka. Otu mgbe ahụ o metụrụ uwe Jisọs aka, ọbara ahụ kwụsịkwara ịgba ọzọ. Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị jụọ ajụjụ sị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya, Pita na ndị ọzọ so Jisọs gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, lee igwe mmadụ gbara gị gburugburu, ndị na-achọsi ike ịbịaru gị nso, ị sikwanụ aṅaa na-ajụ ajụjụ banyere onye metụrụ gị aka?” Ma Jisọs zara sị ya, “O nwere otu onye metụrụ m aka, nꞌihi o metụrụ m nꞌahụ na ike esitela m nꞌahụ pụọ.” Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime izo onwe ya, o jiri egwu na ahụ ịma jijiji bịa daa nꞌala nꞌihu Jisọs, kọọrọ ya ihe nile mere nꞌihu mmadụ nile. Ọ gwakwara Jisọs ihe mere o ji metụ ya aka. Jisọs gwara ya sị, “Ada m nwanyị, atụla egwu, okwukwe i nwere nꞌime m agwọọla gị.” Mgbe ọ nọ na-agwa nwanyị ahụ okwu, otu onye sitere nꞌụlọ Jairọs bịarute ebe ahụ gwa Jairọs sị, “Nwa gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu.” Ma mgbe Jisọs nụrụ ihe onye ahụ kwuru, ọ gwara Jairọs sị, “Atụla egwu, kama kwere na m, a ga-emekwa ka ahụ dị ya mma.” Mgbe ha ruru ụlọ Jairọs, Jisọs ekweghị ka onye ọ bụla ọzọ soro ya baa nꞌime ụlọ ahụ, Ọ kpọọrọ nanị Pita na Jemes na Jọn na nne na nna nwanta ahụ, banye nꞌime ụlọ ahụ. Nꞌime ụlọ ahụ, Jisọs hụrụ ọtụtụ ndị nọ na-akwa akwa na-etikwa aka nꞌobi na mwute, nꞌihi ọnwụ nwanta nwanyị ahụ. Jisọs gwara ha sị, “Unu ebekwala akwa, nꞌihi na nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, ọ bụ ụra ka ọ na-arahụ.” Mgbe ndị ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha chịrị ya ọchị, nꞌihi na ha onwe ha maara na nwanta nwanyị ahụ anwụọla. Jisọs zipụrụ ndị nile na-akwa akwa nꞌụlọ ahụ ezi. Ọ banyere, jide nwanta ahụ nꞌaka ya, selie ya elu, kpọọ ya sị, “Nwa m nwanyị, bilie!” Mmụọ ya lọghachiri ọzọ. O bilitekwara. Jisọs gwara ndị mụrụ ya ka ha chọọrọ ya nri ka o rie. Ụdị ọṅụ juru ndị mụrụ nwa ahụ obi enweghị ọkụkọ. Ma Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọ bụla ihe mere. Mgbe ahụ Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ, na ike ịgwọ ọrịa nile. O zipụrụ ha ikwusa na ọchịchị Chineke ebidola. O zipụkwara ha ịgwọ ndị ọrịa. Jisọs gwara ha sị, “Unu ewerekwala ihe ọ bụla nꞌihi ije a, unu ewerekwala mkpa nꞌaka ma ọ bụ akpa, unu ewerekwala nri, unu ewerela ego ma ọ bụ uwe abụọ. Nꞌụlọ ọ bụla unu banyere, nọdụnụ nꞌebe ahụ tutuu unu ahapụ obodo ahụ. “Obodo ọ bụla kwa unu gara, nke ndị bi nꞌime ya jụrụ ịnabata unu, mgbe unu si nꞌime ya na-apụ, kụpụsịanụ aja obodo ahụ dị unu nꞌụkwụ, dị ka ihe ngosi na ha jụrụ unu na okwu Chineke.” Ndị ahụ na-eso ya gara dị ka Jisọs gwara ha. Ha gara nꞌobodo nile, na-ekwusa ozi ọma. Ha gwọkwara ọtụtụ ndị ọrịa. Mgbe Herọd onye na-achị Galili nụrụ akụkọ banyere ihe Jisọs na-eme, ihe ọ nụrụ gbagwojuru ya anya, nꞌihi na ụfọdụ mmadụ gwara ya na Jisọs bụ Jọn omee baptizim, na o sitela nꞌọnwụ bilie. Ndị ọzọ gwara ya na Jisọs bụ Ịlaịja onye bịaghachiri azụ. Ma ọ dịkwa ndị ọzọ gwara ya na Jisọs bụ otu nꞌime ndị amụma ochie ahụ sitere nꞌọnwụ bilie. Ma Herọd nꞌonwe ya kwuru sị, “Ọ bụ mụ onwe m jiri ọnụ m nye iwu ka e gbuo Jọn, bipụ ya isi, onye bụkwanụ onye a m na-anụ akụkọ ya?” Ọ gụrụ nnọọ Herọd agụụ ịhụ Jisọs. Mgbe ndị ahụ na-eso ụzọ Jisọs lọtara, ha kọọrọ Jisọs akụkọ ihe nile ha mere. Jisọs kpọọrọ ha ka ha soro ya gaa ebe ha ga-anọrọ onwe ha nanị ha. Ọ bụ obodo Betsaida ka ọ kpọọrọ ha gaa. Ma mgbe ndị mmadụ nụrụ na Jisọs agaala Betsaida, ha sooro ya. Mgbe ha bịaruru ebe ahụ, Jisọs nabatara ha, gwa ha okwu gbasara alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nꞌetiti ha. Mgbe anwụ bidoro ịda, nꞌoge anyasị, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ bịakwutere Jisọs gwa ya sị, “Zilaganụ ndị a, ka ha gaa nꞌime obodo chọọrọ onwe ha nri, na ebe ha ga-arahụ ụra. Ebe anyị nọ bụkwanụ ọzara.” Ma Jisọs zara sị ha, “Chọọrọnụ ha nri ha ga-eri.” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nanị ogbe beredi ise na azụ abụọ ka anyị nwere. Ị̀ chọrọ ka anyị gaa zụọra mmadụ ndị a nile nri?” Ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ ruru puku mmadụ ise. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gwanụ ha ka ha nọdụ ala. Keenụ ha ka ha nọdụ nꞌigwe nꞌigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise.” Ndị na-eso ụzọ Jisọs nyeere ndị mmadụ ahu aka ịnnọdụ dị ka Jisọs si kwuo. Emesia, Jisọs weere ogbe beredi ise na azụ abụọ ndị ahụ lelie anya nꞌeluigwe. O kelere Chineke ekele nꞌihi ha, nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahu. Ndị ahụ nile riri tutuu efọ eju ha. Nꞌikpeazụ ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara ibiribe beredi fọdụrụ tụtụjuo ya nkata iri na abụọ. Otu ụbọchị mgbe Jisọs nọ nanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ sị na m bụ?” Ndị na-eso ụzọ ya zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaija, ndị ọzọ sị na ị bụ otu nꞌime ndị amụma ochie ahụ si nꞌọnwụ bilie.” Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Unu kwanụ? Onye ka unu sị na m bụ?” Pita zara ya sị, “Ị bụ Kraịst Onye nzọpụta ahụ Chineke zitere.” Nꞌotu oge ahụ Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọ bụla. Ọ gwakwara ha sị, “Nwa nke mmadụ ga-ahụ ahụhụ dị ukwuu. Nꞌihi na ndị okenye anyị, na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Ha ga-egbu ya, ma ụbọchị atọ gafee, ọ ga-esite nꞌọnwụ bilie ọzọ.” Jisọs gwakwara ha sị, “Ọ bụrụ na unu achọọ isoro m, unu kwesịrị ịgụ ndụ unu dị ka ihe furu efu, buru obe unu ụbọchị nile na-eso m. Nꞌihi na onye ọ bụla chọrọ ịzọpụta ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọ bụla jikeere itufu ndụ ya nꞌihi m, ka a ga-azọpụta. Uru gịnị ka mmadụ nwere ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa nile nꞌuru ma tufuo ndụ ya, bụrụkwa onye furu efu na onye ga-ala nꞌiyi?” “Nꞌihi na onye ọ bụla ihere m ma ọ bụ ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa m mgbe m ga-abịaghachi nꞌebube nke Nna m, na nꞌebube ndị mmụọ ozi. Eziokwu ka m na-agwa unu mgbe m na-asị, na ụfọdụ nọ ugbu a, nꞌetiti unu, ndị na-agaghị anwụ tutuu ruo mgbe ha ga-ahụ alaeze Chineke.” Mgbe abalị asatọ gafere, Jisọs kpọọrọ Pita na Jọn na Jemes gaa nꞌelu ugwu ikpe ekpere. Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ọdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya nwupụrụ ọcha, ọ chara nnọọ vaaa, chakarịa ihe ọcha ọ bụla anya mmadụ hụrụla. Na mberede mmadụ abụọ pụtara soro ya guzo na-ekwu okwu. Ha bụ Mosisi na Ịlaịja. Ha pụtara nnọọ nꞌebube nke eluigwe soro Jisọs na-ekwu okwu banyere otu ọ ga-esi mezuo uche Chineke, site nꞌọnwụ nke ọ ga-anwụ na Jerusalem. Mgbe ihe ndị a na-eme, Pita na mmadụ abụọ ndị ọzọ nọ na-arahụ ụra. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube Jisọs, hụkwa mmadụ abụọ ahụ ha na Jisọs nọ na-ekwurita okwu. Mgbe Mosisi na Ịlaịja bidoro isite nꞌebe Jisọs nọ na-apụ, Pita gwara Jisọs sị, “Nna anyị ukwu, ọ ga-adịkwanụ mma ma ọ bụrụ na anyị ga-anọ nꞌebe a. Ka anyị wuonụ ọnụ ụlọ atọ, otu nke gị, otu nke Mosisi na otu nke Ịlaịja.” Ma mgbe Pita na-ekwu ihe ndị a, ọ ghọtaghị ihe ọ na-ekwu. Mgbe Pita kpụ okwu ahụ nꞌọnụ, igwe ojii kpuchigidere ha. Egwu tụrụ Pita na Jọn na Jemes mgbe igwe ojii ahụ kpuchigidere ha. Mgbe ahụ, ha nụrụ olu si nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m onye m họpụtara.” Mgbe olu ahụ kwusịrị okwu, ọ bụkwa nanị Jisọs ka Pita na Jọn na Jemes hụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla ha gwara ihe ha hụrụ, kama ha debere ihe nile nꞌobi ha. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, mgbe ha si nꞌugwu ahụ na-arịdata, ọtụtụ mmadụ zukọtara na ndịda ugwu ahụ ịhụ Jisọs. Otu nwoke si nꞌetiti igwe mmadụ ahụ jiri oke olu na-eti mkpu na-abịakwute Jisọs sị ya, “Nna anyị ukwu, arịọ m gị, leenụ nwa m, ọ bụkwanụ nanị ya bụ nwa m nwere! Mmụọ ọjọọ na-abịa jide ya na-eme ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-enugharịkwa ya na-eme ka ọ na-agbọ ụfụfụ nꞌọnụ. Mgbe mmụọ ọjọọ a mesịrị nke a laa, ike afụ anaghị adịkwa nwanta a. Abịakwutere m ndị na-eso ụzọ gị rịọ ha ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ, ma ha enweghị ike.” Jisọs zara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Unu bụ nnọọ ndị ekweghị ekwe na isi ike juru obi! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ m na-anagide ekweghị ekwe unu?” Mgbe ahụ ọ gwara nna nwanta ahụ sị, “Kpọtara m nwanta ahụ nꞌebe a!” Mgbe nna nwanta ahụ du nwanta ahụ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwaturu ya nꞌala nugharịa ya. Ma Jisọs nyere mmụọ ọjọọ ahụ iwu ka o si nꞌime nwanta ahụ pụta. Ọ gwọrọ nwanta ahụ kpọnyekwa ya nna ya. Ọrụ a Jisọs rụrụ juru ndị nile nọ nꞌebe ahụ anya. Ịdị ukwuu nke ike Chineke tụrụ ha nꞌanya. Ma mgbe onye ọ bụla nꞌọgbakọ ahụ nọ na-ekwu okwu ọma nꞌihi ihe Jisọs mere, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu echefula okwu a m chọrọ ịgwa unu ugbu a. A ga-arara Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị ga-egbu ya.” Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe Jisọs kwuru. E zonarịrị ha eziokwu dị nꞌokwu ahụ ka ha ghara inwe ike ghọta ya. Ụjọ tụkwara ha ịjụ Jisọs ka ọ kọwaa okwu ahụ. Otu ụbọchị, ịrụ ụka dapụtara nꞌetiti mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso Jisọs, banyere onye ka ibe ya ukwuu. Ebe Jisọs ma ihe ha na-eche, ọ kpọtara otu nwantakịrị mee ka o guzo nꞌakụkụ ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọ bụla nabatara nwanta a nꞌaha m, nabatara m. Onye ọ bụla kwa nabatara m, nabatara Chineke onye zitere m. Ọ bụkwa onye dịkarịsịrị nta nꞌetiti unu bụ onye ka ibe ya ukwuu.” Mgbe ahụ Jọn gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, anyụ hụrụ otu nwoke ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị nꞌotu anyị, anyị kwụsịrị ya.” Jisọs zara sị ya, “Ị garaghị eme ihe dị otu ahụ! Nꞌihi na onye ọ bụla na-adịghị emegide anyị dinyeere anyị.” Mgbe oge Jisọs ji alaghachi nꞌeluigwe na-abịa nnọọ nso, o kpebiri nꞌobi ya ịga Jerusalem. O zipụrụ ụfọdụ ndị ozi ya ka ha gaa nꞌihu ijikere ndị mmadụ ịnabata ya. Ndị ozi a gara rute nꞌụfọdụ obodo nta nke dị na Sameria. Ma ndị obodo ahụ jụrụ ịnabata ya nꞌihi na Jisọs na-aga Jerusalem. Mgbe Jemes na Jọn hụrụ na ndị Sameria jụrụ ịnabata Jisọs, ha gwara Jisọs sị, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nꞌeluigwe bịa laa ha nꞌiyi?” Jisọs tụgharịrị baara ha mba. Emesịa ha gara nꞌihu nꞌije ha tutuu ha erute obodo nta ọzọ. Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke bịakwutere Jisọs sị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọ bụla ị na-aga.” Jisọs zara ya sị, “Ewi nwere ọnụ, ụmụ nnụnụ nwekwara akwụ ebe ha na-edina. Ma mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla m ga-akpọ ụlọ m.” Jisọs gwara onye ọzọ bịakwutere ya sị, “Soro m.” Ma nwoke ahụ zara sị, “Biko, nyenụ m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.” Ma Jisọs zara ya sị, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ ha ka ha lie ndị dị ka ha. Ọrụ gị bụ ịga gbasaa ozi ọma nke alaeze Chineke.” Onye ọzọ kwa bịakwutere Jisọs sị ya, “Aga m esoro gị, ma biko kwere ka m gaa gwa ndị ezinụlọ m na m na-ahapụ ha.” Jisọs zara ya sị, “Onye ọ bụla ji ọgụ ya malite ịrụ ọrụ nꞌubi, mesịa hapụ ọrụ ọ na-arụ lewe anya nꞌazụ, ekwesịghị ịba nꞌalaeze Chineke.” Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs họpụtara iri mmadụ asaa ọzọ, zipụ ha abụọ abụọ, ka ha gaa nꞌobodo ukwu nile na nꞌobodo nta nile nke ọ na-ejikere ịbịa nꞌonwe ya. Ọ gwara ha sị, “Mkpụrụ a ga-aghọ dị ukwuu ma ndị ọrụ dị nanị ole na ole. Kpeenụ ekpere rịọ Chineke onye nwe mkpụrụ ndị a ka o zite ndị ọrụ nꞌubi a. Gaanụ, ma mgbe unu na-aga, chetanụ na ana m eziga unu dị ka unu bụ ụmụ atụrụ nọ nꞌetiti agụ. Unu ewela ego ma ọ bụ akpa onye arịrịọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ. Unu ekelekwala onye ọ bụla unu zutere nꞌụzọ. “Mgbe unu batara nꞌụlọ ọ bụla, ka okwu mbụ unu ga-ekwu bụrụ, ‘Udo dịrị ndị bi nꞌụlọ a.’ Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nꞌụlọ ahụ, mgbe ahụ udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nꞌụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitere unu. “Mgbe unu batara nꞌobodo ọ bụla, unu esitela nꞌotu ụlọ gaa na nke ọzọ. Nọdụnụ nꞌotu ebe rie ma ṅụọkwa ihe ha nyere unu, nꞌihi na onye ọrụ ọ bụla kwesịrị ịnata ụgwọ ọrụ ya. “Ọ bụrụ na ndị bi nꞌobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọ bụla ha nyere unu. Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nꞌebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke abịala unu nso.’ “Kama ọ bụrụ na obodo ọ bụla ajụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nꞌokporo ụzọ obodo ahụ kwuo sị, ‘Anyị na-ehichapụ aja obodo a nyapagidere anyị nꞌụkwụ, na-ahapụrụ unu ya. Matakwanụ nꞌeziokwu na alaeze Chineke abịala unu nso.’ Eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-asị, nꞌụbọchị ikpe ahụ, Chineke ga-emere obodo Sodọm ebere karịa obodo ndị jụrụ ịnabata unu. Ahụhụ dị ukwuu na-eche gị, gị obodo Korazin. Ahụhụ dị ukwuu dịkwa na-eche gị, gị obodo Betsaida. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ nile m rụrụ nꞌime unu nꞌobodo Taịa na Saidọn, ha gaara echegharị kemgbe. Ha gaara eyi uwe nkịkara, wụkwasị onwe ha ntụ nꞌisi igosi na ha esitela na mmehie ha chegharịa. Ka m gwa unu eziokwu, Chineke ga-emere Taịa na Saidọn ebere karịa obodo Korazin na Betsaida. Ma gị obodo Kapanọm! Ị̀ na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịdaru ala mmụọ!” Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ọ bụla gere ntị nꞌihe unu gwara ya, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọ bụla kwa jụrụ ịnabata unu, ọ bụ m ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọ bụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata Chineke onye zitere m.” Emesịa, iri mmadụ asaa ahụ Jisọs zipụrụ jiri ọṅụ lọta gwa Jisọs sị, “Onyenwe anyị, ọ bụladị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi mgbe anyị sitere nꞌaha gị nye ha iwu ka ha pụta.” Mgbe ahụ Jisọs kwuru okwu sị, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nꞌeluigwe daa dị ka mgbe amụma na-egbu na mbara eluigwe. Geenụ ntị. Enyela m unu ike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, ha agaghị emerụkwa unu ahụ. Enyekwala m unu ike imegide ike nile nke onye iro. Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nꞌihi na mmụọ ọjọọ rubere isi mee ihe unu nyere ha nꞌiwu, kama ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi na e deela aha unu nꞌeluigwe.” Mgbe ahụ, Jisọs, onye jupụtara nꞌọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuru okwu sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ekelee m gị nꞌihi na i zonarịrị ihe ndị a nꞌebe ndị ọkachamara na ndị ukwu nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a nile nye ndị na-amaghị ihe ọ bụla. Ee, Nna, ọ bụ gị siri otu a mee ya, nꞌihi na otu ahụ bụ ụzọ i siri chọọ ya. Nna m enyela m ihe nile. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara Nna bụ, karịa Nna. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara Nna na ndị ahụ Ọkpara Nna chọrọ igosi onye Nna bụ.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Unu bụ ndị Chineke gọzịri nꞌihi na o mere ka unu hụ ihe ndị a unu na-ahụ ugbu a. Nꞌezie, ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ugbu a, na ịnụ ihe unu na-anụ ugbu a, ma e nyeghị ha ohere ịhụ ya na ịnụ ya.” Otu ụbọchị otu onye ozizi iwu bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ọ jụrụ ya ajụjụ sị ya: “Onye ozizi, gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọọ iketa eluigwe?” Jisọs zara ya sị, “Gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru banyere ajụjụ a? Gịnị ka ị gụtara?” Nwoke ahụ zara ya sị, “Iwu ahụ sịrị, Ì kwesịrị iji obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na ike gị nile, na mmụọ gị nile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nꞌanya. I kwesịkwara ịhụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.” Jisọs zara ya sị, “Ị zara nke ọma. Ugbu a, laa, gaa mee nke a: ị ga-enwekwa ogologo ndụ.” Ma ebe nwoke ahụ na-ezi iwu chọrọ igosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye kwanụ bụ onye agbata obi m?” Jisọs zara sị, “Ọ dị otu nwoke sitere nꞌobodo Jerusalem na-aga nꞌobodo Jeriko. Mgbe ọ na-aga nꞌụzọ, o zutere ndị ohi na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike, ndị napụrụ ya ihe nile o nwere, tie ya ihe, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụ ọnwụkamma laa. “Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja nke ụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem sitere ụzọ ahụ na-aga njem ya. Mgbe ọ hụrụ nwoke a, o sitere nꞌakụkụ ụzọ ahụ gafee. Otu a kwa, otu onye Livayị na-enyere ndị nchụaja aka nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke bịarutekwara nꞌebe nwoke ahụ tọgbọ nꞌala hụ ya. Ma o sitere nꞌakụkụ ụzọ ahụ gafeekwa. “Ma otu onye Sameria, onye mba ọzọ, onye ndị Juu kpọrọ asị, sitere nꞌụzọ ahụ na-agakwa njem ya. Mgbe ọ bịarutere hụ ebe nwoke a tọgbọ nꞌala, o nwere ọmiko nꞌahụ ya. O sitere nꞌelu inyinya ibu ya rịdata, gaa nso nꞌebe nwoke ahụ dina. O ji mmanya saa ọnya ya, tee ya mmanụ, were akwa kechie ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o buliri nwoke ahụ elu, tụkwasị ya nꞌelu inyinya ibu ya, buru ya gaa nꞌụlọ ndị ije, ebe ọ nọ lekọtazie ya anya nke ọma. Nꞌechi ya, mgbe ọ na-akwado ịpụ, o wepụtara naịra abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie nwoke a anya nke ọma. Ọ bụrụ na i mefuo ego ọzọ karịrị ego a m nyere gị, mgbe m lọghachiri, aga m akwụ gị ya.’ ” Mgbe ahụ Jisọs jụrụ onye ozizi iwu ahụ sị, “Ònye nꞌime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbata obi nwoke ahụ ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike merụrụ ahụ?” Onye ozizi iwu ahụ zara sị ya, “Ọ bụ onye ahụ lekọtaziri ya anya nke ọma.” Mgbe ahụ Jisọs zara ya sị, “Ugbu a laa, gaa mee dị ka nwoke ahụ siri mee.” Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gakwara nꞌihu nꞌije ha ịga Jerusalem. Emesịa, ha rutere obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata bi. Nwanyị a nabatakwara ha nꞌụlọ ya. Mgbe Jisọs batara nꞌụlọ ahụ nọdụ ala, Meri nwanne Mata, bịara nọdụ nꞌala na-ege ntị nꞌihe Jisọs na-ekwu. Mgbe ihe ndị a na-eme, Mata nọrị na-agbalị ikwado nri Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ga-eri. Ọ dịghị anya ọrụ a bidoro ịgbakasị ya ahụ nꞌihi na ọ bụ ọrụ dị ukwuu. Mgbe Mata na-enweghị ike idi ịrụ ọrụ a nanị ya, ọ pụtara jụọ Jisọs sị, “Onyenwe m, ọ̀ dị mma na Meri ga-ahapụrụ nanị m ọrụ ndị a nile? Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.” Ma Jisọs zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-atụfu nnọọ oge ịdọgbu onwe gị nꞌọrụ dị iche iche. Ma ọ bụ nanị otu ihe dị mkpa nꞌụwa, Meri nwanne gị achọtala ihe ahụ. Agaghị m anapụkwa ya ihe ahụ ọ chọtara!” Otu ụbọchị Jisọs nọ na-ekpe ekpere. Ndị na-eso ụzọ ya nọkwa nꞌebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere. Mgbe o kpesịrị, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị otu anyị kwesịrị isi kpee ekpere, dị ka Jọn siri zi ndị na-eso ụzọ ya.” Jisọs zara ha sị, “Mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, unu si otu a kpee ya, Nna anyị, ka e doo aha gị nsọ, ka alaeze gị bịa. Nye anyị nri ga-ezuru anyị kwa ụbọchị. Gbaghara anyị mmehie anyị, nꞌihi na anyị na-agbaghara onye ọ bụla mejọrọ anyị. Edubakwala anyị nꞌọnwụnwa.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ na ọ dị otu onye nꞌime unu nke enyi ya bịakwutere nꞌetiti abalị, kụọ aka nꞌụzọ kpọtee ya sị, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe beredi atọ, nꞌihi na otu nꞌime ndị enyi m bịara nꞌụlọ m ugbu a, ma enweghị m nri ọ bụla nꞌụlọ m ga-enye ya.’ Nwoke ahụ a kpọtere nꞌụra ọ ga-ekwu sị, ‘Enyi m, biko enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ọtọ ugbu a inye gị ihe ọ bụla?’ Echeghị m na unu ga-eme nke a. “Nꞌihi na ọ bụ ezie na ọ gaghị agụ nwoke ahụ agụụ isite nꞌihe ndina ya bilie bịa nye enyi ya ahụ ihe ọ rịọrọ, ma ọ ga-ebili meere ya ihe ọ chọrọ nꞌihi na ihere emeghị nwoke ahụ nke bịara nọgidesie ike ịrịọ arịrịọ ahụ. Ya mere, ana m agwa unu sị, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọọnụ aka, a ga-emeghere unu ụzọ. Nꞌihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nꞌụzọ ka a na-emeghere. “Ajụjụ a dịrị unu bụ nna nwere ụmụ. Onye nꞌime unu ka nwa ya ga-abịakwute ka o nye ya beredi, o were nkume nye ya? Ọ bụrụkwa na nwa unu arịọ unu azụ, unu ga-enye ya akpị? “Ọ bụrụ na unu ndị ajọ omume pụrụ inye ụmụ unu ezi ihe, unu echeghị na nna unu bi nꞌeluigwe ga-esitekwa otu a were Mmụọ Nsọ ya nye ndị rịọrọ ya?” Otu ụbọchị mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ bi nꞌime otu nwoke dara ogbi, nwoke ahụ bidoro ikwu okwu. Ọrụ a jụrụ mmadụ nile anya. Ma ụfọdụ mmadụ nꞌime ndị nọ ebe ahụ kwuru sị, “Ọ bụ site nꞌike ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ ka o si achụpụ mmụọ ọjọọ ndị a.” Ndị ọzọ nwakwara ya ọnwụnwa sị ya gosi ha ihe ịrịba ama na mbara eluigwe iji gosi na ọ bụ Onye nzọpụta. Ma Jisọs onye maara ihe ha na-eche nꞌobi ha gwara ha okwu sị, “Obodo ọ bụla ịlụ ọgụ dị nꞌime ya agaghị adịgide ruo mgbe tere anya, ezinụlọ ọ bụla kwa nkewa na ịlụ ọgụ dị nꞌime ya, enweghị ike ịnọkọta. Ya mere, ọ bụrụ na ekwensu na-alụso onwe ya ọgụ site nꞌinye m ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ, alaeze ya ọ̀ ga-esi aṅaa guzosie ike? Ọ bụrụ na m sitere nꞌike ekwensu achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ site nꞌike onye ka ụmụ unu ji achụpụ ndị ha na-achụpụ? Ya mere, ọ bụ ndị na-eso ụzọ unu ga-ezi unu na okwu unu erijughị afọ. Ma ọ bụrụ na m na-esite nꞌike Chineke nyere m na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ nke a ga-egosi unu na alaeze Chineke abịarutela nꞌebe unu nọ. “Mgbe nwoke dị ike jiri egbe na mma chee ụlọ ya nche, mmadụ ọ bụla enweghị ike bata nꞌime ụlọ ahụ zuo ohi. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ ka nwoke ahụ ike alụso ya ọgụ merie ya, ọ pụrụ ịnapụ ya egbe na mma ahụ o ji, banyekwa nꞌụlọ ya, kwakọrọ ngwongwo ya. “Onye ọ bụla na-adịnyereghị m, na-emegide m. Onye ọ bụla kwa na-adịghị enyere m aka ikpokọta ekpokọta, na-achụsasị achụsasị. “Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ si nꞌime mmadụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-ejegharị nꞌala akọrọ na-achọgharị ebe ọ ga-ezu ike. Ọ bụrụ na mmụọ ọjọọ ahụ achọtaghị ebe izuike, ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alaghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’ Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala obi nwoke ahụ ma ọ tọgbọrọ nꞌefu. Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ na-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha nile ga-abata bịa biri nꞌime nwoke ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.” Mgbe Jisọs kpụ okwu a nꞌọnụ, otu nwanyị nọ nꞌime igwe mmadụ ahụ tiri mkpu sị, “Chineke gọzie nne gị, onye mụrụ gị na onye nyere gị ara!” Jisọs zara ya sị, “Ngọzi Chineke dịịrị ndị nụrụ okwu Chineke, jirikwa ihe ha nụrụ mee ihe.” Mgbe ọtụtụ mmadụ na-abịa, na-agba Jisọs gburugburu, Jisọs gwara ha sị, “Ndị ọgbọ a bụ nnọọ ndị ọjọọ. Ha nọgidesịrị ike na-arịọ m ka m meere ha ihe ịrịba ama nke ga-egosi ha na m bụ Onye nzọpụta. Ma ọ dịghị ihe ịrịba amua ọ bụla a ga-egosi ha karịa ihe ịrịba ama Jona. Nꞌihi na dị ka Jona siri bụrụ ihe ama nye ndị Ninive, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-esi bụrukwa ihe ama nye ndị ọgbọ a. “Nꞌụbọchị ikpe ahụ, eze nwanyị obodo Sheba ga-ebili gbaa ama megide ndị mmadụ bi nꞌọgbọ a, maakwa ha ikpe, nꞌihi na ọ gara ogologo ije nꞌime nsogbu, ịbịa ige ntị nꞌokwu amamihe Solomọn, ma onye dị ukwuu karịa Solomọn nọ nꞌebe a ugbu a, ma unu achọghị ige ya ntị. “Nꞌụbọchị ikpe ahụ kwa, ndị obodo Ninive ga-ebili gbaa ama megide unu nꞌihi na ha chegharịrị mgbe Jona gwara ha okwu Chineke, ma ugbu a onye ka Jona ukwuu nọ nꞌebe a, ma unu achọghị ige ya ntị. “Ọ dịghị onye na-amụnye iheọkụ dọnye ya nꞌebe zoro ezo ma ọ bụ nꞌokpuru nkata, kama ọ na-adọkwasị ya nꞌelu tebulu ka ndị na-abata nꞌụlọ ahụ hụ ìhè. Anya bụ iheọkụ nye ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị nile ga-ejupụta nꞌìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nꞌọchịchịrị. Kpachara anya ka ìhè dị nꞌime gị hapụ ịghọ ọchịchịrị. Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị nile ejupụta nꞌìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ahụ gị ọ bụla agbakwaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ ìhè dị nꞌahụ gị ga-apụta ìhè dị ka a ga-asị na ọ bụ iheọkụ na-enwuzi enwuzi na-enye gị ìhè.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa nꞌụlọ ya soro ya rie nri. Jisọs gakwara, soro ndị ọzọ a kpọrọ nọdụ iri nri. O juru onye Farisii ahụ anya na mgbe Jisọs bidoro iri nri ọ kwọghị aka ya tupuu ya ebido. Ma Jisọs gwara onye Farisii ahụ okwu sị, “Ihe na-eme unu ndị Farisii bụ na unu na-asacha azụ iko na efere unu, mee ka ha dị ọcha, ma ime unu jupụtara nꞌanya ukwu na nꞌịhe ọjọọ dị iche iche. Ndị nzuzu! Ọ̀ bụghị otu Chineke ahụ mere ka ihe ọ bụla nwee ihu na azụ? Ọ bụrụ na unu ga-enwe mkpebi nꞌobi unu inyere ndị ogbenye aka, unu ga-achọpụta na ihe nile dị ọcha. “Ahụhụ dịrị unu ndị Farisii, nꞌihi na unu na-enye Chineke otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke ego nile unu nwere, ya na otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke akwụkwọ nri ntakịrị dị nꞌubi unu, ma unu ekpọghị ikpe ziri ezi na ịhụ Chineke nꞌanya ihe dị mkpa. Unu kwesịrị inye onyinye unu, ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe unu kwesịrị ime. “Ahụhụ dịrị unu ndị Farisii! Nꞌihi na unu hụrụ ịnọdụ ala nꞌisi oche nꞌụlọ ekpere unu nꞌanya, hụkwa ekele pụrụ iche a na-ekele unu nꞌahia nꞌanya. Ahụhụ dịrị unu, nꞌihi na unu dị ka ili na-apụtaghị ìhè nye ndị mmadụ, nke ndị mmadụ na-azọnye ụkwụ nꞌihi na ha amaghị na ọ bụ ili.” Otu onye nꞌime ndị ozizi iwu so Jisọs na-eri nri ahụ gwara Jisọs okwu sị, “Onye ozizi, mgbe i si otu a na-akọcha ndị Farisii, ọ pụtara na ọ bụkwa anyị ka ị na-akọcha.” Jisọs zara ya sị, “Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu! Nꞌihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-enweghị ike ibuli site nꞌịtụpụta iwu dị iche iche ha kwesịrị idebe, ma unu onwe unu adịghị agbalị idebe iwu ndị a. Ahụhụ dịrị unu nꞌihi na unu na-ewuzi ili ndị amụma Chineke nna nna unu ha gburu na mgbe ochie. Site nꞌụzọ dị otu a, unu na-akwagide na ihe nna nna unu ha mere bụ ezi ihe. Ha gburu ndị amụma, unu bụkwa ndị na-ewu ili ha. “Ọ bụ nꞌihi nke a ka Chineke jiri kwuo okwu sị, ‘Aga m ezitere unu ndị amụma na ndị ozi, ụfọdụ nꞌime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgbu.’ “Ka ndị bi nꞌọgbọ a bụrụ ndị ga-aza ajụjụ banyere ọbara ndị amụma nile a wufuru, site nꞌoge a tọrọ ntọ ala ụwa. Ee, ọbara nile a wufuru site nꞌọbara Ebel, ruo nꞌọbara Zakaraya onye e gburu nꞌetiti ebe nchụaja na ebe nsọ. Ee, ana m agwa unu, ọ bụ ndị bi nꞌọgbọ a ga-anata ahụhụ nꞌihi ihe ndị a nile. “Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu nꞌihi na unu na-ezonarị ndị mmadụ eziokwu ka ha hapụ ịmata ya, ma unu onwe unu jụrụ ịnabata eziokwu ahụ. Unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ka ha nabata ya, kwerekwa ya.” Mgbe Jisọs si nꞌebe ahụ na-apụ, ndị ozizi iwu na ndị Farisii sitere nꞌoke iwe juru ha obi kwuo okwu megide ya. Ha jụkwara ya ajụjụ banyere ọtụtụ ihe, nꞌihi na ha chọrọ isite nꞌihe ọ ga-aza jide ya. Ọ dịghị anya ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Ha dị nnọọ ukwuu mee ka ọtụtụ na-azọ ibe ha ụkwụ. Mgbe ahụ, Jisọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya okwu. Ọ gwara ha sị, “Kpacharanụ anya unu nꞌebe ndị Farisii nọ. Nꞌihi na ha na-eme dị ka ha bụ ndị dị mma, ebe ọ bụ ezie na ha abụghị. Ụdị ihu abụọ ha nwere agaghị adịgide ruo mgbe dị anya. Nꞌihi na ọ dịghị ihe zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị emesịa kpughee. Ya mere, ihe ọ bụla unu kwuru nꞌọchịchịrị, a ga-emesịa nụ ya mgbe chi bọrọ, ihe ọ bụla kwa unu takịịrị na ntị mmadụ mgbe unu mechiri ụzọ, a ga-emesị site nꞌelu ụlọ tisasịa ya. “Ndị enyi m, unu atụla egwu ndị chọrọ igbu unu. Nꞌihi na ọ bụ nanị anụ ahụ ka ha nwere ike igbu. Ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka. Ma ka m gwa unu onye unu kwesịrị ịtụ egwu. Tụọnụ egwu Chineke, onye nwere ike igbu mmadụ tụnyekwa ya ala mmụọ. “Ego ole ka ndị mmadụ na-ere ụmụ nza ise? Ọ bụghị kobo abụọ? Ma o nweghị nke ọ bụla nꞌime ha Chineke chefuru. Chineke makwaara ọ bụladị ọnụ ọgụgụ agịrị isi dị nꞌisi unu. Unu atụla egwu. Unu dị mkpa karịa ọtụtụ ụmụ nza. “Ka m gwa unu eziokwu, onye ọ bụla kwuwapụtara nꞌihu ndị mmadụ na ya bụ onye na-eso m, ya ka m ga-ekwukwa okwu banyere nꞌihu ndị mmụọ ozi Chineke na ọ bụ onye dinyeere m. Ọ bụrụkwa na mmadụ ọ bụla agọnarị m nꞌihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nꞌihu ndị mmụọ ozi Chineke. Aga m asị, amaghị m onye ọ bụ. Onye ọ bụla kwujọrọ mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-enweta mgbaghara, ma onye ọ bụla kwujọrọ Mmụọ Nsọ Chineke agaghị anata mgbaghara. “Mgbe ha kpọtara unu nꞌụlọ ekpere ndị Juu, ma ọ bụ nꞌihu ndị na-achị achị, ikpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu. Nꞌihi na ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-etinye okwu unu ga-ekwu nꞌọnụ unu mgbe unu guzoro nꞌihu ha.” Mgbe Jisọs na-ekwu okwu a, otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ kpọrọ ya sị, “Onye ozizi, biko gwa nwanne m ka o kenye m ihe ruru m nꞌime akụ na ụba nke nna anyị hapụụrụ anyị mgbe ọ nwụrụ.” Jisọs zara ya sị, “Enyị, onye nyere m ike ikpebiri gị na nwanne gị ụdị okwu a?” Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị ha, “Kpachapụnụ anya, nꞌihi na ndụ mmadụ adabereghị nanị nꞌihe o nwere, ma ọ bụ otu onye ahụ siri baa ụba.” Mgbe ahụ Jisọs kọọrọ ha akụkọ a sị, “Otu onye ọgaranya nwere ala nke mịrị nnọọ ezi mkpụrụ. Nwoke a bidoro na-eche nꞌobi ya sị, ‘Ọ̀ba m nwere ebughị ibu. Ọ gaghị abachakwa mkpụrụ ubi a. Gịnị ka m ga-eme?’ O chere nnọọ echiche banyere ihe ọ ga-eme. Nꞌikpeazụ o tiri mkpu sị, ‘Ahaa! Amaara m ihe m ga-eme. Aga m akwatu ọba ahụ m nwere ugbu a, wuo ọba ọzọ buru ibu. Nꞌụzọ dị otu a aga m ewu ọba nke ga-abanyecha mkpụrụ ubi ndị a.’ Mgbe m mesịrị ihe ndị a, tinyechaa mkpụrụ ubi a nꞌọba ọhụrụ ahụ, aga m agwa onwe m okwu sị, ‘Enyi, i nwejuola nri ị ga-eri ọtụtụ afọ. Kwụsị ịdọgbu onwe gị nꞌọrụ. Zuru ike. Rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mee ka obi tọọ gị ụtọ. Nchegbu ọ bụla adịkwaghi nye gi.’ “Ma Chineke gwara nwoke ahụ sị, ‘Onye iberibe! Taa, nꞌabalị a, ka m ga-anarakwa gị ndụ ahụ m nyere gị. Mgbe ị nwụrụ onye ga-eketa ihe ndị a nile ị kpakọtara?’ ” Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị mmadụ ahụ sị, “Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọ bụla na-akpadoro nanị onwe ya akụ, nke na-abaghị ụba nꞌihu Chineke.” Ọzọ kwa, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụ nke a mere m ji gwa unu okwu sị, unu echegbula onwe unu banyere nri unu ga-eri. Unu echegbukwala onwe unu banyere uwe unu ga-eyi. Ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ unu dịkwa mkpa karịa uwe unu ga-eyi. Leenụ ụmụ nnụnụ anya. Ha adịghị akụ mkpụrụ nꞌubi, ha adịkwaghị aghọ mkpụrụ site nꞌubi. Ha enweghị ọba ebe ha na-ekpokọta nri. Ma Chineke bụ onye na-azụ ha. Unu dịkwanu mkpa karịa ọtụtụ ụmụ nnụnụ. “Ònye nꞌime unu pụrụ isite nꞌoke echiche ya mee ka ọ nọrọ ndụ karịa ka Chineke si chọọ? Ọ bụrụ na oke echiche unu apụghị iwetara unu ogologo ndụ, gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ? “Leenụ okoko ọhia, ha adịghị arụ ọrụ ọ bụla. Ha adịkwaghị akpara onwe ha akwa ha na-eyi. Ma ka m gwa unu, ọ bụladị eze Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya, eyighị uwe ọma ọ bụla mara mma dị ka okoko ọhia. Ọ bụ Chineke na-eme ka ahịhịa maa mma ile anya, ee, ahịhịa nke na-eto taa, nke e nwekwara ike igbutu echi, nke a na-akpọkwa ọkụ ma ọ kpọnwụọ. Ọ bụrụ na Chineke na-eme ka ahịhịa efu maa mma, unu na-eche na ọ gaghị egboro unu mkpa uwe, unu ndị obi abụọ? Ya mere, unu anọgidela nꞌoke echiche na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Nꞌihi na ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-echegbu onwe ha banyere ihe ndị a. Nna unu bi nꞌeluigwe maara na ihe ndị a dị unu mkpa. Ọ ga-enyekwa unu ihe nile na-akpa unu mkpa ụbọchị nile ma ọ bụrụ na unu ga-atụkwasị obi unu nꞌihe gbasara alaeze ya. “Ya mere, unu atụla egwu ụmụ m, nꞌihi na Nna unu ahọpụtala unu inye unu alaeze ya. Reenụ ihe nile unu nwere nye ndị ogbenye. Nke a ga-eme ka akpa unu, nke dị nꞌelu, ju eju. Akpa ahụ dị nꞌelu epughị epu. Akụ unu dị nꞌeluigwe enwekwaghị ike ifu efu. Onye ohi ọ bụla enwekwaghị ike ịga nꞌebe ahụ zuo ha, nla apụkwaghị iricha ha nꞌihi na ọ bụ ebe ọ bụla ego unu dị ka obi unu ga-adịkwa. “Jikerenụ, yirinụ uwe ọgụ unu, buliekwanụ iheọkụ unu. Nọọnụ na nche dị ka ụmụ odibo na-eche nlọghachi nna ha ukwu, onye gara ebe a kpọrọ ya oriri ọlụlụ nwụnye. Mgbe ọ bụla ọ ga-alọbatakwa ka unu megheere ya ụzọ ka ọ bata. Ọṅụ dị ukwuu dị na-eche ụmụ odibo ahụ nna ha ukwu ga-ahụ ka ha mụ anya nọrọkwa na njikere mgbe ọ lọtara. Nꞌezie, nna ha ukwu ga-eso ha nọdụ ala, jikerekwa idoziri ha ihe oriri. Ọṅụ dịrị ụmụ odibo ahụ ndị ga-anọ na njikere mgbe nna ha ukwu ga-alọghachi, ọ bụladị ma nlọghachi ya bụ nꞌetiti abalị ma ọ bụ nꞌoke isi ụtụtụ. “Chetanụ nke a! Ọ bụrụ na onyenwe ụlọ maara oge onye ohi ji abịa nꞌụlọ ya izu ohi, ọ gaghị ekwe ka onye ohi ahụ gbukaa ụlọ ya. Unu kwesịrị ịnọ na njikere mgbe nile nꞌihi na Nwa nke mmedụ ga-abịa nꞌoge unu na-adịghị ele anya ya.” Pita zara ya sị, “Ị̀ tụrụ ilu a nꞌihi anyị, ka ọ bụ ndị mmadụ ndị a ka i bu nꞌobi tụọ ya?” Jisọs zara ya sị, “Ị bụrụ odibo ahụ maara ihe, nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye nna ya ukwu kpọrọ mee onye na-elekọta ihe nile o nwere mgbe ọ na-apụ ịga njem, ka ị na-enye onye ọ bụla nọ nꞌụlọ ya nri nꞌoge ya, ị ga-abụ odibo a gọziri agọzi ma ọ bụrụ na nna gị ukwu alọta hụ gị ka ị na-eme ihe ahụ ọ chọrọ. Nꞌezie, o doro m anya na mgbe ọ lọtara, ọ ga-etinye gị nꞌọnọdụ ị ga-anọ na-elekọta ihe nile o nwere. “Kama, ị bụrụ odibo ahụ nke na-asị nꞌime onwe ya, nna m ukwu ga-anọ ọdụ tupuu ọ lọta, ị malite iti odibo ndị nwoke na ndị nwanyị ọzọ i kwesịrị ilekọta anya ihe, i bidokwa na-eso ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-aṅụ mmanya, bụrụ onye mmanya na-egbu, nna gị ukwu ga-alọta nꞌụbọchị ahụ, na oge ahụ ị na-atụghị anya ya, ọ ga-atakwa gị ahụhụ, tinye gị nꞌebe a na-edebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Ya mere, odibo ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma jụ ijikere chere nna ya ukwu, ma ọ bụ kpebie ịhapụ ime ihe nna ya ukwu chọrọ, a ga-eti ya ezigbo ihe otiti. “Ma odibo ahụ na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma mee ihe ahụ na-ewetara ndị mere ya ihe otiti, a ga-eti ya ihe ntakịrị. Nꞌihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nꞌaka ya. Nwoke ahụ ndị mmadụ nyere ihe hiri nne nꞌaka, ka ha ga-ele anya ịnata ya ihe hiri nne ha tinyere ya nꞌaka. “Ihe m bịara ime nꞌụwa bụ iwebata ọkụ, ma leekwanụ ka o si na-agụsị m agụụ ike ịhụ na ọkụ a ebidola inwu ugbu a. Ọ dị nnọọ ọrụ dị ukwuu dị nꞌihu m nke m na-aghaghị ịrụ, leekwa ka o si na-anụ m ọkụ nꞌobi imecha ya. “Ùnu chere na m bịara iweta udo nꞌụwa? Baaa! Nꞌezie, ihe m bịara iweta nꞌụwa bụ nkewa. Nꞌihi na site ugbu a gaa nꞌihu, ebe ọ bụla e nwere mmadụ ise nꞌezinụlọ, mmadụ atọ ga-ebili megide mmadụ abụọ ndị ọzọ. Nna ga-ekpebiri onwe ya ihe ọ na-eche banyere m, nwa ya nwoke ga-enwekwa mkpebi nke ya. Nne na ada ya nwanyị agaghị enwe nkwekọta ọ bụla, otu a kwa nwụnye nwa agaghị anabatakwa ihe ọ bụla nne di ya kwuru dị ka eziokwu.” Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị lee igwe mmadụ ahụ anya sị, “Mgbe ọ bụla unu lere anya hụ igwe ojii nꞌọdịda anyanwụ, unu na-asị ‘Mmiri ga-ezo taa.’ Mmiri na-ezokwa. “Otu a kwa, mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, ‘Ọ̀kọchị ga-akọ nnọọ taa.’ Ọkọchị na-akọkwa. Ndị ihu abụọ! Unu nwere ike isite nanị nꞌile anya na mbara eluigwe mata ma mmiri ọ ga-ezo, ma ọ bụ na ọkọchị ga-akọ. Ma unu enweghị ike isite nꞌihe ndị a nile na-eme nꞌanya unu ugbu a mata ihe oge a anyị nọ nꞌime ya bụ. Gịnị mere unu ji jụ ịnabatara onwe unu ihe ziri ezi? “Ka m dọọ unu aka na ntị, ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nꞌihu onye ikpe, gbalịsie ike hụ na gị na ya kpere udo tupuu ikpe gị na ya eruo ụlọ ikpe. Ma i meghị otu a, ọkaikpe ga-ama gị ikpe, tinye gị nꞌụlọ mkpọrọ. Ọ bụrụkwa na o si otu a mee, ị gaghị esite nꞌụlọ mkpọrọ ahụ pụtakwa ọzọ tutuu ruo mgbe ị kwụsịrị ego nile i nwere, na-afọdụghị otu kobo.” Nꞌoge a ụfọdụ mmadụ nꞌime ndị nọ nꞌebe ahụ gwara Jisọs okwu sị, “Ọ dị ụfọdụ ndị Juu si akụkụ Galilị ndị Pailet gburu mgbe ha na-enye onyinye ịchụ aja nꞌụlọ nsọ ukwu dị na Jerusalem.” Jisọs jụrụ ha sị, “Unu chere na ndị ahụ Pailet gburu bụ ndị mmehie karịa ndị Juu ọzọ bi na Galili! Ọ̀ bụ ya mere ha ji hụọ ahụhụ dị otu a? Mbaa! Ka m gwa unu eziokwu, ọ bụrụ na unu onwe unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke, unu ga-esikwa otu a laa nꞌiyi. “Ka m jụọkwka unu ọzọ, gịnị ka unu na-eche banyere mmadụ iri na asatọ ahụ mgbidi Silom dagburu? Unu na-eche na ndị ahụ bụ ndị mmehie karịa ndị nile bi na Jerusalem? Baa! Otu a ka unu onwe unu ga-esikwa laa nꞌiyi ma ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke.” Mgbe ahụ Jisọs kọọrọ ha akụkọ a, “Otu nwoke kụrụ osisi fiigi nꞌubi ya. Mgbe oge ruru ka osisi ahụ mịa mkpụrụ, nwoke a bịara lee ma ọ ga-enweta mkpụrụ ọ bụla, ma ọ dịghị nke ọ chọtara. Ọ bịakwara ọzọ, bịakwa ọzọ, ma o nweghị mkpụrụ ọ bụla ọ chọtara. Nꞌikpeazụ, nwoke ahụ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Gbutuo osisi fiigi a nꞌihi na ọ bakwaghị uru. Nke a emeela afọ atọ m bịara ịghọ mkpụrụ nꞌelu ya, ma o nweghị mkpụrụ ọ bụla m hụrụ. Gịnị bụ uru ọ bara ịhapụ ya, mgbe anyị nwere ike iji ala a mee ihe ọzọ dị mkpa?’ “Ma onye ọrụ ubi ahụ zara sị, ‘Nna m ukwu, ka anyị nye ya ohere otu afọ ọzọ. Aga m elezi ya anya, hinye ya aja nꞌukwu. Ka anyị lee anya nꞌafọ ọzọ ma ọ ga-amị mkpụrụ. Ọ mịa mkpụrụ mgbe ahụ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị mkpụrụ, aga m egbutu ya.’ ” Nꞌotu ụbọchị izuike ndị Juu, Jisọs banyere nꞌime otu ụlọ ekpere ndị Juu bido izi ihe. Nꞌime ụlọ ahụ, o nwere otu nwanyị bịara, nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Mmụọ ọjọọ a emeela ka nwanyị a nọọ nꞌọrịa afọ iri na asatọ. Kemgbe oge ahụ, nwanyị a na-ehu ehu mgbe ọ bụla ọ na-aga ije, o nweghị ike iguzo kwem. Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya, metụ ya aka, sị “Nwanyị, site taa gaa nꞌihu, ị bụrụla onye a gwọrọ site nꞌọrịa nke a.” Otu mgbe ahụ nwanyị a guzoziri ọtọ nke ọma, bido ikele na ito Chineke. *** Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nꞌihi na Jisọs gwọrọ nwanyị a nꞌụbọchị izuike. O biliri gwa ndị mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nꞌime izu ụka mgbe mmadụ kwesịrị ịrụ ọrụ. Ọ bụrụ na ahụ esighị gị ike, ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka a gwọọ gị, bịa nꞌime ụbọchị isii ndị a. Abịakwala nꞌụbọchị izuike ka a gwọọ gị!” Ma Jisọs zara nwoke ahụ sị, “Ị bụ nnọọ onye ihu abụọ! Ị na-achọ ịkọwa na gị onwe gị adịghị arụ ọrụ ọ bụla nꞌụbọchị izuike? Ị̀ naghị atọpụ ehi gị ma ọ bụ inyinya ibu gị ebe i kenyere ha, duru ha gaa nꞌebe ha ga-enweta mmiri ha na-aṅụ nꞌụbọchị izuike? Ugbu a ị̀ na-ekwu na m mere ihe ọjọọ nꞌihi na m mere ka ahụ dị nwanyị a bụ onye Juu mma? Èmere m ihe ọjọọ nꞌihi na m tọpụrụ nwanyị a site nꞌagbụ ekwensu kere ya kemgbe afọ iri na asatọ nꞌụbọchị izuike?” Okwu a Jisọs kwuru mere ka ihere mee ndị iro ya. Ma ndị nile nọ nꞌụlọ ekpere ahụ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ọrụ ebube nile ọ rụrụ. Mgbe ahụ Jisọs bidoro izi ha ihe banyere alaeze Chineke. Ọ gwara ha okwu sị, “Gịnị bụ ihe o yiri? Alaeze Chineke dị ka mkpụrụ mọsụtadị nke onye ọrụ ubi na-ewere kụọ nꞌubi ya. Mkpụrụ a na-eto bụrụ osisi, ebe ụmụ nnụnụ na-abịa wuo akwụ ha nꞌalaka ya.” Ọzọ Jisọs gwakwara ha sị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyekwara alaeze Chineke? Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere tinye nꞌụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ụtụ ọka ahụ koro.” Jisọs jegharịrị nꞌobodo ukwu nile na nꞌobodo nta nile na-ezi ihe, tutuu ọ bịaruo Jerusalem. Nꞌoge a otu onye jụrụ ya ajụjụ sị, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị nta?” Jisọs zara ya sị, “Ọnụ ụzọ e si abanye nꞌeluigwe dị warara. Ya mere, gbalịsie ike ịbanye. Nꞌihi na ọtụtụ ga-achọ ịbata ma ha agaghị enwe ike ịbanye. Nꞌihi na mgbe onye nwe ụlọ ahụ biliri mechie ọnụ ụzọ ya, ọ dịkwaghị onye ọ bụla nwere ike ịbanyekwa. Mgbe ahụ ọ bụrụ unu anọdụ nꞌezi kụọ aka nꞌọnụ ụzọ na-arịọ arịrịọ sị, ‘Onyenwe anyị biko megheere anyị ụzọ,’ ọ ga-aza sị, ‘Amaghị m ndị unu bụ. Amakwaghị ebe unu si bịa.’ “Nꞌoge ahụ unu ga-azaghachi sị, ‘Onyenwe anyị, ọ bụ anyị na gị soro rikọọ nri. Ọ bụkwa nꞌokporo ụzọ dị nꞌakụkụ ụlọ anyị ka ị nọ zie ndị mmadụ ihe.’ “Ma aga m aza unu sị, ‘Nꞌezie, amaghị m unu, amaghị m ebe unu si bịa. Nyenụ m ohere, unu ndị ajọ omume!’ “Nꞌoge ahụ ọtụtụ mmadụ ga-akwa akwa, taakwa ikikere eze na mwute, mgbe ha ga-eguzo nꞌezi hụ Eberaham, na Aizik na Jekọb na ndị amụma nile ka ha nọ nꞌalaeze Chineke. Ọtụtụ mmdụ ga-esitekwa nꞌakụkụ nile nke ụwa bịa soro nọdụ ala iri nri nꞌalaeze Chineke. Hụbakwanụ okwu m a ama, nꞌụbọchị ahụ, ndị ahụ a na-eleda anya ugbu a ga-abụ ndị a ga-enye nsọpụrụ dị ukwuu. Ma ndị ahụ a na-asọpụrụ nke ukwuu ugbu a, ga-abụ ndị na-adịghị oke mkpa.” Mgbe oge nta gasịrị ụfọdụ ndị si nꞌotu ndị Farisii bịara nꞌebe Jisọs nọ gwa ya okwu sị, “Ọ bụrụ na ị hụrụ ndụ gị nꞌanya, sitekwa nꞌebe a pụọ ngwangwa, nꞌihi na Herọd na-achọsi ike igbu gị.” Ma Jisọs zara ha sị, “Gaanụ gwa anụ ụrụ ahụ na m kwuru sị, na taa na echi, aga m anọgide na-arụ ọrụ m na-arụ ịchụpụ mmụọ ọjọọ na ịgwọ ndị ọrịa. Gwakwanụ ya na nwanne echi aga m arụcha ọrụ m. Ee, aga m arụ ọrụ m taa na echi na nwanne echi tutuu ruo mgbe m ga-eru ebe m na-aga. Nꞌihi na ọ bụ nnọọ ihe were mmadụ nile anya na onye amụma Chineke ọ bụla enweghị ike ịnwụ nꞌebe ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị nanị na Jerusalem. “Ị dị nnọọ egwu gị obodo Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma na nke na-eji nkume atụgbu ndị nile Chineke zitere inyere gị aka. Lee ka m si gbalịa ịchịkọta ụmụ gị ọnụ, dị ka nne ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya nꞌokpuru nku ya, ichebe ha, ma ị chọghị. Ugbu a ahapụrụla m gị ụlọ gị ka ọ bụrụ ihe tọgbọrọ nꞌefu. Ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ tutuu ruo mgbe i jikeere ịnabata m na ịsịkwa, ‘Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị.’ ” Otu ụbọchị izuike Jisọs gara iri ihe nꞌụlọ otu nwoke bụ onye dị mkpa nꞌetiti ndị Farisii. Mgbe Jisọs nọ nꞌụlọ ahụ, ọtụtụ ndị nọ nꞌụlọ ahụ nọ na-ele ya anya. Nꞌụlọ ahụ otu nwoke ụkwụ ya zara aza bịakwutere Jisọs. Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị na-ezi ihe ajụjụ sị, “O ziri ezi ịgwọ mmadụ nꞌụbọchị izuike, ka unu sị na ọ bụ ihe ọjọọ ime ihe dị otu a?” Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu ahụ ekwughị okwu ọ bụla. Mgbe ahụ Jisọs gwọrọ nwoke ahụ sị ya laa. Emesịa, Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “A sị na onye ọ bụla nꞌetiti unu nwere nwa ma ọ bụ ehi nke danyere nꞌime olulu mmiri nꞌụbọchị izuike ọ gaghị aga dọpụta ya?” Ma o nweghị ihe ha nwere ikwu banyere ihe Jisọs kwuru. Mgbe Jisọs hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri ahụ si họrọ nanị oche dị mkpa, oche dị mkpa, ọ gwara ha okwu a nꞌilu sị. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla akpọọ gị oriri ọlụlụ nwụnye, abatala nọdụ nꞌoche dị mkpa, nꞌihi na ma eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara ndị ọzọ dị mkpa karịa gị. Nꞌihi na mgbe ndị e debeere oche ahụ dị mkpa bịara, onye kpọrọ gị oriri ga-abịakwute gị sị gị nye onyenwe oche ohere. Mgbe ahụ ị ga-ebili nꞌanya ihere gaa nọdụ nꞌoche dị ala. “Kama mgbe ị batara, legharịa anya, nọdụ nꞌoche dị ala. Mgbe onye kpọrọ gị oriri bịara hụ gị, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, bịa nọdụ nꞌoche a dị mkpa e debeere gị.’ Nꞌoge ahụ ị ga-enwe ugwu nꞌanya ndị ọzọ a kpọrọ oriri ahụ. Onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda ala, ma onye ọ bụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.” Jisọs gwakwara onye ahụ kpọrọ ya oriri ahụ sị, “Mgbe ọ bụla ị chọrọ ịkpọ oriri, akpọla nanị ndị enyi gị na ụmụnne gị na ndị ikwu gị na ndị ọgaranya, nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ndị a nanị ka ị kpọrọ, ha ga-akpọkwa gị nꞌoge nke ha. Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ụkwụ rụrụ na ndị ngwụrọ na ndị ìsì. Ebe ọ bụ na ndị a enweghị ike ịkwụghachi gị, Chineke ga-agọzi gị, kwụghachikwa gị, dị ka ọ ga-esi kwụghachi gị mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie.” Mgbe otu nꞌime ndị a kpọrọ oriri ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru o kwuru okwu nꞌoke olu sị, “Ọṅụ dịrị nwoke ahụ ga-eso rie nri nꞌalaeze Chineke!” Ma Jisọs zara ya sị, “O nwere otu nwoke kpọrọ ọtụtụ mmadụ ka ha bịa oriri. Mgbe oge oriri ahụ ruru, o zipụrụ ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa nꞌihi na e dozichaala ihe nile. Ma ndị nile a kpọrọ oriri ahụ bidoro ịsị na ha agaghị abịa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Ọ dịbeghị anya m kwụrụ ụgwọ ala m zụrụ. Ala m aga ile ya. Biko gwara m nna gị ukwu na agaghị m abịa.’ Onye ọzọ a kpọkwara sịrị, ‘Ọ dịbeghị anya kemgbe m zụrụ ehi iri. Ana m aga ka m ga hụ ha. Gwa nna gị ukwu na agaghị m abịa.’ Onye ọzọ sịkwara, ‘Alụrụ m nwanyị ọhụrụ, nꞌihi nke a biko gwa nna gị ukwu na agaghị m abịa.’ Onye e ziri ozi lọtara kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ kwuru. Iwe dị ukwuu were nwoke ahụ kpọrọ oriri ahụ. Ọ gwara onye na-ejere ya ozi sị, ‘Gaa ngwangwa nꞌokporo ụzọ ukwu na okporo ụzọ nta kpọbata ndị ogbenye nile na ndị ngwụrọ nile na ndị ụkwụ rụrụ arụ nile ị hụrụ.’ Onye ozi ahụ pụrụ kpọbatachaa ndị nile ọ hụrụ. Emesịa, ọ bịara gwa nna ha ukwu sị, ‘Nna anyị ukwu, akpọbatala m ndị nile ị sị m kpọbata, ndị ogbenye na ndị ngwụrọ na ndị ụkwụ rụrụ arụ. Ma ohere ka fọdụkwara nꞌụlọ.’ *** “Nwoke ahụ sịrị odibo ya, ‘Gaakwa nꞌokporo ụzọ ukwu na okporo ụzọ nta dị nꞌobodo nta nile dị gburugburu obodo ukwu a, kpọọ onye ọ bụla ị hụrụ, nꞌihi na achọrọ m ka ụlọ m ju eju. Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m sịrị na o nweghị onye ọ bụla nꞌime ndị ahụ m buru ụzọ kpọọ ka ha bịa nꞌoriri a ga-abata nꞌụlọ m.’ ” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, o sitere nꞌụlọ ahụ pụọ. Oke igwe mmadụ sokwaara ya, nꞌoge a. Jisọs tụgharịrị lee ha anya sị ha, Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ibu onye na-eso ụzọ m, onye ahụ ga-ahụ m nꞌanya karịa nna ya na nne ya na nwụnye ya na ụmụ ya, na ụmụnne ya nwanyị. Ọ ga-ahụkwa m nꞌanya karịa ndụ nke aka ya. Onye ọ bụla kwa nke na-eburughị obe ya soro m enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu achọọ iwu ụlọ, ọ̀ gaghị eburu ụzọ nọdụ ala gukọọ ihe ọ ga-efu ya iwu ụlọ ahụ? Ọ̀ gaghị agụkọkwa ego o nwere nꞌaka ya mata ma ọ ga-ezuru ya iwu ụlọ ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị ezuru ya? Nꞌihi na ọ bụrụ na o cheghị echiche banyere nke a, o nwere ike wuruo nanị na ntọ ala ụlọ ahụ kwụsị, chọpụta na o jizughị ego ga-ezuru ya. Mgbe ahụ ọ bụrụ na ndị mmadụ esi ebe ahụ gafee hụ na o nweghị ike iwucha ụlọ ya, ha ga-ebido ịchị ya ọchị, na-asị, “ ‘Leenụ kemgbe nwoke a bidoro iwu ụlọ a, ma o nwebeghị ime wuchaa ya.’ “Ọ bụrụ na otu eze achọọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị eburu ụzọ chọpụta ma o nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye eze nke ọzọ ji iri puku ndị agha abụọ abịa ọgụ? Ọ bụrụ na eze ahụ achọpụta na o nweghị ike iji puku ndị agha iri merie onye ji iri puku ndị agha abụọ, ọ̀ bụ na ọ gaghị eziga ozi nye eze ahụ rịọ ka e kpee udo mgbe eze ahụ ka nọ ebe dị anya? “Nꞌụzọ dị otu a, onye ọ bụla na-ewezugaghị ihe nile ọ na-eme, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. “Nnu bụ ihe dị mma. Ma ọ bụrụ na nnu etufuo ụtọ ya, ọ̀ dịkwa ụzọ ọzọ e si eme ya ka ọ tọọkwa ụtọ dị ka nnu ọzọ? Ọ dịkwaghị uru ọzọ ọ bara. Ihe a ga-eme bụ itufu ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka okwu m kwuru baara gị uru, jiri ya mee ihe ga-abara gị uru.” Otu ụbọchị ndị ọnaụtụ na ndị mmehie bịakwutere Jisọs ịnụrụ ihe ọ na-ekwu. Mgbe ndị Farisii na ndị na-ezi iwu hụrụ ha, ha tamụrụ ntamụ megide Jisọs sị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie. Ọ na-esokwa ha eri nri.” Jisọs gwara ndị Farisii na ndị ozizi iwu okwu sị, “Ọ bụrụ na otu onye nꞌime unu enwee narị atụrụ ma otu nꞌime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị ahapụ iri atụrụ toolu na toolu ahụ fọdụrụ afọdụ pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru akpafu nꞌọzara nile tutuu ọ chọta ya? *** Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị eburu ya tụkwasị ya nꞌolu ya bulata nꞌụlọ ya ebe atụrụ ndị ọzọ nọ? Mgbe ọ lọtara ụlọ, gịnị ka ọ ga-eme? Nꞌezie, asị m unu, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha, ‘Bịanụ soro m ṅụrịa ọṅụ nꞌihi na achọtala m atụrụ m kpafuru akpafu.’ “Nꞌụzọ dị otu a, ọṅụ na-adị nꞌeluigwe nꞌihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa ndị ezi omume iri toolu na toolu ndị mkpa nzọpụta na-adịghị akpa. “Ọ bụrụ na otu nwanyị nwere mkpụrụ ọlaọcha iri ma otu nꞌime ha adafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị amụnye ọkụ were azịza zaa ụlọ ya ịchọ otu mkpụrụ ego ahụ tutuu ọ chọta ya. Mgbe nwanyị ahụ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme? Ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha bịa soro ya ṅụrịa ọṅụ nꞌihi na ya achọtala otu mkpụrụ ego furu efu. Nꞌụzọ dị otu a kwa, ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi nꞌeluigwe na-aṅụrị ọṅụ mgbe otu onye mmehie chegharịrị.” Mgbe ahụ Jisọs kọkwaara ha akụkọ ọzọ sị ha, “E nwere otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ. Nwa ya nwoke nke nta bịakwutere nna ya otu ụbọchị sị ya, ‘Nna m, kenye m ugbu a, site nꞌakụ na ụba i nwere, ihe m kwesịrị iketa mgbe i nwụrụ.’ Nna ya kenyere nwa ya ahụ ihe o kwesịrị iketa. “Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorọbịa ahụ kwakọtara ihe nile o nwere hapụ ezi nna ya gaa biri nꞌotu obodo dị nnọọ anya. Nꞌebe ahụ, o mefuchara ego nile o nwere na ndụ ọjọọ. Mgbe ọ zụfuchara ego nile o nwere, ụnwụ bidoro nꞌobodo ahụ, nke mere ka nwokorọbịa ahụ bido ịnọ agụụ. Nꞌihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ, onye nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri. Ma agụụ gụrụ nwokorọbịa a nke ukwuu, mee ya ka ọ chọọ iri site na nri ọ na-enye ezi, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ ka o rie. “Otu ụbọchị, mgbe ọ nọdụrụ chee echiche banyere ọnọdụ ya, ọ jụrụ onwe ya ajụjụ sị, ‘Nꞌihi gịnị ka m ga-eji nwụọ nꞌagụụ nꞌebe a mgbe nna m nwere ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi, ndị nwere nri na-ezuru ha mapụtakwa?’ O kpebiri nꞌobi ya sị, ‘Aga m alaghachikwuru nna m. M ruo ebe ahụ, aga m agwa ya sị, Nna m, emehiela m megide Chineke. Emehiekwala m megide gị. Ekwesikwaghị ka a kpọọ nwa gị ọzọ. Biko were m ka m bụrụ otu nꞌime ndị na-ejere gị ozi.’ *** “Mgbe nwokorọbịa a nwere mkpebi a nꞌime onwe ya, ọ hapụrụ obodo ahụ ịlaghachikwuru nna ya. Ma mgbe ọ nọrịị ebe dị anya na-alọta, nna ya lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, nwee ọmiko nꞌahụ ya. O si nꞌụlọ ya gbapụta, gaa zute ya, bakụọ ya, kelee ya. “Mgbe ahụ nwokorọbịa ahụ gwara nna ya sị, ‘Nna m, emehiela m megide gị. Emehiekwala m megide Chineke. Ekwesịghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’ “Ma nna ya gwara otu onye na-ejere ya ozi sị, ‘Mee ngwangwa weta uwe kachasị mma dị nꞌụlọ bịa yikwasị nwa m uwe ahụ. Gbanyekwa ya ọla nꞌaka, nyekwa ya akpụkpọ ụkwụ ka o yiri, gaakwa kpụpụta otu ehi gbara abụba gbuo ya ka anyị na ndị enyị anyị soro rie. Nꞌihi na nwa m a, ka m gụrụ dị ka onye furu efu. Ma ugbu a a chọtala ya.’ Emesịa, ha bidoro iri na ịṅụ na ịṅụrị ọṅụ. “Ọ dịghị anya ọkpara nwoke a, onye jere ịrụ ọrụ nꞌubi bidoro ịlọta nꞌụlọ. Mgbe ọ na-abịa nso ọ nụrụ ụda egwu, nụkwa ụda aṅụrị na ite egwu. Ọ kpọrọ otu nꞌime ndị na-eje ozi jụọ ya sị, ‘Gịnị mere egwu ji na-ada, ndị mmadụ na-etekwa egwu?’ “Odibo ahụ zara ya sị, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna unu gburu ehi gbara abụba nꞌihi na ọ lọtara nꞌudo.’ “Mgbe ọkpara nwoke ahụ nụrụ okwu a, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ịbata nꞌụlọ ahụ. Mgbe nna ya matara ihe mere, ọ pụtara nꞌezi rịọ ya ka ọ bata. Ma ọ gwara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ nile ndị a m nọrọ na-ejere gị ozi, enupụghị m isi nꞌụzọ ọ bụla. Ma o nweghị oge i ji nye m ọ bụladị ewu ntakịrị sị mụ na ndị enyị m jiri ya mere oriri. Ma ugbu a, nwa gị a alọtala. Onye mefusiri ego nile i nwere nꞌebe ụmụ akwụla nọ. Ọ bụ ya ka i gbuuru ehi gbara abụba!’ “Mgbe ahụ nna ya zara ọkpara ya sị, ‘Nwa m, ọ bụ mụ na gị nọ kemgbe, ị makwaara na ihe nile m nwere bụ nke gị. Anyị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ, kpọọ oriri, nꞌihi na onye a bụ nwanne afọ gị, onye anyị gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ, ma ugbu a ọ dịkwala ndụ. Ọ bụkwa onye furu efu a chọtara.’ ” Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọgaranya nwere otu odibo na-ejere ya ozi. Emesịa, ndị mmadụ bidoro ịkọsara ọgaranya ahụ na nwa odibo ya na-emebisi ego ya. “Otu ụbọchị, nwoke a kpọrọ odibo ya sị, ‘Gịnị bụ akụkọ ndị a m na-anụ banyere gị? Achọrọ m ka ị bịa guziere m otu i si na-elekọta ego m nꞌihi na achọkwaghị m ka ị bụrụ odibo m ọzọ.’ “Mgbe odibo a nụrụ ihe nna ya ukwu kwuru, o chere nꞌobi ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m nꞌọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m jegharịa ịrịọ arịrịọ. Ahaaa! Amatala m ihe m ga-eme, nke ga-enyere m aka mgbe nna m ukwu chụpụrụ m. Mgbe ahụ aga m enweta ndị ga-anabata m nꞌụlọ ha.’ “Odibo ahụ ziri ozi kpọọ ndị nile ji nna ya ukwu ụgwọ ka ha bịakwute ya. Mgbe onye nke mbụ bịara, ọ jụrụ ya sị, ‘Gịnị bụ ụgwọ i ji nna m ukwu?’ Nwoke ahụ zara ya sị, ‘Ọ bụ puku karama mmanụ ka m ji ụgwọ ya.’ Odibo ahụ gwara ya sị, ‘Ngwa, were akwụkwọ ebe i dere na ọ bụ puku karama mmanụ ka i ji ụgwọ ya. Nọdụ ala degharịa ya, dee na ọ bụ narị karama ise.’ Mgbe nwoke ahụ desịrị pụọ, “Odibo ahụ kpọrọ onye nke abụọ jụọ ya sị, ‘Gịnị bụ ụgwọ i ji?’ Nwoke ahụ zara ya sị, ‘Ọ bụ narị akpa ọka.’ Odibo ahụ zara sị ya, ‘Ngwa, lee akwụkwọ ebe i dere na ọ bụ narị akpa ọka ka i ji ụgwọ ya, degharịa ya, dee na ihe i ji ụgwọ ya bụ iri akpa ọka asatọ.’ “Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe odibo ya mere, o toro ya nꞌihi na ihe o mere jupụtara nꞌamamihe. Ọ bụkwa eziokwu na ndị ụwa nwere amamihe idozi ihe ọ bụla nꞌụzọ o ga-esi baara ha uru, karịa ndị ahụ bụ ụmụ nke ìhè. Ya mere ka m gwa unu, jirinụ akụ na ụba unu mepụtara onwe unu enyi, nke ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịkwaghị akụ unu nwere, a ga-anabata unu nꞌụlọ ebighị ebi ahụ. Onye ọ bụla jiziri ihe dị ntakịrị e nyere ya ga-enwe ike jizie ihe ukwu ọ bụla a ga-etinye ya nꞌaka. Ma onye ahụ a na-enweghị ike ịtụkwasị obi nꞌihe dịkarịsịrị nta ga-abụkwa onye a na-enweghị ike ịtụkwasị obi ijizi ihe buru ibu. Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike tụkwasị gị obi ilekọtazi akụ na ụba nke ụwa a, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi nye gị ezi akụ nke eluigwe? Ọ bụrụkwa na o nweghị onye na-atụkwasị gị obi ijizi akụ onye ọzọ, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi ijizi ihe nke bụ nke gị? “Otu onye apụghị ịbụ odibo mmadụ abụọ. Ọ ghaghị ịkpọ otu asị hụ nke ọzọ nꞌanya, ma ọ bụkwanụ ọ ga-eme nanị ihe otu nꞌime ha chọrọ leda onye nke ọzọ anya. Nꞌụzọ dị otu a kwa mmadụ enweghị ike ịhụ Chineke na ego nꞌanya otu mgbe ahụ.” Ndị Farisii hụrụ ego nꞌanya, ndị nụrụ ihe ndị a Jisọs kwuru, weere Jisọs mee ihe ọchị. Ma Jisọs gwara ha sị, “Nꞌihu ndị mmadụ, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị dị nsọ na ndị bụ ndị ezi omume. Ma Chineke maara obi unu. Nꞌihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị mkpa abaghị uru nꞌihu Chineke. Tupuu Jọn abịa, ndị mmadụ na-agụ ihe Mosisi na ndị amụma dere. Ma kemgbe Jọn bịasịrị, a na-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke, mmadụ nile na-ejikwa ike na-abanye nꞌime alaeze a. Ma nke a egosighị na ihe Mosisi dere abakwaghị uru. Nꞌezie, ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịhapụ ịdịkwa karịa na akwụkwọ iwu ahụ ga-abụ ihe na-abaghị uru. “Onye ọ bụla gbara nwụnye ya achọghị m mesịa lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụla kwa lụrụ nwanyị ahụ di ya jụrụ na-emekwa mmehie ịkwa iko. “Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe mara mma, na-erikwa nri dị mma ụbọchị nile. Nꞌọnụ ụzọ e si abanye nꞌụlọ onye ọgaranya a, otu nwoke ahụ ya jupụtara nꞌọnya na-edina nꞌebe ahụ oge nile! Aha nwoke a bụ Lazarọs. Ọ gụsịrị Lazarọs agụụ ike iri ọ bụladị ibiribe nri si na tebulu onye ọgaranya ahụ daa nꞌala, ma o nweghị onye nyere ya. Nꞌezie, ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nꞌahụ Otu ụbọchị Lazarọs nwụrụ. Ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nꞌebe Eberaham nọ. Nꞌikpeazụ, onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya. Nꞌọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nꞌoke mgbu, ọ hụrụ Eberaham ka ọ nọ nꞌebe dị anya. Ọ hụkwara Lazarọs ka ọ nọ nꞌakụkụ Eberaham. “Onye ọgaranya ahụ kpọkuru Eberaham sị ya, ‘Nna m Eberaham, meere m ebere nꞌihi na anọ m nꞌoke mgbu nꞌebe a, biko zienụ Lazarọs ka o denye mkpịsị aka ntakịrị ya na mmiri bịa metụ ya nꞌire m ka akpịrị na-akpọ m nkụ dajụọ.’ “Ma Eberaham zara ya sị, ‘Nwa m nwoke, chetakwa oge ị nọ nꞌụwa? Nꞌoge ahụ i nwetara ihe ọma nile. Chetakwa na Lazarọs natara nanị ihe ọjọọ nꞌoge ahụ. Ugbu a Chineke na-akasi Lazarọs obi ma ị nọkwa nꞌoke ihe mgbu. A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nꞌihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike isite nꞌebe a bịa nꞌebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nꞌebe unu nọ bịa nꞌebe a.’ “Onye ọgaranya ahụ gwara Eberaham sị ya, ‘Biko, arịọ m gị, nna m, zienụ ozi zigara ndị bi nꞌụlọ nna m nꞌụwa. Nꞌihi na enwere m ụmụnne ise. Ka ndị ị ga-eziga gaa dọọ ha aka na ntị ka ha bie ụdị ndụ nke na-agaghị eme ka ha bịa nꞌebe ahụ ụfụ a m nọ.’ “Ma Eberaham zara ya sị, ‘Ụmụnne gị nwere akwụkwọ nsọ ebe Mosisi na ndị amụma ziri ụzọ e si eme ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ha gụọ ya, ma meekwa ihe ha gụtara ọ chọrọ ka ha mee.’ Ma onye ọgaranya ahụ zara sị, ‘Nna m Eberaham, nke ahụ agaghị ezu! Ọ dị mkpa na mmadụ ga-esite na ndị nwụrụ anwụ bilie gaa gwa ha ka ha chegharịa.’ “Ma Eberaham zara ya sị, ‘Ọ bụrụ na ha agaghị eme ihe ha ga-agụta nꞌakwụkwọ Mosisi na ndị amụma dere, echeghị m na ha ga-echegharị ma mmadụ site nꞌọnwụ bilie bịa gwa ha okwu.’ ” Otu ụbọchị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọnwụnwa nke na-eduba mmadụ nꞌime mmehie ga na-adị, ma oke ahụhụ dị na-eche nwoke ahụ onye ọnwụnwa ga-esi nꞌaka ya bịara mmadụ. Ọ ga-akara onye ahụ mma ma a sị na e kenyere ya nkume buru ibu nꞌolu, tụnye ya nꞌetiti osimiri, karịa na ọ ga-eme ka ndị a dị nta kweere na m mehie. Kpacharanụ anya unu! Ọ bụrụ na nwanne gị eme gị ihe ọjọọ, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugbo asaa, rịọkwa gị ka ị gbaghara ya ugbo asaa, gbaghara ya.” Ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ Jisọs otu ụbọchị sị ya, “Nyere anyị aka ka anyị nwee okwukwe karịa nke anyị nwere.” Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike ịsị osisi ukwu a, ‘Site na mgbọrọgwụ fopụta onwe gị, burukwa onwe gị gaa daba nꞌosimiri,’ ọ ga-emekwa ihe unu nyere ya nꞌiwu. Ọ bụrụ na otu onye nꞌime unu nwere odibo gara rụọ ọrụ nꞌubi ya, ma ọ bụ odibo gara ilekọta atụrụ ya, ginị ka ọ ga-agwa odibo ahụ ma ọ lọta? Ọ̀ ga-asị ya, ‘Bịa soro m rie nri dị na tebulu’? Ka ọ̀ ga-asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, dozie ya nꞌelu tebulu. Ị ga-anọ tutuu m richaa tupuu ị gaa rie nri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị.’ Mgbe odibo ahụ rụchara ọrụ ndị a nile, onyenwe ụlọ ahụ ọ̀ ga-ekele ya nꞌihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ? Otu a ka ọ dịrị unu, mgbe unu rụchara ọrụ nile unu kwesịrị ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ nanị nke a, ‘Anyị bụ nanị mmadụ efu ndị na-eje ozi, anyị arụchaala ọrụ anyị kwesịrị ịrụ.’ ” Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-aga Jerusalem ha sitere nꞌagbata Galili na Sameria. Mgbe ha chọrọ ịbanye nꞌotu obodo nta, ndị ekpenta mmadụ iri zutere ha. Site nꞌebe dị anya, ha bidoro na-eti mkpu na-asị, “Jisọs, nna anyị ukwu, meere anyị ebere.” *** Mgbe Jisọs hụrụ ha, ọ gwara ha okwu sị, “Gaanụ gosi onye nchụaja onwe unu.” Mgbe ha na-aga nꞌụzọ igosi onye nchụaja onwe ha, e mere ka ahụ dị ha mma. Mgbe otu nꞌime ha hụrụ na ahụ adịla ya mma, o jiri iti mkpu na ito Chineke lọghachi azụ. Ọ bịakwutere Jisọs, daa nꞌala nꞌihu ya, kelee ya. Ma nwoke a lọghachiri azụ bịa kelee Jisọs bụkwanụ onye Sameria, obodo ahụ ndị Juu ledara anya. Mgbe Jisọs hụrụ ya, o kwuru okwu sị, “Ha dị mmadụ iri m gwọrọ, ebeekwanụ ka toolu ndị ọzọ nọ? Ọ̀ bụ nanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” Mgbe ahụ Jisọs gwara onye ahụ sị, “Bilie ọtọ laa nꞌụlọ gị, e meela ka ahụ dị gị mma nꞌihi na i kweere.” Ụfọdụ ndị Farisii jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa?” Jisọs zara ha sị, “Alaeze eluigwe adịghị abịa nꞌụzọ ndị mmadụ ga-eji anya ha hụ ya. O nweghị onye nwere ike ịgwa gị sị, ‘Lee alaeze Chineke ebidola nꞌebe a, ma ọ bụ lee o bidola nꞌebe ahụ.’ Ma achọrọ m ka unu mata na alaeze Chineke nọ ugbu a nꞌetiti unu.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu ọzọ sị, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụ unu agụụ ịhụ m anya, ọ bụladị otu mgbe nanị, ma unu agaghị ahụ m. Nꞌoge ahụ, ndị mmadụ ga-agwa unu sị, ‘Lee, ọ nọ nꞌebe ahụ ma ọ bụ lee ọ nọ nꞌebe a.’ Ma unu agakwala ebe ọ bụla ha na-atụrụ unu aka, unu esokwala ha. Nꞌihi na dị ka mmadụ si ahụ ìhè mgbe ọ bụla amụma eluigwe gburu na mbara eluigwe site nꞌotu ebe ruo nꞌebe ọzọ, otu a ka ndị mmadụ ga-ahụ m mgbe m ga-alọghachi. Ma tupuu oge ahụ eruo, aga m ebu ụzọ hụọ ụdị ahụhụ dị iche iche. Ndị mmadụ bi nꞌọgbọ a ga-ajụkwa ya. “Ma mgbe oge nlọghachi zuru, ndị mmadụ ga-aga nꞌihu na-ebikwa ndụ ha dị ka ndị bi nꞌoge Noa siri bie ndụ ha. Nꞌihi na nꞌoge Noa, ndị mmadụ nọ nꞌoriri na ọṅụṅụ. Ha na-alụkwa nwụnye na-ekenyekwa ụmụ ha di, tutuu ruo mgbe Noa banyere nꞌime ụgbọ mmiri ahụ. Chineke zitekwara mmiri dị ukwuu nke kpochapụrụ ha. “Otu a ka ọ dịkwa nꞌoge Lọt. Ndị mmadụ nọ nꞌoriri na ọṅụṅụ. Ha nọ na-azụ ahịa, nọkwa na-ere ahịa, ụfọdụ nọ na-arụ ọrụ nꞌubi ha, ndị ọzọ nọ na-ewu ụlọ ha. Ma nꞌụbọchị ahụ Lọt si nꞌobodo Sodọm pụọ, Chineke sitere nꞌeluigwe wụkwasị ndị obodo ahụ ọkụ na nkume na-enwu enwu nke rechapụrụ ndị nile bi nꞌobodo ahụ, laa obodo ahụ nile nꞌiyi. Otu a ka ọ ga-adịkwa nꞌụbọchị ahụ Nwa nke mmadụ ga-alọta. “Nꞌụbọchị ahụ, ọ bụrụ na ị nọ nꞌelu ụlọ alọdatala chọọ ka ị baa nꞌụlọ gị iburu ngwongwo gị. Ọ bụrụ na ị nọ nꞌubi, alọtala nꞌụlọ gị. Chetakwanụ ihe dakwasịrị nwụnye Lọt! Onye ọ bụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọ bụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya. Nꞌụbọchị ahụ, mmadụ abụọ ga-edina nꞌotu ebe, a ga-ewepu otu nꞌime ha hapụ onye nke ọzọ. Ụmụ nwanyị abụọ ga-anọ na-akwọ ọka, a ga-ewepụ otu hapụ nke ọzọ. Otu a kwa, ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nꞌubi ha na-arụ ọrụ, a ga-ewepụ otu hapụ nke ọzọ.” Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ebee ka a ga-ebuga ndị ahụ e wepụrụ?” Jisọs zara ha sị, “Ebe ọ bụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.” Otu ụbọchị Jisọs kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya akụkọ iji gosi ha mkpa ọ dị ikpegide ekpere na-esepụghị aka tutuu Chineke aza ekpere ha. Ọ sịrị ha, “O nwere otu ọkaikpe bi nꞌotu obodo, nke na-adịghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị emetụ ya nꞌobi ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya. Nꞌobodo ahụ kwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ọkaikpe a oge nile na-arịọ ya ka o nyere ya aka megide onye iro ya. Ma oge nile nwanyị a na-abịakwute ọkaikpe a, ọkaikpe a ekweghị inyere ya aka. Nꞌikpeazụ, nꞌihi na nwanyị a nyegidere ọkaikpe ahụ nsogbu, ọkaikpe a kwuru sị, ‘Ọ bụ ezie na m adịghị atụ egwu Chineke, ọ nakwaghị emetụ m nꞌobi ihe ndị mmadụ na-ekwu megide m. Ma nwanyị a enyekarịala m nsogbu. Aga m enyere ya aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na m ajụ inyere ya aka, ọ ga-aga nꞌihu na-abịakwute m, ọ gaghị enye m ohere izu ike.’ ” *** Mgbe ahụ Jisọs kwuru sị, “Leenụ ihe ajọ ọkaikpe a kwuru. Ọ bụrụ na mmadụ ọjọọ dị otu a nwere ike kpebie inyere nwanyị na-arịọsi ya arịrịọ ike aka, ọ bụ na Chineke agaghị enyekwara ndị ahụ ọ họpụtara aka, bụ ndị ahụ na-akpọku ya ehihie na abalị. Ọ̀ ga-anọ tee anya ịbịa inyere ha aka? Mba! O doro m anya na ọ ga-eme ọsịịsọ inyere ha aka. Ma ajụjụ m na-ajụ bụ nke a, mgbe m ga-alọghachi azụ, m ga-achọta mmadụ ndị kweere na m nꞌụwa?” Jisọs kọrọ akụkọ a nꞌihi ndị na-eche nꞌobi ha na ha bụ ndị dị mma si otu a na-eleda ndị ọzọ anya. Ọ gwara ha okwu sị, “Mmadụ abụọ gara nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ikpe ekpere. Otu onye nꞌime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọnaụtụ. Onye Farisii guzoro ọtọ si otu a kpee ekpere ya nye Chineke sị, ‘Chineke, biko ekelee m gị, nꞌihi na adịghị m ka ndị ọzọ. Adịghị m ka onye ọnaụtụ ahụ. Anaghị m aghọgbu mmadụ, anaghị m akwa iko, abughị m onye mmadụ na-enweghi ike ịtụkwasị obi. Ana m ebu ọnụ nꞌihi ịdị ọcha nꞌihu gị ugbo abụọ nꞌizu ụka. Ana m enye onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke ihe nile m nwere oge nile.’ “Ma onye ọnaụtụ guzo nꞌebe dị anya enweghị ike iweli isi ya elu lee anya nꞌeluigwe. Kama ọ nọ ebe ahụ tie aka nꞌobi na mwute gwa Chineke okwu sị, ‘Chineke m, biko meere m ebere nꞌihi na abụ m onye mmehie!’ O doro m anya nke ọma na ọ bụ onye ọnaụtụ ahụ karịa onye Farisii ahụ ka Chineke gbaghaara mmehie ya mgbe o biliri ịla nꞌụlọ ya. Nꞌihi na onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nꞌala, ma onye ọ bụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.” Ụfọdụ mmadụ kpọtaara Jisọs ụmụ ha ka o bikwasị ha aka. Ma mgbe ha du ụmụaka ahụ na-abịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs hụrụ ha baara ha mba. Ma Jisọs kpọrọ ụmụnta ahụ ka ha bịakwute ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha, nꞌihi na alaeze Chineke dịrị ndị dị ka ha. Nꞌezie, onye ọ bụla na-anabataghị alaeze Chineke dị ka ụmụntakịrị ga-esi nabata ya, agaghị abanye nꞌime ya.” Otu onyendu ndị Juu bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na m achọọ iketa alaeze eluigwe?” Ma Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji sị na m bụ ezi mmadụ? Ọ dịghị onye bụ ezi mmadụ. Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye. Ma otu ọ dị banyere ajụjụ ị jụrụ m, ị maara ihe iwu na-ekwu. Ọ sị, ‘Akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.’ ” Nwoke ahụ zara sị, “Edebezuchaala m iwu ndị a nile siterị na mgbe m bụ nwanta.” Mgbe Jisọs nụrụ ihe nwoke ahụ kwuru, ọ gara nwoke ahụ sị, “Ọ fọdụrụ nanị otu ihe i kwesịrị ime. Laa nꞌụlọ gị, ree ihe nile i nwere. Kesaa ego i retara nye ndị ogbenye. I mechaa nke a ị ga-enwe akụ nꞌeluigwe, bịa soro m.” Mgbe nwoke ahụ nụrụ okwu a Jisọs kwuru, ihu ya gbarụrụ, obi jọkwara ya njọ, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya. Jisọs legidere nwoke ahụ anya mgbe o si nꞌebe ọ nọ na-apụ gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụ nnọọ ihe siri ike ime, bụ na ndị ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke! Ọ dịrị ịnyịnya mfe isite nꞌanya agịga gafee karịa na onye ọgaranya ga-abanye nꞌalaeze Chineke.” Mgbe ndị mmadụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Ọ bụrụ na o si otu a dị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” Ma Jisọs zara ha sị, “Chineke nwere ike ike ihe nile. O nwere ike ime ihe ndị ahụ mmadụ efu na-enweghị ike ime.” Pita kwuru okwu sị, “Onyenwe anyị, leenụ, anyị ahapụla ụlọ anyị soro gị.” Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nꞌezie, o nweghị onye ọ bụla hapụrụ ụlọ ya ma ọ bụ nwụnye ya ma ọ bụ ụmụnne ya, ma ọ bụ ndị mụrụ ya, ma ọ bụ ụmụ ya, nꞌihi alaeze Chineke, nke na-agaghị anata ihe karịrị ihe ọ hapụrụ nꞌụwa a. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nꞌụwa ga-abịa.” Mgbe ahụ Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya gwa ha okwu sị, “Leenụ anya ugbu a, anyị na-aga Jerusalem. Nꞌebe ahụ ihe nile ndị amụma dere na ọ ga-adakwasị Onye nzọpụta ahụ ga-adakwasị m. Nꞌihi na a ga-arara m nye nꞌaka ndị mba ọzọ. Ha ga-eji m mee ihe ọchị, mesoo m mmeso ihere, gbụọkwa m asụ. Ha ga-eti m ihe, gbuokwa m. Ma nꞌụbọchị nke atọ, aga m esite nꞌọnwụ bilie ọzọ.” Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị okwu ndị a nile ọ gwara ha. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe zoro ezo nꞌebe ha nọ. Nꞌihi ya, ha aghọtaghị okwu o kwuru. Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya bịara nso nꞌobodo Jeriko, o nwere otu nwoke kpuru ìsì nọ nꞌakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. Mgbe nwoke onye ìsì ahụ nụrụ ụzụ ọtụtụ mmadụ na-agafe, ọ jụrụ ụfọdụ mmadụ ka ha kọwaara ya ihe na-eme. Ha gwara ya na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na-agafe. Mgbe ahụ onye ìsì ahụ bidoro iti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Jisọs nwa Devidi, biko meere m ebere!” Ndị mmadụ ahụ nọ nꞌihu Jisọs baara ya mba sị ya mechie ọnụ. Ma onye ìsì ahụ nọgidekwara na-eti mkpu na-asị, “Nwa Devidi, bikonụ meere m ebere!” Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ kwụsịrị, zie ozi ka a kpọta onye ìsì ahụ. Mgbe onye ìsì ahụ bịara nso, Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Onye ìsì ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, biko, biko, achọrọ m ịhụ ụzọ.” Jisọs zara ya sị, “Ọ dị mma, bido hụwa ụzọ.” Nꞌotu mgbe ahụ onye ìsì ahụ bidoro ịhụ ụzọ. O sooro Jisọs na-eto Chineke. Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe mere, ha onwe ha bidokwara ito Chineke. Mgbe ahụ Jisọs banyere nꞌime obodo Jeriko mgbe ọ na-agafe. O nwere otu nwoke ọ gụrụ nnọọ agụụ ịhụ Jisọs anya. Aha nwoke a bụ Zakịọs. Ọ bụ onyeisi ndị ọnaụtụ, bụrụkwa onye ọgaranya. Kama ọ dị mkpụmkpụ. O nweghị ike ịhụ Jisọs nꞌihi na ọtụtụ mmadụ gbara Jisọs gburugburu. *** Ihe Zakịọs mere bụ ịgba ọsọ gaa nꞌihu, nꞌụzọ Jisọs si agafe, rigoro nꞌelu osisi, ka o nwee ike ịhụ Jisọs. Mgbe Jisọs jere ije rute nꞌebe ahụ, o lere anya nꞌelu hụ Zakịọs, gwa ya okwu sị, “Zakịọs, mee ngwangwa si nꞌelu rịdata, nꞌihi na achọrọ m iso gị gaa nꞌụlọ gị taa.” Zakịọs mere ngwangwa rịdata. O jikwa ọṅụ duru Jisọs gaa nꞌụlọ ya. Mgbe ọtụtụ ndị mmadụ ahụ so Jisọs hụrụ ka Jisọs na-eso Zakịọs, ha bidoro ịtamụ ntamụ na-asị, “Lee na nwoke a esorola onye mmehie na-aga nꞌụlọ ya iri ihe.” Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Jisọs okwu sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ana m ekwe nkwa nꞌihu gị, onyenwe m, na aga m ekewa ihe nile m nwere ụzọ abụọ, nye ndị ogbenye otu ụzọ. Ọ bụrụkwa na o nweela ndị ọ bụla m ghọgburu nꞌụzọ ọ bụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.” Jisọs gwara Zakịọs okwu sị, “Zakịọs, Chineke abịala nꞌụlọ a taa ịzọpụta gị, nꞌihi na ị bụkwa otu nꞌime ụmụ Eberaham. Nꞌihi na mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị ahụ furu efu.” Jisọs nọ nso na Jerusalem mgbe o kwuru okwu a. Nꞌihi okwu a, ndị nụrụ ihe o kwuru chere na ọ gaghị adị anya tupuu alaeze Chineke apụta ìhè. Nꞌihi nke a, Jisọs kọọrọ ha akụkọ a sị ha, “Otu nwoke chọrọ ịga obodo dị anya ebe a ga-eme ya eze. Tupuu ọ pụọ, ọ kpọrọ mmadụ iri na-ejere ya ozi nye ha iri naịra abụọ, iri naịra abụọ, sị ha were ego a zụọ ahịa tutuu ọ lọta. Ma ndị obodo ahụ o si pụọ kpọrọ ya asị. Mgbe ọ hapụrụ obodo ahụ na-apụ, ndị obodo ahụ zipụrụ ndị mmadụ ka ha gaa gwa ya sị, ‘Anyị achọkwaghị ka ị bụrụ eze anyị ọzọ.’ “Mgbe nwoke ahụ natachara ike ịbụ eze nꞌobodo ahụ ọ gara, ọ lọghachiri nꞌobodo nke aka ya, kpọọ ndị na-ejere ya ozi o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa guzie ego o nyere ha, ịmata ego ole ha ritere nꞌuru. “Onye nke mbụ bịara sị ya, ‘Onyenwe m, eji m iri naịra abụọ ahụ i nyere m zụọ ahịa, rite uru iri naịra abụọ ụzọ iri.’ “Eze ahụ zara sị ya, ‘I mere nke ọma. Site taa gaa nꞌihu, ị ga-achị obodo iri nꞌihi na i jiziri ihe ntakịrị e nyere gị.’ “Mgbe ahụ onye nke abụọ bịara sị ya, ‘Onyenwe m, eji m iri naịra abụọ i nyere m zụọ ahịa, rite uru iri naịra abụọ ụzọ ise.’ “Eze ahụ zara ya sị, ‘Ị̀ ga-achị obodo ise.’ “Onye ọzọ bịakwara sị ya, ‘Onyenwe m, lee iri naịra abụọ i nyere m. Ekechiri m ya nꞌakwa, zoo ya, nꞌihi na atụrụ m egwu. Ị bụ onye afọ tara mmiri bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na onye na-ewe ihe ubi nꞌubi nke ị na-akụghị mkpụrụ.’ Eze ahụ zara nwoke a na-ejere ya ozi sị, ‘Ọ bụ okwu si gị nꞌọnụ ka a ga-eji kpee gị ikpe, gị odibo ọjọọ! Ị maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-ewe ihe ubi nꞌubi m na-akụghị mkpụrụ, gịnị mere i wereghị ego m tinye nꞌụlọ akụ ka m nwee ike nwetaghachi ya na ọmụrụ nwa ya mgbe m lọtara?’ “Mgbe ahụ eze ahụ gwara ndị guzo nꞌebe ahụ sị, ‘Napụta ya iri naịra abụọ ahụ o ji, werekwa ya nye onye ji ego e nyere ya zụpụta uru ụzọ iri.’ “Ndị ahụ zara eze ahụ sị, ‘Onyenwe anyị, nwoke a nwekwaranụ ụzọ iri, ị chọrọ ka e nye ya ọzọ?’ “Eze ahụ zara ha sị, ‘Ka m gwa unu eziokwu, onye ọ bụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. Ugbu a, olee ebe ndị iro m ahụ nọ, ndị ahụ na-achọghị ka m bụrụ eze ha? Kpụpụta ha nꞌebe a gbuo ha nꞌihu m.’ ” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, ọ gakwara nꞌihu nꞌije ya ịga Jerusalem. Mgbe ha bịara nso obodo nta abụọ a na-akpọ Betfeji na Betani, nke dị ugwu olivu nso, Jisọs kpọpụtara mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya zie ha ozi sị, “Gaanụ nꞌime obodo nta ahụ dị nꞌihu anyị. Mgbe unu na-abanye nꞌime ya, unu ga-ahụ otu inyinya ibu nke onye ọ bụla na-anọkwasịbeghị nꞌelu ya, ebe e kenyere ya. Tọpụnụ ya nꞌagbụ ya kpụtara m ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu ihe mere unu ji atọpụ ya, gwanụ ndị ahụ na ọ dị Onyenwe anyị mkpa.” Ndị ahụ Jisọs zipụrụ gara hụ inyinya ibu ahụ ebe Jisọs kwuru na ha ga-ahụ ya. Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji tọpụ inyinya ibu ahụ?” Ndị na-eso ụzọ Jisọs zara sị ha, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.” Ha kpụtaara Jisọs inyinya ibu ahụ, tụsaa uwe ha nꞌelu ya, kukwasị Jisọs nꞌelu ya. Mgbe inyinya ibu ahụ bu Jisọs na-aga, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụsara uwe ha nꞌokporo ụzọ. Mgbe Jisọs na ndị so ya na-abịaru nso Jerusalem, ha rutere nꞌụzọ ahụ e si arigo ugwu olivu. Site nꞌebe ahụ gaa nꞌihu, igwe mmadụ ndị so ya bidoro iti mkpu na ịbụ abụ. Ha na-eto Chineke nꞌihi ọrụ ebube nile ha hụrụ Jisọs rụrụ. Ha na-eti mkpu na-asị, “Chineke gọzie eze ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị! Ka udo dị nꞌeluigwe! Ka otuto dịkwa nꞌebe kachasị elu nke eluigwe!” Ụfọdụ nꞌime ndị Farisii so ndị mmadụ ahụ kpọkuru Jisọs sị ya, “Onye ozizi, baara ndị na-eso ụzọ gị mba!” Ma Jisọs zara ha sị, “Nꞌezie, ọ bụrụ na m asị ha mechie ọnụ, unu ga-ahụ ka nkume ndị a ga-ebido iti mkpu ọṅụ nke ha!” Mgbe Jisọs rutere ebe ọ nọ huzie obodo Jerusalem anya nke ọma, ọ kwara akwa nꞌihi ya, kwuo okwu sị, “O Jerusalem! A sị na ị maara taa ihe pụrụ iwetara ndị bi nꞌime gị udo, ma ị maghị ya, ị gaghị ahụkwa udo anya ọzọ. Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ nile, sitekwa nꞌụzọ nile dị iche iche bịakwasị gị. Ha ga-egwepịa gị, ọ dịkwaghị nkume ọ bụla ha ga-ahapụ nꞌelu ibe ha, nꞌihi na ị jụrụ ịnabata Chineke mgbe ọ bịara ịzọpụta gị.” Emesịa, Jisọs batara nꞌime Jerusalem gaa nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke bido ịchụpụ ndị nile nọ nꞌebe ahụ na-ere ahịa. Ọ gwara ha sị, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ na ụlọ m ga-abụ ụlọ ekpere, ma ugbu a unu emeela ya ka ọ bụrụ ebe obibi ndị na-apụnarị mmadụ ihe.” Ụbọchị nile Jisọs na-anọ na-akuzi ihe nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Kama ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị a maara aha ha dị ka ndị ndu nꞌetiti ndị Juu, nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ma ha achọpụtaghị ụzọ ọ bụla ha ga-esi jide ya nꞌihi ọtụtụ mmadụ na-esogharị Jisọs, nꞌihi na ha chọrọ ịnụ okwu nile ọ na-ekwu. Otu ụbọchị, Jisọs nọ nꞌụlọ nsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe. Ọ na-ekwusakwa ozi ọma. Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya. Ha jụrụ ya ajụjụ sị, “Gwa anyị, onye nyere gị ike i ji na-eme ihe ndị a nile ị na-eme? Ebeekwa ka i si nweta ike ahụ?” Jisọs zara ha sị, “Enwekwara m ajụjụ m chọrọ ijụ unu. Gwanụ m, onye nyere Jọn omee baptizim ike ime ndị mmadụ baptizim? Ọ bụ Chineke ka ọ bụ mmadụ!” Ha kwurịtara okwu nꞌetiti onwe ha kpebie sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na ọ bụ Chineke nyere Jọn ike, ọ ga-ajụ anyị ihe mere anyị ji jụ ikwere nꞌihe o kwuru. Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na ọ bụ mmadụ nyere ya ike ahụ, ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nꞌihi na ha nile kweere na Jọn bụ onye amụma.” Nꞌihi nke a, ha zara Jisọs sị, “Anyị amaghị onye nyere Jọn ike ime ndị mmadụ baptizim.” Jisọs zakwara ha sị, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu onye nyere m ike ime ihe ndị a.” Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ akụkọ sị, “Otu nwoke nwere ala ubi ebe ọ kụrụ mkpụrụ vaịnị. Mgbe ọ kụsịrị mkpụrụ vaịnị ahụ, o tinyere ubi ahụ nꞌaka ndị ga-elekọta ya, pụọ gaa nꞌobodo ọzọ ebe ọ ga-anọ ogologo oge. Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zitere otu nꞌime ndị na-ejere ya ozi ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ anya, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ubi ahụ. Ma ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ jidere odibo nwoke ahụ, tie ya ihe, zilaa ya nꞌaka efu. Onyenwe ubi ahụ zitekwara odibo ọzọ. Ma ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ tikwara ya ihe mee ya ihe ihere. Ha zilakwara ya nꞌaka efu. Onyenwe ubi ahụ zipụkwara onye ọzọ, nke mere ha mmadụ atọ, ma ndị na-elekọta ubi ahụ merụrụ ya ahụ chụọ ya ọsọ. “Nꞌikpeazụ, mgbe onyenwe ubi ahụ na-amakwaghị ihe ọzọ ọ ga-eme, o kpebiri nꞌime onwe ya sị, ‘Aga m ezigara ha ọkpara m hụrụ nꞌanya. Ikekwe, ha ga-asọpụrụ ya mgbe ha hụrụ ya.’ “Nwoke ahụ zipụrụ ọkpara ya dị ka o si kpebie. Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara nwoke ahụ ka ọ na-abịa, ha kpebiri nꞌetiti onwe ha igbu ya. Ha sịrị, ‘Onye a bụ onye ga-eketa ihe nile onyenwe ubi a nwere. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ubi a bụrụkwa nke anyị.’ Mgbe ọkpara nwoke a bịaruru, ndị ahụ mere dị ka ha kwuru. Ha jidere ya, kpụrụ ya pụọ, gaa nꞌazụ ubi ahụ, gbuo ya nꞌebe ahụ.” Jisọs jụrụ ndị na-ege ya ntị sị, “Mgbe onyenwe ubi ahụ bịara, gịnị ka ọ ga-eme ndị ahụ na-elekọta ubi ya? Ọ̀ bụghị ịbịa laa ajọ ndị ahụ nꞌiyi werekwa ubi ya tinye nꞌaka ndị ọzọ ndị jikeere inye ya mkpụrụ ruru ya nꞌoge ya? Nꞌezie, nke ahụ bụ nnọọ ihe nwoke ahụ ga-eme.” Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ akụkọ a Jisọs kọrọ, ha tiri mkpu sị, “Tụfịaakwa! Chineke ekwela! Gịnị mere ha ji mee ihe dị otu a?” Ma Jisọs lere ha anya sị, “Gịnị ka unu chere na okwu Chineke na-akọwa mgbe o kwuru sị, ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ tụfuru dị ka ihe na-abaghị uru, abụrụla nkume dị mkpa ugbu a nꞌụlọ ahụ?’ Ahụ onye ọ bụla dara nꞌelu nkume ahụ ga-etiwa, ma onye ọ bụla nkume ahụ dakwasịrị ka ọ ga-egwepịa dị ka ntụ.” Nꞌoge ahụ, ndị ozizi iwu na ndị isi nchụaja ghọtara na ọ bụ ha ka Jisọs bu nꞌobi mgbe ọ kọrọ akụkọ ahụ. Ha gbalịrị ijide ya, ma ha ejidekwaghị ya nꞌihi na ha tụrụ egwu ihe ndị mmadụ ga-eme ha. Ihe ha mere bụ iche ya nche. Ha zipụrụ ndị mmadụ ka ha bịa jiri aghụghọ jụọ Jisọs ajụjụ, ka ha lee ma ha ga-esite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye nꞌajụjụ ha jụrụ ya jide ya, kpụrụ ya jekwuru onyeisi ọchịchị na-achị nꞌoge ahụ. Ndị ahụ ha zipụrụ bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Onye ozizi, anyị maara na ihe ị na-ezi na okwu ị na-ekwu bụ eziokwu. Ị dịghị ele mmadụ anya nꞌihu, kama ị na-ezi ihe bụ ụzọ mmadụ ga-esi bịakwute Chineke. Ma gwa anyị, o ziri ezi na anyị ga-atụ ụtụ anyị nye Siza onye na-achị alaeze ndị Rom, ka ị sị anyị atụla ụtụ?” Jisọs matara na ajụjụ a bụ ajụjụ aghụghọ. Nꞌihi ya ọ zara ha sị, “Gosinụ m otu nꞌime mkpụrụ ego unu.” Ha nyere ya otu mkpụrụ ego. Ọ jụrụ ha sị, “Ònye nwe ihu e sere nꞌelu ego a? Ọ̀ bụkwa aha onye ka e dere nꞌelu ya?” Ha zara sị ya, “Ha bụ nke Siza.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nyenụ Siza ihe ruru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe ruru Chineke.” Ọsịsa Jisọs nyere juru ha anya, mee ka ha kpuchie ọnụ ha nꞌihere. Ha enwekwaghị ike ijide Jisọs site nꞌokwu ọnụ ya nꞌihu ndị mmadụ ahụ. Mgbe oge nta gasịrị, ụfọdụ ndị si nꞌotu ndị Sadusii bịakwutere Jisọs. Ndị a bụ ndị ahụ na-asị na ndị nwụrụ anwụ agaghị ebilitekwa nꞌọnwụ ọzọ. Ha jụrụ Jisọs ajụjụ a sị, “Onye ozizi, Mosisi dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ọ bụrụ na nwoke lụrụ nwụnye anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne nwoke ahụ ga-alụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, mụta ụmụ ndị ga-aza aha nwoke ahụ nwụrụ anwụ. Ugbu a, ọ dị ezinụlọ e nwere ụmụnne nwoke asaa, onye nke mbụ lụrụ nwụnye, ma ọ nwụrụ na-amụtaghị nwa. Onye nke abụọ na nke atọ lụrụ nwanyị ahụ ma ha nwụrụ na-amụtaghị nwa. Otu a, ụmụnne asaa ahụ nile lụrụ nwanyị a, ma ha nile nwụrụ na-amụtaghị nwa. *** Nꞌikpeazụ nwanyị ahụ nwụkwara. Mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie, onye ka nwanyị a ga-alakwuru dị ka di ya ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ahụ lụrụ ya nꞌụwa a?” Jisọs zara ha sị, “Ndị nwoke na ndị nwanyị bi nꞌọgbọ a na-alụ nwụnye, ma na-enyekwa ụmụ ha nꞌọlụlụ di na nwụnye. Ma ndị ahụ Chineke gụrụ dị ka ndị tozuru etozu inwe ndụ ebighị ebi agaghị alụ di na nwụnye mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie, nꞌihi na ha agaghị anwụkwa ọzọ, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke nꞌihi na Chineke emeela ka ha si nꞌọnwụ dị ndụ ọzọ. “Ma banyere ajụjụ unu jụrụ ma ọ bụ ezie na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ, Mosisi nꞌonwe ya gosiri anyị na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Nꞌihi na mgbe o dere banyere okwu Chineke gwara ya site nꞌime osisi ahụ nwuru ọkụ nꞌọzara, aha ọ kpọrọ Chineke bụ, Chineke nke Eberaham, Chineke nke Aizik na Chineke nke Jekọb. Chineke abụghị Chineke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ Chineke ndị dị ndụ. Ya mere nꞌihu Chineke mmadụ nile dị ndụ.” Ụfọdụ ndị ozizi iwu zara Jisọs sị, “Onye ozizi, ị zara ajụjụ a nke ọma.” O nwekwaghị onye ọ bụla jụrụ Jisọs ajụjụ ọzọ. Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị mere ndị mmadụ ji na-asị na Onye nzọpụta ahụ na-abịa bụ nwa Devidi? Nꞌihi na nꞌakwụkwọ Abụ Ọma, Devidi nꞌonwe ya kwuru sị, ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị, Nọdụ nꞌebe a nꞌakụkụ aka nri m tutuu ruo mgbe m mere ka ndị iro gị bụrụ ebe mgbakwasị ụkwụ gị.’ Devidi nꞌonwe ya kpọrọ Onye nzọpụta ahụ Onyenwe anyị. Oleekwanụ otu Onye nzọpụta siri bụrụ nwa Devidi?” Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu, mgbe ndị mmadụ ahụ na-ege ntị sị, “Jienụ onwe unu aka site nꞌebe ndị ozizi iwu nọ. Nꞌihi na ihe ha hụrụ nꞌanya bụ iyi uwe ogologo na-ejegharị ebe nile. Ihe na-atọkwa ha ụtọ bụ ka a na-ekele ha ekele dị iche nꞌime ahịa. Ha hụkwara ịnọdụ nꞌoche dị mkpa nꞌụlọ ekpere na nꞌoge mmemme ọ bụla nꞌanya. Ma ha bụ ndị na-abakwuru ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ, pụnarị ha ihe ha nwere. Ha na-ekpe ogologo ekpere ka ndị mmadụ too ha. Ha ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu site nꞌaka Chineke.” Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ dị na Jerusalem, o lere anya hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nꞌigbe onyinye. Ọ hụkwara otu nwanyị onye ogbenye di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara nꞌebe ahụ tụnye nanị afụ abụọ. Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nꞌezie, ego nwanyị ogbenye a tinyere karịrị nke ndị ọzọ nile tinyere. Nꞌihi na ọtụtụ ndị ọzọ sitere nꞌego mapụtaara ha nye onyinye ha, ma nwanyị ogbenye a sitere nꞌọnọdụ ogbenye ya tinye ego nile o nwere.” Ụfọdụ nꞌime ndị nọ nꞌebe ahụ bidoro ikwu okwu banyere ụlọ nsọ ukwu Chineke ahụ. Ha nọ na-ekwu okwu banyere otu ụlọ ahụ si maa mma, na nkume ọma e ji wuo ya. Ha kwukwara okwu banyere ụdị onyinye ndị mmadụ na-eche nꞌihu Chineke nꞌime ya. Ma Jisọs zara ha sị, “Oge na-abịa mgbe ihe ndị a nile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. O nweghị otu nkume dị nꞌebe a nke ga-adịkwa nꞌelu ibe ya. A ga-akwatụ ihe nile.” Ndị mmadụ ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụ ihe ga-eme tupuu anyị amata na ihe ndị a na-aga ime?” Jisọs zara ha sị, “Kpacharanụ anya unu, ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu. Nꞌihi na ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa nꞌoge dị nꞌihu, ndị ga-asị na ha bụ Kraịst, onye nzọpụta ahụ. Ha ga-asịkwa na oge ahụ eruola. Ma unu esokwala ha. Unu ga-anụ akụkọ agha na ọgba aghara nꞌebe nile, ma ka ụjọ ghara ịtụ unu. Nꞌihi na ihe ndị a nile ga-ebu ụzọ mezuo, ma nke a egosighị na ọgwụgwụ ihe nile abịala. Otu mba ga-ebili ịlụ ọgụ megide mba ọzọ, otu alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ. A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nꞌebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe ga-eweta egwu na mbara eluigwe na ihe ngosi dị egwu. “Ma tupuu ihe ndị a nile emezuo, ndị mmadụ ga-ejide unu, kpagbuokwa unu. Ha ga-akpọrọ unu gaa nꞌụlọ ekpere ikpe unu ikpe. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-ebo unu ebubo nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m. Ma oge a bụ oge unu ga-eji gbaa ama banyere m. Kpebienụ nꞌobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu. Nꞌihi na aga m enye unu okwu amamihe unu ga-ekwu, ụdị amamihe na okwu nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike imegide ma ọ bụ imeri. Ọ bụladị ndị mụrụ unu na ndị ikwu unu na ndị enyi unu ga-enyefe unu nꞌaka ndị ga-ekpe unu ikpe. A ga-egbukwa ụfọdụ nꞌime unu. Mmadụ nile ga-akpọ unu asị nꞌihi m. Ma chetanụ na otu agịrị isi dị nꞌisi unu agaghị efu. Kama tachienụ obi, nwee ndidi, nꞌihi na ọ bụ otu a ka unu ga-esi zọpụta ndụ unu. “Mgbe unu hụrụ ka ndị iro gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nꞌiyi eruola. Nꞌoge ahụ ọ bụrụ na unu nọ na Judia, gbalaganụ gaa nꞌelu ugwu. Ọ bụrụ na unu nọ nꞌime obodo, sinụ nꞌime ya gbapụta. Onye na-anọghị nꞌime obodo, ya gbalaga ghara ịbanye nꞌime ya. Nꞌihi na oge ahụ bụ oge ntaramahụhụ imezu ihe nile akwụkwọ nsọ kwuru mezuo. Ebere na-emere m ụmụ nwanyị ji nwa nꞌaka nꞌụbọchị ahụ. Ebere na-emekwara m ụmụ nwanyị na-enye ụmụntakịrị ara nꞌụbọchị ndị ahụ. Ahụhụ dị ukwuu ga-adị nꞌala a, nꞌihi na Chineke ga-egosi iwe ya megide ndị Izirel. A ga-eji mma agha gbuo ha, kpụrụ ụfọdụ dị ka ndị a dọtara nꞌagha gaa nꞌobodo dị iche iche nke ụwa. Ndị mba ọzọ ga-achị Jerusalem, mesoo ya mmeso dị ka ha si chọọ, tutuu ruo oge Chineke kara aka na ọchịchị ha ga-agwụ. “Ihe ịrịba ama na ìhè ngosi ga-apụta ìhè nꞌanwụ na nꞌọnwa ya na kpakpando. Oke ịta ahụhụ ga-adakwasịkwa mba nile dị nꞌụwa. Ndị mmadụ ga-anọ nꞌoke mgbagwoju anya. Ụjọ ga-ejupụtakwa obi ha mgbe ọ bụla ebili mmiri nke oke osimiri mere mkpọtụ. Ndị mmadụ ga-ada mba nꞌihi ụjọ nke ga-atụ ha maka ihe na-abịakwasị ụwa. Nꞌihi na a ga-eme ka ike nile jikọtara eluigwe maa jijiji. Nꞌoge ahụ ndị mmadụ ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka m ji ike na ebube dị egwu na-abịa nꞌigwe ojii nke mbara eluigwe. Mgbe ihe ndị a nile bidoro ime, guzonụ lelie anya elu nꞌihi na oge ahụ adịla nso mgbe Chineke ga-azọpụta unu.” Mgbe ahụ Jisọs tụụrụ ha ilu iji kọwaa okwu ndị a ọ gwara ha. Ọ sịrị, “Leenụ anya nꞌosisi fiigi. Mgbe ọ bụla osisi fiigi wepụtara ahịhịa ndụ ọhụrụ, unu onwe unu na-ahụ, matakwa na oge ọkọchị adịla nso. Nꞌụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a nile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke dị nso. “Nꞌezie, ọgbọ a agaghị agabiga tutuu ihe ndị a nile emezuo. Eluigwe na ụwa pụrụ ịgabiga, bụrụ ihe na-agaghị adịkwa, ma okwu m ndị a agaghị agabiga. “Kpacharanụ anya ka unu hapụ ibi ndụ iri oke nri na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke. Kpachakwaranụ anya ka ibi ndụ unu hapụ ijubiga nꞌoke echiche banyere ihe nke ụwa, nke ga-eme ka unu hapụ ịnọ na njikere mgbe m ga-abịa. Nꞌihi na ọbịbịa m ga-abụ nnọọ na mberede, ọtụtụ mmadụ agakwaghị anọ na njikere mgbe m ga-abịa. Ma nọọnụ na nche oge nile. Kpeerenụ Chineke ekpere ka o nye unu ike ịgbanarị ihe ndị a nile nke na-aga ime. Ka o nyekwa unu ike iguzo nꞌihu m mgbe m ga-alọghachi.” Ụbọchị nile Jisọs nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ na-ezi ihe, ma nꞌoge anyasị, ọ na-ahapụ Jerusalem pụọ gaa hie ụra nꞌelu ugwu olivu. Nꞌisi ụtụtụ nile kwa, ndị mmadụ nile ahụ na-abịakwute ya nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, ịnụrụ okwu ya. Nꞌoge a, mmemme a na-akpọ Ngabiga eruola nso. Nke a bụ oge ndị Juu na-ata beredi a na-ejighị ihe na-eko achịcha eme. Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo Jisọs, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ. Mgbe ahụ ekwensu banyere nꞌime obi Judas Iskarịọt, otu nꞌime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso Jisọs. Ekwensu mere ka o jekwuru ndị isi nchụaja, na ndị isi agha na-elekọta ụlọ nsọ ukwu ahụ, ka ya na ha gbaa izu otu ọ ga-esi nyefee Jisọs nꞌaka ha. Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ha nụrụ ihe Judas ji bịa. Ha kwere nkwa inye ya ego. Ya mere, site nꞌụbọchị ahụ, Judas bidoro ịchọ ụzọ kachasị mma ọ ga-esi rara Jisọs nye. Nzube ya bụ ime nke a mgbe Jisọs na ndị mmadụ na-anọkọtaghị. Emesịa, nꞌụbọchị mmemme Ngabiga ahụ, mgbe a na-egbu atụrụ ahụ e ji eri oriri ngabiga, Jisọs kpọrọ Pita na Jọn sị ha, “Gaanụ kwadoo nri Ngabiga nke anyị onwe anyị ga-eri.” Ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Ebeekwanụ ka ị chọrọ ka anyị nọdụ kwadoo ya?” Jisọs zara ha sị, “Gaanụ nꞌime obodo. Mgbe unu na-abanye unu ga-ezute otu nwoke bu ite mmiri. Soronụ ya gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Sorokwanụ ya baa nꞌụlọ ọ banyere. Nꞌebe ahụ leenụ ihe unu ga-agwa onye nwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi anyị sị anyị jụọ gị ọnụ ụlọ ị kwadoro ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ rie oriri Ngabiga nke ha.’ *** Nwoke ahụ ga-egosi unu otu ọnụ ụlọ buru ibu dị nꞌelu ụlọ ebe e dozichara ihe nile. Nọdụnụ nꞌebe ahụ kwadoo nri anyị.” Pita na Jọn gara nꞌebe ahụ, chọpụta ihe nile dị ka Jisọs kwuru. Ha nọkwa nꞌebe ahụ kwadoo nri ha ga-eri. Mgbe oge ruru, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌụlọ ahụ nọdụ ala iri ihe. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ na mụ na unu ga-eri nri ngabiga a tupuu m hụọ ahụhụ. Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m kwuru mgbe m sị na agaghị m erikwa nri a ọzọ tutuu e mezuo ihe nri a nọchịrị anya ya nꞌalaeze Chineke.” Mgbe ahụ o buuru iko mmanya nye Chineke ekele nꞌihi ya. O bunyere ndị na-eso ụzọ ya iko ahụ sị ha, “Burunụ iko mmanya a ṅụọ unu nile, nꞌihi na eziokwu ka m na-ekwu na site nꞌụbọchị taa gaa nꞌihu, agaghị m aṅụkwa ụdị mmanya a ọzọ tutuu ruo mgbe alaeze Chineke bịara.” O wekwaara beredi dị nꞌebe ahụ kelee Chineke ekele nꞌihi ya, nyawaa ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nke a bụ anụ ahụ m nke a na-enye nꞌihi unu. Meenụ nke a mgbe nile icheta m.” Nꞌụzọ dị otu ahụ kwa, o buliri iko mmanya mgbe ha risiri nri anyasị kwuo okwu sị, “Mmanya a nọchiri anya ọbara m nke a na-awụsị nꞌihi unu, ime ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ Chineke guzosie ike. Ma, achọrọ m ka unu mata na ebe a anyị nile nọkọrọ, onye ga-arara m nye nꞌaka ndị ga-egbu m, so m ugbu a, na-eri nri. Mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ na-aga ịnwụ dị ka Chineke kpebiri. Ma ahụhụ dịrị onye ahụ e sitere nꞌaka ya rara m nye.” Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịjụrịta onwe ha ajụjụ ịchọpụta onye ọ bụ nꞌime ha nke ga-arara ya nye. Mgbe ahụ kwa ha bidoro ịrụ ụka nꞌetiti onwe ha ịchọpụta onye ka ibe ya ukwuu. Jisọs gwara ha okwu sị, “Ndị eze mba dị nꞌụwa na-eji aka ike na-achị ndị nọ nꞌokpuru ha. Otu aka ahụ kwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ. Ma nꞌebe unu nọ ọ gaghị esi otu a dịrị. Kama ka onye kachasị ibe ya ukwuu nꞌime unu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyendu dịrịkwa ka onye na-eje ozi. Ònye ka ibe ya ukwuu? Ọ̀ bụ onye batara nꞌụlọ nọdụ nꞌelu tebulu rie nri, ka ọ bụ onye ahụ na-esi nri, dozie ya nꞌelu tebulu? Unu maara na ọ bụ onye ahụ batara nọdụ rie nri dị ukwuu karịa onye na-esi nri esi. Ma nꞌebe unu nọ, adị m ka onye na-ejere unu ozi. Mụ na unu anọọla nꞌoge ọnwụnwa m nile. Ya mere, dị ka Nna m siri nye m ike ịchị achị, otu a ka m si enyekwa unu ike. Ka unu nwee ike isoro m rie ihe, sorokwa m ṅụọ ihe ọṅụṅụ nꞌalaeze m. Sorokwa m nọdụ nꞌelu ocheeze ikpe ebo iri na abụọ nke Izirel ikpe. “Saimọn, Saimọn, ekwensu arịọla ka e nye ya ohere ịnwa unu ọnwụnwa na ịyọcha unu dị ka nwanyị si ayọcha ọka, ma ekpeelara m gị ekpere, rịọ Chineke, ka o mee ka okwukwe gị sie ike, ka ị hapụ ịda. Mgbe ị tụgharịrị bụrụ onye na-eso m nꞌezie, gbaakwa ụmụnna gị ndị a ume.” Mgbe ahụ ha gwara ya sị, “Onyenwe anyị, lee, anyị nwere mma agha abụọ.” Jisọs zara ha sị, “Nke ahụ ezuole.” Ma Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m, si na ị maghị onye m bụ, ugbo atọ.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego ma ọ bụ akpa, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, ọ̀ dị ihe kọrọ unu?” Ha zara ya sị, “Ihe ọ bụla akọghị anyị.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Ugbu a, ka onye ọ bụla nwere ego were ya, ka onye nwere akpa sere ya. Ọ bụrụkwa na ọ dị onye na-enweghị mma agha, ya ree uwe ya, nweta ego zụrụ otu. Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-asị na ihe ahụ akwụkwọ nsọ kwuru banyere m sị, ‘A gụkọrọ ya na ndị mmehie’, ga-emezu.” Mgbe ahụ ha gwara ya sị, “Onyenwe anyị, lee, anyị nwere mma agha abụọ.” Jisọs zara ha sị, “Nke ahụ ezuole.” Jisọs si nꞌụlọ ahụ pụta, bido ịga nꞌugwu olivu, ebe ọ na-anọ mgbe nile. Ndị na-eso ụzọ ya sokwaara ya. Nꞌebe ahụ ọ gwara okwu sị, “Kpeenụ ekpere rịọọ Chineke, ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.” Ọ hapụrụ ha gaa nꞌihu nke nta, ebe dị anya ntakịrị site nꞌebe ha nọ, gbuo ikpere nꞌala kpeere Chineke ekpere. Nꞌekpere ya, ọ rịọrọ Chineke sị, “Nna, ọ bụrụ na ị chọrọ, napụ m iko a. Otu ọ dị, ọ bụghị ihe m chọrọ ka a ga-eme, kama ka ihe ọ bụla ị chọrọ mezuo.” Nꞌoge ahụ Chineke sitere nꞌeluigwe zite ndị mmụọ ozi bịara gbaa ya ume. Nꞌime obi nke jupụtara nꞌihe mgbu, Jisọs kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nꞌahụ na-adapụ nꞌala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara. Mgbe o kpechara ekpere, o biliri ọtọ, bịakwute ndị na-eso ụzọ ya, hụ na ha na-arahụ ụra, nꞌihi na obi adịghị ha mma. Jisọs kpọtere ha sị, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.” Mgbe ọ kpụ okwu a nꞌọnụ, o leliri anya hụ igwe mmadụ ka ha na-abịa nꞌebe ọ nọ. Ọ bụ nwoke a na-akpọ Judas otu nꞌime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya du ha. Mgbe ha bịarutere Jisọs nso, Judas pụtara bakụọ Jisọs sutu ya ọnụ. Ma Jisọs jụrụ Judas ajụjụ sị, “Judas, ọ̀ bụ site nꞌisutu m ọnụ ka i ji arara m nye?” Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ na ọ bụ Jisọs ka igwe mmadụ ahụ bịara ijide, ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onyenwe anyị, mma agha dị nꞌebe a. Anyị ga-eji ya lụso ha ọgụ?” Otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya jiri mma agha gbupụ ntị otu onye na-ejere onyeisi nchụaja ozi. Ma Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “O zuola! Unu egbukwala onye ọ bụla mma ọzọ!” Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị gwa ndị isi nchụaja ahụ, na ndị isi agha ahụ na-eche ụlọ nsọ ukwu ahụ, na ndị okenye ahụ bịara ijide ya okwu sị, “Ùnu chịịrị mma agha na osisi bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike? Ụbọchị nile ka mụ na unu na-anọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma nke a bụ oge unu, mgbe Chineke kpebiri inye ekwensu ohere igosi ike ya.” Mgbe ahụ ha jidere Jisọs duru ya pụọ. Ha duuru ya gaa nꞌụlọ onyeisi nchụaja. Pita so ha nꞌazụ. Kama ọ nọ nꞌazụ azụ, nꞌebe dị anya. Ndị agha kwanyere ọkụ nꞌetiti ezi nke ụlọ onyeisi nchụaja ahụ, nọdụ ya gburugburu na-anya ọkụ. Pita batara soro ha nọdụ. Otu nwagbọghọ na-eje ozi nꞌebe ahụ pụtara hụ Pita ebe ọ nọdụrụ na-anya ọkụ. O legidere Pita anya sị, “Onye a bụkwanụ otu nꞌime ndị na-eso Jisọs.” Ma Pita gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.” Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ pụtakwara hụ Pita sị ya, “Ị bụ otu nꞌime ndị na-eso Jisọs.” Ma Pita kwuru sị, “Enyi m, abụghị m otu nꞌime ha.” Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike sị, “Nꞌezie, nwoke a bụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs. Lee, ọ bụkwa onye Galili.” Ma Pita zara ya sị, “Enyi, amaghị m ihe ị na-ekwu okwu banyere ya.” Otu mgbe ahụ, mgbe Pita kpụ okwu ya nꞌọnụ, oke ọkụkọ kwara akwa. Jisọs tụgharịrị lee Pita anya. Mgbe ahụ kwa Pita chetara okwu ahụ Jisọs gwara ya. Nꞌihi na ọ gwara Pita sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa taa, ugbo atọ ka ị ga-agọnarị m.” Pita sitere nꞌebe ahụ pụọ, gaa kwaa nnọọ akwa. Ndị ahụ jidere Jisọs bidoro iji ya ime ihe ọchị na iti ya ihe. Ha jiri akwa kechie anya ya abụọ bido na-ajụ ya ajụjụ mgbe ha na-eti ya ihe sị, “Gwa anyị, ọ bụ onye tiri gị ihe?” Ha kwukwara ọtụtụ okwu ọjọọ megide ya, na-akparịkwa ya. Mgbe chi bọrọ, ndị okenye ndị Juu na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu zukọrọ. A kpọtara Jisọs nꞌihu ha. Mgbe ahụ ha bidoro ịjụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Onye nzọpụta ahụ, gwa anyị.” Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwenye. Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ unu agaghị aza m. Ma ka m gwa unu nke a, site taa gaa nꞌihu, Mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ, ga-anọdụ nꞌocheeze ahụ dị nꞌaka nri Chineke.” Mgbe ahụ ha bidoro ịjụ ya ajụjụ sị, “Ihe ị na-ekwu ọ bụ na ị bụ Ọkpara Chineke?” Jisọs zara sị ha, “Ee, ọ bụ dị ka unu si kwuo ya.” Ha nile tiri mkpu nꞌiwe sị, “Ọ̀ dị mkpa ịchọ ndị akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ okwu si ya nꞌọnụ pụta!” Mgbe ahụ ọha mmadụ ahụ nile biliri duru Jisọs ijekwuru Paịlet. Mgbe ha ruru nꞌihu Pailet ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị ala anyị. Ọ na-ezi ha na o zighị ezi ịtụ ụtụ taksị nye Siza. Ọ na-agwakwa ha na ya onwe ya bụ Kraịst, bụrụkwa eze.” Pailet jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Ị̀ bụ Kraịst, eze ndị Juu?” Jisọs zara sị ya, “Ee, ọ bụ dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ Pailet chigharịrị gwa ndị isi nchụaja na igwe mmadụ ahụ zukọrọ nꞌebe ahụ okwu sị ha, “Lee, o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m chọpụtara nwoke a mere.” Ma ha nọgidere gwasie ya okwu ike sị ya, “Nwoke a na-akwalị ndị Juu nile inupụ isi. Na Galili ka ọ malitere izi ihe. O ziekwala ndị Juda nile ozizi nnupụ isi ya. Ugbu a, o webatakwala ozizi ya nꞌebe a.” Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a ha kwuru, ọ jụrụ ha sị, “Nwoke a ọ̀ bụ onye Galili?” Mgbe ha gwara ya na Jisọs bụ onye Galili, o nyere iwu ka e duru ya jekwuru Herọd, bụ eze, onye ọchịchị ala Galili dị nꞌaka. Nꞌoge a Herọd nꞌonwe ya nọkwa na Jerusalem. Obi tọrọ Herọd ụtọ mgbe ọ hụrụ Jisọs nꞌihi na ọ dịlarị anya kemgbe ọ chọrọ ịhụ ya anya ihu na ihu. Nꞌihi na ọ nụla ọtụtụ akụkọ banyere Jisọs. O lekwara anya na Jisọs ga-arụ ọrụ ịrịba ama nꞌihu anya ya. Ọ nụla akụkọ Jisọs, nꞌihi ya o nwere olileanya na Jisọs ga-arụrụ ya ụfọdụ nꞌime ọrụ ebube ahụ ọ na-arụ. Ya mere, mgbe Jisọs bịakwutere Herọd, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ banyere ihe ụfọdụ, ma Jisọs asaghị ya ihe ọ bụla. Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nọ nꞌebe ahụ na-ebọ Jisọs ọtụtụ ebubo ihe ọjọọ ha sị na o mere. Herọd na ndị agha ya jiri Jisọs mee ihe ọchị, na-akwa ya emu. Mgbe ha yikwasịchara ya uwe mara mma, ụdị nke ndị eze na-eyi, ha dukwaara ya ọzọ jekwuru Pailet. Site nꞌụbọchị ahụ gaa nꞌihu Herọd na Pailet bidoro bụrụkwa ezigbo enyi ọzọ. Tupuu ruo oge a, ha na-eburitara ibe ha iro. Mgbe ahụ a kpọghachiri Jisọs, Pailet kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị na-achị ndị Juu gwa ha okwu sị, “Unu kpọtaara m nwoke a nꞌihi na unu sị na ọ na-eduhie ndị mmadụ. Ugbu a ajụọla m ya ajụjụ nꞌihu unu, chọpụta na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla o mere. Herọd nꞌonwe ya kwa achọpụtaghị ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere. Ọ bụ nꞌihi nke a ka o jiri zighachiri m ya. Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla o mere nke pụrụ iwetara ya amamikpe ọnwụ. Ya mere, aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.” Nꞌoge mmemme ngabiga ọ bụla, Pailet na-ahapụrụ ndị Juu onye mkpọrọ ọ bụla ha chọrọ. Ma nꞌoge a, igwe mmadụ ahụ bidoro iti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ọgba aghara e nwere nꞌobodo Jerusalem. E tinyekwara ya nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi na o gburu mmadụ. Ebe Pailet chọsịrị ike ịhapụ Jisọs ka ọ laa, ọ gwakwara ndị ahụ okwu ọzọ. Ma ha nile tiri mkpu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe! Kpọgide ya nꞌobe!” Pailet gwakwara ha okwu nke ugbo atọ sị, “Gịnị mere unu ji chọọ ka nwoke a nwụọ? Gịnị bụ ihe ọjọọ o mere? Achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke ga-ewetara ya ọnwụ. Aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.” Ma ha nọgidere na-eti mkpu nꞌoke olu, na-akpọku Pailet ka a kpọgbuo Jisọs. Nꞌikpeazụ. Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ. Ọ mara Jisọs ikpe ọnwụ dị ka ha chọrọ. Ọ hapụrụ Barabas onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ọgba aghara na nꞌihi igbu ọchụ dị ka ndị mmadụ chọkwara. Ma o nyefere ha Jisọs nꞌaka. Mgbe ha duuru Jisọs na-aga ebe ha ga-anọ kpọgide ya nꞌobe, ha zutere otu nwoke aha ya bụ Saimọn onye obodo Sirini. O si nꞌime obodo a na-abịa Jerusalem. Ha kwagidere ya bokwasị ya obe ahụ ka ọ buru ya na-eso Jisọs nꞌazụ. Ọtụtụ ndị mmadụ, ma ụmụ nwanyị, sooro ya. Ụmụ nwanyị ndị a na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa nꞌihi Jisọs. Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụ nwanyị Jerusalem, unu eberela m akwa, kama berenụ ụmụ unu akwa. Nꞌihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ọ dịrị unu mma unu ụmụ nwanyị ndị na-enweghị ụmụ, na unu ndị na-amụtaghị ụmụntakịrị, na unu ndị na-enyebeghị ụmụntakịrị ara mbụ.’ Nꞌoge ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-akpọku ugwu buru ibu sị ya, ‘Dakwasị anyị,’ ha ga-akpọkwa ugwu nta sị ya, ‘Kpuchie anyị, zookwa anyị.’ Ọ bụrụ na ihe na-esiri osisi dị ndụ ike, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ya mgbe ọ kpọrọ nkụ.” Mmadụ abụọ ọzọ, bụ ndị na-emebi iwu ka e dukwa nꞌụbọchị ahụ igbu ha na Jisọs. Mgbe ha bịarutere ebe a na-akpọ, “Ebe Okpokoro isi,” ebe ahụ ka ha nọ kpọgide ya nꞌobe. Ha kpọgidekwara mmadụ abụọ ahụ na-emebi iwu nꞌobe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌakụkụ aka nri Jisọs, nke ọzọ nꞌakụkụ aka ekpe ya. Mgbe ha kpọgidechara ha nꞌelu obe, Jisọs kwuru okwu sị, “Nna, gbaghara ha nꞌihi na ha aghọtaghị ihe ha na-eme.” Ndị agha kere uwe ya nꞌetiti onwe ha. Ha fere nza ịchọpụta onye ga-ewe nke ọ ga-ewe. Ọtụtụ mmadụ guzoro na-ele Jisọs anya. Kama ndị ndu ndị Juu nọ na-achị ya ọchị. Ha gwara ya okwu sị, “Leenụ ya ugbu a! Ọ na-azọpụta ndị ọzọ ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. A sị na ọ bụ Onye nzọpụta, onye Chineke họpụtara, ya zọpụtanụ onwe ya.” Ndị agha ahụ chịrị ya ọchị, nyekwa ya mmanya gbara ụka ka ọ ṅụọ. Ha gwara ya sị, “Ị bụrụ eze ndị Juu zọpụta onwe gị!” O nwere ihe e dere kụpanye nꞌelu obe ahụ. Nke a bụ ihe e dere, “Onye a bụ eze ndị Juu.” Otu nꞌime ndị na-emebi iwu ahụ a kpọgidere nꞌelu obe nꞌụbọchị ahụ kwujọkwara Jisọs sị ya, “Ana m eche na ị bụ Onye nzọpụta. Zọpụtanụ onwe gị, zọpụtakwa anyị!” Ma onye nke ọzọ ahụ na-emebikwa iwu baara ya mba sị ya, “Ị̀ dịghị atụ egwu Chineke? Ọ̀ bụghị otu ụdị ahụhụ ahụ ka anyị nile nọ nꞌime ya? Ma anyị kwesịrị ịnata ahụhụ a na-ata anyị nꞌihi na anyị na-ahụ ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọ bụla.” Mgbe ahụ ọ gwara Jisọs sị ya, “Onyenwe m, cheta m mgbe i bidoro ịchị alaeze gị.” Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, taa, ka ị ga-eso m nọdụ na Paradaịs.” Ihe dị ka elekere iri na abụọ eruola nꞌoge a. Ọchịchịrị gbachikọtara ebe nile nꞌala ahụ site nꞌoge ahụ ruo nꞌelekere atọ nke ehihie. Anwụ enyekwaghị ìhè ya. Akwa mgbochi dị nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem gbawara ụzọ abụọ site nꞌelu ruo nꞌala. Jisọs tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Nna, ọ bụ nꞌaka gị ka m na-etinye mmụọ m.” Mgbe o kwusịrị okwu a, o kubiri ume. Nꞌoge a otu ọchịagha na-achị narị ndị agha guzo nso nꞌebe ahụ. Ọ hụrụ ihe ndị a nile mere, too Chineke sị, “Nꞌezie, aka nwoke a dị ọcha!” Mgbe ndị bịara ile otu a ga-esi kpọgbuo Jisọs hụrụ ihe nile mere, ha hapụrụ ebe ahụ laa nꞌụlọ ha, na-eti aka nꞌobi na mwute. Ndị enyi Jisọs nile, na ụmụ nwanyị si Galili soro ya bịa Jerusalem, guzo nꞌebe dị anya nꞌele ihe ndị a. Ma ọ dị otu nwoke onye Juu a na-akpọ Josef si nꞌobodo a na-akpọ Arimatia. Josef bụ ezigbo mmadụ, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ na onye na-ele anya ọbịbịa alaeze Chineke. Ọ bụkwa otu onye nꞌime ndị na-anọ nꞌụlọ ikpe ukwu ndị Juu, kama ọ kwagideghị mkpebi na mmeso ndị isi ndị Juu kpebiri megide Jisọs site nꞌigbu ya. *** Ọ gara hụ Pailet rịọ ya ka o kwe ya ka o buru ozu Jisọs. Mgbe Pailet nyere ya ike, Josef gara butuo ozu Jisọs site nꞌelu obe ahụ. O ji akwa ọcha dị ogologo kechie ozu ahụ. Emesịa, o nyibere ya nꞌili ọhụrụ o gwuru nꞌime nkume nke a enyisabeghị onye ọ bụla nꞌime ya mbụ. Josef mere ihe ndị a nꞌuhuruchi ụbọchị Fụraịde, nꞌoge ndị mmadụ na-akwado maka ụbọchị Satọde bụ ụbọchị izuike ndị Juu. Ndị nwanyị ahụ si Galili soro Jisọs bịa Jerusalem, sokwa Josef gaa hụ ili ahụ, hụkwa otu o si nyibe Jisọs nꞌime ya. Emesịa, ha lara nꞌụlọ ha, gaa kwadoo ụda na-esi isi ụtọ na mmanụ e ji echekwa ahụ mmadụ ka ọ hapụ isi isi. Nꞌụbọchị izuike ahụ, ha zuru ike dị ka e nyere nꞌiwu. Ma nꞌisi ụtụtụ Sọnde, ha weere mmanụ ahụ na ụda ahụ ha kwadoro bido ịga nꞌili ahụ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ na o nweela onye bupụrụ nkume ahụ buru ibu e ji mechie ọnụ ili ahụ. Ma mgbe ha banyere nꞌime ili ahụ, ha ahụghị ozu Jisọs. Mgbe ha guzo nꞌebe ahụ nꞌọnọdụ mgbagwoju anya, mmadụ abụọ yi uwe ọcha pụtara guzo nso ebe ha nọ. Ha tụrụ ụjọ, kpuo ihu ha nꞌala. Mgbe ahụ mmadụ abụọ ahụ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nꞌetiti ndị nwụrụ anwụ? Chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili. Ọ gwara unu na a ga-arara ya nye nꞌaka ndị mmehie ndị ga-akpọgide ya nꞌobe, na ya ga-esikwa nꞌọnwụ bilie ọzọ nꞌụbọchị nke atọ ya.” Ụmụ nwanyị ahụ chetara na ọ bụ ihe Jisọs gwara ha. Ha sitere nꞌili ahụ pụọ laghachikwuru mmadụ iri na otu ahụ na-eso ụzọ Kraịst, kọọrọ ha ihe mmadụ abụọ ahụ gwara ha. Ọ bụ Meri Magdalin na Joana na Meri nne Jemes na ụmụ nwanyị ndị ọzọ jere nꞌili ahụ, lọtara bịa kọọrọ ndị ozi ahụ ihe ha hụrụ. Ma akụkọ ụmụ nwanyị a lọtara bịa kọọrọ ha dị ha ka ọ bụ akụkọ ifo. Ha ekwenyeghị nꞌokwu ahụ. Otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ gaa nꞌili ahụ ka o jiri anya ya hụ ihe mere. Mgbe o ruru, o hulatara ala nyoo anya nꞌime ili ahụ hụ akwa ahụ e ji kee ahụ Jisọs ka ọ tọgbọ nꞌala. Mgbe ọ hụrụ ihe ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ laghachi azụ nꞌụlọ, na-echekwa echiche banyere ihe ndị ahụ mere. Nꞌụbọchị ahụ kwa, mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs si na Jerusalem na-aga obodo nta a na-akpọ Emaus nke rukwara kilomita iri na abụọ site na Jerusalem. Mgbe ha na-aga nꞌụzọ, ha na-ekwurịta okwu banyere ihe nile mere. Ọ dịghị anya, Jisọs bịara ha nso, soro ha na-aga nꞌụzọ Emaus ahụ. Ma Chineke mere ka mmadụ abụọ ahụ hapụ ịmata na ọ bụ Jisọs ka ha na ya so. Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịjụ ha ajụjụ sị, “Akụkọ gịnị ka unu na-akọ?” Mmadụ abụọ ahụ kwụsịrị ịga ije mgbe ajụjụ a dara. Onye lere ha anya nꞌihu ga-ama nꞌezie na ha nọ nnọọ nꞌiru uju. Mgbe ahụ otu onye nꞌime ha aha ya bụ Kliopas zara Jisọs sị, “Ị̀ na-akọwa na ị maghị ihe ọ bụla banyere ihe nile a mere na Jerusalem nꞌizu ụka gara aga? Ị ga-abụkwanụ nnọọ onye ọbịa ma ọ bụrụ na ị maghi ihe ndị a!” Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe ndị a unu sị na o mere?” Ha zara ya sị, “Ihe dakwasịrị Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma rụrụ ọrụ ebube dị iche iche, onye kwukwara okwu na-atụghị egwu. Onye, ọ bụladị Chineke na mmadụ na-asọpụrụ. Ma ndị isi nchụaja anyị na ndị ọchịchị anyị nyefere ya nꞌaka ndị Rom, ka ha maa ya ikpe ọnwụ, kpọgbuokwa ya nꞌobe. Anyị na rị ele anya na ọ bụ ya bụ onye Chineke zitere ịgbapụta Izirel. Ma nke ka nke, taa mere ya ụbọchị atọ kemgbe a kpọgburu ya. Ma ụfọdụ nꞌime ụmụ nwanyị si nꞌotu anyị, ndị na-eso Jisọs mgbe ọ dị ndụ, bịara kọọrọ anyị akụkọ juru anyị anya. Nꞌụtụtụ a ha gara nꞌili ebe e nyibere Jisọs, lọta kọọrọ anyị na ha ahụghị ozu ya. Ha gwakwara anyị na ha hụrụ ndị mmụọ ozi ndị gwara ha na Jisọs dị ndụ! Ụfọdụ nꞌime ndị ikom so nꞌotu anyị gara nꞌili ahụ chọpụta na ihe ụmụ nwanyị ahụ kwuru bụ eziokwu, ma ha ahụghị Jisọs.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ịnabata ihe ndị amụma kwuru. Ọ̀ bụ na ndị amụma ekwughị ya nꞌụzọ pụtara ìhè na Kraịst ga-esi otu a hụọ ahụhụ, tupuu ọ banye nꞌebube ya?” Mgbe ahụ Kraịst sitere nꞌakwụkwọ nsọ kọwaara ha ihe akwụkwọ nsọ kwuru banyere ya onwe ya. O sitere nꞌakwụkwọ nke Mosisi dere ruo nꞌakwụkwọ nile ndị amụma dere. Ha na Kraịst gagidere ije tutuu ha eruo Emaus, obodo nta ahụ ha na-aga. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Jisọs mere dị ka ọ ga-aga nꞌihu nꞌije ya. Ma mmadụ abụọ ahụ rịọrọ ya sị, “Nọnyerenụ anyị, nꞌihi na chi ebidola iji.” Jisọs soro ha baa nꞌụlọ ịnọnyere ha. Nꞌoge ha nọdụrụ ala iri nri anyasị, Jisọs were beredi kelee Chineke ekele, ọ nyawara ya nye ha ka ha rie. Nꞌoge ahụ kwa Chineke meghere anya ha, mee ka ha ghọta na ọ bụ Jisọs ka ha na ya nọ. Ma nꞌotu mgbe ahụ ha matara na ọ bụ ya, Jisọs gbara barịị, fuo. Ha ahụkwaghị ya anya ọzọ. Mgbe ahụ mmadụ abụọ ahụ bidoro ịgwarịta onwe ha okwu sị, “Ọ̀ bụ na obi anyị ejupụtaghị nꞌọṅụ mgbe anyị na ya nọ nꞌụzọ ọ na-akọwara anyị ihe dị nꞌakwụkwọ nsọ?” Nꞌotu oge ahụ, ha hapụrụ Emaus bido ịlaghachi Jerusalem. Mgbe ha ruru, ha hụrụ ndị ozi iri na otu ahụ na ndị ọzọ nọ nꞌebe ahụ, ndị gwara ha okwu sị, “Onyenwe anyị esitela nꞌọnwụ bilie nꞌezie, o gosila Saimọn onwe ya!” Mgbe ahụ ha gwara ndị ahụ ihe nile mere mgbe ha na-aga nꞌụzọ, na otu ha si ghara ịmata na ọ bụ Jisọs na-agwa ha okwu tutuu ruo nꞌoge ha hụrụ ya ka ọ nyawara beredi ahụ. Mgbe ha nọ na-ekwu okwu ndị a, Jisọs, onye ha na-ekwu okwu ya, batara nꞌụlọ ahụ guzo nꞌetiti ha, sị ha, “Udo dịrị unu.” Mgbe ha hụrụ ya, ụjọ dị ukwuu tụrụ ha, nꞌihi na ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha hụrụ. Ma Jisọs zara ha sị, “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu? Gịnị mere unu ji na-enwe obi abụọ? Leenụ anya nꞌaka m! Leekwanụ anya nꞌụkwụ m! Ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ahụ. Metụnụ m aka chọpụtanụ ihe m bụ nꞌonwe unu, nꞌihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ dị ka m nwere.” Mgbe ọ nọ na-agwa ha okwu ndị a, o setipụrụ aka ya gosi ha apa ntu dị ya nꞌaka. O gosikwara ha ụkwu ya ka ha hụrụ ọnya dị ya. Ma o siiri ndị na-eso ụzọ ya ike inwe mkpebi na ọ bụ ya nꞌezie. Ọṅụ jupụtara obi ha, ma otu aka ahụ kwa, ha jupụtara nꞌobi abụọ. Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ha sị, “Ọ dị ihe oriri unu nwere?” Ha nyere ya ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. Ọ naara ya rie ya nꞌihu ha nile. Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Mgbe mụ na unu nọ, agwara m unu na ihe nile Mosisi na ndị amụma dere banyere m, na ihe e dekwara nꞌAbụ Ọma ga-emezucha.” Mgbe ahụ o meghere akọnuche ha, ime ka ha ghọta ihe nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ banyere ya. Ọ gwara ha sị, “E dere ya rị nꞌoge gara aga na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ, nwụọ, na ọ ga-ebilikwa nꞌụbọchị nke atọ. E dekwara ya sị na a ga-ekwusara ndị mmadụ otu ha ga-esi chegharịa nweta mgbaghara site nꞌịtụkwasị m obi. A ga-ekwusa ya nye mmadụ nile na mba nile, bido na Jerusalem. Unu bụkwa ndị akaebe na ihe nile ndị amụma kwuru emezuola. “Ma nọdụnụ nꞌobodo Jerusalem a tutuu Mmụọ Nsọ abịa mejupụta unu nꞌike. Nꞌihi na aga m ezite ya ka ọ bịakwasị unu dị ka Nna m kwere nkwa ime.” Mgbe Jisọs gwasịrị ndị na-ezo ụzọ ya okwu a, o duuru ha gaa Betani. Nꞌebe ahụ ka ọ nọ welie aka ya elu gọzie ha. Mgbe Jisọs nọ na-agọzi ha, e bidokwara iweli ya elu tutuu ruo mgbe ha na-ahụkwaghị ya anya ọzọ. Ndị na-eso ụzọ ya kpọrọ isi ala nye ya nꞌọnọdụ ife ya ofufe. Emesịa ha lọghachiri na Jerusalem; oke ọṅụ jukwara ha obi. Ha nọgidere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ oge nile, na-eto Chineke. Site na mmalite ihe nile, Okwu ahụ dị. Okwu ahụ na Chineke nọkwa, Okwu ahụ bụkwa Chineke. Site nꞌoge ihe nile bidoro, Okwu ahụ na Chineke nọkwa. E kere ihe nile site nꞌaka ya. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla e kere eke nke a na-ekeghị site nꞌaka ya. Nꞌime ya ka ihe nile nwere ndụ siri nwee ndụ ha, nꞌihi nke a, ndụ ahụ dị nꞌime ya na-enyekwa ndị nile bi nꞌụwa ìhè. Ezi ndụ ahụ dị nꞌime ya bụ ìhè na-enwu nꞌime ọchịchịrị. Ọchịchịrị ọ bụla enwebekwaghị ike ịmenyụ ìhè ahụ dị nꞌime ya. Ọ dị otu nwoke Chineke zitere a na-akpọ Jọn. Jọn bịara ka ọ kọwaara mmadụ nile ihe banyere ìhè ahụ. Jọn nꞌonwe ya abụghị ìhè ahụ. Ọ bụ nanị onye gbara ama kọwaakwa ihe banyere ìhè ahụ. Nꞌikpeazụ, Okwu ahụ bụ ìhè nke ụwa, bịara nꞌụwa. Ọ bịara inye onye ọ bụla bi nꞌụwa ìhè. Ọ bịara nꞌụwa, bụ ụwa ahụ o kere nꞌonwe ya, ma ụwa amaghị ya. Ọ bịara nꞌụwa ahụ bụ nke aka ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya. Ma ndị nile naara ya, ndị nile kweere nꞌaha ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ Chineke. A mụghị ndị a kweere na ya site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, ma ọ bụ site nꞌọchịchọ nwoke, ma ọ bụ site na ntụpụta mmadụ, kama ịmụ ọzọ a sitere na Chineke nꞌonwe ya. Okwu ahụ ghọrọ mmadụ, gbokwasị onwe ya ọdịdị mmadụ, sorokwa mmadụ bikọọ nꞌụwa a. O jupụtara nꞌamara na eziokwu. Anyị hụkwara ebube ya, ebube ahụ a pụrụ ịhụ nanị na ndụ onye bụ Ọkpara Chineke Nna nke eluigwe. Jọn omee baptizim mere ka igwe mmadụ ahụ nile mata Kraịst mgbe o tiri mkpu sị, “Lee! Onye a bụ onye ahụ m gwara unu ihe banyere ya, sị, onye dị ukwuu karịa m na-abịa, ọ dị ukwuu karịa m nꞌihi na ọ na-adị rị tupuu amụọ m.” Anyị sitere nꞌaka ya nata amara pụrụ iche, nꞌokpukpu nꞌokpukpu, amara sitere nꞌeluigwe bịa. Nꞌihi na iwu sitere nꞌaka Mosisi bịa, ma ugbu a, Jisọs Kraịst ewetarala anyị amara na eziokwu. Ọ dịbeghị onye ọ bụla ji anya ya hụ Chineke anya mgbe ọ bụla, ma Jisọs Kraịst, onye nanị ya bụ Ọkpara Chineke, bụrụkwa onye ya na Chineke nọ rị site na mbụ egosila anyị onye Chineke bụ, meekwa ka anyị mata ya. Mgbe ahụ ndị isi ndị Juu bi na Jerusalem zigara ụfọdụ ndị nchụaja ụlọ nsọ ukwu Chineke, na ndị Livayị naeje ozi nꞌụlọ nsọ ahụ, ka ha bịakwute Jọn, jụọ ya ajụjụ sị, “Ị bụ onye?” Ma Jọn omee baptizim ezoghị ihe ọ bụla nꞌebe ha nọ. Kama ọ gwaghere ha ọnụ sị ha, “Mụ onwe m abụghị m Onye nzọpụta ahụ.” Ma ndị nchụaja ahụ jụrụ Jọn ajụjụ ọzọ sị ya, “Onye kwanụ ka ị bụ? Ị̀ bụ Ịlaịja?” Jọn zara ha sị, “É,è, abụghị m Ịlaịja.” Ha jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ị̀ bụ onye amụma ahụ Mosisi gwara anyị ihe banyere ya?” Jọn zakwara sị ha, “Ọ dịghị! Abụghị m onye amụma ahụ unu na-ekwu ihe banyere ya.” Ndị nchụaja ahụ jụrụ Jọn ajụjụ ọzọ sị ya, “Onye kwanụ ka ị bụ? Biko gwa anyị eziokwu ka anyị nweta ọsịsa dị mma anyị ga-asa ndị zitere anyị.” Mgbe ahụ Jọn gwara ha sị, “Abụ m nanị olu na-eti mkpu nꞌọzara na-asị, ‘Jikerenụ nꞌihi ọbịbịa nke Onyenwe anyị!’ Nke a bụ mmezu amụma ahụ Aịzaya buru nꞌoge ya.” Ndị nchụaja ahụ e zipụrụ ịjụ Jọn ajụjụ a sitere nꞌetiti ndị Farisii bịa. Ha jụrụ Jọn ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụrụ na ị bụghị Onye nzọpụta ahụ, ma ọ bụ Ịlaịja, ma ọ bụ onye amụma ahụ, gịnị mere i ji eme ọtụtụ mmadụ baptizim?” Jọn zara sị ha, “Ana m eji mmiri efu eme mmadụ baptizim, ma ọ dị otu nwoke guzo nꞌetiti unu onye unu naamataghị, onye ga-ebido ọrụ ya nꞌoge na-adịghị anya site ugbu a. Ọ bụkwa ihe banyere ya ka m na-agwa unu. Nꞌezie, eturughi m ịtọghepụ eriri dị nꞌakpụkpọ ụkwụ ya.” Ihe ndị a nile mere nꞌobodo nta a na-akpọ Betani nke dị nꞌofe mmiri osimiri Jọdan. Nꞌebe ahụ ka Jọn nọ naeme ndị mmadụ baptizim. Nꞌechi ya, mgbe Jọn hụrụ Jisọs ka ọ na-abịa nꞌakụkụ ebe ọ nọ, o tiri mkpu sị, “Lee Nwa atụrụ Chineke, onye naebupụ mmehie ụwa! Onye a bụ onye ahụ m gwara unu ihe banyere ya. Chetanụ na m gwara unu sị, ‘Nꞌoge na-adịghị anya otu onye dị ukwuu karịa m ga-abịa. Ya onwe ya bukwa ụzọ dịrị. Ọ na-adịkwa ruo mgbe nile ebighị ebi.’ Amatakwaghị m na ọ bụ ya. Kama ana m eme-ndị mmadụ baptizim ebe a ka ọ dịrị m mfe igosi ya nye ndị Izirel nile.” Nke a bụ ama Jọn gbara: “Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Mmụọ Nsọ ka ọ rịdatara dị ka nduru bekwasị nwoke a nꞌisi. “Ma amaghị m onye nwoke a bụ. Kama Chineke, onye zitere m ime ndị mmadụ baptizim ebe a, gwara m sị, ‘Onye ahụ Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị nꞌisi, bụ onye ahụ unu na-ele anya ya. Ọ bụkwa onye ndị mmadụ ga-esite nꞌaka ya nata Mmụọ Nsọ.’ Ihe ndị a nile mezuru nꞌahụ nwoke a. Nꞌihi nke a ana m agbasi ama ike na nwoke a bụ Ọkpara Chineke nꞌeziokwu.” Nꞌechi ya kwa, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya, guzoro nꞌotu ebe. Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe nꞌebe ahụ ha nọ, o legidere ya anya sị, “Lee Nwa atụrụ Chineke!” Mgbe mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, ha tụgharịrị soro Jisọs. Jisọs lere anya nꞌazụ hụ ka mmadụ abụọ ahụ na-eso ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka unu na-achọ?” Ha zara ya sị, “Onye ozizi olee ebe i bi?” Jisọs sịrị ha, “Bịanụ ka unu hụrụ.” Nꞌotu oge ahụ, ha sooro Jisọs gaa nꞌebe o bi. Ha sooro ya nọgide nꞌebe ahụ nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ bụ ihe dị ka elekere anọ nke anyasị ka ha jiri zute ya nꞌụbọchị ahụ. Otu nꞌime mmadụ abụọ ahụ hụrụ Jisọs soro ya, bụ Anduru nwanne Saimọn Pita. Anduru siri nꞌebe ahụ pụọ chọta Pita nwanne ya sị ya “Anyị achọtala Onye nzọpụta ahụ.” O duuru Pita bịarute nꞌebe Jisọs nọ. Mgbe Jisọs hụrụ Pita, o legidesịrị ya anya ike gwa ya okwu sị ya, “Ọ bụ ezie na aha gị bụ Saimọn nwa Jọn ma site taa gaa nꞌihu, aha ọhụrụ gị bụ Pita, nke pụtara Nkume!” Nꞌechi ya, Jisọs kpebiri ijeru Galili. Mgbe o ruru ebe ahụ ọ hụrụ Filip gwa ya okwu sị ya, “Soro m.” Filip a bụkwa onye Betsaida, nke bụkwa obodo Anduru na Pita. Emesịa, Filip pụrụ chọta nwoke a ana-akpọ Nataniel gwa ya sị, “Anyị ahụla Onye nzọpụta ahụ. Onye ahụ Mosisi na ndị amụma kwuru ihe banyere ya, Jisọs nwa Josef, onye obodo Nazaret.” Ma Nataniel zara Filip sị ya, “Gịnị ka ị na-ekwu? Ị̀ sị na ọ bụ Nazaret? Ọ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isite na Nazaret pụta?” Filip zara sị ya, “Bịa ka ị chọpụta nꞌonwe gị.” Mgbe Jisọs hụrụ Nataniel ka ọ na-abịa nso ebe ọ nọ, ọ sịrị, “Lee! Nke a bụ nwa afọ Izirel nꞌeziokwu! Aghụghọ ọ bụla adịghị nꞌime ya!” Nataniel jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Ì si aṅaa mata onye m bụ?” Ma Jisọs zara ya sị, “Tupuu Filip akpọọ gị, ahụrụ m gị ka ị nọ nꞌokpuru osisi fiigi ahụ.” Nataniel zara sị ya, “Onyenwe anyị, nꞌeziokwu ị bụ Ọkpara Chineke ahụ! Ị bụkwa Eze Izirel!” Jisọs jụrụ Nataniel ajụjụ sị, “Ì kweere na m bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌihi na m gwara gị na m hụrụ gị nꞌokpuru osisi fiigi ahụ? Nꞌezie, ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a, nke pụrụ igosi gị na mụ onwe m bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌeziokwu. Ị ga-ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arigo naarịdatakwa ịbịakwute m bụ Onye nzọpụta.” Mgbe ụbọchị abụọ gafere e nwere ọlụlụ dị na nwụnye nꞌobodo Kena nke dị na Galili. Nne Jisọs nọ nꞌebe ahụ. A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịa na mmemme ọlụlụ di na nwụnye ahụ. Ọ dịghị anya mgbe ha nọ nꞌebe ahụ, mmanya ha na-aṅụ gwụrụ. Nne Jisọs bịakwutere ya gwa ya sị, “Mmanya ha agwụchaala!” Ma Jisọs zara nne ya sị, “Nne, nke a abụghị nsogbu m. Oge m ji eme ihe ịrịba ama erubeghị.” Nne ya gwara ndị na-eje ozi nꞌebe ahụ sị, “Ihe ọ bụla ọ sị unu mee, meenụ ya.” Nꞌụlọ ahụ ha nọ, a dọbara ite mmiri isii buru ibu. Otu nꞌime ite ndị a na-eri ihe dị ka iri lita mmiri ạnọ. Nꞌime ite a ka ndị Juu na-agbanye mmiri ha ji asa ụkwụ ha, na aka ha, na ihu ha, tupuu ha ekpee ekpere. Jisọs gwara ndị na-eje ozi ahụ okwu sị, “Kujuonụ ite ndị a na mmiri!” Ndị ahụ mere ihe ọ gwara ha. Emesịa Jisọs sịrị ha, “Sitenụ nꞌime ite a kuru ihe ọṅụṅụ bulaara onyeisi oche oriri ọlụlụ di na nwụnye a!” Ha mekwara ihe Jisọs gwara ha. Mgbe onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ, (ma ọ maghị ebe o si pụta nanị ndị na-eje ozi maara), ọ kpọrọ di nwanyị ọhụrụ ahụ sị ya, “Nꞌoge mmemme ọ bụla, a na-eburu ụzọ nye mmanya dị ụtọ. Mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ruo na mgbe ‘Kama mmanya dọrọ nꞌite ka ọ dọrọ nꞌafọ,’ e bido na-ebupụta mmanya na-adịghị ụtọ. Ma i meghị nke a! I debere mmanya ọma a ruo ugbu a.” *** Nke a bụ ọrụ ịtụnanya mbụ Jisọs rụrụ nꞌobodo Kena dị nꞌime Galili. Site nꞌihe ịtụnanya a, Jisọs zipụtara ike ya. Ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya. Mgbe oriri ọlụlụ nwụnye ahụ gwụsịrị, Jisọs hapụrụ obodo Kena gaa nꞌobodo Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya. Ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa. Ya na ha nọrọ na Kapanọm ụbọchị ole na ole. Ma mgbe ụbọchị ncheta oriri Ngabiga na-abịaru nso, (mmemme a bụ nke ndị Juu na-eji echeta ụbọchị Chineke napụtara ha nꞌaka ọnwụ nꞌala Ijipti), Jisọs gara Jerusalem. Nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, ọ hụrụ ndị na-azụ ahịa na ndị na-ere ahịa. Ụfọdụ na-ere atụrụ na ehi. Ndị ọzọ na-ere nduru. Ndị ọzọ kwa na-agbanwe ego nke ndị si mba ọzọ jiri bịa Jerusalem. Jisọs weere eriri meere onwe ya ụtarị. O ji ụtarị a chụpụsịa ndị nile na-ere ahịa site nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, ha na atụrụ ha na ehi ha. O kpugharịkwara tebulu ndị na-agbanwe ego mee ka ego ha wufuo nꞌala. Ọ baara ndị ahụ na-ere nduru mba, sị, “Sitenụ nꞌebe a wepụ ihe ndị a! Unu emeela ụlọ nsọ Nna m ebe a na-anọ azụ ahịa!” Nꞌoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya chetara ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ihe banyere ụlọ gị, Chineke, ka mkpụrụ obi m na-achọsi ike.” Ndị Juu nọ nꞌebe ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onye nyere gị ike i ji chụpụ ndị a nꞌezi? Mee ihe ga-egosi anyị na ọ bụ Chineke zitere gị!” Ma Jisọs zara ha sị, “Kwatuonụ ụlọ nsọ a, aga m ewulikwa ya elu nꞌime ụbọchị atọ!” Ndị Juu tiri mkpu sị, “Gịnị? Ụlọ nsọ a anyị ji iri afọ abụọ na ise wuo, ọ bụ ya ka ị sị na ị ga-ewu nꞌabalị atọ?” Ma Jisọs na-ekwurị okwu banyere anụ ahụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị okwu a. Ma mgbe e mere ka Jisọs site nꞌonwụ bilie, okwu a doro ha anya. Mgbe ahụ kwa, ha kweere nꞌakwụkwọ nsọ, na okwu nile Jisọs gwara ha. Nꞌihi ihe ịrịba ama nile Jisọs mere na Jerusalem, igwe mmadụ kweere na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌezie. Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nke iwere onwe ya nye ha, nꞌihi na ọ maara ihe mmadụ nile bụ. Ọ chọghị ka onye ọ bụla gwa ya ihe banyere mmadụ. Nꞌihi na ọ maara ihe dị mmadụ nꞌobi, matakwa na mmadụ pụrụ ịgbanwe mgbe ọ bụla. O nwere otu onyeisi ndị Juu, onye so nꞌotu ndị Farisii, aha ya bụ Nikọdimọs. Nwoke a bịakwutere Jisọs nꞌabalị, sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere nꞌebe Chineke nọ bịa. Nꞌihi na mmadụ ọ bụla apụghị ịrụ ụdị ọrụ ịtụnanya ị na-arụ ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.” Jisọs zara ya sị, “Nꞌezie, asị m gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ ụwa ọhụrụ ahụ Chineke ga-eweta anya.” Nikọdimọs jụrụ ya sị, “Ị̀ sị na ọ bụ ịmụ mmadụ ọzọ? E si aṅaa amụ dimkpa ọzọ? Onye ha ka m ọ pụrụ ịba nꞌafọ nne ya ka a mụọ ya ọzọ?” Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke. Dị ka mmadụ nwere ike mụọ mmadụ ibe ya, otu a kwa, ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ pụrụ ịmụ mmadụ nꞌime Mmụọ Nsọ. Ya ejule gị anya na m sịrị, ‘A ghaghị ịmụ gị ọzọ.’ Dị ka ifufe si efegharị nꞌebe ọ bụla ọ chọrọ, ị na-anụkwa ka ọ na-eme mkpọtụ, ma ị mataghị ebe o si bịa ma ọ bụ ebe ọ na-aga, nꞌụzọ dị otu a, i nweghị ike ịmata otu Mmụọ Nsọ si amụ mmadụ ọzọ.” Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mezuo?” Jisọs sịrị ya, “Ị̀ bụ onye ozizi nke mmadụ nile na-asọpụrụ nꞌIzirel ma ị maghị ihe ndị a? Achọrọ m ka ị mata nke ọma na anyị na-ekwu ihe anyị maara na-agbakwa ama banyere ihe anya anyị hụrụ. Ma unu adịghị anabata ama anyị. Ọ bụrụ na unu ekwereghị nꞌihe ndị a na-eme nꞌetiti mmadụ nꞌime ụwa, unu ga-esi aṅaa kwere ma ọ bụrụ na m agwa unu ihe banyere ihe dị nꞌeluigwe? Ọ gwụchaala Onye nzọpụta ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Ọ bụkwa mụ onwe m bụ ya. Ọ bụkwa m ga-alaghachi azụ nꞌeluigwe. “Dị ka Mosisi siri welie agwọ ahụ elu nꞌelu osisi ahụ nꞌọzara, ime ka ndị lekwasịrị ya anya dịkwa ndụ ọzọ, otu a ka a ga-esi weliekwa Nwa nke mmadụ elu. Ka onye ọ bụla kweere na m ghara ịnwụ, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta. “Ikpe agaghị amakwa ndị nile tụkwasịrị Ọkpara Chineke obi kama ndị nile jụrụ ya, abụrụla rị ndị a mara ikpe, nꞌihi na e kpeela ha ikpe ugbu a. Ha bụkwa ndị ikpe Chineke mara nꞌihi na ha ekwenyeghị nꞌỌkpara Chineke. E mere ka ikpe Chineke ma ha, nꞌihi na ha hụrụ ọchịchịrị nꞌanya karịa ìhè nke si nꞌeluigwe bịa. Nꞌihi na ha bụkwa ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche. Ndị mmehie nile na-agba ọsọ site nꞌìhè ahụ. Ha achọghị ịbịakwute ìhè ahụ nꞌihi na mmehie ha ga-apụta ìhè. Ma onye ọ bụla na-eme eziokwu ahụ na-eji oke ọṅụ bịakwute ìhè ahụ. Ọ na-atọkwa ya ụtọ ka mmadụ nile hụ ọrụ ya, nꞌihi na ọ na-arụ ọrụ ndị a site nꞌike nke Chineke.” Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌime obodo Judia. Ebe ahụ ka ha nọdụrụ abalị ole na ole meekwa ọtụtụ mmadụ baptizim. Otu aka ahụ, Jọn omee baptizim nọkwa nꞌọnụ mmiri a na-akpọ Aenọn nke dị nso nꞌobodo Salim, na-emekwa ọtụtụ mmadụ baptizim, nꞌihi na mmiri buru ibu dị nꞌebe ahụ. Ọtụtụ mmadụ na-abịakwutekwa ya ka o mee ha baptizim. E tinyebeghị Jọn nꞌụlọ mkpọrọ mgbe ihe ndị a na-eme. Nꞌoge a, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jọn na ụfọdụ ndị Juu bidoro ịrụrịta ụka banyere ime mmadụ ka ọ dị ọcha. Nꞌihi nke a ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, lee onye ahụ i gosiri ndị mmadụ nꞌofe nke ọzọ nke osimiri Jọdan, onye ahụ ị gbara ama banyere, ọ nọ ugbu a na-eme ọtụtụ mmadụ baptizim. Igwe mmadụ na-esokwa ya ka o mee ha baptizim.” Ma Jọn kọwaara ha sị, “Nanị Chineke na-esi nꞌeluigwe kenye onye ọ bụla ọrụ nke ọ na-aghaghị ịrụ. Unu nile ga-agbara m ama na m gwara unu na mbụ sị, ‘Abụghị m Onye nzọpụta ahụ.’ Ọrụ m bụ nanị ikwadebere ya ụzọ, na ime ka mmadụ nile mara ya. Nwanyị a na-alụ alụ, bụ akụ di ya (ya bụ onye na-alụ ya). Nwanyị ahụ na-alakwurukwa nwoke ahụ na-alụ ya. Ndị nile bụ enyi nwoke ahụ naesoro ya ṅụrịa ọṅụ. Ya mere, nwoke ahụ kwesịrị ịdị elu nke ukwuu mgbe mụ onwe m na-adị ala. “Onye ahụ si nꞌelu bịa dị ukwuu karịa onye ọ bụla. Onye a mụrụ nꞌụwa bụ mmadụ efu, okwu ya nile bụkwa okwu gbasara ihe dị nꞌụwa. Ma Onye ahụ si nꞌeluigwe bịa dị elu nke ukwuu karịa onye ọ bụla. Ọ na-akọwakwa ihe nile ọ hụrụ na nke ọ nụrụ. Ma o nweghị onye na-anabata ihe ọ na-ekwu. Ma ndị nile na-anabata ozi ọma ya aghaghị ịchọpụta na Chineke bụ onye eziokwu. Nꞌihi na onye ọ bụla Chineke zitere na-ekwu okwu nke Chineke. Nꞌihi na onye ahụ naejupụta na Mmụọ nsọ Chineke. Chineke Nna hụkwara Ọkpara ya nꞌanya. O werekwala ike nile tinye ya nꞌaka. Ya mere onye ọ bụla kweere nꞌỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi. Ma onye ọ bụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị enwe ndụ ebighị ebi, kama iwe Chineke na-adịgide ya nꞌahụ.” Mgbe Onyenwe anyị matara na ndị Farisii anụla na igwe mmadụ na-abịakwute ya ka o mee ha baptizim ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, kama ịgakwuru Jọn, (ma ọ bụkwaghị Jisọs nꞌonwe ya na-eme ha baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim) Jisọs hapụrụ Judia gaa Galili. Ma ọ ghaghị isite nꞌetiti obodo ndị Sameria gafee mgbe ọ na-aga. Ihe dị ka oge ehihie, ọ banyere obodo nta Saika nke dị nꞌime Sameria. Ọ bịaruru nꞌolulu mmiri Jekọb. Olulu mmiri e gwuru nꞌala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya. Ike gwụrụ Jisọs nꞌihi ogologo ije o jere nꞌime anwụ. Nꞌihi ya ọ nọdụrụ ala nꞌakụkụ olulu mmiri ahụ izu ike. Mgbe nwa oge nta gafere, otu nwanyị onye Sameria bịara nꞌolulu mmiri ahụ ịdọrọ mmiri. Jisọs rịọrọ ya ka o nyetụ ya mmiri ọṅụṅụ. Ma nꞌoge a ọ bụ nanị Jisọs nọ, nꞌihi na ndị na-eso ụzọ ya gara nꞌime obodo ịzụta nri. O juru nwanyị ahụ anya na onye Juu ga-arịọ onye Sameria e ledara anya, ihe ọ bụla. Nke a bụ ihe a na-emetụbeghị mbụ. Ọ bụladị ekele ọnụ, ha adịghị ekelerịta onwe ha. Nwanyị a mere ka Jisọs mata nke a. Ma Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na ị maara ụdị onyinye dị ebube Chineke ga-enye gị, matakwa onye m bụ, ị gaara arịọ ka m nye gị mmiri na-enye ndụ.” Nwanyị a sịrị Jisọs, “I nweghị ụdọ ma ọ bụ bọketi. Olulu mmiri a dịkwa omimi. Ebeekwanụ ka ị ga-esi nweta mmiri ndụ ahụ ị ga-enye m? E wezugakwa nke a, i chere na ị dị ukwuu karịa nna anyị ochie Jekọb onye gwuru olulu mmiri a? Olee otu ị ga-esi nye m mmiri dị mma karịa nke a ya na ụmụ ya na igwe ehi ya ṅụkwara?” Jisọs zara ya sị, “Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri a ga-emesị chọọ mmiri ọṅụṅụ ọzọ. Ma mmiri nke m ga-enye onye ahụ ga-abụ isi iyi ebighị ebi nꞌime ya. Ọ ga na-asọgharị nꞌime ya ebighị ebi. Ọ ga-aghọkwa nꞌime ya ụzọ ndụ ebighị ebi.” Nwanyị ahụ rịọrọ Jisọs sị ya, “Onyenwe anyị, biko nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ. Ka m hapụkwa ịga ụzọ a dị anya ọzọ, nꞌihi ịdọrọ mmiri.” “Gaa kpọta di gị,” ka Jisọs gwara ya. Nwanyị ahụ zara sị, “Enweghị m di.” Jisọs sịrị ya, “Ị kwuru eziokwu. Nꞌihi na i nweela di ise, ma nwoke nke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ị bụ onye eziokwu.” Nwanyị ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe anyị, ị ga-abụrịrị onye amụma! Ma kọwaara m, gịnị mere unu ndị Juu jiri sị na Jerusalem bụ nanị ebe e kwesịrị ịnọ kpọọ isi ala nye Chineke. Anyị ndị Sameria sị na ọ bụ nꞌebe a, nꞌugwu Gerazim, ebe nna anyị ha kpọrọ isi ala nye Chineke.” Jisọs zara ya sị, “Nwanyị, gee ntị ka m gwa gị, oge na-abịa mgbe ọ naagaghị adị mkpa ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Ma ọ bụ nꞌebe a ma ọ bụ na Jerusalem. Ihe dị mkpa abụghị ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Kama ọ bụ otu anyị siri kpọọ isi ala. Anyị na-esite nꞌime obi anyị kpọọ isi ala? Anyị na-akpọ isi ala site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ? Chineke bụ mmụọ. Anyị apụkwaghị ịkpọ isi ala nye ya nꞌụzọ ziri ezi ma ọ bụghị site nꞌinyeaka ya. Nke a bụ ụdị ịkpọ isi ala Chineke chọrọ site nꞌaka anyị. Unu bụ ndị Sameria maara ntakịrị banyere nke a. Unu na-akpọ isi ala nꞌisi. Anyị ndị Juu maara ihe nile banyere ya nꞌihi na nzọpụta rutere ụwa site nꞌaka ndị Juu!” *** *** Nwanyị ahụ zara ya sị, “Amaara m na Onye nzọpụta ga-abịa, onye ahụ ha na-akpọ Kraịst. Mgbe ọ bịara, ọ gaeme ka ihe nile doo anyị anya.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ya sị, “Abụ m Onye nzọpụta ahụ!” Mgbe ọ na-ekwu okwu a, ndị na-eso ụzọ ya bịara. O juru ha anya ịhụ Jisọs ka ya na nwanyị a na-ekwurịta okwu. Ma ọ dịghị onye nꞌime ha jụrụ ya ihe mere o ji mee nke a ma ọ bụ ihe ha na-ekwu. Otu mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya nꞌakụkụ olulu mmiri ahụ gbara ọsọ laghachi azụ nꞌime obodo gaa gwa onye ọ bụla bi nꞌobodo ahụ sị, “Bịanụ lee nwoke gwara m ihe nile m mere! Ọ̀ ga-abụ na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ?” Ya mere, ọtụtụ mmadụ siri nꞌime obodo ahụ pụta ịhụ Jisọs. Mgbe ihe ndị a na-eme ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ na-arịọ ya ka o rie nri ha zụtara. Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ dịghị mkpa! Ọ dị ihe oriri m nwere iri nke unu na-amaghị ihe ọ bụla banyere ya.” Ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha sị, “Onye kwanụ nyere ya ihe oriri?” Ma Jisọs kọwaara ha sị, “Nri m bụ ime ihe bụ uche Chineke onye zitere m, na ịrụcha ọrụ o nyere m ka m rụọ. Ùnu chere na owuwe ihe ubi naebido nanị nꞌọnwa asatọ nꞌafọ? Leenụ anya gburugburu unu! Ọtụtụ mkpụrụ obi ụmụ mmadụ achaala dị ka mkpụrụ ubi. Ha dịkwa mma ọghụghọ. Ndị ga-aghọ ha ga-enwe ụgwọ ọrụ dị mma. Ha ga-aghọtakwa mkpụrụ obi ndị ga-abanye nꞌime ọba nke eluigwe. Lee! ọṅụ dị ukwuu dị na-eche ndị na-akụ mkpụrụ na ndị na-ewe ihe ubi a. Ilu ahụ bụ eziokwu nke na-asị, ‘Otu onye na-akụ mkpụrụ nꞌubi, ma onye ọzọ na-aghọ mkpụrụ ubi ahụ.’ Ana m ezipụ unu ka unu gaa wee ihe ubi nꞌebe unu na-aghaghị mkpụrụ. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu na-ewe mkpụrụ nke ọrụ ha.” Ọtụtụ nꞌime ndị sitere nꞌobodo Sameria kweere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌihi ama nwanyị ahụ gbara, na-asị, “Ọ gwara m ihe nile m mere.” Mgbe ha pụtara ịhụ Jisọs nꞌakụkụ olulu mmiri ahụ, ha rịọrọ ya ka o soro ha nọdụ nꞌobodo ha. O sooro ha gaa nọdụ ụbọchị abụọ. Ọtụtụ ndị ọzọ kwa kweere na ya nꞌihi okwu ha nụrụ site nꞌọnụ ya. Ha gwara nwanyị ahụ sị, “Nꞌezie, anyị ekwerela ugbu a, nꞌihi na anyi anụla okwu ya nꞌonwe anyị. Ọ bụkwaghị nanị nꞌihi na ị gwara anyị.” Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gwụsịrị, Jisọs hapụrụ obodo ahụ chee ihu ya ịga nꞌime Galili. Dị ka Jisọs si ekwu, “Onye amụma adịghị enwe ugwu nꞌala a mụrụ ya.” Mgbe Jisọs bịaruru ala Galili, ndị obodo ahụ weere obi ha nile nabata ya. Nꞌihi na ọtụtụ nꞌime ha nọ na Jerusalem nꞌụbọchị mmemme Ngabiga ahụ hụ ụfọdụ ihe ịrịba ama Jisọs rụrụ. Ma mgbe Jisọs na-agagharị na Galili ọ bịaruru Kena. Nke a bụ obodo ahụ ebe o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. Mgbe ọ nọ nꞌebe ahụ, otu onye na-arụ ọrụ eze, nke bi nꞌobodo Kapanọm, nke nwere nwa nwoke ahụ na-esighị ike, nụrụ na Jisọs esila Judia laghachi Galili. Nwoke a mere ngwangwa gaa Kena. Nꞌebe ahụ ka ọ hụrụ Jisọs rịọ ya ka ọ bịaruo Kapanọm gwọọ nwa ya nwoke nke nọ nꞌọnụ ọnwụ. Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Ọ bụ nanị mgbe unu hụrụ ọrụ ebube na ihe ịrịba ama ka unu ga-ekwere?” Nwoke ahụ rịọsịrị ya ike sị, “Onyenwe anyị biko soro m ugbu a tupuu nwa m anwụọ.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ya sị, “Laa nꞌụlọ gị. A gwọọla nwa gị!” Nwoke ahụ kweere nꞌihe Jisọs kwuru. Ọ hapụrụ ebe ahụ laa nꞌụlọ ya. Mgbe ọ nọ nꞌụzọ ndị ohu ya jiri ozi ọma bịakwute ya sị, “Ahụ adịla nwa gị nwoke mma.” Ọ jụrụ ha sị, “Olee oge ahụ ji dị ya mma?” Ha gwara ya sị, “Ụnyaahụ, nꞌoge ehihie, nꞌihe dị ka elekere nke mbụ, oyi ahụ kwụsịrị ya.” Otu mgbe ahụ nwoke a ghọtara ihe mere ahụ jiri dị nwa ya mma. Oge ahụ bụ mgbe Jisọs gwara ya sị, “Ahụ nwa gị nwoke adịla ya mma.” Nwoke ahụ na ezinụlọ ya nile kweere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Nke a bụ ihe ịrịba ama nke abụọ Jisọs mere na Galili mgbe ọ hapụrụ Judia. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs laghachiri azụ na Jerusalem. Ọ gara nꞌihi otu mmemme ndị Juu ga-eme. Nꞌime Jerusalem, otu ọdọ mmiri ntakịrị dị ya, aha ọdọ mmiri a bụ Betesda. Ọ dị nso nꞌahia ebe a na-ere atụrụ. Ọ dịkwa ọnụ ụzọ ise e si aba nꞌebe ahụ. Igwe ndị ọrịa dina nꞌakụkụ ọdọ mmiri a. Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị ngwụrọ. Ụfọdụ bụ ndị isi. Ndị ọzọ bụ ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha nile nọ na-eche ka mmiri ahụ mee mkpọtụ. Nꞌihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-abịa na mmiri ahụ gbarụọ ya. Mgbe mmiri a gbarụrụ, onye ọrịa ọ bụla buru ụzọ baa nꞌime ya ka a na-eme ka ahụ dị mma. Ma ọ dị otu nwoke nọ nꞌakụkụ mmiri a nke nọrọla nꞌọrịa ihe ruru iri afọ atọ na asatọ. Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ hụọla ahụhụ nꞌọrịa. Ọ bịarutere nso ebe nwoke ahụ nọ jụọ ya ajụjụ sị, “Nwoke, ị chọrọ ka ahụ dị gị mma?” Onye ọrịa ahụ zara sị, “Ahụ enweghị ike ịdị m mma, nꞌihi na mgbe ọ bụla mmiri a mere mkpatọ enweghị m onye ọ bụla ga-ekuba m nꞌime ya. Ọ bụrụ na m achọọ ịbanye, onye ọzọ ga-esi nꞌazụ m kwatuo m, buru m ụzọ banye.” Jisọs gwara ya okwu sị, “Nwoke, bilie, chilie ute gị laa!” Nꞌotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma. O biliri chilie ute ya bido ịla nꞌụlọ ya. Ma ụbọchị ahụ Jisọs mere ka ahụ dị ya mma bụ ụbọchị izuike ndị Juu, ụbọchị nke asaa! Mgbe ndị isi ndị Juu hụrụ nwoke a, ha baara ya mba, sị, “Taa bụ ụbọchị izuike, o zighị ezi nꞌiwu na ị gaebu ute gị.” Ma nwoke a zara ha sị, “Onye ahụ mere ka ahụ dị m mma gwara m sị, ‘Chilie ute gị laa.’ ” Ha jụrụ ya sị, “Onye bụ nwoke gwara gị ụdị okwu ahụ?” Ma nwoke a amaghị onye gwọrọ ya! Igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ mgbe Jisọs mere ka ahụ dị ya mma. Jisọs banyekwara nꞌetiti igwe mmadụ a, nwoke ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ. Mgbe e mesịrị, Jisọs hụrụ nwoke ahụ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, dụọ ya ọdụ sị, “Ugbu a ahụ adịla gị mma. Emehiekwala ọzọ. Ọ bụrụ na i mehie, ọrịa ka nke a njọ ga-abịakwasị gị.” Nwoke a siri nꞌebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya. Nꞌihi nke a ndị Juu sogburu Jisọs, chọsiekwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Nꞌihi na ọ dịghị asọpụrụ ụbọchị izuike ha. Ma Jisọs zara ha sị, “Nna m na-arụ ọrụ oge nile. Mụ onwe m na-arụkwa dị ka o si arụ.” Nꞌihi okwu a Jisọs kwuru, ndị Juu chọsịrị ụzọ ike igbu ya. Ọ bụghị nanị na Jisọs rụrụ ọrụ nꞌụbọchị izuike, kama ọ sịrị na Chineke bụ Nna ya. Site nꞌokwu a ọ na-egosi na ya na Chineke ha. Jisọs gwara ha sị, “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla site nꞌike nke aka ya. Ọ na-arụ ihe ọ bụla ọ hụrụ Nna ya na-arụ. Ihe ọ bụla Nna mere nke a ka Ọkpara Nna na-emekwa. Nꞌihi na Nna hụrụ Ọkpara ya nꞌanya, ọ naegosikwa ya ihe nile ọ na-eme. Ọkpara Nna ga-emekwa ihe ịrịba ama dị iche iche karịa ọgwụgwọ nwoke a, ka o ju unu anya. Dị ka Nna pụrụ ime ka mmadụ si nꞌọnwụ bilie, otu a ka Ọkpara Nna pụrụ ịkpọlitekwa onye ọ bụla nwụrụ anwụ ọ chọrọ site nꞌọnwụ. Nna adịghị ekpe mmadụ ọ bụla ikpe. Ọ hapụụrụ Ọkpara Nna ikpe ikpe nile. Ka mmadụ nile nye Ọkpara Nna nsọpụrụ dị ka ha si enye Nna. Onye ọ bụla na-adịghị asọpụrụ Ọkpara adịghị asọpụrụ Nna. Nꞌihi na ọ bụ Nna zitere ya. “Ka m gwa unu eziokwu, mmadụ ọ bụla nụrụ okwu m ma kwerekwa na Chineke onye zitere m, nwere ndụ ebighị ebi. Ọmụma ikpe adịkwaghị nye onye ahụ. Kama o sitela nꞌọnwụ banye na ndụ. Nꞌeziokwu, oge na-abịa, oge ahụ eruokwala nso mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anọ nꞌili ha nụ olu m. Ndị nile nụrụ olu m ga-adịkwa ndụ. Dị ka ndụ na-esite nꞌaka Chineke bịa, otu a kwa ka Nna si mee ka ndụ site nꞌaka Ọkpara ya bịa. Ọ na-enye Ọkpara ike nile, ikpe mmadụ nile ikpe nꞌihi mmehie ha, nꞌihi na ọ bụ Nwa nke mmadụ, Onyenwe abube nile. Ka ọ hapụ iju unu anya, oge na-abịa mgbe ndị nwụrụ anwụ nọkwa nꞌili gaanụ olu Ọkpara Chineke. Ha ga-esitekwa nꞌili ha pụta. Ndị rụrụ ezi ọrụ ga-abanye na ndụ ebighị ebi. Ma ndị ọrụ ọjọọ ga-abanye nꞌọmụma ikpe ebighị ebi. Mụ onwe m adịghị ekpe ikpe dị ka m si chọọ. Ana m ekpe ikpe dị ka Nna si chọọ. Ikpe m na-ekpe ziri ezi. Mkpa m abụghị ime ihe m chọrọ. Ana m achọ ime uche Nna m, onye zitere m. “Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, nke a abụghị ezi ama. Onye ọzọ dị nke na-agba ama banyere m. Jọn omee baptizim bụ onye ahụ na-agba ama banyere m. Unu ezigala ndị gara jụọ ya ajụjụ. Ama Jọn gbakwara bụ eziokwu. Ọ bụghị na m na-atụkwasị obi nꞌama mmadụ. Emere m ka unu cheta ama Jọn ka unu kwere na m, ka a zọpụta unu. Jọn dị ka ìhè nwuru nwa oge nta. Unu ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ya ritekwa uru site na ndụ ya. Ma enwere m ama karịrị ama Jọn. Ọrụ ebube nile m rụrụ gosiri na ọ bụ Nna m zitere m. Ha bụ ọrụ nke Nna m nyefere m nꞌaka ịrụ. Nna m, onye zitere m, gbakwara ama banyere m. Ọ bụ ezie na ọ pụtaghị ka unu hụ ya anya, unu anụbekwaghị olu ya. Ma unu jụrụ ige ntị nꞌihe onye Chineke zitere na-ekwu. Nke a bụ nꞌihi na okwu Chineke adịghị nꞌime unu. “Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nꞌihi na unu chere na unu ga-esite nꞌihe e dere nꞌime ya nwee ndụ ebighị ebi. Ma akwụkwọ nsọ ndị a na-ekwu ihe banyere m. Ma unu achọghị ịbịakwute m ka m nye unu ndụ ebighị ebi. “Adịghị m achọ otutu mmadụ. Ma amaara m unu. Amaara m na ịhụnanya Chineke adịghị nꞌime unu. Abịara m nꞌaha Nna m ma unu anabataghị m. Ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nꞌaha nke ya onwe ya ọ bụ ya ka unu ga-anabata. Unu ga-esi aṅaa kwere, ebe ọ bụ na unu na-achọ otuto mmadụ ibe unu? Ma unu achọghị otuto si nꞌebe Chineke nọ pụta. “Agaghị m ebo unu ihe ọ bụla nꞌebe Nna nọ. Mosisi bụ onye ga-ebo unu ebubo nile. Ee, Mosisi ahụ unu na-atụkwasị obi na ọ ga-eduba unu nꞌeluigwe. Ebe unu jụrụ ikwere ihe Mosisi dere banyere m, unu ajụkwala ikwere na Mosisi. Nke a mere unu ji jụ ikwere na m. Ebe ọ bụ na unu ekwenyeghị nꞌihe Mosisi dere, unu ga-esi aṅaa kwere na m?” Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs banyere ụgbọ mmiri gafee nꞌakụkụ nke ọzọ nke osimiri Galili. Aha ọzọ a na-akpọ osimiri Galili bụ osimiri Taịberias. Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya, nꞌihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ hụkwa otu o si agwọ ndị ọrịa. Nꞌihi nke a Jisọs rigoro nꞌelu ugwu nọdụ ala. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwara nọrọ ya gburugburu. Nꞌoge ihe ndị a na-eme mmemme oriri Ngabiga ndị Juu dị nso. Mgbe Jisọs leliri anya ya elu hụ igwe mmadụ dị ukwuu na-abịakwute ya ọ jụrụ Filip ajụjụ sị, “Ebee ka anyị ga-azụta nri ga-ezu ndị a?” Jisọs chọrọ ịmata ihe Filip ga-ekwu, nꞌihi na ọ maara ihe ọ na-ezube ime. Filip zara ya sị, “Olee otu nke a ga-esi mee? Ọ ga-efu ego dị ukwuu ịzụta nri nke onye ọ bụla nꞌime ha ga-eritụ nanị nri ntakịrị.” Anduru nwanne Saịmọn Pita tinyere ọnụ ya gwa Jisọs okwu sị, “Otu nwantakịrị nwoke nọ nꞌebe a. O nwere ogbe beredi ise na azụ abụọ. Ma gịnị ka a ga-eji nke a mee nꞌebe igwe mmadụ ha otu a dị?” Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu sị, “Gwanụ onye ọ bụla ka ọ nọdụ ala.” Ahịhịa juru nꞌebe ahụ. Ndị a nile nọdụrụ ala. Ha dị puku mmadụ ise! Jisọs weere beredi ndị a kelee Chineke ekele nꞌihi ha. O nyere ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ. Jisọs natakwara azụ abụọ ahụ nyekwa Chineke ekele nꞌihi ha. Ndị na-eso ụzọ ya kekwara igwe mmadụ ndị a azụ ahụ. Onye ọ bụla riri nri tutuu afọ eju ya. Emesịa, Jisọs nyekwara ndị na-eso ụzọ ya iwu sị, “Tụtụkọtaanụ ibiribe beredi na azụ fọdụrụ, ka ihe ọ bụla ghara ịla nꞌiyi.” Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara ihe fọdụrụ. O juru nkata iri na abụọ. Mgbe ndị mmadụ a hụrụ ihe ebube a Jisọs mere, ha sịrị, “Nꞌezie, nwoke a bụ onye amụma ahụ anyị naele anya ya!” Ma Jisọs matara ihe ha chọrọ ime. Ọ maara na ha chọrọ ijide ya mee ya eze ha nꞌike. Ọ hapụrụ ha gamie nꞌelu ugwu ahụ nanị ya. Nꞌanyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌebe ahụ pụọ gaa nꞌọnụ mmiri, ebe ha banyere nꞌụgbọ mmiri malite ịga nꞌọbodo Kapanọm, nke dị nꞌofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Nꞌoge a ọchịchịrị ebidola ịgba, ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha. Ọ dịghị anya mgbe ha banyesịrị nꞌụgbọ, oke ifufe bidoro ife. Mgbe ha nyaara ụgbọ mmiri ahụ na-aga, nꞌihe dị ka kilomita anọ ma ọ bụ ise site nꞌọnụ mmiri, ha lepụrụ anya hụ Jisọs ka ọ na-aga ije nꞌelu mmiri na-abịakwute ụgbọ ahụ ha nọ nꞌime ya. Oke egwu tụrụ ha! Ma Jisọs kpọrọ ha sị, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m!” Ngwangwa ha kpọbatara ya nꞌime ụgbọ ahụ. Ọ dịkwaghị anya ha eruo ebe ha na-aga. Nꞌụtụtụ echi ya, igwe mmadụ zukọtara nꞌakụkụ mmiri ahụ Jisọs nọ nye ha nri. Ha chere na ha ga-ahụ Jisọs, nꞌihi na o soghị ndị na-eso ụzọ ya baa nꞌụgbọ mgbe ha bara nꞌụgbọ mmiri ụnyaahụ. Ọtụtụ ụgbọ mmiri ndị ọzọ si Taịberias bịaruo ebe ahụ Onyenwe anyị nọ nye igwe mmadụ ahụ nri. Ma mgbe ndị a na-ahụghị Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, ha banyere ụgbọ mmiri ọzọ kwọfee osimiri ahụ na-aga Kapanọm ịchọ Jisọs. Mgbe ha bịaruru Kapanọm, ha hụrụ Jisọs sị ya, “Nna anyị ukwu, olee ụzọ i si bịa nꞌebe a?” Jisọs zara sị ha, “Unu na-achọ m nꞌihi na m nyere unu nri, ọ bụghị nꞌihi na unu kweere na m. Unu atụkwasịla obi unu nꞌihe na-ala nꞌiyi dị ka nri, kama chọọnụ ndụ ebighị nke Nwa nke mmadụ na-enye. Nꞌihi na Chineke Nna zitere ya ime nke a.” Ha zara ya sị, “Gịnị ka anyị ga-eme nke ga-egosi na anyị na-arụ ọrụ Chineke?” Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ otu ihe nanị, nke a bụkwa uche Chineke. Kwerenụ nꞌọnye ahụ Chineke zitere.” Ha zara sị ya, “Olee ihe ịrịba ama ị ga-egosi anyị nke ga-eme ka anyị kwere na gị? Gịnị ka ị ga-eme? Nna anyị ha riri mana mgbe ha jegharịrị nꞌọzara. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘O si nꞌeluigwe nye ha achịcha ha riri.’ ” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụghị Mosisi nyere ha nri ahụ. Ọ bụ Nna m. Ugbu a Nna m na-enye unu ezi nri ahụ si nꞌelu bịa. Ezi nri a bụ Onye ahụ Chineke si nꞌelu zite. Ọ na-enye ụwa ndụ.” Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko nye anyị nri a ụbọchị nile.” Jisọs zaghachiri ha sị, “Abụ m nri na-enye ndụ. Onye ọ bụla na-abịakwute m agụụ agaghị agụkwa ya ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ndị nile kweere na m nkụ. Dị ka m gwara unu, unu ahụla m ma unu ekweghị. Ma ụfọdụ ga-abịakwute m. Agaghị m achụpụkwa ndị nile Nna m nyere m ma ha bịakwute m. Nꞌihi na esi m nꞌelu bịa nꞌụwa. Abịara m ime uche Chineke onye zitere m, ọ bụghị ime uche nke aka m. Nke a bụ uche Chineke, ọ dịghị onye ọ bụla o nyere m ga-efu efu. Kama aga m eme ka onye ahụ si nꞌọnwụ bilite nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ. Nꞌihi na nke a bụ uche Chineke. Onye ọ bụla hụrụ Ọkpara ya, kwerekwa na ya, ga-enwe ndụ ebighị ebi. Aga m eme ka o site nꞌọnwụ bilite nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ!” Ndị Juu bidoro ịtamụ ntamụ megide ya nꞌihi na ọ sịrị na ya bụ nri ahụ si nꞌelu bịa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ònye a ọ bụghị Jisọs nwa Josef? Ọ̀ bụ na anyị amaghị nne ya na nna ya? Gịnị ka ọ na-ekwu, na o si nꞌelu bịa?” Jisọs sịrị ha, “Unu atamụla nꞌime onwe unu. Nꞌihi na mmadụ ọ bụla enweghị ike ịbịakwute m karịakwa ma Nna m onye zitere m, mere ka ọ bịakwute m. Nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ, aga m emekwa ka ndị ọ bụla bịakwutere m si nꞌọnwụ bilie. *** E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘A ga-akụziri mmadụ nile ihe banyere Chineke.’ Onye ọ bụla Chineke gwara okwu, nke mụtakwara eziokwu ahụ site nꞌaka Chineke ga-abịakwute m. Nke a apụtaghị na onye ọ bụla ahụla Nna m anya. Ọ bụ nanị m hụrụ ya, nꞌihi na ọ bụ site nꞌebe ọ nọ ka m si bịa. “Nꞌezie asị m unu, onye ọ bụla kweere na m nwere ndụ ebighị ebi. Nꞌezie abụ m nri na-enye ndụ. Nna nna unu ha riri mana, nri ahụ pụrụ iche Chineke nyere ha nꞌime ọzara, ma ha mesịrị nwụọ. Ma nri a, nke si nꞌelu bịa, na-enye onye ọ bụla na-eri ya ndụ ebighị ebi. Abụ m nri na-enye ndụ nke si nꞌelu bịa. Onye ọ bụla na-eri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nri nke m na-enye bụ anụ ahụ m, nke e nyere maka ịgbapụta ụwa nile.” Ndị Juu rụrịtara ụka nꞌetiti onwe ha na-asị, “Olee otu nwoke a ga-esi nye anyị anụ ahụ ya ka anyị taa?” Ma Jisọs zara sị ha, “Nꞌezie asị m unu, ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ, ṅụọkwa ọbara m, unu agaghị enwe ndụ ebighị ebi. Onye ọ bụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. Aga m emekwa ka o si nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ. Anụ ahụ m bụ ezi nri ahụ. Ọbara m bụkwa ezi ihe ọṅụṅụ. Onye ọ bụla na-eri anụ ahụ, ma na-aṅụkwa ọbara m ga-anọgide nꞌime m. Mụ onwe m gaanọkwa nꞌime ya. Ana m adị ndụ site nꞌike Nna dị ndụ, onye zitere m. Otu aka ahụ, ndị nile na-eri anụ ahụ m ga-adịkwa ndụ site nꞌike nke m gaenye ha. Abụ m ezi nri ahụ si nꞌelu bịa. Nri a abụghị ụdị nke nna nna unu ha riri nwụọ. Onye ọ bụla na-eri nri a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” Na Kapanọm ka Jisọs nọ kwuo ihe ndị a. Ebe ahụ ka ọ nọkwa kuziere ndị mmadụ okwu Chineke nꞌime ụlọ ekpere ndị Juu. Ọtụtụ ndị na-eso ya bụ ndị gere ntị nꞌokwu ndị a kwuru sị, “Okwu ndị a siri ike ịghọta. Ònye nwere ike ịkọwa ihe ha pụtara?” Ma Jisọs nꞌọnwe ya matara nꞌime onwe ya na ndị na-eso ụzọ ya naatamụ ntamụ nꞌetiti onwe ha banyere ozizi ya. Ya mere ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Okwu ndị a o mere ka obi jọọ unu njọ?” Ọ gwakwara ha sị, “Gịnị ka unu ga-ekwu mgbe unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-alaghachi nꞌeluigwe? Ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ na-enye ndụ, ike mmadụ abaghị uru ọ bụla. Okwu ndị a nile m gwara unu bụ Mmụọ na ndụ. Ma ụfọdụ nꞌime unu ekwenyeghị.” Nꞌihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ na-ekwereghị. Ọ matakwara onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere ọ gwakwara ha okwu sị, “Ọ bụ nke a mere m ji gwa unu okwu sị, ọ dịghị onye ọ bụla ga-abịakwute m ma ọ bụghị na Nna m mere ka ọ bịakwute m.” Site nꞌoge a ọtụtụ nꞌime ndị na-eso ya kwụsịrị iso ya. Ha esokwaghị ya na-agagharị ebe nile ọ na-aga. Ma Jisọs tụgharịrị jụọ mmadụ iri na abụọ ahụ ọ họpụtara ajụjụ sị ha, “Ùnu chọkwara ịlaghachi azụ dị ka ndị ọzọ mere?” Saịmọn Pita zara sị, “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? Ọ bụ nanị nꞌaka gị ka okwu ahụ na-enye ndụ ebighị ebi dị. Anyị kweere okwu gị, marakwa na ị bụ Onye Nsọ ahụ Chineke zitere.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu dị ndị ozi iri na abụọ m họpụtara, ma nꞌime unu e nwere otu onye bụ nwa ekwensu!” Jisọs na-ekwu ihe banyere Judas nwa Iskarịọt onye ahụ ga-arara ya nye nꞌaka ndị ga-egbu ya. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs jegharịrị site nꞌotu obodo dị na Galili gaa nꞌobodo ọzọ. Ọ chọkwaghị ijegharị na Judia, nꞌihi na ndị Juu na-achọ igbu ya nꞌebe ahụ. Ma oge ahụ mmemme ibi nꞌụlọ e ji akpụkpọ anụ mee, nke e ji echeta mwagharịrị nꞌọzara ndị Juu dị nso. Ụmụnne Jisọs bịakwutere ya gwa ya sị, “O ruola nnọọ oge ị ga-eji gaa Judia. Gaa ugbu a ka ndị na-eso ụzọ gị hụ ọrụ ị na-arụ. “Ndị mmadụ enweghị ike ịmata gị ma ị nọdụ na-arụ ọrụ gị na nzuzo. Ebe ọ bụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ndị ụwa onwe gị.” Ọ bụladị ụmụnne ya ekwereghị na Jisọs. Jisọs zara sị ha, “Oge m ga-egosi ụwa onwe m erubeghị. Ọ dịrị unu mfe ịga mgbe ọ bụla, nꞌihi na a ga-anabata unu. Ndị ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, dị ka ha si kpọọ m asị. Ndị ụwa na-akpọ m asị nꞌihi na m na-atụ ha mmehie ha nꞌanya. Gaanụ na mmemme ahụ. Mgbe oge ruru aga m abịa. Ugbu a abụghị oge dịrị m mma ịga nꞌebe ahụ.” Mgbe Jisọs gwasịrị ha ihe ndị a, ọ nọgidere na Galili. Ma mgbe ụmụnne ya pụrụ, o sochiri ha azụ. Ma ọ gara nꞌebe ahụ na nzuzo. Na mmemme ahụ, isi ndị Juu nọ na-ele anya ya. Ha na-ajụgharị ajụjụ na-asị, “Olee ebe ọ nọ?” Igwe ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ nọkwa na-agbarịta izu banyere ya. Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Mbaa, ọ bụghị ezi mmadụ. Ọ na-eduhie ndị mmadụ.” Ma o nweghị onye ọ bụla kwupụtara okwu banyere ya. Nꞌihi na ha tụrụ egwu ndị isi ndị Juu. Ma nꞌetiti mmemme ahụ, mgbe ndị mmadụ na-atụghị anya ya, Jisọs gara nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, nọọ nꞌebe ahụ bido izi ihe. Ihe ọ na-ezi juru ndị Juu anya, nke mere ka ha jụọ sị, “Olee otu nwoke a na-amụghị akwụkwọ siri mara ihe?” Jisọs zara ha sị, “Ihe m na-ezi abụghị ihe m tụpụtara nꞌuche m. Kama ana m ezi ihe Chineke, onye zitere m, chọrọ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie ime uche Chineke, ọ gaamata ma ozizi a ọ bụ nke m ma ọ bụkwanụ nke si nꞌebe Chineke nọ pụta. Onye ọ bụla na-ekwu ihe si ya nꞌuche pụta na-achọ ka ndị mmadụ too ya. Ma onye ahụ na-achọ otuto onye zitere ya, na-ekwu eziokwu. Ihe ọjọọ ọ bụla adịkwaghị nꞌime ya. Mosisi nyere unu iwu, ma ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji chọọ igbu m nꞌihi na m edebeghị iwu unu?” Ndị mmadụ zara sị ya, “Ọ gaabụkwanụ na isi mebiri gị. Ònye chọrọ igbu gị?” Jisọs gwara ha sị, “Arụrụ m nanị otu ọrụ dị ebube, ọrụ ahụ tụkwara unu nꞌanya. Mosisi nyere unu iwu banyere ibi mmadụ ugwu. (Iwu a ebidoghị nꞌaka Mosisi, o bidororị nꞌaka nna anyị ochie ha). Ma unu na-ebi mmadụ ugwu nꞌụbọchị izuike. Nꞌụbọchị izuike unu na-ebi nwa ọhụrụ ugwu ka a hapụ imebi iwu Mosisi. Gịnị mere unu ji ewe iwe nꞌihi na m mere ka ahụ dị mmadụ mma nꞌụbọchị izuike? Kpeenụ ikpe ziri ezi ụnu ekpela ikpe site nanị nꞌihe anya naahụ.” Ụfọdụ nꞌime ndị bi na Jerusalem kwuru okwu sị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu? Lee! Ọ na-ekwusi okwu ike ma o nweghị ihe ha na-agwa ya! Ma eleghị anya ndị isi achọpụtala na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ ga-abịa. Ma anyị maara ebe a mụrụ nwoke a. Mgbe Onye nzọpụta ahụ ga-abịa mmadụ ọ bụla agaghị ama ebe o siri pụta.” Mgbe ahụ Jisọs tiri mkpu sị, “Nꞌezie unu maara m. Unu maara ebe a nọ mụọ m. Ma ọ dị onye zitere m. Onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Ma unu amaghị ya. Amaara m ya. Ọbụkwa ebe ọ nọ ka m si bịa. Ọ bụ ya zitekwara m.” Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ biliri chọọ ijide ya. Ma mmadụ ọ bụla emetụghị ya aka nꞌihi na oge Chineke kara aka erubeghị. Ma ọtụtụ mmadụ nọ nꞌebe ahụ kweere na ya. Ihe ha kwuru bụ nke a, “Mgbe Onye nzọpụta ahụ ga-abịa, ọ̀ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị nke nwoke a rụrụ?” Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ndị mmadụ na-ekwu, ha na ndị isi nchụaja gbara izu, zite ndị uwe ojii ka ha jide Jisọs. Ma Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Nanị nwa oge nta ka m ga-anọnyere unu. Emesịa aga m alakwuru onye zitere m. Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Unu enwekwaghị ike ịbịaru ebe m gaaga.” Ndị isi ndị Juu jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Ebee ka ọ na-akwado ịga? Ọ̀ bụ ijekwuru ndị Juu nọ na mba ọzọ soro ha nọdụ na-ezi ndị mba ọzọ naabụghị ndị Juu ihe? Ụdị okwu dị aṅaa bụ nke a, na anyị ga-achọ ya ma anyị agaghị achọta ya? Na anyị apụghị ịbịaru ebe ọ na-aga?” Nꞌụbọchị ikpeazụ bụ ụbọchị dị mkpa nꞌoge mmemme ahụ, Jisọs guzoro ọtọ tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọ bụla nkụ ya bịakwute m, bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ. Ọ bụrụ na unu ekwere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, Chineke ga-eme ka isi iyi mmiri na-enye ndụ site nꞌime unu naasọpụta.” (Jisọs na-ekwu okwu banyere Mmụọ Nsọ nke ndị kweere na ya ga-anata. Nꞌoge ahụ Mmụọ Nsọ abịabeghị nꞌihi na Jisọs alaghachibeghị nꞌebube ya nꞌeluigwe). Mgbe ndị mmadụ nụrụ okwu a, ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nꞌezie, nwoke a bụ onye amụma ahụ.” Ụfọdụ sịrị, “Nke a bụ Onye nzọpụta ahụ e kwere na nkwa.” Ma ụfọdụ sịrị, “Onye nzọpụta ahụ e kwere na nkwa ọ̀ ga-esi Galili pụta? Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na Kraịst ga-esite nꞌagbụrụ Devidi bịa. Akwụkwọ nsọ gwakwara anyị na ọ ga-esi na Betilehem obodo Devidi pụta.” Nꞌihi nke a, nkewa dị nꞌetiti igwe mmadụ ndị ahụ. Ụfọdụ chọrọ ijide ya. Ma mmadụ ọ bụla emetụghị ya aka. Ndị uwe ojii ahụ e zitere ijide ya laghachiri azụ. Ha lọghachiri nꞌebe ndị isi nchụaja na ndị Farisii nọ. Mgbe ndị isi ahụ jụrụ ha ihe mere ha akpụtaghị Jisọs, Ha zara sị ha, “Anyị ahụbeghị nwoke kwuru okwu dị ka nwoke a si kwuo okwu taa.” Ndị Farisii jụrụ ha sị, “A ghọgbuokwala unu? Ò dị onyeisi ndị Juu ma ọ bụ onye Farisii unu hụrụ kweere na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ? Ma igwe mmadụ ndị a amaghị akwụkwọ nsọ. Ha bụ ndị a bụrụ ọnụ.” Nikọdimọs, otu nꞌime ndị isi ndị Juu (nwoke ahụ bịakwutere Jisọs nꞌabalị), jụrụ ndị ibe ya sị, “Ò ziri ezi nꞌiwu ịma mmadụ ikpe tupuu e kpee ya ikpe?” Ha jiri oke olu jụọ Nikọdimọs ajụjụ nꞌiwe sị, “Gị onwe gị i sokwa na ndị si Galili pụta? Lee anya nꞌakwụkwọ nsọ ị ga-achọpụta na onye amụma ọ bụla esitebeghị na Galili pụta!” Nzụkọ ahụ gbasara. Onye ọ bụla lara nꞌụlọ ya. Jisọs lọghachiri azụ nꞌugwu ahụ a na-akpọ Olivet. Nꞌechi ya, nꞌisi ụtụtụ, ọ banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke. Mgbe na-adịghị anya, ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ bịakwutere ya, gbaa ya gburugburu. O guzoro nꞌetiti ha malite izi ha ihe. Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu, ndị isi ndị Juu na ndị Farisii bịakwutere ya. Lee! ha dọkpụ otu nwanyị onye ha jidere mgbe ọ nọ na-akwa iko. Ha mere ka nwanyị ahụ guzo nꞌetiti igwe mmadụ ahụ nile. Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye ozizi, lee, anyị jidere nwanyị a nꞌime ịkwa iko, ọ bụladị mgbe ya na nwoke dina! Iwu Mosisi nyere anyị kwuru na onye mere ihe dị otu a kwesịrị ka anyị jiri nkume tụgbuọ ya. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?” Ha kwuru okwu ndị a ile ma ha gaesite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye ha boo ya ebubo ịkwagide mmebi iwu. Ha gere ntị ka ha nụrụ ihe Jisọs ga-ekwu. Ma ebe ọ bụ na Jisọs matara echiche obi ha, ọ gwaghị ha ihe ọ bụla. Kama o huuru ala were mkpịsị aka ya dee ihe nꞌala. Mgbe ha nọgidere na-esogbu ya ka okwu si ya nꞌọnụ pụta, Jisọs lelitere anya ya elu gwa ha sị, “Unu nwere ike tụọ nwanyị a nkume ugbu a. Ma achọrọ m ka onye ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume bụrụ onye nke na-emebeghị mmehie nꞌoge ọ bụla.” Jisọs hurukwara ala ọzọ malitekwa ide ihe ọ na-ede nꞌala. Mgbe ndị ahụ kpụtara nwanyị ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha nile nꞌotu nꞌotu, malite nꞌonye okenye ha, sitere nꞌebe ahụ pụọ. Nꞌikpeazụ, ọ fọdụrụ nanị Jisọs na nwanyị ahụ. Mgbe Jisọs guzoro ọtọ lee anya gburugburu, o nweghị onye ọ bụla ọ hụrụ karịa nanị nwanyị ahụ. Jisọs jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị, “Olee ndị ahụ kpọtara gị nꞌebe a? Ò nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara gị ikpe?” Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “O nweghị onye ọ bụla nꞌime ha mara m ikpe, Onyenwe m.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe. Laa nꞌụlọ gị, kama emehiekwala ọzọ.” Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Mụ onwe m bụ onye na-enye ndị bi nꞌụwa ìhè. Onye ọ bụla sooro m agaghị ejegharị nꞌime ọchịchịrị, kama ìhè ahụ ga-anọnyere ya ruo mgbe ebighị ebi.” Ndị Farisii nọ nꞌebe ahụ zaghachiri ya sị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị erijughị afọ.” Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụ eziokwu na m na-agbara onwe m ama, ma ama m na-agba bụ eziokwu. Amaara m ebe m si bịa, amakwara m ebe m na-aga. Ma unu onwe unu amaghị ihe ndị a nile. O nweghị ihe ọ bụla unu ma banyere m. Ma unu na-ekpe m ikpe. Otu ọ dị, ikpe ikpe nke m abụghị nꞌoge dị ugbu a. Mgbe ọ bụla m jikeere ikpe ikpe, aga m ekpe ikpe ziri ezi. Nꞌihi na Nna m, onye zitere m, na-agbara m ama. Iwu unu kwuru sị, ‘Ama mmadụ abụọ gbara banyere ihe ọ bụla bụ eziokwu.’ Ana m agba ama banyere onwe m. Otu a kwa Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.” Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs sị ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zaghachiri ha sị, “Ebe unu na-amaghị onye m bụ, unu apụghị ịmata onye Nna m bụ. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.” Okwu ndị a nile ka Jisọs kwuru nꞌụlọ nsọ ukwu ha, na mpaghara ụlọ ahụ a na-akpọ Ụlọ Akụ. Ma ọ dịghị onye ọ bụla nwere obi ike ijide ya nꞌihi na oge ọnwụ ya erubeghị. Mgbe oge ntakịrị gasịrị, Jisọs gwara ha okwu ọzọ sị, “Nꞌoge na-adịghị anya, aga m ahapụ unu, unu gaachọ m ma unu agaghị ahụ m anya. Nꞌihi nke a unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nꞌebe m nọ.” Ndị Juu ahụ jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Nwoke a ọ̀ ga-egbu onwe ya? Gịnị ka okwu ndị a ọ na-ekwu pụtara, ‘Unu apụghị ịbịa nꞌebe m na-aga?’ ” Jisọs sịrị ha, “Unu si nꞌụwa ma esi m nꞌelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa. Kama esitere m nꞌeluigwe bịa. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji gwa unu na unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ekweghị na abụ m Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke, unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu.” Ya mere, ndị Farisii ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ. Enwere m ọtụtụ ihe m ga-ezi unu, ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nꞌihi nke a ihe nile m nụrụ site nꞌọnụ ya ka m gwara unu.” Ọ bụ ihe banyere Chineke ka Jisọs na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ihe ọ na-ekwu. Nꞌihi nke a, Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị, “Mgbe unu mere ka m nwụọ, unu ga-amata na unu egbuola Onye nzọpụta ahụ, bụ onye Chineke zitere. Unu ga-amatakwa na ihe nile m gwara unu esiteghị nꞌuche m kama ha bụ ihe nile Nna m chọrọ ka m gwa unu. Chineke onye zitere m naanọnyekwara m mgbe nile. Ọ hapụkwaghị m mgbe ọ bụla. Ọ bụkwa ihe na-atọ ya ụtọ ka m na-eme mgbe nile.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọtụtụ ndị nụrụ okwu ya, kweere na ya. Ya mere, Jisọs chigharịrị gwa ndị ahụ nile kweere na ya sị, “Ọ bụrụ na unu anọgide nꞌihe nile m gwara unu, unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m nꞌeziokwu. Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ. Ọ bụkwa eziokwu ahụ ga-eme ka unu nwere onwe unu.” Ndị Juu ahụ zara Jisọs sị, “Anyị bụ ụmụ Eberaham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọ bụla. Olee otu ị ga-esi mee ka anyị nwere onwe anyị?” Jisọs zara ha sị, “Nꞌezie, asị m unu, onye ọ bụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie. Ohu enwekwaghị onwe ya mgbe ọ bụla ọ nọ nꞌụlọ onyenwe ya. Ma Ọkpara onye nwe ụlọ ahụ nwe onwe ya, nꞌihi na ọ na-anọgide nꞌụlọ ahụ oge nile. Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ ga-eme ka unu pụọ nꞌohu, unu agaghị abụkwa ohu ọzọ. Kama unu ga-enwere onwe unu. Ọ bụ ezie na unu sitere nꞌagbụrụ Eberaham pụta. Ma unu na-achọ ụzọ igbu m. Unu chọkwara ime nke a nꞌihi na okwu m enweghị ọnọdụ nꞌime unu. Ma ugbu a ana m akọwara unu ihe m hụrụ mgbe mụ na Nna m nọ. Unu onwe unu na-emekwa ihe unu mụtara site nꞌaka nna unu.” Ha zara Jisọs sị ya, “Eberaham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Eberaham, unu gaara arụ ọrụ Eberaham rụrụ. Ma unu na-achọ ụzọ igbu m nꞌihi na m gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ site nꞌọnụ Nna m. Eberaham, onye unu na-ekwu na ọ bụ nna unu, emesoghị m omume ọjọọ dị otu a. Kama ọ bụ ọrụ ọjọọ nke nna unu chọrọ ka unu na-arụ.” Ndị isi ndị Juu ahụ zara sị ya, “Anyị abụghị ndị a mụrụ site nꞌịkwa iko. Anyị nwere Chineke dị ka nna anyị.” Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ nꞌezie na Chineke bụ nna unu, unu ga-ahụ m nꞌanya. Nꞌihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nꞌike nke m. Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-agwa unu? Nke a pụtara na ọ dị onye na-eme ka unu hapụ ịghọta ihe ndị a nile m na-akọrọ unu. Onye na-eme ihe dị otu a bụ nna unu ekwensu. Unu na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu nꞌihi na unu na-eme ihe nile na-atọ ya ụtọ. Ekwensu bụ ogbu mmadụ site na mbụ. Ọ kpọrọ eziokwu asị nꞌihi na eziokwu ọ bụla adịghị nꞌime ya. Ọ na-anyakwa isi mgbe nile, nꞌime ụgha nile, nꞌihi na ọ hụrụ ịgha ụgha nꞌanya. Ọ bụkwa nna nke ndị nile na-agha ụgha. Unu adịghị ekwere ihe nile m gwara unu nꞌihi na ha bụ eziokwu. Unu apụkwaghị ịghọta eziokwu. “Onye nꞌime unu nile pụrụ ibo m ebubo mmehie ọ bụla? Ọ bụrụ na unu apụghị ịkwagide na m bụ onye mmehie, gịnị mere unu jiri jụ ikwere nꞌokwu m nile? Ihe nile m na-ekwu bụ eziokwu. Onye ọ bụla nwere Chineke dị ka nna ya ga-anabata okwu Chineke. Ya mere, unu onwe unu abụghị ụmụ Chineke nꞌihi na unu achọghị ịnụ okwu ya.” Ndị isi ndị Juu sịrị ya, “Nke a bụ nnọọ ihe anyị kwuru na ị bụ onye obodo ọzọ. Ọ pụtara ìhè ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nꞌime gị na-achịkwa gị.” Jisọs zara sị ha, “Mmụọ ọjọọ ọ bụla adịghị nꞌime m, kama unu amaghị onye m bụ. Ọ bụ Nna m ka m na-enye otuto. Anaghị m ebuli onwe m elu. Kama ọ bụ ọchịchọ Chineke ka e bulie m elu. Ọ bụkwa Chineke gaekpe ndị nile jụrụ m ikpe nꞌotu nꞌotu. Nꞌezie, nꞌezie, asị m unu, onye ọ bụla na-edebe okwu m nile agaghị anwụ ọzọ.” Ndị isi ndị Juu ahụ sịrị, “Ahaa! anyị maara ugbu a na ị bụ onye isi mebiri. Eberaham na ndị amụma nile a maara aha ha nwụrụ kemgbe oge dị anya. Ma gị onwe gị na-asị na onye ọ bụla kweere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. Ị na-akọwa na ị dị ukwuu karịa nna anyị Eberaham na ndị amụma ndị nwụrụ kemgbe oge dị anya? Gịnị ka ị na-eche na ị bụ?” Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ na m naanya isi banyere onwe m, nke a abaghị uru. Kama Nna m onye unu na-asị na ọ bụ nna unu, bụ onye na-ebuli m elu. Unu amakwaghị onye Chineke bụ. Amaara m ya nke ọma. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m gaasị na amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya, na-edebekwa okwu ya nile. Nna unu Eberaham ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu ma chọsiekwa ike ịhụ ụbọchị ndị a anya. Ọ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi na ọ matara na mụ onwe m ga-abụ Onye nzọpụta ahụ.” Mgbe ahụ ndị isi ndị Juu ahụ nile sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise, ị si aṅaa hụ Eberaham anya?” Ma Jisọs zara sị ha, “Eziokwu ahụ bụ nke a, mụ onwe m na-adịrị ndụ tupuu amụọ Eberaham!” Ndị isi ndị Juu ahụ nile were iwe nke ukwuu mgbe ha nụrụ ihe Jisọs kwuru. Ha nile tụtụlitere nkume ịtụ ya. Ma site nꞌụzọ ihe ịrịba ama dị iche, Jisọs zoro onwe ya site nꞌihu ha pụọ. O sitere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ pụọ. Otu ụbọchị mgbe Jisọs na-agafe nꞌụzọ, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì, onye kpuru ìsì site nꞌafọ nne ya. Ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere nwoke a ji kpuo ìsì site nꞌoge a mụrụ ya? Onye mehiere? Ọ bụ nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya?” Jisọs zara ha sị, “Nwoke a emehieghị. Ndị mụrụ ya emehiekwaghị. Kama Chineke chọrọ ka o site nꞌọgwụgwọ a ga-agwọ nwoke a gosi ịdị ike ya. Chineke enyela anyị ọrụ ọ chọrọ ka anyị rụọ. O kwesịrị ka m rụọ ya ngwangwa. Nꞌihi na ọ bụ nanị nwa oge fọdụrụ tupuu o ruo anyasị. A naghị ejikwa anyasị arụ ọrụ. Ugbu a m nọ nꞌụwa, ana m eme ka ìhè m naenwu nꞌime ụwa.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, ọ bụsara ọnụ mmiri nꞌala gwakọta ọnụ mmiri na aja were aja ahụ tee onye ìsì ahụ nꞌanya. Ọ gwara ya ka ọ gaa saa anya ya nꞌolulu mmiri Silom. (Silom pụtara “Nziga”). Nwoke a gara saa anya ya mmiri. Mgbe ọ na-alọghachi, o bidoro ịhụ ụzọ. Ma mgbe ndị agbata obi ya hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Onye a ọ̀ bụghị onye ahụ kpuru ìsì? Nwoke a ọ̀ bụghị onye arịrịọ ahụ?” Ụfọdụ sịrị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụghị ya.” Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ onye yiri ya.” Ma nwoke ahụ sịrị, “Abụ m onye ìsì ahụ.” Ha jụrụ ya ihe mere ya o jiri bido ịhụ ụzọ. Ọ gwara ha sị, “Nwoke ahụ a na-akpọ Jisọs gwọrọ ụrọ tee m nꞌanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa anya gị nꞌọdọ mmiri Silom.’ E mere m nke a malitekwa ịhụ ụzọ!” Ha jụrụ ya sị, “Ugbu a, ebe ka Jisọs nọ?” Ọ zara ha sị, “Amaghị m.” Ha duuru ya bịa nꞌihu ndị Farisii. Ọ bụ nꞌụbọchị Satọde ka Jisọs mere ka nwoke a hụ ụzọ. Ndị Juu adịghị arụ ọrụ ọ bụla nꞌụbọchị ahụ nꞌihi na ọ bụ ụbọchị izuike. Ndị Farisii gwara nwoke ahụ ka ọ kọwaa otu ihe nile siri mee. Nwoke ahụ gwara ha otu Jisọs si gwakọtaa ụrọ tee ya nꞌanya na otu o si gaa saa anya ya nꞌọdọ mmiri Silom malite ịhụ ụzọ. Mgbe ahụ ndị Farisii sịrị, “Ọ bụghị Chineke zitere nwoke a a na-akpọ Jisọs. A sị na ọ bụ onye Chineke zitere, ọ garaghị arụ ọrụ nꞌụbọchị izuike.” Ndị ọzọ nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ dị otu a?” Nkewa batara nꞌetiti ha. Ndị Farisii jụrụ nwoke a ajụjụ ọzọ sị, “Gịnị ka i chere banyere Jisọs?” Ọ zara ha sị, “Nꞌuche m, ọ bụ onye amụma si nꞌebe Chineke nọ bịa!” Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ. Ha ziri ozi ka a kpọọ ndị mụrụ ya. Mgbe ndị mụrụ ya bịara, ha jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ bụ unu mụrụ nwoke a? Ọ dị mgbe o kpuru ìsì? Ọ bụrụ na o kpuru ìsì site na mgbe unu mụrụ ya, gịnị mere o ji na-ahụ ụzọ ugbu a?” Ndị mụrụ ya zara sị, “Nke a bụ nwa anyị. Anyị makwaara na o kpuru ìsì site nꞌoge anyị mụrụ ya. Ma anyị amaghị ihe mere o ji na-ahụ ụzọ ugbu a. Anyị amaghị onye meghere anya ya. Unu jụọ ya. Ya onwe ya abụghị nwanta. O nwere ike ịsara ọnụ ya.” Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nꞌihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị Juu ekpebiela na ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nꞌụlọ ekpere ha. Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.” Ndị Juu kpọrọ nwoke a ọzọ sị ya, “Nye Chineke otuto nꞌihi ihe o meere gị chefuo nwoke a bụ Jisọs nꞌihi na anyị maara na ọ bụ onye mmehie.” Ma nwoke ahụ zara sị ha, “Amaghị m ma Jisọs ọ bụ onye mmehie, ma ọ bụ onye ezi omume. Ma ọ dị otu ihe m maara, na mbụ abụ m onye kpuru ìsì, ugbu a ana m ahụ ụzọ.” Ndị isi ndị Juu ahụ jụrụ ya ọzọ sị, “Gịnị ka Jisọs mere? Gịnị ka o mere nꞌanya gị tupuu ị malite ịhụ ụzọ?” Nwoke ahụ zara sị ha, “Agwala m unu ihe nile. Ma unu achọghị ikwere nꞌihe m gwara unu. Gịnị ọzọ kwa ka unu na-ajụ m? Unu chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya?” Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya. Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosisi. Anyị maara na Chineke gwara Mosisi okwu, ma nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.” Onye ìsì ahụ sịrị ha, “Unu ahụla ọrụ ebube Jisọs rụrụ, otu o si gwọọ onye ìsì ma unu na-asị na unu amaghị ebe o siri bịa. Chineke adịghị anụ ekpere onye mmehie. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla na-arụ ọrụ ya, na-eme ihe ọ na-achọ, ọ bụ onye ahụ ka Chineke na-anụ olu ya. Site na mgbe e kere ụwa ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. Anyị anụbeghị ya na ntị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì site nꞌoge a mụrụ ya. Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nꞌebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọ bụla.” Ha zara ya sị, “Gị onye a mụrụ nꞌime mmehie, ọ̀ bụ izi anyị ihe ka ị na-eme nke a?” Ha chụpụrụ ya site nꞌetiti ha. Ma Jisọs nụrụ na ha chụpụrụ ya. Mgbe ọ chọtara nwoke ahụ, ọ gwara ya okwu sị ya, “Ì kweere nꞌỌkpara Chineke?” Nwoke ahụ zara ya sị, “Onye bụ Ọkpara ahụ, Onyenwe m, ka m nwee ike ikwere na ya?” Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị na-ahụkwa ya. Ya onwe ya bụkwa onye gị na ya na-ekwurịta okwu!” Onye ìsì ahụ a gwọrọ zara sị ya, “Ekwerela m.” Ọ kpọrọ isi ala nye Jisọs. Mgbe ahụ Jisọs sịrị, “Ọ bụ nꞌihi ikpe ka m ji bịa nꞌụwa. Ka ndị naadịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.” Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nꞌebe ahụ nụrụ okwu a, ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya. “Anyị onwe anyị, anyị kpuru ìsì?” Jisọs zara sị ha, “A sị na unu kpuru ìsì, unu agaraghị enwe mmehie. Ma ugbu a unu na-asị, ‘Anyị na-ahụ ụzọ.’ Nꞌihi ya, mmehie unu naadịgide.” “Ka m gwa unu eziokwu, onye ọ bụla na-achọghị isite nꞌụzọ banye nꞌọgba a na-edebe atụrụ, ma chọọ ka o site na mgbidi ụlọ ahụ wufee bụ onye ohi. Onye ọzụzụ atụrụ naesite nꞌụzọ abanye. Onye nche naemeghere ya ụzọ. Ụmụ atụrụ ahụ naanụkwa olu ya. Ọ na-akpọ ndị nke ya, duru ha pụọ. Mgbe ọ kpọpụtara atụrụ nke ya, ọ na-aga nꞌihu ha. Ha na-esokwa ya nꞌazụ nꞌihi na ha maara olu ya. Ha agaghị eso onye ha na-amaghị olu ya. Ha ga-agbapụ site nꞌebe onye ahụ nọ. Nꞌihi na ha amaghị olu ya.” Jisọs siri otu a tụọrọ ha ilu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Ma Jisọs kọwaara ha sị, “Mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ. Ndị nile bịara tupuu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị. Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọ bụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-abata pụọkwa ịchọ nri. Onye ohi na-abịa ka o bibie. Ma mụ onwe m na-abịa inye ndụ nke na-ejubiga oke. “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Onye ọzụzụ atụrụ kwadoro ịtọgbọ ndụ ya nꞌihi atụrụ ya. Onye e goro ọrụ adịghị elezi atụrụ anya. Ọ hụ nkịta ọhịa ka ọ na-abịa, ọ na-agbapụ ọsọ, hapụ atụrụ ahụ ka nkịta ọhịa buru ha, ma ọ bụ chụsasịa ha. Onye e goro ọrụ na-agbapụ. Ọ dịghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ahụ. “Ma mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Amaara m atụrụ nke m. Atụrụ nke m makwaara m, dị ka Nna m siri mata m, na dị ka mụ onwe m si mara Nna m. Akwadokwara m ịtọgbọ ndụ m nꞌihi atụrụ ahụ. Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nꞌọgba a. Aga m akpọbatakwa ha ka m nwee nanị otu ọgba. Ha ga-anụ olu m nꞌihi na otu onye ọzụzụ atụrụ nanị ga-adị. “Nna m hụrụ m nꞌanya nꞌihi na akwadoro m ịtọgbọ ndụ m. Ana m atọgbọ ndụ m ka m weghachikwa ya. O nweghị onye ọ bụla pụrụ ịnara m ndụ m. Ọ bụ m kpebiri nꞌonwe m ịtọgbọ ndụ m. Enwere m ike ịtọgbọ ya, nweekwa ike iweghachi ya. Ọ bụ Nna m nyere m ike a.” Nkewa batara nꞌetiti ndị Juu mgbe ha nụrụ ihe ndị a Jisọs kwuru. Ọtụtụ nꞌime ọgbakọ ahụ sịrị, “Mmụọ ọjọọ na-achị achị nꞌobi ya. Ọ bụ onye isi mebiri. Ọ baghị uru ige ya ntị?” Ma ndị ọzọ kwuru sị, “Ọ dịghị ekwu okwu dị ka onye mmụọ ọjọọ na-achị. Mmụọ ọjọọ enweghị ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee.” Ihe ndị a nile mere na Jerusalem. Ha mere nꞌoge mmemme icheta owuwu ụlọ nsọ ukwu Chineke. Ọ bụkwa nꞌọnwa nke atọ nꞌafọ ka ha mere. Jisọs nọ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke. O jegharịrị nꞌakụkụ ụlọ nsọ ahụ a na-akpọ “Mgbe Ụlọ Solomọn.” Nꞌebe ahụ ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị gaedebe anyị nꞌọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Onye nzọpụta ahụ, gwaghee anyị ọnụ!” Jisọs sịrị ha, “Agwara m unu, ma unu achọghị ikwere nꞌihe m kwuru. Ọrụ m na-arụ nꞌaha Nna m na-agba ama banyere m. Ma unu ekwenyeghị, nꞌihi na unu abụghị atụrụ m. Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m. Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nꞌiyi. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nꞌaka m. Ọ bụ Nna m nyere m ha. Ọ dị ukwuu karịa mmadụ nile. Mmadụ ọ bụla enweghị ike ịpụnarị ha site nꞌaka Nna m. Mụ na Nna bụ otu.” Mgbe ahụ ndị Juu tụtụlitere nkume ọzọ ịtụ ya. Ma Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Arụrụ m ọrụ ebube dị iche iche site nꞌaka Nna m inyere ọtụtụ mmadụ aka. Ọ̀ bụ nꞌihi ọrụ ebube nke ole ka unu ji chọọ ịtụ m nkume?” Ndị Juu zara ya sị, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nꞌihi ọrụ ọma ị rụrụ. Kama anyị chọrọ ịtụ gị nkume nꞌihi na gị, bụ mmadụ efu, na-eme onwe gị dị ka Chineke.” Jisọs sịrị ha, “Ọ̀ bụ na edeghị ya nꞌakwụkwọ iwu unu na a kpọrọ ndị mmadụ chi? Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị natara ozi Chineke chi, ma apụkwaghị iwezuga akwụkwọ nsọ, unu si aṅaa agwa m, mụ, onye Chineke doro nsọ zite nꞌụwa, na m adịghị asọpụrụ Chineke nꞌokwu m nꞌihi na m kwuru na abụ m Ọkpwara Chineke? Ọ bụrụ na arụghị m ọrụ Chineke, unu ekwela na m. Ma ọ bụrụ na m na-arụ ọrụ Chineke, nabatanụ ọrụ m dị ka ama zuru oke, ma unu jụ ịnara m. Ọ bụrụ na unu anabata ọrụ m, unu ga-amata, kwerekwa na Nna m nọ nꞌime m, na mụ onwe m nọkwa nꞌime Nna m.” Ọzọ kwa, ha gbalịrị ijide ya, ma ọ pụnarịrị ha. Ọ gara nꞌakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọdan. Ebe ahụ ka ọ nọdụrụ. Ebe Jọn bidoro ime baptizim na mbụ. Ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya nꞌebe ahụ. Ha sịrị, “Jọn arụghị ọrụ ebube ọ bụla, ma ihe nile Jọn kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu.” Ọtụtụ mmadụ kweere na ya nꞌebe ahụ. Nꞌoge a Lazarọs onye bi na Betani nọ nꞌahụ ọkụ. Betani bụ obodo nta ebe Meri na nwanne ya nwanyị Mata bi. Nke a bụ Meri ahụ weere mmanu dị oke ọnụ ahịa tee Jisọs. O jikwara agịrị isi ya hichaa ụkwụ Jisọs. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs, bụ onye nọ nꞌọrịa. Ụmụ nwanne nwanyị abụọ ndị a zipụrụ ozi ngwangwa zigara Jisọs sị ya, “Onyenwe anyị, enyi ọma gị nọ nꞌọnụ ọnwụ.” Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa na-arịa ya abụghị nke ma-eweta ọnwụ, kama ọ bụ ọrịa a ga-esi na ya nye Chineke otuto. A ga-esitekwa nꞌime ya nye mụ onwe m bụ Ọkpara Chineke otuto.” Ọ bụ ezie na Jisọs hụrụ Mata, Meri na Lazarọs nꞌanya, ma ọ nọgidesịrị ike nꞌọrụ ya ruo ụbọchị abụọ ọzọ. Ọ dịghị mgbe o mere ngwangwa ịgakwuru ha. Ma mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Ngwanụ, bilienụ ka anyị jeruo Judia.” Ma ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi gwara ya sị, “Nꞌoge gara aga ka ndị Juu nwara ọnwụnwa ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?” Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ nanị awa iri na abụọ dị nꞌotu ehihie nke ụbọchị. Nꞌime awa ndị a mmadụ nwere ike jegharịa nꞌime ya na-asụghị ngọngọ nꞌihi na ọ na-ahụ ìhè anyanwụ. Ọ bụ nanị nꞌabalị ka egwu ịzọhie ụkwụ dị. Nꞌihi na ọchịchịrị dị.” Jisọs gwakwara ha sị, “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ugbu a ana m aga ịkpọte ya nꞌụra.” Ndị na-eso ụzọ ya, ebe ha na-eche ihe banyere nanị ụra efu, sịrị, “Ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-etetanụ nꞌonwe ya.” Ma Jisọs maara na ha aghọtaghị na ihe ọ na-akọwara ha bụ na Lazarọs anwụọla. Ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Lazarọs anwụọla! Ma nꞌihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nꞌebe ahụ. Nꞌihi na nke a ga-enye unu ohere ọzọ ikwere na m. Bịanụ, ka anyị gaa lee ya.” Tọmọs, onye a na-akpọ Didimọs, gwara ndị ibe ya bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst sị, “Ka anyị gaakwa soro ya nwụọ.” Mgbe ha rutere Betani, Jisọs chọpụtara na Lazarọs anọọlarị nꞌili ụbọchị anọ! Betani dị nanị kilomita anọ site na Jerusalem. Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasi ha obi. Mgbe ozi ọbịbịa Jisọs ruru Mata ntị, ọ gara izute ya. Ma Meri nọdụrụ nꞌụlọ. Mgbe Mata hụrụ Jisọs, ọ sịrị ya, “Onyenwe m, a sị na ị nọ nꞌebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ. Ma ugbu a amara m na Chineke gaemere gị ihe ọ bụla ị ga-arịọ ya ka o mee.” Jisọs zaghachiri ya sị, “Nwanne gị nwoke ga-adị ndụ ọzọ.” Mata sịrị ya, “Amaara m na a ga-eme ka o bilie ọzọ mgbe a ga-emekwa ka ndị ọzọ bilie nꞌụbọchị mbilite nꞌọnwụ ikpeazụ ahụ.” Ma Jisọs gwara ya sị, “Mụ onwe m bụ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa m na-enye ha ndụ ọzọ. Onye ọ bụla kweere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. Ọ dịkwaghị onye dị ndụ nke nwere okwukwe nꞌime m, ga-anwụ anwụ. Mata, ị kweere nke a?” Mata zara ya sị, “E, Onyenwe m, ekweere m na ị bụ Onye nzọpụta ahụ. Ọkpara Chineke, Onye anyị na-ele anya ya.” Mgbe Mata gwasịrị Jisọs nke a, ọ hapụrụ ya bịakwute Meri, kpọpụta ya site nꞌebe ndị na-akwa akwa nọ, gwa ya na nzuzo sị, “Onyenwe anyị bịara, ọ chọrọ ịhụ gị.” Mgbe Meri nụrụ nke a, ọ gbapụtara nꞌụlọ ahụ ịga izute Jisọs. Ruo mgbe a, Jisọs abịarubeghị Betani. Ọ nọ nꞌebe ahụ Mata zutere ya. Mgbe ndị Juu nọ nꞌụlọ na-akasi Meri obi hụrụ ya ka ọ na-apụ ngwangwa, ha chere na ọ na-aga nꞌakụkụ ili ịkwa akwa. Ha sooro ya. Mgbe Meri rutere nꞌebe Jisọs nọ, ọ dara nꞌụkwụ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị nọ nꞌebe a, nwanne m nwoke Lazarọs agaraghị anwụ.” Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-akwa akwa, hụkwa ndị ahụ bịara ileta ha ka ya na ha na-akwa akwa, o metụrụ ya nꞌobi. O nwere ọmiko dị ukwuu nꞌebe ha nọ. Ọ jụrụ ha sị, “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya, “Onyenwe anyị bịa ka ị hụ.” Anya mmiri pụtara Jisọs nꞌanya! Ndị Juu ahụ nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Nꞌeziokwu Jisọs hụrụ ha nꞌanya nke ukwuu.” Ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nwoke a gwọrọ onye kpuru ìsì, ọ garaghị enwe ike mee ka Lazarọs hapụ ịnwụ?” Jisọs sụrụ ude nꞌime onwe ya nke ukwuu, bịarute ili ahụ nso. Ili ahụ bụ ọgba. E jiri nkume dị ukwuu mechie ọnụ ya. Jisọs nyere iwu sị, “Bupụnụ nkume a!” Ma Mata, nwanne nwanyị Lazarọs sịrị, “Ozu ya ebidola isi isi ugbu a, nꞌihi na nke a bụ abalị anọ ọ nwụrụ.” Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ̀ bụ na m agwaghị gị sị na ọ bụrụ na i kwere i ga-ahụ ọrụ ebube Chineke?” Mgbe ahụ ha bupụrụ nkume ahụ. Jisọs lere anya nꞌelu kpọkuo Chineke sị, “Nna, ekelee m gị nꞌihi na ị na-anụ olu m. Amaara m na ị na-anụ olu m mgbe nile. Ana m ekwu nke a nꞌihi ndị a gbara m gburugburu nꞌebe a, ka ha kwere na ọ bụ gị zitere m.” Mgbe o kwusịrị okwu a, o jiri oke olu kpọọ oku sị, “Lazarọs! Pụta!” Lazarọs pụtara. E jiri akwa ozu kekọtaa aka ya na ụkwụ ya. E jikwa akwa ozu kee ihu ya. Jisọs nyere ha iwu sị, “Tọpụnụ ya ka ọ laa!” Ọtụtụ ndị Juu bịara ileta Meri hụrụ ihe a Jisọs mere. Ha kweere na ya. Ma ụfọdụ nꞌime ha lara gaa kọọrọ ndị Farisii ihe Jisọs mere. Mgbe ahụ ndị isi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ ịchọ ihe ha ga-eme. Onye ọ bụla nꞌetiti ha na-ajụ sị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nꞌihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nꞌihu mmadụ nile ga-esokwa ya. Ndị Rom ga-abịakwa tigbuo anyị kwatuo ụlọ nsọ ukwu Chineke anyị ma mebisie obodo anyị.” Kaịfas, onyeisi nchụaja nꞌafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe. Ọ dị mma ka otu nwoke a nwụọ nꞌihi mmadụ nile, kama a ga-emebi mba a nile.” Kaịfas ekwughị nke a site nꞌechiche ya. Nꞌokwu a o kwuru, ọ na-ebu amụma na Jisọs aghaghị ịnwụ nꞌihi mba ahụ. Ọ bụghị nꞌihi mba ahụ nanị, kama nꞌihi ụmụ Chineke ndị gbasara nꞌime mba nile. Ka ọ chịkọta ha nꞌotu. Ya mere, site nꞌụbọchị ahụ ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi mee ka Jisọs nwụọ. Nꞌihi nke a Jisọs kwụsịrị ịgagharị ebe mmadụ nile ga-ahụ ya. O siri nꞌebe ahụ pụọ gaa nꞌakụkụ ọzara. Ọ gara nꞌotu obodo nta a na-akpọ Ifrem. Nꞌebe ahụ ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ. Mmemme ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nꞌakụkụ ala ndị Juu nile bịa Jerusalem. Ha bịara tupuu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha, dị ka omenala si dị. Mgbe ha rutere Jerusalem, ha malitere ịchọ Jisọs. Ha na-ajụrịta onwe ha ajụjụ mgbe ha nọ nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ sị, “Gịnị ka i chere? Ọ̀ ga-abụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?” Ma nꞌoge ahụ, ndị isi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọ bụla hụrụ Jisọs gwa ha otu mgbe ahụ ka ha jide ya. Ụbọchị isii tupuu e mee mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani. Betani bụ obodo Lazarọs, nwoke ahụ Jisọs mere ka o site nꞌọnwụ bilie. Ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata jere ozi isi nri ahụ. Lazarọs bụ otu onye nꞌime ndị sooro nọdụ na nri ahụ. Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ dị oke ọnụ ahia tee Jisọs nꞌụkwụ. O jikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ Jisọs. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nꞌisi mmanụ oke ọnụ ahia ahụ. Ma Judas Iskariọt, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Kraịst, onye ahụ ga-arara Jisọs nye nꞌaka ndị Juu, tamụrụ ntamụ sị, “Nke a bụ itufu ego, a gaara ere mmanụ a nweta ego dị ukwuu, were ya kee ndị ogbenye.” Ma Judas ekwughị nke a nꞌihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nꞌobi. Kama Judas bụ onye na-eche ego ndị na-eso ụzọ Kraịst. Mgbe ụfọdụ, ọ naamanye aka nꞌego ahụ zụfuo nꞌonwe ya. Jisọs zara sị, “Hapụnụ nwanyị a ka ọ rụọ ọrụ ọ na-arụ. Ọ na-akwado m nꞌihi olili a ga-eli m! Unu nwere ike inyere ndị ogbenye aka mgbe ọ bụla unu chọrọ, ma ọ bụghị mụ na unu gaanọ mgbe nile.” Ọtụtụ ndị Juu nụrụ na Jisọs nọ nꞌebe ahụ. Ha bịara ịhụ ya. Ha bịakwara ịhụ Lazarọs, onye Jisọs mere ka o si nꞌọnwụ bilie. Ma ndị isi nchụaja gbakwara izu igbu Lazarọs. Nꞌihi na ọ bụ nꞌihi Lazarọs ka ọtụtụ mmadụ ji kwere na Jisọs. Ụbọchị nke ọzọ ya, ozi rutere ndị Juu ntị na Jisọs na-abịa Jerusalem. Ọtụtụ mmadụ weere igu nkwụ pụọ izute ya. Ha na-eti mkpu na-asị, “Hozaana! Ngọzi dịrị eze Izirel! Ngọzi dịrị Onye ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị.” Nꞌoge a, Jisọs nꞌonwe ya nọkwasịrị nꞌelu nwa inyinya ibu imezu amụma ahụ e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Atụla egwu ada Zayọn! Lee eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ na-anọkwasị nꞌelu nwa inyinya ibu!” Nꞌoge ahụ, ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị na Jisọs na-emezu ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ nanị mgbe Jisọs laghachiri nꞌeluigwe, ka ha chọpụtara na ọtụtụ ihe ndị amụma dere banyere ya mezuru. Ndị nọ mgbe Jisọs mere ka Lazarọs si nꞌọnwụ bilie, gwakwara ndị ọzọ banyere ya. Nke a mere ọtụtụ mmadụ ji pụọ izute Jisọs. Nꞌihi na ha nụrụ akụkọ ọrụ ebube nile ọ rụrụ. Mgbe ndị Farisii hụrụ ndị mmadụ ka ha na-agbakọ ịhụ Jisọs, ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Unu gbara nkịtị? Lee! Mmadụ nile na-eso ya!” Ụfọdụ ndị Griik so nꞌime ndị ahụ bịara Jerusalem nꞌihi mmemme ahụ. Ha bịakwutere Filip nwoke si nꞌobodo nta a na-akpọ Betsaida gwa ya sị, “Biko, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.” Filip pụrụ gaa gwa Anduru. Ya na Anduru soro gaa gwa Jisọs. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Oge ahụ abịala mgbe a ga-ebuli Nwa nke mmadụ elu. Eziokwu ka m na-agwa unu. Mkpụrụ ọka apụghị ịmị mkpụrụ karịakwa ma ọ dabara nꞌala nwụọ. Ma o meghị otu a ọ pụghị ịmị mkpụrụ. Kama ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị mkpụrụ hie nne. Onye ọ bụla hụrụ ndụ ya nꞌanya ga-etufu ya. Onye ọ bụla kpọrọ ndụ ya asị nꞌụwa a, gaedebe ya ruo ebighị ebi. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ijere m ozi, ya so m. Ndị ozi m ga-anọkwa nꞌebe mụ onwe m nọ. Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla abụrụ onyeozi m, Nna m ga-asọpụrụ ya. Ugbu a, mkpụrụ obi m jupụtara nꞌihe mgbu. Gịnị ka m ga-ekwu? M ga-arịọ Nna m ka ọ zọpụta m site nꞌihe na-akwado ịdakwasị m? Mbaa! Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji bịa nꞌụwa. Nna m biko wetara aha gị ugwu na otuto.” Olu siri nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Enyela m aha m otuto. Aga m enyekwasịkwa aha m otuto ọzọ.” Igwe ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ, ndị nụrụ olu ahụ kwuru sị, “Ọ bụ egbe eluigwe.” Ụfọdụ sịrị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Olu a abịaghị nꞌihi m. Olu a bịara nꞌihi unu. Nke a bụ oge a ga-ekpe ụwa ikpe. Ugbu a bụ oge ịchụda ekwensu. Mgbe e weliri m elu aga m adọta mmadụ nile nye onwe m.” Jisọs kwuru nke a igosi ụdị ọnwụ nke ọ ga-anwụ. Ndị mmadụ jụrụ ya sị. “A na-akuziri anyị nꞌime akwụkwọ iwu na onye ahụ bụ Onye nzọpụta agaghị anwụ anwụ. Na ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị mere i ji na-asị na Onye nzọpụta ga-anwụ?” Jisọs zara ha sị, “Ìhè m nwere nanị nwa oge nta ọ ga-enwuru unu. Jegharịanụ nꞌìhè a, ugbu a unu nwere ya ka ọchịchịrị hapụ ịbịakwasị unu. Nꞌihi na onye ọ bụla na-ejegharị nꞌọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga. Ugbu a unu nwere ìhè a, nabataranụ ya onwe unu. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-aghọ ụmụ nke ìhè.” Mgbe o kwusịrị nke a Jisọs hapụrụ ha pụọ zoo onwe ya. Ma ọ bụ ezie na ha hụrụ ọrụ ebube nile ọ rụrụ nꞌetiti ha, ha ekwereghị na ya. Nke a bụ ihe Aịzaya onye amụma kwuru nꞌoge ya sị, “Onyenwe anyị, onye kweere akụkọ anyị? Onye gaanabata ọrụ ebube nile nke Chineke dị ka ihe ngosi?” Ma ha ekwereghị nꞌihi na Aịzaya kwukwara ọzọ sị, “Chineke emeela ka ha kpuo ìsì. O meela ka obi ha kpọchie. He enweghị ike ịhụ. Ha apụghị ịghọtakwa. Ha agaghị abịakwute Chineke ka ọ gwọọ ha.” Aịzaya kwuru ihe ndị a banyere Jisọs. Nꞌihi na ọ hụrụ ebube Kraịst. Ma ụfọdụ nꞌime ndị isi nchụaja kweere na ya. Ma ha ekwupụtaghị nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu ndị Farisii. Ha achọkwaghị ka achụpụ ha site nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Nꞌihi na ha chọrọ otuto mmadụ, karịa otuto nke Chineke. Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọ bụla tụkwasịrị m obi, tụkwasịrị Chineke obi. Nꞌihi na onye ọ bụla hụrụ m ahụla onye zitere m. Abịara m nꞌime ụwa dị ka ìhè ka ndị nile tụkwasịrị m obi hapụ ijegharị nꞌọchịchịrị. Ọ bụrụ na onye ọ bụla nụrụ okwu m ajụ ịtụkwasị m obi, ọ bụghị m ga-ekpe ya ikpe. Abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe. Onye ọ bụla jụrụ m, jụkwa ozi m, nwere onye na-ekpe ya ikpe. Okwu nile m kwuru ka a ga-eji kpee ya ikpe. Okwu ndị a esiteghị nꞌaka m. Ha sitere nꞌaka Nna m onye zitere m. Ọ bụ ya na-agwa m ihe m na-ekwu. Amakwara m na iwu ya naeweta ndụ ebighị ebi. Ya mere, ihe ọ bụla ọ gwara m ka m na-ekwu.” Jisọs matara nꞌabalị ụbọchị mmemme ngabiga ahụ bụ ụbọchị ikpeazụ ya nꞌụwa. Ọ maara nke ọma na emesịa ọ ga-alaghachikwuru Nna ya. Ọ hụrụ ndị bụ nke ya nꞌanya hụkwa ha nꞌanya tutuu ruo ọgwụgwụ. Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu tinyere atụmatụ ọjọọ nꞌime obi Judas. Atụmatụ a bụ na a ga-arara Jisọs nye nꞌabalị ahụ. Jisọs maara na Chineke enyefeela ya ihe nile nꞌaka. Ọ matara na ọ si nꞌebe Chineke nọ bịa, matakwa na ọ ga-alaghachikwuru Chineke. O sitere nꞌoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ yipụ uwe ya. O kekwasịrị akwa mmiri e ji ehicha ahụ nꞌukwu ya. Ọ wụnyekwara mmiri nꞌime efere, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ. O ji akwa mmiri ahụ o kere nꞌukwu ya hichaa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe ọ bịarutere ịsacha Pita ụkwụ, Pita sịrị ya, “Onyenwe m, o kwesịghị ka ị sachaa m ụkwụ.” Ma Jisọs sịrị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme. Oge na-abịa mgbe ị ga-aghọta.” Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ị gaghị asacha m ụkwụ.” Ma Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, ị gaghị abụkwa onye na-eso ụzọ m.” Mgbe ahụ Saịmọn Pita sịrị ya, “Ọ bụghị nanị ụkwụ m ka ị ga-asacha, kama sachaakwa aka m na isi m.” Jisọs zara ya sị, “Onye ọ bụla sara ahụ ya agaghị asakwa ya ọzọ. Nanị ihe ọ ga-eme iji dị ọcha bụla ịsa ụkwụ ya. Kama ọ bụghị onye ọ bụla nọ nꞌebe a dị ọcha.” Jisọs maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu nile dị ọcha.” Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya jụọ ha sị, “Unu ghọtara ihe m mere ugbu a? Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma. Nꞌezie, abụ m Nna unu ukwu na Onyenwe unu. Ebe ọ bụ na mụ onwe m, Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu ji ụgwọ ịsachakwa ụkwụ ibe unu. Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m meere unu. Nꞌezie, ohu adịghị ukwuu karịa nna ya ukwu. Onye e ziri ozi adịghị mkpa karịa onye ziri ya ozi. Ugbu a unu maara ihe ndị a nile, meenụ ha. Obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ ma unu mee ha. “Ọ bụghị unu nile ka m na-agwa okwu a. Ọ bụ m họpụtara unu. Amakwaara m unu nꞌotu nꞌotu. Akwụkwọ nsọ sịrị na onye ahụ mụ na ya rikọrọ nri ga-arara m nye. Nke a ga-emekwa nꞌoge na-adịghị anya. Ana m agwa unu ugbu a tupuu ihe ndị a eme, ka unu kwere na m mgbe ha ga-emezu. “Nꞌezie, onye ọ bụla nabatara onyeozi m nabatara m. Onye ọ bụla nabatara m nabatara Nna m onye zitere m.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, o nweghị udo nꞌime mmụọ ya. Ọ gwara ha sị, “Nꞌezie, otu onye nꞌime unu ga-arara m nye.” Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nꞌime obi ha onye ọ ga-abụ. Jọn, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nꞌanya nọ Jisọs nso. Saịmọn Pita fufeere Jọn isi sị ya, “Jụọ Jisọs onye ga-arara ya nye.” Jọn tụgharịrị chee ihu ya nꞌebe Jisọs nọ jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?” Jisọs sịrị ya, “Aga m esuru achịcha a nꞌime ofe. Onye ọ bụla m nyere ya, onye ahụ bụ onye ga-arara m nye.” Jisọs suuru achịcha ahụ nꞌime ofe nye ya Judas nwa Saịmọn Iskarịọt. Mgbe Judas riri achịcha ahụ, ekwensu bara nꞌime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọ bụla ị chọrọ ime mee ya ngwangwa.” Ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs ghọtara ihe ọ na-ekwu. Ụfọdụ chere na Jisọs gwara Judas ka ọ gaa kwụọ ụgwọ nri ha riri ma ọ bụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ego. Nꞌihi na Judas bụ onye na-eche ego ha. Judas hapụrụ na-atụfụghị oge, pụọ nꞌabalị ahụ. Mgbe Judas hapụrụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ugbu a ka a ga-ekpughe ebube Nwa nke mmadụ. Ugbu a ka a ga-emekwa ka ebube Chineke pụta ìhè nꞌime ya. Ọ bụrụ na e mee ka ebube Chineke pụta ihe nꞌime ya, Chineke ga-akpọbatakwa ya nꞌebube nke ya onwe ya, meekwa ka ebube a pụta ìhè na mgbe na-adịghị anya. Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Aga m ala hapụ unu. Site ugbu a gaa nꞌihu unu ga-achọ m ma unu agaghị ahụ m. Nke a bụkwa ihe m gwara ndị Juu. “Nꞌihi na m na-ahapụ unu, ana m enye unu iwu ọhụrụ. Hụritaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya. Hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya. Nke a ga-eme ka ndị ụwa mata na unu bụ ndị ụwa mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” Saịmọn Pita sịrị, “Nna anyị ukwu, olee ebe ị na-aga?” Jisọs sịrị, “Ị pụghị iso m gaa ebe m na-aga ugbu a. Kama emesịa, ị ga-abịa.” Pita sịrị, “Gịnị ga-egbochi m isoro gị ugbu a? Ejikeere m ịnwụ nꞌihi gị.” Jisọs jụrụ ya sị, “Ị sị na i jikeere ịnwụ nꞌihi m? Nꞌeziokwu tupuu oke ọkụkọ ebee akwa nꞌụtụtụ echi ị gaagọnarị m ugboro atọ.” “Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m. Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha. Mgbe m dozichara ha, aga m abịa ịkpọrọ unu, ka mụ na unu nọdụ. Unu maara nke ọma ebe m na-aga.” Ma Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ahụ?” Jisọs zara ya sị, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu ahụ, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m. Ọ bụrụ na ị maara onye m bụ, ị ga-amatakwa Nna m. Site taa unu amatala ya. Unu ahụkwala ya.” Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị ọ bụrụ na i zi anyị Nna ahụ afọ ga-eju anyị.” Jisọs zara ya sị, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ̀ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna ahụ. Gịnị mere i ji na-asị m, ‘Zi m Nna ahụ?’ Ọ bụ na i kweghị na m nọ nꞌime Nna m, na Nna m nọkwa nꞌime m? Okwu nile m na-ekwu esitekwaghị nꞌebe m nọ pụta. Ha bụ okwu nke Nna m. Nna m bi nꞌime m na-arụkwa ọrụ ya nꞌọnwe ya. Kwere ihe m gwara gị. Ebi m nꞌime Nna m, Nna m bikwa nꞌime m. Ọ bụrụ na i kwereghị okwu ọnụ m, kwere nꞌihi ọrụ ndị a nile m na-arụ. “Nꞌeziokwu, ana m agwa unu sị, onye ọ bụla tụkwasịrị m obi ga-enwe ike mee ihe ndị a nile. Ọ ga-enwekwa ike ime karịa ihe ndị a nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Ihe ọ bụla unu gaarịọ site nꞌaha m, aga m enye unu ya. Aga m enye ya ka e site na ya nye Nna m otuto nꞌihi ihe Ọkpara ya na-eme. Ihe ọ bụla unu rịọrọ nꞌaha m, aga m eme ya. “Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu debe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Aga m arịọ Nna m ka o zitere unu Onye nkasịobi, onye ga-anọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi. Onye a ga-abụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nꞌụwa agaghị anabata ya, nꞌihi na ha apụghị ịhụ ya anya. Ha amakwaghị ya. Ma unu onwe unu maara ya, nꞌihi na unu na ya nọ ugbu a. O bikwa nꞌime unu. Agaghị m ahapụ unu ka unu nọdụ nanị unu. Aga m abịakwutekwa unu. Na mgbe na-adịghị anya site ugbu a, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu onwe unu ga-ahụ m anya. Nꞌihi na m na-adị ndụ unu onwe unu gaadịkwa ndu. Mgbe ụbọchị ahụ bịara, ihe nile ga-edo unu anya. Unu ga-amata na m nọ nꞌime Nna m na unu nọkwa nꞌime m, na mụ onwe m nọkwa nꞌime unu. Onye na-anabata ihe m nyere nꞌiwu ma na-edebekwa ya bụ onye hụrụ m nꞌanya. Onye hụrụ m nꞌanya ka Nna m ga-ahụ nꞌanya. Aga m ahụkwa ya nꞌanya gosikwa ya onwe m.” Judas (ọ bụghị nke raara ya nye) sịrị ya, “Onyenwe ayị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?” Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m nꞌanya, ọ ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nꞌanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nꞌebe onye ahụ nọ soro ya biri. Onye na-ahụghị m nꞌanya agaghị edebe okwu m. Okwu nile unu nụrụ nꞌọnụ m abụghị nke m. Ha bụ okwu Nna m, onye zitere m. Agwala m unu ihe ndị a ugbu a mụ na unu nọ. Ma Onye nkasịobị ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nꞌaha m, ga-ezi unu ihe nile. Ọ gaechetara unu ihe nile m gwara unu. “Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na-enye unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye udo ka m na-enye unu udo nke m. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu. Unu nụrụ na m gwara unu okwu sị, ‘Aga m ahapụ unu, emesịa aga m alaghachikwute unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu gaara aṅụrị ọṅụ. Nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Nna m dịkwa ukwuu karịa m. Ana m agwa unu ihe ndị a mgbe ihe ọ bụla na-emebeghị, ka ọ bụrụ na mgbe o mere unu ga-enwe okwukwe. “Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nꞌihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. Ọ nwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe m nọ. Ọ na-abịa ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nꞌanya. Ka ụwa matakwa na m na-eme ihe Nna m nyere m nꞌiwu ime. Bilienụ ka anyị si nꞌebe a pụọ. “Mụ onwe m bụ ezi osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye nlekọta ọrụ ubi. Ọ na-egbuda alaka ọ bụla dị nꞌime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-ewewpụ ihe nile naeme ka ọ hapụ ịmi mkpụrụ nke ọma, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. Ugbu a e meela ka unu dịrị ọcha site nꞌokwu nile m gwara unu. Ọ bụrụ na unu anọgide nꞌime m, mụ onwe m kwa ga-anọgide nꞌime unu. Alaka ọ bụla apụghị ịmị mkpụrụ nꞌọnwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nꞌosisi vaịnị ahụ. Otu a, unu apụkwaghị ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na mụ onwe m anọghị nꞌime unu. “Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ nꞌezie. Unu onwe unu bụkwa alaka nke m. Onye ọ bụla na-anọgide nꞌime m, ma mụ onwe m kwa nꞌime ya, na-amị mkpụrụ nke ukwuu. Nꞌihi na e wezụga m, unu enweghị ike ime ihe ọ bụla. Onye ọ bụla na-adịghị anọgide nꞌime m abaghị uru ọ bụla nye m. A na-atụpụkwa ya nꞌezi ka ọ kpọnwụọ, dị ka alaka osisi e gbuturu egbutu. Ọ bakwaghị uru ọzọ ma ọ bụghị ka e tinye ya nꞌọkụ, ka o ree ọkụ. Ma ọ bụrụ na unu na-anọgide nꞌime m, ọ bụrụkwa na okwu m na-anọgide nꞌime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ nꞌaha m, a ga-emekwara unu ya. Ọ bụrụ na unu amịa mkpụrụ, a ga-esite na mkpụrụ ahụ nye Nna m otuto. Nꞌụzọ dị otu a ka unu ga-eji bụrụ ndị na-eso ụzọ m. “Dị ka Nna m si hụ m nꞌanya otu a ka m si hụkwa unu nꞌanya. Ya mere nọgidenụ nꞌime ịhụnanya m. Unu ga-anọgide nꞌịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Mụ onwe m na-anọgidekwa nꞌịhụnanya nke Nna m nꞌihi na m naedebe ihe nile o nyere nꞌiwu. Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m zuo oke nꞌime unu, ka ọṅụ unu zuokwa oke. Nke a bụkwa iwu m na-enye unu: hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya. Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya. Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Malite ugbu a, agaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nꞌihi na ohu adịghị amazu ihe nile onyenwe ya na-achọ ime. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nꞌihi na ihe nile Nna m naezube ka m gwara unu. “Ọ bụkwaghị unu onwe unu họpụtara m. Ọ bụ m họpụtara unu ka unu baa nꞌime ụwa mịa mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgide. Ya mere, ọ bụrụ na unu arịọọ Nna m ihe ọ bụla site nꞌaha m, Nna m ga-enye unu ihe nile unu rịọrọ. Ma nke a bụ iwu m nyere unu. Hụnụ onwe unu nꞌanya. Unu echegbula onwe unu ma ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị. Chetanụ na ụwa buru ụzọ kpọọ m asị tupuu ọ kpọọ unu asị. A sịkwarị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nꞌanya. Ma ugbu a unu abụghị nke ụwa. Nꞌihi na mụ onwe m si nꞌime ụwa kpọpụta unu. Ọ bụkwa nꞌihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. Unu chetakwa ihe m gwara unu malite na mbụ, na ohu adịghị ukwuu karịa onyenwe ya. Nꞌihi nke a ebe ụwa kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ha agaghị erube isi nꞌokwu unu, nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌihe m ziri ha. Ee, ha ga-eme unu ihe nile ndị a nꞌihi na unu bụ ndị nke m, na nꞌihi na ha amaghị Onye ahụ zitere m. “Ọ bụrụ na abịaghị m nꞌụwa, ikpe agaraghị ama ha. Ma ugbu a abịala m gwa ha okwu ndị a nile. Ya mere, ha enweghị agụgọ ọ bụla. Onye ọ bụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. A sị na ọrụ nile m rụrụ nꞌetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọ bụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu ha ahụzuola ọrụ ịrịba ama ndị a nile, ma ha nọgidekwara naakpọ mụ na Nna m asị. Ma mmeso ndị a nile emeela ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ha akpọọla m asị, ma emeghị m ha ihe ọjọọ ọ bụla.’ “Ma Onye ndụmọdụ ahụ ga-abịa, Onye ahụ bụ Mmụọ eziokwu ahụ, Onye ga-esite nꞌebe Nna m nọ bịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwara unu ihe nile banyere m. Ma unu onwe unu aghaghị ịgwakwa mmadụ nile ihe banyere m, nꞌihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. “Ana m agwa unu ihe ndị a nile ka unu ghara ịda mba nꞌokwukwe unu. Ha ga-esite nꞌụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ha ga-egbu unu. Ha gaechekwa na ha na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a. Ha ga-eme ihe ndị a nꞌihi na ha amaghị Nna m, na mụ onwe m. Ma agwara m unu ihe ndị a ka unu hapụ ichefu okwu ndị a mgbe ihe ndị a ga-eme. Agwaghị m unu na mmalite nꞌihi na mụ na unu nọ nꞌoge ahụ. “Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ana m ala ebe m siri bịa. Ma ọ dịghị onye ọ bụla nꞌetiti unu jụrụ m sị, ‘Olee ebe ị naaga?’ Ma nꞌihi na m gwara unu okwu ndị a, obi unu ejupụtala na mwute. Nꞌezie, ọ dị mkpa ka m hapụ unu laa. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye nkasịobi ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. “Mgbe ọ bịara ọ ga-ama ụwa ikpe mmehie. Ọ ga-akọwara ha ezi omume nke Chineke. Ọ ga-agwakwa ha ihe banyere ikpe nke Chineke. Ọ ga-ama ha ikpe mmehie nꞌihi na ha ekwenyeghị na m. Ọ ga-akọwara ha ihe banyere ezi omume Chineke nꞌihi na m na-alakwuru Nna m. Ma unu agaghị ahụkwa m ọzọ. Ọ ga-akọwara ha banyere ikpe Chineke, nꞌihi na e kpeela onye na-achị ụwa a bụ ekwensu ikpe. “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a o siiri unu ike ịnabata ha. Ma Mmụọ nke eziokwu ahụ na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eduba unu nꞌeziokwu nile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya. Kama ọ bụ ihe nile ọ nụrụ nꞌọnụ m ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe nile nke na-aghaghị ime. Ọ ga-enye m otuto, nꞌihi na ọ ga-anata ihe nile site nꞌaka m. Ihe ndị a nile ka ọ ga-ezikwa unu. Ihe nile Nna m nwe bụ nke m. Nke a mere m ji sị na ọ ga-ezi unu ihe nile m ga-agwa ya. Ọ fọdụrụ nwa oge ugbu a unu agaghị ahụkwa m anya ọzọ. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ. Nke a bụ nꞌihi na ana m alakwuru Nna m.” Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị ka okwu dị otu a pụtara? Gịnị ka o bu nꞌobi mgbe ọ na-asị, ‘Ana m alakwuru Nna m?’ Nke a edoghị anyị anya.” Ndị ọzọ sịkwara, “Gịnị ka ọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ọ̀ fọdụrụ nwantịị unu agaghị ahụ m anya ọzọ ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, unu ga-ahụkwa m anya?’ ” Jisọs matara ihe dị ha nꞌobi. Ọ maara na ha chọrọ ka a kọwaara ha. Nꞌihi ya, ọ sịrị ha, “Ùnu na-ajụrịta onwe unu ihe banyere okwu m kwuru? Nꞌezie, unu ga-akwa akwa tie aka nꞌobi na mwute. Ma ndị ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma mgbe iru uju unu gafesịrị unu ga-aṅụrị ọṅụ. Mgbe nwanyị dị ime na-achọ ịmụ nwa, ọ naanọ nꞌọnọdụ mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nꞌihi na ọ mụpụtala nwa nwoke ya. Unu nọ nꞌọnọdụ iru uju ugbu a. Ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, aga m ahụ unu anya ọzọ. Mgbe ahụ unu ga-aṅụrị ọṅụ. Mmadụ ọ bụla apụkwaghị ịnapụ unu ọṅụ unu mgbe ahụ. Mgbe ụbọchị ahụ ga-erukwa, ọ dịghị ihe ga-adị unu mkpa. Ọ dịkwaghị ihe unu ga-arịọ nꞌaka m. Unu ga-ajụ Nna m ihe nile. Ọ ga-enyekwa unu nꞌihi na unu na-arịọ ha nꞌaha m. Ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nꞌaha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka ọṅụ unu zuokwa oke. “Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m naagaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu nile ihe banyere Nna m nꞌụzọ unu gaaghọta ya. Nꞌụbọchị ahụ, unu ga-esite nꞌaka m rịọ Nna m ihe nile. Ọ gaghị adịkwa mkpa na m ga-agwa Nna m ka o meere unu ihe unu chọrọ. Nꞌihi na Nna m nꞌonwe ya hụrụ unu nꞌanya. Ọ hụrụ unu nꞌanya nꞌihi na unu hụrụ m nꞌanya kwerekwa na m si nꞌebe Chineke nọ bịa. Esi m nꞌebe Nna m nọ pụta, bịa nꞌime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru Nna m.” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Lee! Ugbu a ka okwu gị doro anya! Ọ bụkwaghị ilu ka i ji ekwu okwu. Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe nile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọ bụla gwa gị ihe ọ bụla. Nꞌihi nke a anyị kweere na i si nꞌebe Chineke nọ bịa.” Jisọs jụrụ ha sị, “Unu ekwerela ugbu a? Lee! Oge na-abịa, nꞌezie oge ahụ eruola mgbe a ga-eme ka unu gbasasịa. Onye ọ bụla nꞌụzọ nke aka ya. Mgbe ahụ unu ga-ahapụ nanị m. Ma ọ bụghị nanị m ga-anọ nꞌihi na mụ na Nna m ga-anọ. Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, o legidere anya nꞌeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola. Biko, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto. I nyela ya ike nꞌebe mmadụ nile dị. Ee, i nyekwara ya ike nꞌebe ihe nile e kere eke dị, na ike inye ndị nile i nyere ya ndụ ebighị ebi. Nke a bụkwa ụzọ ndụ ebighị ebi ahụ. Ka mmadụ mata na ọ bụ nanị gị bụ Chineke nꞌezie, ka ha matakwa na Jisọs Kraịst bụkwa onye ahụ i zitere nꞌụwa. Enyela m gị otuto nile nꞌime ụwa a, ya mere arụsịrị m ọrụ nile ị chọrọ ka m rụọ. Ma ugbu a, Nna m, mee ka otuto gị pụta ìhè nꞌahụ m ugbu a m guzo nꞌihu gị. Otuto ahụ m nwererị nꞌime gị mgbe a na-atọbeghị ntọ ala ụwa a. “Ezila m ndị a ihe nile banyere gị. Gị onwe gị nyere m ha site nꞌụwa. Ha nile bụkwa nke gị. Ma ugbu a, i nyere m ha ka ha bụrụ nke m. Ha debekwara okwu gị nile. Nꞌihi nke a ha maara na ihe nile i nwere bụ nke m. Ihe nile m nwere bụkwa nke gị. Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m ka m nye ha. Ha anabatala ya, ghọta ya, jidesiekwa ya ike. Ha aghọtala na mụ onwe m si nꞌebe ị nọ bịa nꞌụwa. Ha kweere na m si nꞌebe ị nọ bịa, na ọ bụkwa gị onwe gị zitere m. “Ugbu a ana m ekpe ekpere nꞌihi ndị a nile i nyere m. Ekpeghị m ekpere nꞌihi ndị nọ nꞌụwa. Kama ana m ekpe ekpere nꞌihi ndị a i nyere m, nꞌihi na ha bụkwa ndị nke gị. Ndị nke gị nile bụkwa ndị nke m. Ha nile nꞌotu nꞌotu bụkwa otuto m. Ma ugbu a ọ fọdụrụ nwa oge nta ka m hapụ ụwa. Aga m ahapụkwa ha nꞌụwa bịakwute gị. Biko Nna dị nsọ, site nꞌike dị nꞌaha gị chebe ndị nile i si nꞌụwa nye m, ka ha bụrụ otu dị ka mụ na gị siri bụrụ otu. Mgbe mụ na ha nọ nꞌụwa echebere m ha site nꞌaha gị nke i nyere m. O nwekwaghị onye ọ bụla nꞌime ha lara nꞌiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa ọkụ ala mmụọ, dị ka akwụkwọ nsọ siri gbaa ama banyere ya. “Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị. Ma ana m ekwu ihe ndị a nꞌụwa ugbu a mụ na ha nọ, ka ha jupụta nꞌọṅụ m. Enyela m ha okwu gị. Ma nꞌihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nꞌihi na ha sitere nꞌomenala ndị ụwa pụọ. Dị ka m si pụọkwa nꞌomume ọjọọ nile nke ụwa. Ekpeghị m ekpere ka i wepụ ha nꞌụwa, kama ana m achọ ka i debe ha nke ọma. Ka ha ghara ịdaba nꞌaka onye ụrụala ahụ bụ ekwensu. Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị nke ụwa. Biko mee ha ka ha dị ọcha dịkwa nsọ site nꞌịnagide ozizi gị nile nꞌihi na ha bụ eziokwu. Dị ka i siri zite m nꞌụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nꞌụwa. Ọ bụkwa nꞌihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ nꞌime eziokwu ahụ. “Ekpeghị m ekpere nꞌihi ndị a nanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nꞌihi ndị nile ga-ekwere na mụ, nꞌoge dị nꞌihu, site nꞌama ndị a ga-agba banyere m. Isi ekpere m nꞌihi ha bụ ka ha nile nwee otu obi na otu mkpebi banyere ihe nile ha ga-eme, dị ka mụ na gị si nwekọọ. Nna, ee, dị ka gị onwe gị dị nꞌime m, dị ka mụ onwe m dịkwa nꞌime gị, achọrọ m ka ndị nile kweere na m nọgide nꞌime anyị. Mgbe ahụ ndị nile nọ nꞌụwa ga-esite nꞌomume dị otu a mata na gị onwe gị zitere m. “Enyere m ha otuto i nyere m. Otuto ga-eme ka ha nile bụrụ otu dị ka anyị dịkwa. Mgbe ahụ aga m ebikwa nꞌime ha, gị onwe gị ga-ebikwa nꞌime m. Anyị na ha ga-abụrụ ndị e jikọtara nꞌotu. Ụwa ga-esikwa otu a mata na gị onwe gị zitere m. Ha gaamatakwa na ị hụrụ ndị nile kweere na m nꞌanya, dị ka ị hụrụ m nꞌanya. Biko Nna m, achọrọ m ka ndị nile kweere na m soro m bikọọ nꞌotu ebe. Ndị ahụ nile i nyere m site nꞌụwa, achọrọ m ka ha hụ otuto m nile, nke i nyere m site nꞌịhụnanya gị, nke i nwere nꞌebe m nọ malite na ntọ ala nke ụwa a. “Nna onye ezi omume, nꞌezie, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Otu aka ahụ, ndị nile na-eso ụzọ m maara gị. Ha matakwara na ọ bụ gi zitere m. Emeela m ka ha mata onye ị bụ. Aga m agakwa nꞌihu na-egosi ha ihe omimi nile dị nꞌime gị, tutuu ruo mgbe a ga-eme ka ịhụnanya i nwere nꞌebe m nọ dịgide nꞌime ha, tutuu ruo mgbe m ga-ebikwa nꞌime ha.” Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gafee iyi ntakịrị a na-akpọ Kidrọn. Ha bịaruru nꞌotu ubi a gbara ogige dị nꞌebe ahụ. Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nꞌime ubi a. Judas, onye gaarara ya nye matakwara ebe ahụ. Nꞌihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya naanọkarị nꞌebe ahụ. Ndị isi nchụaja na ndị Farisii dunyere Judas ụfọdụ ndị agha na ndị uwe ojii. Ndị a ji ọkụ na ngwa agha ha bịa nꞌebe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ. Ebe Jisọs maara ihe nile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ bịakwutere ndị ahụ jụọ ha sị, “Onye ka unu na-achọ?” Ha zara ya sị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Jisọs sịrị ha, “Abụ m Jisọs onye unu na-achọ.” Judas onye rara ya nye so ha guzo nꞌebe ahụ. Mgbe Jisọs gwara ha na ya bụ Jisọs onye ha na-achọ, ha daghachiri azụ, daa nꞌala. Jisọs jụkwara ha ajụjụ ọzọ sị, “Onye ka unu na-achọ?” Ha zara sị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Jisọs sịrị, “Agwala m unu na abụ m Jisọs. Ebe ọ bụ m ka unu nile na-achọ hapụnụ ndị ọzọ a ka ha laa.” O kwuru nke a iji imezu okwu ahụ o kwuru mgbe o kpere ekpere sị, “Etufughị m onye ọ bụla nꞌime ndị ahụ i nyere m.” Mgbe ahụ, Saimọn Pita mịpụtara mma ya were ya gbupụ ntị aka nri onye a na-akpọ Malkus. Malkus a bụ ohu onyeisi nchụaja. Ma Jisọs gwara Pita sị, “Mịghachi mma gị nꞌọbọ ya! Ị̀ na-eche na m agaghị aṅụ site nꞌiko ahụhụ ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?” Ya mere ndị agha ahụ na ndị uwe ojii ahụ jidere Jisọs, kee ya agbụ. Emesịa, ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas ọgọ nwoke Kaịfas. Kaịfas bụ onyeisi nchụaja nꞌafọ ahụ. Kaịfas bụkwa onye ahụ gwara ndị Juu sị, “Ọ bara uru ka otu onye nwụọ nꞌihi mmadụ nile.” Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ Jisọs, nke onyeisi nchụaja maara, sooro Jisọs. Ma ha na-eso ya nꞌazụ site nꞌebe dị anya. Ha sokwa Jisọs baa nꞌime obi onyeisi nchụaja ahụ. Mgbe ha bịarutere nꞌobi onyeisi nchụaja ahụ, Pita guzoro nꞌezi nꞌọnụ ụzọ e si abata nꞌime ya. Onye nke ọzọ na-eso ụzọ Jisọs nke onyeisi nchụaja maara, bịara gwa nwagbọghọ na-eche ọnụ ụzọ ihe banyere Pita. Emesịa, ọ kpọbatara Pita. Nwagbọghọ ahụ jụrụ Pita ajụjụ sị, “Ị bụghị otu onye nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs?” Ma Pita zara ya sị, “Mbaa! Abụghị m onye na-eso ụzọ ya!” Nꞌabalị ahụ, oyi na-atụ. Ndị agha na ndị na-ejere onyeisi nchụaja ozi nọ nso nꞌakụkụ ọkụ a kwanyere nꞌebe ahụ na-anya ọkụ. Pita gara soro ha guzo na-anyakwa ọkụ. Nꞌoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ malitere ijụ Jisọs ajụjụ banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ihe ọ na-ezi ha. Jisọs zara ya sị, “Nꞌihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu nile m kwuru. Ekwuru m okwu Chineke nꞌime ụlọ ekpere na nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọ bụla na nzuzo. Gịnị mere i ji ajụ m ụdị ajụjụ a? Jụọ ndị gere m ntị! Ha makwaara ihe nile m kwuru.” Otu onye nꞌime ndị agha guzo nꞌakụkụ Jisọs bịaketara nso pịa Jisọs aka nꞌanya, jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji si otu a na-asa onyeisi nchụaja ajụjụ?” Ma Jisọs zara ya sị, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe dị njọ m kwuru, gbagide ihe ọjọọ ahụ ama, ma ọ bụrụ na ihe m kwuru bụ eziokwu, gịnị mere i ji eti m ihe?” Mgbe ahụ Anas nyere iwu ka e duru Jisọs nꞌagbụ jekwuru Kaịfas onyeisi nchụaja. Ma mgbe Saimọn Pita nọ nꞌakụkụ ọkụ ahụ na-anya ọkụ, a jụrụ ya ajụjụ nke ugbo abụọ sị, “Ị bụghị otu onye nꞌime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma Pita gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.” Ohu onyeisi nchụaja, onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, jụrụ ya sị, “Ọ̀ bụghị gị ka m hụrụ nꞌime ubi ahụ a gbara ogige, gị na Jisọs?” Ma Pita gọkwara agọ sị, “Amaghị m ihe i na-ekwu!” Otu mgbe ahụ oke ọkụkọ kwara akwa. E sitere nꞌụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nꞌụlọ Pailet onye na-achị Jerusalem. Ọ bụkwa nꞌisi ụtụtụ ka ha mere nke a. Ma ndị Juu abanyeghị nꞌụlọ Pailet. Ha achọghị imerụ onwe ha nꞌihi na ọ ga-egbochi ha iri nwa atụrụ e gburu e ji mee mmemme Ngabiga. Pailet pụtara jụọ ha sị, “Gịnị ka unu nwere megide nwoke a? Olee nsogbu unu na ya nwere?” Ha zara ya sị, “Anyị agaraghị ejide ya ma ọ bụrụ na o meghị ihe ọjọọ.” Mgbe ahụ Pailet zara sị ha, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nꞌonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ma ndị Juu ahụ nile sịrị, “Enyeghị anyị ike igbu onye ọ bụla.” Okwu a ndị Juu kwuru mezuru amụma Jisọs buru banyere otu ọ ga-esi nwụọ. Ya mere, Pailet batara nꞌime ụlọ ikpe ya zie ozi ka a kpọọ Jisọs ka ọ bịakwute ya. Mgbe ọ bịara, Pailet jụrụ ya ajụjụ sị, “Gwa m, ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs zara ya sị, “Nke a ọ bụ ihe i chepụtara nꞌuche gị, ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị?” Pailet jụrụ ya sị, “Abụ m onye Juu? Ndị ala gị na ndị isi nchụaja unu duuru gị bịakwute m. Ọ bụ nꞌihi gịnị? Gịnị ka i mere?” Jisọs zara ya sị, “Abụghị m eze nke ụwa a. A sị na m bụ eze nke ụwa a, ndị na-eso ụzọ m gaara alụ ọgụ ịgbochi ndị Juu ijide m. Ma alaeze m abụghị nke ụwa.” Mgbe ahụ Pailet sịrị, “Ọ pụtara na ị bụ eze?” Jisọs zara sị ya, “Otu ahụ ka ọ dị. Amụrị m nꞌihi nke a. Abịakwara m nꞌụwa ịgba ama banyere eziokwu ahụ. Ọ bụkwa ndị ọ bụla hụrụ eziokwu nꞌanya na-ege m ntị.” Pailet jụrụ ya sị, “Gịnị bụ eziokwu ahụ?” Ma tupuu Jisọs asaa ihe ọ bụla Pailet pụrụ nꞌezi jekwuru ndị Juu gwa ha sị, “Ajụọla m nwoke a ajụjụ chọpụta na ọ dịghị ihe kwesịrị ahụhụ o mere. Ma ebe ọ bụ omenala unu ịhapụrụ unu otu onye nꞌafọ nile nꞌoge mmemme Ngabiga unu, unu chọrọ ka m hapụrụ unu nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?” Mgbe ahụ ndị Juu nile zukọrọ nꞌebe ahụ tiri mkpu sị, “Mbaa! Ọ bụghị nwoke a! Barabas ka anyị chọrọ ka ị hapụ!” Ma Barabas bụ onye naapụnara mmadụ ihe nꞌike. Mgbe ahụ Pailet nyere ndị agha ya iwu ka a pịa Jisọs ihe. Ndị agha ya jikwa ogwu kpaa okpu nke ha kpukwasịrị Jisọs nꞌisi ka ọ bụrụ okpueze ya. Ha yinyekwara ya uwe ndị eze. Emesịa, ha kpọrọ isi ala nꞌihu ya, nꞌọnọdụ ịkwa emu, na-asị, “Ka eze ndị Juu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!” Ha jikwa aka ha tie ya ihe otiti. Pailet pụkwara nꞌezi jekwuru ndị Juu sị ha, “Lee! Ana m akpọpụtara unu nwoke a. Maranụ na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọ bụla nꞌime ya.” A kpọpụtara Jisọs ka ndị Juu hụ ya anya. Okpu ogwu ahụ dị ya nꞌisi. O yikwa uwe ahụ ha yinyere ya nꞌahụ. Pailet gwara ndị Juu sị, “Leenụ onye unu chọrọ!” Mgbe ndị isi ndị Juu hụrụ Jisọs, ha bidoro iti mkpu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe! Kpọgide ya nꞌobe!” Pailet zara sị ha, “Kpọrọnụ ya gaa kpọgide ya nꞌonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọ bụla nꞌime ya.” Ndị Juu gwara Pailet sị, “Iwu anyị kwuru na o kwesịrị ịnwụ nꞌihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke!” Mgbe Pailet nụrụ nke a ọ tụrụ egwu nke ukwuu. O duuru Jisọs baa nꞌụlọ ikpe ya, jụọ ya sị, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs egheghị ya ọnụ. Pailet jụrụ Jisọs sị, “Ị̀ chọghị ikwuru m okwu? Ị̀ maghị na m nwere ike ikpọgide gị nꞌobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?” Jisọs zara ya sị, “Ị garaghị enwe ike ọ bụla nꞌebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nꞌelu rute gị aka. Ọ bụ ndị dutere m nꞌebe ị nọ nwere mmehie karịa.” Okwu a mere ka Pailet chọsie ike ịhapụ Jisọs. Ma ndị isi ndị Juu gwara ya sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, i gosiri na ị bụkwaghị enyi Siza. Nꞌihi na onye ọ bụla na-eme onwe ya eze na-edo onwe ya imegide Siza.” Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nye ha. Ọ nọdụrụ ala nꞌoche ikpe ya nꞌebe a na-akpọ Pevumentị. Ihe ndị a mere nꞌihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie nꞌụbọchị ọ ga-abụ o jie, bọọ, mmemme Ngabiga ebido. Pailet sịrị ha, “Leenụ eze unu!” Ma ndị Juu jiri oke olu tie mkpu sị, “Were ya pụọ! Kpọgide ya nꞌobe!” Pailet jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nꞌobe?” Ma ndị Juu zara sị, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza!” Mgbe ahụ Pailet kpọnyere ha Jisọs ka ha kpọgbuo ya. Ndị soja duuru ya pụọ. Jisọs buuru obe ya gaa nꞌebe a na-akpọ Gọlgọta. Nꞌebe ahụ ka ha kpọgidere ya nꞌobe. A kpọgidekwara mmadụ abụọ ọzọ nꞌobe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌaka nri ya, onye nke ọzọ nꞌaka ekpe ya. O nwere ihe Pailet dere kụpanye nꞌelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a, “Jisọs onye Nazaret, Eze Ndị Juu.” Ma ebe a nọkwa kpọgide Jisọs nꞌobe dị nso nꞌobodo Jerusalem. Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe Pailet dere, nꞌihi na o dere ya nꞌasụsụ atọ, Hiburu, Griik na Latin. Emesịa, ndị isi nchụaja bịakwutere Pailet rịọ ya sị, “Gbanwee ihe i dere nꞌelu obe ahụ. Ị garaghị ede na ọ bụ eze ndị Juu, kama na ọ sịrị, ‘Mụ onwe m bụ Eze ndị Juu!’ ” Ma Pailet gwara ha sị, “Agaghị m agbanwe ihe m dere. Ka ọ dịrị otu m siri dee ya.” *** Mgbe ndị agha rụsịrị ọrụ ịkpọgide Jisọs nꞌelu obe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Ma ha ekeghị otu uwe mwụda ya, nꞌihi na a kpara ya akpa. O nweghị ebe a dụkọtara ya adụkọta. Ha gwarịtara onwe ha sị, “Ka anyị hapụ ịdọka uwe a, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere iwere ya.” Ma okwu a mezuru ihe e buru nꞌamụma sị, “Ha kere uwe m nꞌetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwuda m.” Nke a bụ ihe ha mere. Meri, nne Jisọs guzo nso nꞌebe ahụ a kpọgidere Jisọs nꞌobe, ya na nwanne ya nwanyị bụ nwụnye Kleopas na Meri Magdalin. Mgbe Jisọs hụrụ nne ya ka o guzo nso nꞌebe Jọn guzo, Jọn bụ otu onye nꞌime ndị na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nꞌanya, ọ gwara ya sị, “Nwanyị, lee nwa gị nwoke.” Ọ gwakwara Jọn sị, “Lee nne gị.” Site nꞌụbọchị ahụ, Jọn duuru Meri laa nꞌụlọ ya. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs matara na ọ rụzuola ọrụ ya nile. Imezu ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ, o kwuru sị, “Agụụ mmiri na-agụ m.” Ite mmanya ọra dọ nso nꞌebe ahụ. Ndị agha gbara ọsọ were ogbo denye nꞌime mmanya ahụ. Ha kenyere ogbo a nꞌosisi, welie ya elu tinye ya nꞌọnụ Jisọs. Mgbe Jisọs detụrụ ya ọnụ, o tiri mkpu sị, “Ọ gwụchaala!” O hulatara isi ya, kwụsị iku ume. Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị a a kpọgidere nꞌobe nọgide nꞌebe ahụ tutuu chi abọọ. Nꞌihi na echi ya bụ ụbọchị izuike. Ha jekwuru Pailet rịọ ya ka ọ gwa ndị agha ya ka ha gbajisịa ụkwụ ha. Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ka ndị a nwụọ ọsịịsọ. Ọzọ kwa, nꞌihi na ha chọkwara ibupụ ahụ ha. Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ ndị ahụ a kpọgidere nꞌobe nꞌakụkụ Jisọs. Ma mgbe ha bịaruru nꞌebe Jisọs nọ, lee ya anya, ha hụrụ na ọ nwụọla. Nꞌihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. Kama otu onye nꞌime ndị agha ahụ weere ùbe o ji nꞌaka maa Jisọs nꞌakụkụ. Nke a mere ka ọbara na mmiri site nꞌakụkụ ya sọpụta. Akụkọ a bụ eziokwu. Onye dere akụkọ a nọ mgbe ihe ndị a nile na-eme, hụkwa ha. Ọ chọkwara ka unu kwere. Nꞌihi na ihe ndị a nile mezuru ihe akwụkwọ nsọ kwuru. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Otu ọkpụkpụ agaghị agbaji agbaji nꞌahụ ya.” Ọzọ kwa, akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mara ùbe anya.” Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo a na-akpọ Josef, onye si nꞌobodo a na-akpọ Arimatia, jekwuuru Pailet, rịọ ya ka o nye ya ike ibutu ozu Jisọs. Pailet nyere ya ike. Josef gara butuo ozu Jisọs. Nikọdimọs bịakwara nꞌebe ahụ. Nke a bụ nwoke ahụ bịakwutere Jisọs nꞌabalị. O wetara mmanụ otite na-esi isi ụtọ. Ha abụọ, Nikọdimọs na Josef onye Arimatia, kwadoro ozu Jisọs. Ha jiri akwa kechie ahụ ya dị ka omenala ndị Juu si dị. Ebe a nọ kpọgide Jisọs nꞌobe dị nso nꞌebe nwa ọgba ntakịrị dị. Nꞌime ọgba a, otu ili dị ya nke mmadụ ọ bụla na-ejibeghị mee ihe ọ bụla. Nꞌime ili a ka ha dọnyere ozu Jisọs, nꞌihi na ili a dị nso. Ọzọ kwa, Nikọdimọs na Josef na-eme ngwangwa nꞌihi na ha chọrọ imechasị ihe nile tupuu ụbọchị izuike ebido. Nꞌihi na ụbọchị izuike ndị Juu na-ebido nꞌelekere isii nke abalị ụbọchị ahụ. Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị, Meri Magdalin bịara nꞌili ebe e liri Jisọs, hụ na e nupụla nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ. Ọ laghachiri azụ chọta Saimọn Pita na Jọn gwa ha sị, “Ha esitela nꞌime ili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Amaghị m ebe ha bujere ha.” Pita na Jọn jiri ọsọ rute nꞌili ahụ. Ma Jọn gbakarịrị Pita nꞌọsọ buru ụzọ ruo nꞌili ahụ. Ma ọ banyeghị nꞌime ya, kama o nyonyere anya nꞌime ya hụ akwa e ji lie Jisọs ka ha ghasara nꞌala. Mgbe Saimọn Pita rutere, ọ banyere nꞌime ili ahụ. Ọ hụkwara akwa e ji kechie ozu Jisọs ka ha gbasara nꞌala. Akwa e ji kechie isi Jisọs dị otu ahụ ọ dị mgbe e kere ya nꞌisi Jisọs na mbụ. Jọn nꞌonwe ya banyekwara hụ ihe ndị a nile, kwerekwa na Jisọs esitela nꞌọnwụ bilie nꞌezie. Tutuu ruo mgbe ahụ, Jọn aghọtaghị na akwụkwọ nsọ kwuru na Jisọs ga-esi nꞌọnwụ bilie ọzọ. Ọ bụ ugbu a ka ha matara. Mgbe Pita na Jọn hụsịrị ihe ndị a, ha laghachiri nꞌụlọ. Ma Meri lọghachiri, nọgide nꞌili ahụ. O guzoro nꞌakụkụ ya na-akwa akwa. Mgbe ọ nọ na-akwa akwa, o hulatara ala nyoo anya nꞌime ili ahụ. Ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha. Otu nọdụrụ ala nꞌebe ụkwụ Jisọs dị mgbe ọ tọgbọ nꞌili ahụ. Nke ọzọ nọdụkwara ebe isi ya dị. Ndị mmụọ ozi ahụ jụrụ Meri ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji akwa akwa?” Meri zara ha sị, “Ọ bụ nꞌihi na ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” Mgbe Meri kwusịrị okwu a, ọ tụgharịrị hụ otu onye guzo ya nꞌazụ. Onye a bụ Jisọs, ma Meri amaghị na ọ bụ ya. Jisọs jụrụ Meri ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji akwa akwa? Onye ka ị naachọ?” Ebe Meri chere na Jisọs bụ onye na-elekọta ogige ahụ, Meri zara sị ya, “Biko, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ Onyenwe m, gwa m. Gosi m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” Jisọs kpọrọ Meri aha sị, “Meri!” Meri tụgharịrị tie mkpu sị, “Onyenwe m!” Jisọs sịrị ya, “Emetụla m aka nꞌihi na alakwurubeghị m Nna m nꞌeluigwe. Kama gaa chọta ụmụnna m gwa ha na m na-alakwuru Nna m na Nna unu. Ana m alakwuru Chineke m na Chineke unu kwa.” Meri Magdalin hapụrụ ebe ahụ gbara ọsọ gaa chọta ndị na-eso ụzọ Jisọs sị ha, “Ahụrụ m Onyenwe anyị!” O zikwara ha ozi Jisọs ziri ha. Nꞌanyasị ụbọchị ahụ ndị na-eso ụzọ Jisọs zukọtara nọdụ nꞌime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ nile e si abata nꞌụlọ ahụ nꞌihi na ha na-atụ egwu ihe ndị isi ndị Juu ga-eme ha. Ma na mberede, mgbe ha na-atụghị anya ya, Jisọs batara guzo nꞌetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” O gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nꞌihi na ha ahụla Onyenwe ha. Ọzọ kwa Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu. Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” Mgbe ahụ o kusara ha ume sị ha, “Natanụ Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọ bụla mmehie ya, a gbagharala onye ahụ. Ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara onye ahụ mmehie ya, a gaghị agbaghara onye ahụ.” Ma Tọmọs onye a na-akpọ Didimọs otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. Mgbe ndị ọzọ gwara ya na ha ahụla Jisọs, o kweghị. Ọ sịrị, “Ọ bụ nanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ntu kpọpuru ya aka. Ọ bụ nanị mgbe m tinyere aka m nꞌapa ntu ndị a, ọ bụkwa nanị mgbe m tinyere aka m nꞌakụkụ ya ebe a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere na o sitela nꞌọnwụ bilie.” Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nꞌetiti ha. E mechisịrị ụzọ nile. Na mberede, Jisọs batara guzo nꞌetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” Ọ gwara Tọmọs sị ya, “Rụnye mkpịsị aka gị nꞌapa ntu dị m nꞌaka, tinyekwa aka gị nꞌakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe kama kwere!” Tọmọs tiri mkpu sị, “Onyenwe m na Chineke m!” Ma Jisọs zara sị ya, “I kweere ugbu a nꞌihi na i ji anya gị hụ. Ma ngọzi dịịrị ndị na-ahụghị m ma kwere.” Ọ dị ọtụtụ ọrụ ebube ọzọ Jisọs rụrụ nke ndị na-eso ụzọ ya hụrụ. Ma edeghị ha nꞌime akwụkwọ a. Kama e dere ihe ndị a nile ka unu site nꞌịgụ ya kwere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ka unu kwere na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ọ bụrụ na unu ekwere, unu ga-enwe ndụ ọhụrụ site nꞌaha ya. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nꞌakụkụ osimiri Galili. Lee otu o si mee. Ụfọdụ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saịmọn Pita na Tọmọs onye a na-akpọ Didimọs, na Jemes, na Jọn, ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. Saịmọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha zara sị ya, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nꞌime ụgbọ mmiri, pụọ igbu azụ. Ma nꞌabalị ahụ nile ha egbuteghị azụ ọ bụla. Mgbe chi na-abọ ha hụrụ otu nwoke guzo nꞌakụkụ mmiri. Ma ha amataghị na ọ bụ Jisọs. Jisọs kpọkuru ha sị, “Ụmụnta, unu gbutere ihe ọ bụla?” Ha zara sị ya, “È, è.” Ọ gwara ha sị, “Tụnyenụ ụgbụ unu nꞌakụkụ aka nri ụgbọ unu. Unu gaegbutekwa ọtụtụ azụ.” Ha tụnyere ụgbụ ha, ma ha enwekwaghị ike ịdọpụta ya nꞌihi na ọtụtụ azụ dị nꞌime ya, nke mere ka ụgbụ ahụ dị arọ nke ukwuu. Mgbe ahụ Jọn gwara Pita sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saịmọn Pita yiiri uwe ya (nꞌihi na ọ gba ọtọ), wụba nꞌime mmiri gwuru mmiri pụọ gaa nꞌelu ala. Ndị ozi ndị ọzọ nọgidere nꞌime ụgbọ ahụ dọpụta ụgbụ ahụ nke azụ juru nꞌime ya. Ila nọ ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise site nꞌala ọnụ mmiri. Mgbe ha pụtara nꞌelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nꞌelu ya. Achịcha dịkwa nꞌebe ahụ. Jisọs gwara ha sị, “Wetanụ ụfọdụ nꞌime azụ unu gbutere.” Saịmọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nꞌelu ala. Ila dị narị azụ abụọ na iri ise na atọ nꞌime ụgbọ ahụ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị! Emesịa, Jisọs kpọrọ ha sị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime ndị ozi ya jụrụ ya onye ọ bụ. Nꞌihi na ha maara onye ọ bụ. Jisọs weere achịcha ahụ nye ha. Otu aka ahụ o nyekwara ha azụ. Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya malite nꞌoge o si nꞌọnwụ bilie. Mgbe ha risịrị nri, Jisọs kpọrọ Saịmọn Pita jụọ ya sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya karịa ndị a nile?” Pita zara sị ya, “Ee Onyenwe m, ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.” Jisọs jụrụ Pita ajụjụ nke ugboro abụọ sị ya “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya?” Pita zara sị ya, “Ee, Onyenwe m, ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.” Jisọs jụrụ Pita ajụjụ nke ugboro atọ sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya?” O wutere Pita na Jisọs jụrụ ya ajụjụ a nke ugboro atọ. Pita zara sị ya, “Onyenwe m ị maara ihe nile. Ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m. Nꞌezie asị m gị, na mgbe ị bụ okorọbịa i mere ihe dị gị mma nꞌanya. Ị gara ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi ị ga-esite aka gị, mgbe ndị ọzọ ga-edu gị. Ha ga-edu gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” Jisọs kwuru nke a igosi ụdị ọnwụ Pita gaanwụ nꞌihi inye Chineke otuto. Mgbe ahụ, Jisọs sịrị Pita, “Soro m.” Pita chigharịrị hụ onyeozi ahụ naadabere nꞌobi Jisọs ka ọ na-esokwa ha nꞌazụ. Ọ bụ onyeozi ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ banyere onye nꞌime ha ga-arara ya nye. Pita jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, gịnị ka i nwere ikwu banyere nwoke a?” Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ dị ndụ tutuu ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m nꞌazụ.” Ndị ozi Jisọs kwuritara nꞌetiti onwe ha si na onyeozi a agaghị anwụ anwụ. Ma nke a abụghị ihe Jisọs kwuru. Nanị ihe o kwuru bụ, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ dị ndụ tutuu ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụụrụ gị?” Ọ bụ otu onyeozi ahụ bụ onye naagba ama ihe ndị a nile, ma deekwa ha nꞌakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ọ gbara bụ eziokwu. Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha nile nꞌotu nꞌotu nꞌakwụkwọ, ụwa nile agaghị aba akwụkwọ nile a ga-ede banyere ha. Ezi enyi m Teofilọs, nꞌakwụkwọ mbụ m deere gị, agwara m gị ihe banyere Jisọs Kraịst. Agwara m gị ihe banyere ndụ ya, ọrụ ọ rụrụ, na ihe o ziri. Agwakwara m gị otu o siri laghachi nꞌeluigwe mgbe o nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ndị ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya ọ họpụtara. O gosiri ha onwe ya mgbe o si nꞌọnwụ bilie. Ihe ruru iri ụbọchị anọ site na mgbe a kpọgburu ya, ha hụrụ ya na ndụ site nꞌoge ruo nꞌoge. Nꞌụzọ doro anya, o gosiri ha na ọ bụ ya onwe ya ka ha na-ahụ. Nꞌoge a ọ gwara ha okwu banyere alaeze Chineke. Nꞌoge ọ nọnyeere ha o nyere ha iwu ka ha hapụ isite na Jerusalem pụọ. Ọ sịrị ha, “Nọgidenụ na Jerusalem tutuu ruo mgbe unu sị nꞌaka Nna m nata onyinye ahụ o kwere na nkwa dị ka m gwara unu.” Jisọs gwakwara ha sị, “Ọ bụ ezie na Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma tupuu abali ole na ole agafee, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.” Oge ọzọ ya na ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ, ha jụrụ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, o ruola oge ị ga-eme ka Izirel nọdụrụ onwe ha dị ka alaeze nwere onwe ya?” Ma Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata ihe Nna m na-ezube ime, na mgbe ọ na-akwado ime ihe o zubere ime. Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ unu ga-agwa ndị mmadụ nọ na Jerusalem, na Judia, na Sameria, na mmadụ nile nọ na nsọtụ ụwa nile, ihe banyere m.” Ọ dịghị anya, mgbe o kwusịrị okwu ndị a, mgbe ha nọ na-ele ya anya, e weliri ya elu, igwe ojii kpuchiri ya, mee ka ha ghara ịhụkwa ya anya ọzọ. Mgbe ha na-elegide anya ha nꞌelu na-ele ya anya ka ọ na-arịgo, na mberede, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe ọcha ka ha guzoro nꞌakụkụ ha. Mmadụ abụọ ndị a jụrụ ha sị, “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzo nꞌebe a na-ele anya nꞌeluigwe? Jisọs alaala nꞌeluigwe. Otu ụbọchị unu ga-ahụkwa ya anya ọzọ, ka ọ na-alọta dị ka unu hụrụ ya taa, ka ọ na-ala nꞌeluigwe!” Ha nọ nꞌugwu olivu mgbe ihe ndị a na-eme. Emesịa, ha sitere nꞌebe ahụ laghachikwa na Jerusalem. Ugwu olivu adịghị anya site na Jerusalem. Ọ bụ ihe dị ka kilomita abụọ site nꞌebe ahụ. Mgbe ha lọghachiri Jerusalem, ha rigooro nꞌelu ụlọ ahụ ha nọ nꞌime ya. Ndị a bụ ndị nọ nꞌụlọ ahụ: Pita, na Jọn, na Jemes, na Anduru, na Filip, na Tọmọs, na Batalomi, na Matiu, na Jemes nwa Alfiọs, na Saịmọn onye aha ya bụkwa Zilọt, na Judas nwa Jemes. Ha nile jikọtara onwe ha ọnụ na-ekpe ekpere site nꞌoge ruo nꞌoge. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna Jisọs. Ọ bụ nꞌoge a, mgbe ihe dị ka narị ndị kwere ekwe na iri abụọ zukọtara ka Pita biliri ọtọ nꞌetiti ha gwa ha okwu sị, “Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nꞌọnụ Devidi kwuo okwu nꞌoge gara aga. Judas bụ otu nꞌime anyị. O nwere òke nꞌime ọrụ a, nꞌihi na a họpụtara ya dị ka e si họpụta anyị. Ma ego ọ natara nꞌihi ọrụ ọjọọ ya ka o ji zụọ ala. Nꞌime ala ahụ ka ọ nọkwa daa ada, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa. Ndị nile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nꞌihi ya ha kpọrọ ala ahụ Judas zụrụ Ala Ọbara. E dere ya nꞌakwụkwọ Abụ Ọma sị, ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nꞌefu. Ka mmadụ ọ bụla hapụ ibi nꞌime ya. Ka onye ọzọ narakwa ọrụ ya.’ “Nꞌihi ya, anyị ga-ahọpụta onye ọzọ nꞌọnọdụ ya. Ka ọ bụrụ otu nꞌime anyị. Ka o soro anyị gbakọọ ama banyere mbilite nꞌọnwụ Jisọs. Ka anyị site nꞌetiti anyị họpụta onye naara eso anyị na-ejegharị site na mbụ, site nꞌoge Jọn mere baptizim ya tutuu ruo nꞌụbọchị ahụ Jisọs laghachiri nꞌeluigwe.” *** Ụmụnna ahụ họpụtara mmadụ abụọ, Matayas na Josef Jọstus. Aha ọzọ a na-akpọ Josef Jọstus bụ Basabas. Ha kpere ekpere rịọ Chineke ka o gosi ha onye ha ga-ahọrọ nꞌime mmadụ abụọ ahụ. Otu a ka ha si kpee ekpere ahụ: “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ nile. Gosi anyị onye ị họpụtara nꞌime mmadụ abụọ ndị a ka ọ bụrụ onyeozi ga-anọchi anya Judas Iskariọt, onye gara ebe o kwesịrị ka ọ gaa.” *** Mgbe ha kpesịrị ekpere, ha fere nza. Nza ahụ makwara Matayas. Ọ bụ ya ka ha họpụtara, gụnye ya ka ọ bụrụ otu nꞌime ndị ozi iri na abụọ ahụ. Nꞌụbọchị mmemme owuwe ihe ubu, nke bụ Pentikọọsụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst nile zukọrọ nꞌotu ebe. Na mberede, ha nụrụ ụzụ si nꞌeluigwe. Ụzụ a dị nꞌụdị ifufe dị ike. Ụzụ ahụ jupụtara nꞌụlọ ahụ ha nọ. Ndị na-eso ụzọ Kraịst hụrụ ihe yiri ire ọkụ. Ire ọkụ ndị a nọkwasịrị nꞌisi ha nile nꞌotu nꞌotu. E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ. Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ha si na mba dị iche iche bịa Jerusalem. Mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, ha nile gbakọtara. Ihe ha hụrụ juru ha anya! Nꞌihi na ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-asụ asụsụ nke onye ọ bụla nꞌime ha na-aghọta. Ndị si ebe dị iche iche bịa, nụrụ ka ndị a na-ekwu okwu nꞌasụsụ nke ha. Ihe ndị a juru ha anya. Ha jụrịtara onwe ha sị, “Ndị a ha esighị Galili? Gịnị mere o ji bụrụ na anyị na-anụ okwu ha nꞌasụsụ anyị dị iche iche? Anyị na-anụ ka ha na-asụ asụsụ ndị Patia, na nke ndị Mid, na nke ndị Elam, na nke ndị Mesopotamia, na nke ndị Judia, na nke ndị Kapadosia, na nke ndị Pọntus, na nke ndị Esia, na nke ndị Frigia, na nke ndị Pamfilia, na nke ndị Ijipti, na asụsụ mba dị gburugburu Libiya, na nke ndị Sirini. Anyị ndị ọbịa site na Rom, ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu, ndị Krit, na ndị si Arebia, lee, anyị na-anụ okwu ha na-ekwu banyere ọrụ ebube Chineke na-arụ.” O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụkwa?” Ma ụfọdụ ndị ọzọ nọ na-achị ha ọchị na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.” Ma Pita guzoro ọtọ nꞌoge ahụ. Ndị ozi iri na otu fọdụrụ guzokwara nꞌakụkụ ya. Nꞌoke olu Pita gwara igwe mmadụ ahụ nile okwu sị, “Ndị Judia! na unu ndị bi na Jerusalem, geenụ ntị ka m kọwaara unu ihe ndị a. Geekwanụ ntị nꞌokwu m chọrọ ikwu! Anyị abụghị ndị mmanya na-egbu dị ka ụfọdụ nꞌetiti unu kwuru. Lee, ọ bụ nanị elekere toolu nke ụtụtụ na-akụ! Kama ihe unu ji anya unu hụ taa bụ mmezu amụma ahụ Joel onye amụma buru nꞌoge ya. Nꞌihi na Joel buru amụma sị, ‘Nꞌoge ikpeazụ, nke a bụ ihe na-aghaghị ime, dị ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m awụkwasị mmadụ nile Mmụọ m. Nꞌoge ahụ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okorọbịa unu ga-ahụ ọhụ. Ndị okenye nꞌetiti unu ga-arọkwa nrọ. Ndị bụ ohu nꞌetiti unu, nwoke ha na nwanyị nꞌime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma. A ga-eme ka ihe ịtụnanya dị iche nke anya unu ga-ahụ mee na mbara eluigwe. Aga m arụkwa ọrụ ebube nꞌụwa. Unu ga-ahụ ọbara na ọkụ, na anwụrụ ọkụ bara ụba, dị ka igwe ojii. Nꞌụbọchị ahụ, anwụ agaghị enyekwa ìhè, kama ọ ga-aghọ ọchịchịrị. Ọnwa ga-adịkwa ka ọbara. Ihe ndị a nile ga-emezu tupuu o ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị. Nꞌoge ahụ, ọ ga-abụkwa, na onye ọ bụla ga-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta!’ “Ndị Izirel, geenụ ntị nꞌokwu m chọrọ ikwu. Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu na ọ bụ ya zitere ya. Chineke gosiri nke a site nꞌọrụ ebube nile Chineke rụrụ nꞌetiti unu site nꞌaka ya. Unu maara na nke a bụ eziokwu. Ma ya ka e weere nye, site nꞌizu Chineke bururị ụzọ tụọ atụmatụ ya, dị ka Chineke siri mata na mbụ na a ga-arara ya nye. Ọ bụ ya ka unu kpọgidere nꞌobe site nꞌinye aka ndị na-amaghị Chineke. Ma Chineke emeela ka ọ dịkwa ndụ ọzọ! Chineke tọpụrụ ya site nꞌagbụ nke ọnwụ, nꞌihi na ọ bụ ihe rara ahụ na ọnwụ ga-emeri ya. “Devidi kwuru okwu a banyere Jisọs, ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgidekwa nꞌihu m. Ọ nọkwa nꞌaka nri m. Obi m agaghị emekwa mkpatụ. Nꞌihi nke a ọṅụ jupụtara m obi. Ire m na-agbakwa ama banyere obi ụtọ m. Nꞌihi na amaara m na anụ ahụ m agaghị anọgide na-enweghị olileanya. Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m nꞌala mmụọ. Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke onye gị dị nsọ ka o ree ure. I gosila m ụzọ nke ndụ. I meekwala ka ọṅụ m gbaa ụfụfụ dị ka ụfụfụ mmanya dị ike, nꞌihi na anọ m nꞌihu gị.’ “Ụmụnna m, cheenụ echiche banyere nna nna anyị Devidi. Unu maara na ọ nwụrụ, e lie ya. Ebe e liri ya ka anyị nile mazuru taa. Ma Devidi kwuru okwu ndị a dị ka onye amụma. Ọ maara na Chineke kwere ya nkwa na ọ ga-eme ka otu nꞌime ụmụ ya nọkwasị nꞌocheeze ya. Ya mere Chineke jiri mee ka Devidi mata ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu. Devidi hụrụ, kwuokwa okwu banyere mbilite nꞌọnwụ nke Kraịst. Ọ hụrụ na a hapụghị mkpụrụ obi Kraịst nꞌala mmụọ. Ọ hụkwara na anụ ahụ ya erekwaghị ure. Ọ bụ Jisọs a, nke Devidi buru amụma banyere ya, ka Chineke kpọlitere site nꞌọnwụ! Anyị nile bụkwa ndị akaebe mbilite nꞌọnwụ ya. “Ugbu a, e buliela Jisọs elu. Ọ nọdụrụ nꞌakụkụ Chineke nꞌocheeze ya nꞌeluigwe. Ọ natala nkwa nke Mmụọ Nsọ, site nꞌaka Chineke. Ugbu a ọ na-awụsịkwa ike Mmụọ Nsọ ahụ. Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe na nke a bụ eziokwu. “Ọ dịghị oge Devidi jiri rigoro gaa nꞌeluigwe. Ma ya onwe ya sịrị, ‘Chineke gwara Onyenwe m, nọdụ nꞌebe a nꞌaka nri m, tutuu ruo mgbe m mere ka ndị iro gị bụrụ ihe ịtụkwasị ụkwụ nye gị.’ “Ya mere, ana m eme ka ndị Izirel nile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs onye unu kpọgidere nꞌobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Onye nzọpụta!” Mgbe ndị mmadụ nụrụ ihe ndị a Pita kwuru, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha jụrụ Pita na ndị ozi iri na otu ahụ ajụjụ sị, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?” Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ. Nꞌihi na Chineke kwere unu nkwa a, unu na ụmụ ụmụ unu. Nkwa a dịkwara mmadụ nile nꞌebe nile. Ọ dịrị onye ọ bụla Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ọ bịakwute ya!” Pita gwara ndị mmadụ ahụ okwu nꞌụzọ dị iche iche. Ọ gwara ha ihe ọzọ banyere Kraịst, rịọ ha na-asị, “Sitenụ nꞌetiti ndị ọjọọ jupụtara nꞌala a zọpụta onwe unu!” Ndị nile nabatara okwu Pita sitere nꞌọgbakọ ahụ pụta. E mere ha baptizim. Nꞌụbọchị ahụ, ihe ruru puku mmadụ atọ nabatara Kraịst. Ha dịnyeere ndị kwere ekwe. Ha jiri oge nile ha nwere na-anụ ihe ndị ozi Kraịst na-ezi ha. Ha kenyere ndị ọzọ ihe ha nwere. Ha nile jupụtara nꞌegwu nꞌihi na Chineke mere ka ha mata na ọ nọ nꞌetiti ha. Nꞌihi na ndị ozi Kraịst rụrụ ọrụ ebube dị iche iche. Ndị nile kwere ekwe zukọtara mgbe nile na-enwekọ ihe nile ọnụ. Mmadụ ọ bụla agụghị ihe ọ bụla dị ka nke aka ya nanị. Ha rere ihe ha nwere, kee ego ọ bụla ha retara ka o ruo onye ọ bụla, dị ka o siri na-akpa ya. Ụbọchị nile, ha na-ezukọ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ikpe ekpere. Ha na-ezukọkwa nꞌụlọ ndị kwere ekwe dị iche iche, mmadụ ole na ole, iri oriri nsọ. Ha jiri ọṅụ na-eri nri ha, site nꞌobi ekele. Ha nọgidere ito Chineke. Chineke mekwara ka udo dị nꞌetiti ha na ndị bị na Jerusalem. Chineke mekwara ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị a na-azọpụta. Ndị a a zọpụtara na-ejikọ onwe ha nꞌọgbakọ ndị nile kwere ekwe. Nꞌotu ụbọchị, Pita na Jọn gara nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ikpe ekpere. Ihe a mere nꞌelekere atọ nke ehihie. Mgbe ha ruru ọnụ ụzọ e si abanye, ha hụrụ otu nwoke e butere dote nꞌọnụ ụlọ nsọ ahụ. Nwoke a dara ngwụrọ. A mụkwara ya nꞌọnọdụ ngwụrọ, site nꞌafọ nne ya. Oge nile ka a na-ebute ya dote ya nꞌọnụ ụzụ ahụ, ka ọ na-arịọ arịrịo. Aha ọnụ ụzọ a, ebe e dotere ya bụ Ọnụ ụzọ ọma. Mgbe onye ngwụrọ a hụrụ Pita na Jọn, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ. Ma Pita na Jọn legidere ya anya. Mgbe ahụ Pita sịrị ya, “Lee anyị anya!” Nwoke ahụ letre anya. Ọ na-ele anya na ha ga-enye ya onyinye. Ma Pita sịrị ya, “Enweghị ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo m ga-enye gị. Ma aga m enye gị ihe m nwere. Site nꞌaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gaa ije!” Mgbe ahụ Pita jidere ya nꞌaka dọlie ya elu. Nọtu mgbe ahụ, ụkwụ onye ngwụrọ ahụ gbasikwara ike ọzọ. Ọ wụliri ọtọ, bido ịga ije! O sooro Pita na Jọn baa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Ọ na-aga, ọ na-awụli elu, na-eto Chineke. Ndị nile nọ nꞌebe ahụ hụrụ nwoke ahụ ka ọ na-agagharị na-eto Chineke. Ha ghọtara na ọ bụ onye ngwụrọ ahụ, nke na-arịọ arịrịọ nꞌọnụ ụzọ ụlọ nsọ ukwu Chineke. O juru ha anya ịhụ ya ka ọ na-aga ije ọzọ. Ma dị ka nwoke ahụ siri jide Pita na Jọn aka, ndị mmadụ gbara ha gburugburu, nꞌakụkụ ụlọ nsọ ahụ a na-akpọ Mgbe ụlọ Solomọn. O juru ha anya nke ukwuu. Mgbe Pita hụrụ ọtụtụ mmadụ ka ha gbara ya gburugburu, ọ gwara ha okwu sị, “Ndị Izirel, gịnị mere ọnọdụ nwoke a ji na-eju unu anya? Unu na-ele anyị anya dị ka ọ bụ anyị onwe anyị mere ka nwoke a gaa ije site nꞌike anyị na ịdị nsọ anyị. Chineke nke Eberaham, na Aịzik na Jekọb, Chineke nna nna anyị ha, asọpụrụla onyeozi ya Jisọs. Ọ bụ Jisọs ahụ unu nyefere ka e kpee ya ikpe. Jisọs ahụ unu jụrụ nꞌihu Pailet mgbe Pailet kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa! Ma unu gọnarịrị onye dị nsọ na onye ezi omume ahụ. Unu rịọrọ Pailet ka ọ hapụrụ unu ogbu mmadụ kama Jisọs. Ma unu gburu Jisọs bụ Onyenwe anyị na Onye na-enye ndụ. Ma Chineke akpọlitela ya site nꞌọnwụ. Anyị na-gbakwa ama na o biliri nꞌọnwụ nꞌezie! Ọ bụ okwukwe nwoke a nwere nꞌaha Jisọs ka e ji mee ka ọ dịkwa ike ọzọ. Unu nile na-ahụ ya. Unu makwaara ya. Ee! Okwukwe ya mere ka ahụ dị ya mma, dị ka unu ji anya unu na-ahụ! “Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu jụrụ Jisọs site na-amaghị ama. Amakwaara m na ọ bụ site na-amaghị ama ka ndị isi unu ji jụkwa ya. Otu ọ dị, Chineke esitela nꞌọrụ na omume unu mezuo ihe o kwuru na ọ ghaghị imezu site nꞌọnụ ndị amụma nꞌoge gara aga. Nꞌihi na ndị amụma kwuru na Kraịst ga-ahụ ahụhụ. “Chegharịanụ ugbu a, lọghachikwutenụ Chineke! Ọ ga-ehichapụ mmehie unu. Onyenwe anyị ga-emekwa ka agbamume nke ime mmụọ rute unu aka. Ọ ga-ezitekwara unu Jisọs Onye nzọpụta ahụ unu na-ele anya ya. Onye nọ nꞌeluigwe ugbu a. Ebe ahụ ka ọ ga-anọgide tutuu e dozie ihe nile. Nꞌihi na otu a ka Chineke kwuru site nꞌọnụ ndị amụma ya na mgbe ochie. Mosisi nꞌonwe ya kwuru nꞌoge nke ya sị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu ga-eme ka onye amụma ọzọ bilie site nꞌetiti unu. Chineke ga-ahọpụta ya dị ka o si họpụta m. Ọ bụ onye ahụ ka unu ga-ege ntị ime ihe ọ bụla ọ gwara unu. Onye ọ bụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị ka a ga-ala nꞌiyi, site nꞌetiti ndị mmadụ.’ “Ee, ndị amụma nile site na Samuel, na ndị nile bịara nꞌazụ ya, ndị ziri ụmụ Izirel ihe, kwuru okwu banyere ihe ndị a. Unu bụ ndị ketara ozi ndị amụma. Unu ketakwara ọgbụgba ndụ nna nna unu ha na Chineke gbara. Nꞌihi na Chineke gwara Eberaham sị, ‘Site nꞌotu nwa gị ka a ga-agọzi mba nile nke ụwa.’ Ọ bụ unu ka Chineke buru ụzọ zitere Okpara ya Jisọs ka ọ gọzie, mgbe o sitere nꞌọnwụ kpọlite ya. Ka o mee ka onye ọ bụla site na mmehie ya tụgharịa.” Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ okwu, ndị nchụaja na ndị isi agha na-eche ụlọ nsọ ukwu ahụ, bịakwutere ha. Ụfọdụ ndị Sadusii sokwa ha bịa. Ha were iwe nꞌihi na Pita na Jọn na-ezi ndị mmadụ ihe. Ha na-ezi ha na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilie ọzọ. Ha ji mbilite nꞌọnwụ Jisọs na-ama atụ. Ha jidere Pita na Jọn tinye ha nꞌụlọ mkpọrọ, ka ha nọdụ nꞌebe ahụ ruo nꞌechi ya. Nꞌihi na oge e jidere ha bụ nꞌoge anyasị. Otu ọ dị, ndị nụrụ ihe ha kwuru kwenyere. Nꞌụbọchị ahụ ihe dị ka puku mmadụ ise kweere! Nꞌụtụtụ echi ya, ndị na-achị achị, ndị okenye na ndị ozizi iwu, na Anas onyeisi nchụaja, na Kaifas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ, bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja, zukọtara na Jerusalem. A kpọpụtara Pita na Jọn nꞌihu ha. Ha jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ bụ site nꞌike onye, na site nꞌaha onye, ka unu ji mee ihe ndị a?” Nꞌoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha sị, “Unu ndị na-achị achị, na ndị okenye ala anyị. Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke a si bụrụ onye ahụ dị mma, aga m agwa unu. Ka ụmụ Izirel nile matakwa! A gwọrọ nwoke a guzo nꞌebe a site nꞌike Jisọs Kraịst onye Nazaret. Ọ bụkwa Jisọs ahụ unu kpọgidere nꞌobe, onye Chineke kpọlitere site nꞌọnwụ. Ọ bụ site nꞌike Jisọs Kraịst ka nwoke a ji guzo nꞌihu unu, dị ka onye ahụ zuru oke. Jisọs dị ka nkume nke unu bụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ. Ma ugbu a ọ ghọọla nkume dị mkpa nꞌụlọ ahụ. O nweghị onye ọzọ pụrụ ịzọpụta anyị. Chineke ahọpụtakwaghị aha ọzọ nꞌụwa nile nye ụmụ mmadụ, nke a ga-esite na ya zọpụta anyị.” Mgbe ha hụrụ na Pita na-ekwusi okwu ike, na-atụghị ụjọ, chọpụtakwa na ha bụ ndị na-amaghị akwụkwọ, ndị a na-azụghị nꞌụlọ akwụkwọ ndị Juu, ndị mmadụ efu, o juru ha anya! Ma mgbe ahụ ha chetara na ha bụ ndị ha na Jisọs yịkọrọ. Ọzọ kwa, mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nꞌihu ha, ha enweghị okwu ọ bụla ha nwere ikwu megide nke Pita kwuru. Ihe ha mere bụ ịsị ha pụọ nꞌụlọ ikpe ahụ. Mgbe ha pụrụ, ha bidoro ịgba izu nꞌetiti onwe ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ na ha rụrụ ọrụ ebube pụrụ iche. Ndị bi na Jerusalem anụlarị ihe banyere ọrụ a. Kama ime ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị sị ha kwụsị ịgwa onye ọ bụla okwu banyere nwoke a bụ Jisọs.” Ha kpọrọ ha nye ha iwu sị ha kwụsị ikwu okwu, ma ọ bụ izi ihe nꞌaha Jisọs. Ma Pita na Jọn sịrị, “Kpeenụ ikpe a nꞌọnwe unu. Ò ziri ezi nꞌanya Chineke irubere unu isi karịa irubere Chineke isi? Nꞌuche anyị, ọ bụ ihe rara ahụ ịkwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ!” Ndị ikpe ahụ dọkwara ha aka na ntị ọzọ, hapụ ha ka ha laa, ebe ọ bụ na o nweghị iwu ọ bụla ha dara nke pụrụ iwetara ha ahụhụ. Otu ọ dị, ha hapụkwara ha nꞌihi na mmadụ nile na-ekele Chineke ekele nꞌihi ihe a mere. Nwoke ahụ ha gwọrọ agafeela iri afọ anọ. Mgbe a hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị enyi ha ihe ndị nchụaja na ndị okenye gwara ha. Mgbe ha nụrụ akụkọ a, ha nile jiri otu obi kpọkuo Chineke sị, “Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe nile dị nꞌime ha. Ọ bụ gị mere ka Mmụọ Nsọ kwuo okwu site nꞌọnụ Devidi sị, ‘Gịnị mere mba nile ji na-agbọ ụfụfụ? Gịnị mere ha ji ezube nzube nzuzu imegide gị, Chineke? Ndị eze nke ụwa ejikerela onwe ha. Ndị na-achị achị ezukọtakwala imegide Onyenwe anyị na onye ahụ ọ họpụtara.’ Nꞌihi na Herọd, na Pailet na ndị ụwa nile, na ndị Izirel ezukọtaala imegide Jisọs, Ohu gị dị nsọ, onye ị họpụtara ka ọ bụrụ Onye nzọpụta! Ha zukọtara ime ihe i zubere kwadookwa na ha aghaghị ime. Ugbu a Onyenwe anyị, lee ịba mba ha nile. Nyere ndị ozi gị aka ikwusa okwu gị na-atụghị ụjọ. Nyere anyị aka site nꞌisetipụ aka gị ịgwọ ndị ọrịa, na ime ihe ịrịba ama na ịrụ ọrụ ebube site nꞌike Jisọs, Ohu gị dị nso.” Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nꞌime ya mara jijiji. Ha nile jupụtakwara na Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu ikwusa ozi ọma Chineke na-atụghị ụjọ. Ndị nile kwere ekwe nwere otu obi. O nweghị onye ọ bụla gụrụ ihe ọ bụla o nwere dị ka nke aka ya. Kama ha mere ka ndị ọzọ keta oke nꞌihe ha nwere. Ndị ozi Kraịst gara nꞌihu na-agba ama banyere mbilite nꞌọnwụ Onyenwe anyị Jisọs site nꞌike nile. Ngọzị Chineke dịnyeere ha. O nweghị onye ihe kọrọ nꞌetiti ha. Nꞌihi na ndị nile nwere ala na ụlọ rere ha, wetakwa ego ha retara, nye ya ndị ozi Kraịst. E kekwara ya ka onye ọ bụla keta dị ka mkpa ya si dị. Josef, onye a na-akpọkwa Banabas, nke aha ya pụtara Nwa nkasịobi, onye agbụrụ Livayị, na onye obodo Saịpros, rere ala ya. O wetakwara ego o retara nye ndị ozi. Ma ọ dị otu nwoke a na-akpọ Ananayas. Ya na nwụnye ya Safaịra gbara izu ree ala ha nwere. Ma ha ewetaghị ego nile ha retara. Ananayas zoro ụfọdụ nꞌime ego ahụ. Safaịra nwụnye ya matakwara. O kwenyere ka di ya zoo ego ahụ. Ma ego ha kwekọtara iwepụta ka Ananayas wetara nye ndị ozi. Ma Pita maara ihe Ananayas mere. Ọ sịrị ya, “Gịnị mere i ji kwenye ka ekwensu na-achị nꞌobi gị ime ka ị ghọgbuo Mmụọ Nsọ? Gịnị mere ekwensu ji mee ka i kwere izo ụfọdụ nꞌime ego i retara? Mgbe a na-erebeghị ala ahụ, ala ahụ ọ̀ bụ nke onye? Ọ bụghị nke gị? Mgbe i rere ya ego i retara ọ̀ bụkwaghị nke gị, iji mee ihe ị chọrọ? Gịnị mere i ji mee ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghọgburu, ọ bụ Chineke ka ị ghọrọ aghụghọ.” Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nꞌala nwụọ. Ndị nile nụrụ ihe mere tụrụ egwu. Ụmụ okorọbịa ndị nọ nꞌebe ahụ batara jiri akwa kee Ananayas bupụ ya, gaa lie ya. Mgbe awa atọ gasịrị, Safaịra nwụnye Ananayas batara. Ọ matabeghị ihe ọ bụla banyere ihe mere di ya. Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Gwa m, ego ole ka unu rere ala ahụ?” Safaịra gwara na ọ bụ ihe ahụ di ya gwara ya. Pita sịrị ya, “Gịnị mere gị na di gị ji gbakọọ izu ịkpasu Mmụọ Nsọ iwe? Gee ntị! Nzọ ụkwụ ị na-anụ bụ nzọ ụkwụ ụmụ okorọbịa liri di gị. Ha ga-ebupụkwa gị!” Nꞌotu oge ahụ Safaịra dara nꞌihu Pita nwụọ. Ụmụ okorọbịa ahụ liri di ya batakwara buru ya pụọ gaa lie ya nꞌakụkụ ebe ha liri di ya. Oke egwu tụrụ nzukọ Kraịst nile. Oke egwu tụkwara ndị nile nụrụ akụkọ ndị a. Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịtụnanya dị ukwuu nꞌetiti ndị mmadụ. Ndị kwere ekwe nile jiri otu obi zukọọ na mpaghara ụlọ nsọ ukwu Chineke a na-akpọ Mgbe ụlọ Solomọn. Ndị ọzọ tụrụ egwu ịdịnyere ha. Ma ọtụtụ mmadụ kwuru okwu dị mma banyere ha. Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị kwere nꞌOnyenwe anyị dịnyeere ha, nwoke na nwanyị. Nꞌihi ọrụ ebube ndị ozi rụrụ, ọtụtụ bupụtara ndị enyi ha na ndị ikwu ha nꞌụzọ, bụ ndị ahụ na-esighị ike. Ha nyibere ha nꞌụte ma ọ bụ nꞌihe ndina ọzọ. Nzube ha bụ na ọ bụrụ na Pita agafee ha, onyinyo ya ga-eme ka ahụ dị ha mma. Igwe mmadụ zukọrọ site nꞌobodo dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị na-arịa ọrịa, na ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Ndị ozi mekwara ka ahụ dị ha mma. Ihe ndị a nile mere ka onyeisi nchụaja na ndị enyi ya, na ndị Sadusii megharịa ahụ. Ha jupụtara nꞌiwe na ekworo. Ha jidere ndị ozi a tinye ha nꞌụlọ mkpọrọ. Ma nꞌabalị ahụ, Onyenwe anyị zitere mmụọ ozi ya. Mmụọ ozi ahụ meghere ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ, dupụta ndị ozi ahụ, gwa ha okwu sị, “Gaanụ, guzonụ nꞌụlọ nsọ ụkwụ Chineke gwa ndi mmadụ ihe banyere ndụ ọhụrụ a!” Ndị ozi ahụ pụrụ dị ka mmụọ ozi gwara ha. Nꞌisi ụtụtụ ha banyere nꞌụlọ nso ukwu Chineke bido izi ihe. Mgbe e mesịrị, onyeisi nchụaja na ndị enyi ya, batara nꞌụlọ nzukọ ha. Onyeisi nchụaja kpọrọ nzukọ ndị na-achị achị. Ndị bịara nzukọ a bụ ndị okenye ndị Juu, ndị na-anọchite anya ụmụ Izirel nile. Mgbe ha zukọrọ, onyeisi nchụaja ziri ndị uwe ojii ka ha gaa kpụta ndị ozi site nꞌụlọ mkpọrọ. Ma ndị uwe ojii ahụ ahụghị ha nꞌụlọ mkpọrọ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ onyeisi nchụaja ihe ha hụrụ. Ha gwara ha sị, “Anyị hụrụ na a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ. Ndị nche guzokwa nꞌọnụ ụzọ. Ma mgbe anyị meghere ụzọ, o nweghị onye nọ nꞌime ụlọ ahụ!” *** Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọ nsọ ukwu Chineke na ndị isi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị. Ha amaghị ihe ha ga-akpọ nke a. Ma nꞌotu oge ahụ, otu onye batara gwa ha sị, “Lee! Ndị unu tinyere nꞌụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke na-ezi ụmụ mmadụ ihe!” Otu mgbe ahụ, onyeisi agha na ndị agha ya gara nꞌụlọ nsọ ahụ. Ha jidere ndị ozi ahụ kpụta ha nꞌihu nzukọ ndị na-achị achị ahụ. Ma ha ejighị ike mee nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume, ma ọ bụrụ na ha emesie ndị ozi ahụ ike. Mgbe a kpụtara ha nꞌihu nzukọ ahụ onyeisi nchụaja bidoro ịjụ ha ajụjụ na-asị, “Ọ bụ na m adọghị unu aka na ntị sị unu kwụsị izi onye ọ bụla ihe ọ bụla banyere aha a? Lee ihe unu mere ugbu a! Ozizi unu ejula Jerusalem! Unu chọkwara ka ndị mmadụ taa anyị ụta nꞌihi ọnwụ nwoke a!” Ma Pita na ndị ozi ọzọ nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Anyị enweghị ike ịhapụ ime ihe Chineke chọrọ. Anyị agaghị emekwa ihe mmadụ chọrọ. Chineke nna nna anyị akpọlitela Jisọs site nꞌili. Ọ bụkwa otu Jisọs ahụ unu gburu site nꞌịkpọgbu ya nꞌelu obe. Chineke ebuliela ya elu mee ya ka ọ nọdụ nꞌaka nri ya, ka ọ bụrụ Onyendu na Onye nzọpụta, iwetara Izirel nchegharị, na mgbaghara mmehie. Anyị na-agbakwa ama na ihe ndị a bụ eziokwu. Otu a kwa, Mmụọ Nsọ, onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi, na-agbakwa ama.” Mgbe ndị nọ na nzukọ ahụ nụrụ ihe ndị a, okwu a bara ha nꞌobi dị ka a ga-asị na e ji mma dụọ ha. Nke a mere ka ha jupụta nꞌọnụ ma. Ha kpebiri igbu ha. Ma otu nwoke guzoro ọtọ nꞌime ha. Ọ bụ onye Farisii. Aha ya bụ Gamaliel. Ọ bụ onye ozizi iwu. Ọ bụkwa onye a maara ama na onye a na-asọpụrụ. Nwoke a nyere iwu ka a kpọpụ ndị ozi nꞌezi nwa oge nta. Ọ gwara nzukọ ahụ okwu sị, “Ndị Izirel, jienụ onwe unu aka banyere ihe unu na-ezube ime ndị a! Nꞌihi na ọ dịbeghị anya mgbe Teodas gosiri onwe ya kwuo na ọ bụ mmadụ pụrụ iche. Chetanụ na e gburu ya. Ndị nile na-eso ya ka e mere ka ha gbasasịa. Ihe nile banyere ya gwụsịrị. “Mgbe e mesịrị, Judas onye Galili gosikwara onwe ya nꞌoge a na-agụ mmadụ ọnụ sị na ọ bụ mmadụ dị mkpa na mmadụ dịkwa ukwuu. O nwetakwara ndị sooro ya, ma ya onwe ya lakwara nꞌiyi. Otu a kwa, ndị nile sooro ya gbasasịrị. “Ya mere, nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu taa. Hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, mgbe na-adịghị anya ọ ga-emebi. Ọ bụrụkwanụ na ọrụ ha bụ ọrụ Chineke, bụrụkwa nke ha na-arụ dị ka nzube ya si dị, unu enweghị ike ịkwatụ ya, ma ọ bụ ịkwụsị ya. Ọ bụrụ ọrụ Chineke ka unu na-agbalị ịkwụsị, unu ga-achọpụta na unu na-edo onwe unu imegide Chineke.” Nzụkọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi Kraịst ahụ tie ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nꞌaha Jisọs. Mgbe e mesịrị, ha hapụrụ ha ka ha laa. Ma ndị ozi ahụ jiri ọṅụ hapụ nzukọ ahụ. Ha na-aṅụrị ọṅụ nꞌihi na Chineke nyere ha ugwu ịhụ ahụhụ ihere nꞌihi aha Jisọs. Ụbọchị nile, nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, na nꞌụlọ ndị kwere ekwe dị iche iche, ndị ozi ahụ gara nꞌihu izi ihe na ikwusa ozi ọma Jisọs Kraịst. Nꞌoge ahụ, mgbe ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na-aba ụba, esemokwu dapụtara nꞌetiti ndị kwere ekwe na-asụ asụsụ Griik na ụmụnna ha ndị Juu. Esomokwu a dapụtara nꞌihi na ụfọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ adịghị eketa nri kwesịrị ịbụ nke ha oge nile a na-eke ya. Nꞌihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ nzukọ ndị nile kwere ekwe sị ha, “O zighị ezi na anyị ga-akwụsị ikwusa ozi ọma Chineke bido na-eke nri. Nꞌihi nke a ụmụnna anyị, sitenụ nꞌetiti unu họpụta ụmụ nwoke asaa unu tụkwasịrị obi nke ọma. Ha ga-abụ ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ, bụrụkwa ndị maara ihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nꞌaka. Ma anyị ga-ewerekwanụ ọrụ ikpe ekpere, na ọrụ nile metụtara izisa ozi ọma.” Mmadụ nile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke tozuru oke nꞌokwukwe, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, na Prokorọs, na Nikanọ, na Timọn, na Pamenas, na Nikolas, onye Antiọk. Na mbụ Nikolas bụrị onye Griik na-efe Chineke nꞌụzọ ndị Juu si efe ya. Ha kpọtaara ndị ozi mmadụ asaa ndị a ha họpụtara. Ndị ozi kpeere ha ekpe, bikwasịkwa ha aka nꞌisi. Okwu Chineke gbasara. Ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe bakwara ụba. Nꞌoge a ọtụtụ ndị nchụaja nabatara Jisọs Kraịst. Stivin, nwoke jupụtara nꞌamamihe na ike Chineke, rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ụrụ ịtụnanya dị ukwuu. Ma ụfọdụ ndị Juu, ndị na-aga ụlọ nzukọ ndị Juu a na-akpọ Nzukọ ndị nweere onwe ha, na ụfọdụ mmadụ ndị si Sisilia nke dị nꞌakụkụ Esia, bidoro ịrụsị Stivin ụka. Ma Stivin maara ihe nke ukwuu, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ya mere, ndị Juu a enweghị ike imegide ya. Nꞌihi ya ha zụrụ ụfọdụ mmadụ, ndị boro ya ebubo ụgha sị, “Anyị nụrụ ka Stivin na-ekwu okwu ọjọọ banyere Mosisi na Chineke.” Site nꞌokwu a, ha kpasuru ndị mmadụ iwe, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere Stivin jide ya, kpụrụ ya gaa nꞌụlọ ikpe ndị Juu. Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide Stivin sị, “Oge nile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ụlọ nsọ ukwu Chineke na iwu Mosisi nyere anyị. Nꞌezie, anyị nụrụ ka o kwuru sị, ‘Jisọs onye Nazaret ga-akwatu ụlọ a, gbanwee omenala Mosisi nyere anyị.’ ” Ndị nile nọ nꞌụlọ ikpe ahụ legidere Stivin anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwụ dị ka ihu mmụọ ozi. Onyeisi nchụaja jụrụ Stivin ajụjụ sị, “Ị̀ nụrụ ihe ndị a na-ekwu? Ọ bụ eziokwu?” Stivin zara sị ya, “Ụmụnna m na ndị mụrụ m! Geenụ ntị! Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Eberaham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamia, tupuu ọ gaa biri na Haran. Chineke gwara ya sị, ‘Site nꞌobodo gị na nꞌetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nꞌala m ga-egosi gị.’ Eberaham sitere nꞌobodo ndị Kaldia puọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, ọ hapaụrụ Haran bịa biri nꞌala a. Nꞌoge ahụ, Chineke enyeghị ya òke ọ bụla nꞌala a. Chineke enyeghị ya ọ bụladị otu nzọ ụkwụ ka ọ bụrụ nke ya. Ma Chineke kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya ala a. Chineke kwekwara nkwa na ụmụ ụmụ ya ga-eketa ala a. Ma nꞌoge ahụ Chineke kwere Eberaham nkwa a, Eberaham enweghị nwa ọ bụla. Nke a bụ ihe Chineke gwara Eberaham, ‘Ùmụ ụmụ gị ga-ebi na mba ọzọ, ebe ha ga-anọ dị ka ohu. A ga-emejọkwa ha narị afọ anọ. Ma aga m ekpe mba ahụ ikpe, bụ mba ahụ ebe ha ga-abụ ohu. Mgbe m kpesịrị ha ikpe, ụmụ ụmụ gị ga-ahapụ ala ahụ bịa biri nꞌebe a ife m ofufe.’ “Chineke mere ka ọgbụgba ndụ obibi ugwu dịrị nꞌetiti ya na Eberaham. Ọ bụ nꞌokpuru ọgbụgba ndụ ahụ ka Eberaham mụrụ Aizik. Aizik mụtara Jekọb. Ọ bụkwa ụmụ nke Jekọb mụtara bụ ndị isi ebo iri na abụọ nke Izirel. Ụmụ Jekọb sitere nꞌekworo ree Josef dị ka ohu. A kpọọrọ Josef gaa nꞌala Ijipti. Ma Chineke nọnyeere ya nꞌebe ahụ. Ọ dọpụtara ya site nꞌime nsogbu ya nile, nyere ya aka inweta ihuọma nꞌebe Fero nọ, site nꞌamamihe Chineke nyere ya. Fero mekwara Josef onye na-achị Ijipti na ezinụlọ ya. “Nꞌoge ahụ, ụnwụ dị nꞌala Ijipti ma nꞌala Kenan. Ụnwụ a wetara ahụhụ dị ukwuu. Nna nna anyị ha enwekwaghị ike ịchọta nri. Ma mgbe Jekọb nụrụ na nri dị nꞌala Ijipti, o ziri ụmụ ya bụ nna nna anyị ha ka ha gaa Ijipti ịzụta nri. Nke a bụ oge nke mbụ ha na-aga Ijipti. Mgbe ha gara Ijipti nke ugboro abụọ Josef kọwaara ụmụnna ya onye ọ bụ, site na nke a, Fero nụrụ banyere ezinụlọ Josef. Mgbe ahụ Josef ziri ozi gwa nna ya na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise nꞌoge a, ka ha bịa nꞌala Ijipti. Jekọb gara Ijipti, birikwa nꞌebe ahụ. Ebe ahụ ka ọ nọkwa nwụọ. Ebe ahụ ka nna nna anyị ha nwụkwara. E buuru ozu ha gaa Shekem, ebe e liri ha, nꞌime ala ahụ Eberaham zụrụ nꞌaka ụmụ Hamọ. “Ma mgbe oge ahụ Chineke kwere ha na nkwa na-abịaru nso, ụmụ ụmụ Eberaham bara ụba nꞌọnụ ọgụgụ. Tutuu eze ọzọ, nke na-amakwaghị ihe banyere Josef, ebido ịchị. Eze a megburu ndị agbụrụ anyị, kpagbuokwa ha. O mere ka ha tụfuo ụmụ ọhụrụ ha, ka ha nwụsịa. “Ọ bụ nꞌoge a ka a mụrụ Mosisi. Ọ bụkwa nwa mara mma, onye a zụrụ nꞌezinụlọ nna ya ọnwa atọ. Mgbe ndị mụrụ ya tụfuru ya, Ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nke aka ya. A zụrụ Mosis nꞌamamihe nile nke ndị Ijipti. Ọ bụ onye oke okwu, bụrụkwa onye dị gara gara. “Mgbe ọ gbara iri afọ anọ, ọ batara ya nꞌuche iga ileta ụmụnna ya. Nꞌụzọ, ọ hụrụ ka otu onye Ijipti na-emegbu otu nꞌime ụmụnna ya. Ọ gara nyere onye Juu ahụ aka, kwụghachi onye Ijipti ahụ ụgwọ ọrụ ọjọọ ya, site nꞌigbu ya. Mosisi chere na ụmụnna ya ga-aghọta na nzube ya na ha bụ otu. O chere na ha ga-aghọta na Chineke ga-esite nꞌaka ya gbapụta ha. Ma ha aghọtaghị. “Nꞌụbọchị nke abụọ ya, Mosisi hụrụ ụmụnna ya abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nꞌetiti ha. Ọ gwara ha sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emegburita onwe unu?’ “Ma nwoke ahụ na-emegbu nwanna ya nupụrụ Mosisi sị ya, ‘Ònye họpụtara gị mee gị onyeisi na onye ikpe nꞌebe anyị nọ? Ị̀ chọrọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’ “Okwu a mere ka Mosisi gbaa ọsọ. Ọ gbapụrụ gaa biri nꞌala Midian. Nꞌebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ. “Mgbe iri afọ anọ ọzọ gafere, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri Mosisi onwe ya nꞌọzara dị ugwu Saịnaị gburugburu. Mmụọ ozi a bịakwutere Mosisi nꞌime ire ọkụ na-ere nꞌotu osisi. Okụ a nke na-enwụ tụrụ Mosisi nꞌanya. Nꞌihi ya, ọ bịaketara nso ilezi ya anya na ịmata ihe ọ bụ. Ma mgbe ọ na-abịa nso, Chineke gwara ya okwu site nꞌetiti ọkụ ahụ sị, ‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke Eberaham, na Aizik na Jekọb.’ Ụjọ tụrụ Mosisi nke ukwuu. Ọ makwara jijiji. O nwekwaghị ike ilegide ọkụ ahụ anya ọzọ. “Ma Onyenwe anyị gwara ya sị, ‘Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị. Nꞌihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ. Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nꞌala Ijipti. Anụkwala m ịsụ ude ha. Abịakwala m ịzọpụta ha site nꞌala Ijipti. Ya mere, aga m eziga gị Ijipti. Ị ga-abụkwa onyeozi m.’ Mosisi a m na-ekwu ihe banyere ya bụ otu Mosisi ahụ ụmụnna ya jụrụ nꞌala Ijipti. Ee, ọ bụ otu Mosisi ahụ ha jụrụ ajụjụ sị, ‘Ònye mere gị onyeisi na onye ikpe nꞌebe anyị nọ?’ Ọ bụkwa Mosisi a ka Chineke zigara ịzọpụta na ịchị ndị ya. Chineke nyekwara Mosisi ike ime nke a site nꞌọnụ mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nꞌime ọkụ ahụ na-enwụ nꞌosisi ahụ dị nꞌọzara. Mosisi a sitere nꞌala Ijipti kpọpụta ha. Tupuu ọ kpọpụta ha ọ rụrụ ọrụ ebube na ọrụ ịtụnanya nꞌala Ijipti. Mgbe ọ hapụrụ Ijipti ọ rụkwara ọrụ ebube nꞌosimiri uhie na nꞌime ọzara. “Ọ bụkwa otu Mosisi a gwara ụmụ Izirel okwu sị, ‘Chineke ga-akpọlitere unu onye amụma ọzọ. Chineke ga-esite nꞌetiti unu kpọlite ya. Chineke ga-akpọlitekwa ya dị ka o si kpọlite m.’ Ọ bụkwa otu Mosisi a bụ onye kwuchitere ọnụ nna nna anyị ha nꞌihu mmụọ ozi ahụ, nꞌugwu Saịnaị, mgbe mmụọ ozi ahụ nyere ha iwu Chineke. “Ma nna nna anyị ha jụrụ ige ntị! Ha chọrọrị nꞌobi ha ịlaghachi azụ nꞌala Ijipti! Nꞌihi ya, ha gwara Erọọn sị, ‘Meere anyị chi ọzọ, nke ga-edu anyị, nꞌihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosisi, onye sitere nꞌala Ijipti dupụta anyị.’ Ha meere onwe ha nwa ehi e ji ọlaedo kpụọ, chụọkwa aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi chi ahụ ha ji aka ha mee. “Nꞌihi nke a Chineke chepụrụ ihu ya site nꞌebe ha nọ, gbaketa ha azụ. Ọ hapụrụ ha ka ha fee kpakpando na anwụ na ọnwa. Nꞌakwụkwọ Emos onye amụma, Chineke na-ajụ ajụjụ sị, ‘Ụlọ Izirel, unu chụrụ aja jirikwa anụ e gburu egbu nye onyinye nꞌọzara iri afọ anọ. Ọ̀ bụ m ka unu chụụrụ aja ahụ? É,è, obi unu dịrịị nꞌarụsị unu. Unu na-eche ihe banyere Molok na Refan, bụ chi kpakpando. Echiche unu dị na chi ahụ unu kpụrụ. Nꞌihi nke a, aga m esite nꞌala a wezụga unu, burukwa unu gafee obodo Babilọn.’ “Mgbe nna nna anyị ha gara ije ha nꞌọzara, ha bu igbe ọgbụgba ndụ. Mosisi mere igbe a nꞌụsoro ahụ Chineke gosiri ya. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Joshua duuru nna nna anyị ha merie ndị ala Kenan. E butere igbe ọgbụgba ndụ a nꞌala a. Ọ nọgidekwara nꞌala a tutuu ruo nꞌoge Devidi eze Izirel. “Chineke gọziri Devidi nke ukwuu. Nꞌihi ya Devidi rịọrọ Chineke ka o wuore ya ebe a ga-anọ na-efe ya bụ Chineke Jekọb ofufe. Ma ọ bụ Solomọn wuuru Chineke ụlọ a. Otu ọ dị, Chineke, onye kachasị ihe nile elu, adịghị ebi nꞌụlọ e ji aka wuo, dị ka ya onwe ya kwuru site nꞌọnụ ndị amụma ya. Chineke kwuru sị, ‘Eluigwe bụ ebe ocheeze m dị. Ụwa bụkwa ebe izuike nye ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewu? M ga-ebi nꞌime ya? Ana m achọ ebe m ga-anọ zuo ike? Ọ bụghị m mere eluigwe na ụwa?’ “Unu ndị isi ike! Lee ka obi unu si sie ike dị ka nkume. Lee ka ntị unu si kpọchie ịnụkwa eziokwu! Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupụ isi megide Mmụọ Nsọ? Nna nna unu nupụrụ isi megide ya! Unu onwe unu na-emekwa otu ihe ahụ taa! Kpọọ onye amụma ahụ aha nke nna nna unu na-akpagbughị! Ha gburu ndị ahụ buru amụma banayere ọbịbịa onye ezi omume ahụ, bụ Onye nzọpụta ahụ unu raara nye, onye e gbukwara. Karịsịa, ọ dịbeghị oge unu ji rube isi nꞌiwu Chineke, iwu ahụ mmụọ ozi ya wetaara unu!” Mgbe ndị isi Juu nụrụ ihe ndị a, o wutere mmụọ ha. Ha tara ikikere eze nꞌiwe na nꞌọnụ ma. Ma Stivin, nꞌihi na o jupụtara na Mmụọ Nsọ, lere anya nꞌeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nꞌaka nri Chineke. Ọ gwara ndị Juu ahụ okwu sị, “Lee! Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Jisọs Onye nzọpụta ka o guzo nꞌaka nri Chineke!” Mgbe ha nụrụ okwu a, ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsị aka ha rụchie ntị ha. Ha nile biliri ọtọ nꞌiwe, gbara ọsọ gaa nꞌebe Stivin guzo. Ha dọkpụụrụ ya pụọ nꞌazụ obodo ịtụ ya nkume. Ndị akaebe yipụrụ uwe ha chinye ya otu nwokorọbịa nọ nꞌebe ahụ. Aha nwokorọbịa ahụ bụ Sọl. Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.” O gburu ikpere nꞌala kwuo sị, “Onyenwe anyị, biko, agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusịrị okwu a, ọ dara nꞌala nwụọ. Sọl kwenyere ka e gbuo Stivin. Nꞌụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ Kraịst dị na Jerusalem. Mkpagbu a mere ka ndị kwere ekwe site na Jerusalem gbapụ. Ha gbaara ọsọ gbaga obodo ndị ọzọ dị iche iche dị na Judia na Sameria. Ọ bụkwa nanị ndị ozi Kraịst fọdụrụ na Jerusalem. Ma ndị Juu ụfọdụ, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin, gaa lie ya. Ha kwara akwa nke ukwuu nꞌihi ya. Ma Sọl bidoro ịla nzukọ Kraịst nꞌiyi. Ọ banyere nꞌụlọ ndị kwere ekwe dọpụta ha, nwoke na nwanyị, tinye ha nꞌụlọ mkpọrọ. Ma ndị kwere ekwe ahụ, ndị sitere Jerusalem gbapụ, jegharịrị na-ekwusa ozi ọma Jisọs. Onye dị ka Filip gara nꞌotu obodo dị na Sameria kọọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ihe banyere Kraịst. Igwe mmadụ gere ntị nꞌihe ọ na-ekwu nꞌihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ rụrụ. Nꞌihi na site nꞌọrụ ebube ndị a, mmụọ ọjọọ pụrụ site na ndụ ndị ụfọdụ. Mmụọ ọjọọ a pụtara na-eti mkpu. Ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ ka Filip gwọkwara. Ụfọdụ ndị ngwụrọ ka ọ gwọkwara. Nꞌihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nꞌobodo ahụ. Ma o nwere otu nwoke bi nꞌobodo ahụ a na-akpọ Saimọn. Tupuu Filip abịa, Saimọn na-arụ ọrụ ịtụnanya dị iche iche site nꞌike ọgwụ e kere eke. Nꞌihi ihe ndị a ọ na-eme, ọ na-akpọ onwe ya mmadụ dị mkpa. Onye ọ bụla na Sameria, onye ukwu na onye nta, na-ege ya ntị. Ha na-asị na ọ bụ ike Chineke a na-akpọ Ike dị ukwuu. Ha na-eso ya nꞌihi na ọrụ ya na-eju ha anya. Ma mgbe Filip kwusasịrị ozi ọma, ha kweere na Jisọs, na ọ bụ Onye nzọpụta. Ha kwekwara ihe nile Filip kwuru banyere alaeze Chineke. E mere ọtụtụ nꞌime ha baptizim, nwoke na nwanyị ha. Saimọn kwekwaara otu aka ahụ. E mekwara ya baptizim. O bidoro iso Filip nꞌihi na ọrụ ebube nile Filip rụrụ tụrụ ya nꞌanya nke ukwuu. Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala ozi ọma Chineke, ha zipụrụ Pita na Jọn ka ha gaa hụ ihe na-eme nꞌebe ahụ. Mgbe ha bịaruru, ha bidoro ikpe ekpere ka ndị a kwere ekwe nata Mmụọ Nsọ. Nꞌihi na tutuu ruo ugbu a, ha anatabeghị Mmụọ Nsọ. Ọ bụ nanị baptizim ka e mere ha baa nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs. Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ndị a kwere ekwe aka nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Mgbe Saimọn hụrụ na ndị a natara Mmụọ Nsọ nanị site nꞌaka ndị ozi bikwasịrị ha nꞌisi, o chere ha ego nꞌihu, rịọ ha sị, “Werenụ ego a, nyekwanụ m ike a. Ka onye ọ bụla m bikwasịrị aka nꞌisi nata Mmụọ Nsọ.” Ma Pita baara ya mba sị, “Gị na ego gị laakwa nꞌiyi! Ì si aṅaa chee na ị pụrụ iji ego zụta onyinye Chineke? I nweghị oke nꞌọrụ a, nꞌihi na obi gị adịghị ọcha nꞌihu Chineke. Si nꞌajọ omume gị tụgharịa, kpeekwa ekpere. Ma eleghị anya Chineke ga-agbaghara gị echiche ọjọọ gị nile. Nꞌihi na ahụrụ m na ekworo na mmehie jupụtara gị nꞌobi.” Saimọn rịọrọ Pita sị ya, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a nile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.” Mgbe Pita na Jọn rụsịrị ọrụ ịgwa ndị ọzọ banyere Kraịst, na ikwusa okwu Onyenwe anyị, ha lọghachiri Jerusalem. Ma mgbe ha na-ala nꞌụzọ, ha kwụsịrị nꞌọtụtụ obodo nta nke Sameria ikwusa ozi ọma ahụ. Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ sitere Jerusalem na-aga Gaza, ya bụ, ụzọ ọzara.” Filip biliri gaa nꞌụzọ ahụ. Mgbe ọ nọ nꞌụzọ ahụ, ọ hụrụ otu nwoke onye Etiopia. Ọ bụ ọnozi nke nwere ike dị ukwuu nꞌụlọ ya. Ọ bụ onye na-eche akụ Kandis, eze nwanyị ndị Etiopia. Nwoke a si Jerusalem ebe ọ gara ife Chineke na-alọghachi Etiopia. Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nꞌụgbọ ala ya, nke inyinya na-adọkpụ, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma dere. Mmụọ Nsọ gwara Filip okwu sị, “Gaa nso, nọọkwa ụgbọ ahụ nso.” Filip gara nso, nụkwa ka nwoke ahụ na-agụ ihe Aịzaya dere. Ọ jụrụ nwoke ahụ ajụjụ sị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?” Nwoke a zara Filip sị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nꞌụgbọ ala ahụ, soro ya nọdụ nꞌime ya. Mpaghara akwụkwọ nsọ nwoke a na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nꞌebe a ga-egbu ya. Dị ka atụrụ si emechi ọnụ ya, o megheghị ọnụ ya. “Nꞌọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Ònye pụrụ ịkọ akụkọ ajọ omume nke ndị bi nꞌọgbọ ya? Nꞌihi na e sitere nꞌụwa wepụ ndụ ya.” Ọnozi ahụ jụrụ Filip ajụjụ sị, “Biko gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ̀ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?” Mgbe ahụ Filip sitere nꞌakụkụ akwụkwọ nsọ ahụ nwoke ahụ na-agụ kọọrọ ya akụkọ ozi ọma Jisọs. Mgbe ha na-aga nꞌụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Ọnozi ahụ gwara Filip okwu sị, “Lee! Nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?” Filip zara sị ya, “E nwere ike ime gị baptizim ugbu a, ma ọ bụrụ na i jiri obi gị nile kwere.” Ọnozi ahụ sịrị ya, “Ekweere m na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke.” Ọnozi a kwụsịrị ụgbọ ala ahụ. Ya na Filip wụdatara banye nꞌime mmiri nta ahụ. Filip mekwara ya baptizim. Mgbe ha sitere nꞌime mmiri ahụ pụta, Onyenwe anyị sitere nꞌebe ahụ wepụ Filip. Ọnozi ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ. Ma ọ lara nꞌụlọ ya nꞌọṅụ. Ebe ọzọ a hụrụ Filip bụ nꞌAzọtus! Ebe ahụ, ọ na-ekwusa ozi ọma. Site nꞌAzọtus, o kwusara ozi ọma site nꞌobodo ruo nꞌobodo tutuu ruo Sizaria. Ugbu a, Sọl, onye ume nile ọ na-ekupụta bụ nanị ịba mba na ịla nzukọ Kraịst nꞌiyi, gara hụ onyeisi nchụaja na Jerusalem. Ọ rịọrọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs. Akwụkwọ ozi a bụ ka nzukọ ndị a nyere Sọl aka ịkpagbu ndị kwere ekwe ọ bụla ọ chọpụtara nꞌebe ahụ, nwoke na nwanyị, ka o kee ha agbụ, kpụta ha na Jerusalem dị ka ndị mkpọrọ. Mgbe Sọl na-aga nꞌụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ìhè chakarịrị ìhè nke anyanwụ siri nꞌelu chaa ya gburugburu. Sọl dara nꞌala, nụ olu na-akpọ ya oku sị, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji akpagbu m?” Sọl zara sị, “Onyenwe anyị ị bụ onye?” Olu ahụ zaghachiri sị, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu! Bilie, baa nꞌime obodo. Nọdụ nꞌebe ahụ tutuu ruo mgbe ị natara ozi m.” Ndị nwoke ha na Sọl so guzoro nꞌebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọ bụla. Sọl biliri ọtọ, chọpụta na ya bụ onye kpuru ìsì. Ndị ya na ha so sekpụụrụ ya nꞌaka tutuu ha abata Damaskọs. Nꞌebe ahụ ka ọ nọrọ abalị atọ, na-ahụghị ụzọ. O rikwaghị nri ọ bụla. Mmiri abakwaghị ya ọnụ. Na Damaskọs ahụ, otu onye kwere ekwe nọ ya. Aha ya bụ Ananayas. Ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ a, Onyenwe anyị kpọrọ ya oku sị, “Ananayas!” Ọ zara sị, “Anọ m nꞌebe a, Onyenwe anyị.” Onyenwe anyị gwara ya okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ a na-akpọ Ama E Guzoziri, chọọ ụlọ nwoke a na-akpọ Judas. Nꞌụlọ nwoke a jụọ ajụjụ banyere nwoke a na-akpọ Sọl onye Tasọs. Ọ nọ nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere. Sọl ahụla ọhụ nke gwara ya na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, na ọ ga-ebikwasị aka nꞌisi ya ka ọ hụ ụzọ.” Ma Ananayas zara sị, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ nile nwoke a mere ndị kwere ekwe bi na Jerusalem! Ugbu a, anyị nụrụ na ọ natara ike nꞌaka ndị nchụaja ka ọ bịa nꞌebe a jide onye kwere ekwe ọ bụla nọ na Damaskọs!” Ma Onyenwe anyị gwara ya sị, “Gaa ozi m ziri gị. Nꞌihi na ahọpụtala m Sọl ka o were ozi ọma m gaa mba nile, ma nꞌihu ndị eze, ma nꞌihu ụmụ Izirel. Nꞌihi na aga m egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịhụ nꞌihi m.” Ananayas gara hụ Sọl dị ka Chineke nyere ya iwu. Ọ chọtakwara Sọl, bikwasị ya aka, gwa ya okwu sị ya, “Nwanna m Sọl, Onyenwe anyị Jisọs onye gosiri gị onwe ya nꞌụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ma jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.” Otu mgbe ahụ, ihe dị ka akpịrịkpa sitere nꞌanya Sọl abụọ dapụta. O bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. Ananayas mekwara ya baptizim. Emesịa, o rituru nri, nweghachikwa ike ya. Ya na ndị kwere ekwe sooro nọdụ na Damaskọs ụbọchị ụfọdụ. Ọ dịghị anya Sọl bidoro ikwusa Kraịst nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ na-ekwusa na Kraịst bụ Ọkpara Chineke. O juru ndị nile nụrụ okwu ya anya. Nꞌihi ya ha na-asị, “Nwoke a ọ̀ bụghị onye ahụ kpagburu ndị kwere ekwe na Jerusalem? Ọ bịakwaghị Damaskọs ijide ndị nile kwere ekwe, ịkpụgara ha ndị isi nchụaja nọ na Jerusalem?” Ma Sọl akwụsịghị ikwusa ozi ọma! Kama ike ikwusa ozi ọma ya na-aba ụba. Ọ gara nꞌihu imeri ndị Juu site nꞌụzọ o siri gosi ha site nꞌakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ndị Juu gbara izu igbu ya. Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ nile e si apụ obodo ahụ, ka ha gbuo ya. Ndị kwere ekwe nọ na Damaskọs nyeere Sọl aka ịgbapụ. Nꞌotu abalị, ha tinyere ya nꞌime nkata buru ibu, site nꞌoghere dị na mgbidi obodo ahụ wetuo ya nꞌofe nke ọzọ. Site nꞌebe ahụ, Sọl gbapụrụ gaa Jerusalem. Mgbe o ruru Jerusalem, ọ gbalịri ịdịnyere ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ. Ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ bụrụla onye kwere ekwe dị ka ha onwe ha. Ma Banabas duuru ya gaa nꞌebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu Sọl siri zute Onyenwe anyị nꞌụzọ Damaskọs. Ọ kọkwara ha akụkọ otu Sọl siri kwusaa ozi ọma Kraịst na Damaskọs na-atụghị egwu. Site nꞌoge ahụ, Sọl nọdụrụ na Jerusalem. Ya na ndị kwere ekwe mekọrịtakwara na-enweghị nsogbu ọ bụla. O kwusara okwu nꞌaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu. Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtara ụka. Nꞌihi ya ndị a gbara izu igbu ya. Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha mere ngwangwa zipụ Sọl obodo Tasọs. Nꞌihi na Sọl ghọrọ onye kwere ekwe mere ka a kwụsị ịkpagbu ndị kwere ekwe. Nzukọ Kraịst nile, ndị dị na Judia, Galili na Sameria, nọọrọ nꞌudo, guzosiekwa ike nꞌokwukwe ha. Ndị kwere ekwe biri ndụ ịsọpụrụ Chineke site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu na-amụba. Otu oge, mgbe Pita na-ejegharị site nꞌobodo ruo nꞌobodo, ọ gara ileta ndị kwere ekwe nọ nꞌobodo Lida. Nꞌebe ahụ ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nꞌute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Pita bịakwutere nwoke a sị ya, “Ainias, Kraịst agwọọla gị! Bilie mezie ihe ndina gị!” Otu mgbe ahụ Ainias biliri bụrụ onye ahụ dị mma. Ndị nile bi na Lida na Sharọn hụrụ Ainias. Nꞌihi ya ha nabatara Onyenwe anyị. Ma nꞌotu obodo a na-akpọ Jopa, otu nwanyị bi ya. Ọ bụ onye kwere ekwe aha ya bụ Tabita. Ndị mmadụ na-akpọkwa ya Dọkas. Nwanyị a jupụtara nꞌọrụ ọma. Ọ na-enyekwa ndị nọ na mkpa ihe o nwere. Nꞌoge a, nwanyị a rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nyibere ya nꞌụlọ dị nꞌelu. Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ na Pita nọ na Lida, ha ziri ozi ka a kpọọ ya. Ụmụ nwoke abụọ gara ịgwa ya sị, “Atufula oge ịbịakwute anyị.” Pita sooro mmadụ abụọ ahụ gaa ngwangwa. Mgbe o ruru Jopa, ha duuru ya gaa nꞌụlọ ebe ha nyibere ozu Dọkas. Ụmụ nwanyị nile di ha nwụrụ nọ nꞌebe ahụ na-akwa akwa. Ha gosiri Pita uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ. Pita gwara mmadụ nile ka ha pụọ nꞌụlọ ahụ. O gburu ikpere nꞌala kpee ekpere. Mgbe o kpesịrị, o chere ihu ya nꞌebe ozu nwanyị ahụ dina kwuo okwu sị, “Dọkas, bilie!” Nwanyị ahụ nwụrụ anwụ meghere anya ya. Mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri ọtọ, nọdụ ala. Pita nyeere ya aka iguzo ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nile kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha Dọkas onye dị ndụ. Ndị nile nọ na Jopa nụrụ akụkọ a. Ọtụtụ mmadụ nabatara Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, Pita nọgidere na Jopa ọtụtụ ụbọchị. Ọ nọdụrụ nꞌụlọ Saimọn, onye ọrụ ya bụ idozi akpụkpọ anụ. Nꞌoge ahụ, o nwere otu nwoke bi na Sizaria, aha ya bụ Kọniliọs. Ọ bụ ọchịagha na-elekọta ndị agha si na mpaghara Itali. Nwoke a ji obi ya nile na-efe Chineke, ya na ezinụlọ ya. Ọ na-enyekwara ụfọdụ ndị Juu mkpa na-akpa aka. Ọ bụkwa mmadụ na-ekpe ekpere. Otụ ụbọchị, nꞌihe dị ka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ ahụ, ọ hụrụ mmụọ ozi Chineke ka ọ bịakwutere ya, kpọọ ya sị, “Kọniliọs!” Ụjọ tụrụ Kọniliọs. O legidere mmụọ ozi ahụ anya jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ gịnị ka ị na-achọ?” Mmụọ ozi ahụ zara sị, “Chineke anụla ekpere gị. Ọ hụkwala, ma cheta ọrụ ọma gị nile. Ugbu a zie ndị ozi ka ha gaa nꞌobodo Jopa. Ka ha chọpụta otu nwoke aha ya bụ Saimọn Pita, gwa ya ka ọ bịakwute gị. Saimọn Pita bụ ọbịa nꞌụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Ụlọ Saimọn dị nso nꞌakụkụ osimiri.” Mgbe mmụọ ozi ahụ lara, Kọniliọs kpọrọ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-ejere ya ozi nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara otu nꞌime ndị agha na-eche ya nche. Onye agha a bụkwa onye na-atụ egwu Chineke. Kọniliọs kọọrọ ha ihe nile mmụọ ozi ahụ kwuru. Emesịa o zigara ha Jopa. Nꞌụbọchị nke abụọ ya, mgbe ndị ozi Kọniliọs nọ nso nꞌebe na-adịghị anya site na Jopa, ebe ha na-aga, Pita rigooro nꞌelu ụlọ ahụ ikpe ekpere. Oge ahụ bụ ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie. Mgbe Pita nọ na-ekpe ekpere, agụụ bidoro ịgụ ya. Ọ chọrọ ihe ọ ga-eri. Ma nꞌụlọ ahụ, a na-akwado ihe oriri nꞌoge ahụ. Nꞌoge Pita nọ na-eche ka e sichaa nri, ọ hụrụ ọhụ. Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa efere buru ibu ka o sitere nꞌeluigwe na-arịdata nꞌebe ọ nọ. Nꞌime efere a, anụmanụ dị iche iche dị ya, dị ka agwọ na nnụnụ. Ha bụ anụmanụ ndị Juu na-asọ nsọ iri. Ma Pita nụrụ olu gwara ya okwu sị, “Bilie Pita! Bilie! Gbuo, ka i riekwa nke ọ bụla ị chọrọ.” Ma Pita zara sị, “É, e, Onyenwe anyị, ọ dịbeghị oge m riri ihe ọ bụla a na-asọ nsọ dị ka iwu ndị Juu si dị.” Olu ahụ gwara Pita okwu ọzọ sị, “Ihe ahụ Chineke gụrụ nꞌihe dị ọcha, dị ọcha. Asịkwala na ihe dị otu a adịghị ọcha.” E mere ka Pita hụ ọhụ ahụ ugboro atọ. Ma mgbe nke a gasịrị, a napụrụ efere ahụ site nꞌebe ọ nọ, weghachikwa ya nꞌeluigwe. Ma o juru Pita anya nke ukwuu ihe ọhụ ahụ pụtara. Ọ malitekwara iche echiche ihe ọ ga-eme banyere ya. Ma mgbe ọ na-atule ihe ndị a nꞌobi ya, lee, ndị ozi ahụ Kọniliọs zipụrụ abịarutela. Ha guzokwa nꞌọnụ ụzọ ụlọ ahụ ebe Pita nọ. Ha malitekwara ịjụ ajụjụ sị, “Ọ̀ dị onye ọbịa nọ nꞌụlọ a a na-akpọ Pita?” Ma Pita nọ rị na-atụgharị uche nꞌihe ọhụ ahụ ọ hụrụ ga-abụ. Nꞌoge a, Mmụọ Nsọ gwara Pita okwu sị, “Lee, mmadụ atọ guzo nꞌọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị. Jekwuru ha ngwangwa, sorokwa ha gaa ebe ọ bụla ha na-aga. Atụkwala egwu. Ọ bụ m zitere ha.” Saimọn Pita biliri jekwuru ha, gwa ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Pita onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ Kọniliọs onyeisi agha anyị zitere anyị. Nwoke a bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke. Ọ bụkwa onye ndị Juu nile na-asọpụrụ. Otu ụbọchị, mmụọ ozi bịakwutere ya, gwa ya ka o zie ozi kpọọ Pita ka ọ bịakwute ya. Na Pita bụ onye ga-eme ka Kọniliọs mata ihe nile Chineke chọrọ ka o mee.” Saimọn Pita kpọbatara ha nꞌụlọ. Nꞌebe ahụ ka ha dinara nꞌabalị ahụ. Nꞌechi ya, Pita sooro ha gaa. Ọtụtụ ndị kwere ekwe sokwaara ya gaa, site nꞌobodo ahụ a na-akpọ Jopa. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, ha bịaruru Sizaria ebe Kọniliọs nọ rị, ya na ndị ezinụlọ ya, na ndị enyi ya, na-eche ọbịbịa Pita. Mgbe Kọniliọs hụrụ Pita, ọ gbaara ọsọ jekwuru ya, daa nꞌala nꞌihu ya, ịkpọ isi ala nye ya. Ma Saimọn Pita selitere ya elu sị ya, “Bilie! Abụ m mmadụ efu dị ka gị. Abụghị m Chineke!” Kọniliọs bilitere, ya na Pita kparịtara ụka nwa oge nta. Emesịa ha banyere nꞌụlọ jekwuru ndị zukọtara na-eche ha. Saimọn Pita gwara ndị nọ nꞌụlọ ahụ okwu sị, “Unu maara nke ọma na o megidere omenala ndị Juu na m ga-abata nꞌụlọ Kọniliọs. Ma Chineke gosiri m site nꞌọhụ, na o kwesịghị ka m leda mmadụ ibe m ọ bụla anya, ma ọ bụ gụọ onwe m dị ka onye karịrị ndị ọzọ mma. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m jiri bịakwute unu. Ugbu a, ọ̀ bụ gịnị mere unu ji zie ozi ka a kpọọ m?” Kọniliọs sịrị ya, “Nꞌụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nꞌoge ehihie, nꞌihe dị ka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m otu nwoke ka o guzoro nꞌihu m. O yikwasịrị onwe ya uwe dị ọcha, nke na-egbukwa amụma. “Nwoke a gwara m okwu sị, ‘Kọniliọs, Chineke anụla ekpere gị. Ọ hụkwala ọrụ ọma gị nile. Ugbu a ziga ndị ozi gị ka ha gaa nꞌobodo Jopa, nꞌụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Nꞌebe ahụ ha ga-ahụkwa otu onye aha ya bụ Saimọn Pita.’ Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m jiri zite ndị ozi m. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu na ị bịara. Anyị nile ezukọtaala ugbu a nꞌihu Chineke ịnụrụ ihe Chineke chọrọ ka anyị mata site nꞌọnụ gị. Ọ bụkwa nke a ka anyị nile chọrọ ịnụ ugbu a.” Mgbe ahụ Saimọn Pita zara ha sị, “Nꞌezie, amaara m ugbu a na ọ bụghị nanị ndị Juu ka Chineke na-anabata. Kama nꞌime obodo ọ bụla, ndị ọ bụla na-akpọ isi ala nye ya, na ndị na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata. Ana m eche na unu anụla ihe banyere ozi ọma ahụ Chineke zigaara ndị Juu. Ozi ọma nke na-asị na udo dị ugbu a nꞌetiti Chineke na mmadụ site nanị na Jisọs, Onye nzọpụta na Onyenwe ihe nile. E mekwara ka ozi ọma a gbasaa ruo obodo Juda nile. Ọ malitekwara nꞌoge Jọn omee baptizim bidoro ọrụ ya na Galili. Ana m echekwa na unu nile maara ihe banyere Jisọs onye Nazaret, Onye Chineke mejupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ. O jegharịrị nꞌebe nile dị iche iche na-arụ ọrụ ebere, chụpụkwa mmụọ ọjọọ, nꞌihi na Chineke nọnyeere ya. “Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe ihe ndị a nile. Anyị hụzukwara ọrụ nile ọ rụrụ nꞌala Izirel nile na nꞌime Jerusalem ebe a nọ kpọgide ya nꞌelu obe. Ma Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ọtụtụ mmadụ hụ ya anya. Kama ọ bụghị mmadụ nile hụrụ ya. Ọ bụ anyị ndị Chineke họpụtara hụrụ ya. Anyị sokwa ya rikọọ nri, sorokwa ya ṅụkọọkwa ihe ọṅụṅụ mgbe o si nꞌọnwụ bilie. Ọ bụkwa anyị ka o zipụrụ ka anyị gaa zisaa ozi ọma nꞌebe nile. O ziri anyị ka anyị mee ka onye ọ bụla mata na Jisọs bụ onye ahụ Chineke họpụtara ka ọ bụrụ onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ndị amụma nile Chineke zitere nꞌoge gara aga kwuru ihe banyere ya na-asị na onye ọ bụla kweere na ya nwere mgbaghara mmehie site nꞌaha ya.” Mgbe Saimọn Pita nọ na-ekwu okwu ndị a, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị nile na-ege ntị nꞌokwu ya. Nke a juru ndị Juu ahụ sooro Pita bịa anya. Ọ gbakwara ha gharịị nke ukwuu otu Chineke si mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ. Nꞌihi na nke a pụtara ìhè nye mmadụ nile nọ nꞌebe ahụ. Ha nile nụkwara ka Kọniliọs na ndị nọ nꞌụlọ ahụ bidoro na-ekwu okwu nꞌasụsụ dị iche iche na-eto Chineke. Mgbe ahụ kwa, Pita jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị ọzọ dị nke ga-egbochi anyị ime ndị a baptizim? Ugbu a ha anatala Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị bụ ndị Juu kwere ekwe si nata ya.” Nꞌihi nke a, Saimọn Pita mere ha baptizim nꞌaha Jisọs Kraịst Onye nzọpụta. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Kọniliọs rịọrọ Pita ka o soro ya bikọọ ụbọchị ụfọdụ. Nꞌoge na-adịghị anya okwu a ruru ndị ozi na ụmụ Chineke ndị bi na Juda ntị. Ha nụrụ na ọtụtụ ndị mba ọzọ na-echegharị na-abịakwute Onyenwe anyị. Mgbe Saimọn Pita laghachiri azụ na Jerusalem, ụfọdụ ndị Juu nꞌetiti ndị kwere ekwe malitere ịtamụ ntamụ megide Saimọn Pita. Ha malitere ibo ya ebubo sị na o sooro ndị mba ọzọ na-enwekọ ihe, sorokwa ha na-eri ihe. Ma otu ọ dị, Saimọn Pita kọwaara ha ihe nile mere. Ọ gwara ha sị, “Otu ụbọchị, mgbe m nọ nꞌobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nꞌoge m na-ekpe ekpere. Nꞌime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri efere buru ibu. E budatara ya nꞌihu m. Efere a nwekwara ụkwụ igwe anọ. E sitekwara nꞌeluigwe zidata ya. Nꞌime efere a ụmụ anụ ọhia dị iche iche dị ya. Anụ na-akpụ akpụ, na nnụnụ dị iche iche, nke anyị onwe anyị na-adịghị eri. Mgbe ahụ kwa, anụrụ m olu gwara m okwu sị, ‘Bilie Pita, bilie gbuo anụ ndị a nile, riekwa ha!’ “Ma azaghachiri m sị, ‘Onyenwe anyị, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla m riri anụ ọ bụla megidere omenala ndị Juu.’ “Ma olu ahụ zaghachiri m nke ugbo abụọ sị, ‘Ihe ọ bụla Chineke gụrụ na ọ bụ ihe dị ọcha, gị onwe gị asịkwala na ọ bụ ihe rụrụ arụ.’ “Ihe ndị a nile mere ugboro atọ. Emesịa, e wepụrụ efere ahụ ya na ihe nile dị ya nꞌime, weghachi ya nꞌeluigwe. Mgbe ihe ndị a gasịrị, mmadụ atọ ahụ bịara izute m bịaruru nso nꞌụlọ ebe m nọ. Ha sitekwara nꞌobodo Sizaria bịakwute m. Mmụọ Nsọ gwara m okwu sị, ‘Soro ha gaa!’ Ma o mekwara ka m mata nke ọma na o kwesịghị ka o wute m na ha bụ ndị mba ọzọ. Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m na ụmụnna isii ndị a, ndị so m gaa Sizarịa, bịarutere nso nꞌụlọ Kọniliọs onye zipụrụ ndị ozi ahụ. Kọniliọs mere ka anyị mata otu mmụọ ozi siri bịakwute ya gwa ya ka o ziga ndị ozi ya ka ha gaa Jopa. Na ha ga-ahụkwa otu nwoke a na-akpọ Saimọn Pita. Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya sị, ‘Pita ga-akọwara gị ihe nile banyere nzọpụta nke gị na nke ndị ezinụlọ gị nile.’ “Nꞌihi ihe ndị a nile, mụ onwe m gwara ha ozi ọma Chineke. Mgbe m nọ na-ekwu okwu ahụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dị ka o siri bịakwasị anyị na mbụ. Mgbe ahụ echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Nꞌezie Jọn ga-eji mmiri mee unu baptizim, ma mụ onwe m ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’ Ebe anyị matara na Chineke nꞌonwe ya emeela ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ dị ka anyị si nata ya mgbe anyị kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ ịrụsị Chineke ụka?” Mgbe mmadụ nile nụrụ nkọwa dị otu a, ha mechiri ọnụ ha nye Chineke otuto sị, “Nꞌezie, Chineke enyela ndị mba ọzọ kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst onyinye Mmụọ Nsọ.” Ndị kwere ekwe ahụ nile sitere Jerusalem gbapụ nꞌoge ahụ mkpagbu ahụ bidoro, mgbe a tụgburu Stivin na nkume, gara nꞌihu na-agbasa ozi ọma. Ụfọdụ ha gara Fonisia na Saiprọs na Antiọk. Ma ọ bụ nanị ndị Juu ka ha na-ekwusara ozi ọma ahụ. Otu ọ dị, ụfọdụ zisakwaara ndị Griik ozi ọma. Ụfọdụ ndị a sitere nꞌobodo Saiprọs na Sirini gaa nꞌobodo a na-akpọ Antiọk kwusaa ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs. Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha nile. Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ sitere nꞌetiti ndị mba ọzọ chegharịa kwere nꞌOnyenwe anyị. Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa nyere ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ aka ime ka ha guzosie ike. Mgbe Banabas bịaruru Antiọk, ihe ọ hụrụ juru ya anya nke ukwuu. Ọ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ihe ọ hụrụ. Ọ gwara ha okwu nkasịobi, meekwa ka ha mata na o kwesịrị ka ha jidesie okwukwe ha ike na-eleghị anya nꞌazụ. Banabas bụ nwoke jupụtara nꞌọrụ ebere na nꞌike Mmụọ Nsọ. O nwekwara okwukwe dị ebube, nꞌihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Emesịa, Banabas hapụrụ Antiọk gaa obodo Tasọs ịchọ Sọl. Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịaghachi nꞌAntiọk. Nꞌebe ahụ ka ha abụọ nọ na-akụziri ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ okwu Chineke. Ọ bụkwa nꞌobodo a ka e buru ụzọ kpọọ ndị kwere ekwe ndị Kraịst. *** Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị amụma sitere Jerusalem bịaruo Antiọk. Otu nwoke nꞌime ha a na-akpọ Agabus biliri ọtọ nꞌetiti nzukọ ahụ buo amụma site nꞌike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ahụ ga-abịakwasị ụwa nile. Amụma a mezukwara nꞌoge Kladiọs chịrị dị ka eze ndị Rom nile. Nꞌihi nke a, ndị kwere ekwe nọ na nzukọ ahụ kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Juda. Onye ọ bụla nyekwara ihe dị ka o nwere ike. Ha nile bunyere Banabas na Pọl onyinye ndị a nile ka ha buru gaa Jerusalem nye ndị okenye na nzukọ Kraịst nọ nꞌebe ahụ. Nꞌoge ahụ, eze Herọd bidoro ịkpagbu ndị nile na-akpọku aha Onyenwe anyị. O nyere iwu ka e gbuo Jemes, otu nꞌime ndị ozi Kraịst. Jemes bụkwa nwanne Jọn. Mgbe Herọd chọpụtara na ọtụtụ ndị isi Juu kwagidere omume ya, o jidekwara Pita nꞌoge mmemme ngabiga, tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, O zipụrụ ndị agha iri na isii ka ha chee ya nche. Ihe Herọd bu nꞌobi bụ ka o nyefee Pita nꞌaka ndị Juu, ka ha gbuo ya mgbe mmemme ngabiga gafere. Ma nzukọ Kraịst ezughị ike site nꞌikpe ekpere nye Chineke. Ha rịọsịrị Chineke arịrịọ ike ka o debe Pita nke ọma nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ma nꞌabalị ahụ na-eso ụbọchị ahụ a ga-egbu ya, Pita, nọ na-arahụ ụra ebe e ji eriri igwe kee ya nꞌụkwụ na aka. E kegidekwara ya nꞌahụ otu onye agha. Ndị nche ọzọ nọkwa ya gburugburu na-eche ya nche. Na mberede, ìhè dị ukwuu nwụrụ nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Mmụọ ozi batara guzo nꞌakụkụ Pita metụ ya aka. Pita tetara nꞌụra. Ọ nụrụ ka mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Pita! Bilie ngwangwa!” Nꞌotu oge ahụ, eriri igwe ahụ dapụrụ nꞌala. Mmụọ ozi ahụ gwara Pita okwu sị, “Kee ihe okike nꞌukwu gi, yirikwa akpụkpọ ụkwụ gị.” Pita mere otu ahụ. Mmụọ ozi ahụ sịkwa ya, “Yirikwa uwe ukwu gi, sokwa m nꞌazu.” Pita sooro mmụọ ozi ahụ nꞌazụ site nꞌụlọ mkpọrọ ahụ pụta. Ma Pita chere na ihe ndị a na-eme na nrọ, ma ọ bụ na ọ bụ ọhụ ka ọ na-ahụ. O kwenyeghị na ihe ndị a nile pụrụ imezu. O jukwara ya anya nke ukwuu. Ha pụtara site nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ dịghị anya, ha bịaruru nꞌogige e ji igwe wuo. Ụzọ dị nꞌebe ahụ meghekwara nꞌonwe ya. Mmụọ ozi ahụ jidekwara Pita nꞌaka tutuu ruo mgbe ha gafesịrị ọnụ ụzọ nile nke ụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ha pụtara nꞌezi, mmụọ ozi ahụ hapụrụ Pita aka. Pita ahụkwaghị ya anya ọzọ. Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe nile mere. O kwuru sị, “Nꞌezie, Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya ka ọ bịa napụta m site nꞌaka eze Herọd. Ugbu a ọ napụtakwala m site nꞌọchịchọ ọjọọ nile nke ndị Juu.” Mgbe Pita tụgharịsịrị ihe nile ndị a nꞌobi ya, ọ malitere ịga nꞌụlọ Meri nne Jọn Mak. Ọtụtụ ndị kwere ekwe zukọtara nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere banyere Pita. Mgbe Pita rutere nꞌụlọ ahụ, ọ kụrụ aka nꞌọnụ ụzọ. Ma otu nwagbọghọ a na-akpọ Roda bịara ka o meghee ụzọ ahụ. Mgbe Roda nụrụ olu onye na-akụ aka, mata na ọ bụ olu Pita, o chetakwaghị imeghe ụzọ. Kama ọ gbaara ọsọ laghachi nꞌime ụlọ gwa ndị ọzọ sị, “Ọ bụ Pita na-akụ aka nꞌọnụ ụzọ.” Ma ọ dịghị onye ọ bụla kwenyere nꞌihe o kwuru. Kama ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dị ka onye anya na-adịghị mma. Mgbe Roda nọgidesịrị ike kwuo na ọ bụ Pita, ha zara sị ya, “Eleghị anya ọ ga-abụ mmụọ ozi Pita ka ị hụrụ, nꞌihi na ndị Juu egbuola ya.” Nꞌoge ahụ kwa, Pita kụsịrị aka ike nꞌụzọ. Emesịa, ha meghere ụzọ ahụ. Mgbe ha hụrụ na ọ bụ Pita nꞌezie, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu. Ma Pita feere ha aka ka ha jiri nwayọọ kwuo okwu. Ọ kọọrọ ha ihe nile Onyenwe anyị mere site nꞌaka mmụọ ozi ya. Nꞌikpeazụ, Pita gwara ha sị, “Meenụ ka Jemes na ụmụnna anyị nile mata ihe ndị a.” Ọ hapụrụ ha gaa nꞌebe ọzọ. Nꞌisi ụtụtụ echi ya, ọgba aghara dị nꞌụlọ mkpọrọ ahụ. O jukwara mmadụ nile anya ihe mere Pita. Eze Herọd zigara ndị agha ya nꞌụlọ mkpọrọ ahụ ka ha kpụpụta Pita, ma ha ahụghị ya. Nꞌihi nke a Herọd nyere iwu ka ha jide ndị agha ahụ e tinyere iche Pita nche. E gbukwara ha nile. Emesịa Herọd hapụrụ Juda gaa Sizaria. Mgbe Herọd nọ na Sizaria, ndị obodo Taịa na Saidọn zipụrụ ndị ozi ha izute ya nꞌihi na Herọd na-eweso ha iwe. Ma ndị ozi a buru ụzọ mee ka ha na Blastọs ode akwụkwọ eze bụrụ enyi. Ha rịọrọ ya ka o mee ka udo dịrị. Nꞌihi na ndị obodo ahụ na-esite nꞌobodo nke Herọd na-achị na-enweta ihe oriri ha. Ha kpebiri na ha na eze Herọd ga-enwe nzukọ. Nꞌụbọchị nzukọ ahụ, Herọd gbokwasịrị onwe ya uwe ndị eze ya nọkwasị nꞌocheeze ya. O weere oke olu dị iche gwa nzukọ ahụ nile okwu. Mgbe Herọd nọ na-ekwu okwu, igwe mmadụ ahụ nile toro ya otuto. Ha tiri mkpu sị, “Nke a abụghị olu mmadụ, ọ bụ olu Chineke!” Nꞌotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri Herọd ihe otiti dị egwu. Ikpuru jupụtakwara ya nꞌahụ, nke mere ka ọ nwụọ. Ma ihe ndị a nile dakwasịrị ya nꞌihi na Herọd naara ofufe ahụ e kwesịrị inye nanị Chineke, dị ka a ga-asị na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. O nyekwaghị Chineke otuto ma ọlị. Site nꞌoge ahụ gaa nꞌihu, nsogbu ọ bụla adịghị nye ndị na-ekwusa ozi ọma. Ọtụtụ mmadụ chegharịkwara biakwute Onyenwe anyị. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Sọl na Banabas bịara Jerusalem. Emesịa, ha laghachikwara Antiọk. Ha kpọọrọ Jọn Mak ka o soro ha nꞌije ha. Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ Kraịst dị nꞌAntiọk. Ụfọdụ nꞌime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ Nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Menien onye sitere nꞌezinụlọ Herọd pụta, na Sọl. Otu mgbe, ndị a zukọrọ ibu ọnụ na ikpe ekpere. Mmụọ Nsọ gwara ha okwu sị, “Kewapụnụ Banabas na Sọl ka ha nọdụ iche. Nꞌihi na enwere m ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ nꞌaha m.” Ya mere, mgbe ha busịrị ọnụ nꞌime ekpere ha, e bikwasịrị Sọl na Banabas aka nꞌisi, zipụ ha ijere Chineke ozi. Mmụọ Nsọ duuru ha gaa obodo Selusia. Emesịa, ha sitere nꞌebe ahụ jeruo Saiprọs. Mgbe ha bịaruru obodo Salamis, ha banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Jọn Mak sokwa ha dị ka onye na-ejere ha ozi. Emesịa, ha kwusara ozi ọma nꞌobodo nta nile dị nꞌala ahụ. Nꞌikpeazụ, ha batara nꞌobodo a na-akpọ Pafọs. Ọ bụkwa nꞌebe a ka ha zutere otu onye amụma ụgha aha ya bụ Bajisọs. Bajisọs bụkwa enyi ọchịagha obodo ahụ, onye a na-akpọ Sajiọs Pọlọs. Ha abụọ na-anọkọ oge nile. Ọchịagha ahụ nwere amamihe na mmụọ nke ịṅomi ihe. O ziri ozi ka a kpọọ Banabas na Sọl, nꞌihi na ọ chọrọ ịnụ okwu Chineke site nꞌọnụ ha. Ma Bajisọs onye mgbaasị ahụ, onye aha ọzọ a na-akpọ ya nꞌasụsụ Griik bụ Elimas, malitere inye ọtụtụ nsogbu, ime ka ọchịagha ahụ hapụ ịghọta ihe Banabas na Sọl na-agwa ya. Ọ chọkwaghị ka ọchịagha ahụ chegharịa kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs. Ma Sọl, ebe o jupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ, legidere onye mgbaasị ahụ anya nꞌoke iwe, sị ya, “Gị nwa ekwensu! Ị jupụtara nꞌaghụghọ na ihe ọjọọ dị iche iche! Ị bụkwa onye iro ezi omume nile! Ugbu a, ahụrụ m na ị chọghị ịkwụsị ibu agha megide Onyenwe anyị. Nꞌihi ya lee, aka Chineke na-adakwasị gị ugbu a. Ọ ga-emekwa ka ị baa nꞌikpe na ahụhụ. Ya mere, malite ugbu a, ị ga-abụ onye kpụrụ ìsì! Ị gaghị ahụkwa ìhè anya ụbọchị ụfọdụ!” Nꞌotu oge ahụ, nwoke a kpuru ìsì. Ọ malitekwara ijegharị nꞌime ọchịchịrị, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya. Mgbe Sajiọs Pọlọs hụrụ ihe nile mere, o kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs. O jukwara ya anya nke ukwuu bụ ike ahụ dị nꞌokwu Chineke. Pọl na ndị otu ya banyere ụgbọ mmiri na Pafọs jeruo obodo Pega nke dị nꞌakụkụ Tọki. Nꞌebe a ka Jọn Mak hapụrụ ha laghachi Jerusalem. Ma Sọl na Banabas gara bịaruo Antiọk, obodo nke dị na Pisidia. Nꞌụbọchị izuike, ha banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu ife Chineke. Mgbe a gụpụtasịrị site nꞌakwụkwọ Mosisi na nke ndị amụma ndị isi ụlọ nzukọ ahụ gwara Pọl na Banabas okwu sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ndụmọdụ unu chọrọ inye anyị, bịanụ ka unu gwa anyị ya.” Ya mere, Pọl guzoro ọtọ nꞌetiti ha feere ha aka ya abụọ. Mgbe o kelesịri ha, ọ gwara ha okwu sị, “Unu ndị Izirel, na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị! “Chineke nke Izirel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwuu nꞌoge ha nọ nꞌobodo Ijipti. Chineke sitere nꞌike ya dị ukwuu gbapụta ha site nꞌọnọdụ ịbụ ohu ha. Ọ zụrụ ha dị ka atụrụ nꞌime ọzara ihe dị ka iri afọ anọ, mgbe ha na-awagharị nꞌime ọzara ahụ site nꞌotu ebe ruo nꞌebe ọzọ. Emesịa, o mebiri mba asaa dị ukwuu nꞌime ala Kenan nꞌihi ha, nyekwa ndị ya obodo ndị a ka ha bụrụ nke ha. O mere ka ndị ikpe dị iche iche chịa ha ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise. Emesịa, Samuel onye amụma soro bụrụ otu nꞌime ndị chịrị ụmụ Izirel. “Mgbe ahụ ụmụ Izirel rịọrọ ka Chineke nye ha eze ga-achị ha. Chineke nyekwara ha Sọl nwa Kish, ka ọ bụrụ eze ha. Sọl, onye si nꞌagbụrụ Benjamin pụta, chịrị dị ka eze iri afọ anọ. Ma Chineke wepụrụ Sọl, họpụta Devidi ka ọ bụrụ eze nꞌọnọdụ ya. Chineke kwuru okwu banyere Devidi sị, ‘Devidi nwa Jeesi bụ nwoke a họpụtara site nꞌọchịchọ obi m. Ọ bụkwa onye na-eme ihe nile m chọrọ ka o mee mgbe nile.’ Jisọs, onye si nꞌezinụlọ Devidi pụta, bụkwa Onye nzọpụta ahụ Chineke kwere nkwa izite. “Ma tupuu Jisọs abịa, e mere ka Jọn omee baptizim buru ụzọ bịa, idoziri ya ụzọ. Jọn kọwaara ụmụ Izirel nile mkpa ọ dị na ha ga-esite na mmehie ha chegharịa bụrụ ndị e mere baptizim. Nꞌoge Jọn omee baptizim na-akwado ịrụsị ọrụ ya, ọ jụrụ ndị Juu nile ajụjụ sị, ‘Unu chere na abụ m Onye nzọpụta ahụ? Ọ dịghị, abụghị m ya. Kama lezienụ anya, nꞌihi na ọ ga-abịa nꞌoge na-adịghị anya. A pụkwaghị iji m tụnyere ya, nꞌihi na etozughị m oke ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ o yi nꞌụkwụ ya.’ “Ya mere ụmụnna m, unu ụmụ Eberaham, na unu bụ ndị mba ọzọ na-asọpụrụ Chineke. Nzọpụta a dịịrị anyị nile. Ndị Juu bi na Jerusalem na ndị isi ha amataghị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ha aghọtakwaghị okwu nile ndị amụma dere, okwu nke a na-agụpụta na ntị ha kwa izu. Ma ha mere ka okwu ahụ ndị amụma kwuru mezuo, mgbe ha mara Jisọs ikpe ọnwụ. Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesịrị ọnwụ nꞌime ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya. Ma mgbe ha mezusịrị ihe nile ndị amụma kwuru banyere ọnwụ ya, ha budatara ya site nꞌelu obe lie ya. Ma Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie ọzọ! E mekwara ka ọtụtụ mmadụ hụ ya anya ọtụtụ mgbe nꞌime ụbọchị ụfọdụ. Ndị nile soro ya jegharịa hụkwara ya, bụ ndị ahụ soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nꞌihu ọtụtụ mmadụ banyere ihe ndị a. “Ugbu a mụ onwe m na Banabas bịara nꞌetiti unu iwetara unu ozi ọma a. Nꞌihi na Chineke emezuola nkwa ahụ o kwere nna nna anyị ha nꞌọgbọ a. Nꞌihi na Chineke mere ka Jisọs si nꞌọnwụ bilie. Nke a bụ ihe akwụkwọ Abụ Ọma isi abụọ na-ekwu banyere ihe ndị a. O kwuru ihe banyere Jisọs sị, ‘Taa ebuliela m gị elu dị ka nwa m.’ “Chineke kwererị nkwa ime ka Jisọs site nꞌọnwụ bilie. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-agwa anyị mgbe e kwuru nꞌime ya sị, ‘Aga m emezuru gị nkwa ahụ nile m kwere Devidi.’ Nꞌabụ Ọma, a kọwakwara nke ọma sị, ‘Chineke agaghị ekwe ka Onye nsọ ya ree ure.’ E kwughị ihe ndị a banyere Devidi. Nꞌihi na anyị maara na Devidi nwụrụ mgbe ọ rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ. E liri ya, o rekwara ure. Kama ihe nile ndị a na-ekwu ihe banyere onye ahụ Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilite. Onye anụ ahụ ya na-erekwaghị ure. “Ụmụnna m, biko geenụ ntị. Mgbaghara mmehie nile dịkwa nꞌime onye a a na-akpọ Jisọs. Onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi ga-enweta mgbaghara mmehie ya nile. A ga-agụkwa onye ahụ nꞌonye ezi omume. Nke a bụ ihe iwu ndị Juu na-apụkwaghị imezuru onye ọ bụla. Lezienụ anya! Ka ihe nile ndị amụma kwuru hapụ imezu nꞌisi unu. Nꞌihi na ndị amụma kwuru sị, ‘Lee! unu ga-ala nꞌiyi! Unu ndị na-enupụ isi nꞌeziokwu. Aga m eme ihe ga-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya nꞌọgbọ unu. Ihe unu na-agaghị ekwenye na ọ bụ eziokwu mgbe unu nụrụ ya.’ ” Mgbe igwe mmadụ ahụ si nꞌụlọ nzukọ na-ala nꞌụbọchị ahụ, ha rịọrọ Pọl ka ọ bịakwa nꞌizu ụka ọzọ ịgwa ha okwu ndị a. Ma ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sitere nꞌụlọ nzukọ ahụ soro Pọl na Banabas. Ma mgbe ha na-aga nꞌụzọ, Pọl na Banabas riọsịrị ha arịrịọ ike sị ha nọgide nꞌamara Chineke. Nꞌizu ụka ọzọ, ọtụtụ ndị bi nꞌobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị nke Pọl na Banabas ga-ekwu. Mgbe ndị isi ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, ndị gbakọrọ ịnụ okwu Pọl na Banabas, ha bidoro inwe anya ụfụ megide Pọl na Banabas bidokwa ikwu okwu ọjọọ megide okwu nile ha na-ekwu. Ma Pọl na Banabas jiri olu ike na-ekwu okwu Onyenwe anyị. Ha na-ekwukwa sị, “Ọ dị mkpa na ozi ọma a ga-ebu ụzọ rute ndị Juu. Ma dị ka unu siri jụ ịnabata ya nke ọma, unu na-egosi na unu ekwesịghị ịnata ndụ ebighị ebi nke Chineke na-enye unu. Ugbu a, anyị ga-ewerekwa ozi ọma ahụ jekwuru ndị mba ọzọ. Nꞌihi na nke a bụ ihe Chineke nyere nꞌiwu mgbe o kwuru sị, ‘E meela ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka unu site nꞌebe nile ụwa sọtụrụ dubata ha nꞌụzọ nzọpụta.’ ” Mgbe ndị mba ọzọ nọ nꞌebe ahụ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ nke ukwuu. Ha ṅụrịkwara ọṅụ nꞌihi ozi ọma nke Pọl wetaara ha. Ya mere ndị nile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi kweere nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs. Site nꞌihe ndị a nile, okwu Onyenwe anyị gara nꞌihu nꞌobodo ahụ. Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ kpalịrị obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke tinyere ndị isi obodo ahụ. Ha sitere nꞌọgbakọ ọjọọ ndị a megide Pọl na Banabas, chụpụ ha site nꞌobodo ahụ. Ma Pọl na Banabas tichapụrụ aja dị nꞌụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ga-emegide obodo ahụ. Emesịa, ha hapụrụ obodo ahụ gaa obodo ọzọ a na-akpọ Aikoniọm. Ndị kwere ekwe nile jupụtakwara nꞌọṅụ nꞌebe ahụ. Ha jupụtakwara nꞌike Mmụọ Nsọ. Nꞌobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nꞌụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu Onyenwe anyị site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ chegharịkwara. Ma ụfọdụ ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu Chineke ahụ, kpalịrị ndị mba ọzọ ahụ, mee ka ha malite imegide Pọl na Banabas. Ha kwuru ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ha. Otu ọ dị, Pọl na Banabas nọgidere nꞌebe ahụ ogologo oge. Ha na-ekwusakwa okwu Onyenwe anyị. Chineke gosikwara na ọ bụ okwu ya ka ha na-ekwu site nꞌinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịba ama dị iche iche. Ma igwe mmadụ na-ege Pọl na Banabas ntị kewara abụọ. Ụfọdụ nꞌime ha dịnyeere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyeekwara Pọl na Banabas. Ma mgbe Pọl na Banabas matara nzube ha, na ha na-achọ ịtụ ha nkume, ha hapụrụ obodo ahụ. Ndị ha chọrọ isite nꞌaka ha tụọ Pọl na Banabas nkume bụ ndị mba ọzọ, ha na ụfọdụ ndị Juu na ndị isi ha. Ha gara nꞌobodo Laikonia, Listra, na Debi, na obodo nta ọzọ dị nꞌakụkụ ebe ahụ, na-ekwusakwa ozi ọma ahụ. *** Ma mgbe ahụ ha nọ nꞌime obodo Listra, ha hụrụ otu nwoke dara ngwụrọ site nꞌoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọ bụla. O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu Chineke. Ma Pọl legidere ya anya hụ na ọ bụ nwoke nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka ahụ dị ya ike. Nꞌihi nke a, Pọl kpọrọ ya sị, “Bilie!” Mgbe ahụ nwoke a wuliiri elu nꞌụkwụ ya abụọ. Ọ malitere ịga ije. Mgbe igwe mmadụ ahụ na-ege Pọl ntị hụrụ ihe Pọl mere, ha nile tiri mkpu nꞌasụsụ ha sị, “Ndị a bụ chi pụtara ìhè nꞌụdị mmadụ!” Ha kpebiri nꞌetiti onwe ha na a ga-akpọ Banabas Jupita. Jupita bụ chị ndị Griik. Ha kpọkwara Pọl Mekuri, nꞌihi na ọ bụ Pọl na-ekwu okwu nile. Mgbe ahụ, onye nchụaja Jupita, bụ chi nwere ụlọ nchụaja nꞌihu obodo ahụ, bupụtara igbe okoko osisi dị iche iche. Ọ kwadokwara iji chi ịchụ aja nye Pọl na Banabas nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ, nꞌihu igwe mmadụ ahụ. Mgbe Pọl na Banabas hụrụ ihe nile ha na-akwado ime, ha dọwara uwe ha, tie mkpu, jekwuru igwe mmadụ ahụ nile na-eti mkpu na-asị, “Ndị ikom obodo a! gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ ozi ọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nꞌịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bụ nke unu na-efe site na-amaghị ama bịakwute Chineke dị ndụ. Ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe nile dị nꞌime ha. Nꞌoge gara aga ọ hapụrụ mmadụ nile ka ha sọọ isi nꞌụzọ nile nke aka ha. Ma ọ nọkwa na-agba akaebe banyere onwe ya nꞌime ọgbọ nile, site nꞌọrụ ọma ya nile. Ọ na-enye unu mmiri ozuzo, na mkpụrụ nke ala nꞌoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri nke na-eme ka obi na-atọ unu ụtọ.” Otu ọ dị, ọ rara Pọl na Banabas ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ndị Juu ụfọdụ bịara site nꞌAntiọk na Aikoniọm. Ha kwaliri obi igwe mmadụ ahụ ka ha gbuo Pọl. Nꞌihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya gaa nꞌazụ obodo ahụ, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụọnwụkamma. Ma mgbe ndị kwere ekwe gbakọrọ guzo ya gburugburu, o bilitere. Ọ laghachiri nꞌime obodo ahụ. Ma nꞌechi ya, ya na Banabas hapụrụ obodo ahụ gaa Debi. Mgbe ha kwusịrị okwu Chineke nꞌebe ahụ, ha lọghachiri na Listra. Ma ọtụtụ mmadụ chegharịrị nꞌobodo Debi. Ha sitere Listra gaa obodo Aikoniọm. Nꞌebe ahụ ha gbara ndị kwere ekwe ume ka ha na-eto eto nꞌịhụnanya nꞌebe Chineke na mmadụ ibe ha nọ. Ha kasịkwara ha obi sị ha jidesie eziokwu ahụ ike, na-agụghị nsogbu nile a na-esogbu ha. Ha mekwara ka ndị kwere ekwe mata na ha aghaghị ịba nꞌalaeze Chineke site nꞌime nsogbu dị iche iche. Pọl na Banabas họpụtakwara ndị okenye nꞌime nzụkọ Kraịst dị nꞌebe ahụ. Ha sitere nꞌobubu ọnụ na ekpere tinye ha na nlekọta Onyenwe anyị, onye ha tụkwasịrị obi. Mgbe ha mesịrị ihe ndị a, ha sitere obodo Pisidia laghachi obodo Pamfilia. Ha zisakwara ozi ọma nke ugboro abụọ nꞌobodo Pega. Site nꞌebe ahụ ha jeruru Atalia. Mgbe ha jezuru ebe ndị a nile, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk. Ọ bụkwa nꞌAntiọk ka ha malitere ije ha nile. Ọ bụ nꞌAntiọk ka e nyefere ha nꞌaka Chineke nꞌihi ije ozi ndị a. Ugbu a ha ejezuokwla ozi ha. Mgbe ha bịaruru Antiọk, ha kpọkọtara ndị kwere ekwe nile kọwaara ha ihe banyere ije ha. Ha kọwaara ha otu Chineke si mee ka ozi ọma ya ruo ọtụtụ ndị mba ọzọ ntị. Emesịa, ha na ndị kwere ekwe nọgidere nꞌAntiọk oge dị anya. Mgbe Pọl na Banabas nọ nꞌAntiọk e nwere ụfọdụ mmadụ sitere Judia bịa nꞌebe ahụ. Ndị a malitere izi ndị kwere ekwe na ọ dị mkpa ka ha mezuo omenala ndị Juu banyere obibi ugwu tupuu a zọpụta ha. Ndị nkuzi a na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Emesịa, ndị kwere ekwe nọ nꞌAntiọk kpebiri iziga Pọl na Banabas Jerusalem ka ha gaa chọpụta ihe banyere okwu a. Ụmụnna ndị ọzọ sokwa ha gaa ịhụ ndị ozi na ndị okenye nzukọ dị na Jerusalem banyere okwu ahụ. Mgbe nzukọ Kraist dị nꞌobodo ahụ dupụrụ ha, Pọl na Banabas, na ndị so ha chere ihu ha ịga Jerusalem. Ma mgbe ha na-aga, ha kwụsịkwara nꞌobodo nta dị iche iche, nke dị nꞌụzọ ahụ, bụ obodo ndị Fonisia na Sameria. Ha na-eleta ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ, na-akọwara ha otu ndị mba ọzọ si anabata Kraịst. Nke a mere ka ndị kwere ekwe ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu. Mgbe ha bịaruru Jerusalem, ha zutere ndị isi ụlọ nzukọ Kraịst. Ndị ozi Kraịst nile na ndị okenye ụlọ nzukọ ahụ zukọtara nꞌotu ebe ịnụrụ ihe Pọl na Banabas nwere ikwu banyere ihe Onyenwe anyị rụrụ site nꞌaka ha. Ma ọtụtụ nꞌime ndị zukọrọ nꞌoge ahụ, ndị bụrịị ndị Farisii tupu ha echegharịa, guzosiri ike na-ekwu na ọ dị mkpa ka ndị chegharịrị site na mba ọzọ bie ugwu dị ka omenala ndị Juu si dị. Mgbe ahụ ndị ozi na ndị okenye zukọtara ịtụle okwu ahụ. Mgbe ha nọ tụlee okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu nile maara ihe banyere nhọpụta nke Onyenwe anyị họpụtara m. Nhọpụta a bụ ka m zisaa ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye ndị mba ọzọ. Ka ha nụrụ, ma chegharịakwa. Chineke a, onye maara obi mmadụ nile, anabatala ndị mba ọzọ. O gosiri na ọ nabatala ha site nꞌinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dị ka anyị si nata ya na mbụ. O gosighị na o nwere ihe dị iche nꞌetiti anyị na ha. Nꞌihi na ọ sachara obi ha nile site nꞌokwukwe. Ugbu a, unu na-achọ ikuziri Chineke ihe? Unu chọrọ ibo ndị mba ọzọ ibu arọ nke anyị na nna nna anyị ha na-enweghị ike ibu? Ọ bụ na unu amataghị na e sitere nanị nꞌotu ụzọ ahụ zọpụta anyị nile? Ụzọ onyinye amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst!” Nꞌoge a, ọ dịghị onye ọ bụla kwuru okwu ọzọ. Mmadụ nile nọdụrụ nwayọọ gee ntị nꞌihe Pọl na Banabas nwere ikwu banyere ihe ịrịba ama nile Chineke rụrụ nꞌetiti ndị mba ọzọ. Mgbe ha kwusịrị okwu ndị a, Jemes malitere ikwu okwu sị, “Ụmụnna m geenụ ntị. Pita akọọrọla unu ihe banyere otu Chineke si leta ndị mba ọzọ. Chineke sitere nꞌetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-asọpụrụ ya, na ndị ga-ebuli aha ya elu. Okwu ahụ ndị amụma kwuru dakọtara nꞌihe ndị a na-eme ugbu a. Nꞌihi na Emọs onye amụma kwuru sị, ‘Mgbe ihe ndị a gasịrị, dị ka Onyenwe anyị kwuru, aga m alọghachikwute ndị m. Aga m ewughachikwa ụlọ Devidi; ebe ya nile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa. Nke a ga-eme ka ndị mba ọzọ chọta Onyenwe anyị, bụ ndị mba ọzọ ahụ nile a kpọkwasịrị aha m. Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru. Nke a bụkwa nzube ya maliterị na mbụ.’ “Nꞌihi nke a, ntụpụta m bụ nke a, o kwesịghị ka anyị jidesie ndị mba ọzọ aka ike, bụ ndị chegharịrị bịakwute Chineke sị ha debe iwu na omenala ndị Juu nile. Kama o kwesịrị ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri anụ ọ bụla e ji chụọra arụsị aja. Ka ha wezụgakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, ma ọ bụ ọbara. Nꞌihi na a na-ekwusa ihe dị nꞌiwu Mosisi nꞌụlọ nzukọ ndị Juu dị nꞌebe nile, site nꞌotu obodo ruo nꞌobodo ọzọ na site nꞌizu ruo nꞌizu.” Mgbe ahụ ndị ozi na ndị okenye na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ fere nza iji ya ịchọpụta ndị ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị kwere ekwe nọ nꞌAntiọk. Ndị dị otu a ga-eso Pọl na Banabas gaa kọwaara ha ihe nzukọ a kpebiri. Ndị a họpụtara bụ mmadụ abụọ site nꞌetiti ndị isi. Ha bụ Judas onye aha ya bụkwa Basabas, na otu onye ọzọ a na-akpọ Saịlas. Nke a bụ ihe ha dere nꞌakwụkwọ ahụ ha ga-eji gaa ozi a. “Akwụkwọ a sitere nꞌaka ndị ozi, ndị okenye na ụmụnna nọ na Jerusalem. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere na Kraịst, unu ndị nọ nꞌAntiọk, na Siria na Silisia. Anyị na-ekele unu ekele nꞌime Onyenwe anyị. “E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị kwere ekwe si nꞌetiti anyị ebuterela unu nsogbu na ọgba aghara banyere nzọpụta unu. Ha etinyerela unu obi ịlọ mmiri. Ma nꞌezie, ọ bụghị anyị zitere ha nꞌebe unu nọ. Nꞌihi nke a anyị zukọrọ sitekwa nꞌotu obi nwee mkpebi a. Anyị na-ezitekwa mmadụ abụọ ndị a, bụ ndị ha na Pọl na Banabas so, ka ha nọchite anya anyị. Mmadụ abụọ ndị a ahụla ọtụtụ ahụhụ nꞌihi ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ka ha site nꞌokwu ọnụ ha kwagide ihe anyị dere nꞌakwụkwọ. “Nꞌihi na ọ bụ ihe ziri ezi nꞌanya Mmụọ Nsọ, na nꞌanya anyị kwa, na o kwesịghị ka anyị bokwasị unu ibu arọ banyere omenala ndị Juu. Ma o kwesịrị ka unu hapụ iri ihe ọ bụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri ihe ọ bụla a nyagburu anyagbu, ma ọ bụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nꞌịkwa iko ọ bụla. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.” Ndị ozi anọ ahụ biliri gaa Antiọk. Nꞌebe ahụ ha kpọrọ nzukọ nke ndị nile kwere ekwe. Mgbe ha zukọrọ, ndị ozi a nyere ha akwụkwọ ozi ahụ ha si na Jerusalem weta. Mgbe ha gụsịrị akwụkwọ ahụ, ndị kwere ekwe ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nꞌihi agbamume akwụkwọ ahụ wetara. Ma ebe Judas na Saịlas nwere onyinye ikwuwa okwu, ha kwupụtara okwu Onyenwe anyị nꞌime nzụkọ Kraịst oge ahụ nile, mee ka okwukwe ndị kwere ekwe nọ nꞌobodo ahụ guzosie ike. Judas na Saịlas nọnyeere ha ụbọchị ụfọdụ. Emesịa, ha laghachiri Jerusalem. Ha jikwa obi ụtọ na ekele laghachikwuru ndị ozi. Ma Pọl na Banabas nọgidere nꞌAntiọk, inyere ndị na-ekwusa okwu Onyenwe anyị aka. Ha nọgidesịrị ike ịkụzi okwu Chineke. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Pọl gwara Banabas sị, “Ka anyị laghachikwa obodo Tọki ileta nzukọ Kraịst dị iche iche dị nꞌakụkụ obodo ahụ. Ka anyị gaa leta ndị ahụ anyị zisaara ozi ọma nꞌoge gara aga, ịmata ihe banyere ọnọdụ ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ.” Banabas kwenyere nꞌihe Pọl kwuru kama ọ chọrọ ka Jọn Mak soro ha nꞌije ha. Ma Pọl ekweghị ka o soro ha, nꞌihi na Jọn Mak esoghị ha nọgide ruo ọgwụgwụ ije ha nꞌoge gara aga. Nꞌihi nke a ịrụ ụka dapụtara nꞌetiti ha. Emesịa, ha kewara. Banabas kpọọrọ Jọn Mak banye nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌobodo Saịprọs. Ma Pọl họọrọ Saịlas. Emesịa, mgbe ụmụnna kpeere ha ekpere tinye ha nꞌaka amara Onyenwe anyị, ha jegharịrị nꞌime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ Kraịst nọ nꞌebe ahụ ume. Mgbe ahụ, Pọl na Saịlas buru ụzọ jeruo obodo Debi. Emesịa ha gara nꞌobodo Listra, ebe ha zutere otu nwoke a na-akpọ Timoti. Timoti bụ onye kwere ekwe. Nne ya bụ onye Juu, bụrụkwa onye kwere ekwe. Ma nna ya bụ onye Griik. Ụmụnna nꞌime Kraịst bi nꞌobodo Listra na Aikoniọm gbara ezi ama banyere Timoti. Nꞌihi nke a Pọl rịọrọ ka Timoti soro ya nꞌije ya. Ma nꞌihi ndị Juu bi nꞌakụkụ ahụ, Pọl biri Timoti ugwu tupu o soro ha. Nꞌihi na mmadụ nile maara na nna Timoti bụ onye Griik. Ha jegharịrị nꞌobodo dị iche iche na-akọwara nzukọ Kraịst ihe banyere mkpebi ndị ozi na ndị okenye kpebiri na Jerusalem banyere ndị mba ọzọ. Ihe ndị a nile mere ka nzukọ Kraịst too eto nꞌokwukwe na nꞌọnụ ọgụgụ. Mgbe ha si nꞌebe ahụ pụọ, ha gara nꞌobodo Frigia na Galetia. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa ozi ọma nꞌakụkụ Esia nꞌoge ahụ. Mgbe ha ruru nꞌakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nꞌakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ Onyenwe anyị akwagideghị ka ha gaa. Kama ha chigharịrị ihu gaa nꞌakụkụ obodo Misia. Emesịa, ha batara nꞌobodo Troas. Nꞌabalị ahụ Pọl hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ ahụ, ọ hụrụ otu nwoke ka o guzo na-arịọ Pọl arịrịọ sị ya, “Biko, bịa na Masidonia nyere anyị aka.” Site nꞌoge Pọl hụrụ ọhụ a, anyị bidoro ịkwado ịga Masidonia. Nꞌihi na anyị kpebiri na ọ bụ Chineke na-eziga anyị nꞌebe ahụ. Anyị matakwara na ọ bụ ọchịchọ ya ka anyị kwusaa ozi ọma ya nꞌebe ahụ. Ọzọ kwa, anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas. Emesịa, anyị gafere obodo Samotres. Nꞌechi ya, anyị bịaruru Niapolis. Nꞌikpeazụ, anyị bịaruru obodo Filipai nke dị nꞌime ala Masidonia. Filipai bụkwa obodo dị nꞌokpuru ndị Rom. Anyị nọgidere nꞌebe ahụ ụbọchị ụfọdụ. Nꞌụbọchị izuike, anyị sitere nꞌobodo ahụ gaa nꞌakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụfọdụ mmadụ na-ezukọ ikpe ekpere. Nꞌebe a ka anyị nọ kụziere ọtụtụ ụmụ nwanyị bịara ikpe ekpere okwu Chineke. Aha otu nꞌime ndị inyom a bụ Lidia. Ọ bụ onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Amụrụ ya nꞌobodo Tiatira. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Mgbe ọ nọ na-ege ntị nꞌihe Pọl na-ekwu, Chineke meghere obi ya, mee ka ọ nabata okwu nile Pọl kwuru. E mere ya na ezinụlọ ya baptizim. Lidia rịọrọ ka anyị bụrụ ọbịa nꞌụlọ ya. Ọ gwara anyị okwu sị, “Ọ bụrụ nꞌezie na unu gụrụ m dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi, biko batanụ nꞌụlọ m.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya. Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga ikpe ekpere nꞌakụkụ ọnụ mmiri, anyị zutere otu nwagbọghọ onye mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Ọ bụkwa ohu, na onye na-agba aja. Site nꞌụzọ dị otu a ọ na-ewetara ndị nwe ya ego dị ukwuu. Ma o sogidere anyị ebe ọ bụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-sị, “Ndị a bụ ndị ozi Chineke kachasị ihe nile elu. Ha abịala nꞌebe a ikwusara unu ihe banyere ụzọ mgbaghara mmehie.” Nwagbọghọ ahụ mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nꞌoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nꞌime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nꞌime nwagbọghọ a pụta!” Otu mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụta. Mgbe ndị nwe nwagbọghọ ahụ hụrụ na olileanya inweta ego site nꞌịgba aja agwụla, ha sitere nꞌoke ọnụma jide Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndị ikpe nꞌebe a na-azụ ahịa. Ha nile tiri mkpu sị, “Ndị Juu a emebiela obodo ukwu anyị! Ha na-ezi ọtụtụ mmadụ ka ha mee omume megidere iwu ndị Rom!” Mgbe na-adịghị anya, ha kwalitere obi ọtụtụ mmadụ megide Pọl na Saịlas. Ndị ikpe ahụ nyere igwe mmadụ ahụ ike ịdọkasị uwe Pọl na Saịlas, na itikwa ha ihe. Mgbe ha tichara ha ihe, a tụnyere ha nꞌime ụlọ mkpọrọ. E mekwara ka onye nche mata na o kwesịrị iche ha nche nke ọma. Nꞌihi nke a, onye nche kpachapụrụ ha anya nke ọma, tinye ha nꞌime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri eriri igwe kegide ha nꞌụkwụ. Nꞌetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị nile nọ nꞌụlọ mkpọrọ ahụ na-anụkwa olu ha. Na mberede, ala ọma jijiji bidoro, ntọ ala ụlọ mkpọro ahụ gharịpụrụ nꞌọnọdụ ya. Ọnụ ụzọ ya nile meghekwara. Mkpọrọ igwe nile e ji kee ndị mkpọrọ dapụsịrị site nꞌebe e kegidere ha! Mgbe ahụ, onyeisi nche ụlọ mkpọrọ ahụ tetara nꞌụra. Ọ hụrụ na ọnụ ụzọ nile ghere oghe. Nꞌihi ya o chere na mmadụ nile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya. Ma Pọl tiri mkpu sị ya, “Egbula onwe gị. Anyị nile nọ nꞌebe a!” Onyeisi nche ahụ tụrụ egwu nke ukwuu maakwa jijiji. Ọ kpọrọ ka e tinye ọkụ. Mgbe e tinyesịrị ọkụ, ọ gbaara ọsọ daa nꞌụkwụ Pọl na Saịlas. Ọ kpọpụtara ha, rịọ ha sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” Ha sịrị ya, “Kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinụlọ gị nile.” Ha kọọrọ ya na ndị ezinụlọ ya akụkọ ozi ọma Onyenwe anyị. Nꞌoge ahụ, ọ sara ọnya ha, nꞌebe e tichara ha ihe, ma merụọ ha ahụ. Emesịa, e mere ya na ezinụlọ ya baptizim. Ọ kpọbatara ha nꞌụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi na ha kweere na Chineke. Nꞌechi ya, ndị ikpe ahụ ziri ndị uwe ojii ka ha gwa onyeisi nche ụlọ mkpọrọ ahụ ka ọ hapụ Pọl na Saịlas ka ha laa. Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara Pọl na ndị ikpe zitere ozi sị ha laa. Ma Pọl zara sị, “Mbaa! Nke a abụghị ihe ha kwesịrị ime! Ha tiri anyị ihe nꞌihu mmadụ nile na-ebughị ụzọ kpee anyị ikpe. Emesịa ha tinyere anyị nꞌụlọ mkpọrọ. Anyị bụ diala nꞌobodo Rom! Olee otu ha ga-esi zipụ anyị na nzuzo. O kwesịri ka ha bịa nꞌonwe ha kpọpụta anyị!” Ndị uwe ojii ahụ e ziri ozi gara gwa ndị ikpe ahụ ihe Pọl kwuru. Mgbe ha nụrụ na Pọl na Saịlas bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu. Ha bịakwutere ha nꞌụlọ mkpọrọ rịọsie ha arịrịọ ike sị ha laa. Ha kpọpụtakwara ha, rịọ ha ka ha hapụ obodo ahụ. Mgbe ahụ Pọl na Saịlas laghachiri nꞌụlọ Lidia. Ọtụtu ndị kwere ekwe bịakwutere ha. Pọl na Saịlas gwara ha okwu Chineke. Emesịa, ha hapụrụ obodo ahụ. Emesịa, ha malitere ijegharị nꞌobodo nile nke Amfipolis na Apolonia. Nꞌikpeazụ ha bịaruru Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị. Dị ka Pọl na-eme oge nile, ọ banyere nꞌime ụlọ nzukọ ahụ ikwu okwu Chineke. O mere nke a izu ụka atọ, na-ekpughekwa ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ na-akọwakwa ihe ndị amụma kwuru banyere ahụhụ nile Onye nzọpụta ga-ahụ na mbilite nꞌọnwụ ya. Site nꞌokwu ndị a o mekwara ka ha mata na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ụfọdụ ndị Juu gere ntị nꞌokwu ahụ, ghọtara ihe ọ na-ekwu. Ha chegharịrị nabata Onyenwe anyị, ha na ndị Griik na-atụ egwu Chineke na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha. Ma ndị isi Juu jupụtara nꞌekworo, nꞌihi ọrụ ndị a. Ha kwalitere obi ụfọdụ mmadụ efu nꞌetiti ha. Ndị a malitekwara ọgba aghara nꞌụzọ dị iche iche. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nꞌihi na ha chọrọ ịdọkpụta Pọl na Sailas, inyefe ha nꞌaka ụlọ ikpe obodo ahụ, ka e nye ha ntaramahụhụ. Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nꞌebe ahụ, ha dọkpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe obodo ahụ. Ha boro ha ebubo sị, “Ndị a kpuru ụwa ihu nꞌala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu. Ma nwoke a na-akpọ Jesin zoro ha nꞌụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nꞌihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.” Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nꞌetiti ndị ikpe na mmadụ nile. Ha hapụrụ ha nanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ ịnapụta ha. Ma nꞌabalị ahụ ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Sailas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nꞌebe ahụ, ha banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu, na-ekwusa ozi ọma Chineke. Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu Chineke karịa ndị bi na Tesalonaịka. Mgbe ha gere ntị nꞌokwu Chineke, ha jiri ọṅụ nyochaa akwụkwọ nsọ ịchọpụta ma ozizi Pọl na Sailas na-ezi ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị nile. Site nꞌụzọ dị otu a ọtụtụ mmadụ nꞌetiti ha chegharịrị. Ụfọdụ ụmụ nwanyị ndị Griik na ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị nwoke chegharịkwara. Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa ozi ọma nꞌobodo Beria, ha bịara nꞌobodo ahụ webata ọgba aghara ọzọ. Ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ mere ngwangwa izipụ Pọl ka ọ gaa nꞌakụkụ oke osimiri dị nꞌebe ahụ. Ma ha hapụrụ Sailas na Timoti ka ha na ha nọdụ nwa oge. Ma ndị dupụrụ Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Emesịa, ha laghachiri Beria zie Sailas na Timoti ozi na Pọl chọrọ ka ha bịakwute ya ngwangwa. Pọl nọdụrụ nꞌAtens chere Timoti na Sailas. Nꞌoge a o wutere ya nke ukwuu nꞌihi arụsị nile ọ hụrụ, nke jupụtara nꞌobodo ahụ. Nꞌihi ya, ọ banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu soro ha kwuritaa okwu. Ụfọdụ ndị nọ nꞌime nzukọ a bụ ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Ụbọchị nile Pọl na-ekwusara ndị nile na-abịakwute ya nꞌọgbọ ọha, ozi ọma. O sokwaara ndị ọkachamara obodo ahụ, ndị a na-akpọ ndị Epikuri na ndị Stoik kwurita okwu. Kama ha enweghị afọ ojuju mgbe Pọl gwara ha ihe banyere Jisọs na mbilite nꞌọnwụ ya. Mgbe ha nụrụ ya ụfọdụ sịrị, “Nwoke a na-arọ nrọ.” Ndị ọzọ sịkwa, “Ọ na-ewebata ozizi ọhụrụ dị iche.” Ndị ọkachamara ahụ kpọbatara ya nꞌebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Ugwu Mas, sị ya, “Bịa kọwaara anyị ozizi ọhụrụ gị. Ihe nile ị na-ekwu na-akọ anyị ọkọ na ntị. Ha na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịnụ ha nke ọma.” Ihe e jiri mara ndị Atens bụ na ha na-achọ nanị ikwu okwu banyere ihe ọhụrụ. Nke a agwụchaala ọrụ ha, ịnụ ihe banyere ihe ọhụrụ na ikwu maka ya. Nke a bụkwa ọrụ ndị ọbia bi nꞌobodo ahụ. Nꞌihi nke a Pọl guzoro nꞌelu ugwu ahụ gwa ha okwu sị, “Unu ndị nile bi nꞌAtens. Amatara m na ọ na-anụ unu ọkụ nꞌobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe. Nꞌihi na mgbe m na-ejegharị nꞌobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche. Otu nꞌime ha ka e dekwasịrị ihe dị otu a nꞌelu ya, ‘E wuru ụlọ a nye chi ahụ a na-amaghị.’ Nke a pụtara na unu na-efe chi ahụ unu na-amaghị ofufe. Ma ugbu a, achọrọ m ka m kọwaara unu ihe banyere ya. “Chineke bụ onye kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nꞌụlọ e jiri aka wuo. Otu aka ahụ, mmadụ ọ bụla apụghị isite nꞌike aka ya jeere ya ozi nꞌụzọ kwesịrị. Nꞌihi na ọ dịghị ihe na-akpa Chineke mkpa. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe nile. Ọ na-egbokwa mkpa nile. Ọ bụ ya kere mmadụ nile site nꞌotu nwoke. O mere ka mba dị iche iche dị nꞌelu ụwa. Ọ bụkwa nanị ya na-ekpebi ihe banyere mbilite na ọdịda nke mba nile. Ọ matakwara ihe banyere oge nile a kara aka na njedebe ihe nile e kere eke. “Ma nzube ya banyere ihe nile bụ ka onye ọ bụla chọsie ihu ya ike. Eleghị anya mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta Chineke. Ọ nọkwaghị mmadụ ọ bụla nꞌebe dị anya. Nꞌihi na nꞌime ya ka anyị na-adị ndụ, anyị na-ejegharịkwa nꞌime ya. Dị ka otu onye nꞌetiti unu na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụkwa ụmụ Chineke.’ Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, anyị ekwesịghị iche na Chineke dị ka ihe mmadụ jiri aka ya kpụọ. A pụkwaghị iwere ọlaọcha na ọlaedo ma ọ bụ nkume kpụọ Chineke! Ma Chineke lefuru enweghị ngbọta mmadụ anya banyere ihe ndị a nile nꞌoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka onye ọ bụla site nꞌikpere arụsị wezuga onwe ya. Ọ chọkwara ka mmadụ nile fee ya ofufe. Nꞌihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa nile ikpe nꞌụzọ ezi omume. Nke a bụ site nꞌaka Onye ahụ ọ họpụtara. O mekwara ka okwu a guzosie ike, mgbe o mere ka Onye ahụ si nꞌọnwụ bilie.” Mgbe ha nụrụ ozizi Pọl banyere mbilite nꞌọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nꞌoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.” Mmadụ ole na ole sooro Pọl. Ha kweere nꞌOnyenwe anyị. Otu onye nꞌime ha bụ Dionisiọs. Ọ bụ otu nꞌime ndị isi obodo ahụ. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damariọs na ndị ọzọ kwa. Pọl hapụrụ Atens gaa obodo Kọrint. Nꞌebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nꞌobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwụnye ya Prisila sitere Itali bịa Kọrint nꞌihi na a chụpụrụ ha na Rom mgbe eze ndị Rom bụ Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nꞌobodo Rom. Pọl soro ha bikọọ, nꞌihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu, dị ka Pọl na-emekwa. Ụbọchị izuike nile Pọl na-ejekwuru ndị Juu nꞌụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere. Mgbe Sailas na Timoti sitere na Masidonia bịa izute Pọl, Pọl tinyere oge ya nile ikwu okwu Chineke na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ọtụtụ ndị Juu ekwereghị. Kama ha na-ekwulu Pọl. Nꞌihi nke a Pọl hichapụrụ aja dị nꞌuwe ya sị ha, “Ọbara unu dịkwasịkwa unu nꞌisi. Ikpe amakwaghị m banyere unu. Malite ugbu a, aga m ezisara ndị mba ọzọ ozi ọma a.” Ọ hapụrụ ha gaa biri nꞌụlọ Taitọs Jọstọs, onye mba ọzọ na-asọpụrụ ma na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nꞌakụkụ ụlọ nzukọ ndị Juu nꞌobodo ahụ. Otu nwoke a na-akpọ Krispọs onyeisi nꞌụlọ nzukọ ndị Juu ahụ na ezinụlọ ya nile chegharịrị bịakwute Onyenwe anyị. E mekwara ha baptizim dị ka e mere ọtụtụ ndị ọzọ na Kọrint. Onyenwe anyị gwara Pọl okwu nꞌọhụ nꞌotu abalị sị ya, “Atụla egwu Pọl! Kwusie okwu ike, emechila ọnụ gị ma ọlị. Nꞌihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nꞌime obodo a.” Site na nke a, Pọl nọgidere nꞌobodo ahụ otu afọ na mkpirisi. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke. Mgbe Galio malitere ịchị nꞌobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nꞌikpeazụ ha duuru ya gaa nꞌihu Galio, ka e kpee ya ikpe. Ha boro Pọl ebubo na ọ na-akwagide obodo ha nile ife Chineke ofufe nꞌụzọ megidere omenala na iwu ha. Ma mgbe Pọl chọrọ ịkọwa onwe ya nꞌihu Galio, Galio chigharịrị ihu ya lee ndị ahụ na-ebo Pọl ebubo ụgha anya sị ha, “Ndị Juu, geenụ m ntị. Ọ bụrụ na nke a bụ okwu megidere iwu ndị Rom, obi ga-atọ m ụtọ ige unu ntị. Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere ihe mmụta dị iche iche na ịrụ ụka site nꞌiwu na-achị ndị Juu, gaanụ dozie ya nꞌonwe unu. Okwu ahụ agbasaghị m, achọghị m itinye ya ọnụ ma ọlị.” Galio sitere nꞌime ụlọ ikpe ya chụpụ ha. Mgbe ha pụtara nꞌezi, ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ndị Juu ahụ tie ya ihe nke ukwuu nꞌọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dị ka ọ maara ihe na-eme nꞌebe ahụ. Ma Pọl nọgidere nꞌobodo ahụ ụbọchị ụfọdụ. Emesịa, ọ hapụrụ ndị kwere ekwe nọ nꞌobodo ahụ banye nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌakụkụ Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Ma mgbe ha bịaruru obodo a na-akpọ Senkria, Pọl kpachara agịrị isi ya. Nke a bụkwa usoro omenala ndị Juu, nꞌihi na o kwere Chineke nkwa. Ọ bịaruru nꞌọnụ mmiri Efesọs, hapụ anyị nꞌime ụgbọ ahụ, baa jekwuru ndị Juu nꞌụlọ nzukọ ha. Ọ gwara ha okwu Onyenwe anyị. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ụfọdụ, ma ọ hapụrụ ha nꞌihi na ọ chọghị itufu oge ọ bụla. Ọ gwara ha sị, “Achọrọ m ijeru Jerusalem nꞌoge izuike. Ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị aga m alọghachi ọzọ.” Emesịa, anyị gara nꞌihu nꞌije anyị. Ebe ọzọ anyị kwụsịrị bụ nꞌọnụ mmiri a na-akpọ Sizaria. Pọl sitere nꞌebe a jeruo ileta nzukọ Kraịst dị na Jerusalem. Emesịa, anyị jerukwara Antiọk. Mgbe anyị nọsịrị ụbọchị ụfọdụ nꞌebe ahụ, Pọl hapụrụ jeghachikwa obodo Tọki, jegharịa akụkụ Galetia na Frigia nile na-eleta ndị kwere ekwe, na-agwa ha okwu ga-agba ha ume. Otu ọ dị e nwere otu nwoke onye Juu bịara ọhụrụ nꞌobodo Efesọs. Aha ya bụ Apọlọs. Ọ bụ onye ikuzi akwụkwọ nsọ were anya nke ọma. O sitere nꞌobodo Alegzanda nke dị nꞌIjipti ebe a mụrụ ya bịa Efesọs. Nwoke a natara ozizi banyere Ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nꞌịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ nanị ihe gbasara baptizim Jọn mere. Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya duru ya gaa nꞌụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe nile banyere Ụzọ Chineke. Ihe Apọlọs na-ezube nꞌuche ya bụ ijeru obodo Griis. Ụmụnna anyị kasịrị ya obi. Ha degaara ụmụnna nọ nꞌebe ahụ akwụkwọ ka ha lekọtaa Apọlọs anya nke ọma. Mgbe ọ bịaruru Griis, Onyenwe anyị jiri ya rụọ ọrụ dị ukwuu. E sitekwara nꞌaka ya gbaa ụmụ Chineke ume nꞌime nzukọ Kraịst nile dị nꞌobodo ahụ. Nꞌihu ndị mmadụ nile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka nile nke ndị Juu. O gosiri ha site nꞌakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Mgbe Apọlọs nọgidere na Kọrint, Pọl gakwara nꞌihu nꞌije ya. Ọ bịaruru Tọki. Nꞌebe ahụ ọ hụrụ ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị. Ọ jụrụ ndị a ajụjụ sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha zara sị ya, “Ọ dịghị! Anyị aghọtaghị ihe ị na-ekwu. Gịnị bụ Mmụọ Nsọ?” Pọl jụrụ ha ajụjụ ọzọ sị, “Gịnị ka unu kwenyere nꞌime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha zara sị ya, “Anyị kweere nꞌihe nile Jọn omee baptizim ziri.” Mgbe ahụ Pọl kọwaara ha na baptizim Jọn bụ ihe gosiri na ndị e mere ya chọrọ inwe mkpebi ichegharị site na mmehie ha bịakwute Chineke. O gosikwara na ndị e mere baptizim ahụ, jikeere ịga nꞌihu ikwere na Jisọs Onye ahụ Jọn kwuru na ọ ga-abịa. Mgbe ha ghọtara ihe ndị a, e mere ha baptizim nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs. Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nꞌasụsụ dị iche iche, buokwa amụma. Ndị mere ihe ndị a ruru mmadụ iri na abụọ. Emesịa, Pọl jekwuuru ndị Juu nꞌụlọ nzukọ ha, na-agwa ha okwu, ma gbalịakwa ime ka ha nabata ihe ọ na-ezi ha banyere alaeze Chineke. O mere nke a ọnwa atọ. Ma ụfọdụ ekwereghị okwu ya, kama ha kwuru okwu megide Jisọs. Nꞌihi nke a Pọl hapụrụ ha. Ọ gwakwaghị ha okwu Chineke ọzọ. O kewapụrụ ụmụ Chineke ka ha nwee nzukọ dị iche nꞌebe ọzọ. O bidoro nzukọ ọzọ nꞌụlọ nzukọ otu nwoke a na-akpọ Tiranọs, nke dị nꞌime obodo ahụ. Ọ na-ekwusakwa okwu Chineke nꞌebe ahụ ụbọchị nile. Ihe ndị a gakwara nꞌihu afọ abụọ. Ndị nile bi na Tọki, nke dị nꞌEsia, nụkwara ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs. Ọtụtụ nꞌime ha bụ ndị Juu ma ndị ọzọ bụ ndị Griik. Onyenwe anyị tụkwasịrị Pọl ike, ime ihe ịrịba ama dị iche iche. Ihe ịrịba ama o mere dị ukwuu. Nke ka nke, a na-ewere ụfọdụ nꞌime akịsị ma ọ bụ ịchafo ọ na-eji ehicha ihu na-atụkwasị nꞌahụ ndị ọrịa, ka ahụ dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ. Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nꞌobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nꞌime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nꞌaha Jisọs. Ihe ha na-agwa mmụọ ọjọọ bụ nke a, “E ji m aha Jisọs onye Pọl na-ekwusa nye gị iwu ka i site nꞌime ya pụta.” Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa Skiva onye nchụaja ndị Juu. Mgbe ha mere ihe dị otu a nꞌebe otu nwoke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya, mmụọ ọjọọ ahụ sịrị ha, “Amaara m Onye Jisọs bụ. Amakwaara m Pọl, ma onye ka unu bụ?” Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị jidere mmadụ abụọ nꞌime ha tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbaara ọtọ gbapụ nꞌụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ nke ukwuu nꞌakụkụ ahụ ha nile. Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs nile. Mgbe ahụ ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidere ndị obodo ahụ. Nꞌihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nꞌebe nile. Ọtụtụ ndị chegharịrị bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha nile, nꞌihu mmadụ nile. Ọtụtụ ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị, bupụtara akwụkwọ nile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nꞌihu mmadụ nile. A kpọkwara ọgwụ nile ọkụ. Akwụkwọ nile a kpọrọ ọkụ nꞌụbọchị ahụ ga-erukwa akwụkwọ a ga-eji puku naịra anọ zụta. Ihe nile ndị a gosiri otu okwu Chineke si gbasaa, ma guzosiekwa ike. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Mmụọ Nsọ kwagidere Pọl ka o jeruo Griis tupu ọ bịaruo Jerusalem. Pọl kpebiri na ọ ghaghị ijeru Rom, nꞌọgwụgwu ije ya nile. O buru ụzọ zipụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Griis. Ma ya onwe ya nọgidere nꞌime Tọki ụbọchị ụfọdụ. Ma ọ bụ nꞌoge a ka oke nsogbu malitere nꞌobodo Efesọs megide ọrụ mgbasa ozi ọma. Onye malitere nsogbu ahụ bụ otu nwoke a na-akpọ Dimitriọs. Ọ bụ ọkpụụzụ nke ọlaọcha. O nwekwara ọtụtụ ndị e goro ọrụ ndị na-akpụ ụdị chi dị iche iche a na-akpọ Daịana, bụ chị ndị obodo Griik. Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya nile, na ndị ọzọ ọrụ ha bụ ire chi ndị a. Ọ gwara ha okwu dị otu a sị, “Ndị a maara aha ha, okwu a bụ ihe banyere ụzọ anyị na-esi enweta akụ anyị na ihe anyị ji adị ndụ. Unu nile ahụla, nụkwa ihe nile na-aga ugbu a. Unu maara ihe nwoke a na-akpọ Pọl na-agwa mmadụ nile na chi ọ bụla e jiri aka mee abụghị ihe ọ bụla. Nꞌihi nke a ahia anyị emebiela. Ọ bụkwaghị nanị nꞌime Efesọs ka ihe ndị a na-eme, kama ndị nile nọ nꞌokpụrụ obodo anyị mazuru ihe banyere okwu a. Ọ bụkwaghị nanị na ụzọ anyị si enweta ihe oriri ka a ga-emechi site nꞌozizi ọjọọ nke Pọl, kama, ọ bụrụ na anyị agba nkịtị, hapụ igbochi ozizi a, ọ gaghị adịkwa anya, chi ukwu anyị Daịana, agaghị enwekwa nsọpụrụ. Otu aka ahụ obodo Tọki na ndị nile dị iche iche agaghị akpọkwa isi ala nye ya ọzọ. Ha ga-echefukwa ihe nile banyere ya.” Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha were oke iwe tie mkpu na-asị, “Ukwuu ka Daịana ndị Efesọs dị!” Nꞌotu ntabi anya ahụ, igwe mmadụ gbakọrọ. Onye ọ bụla nꞌobodo ahụ nọ nꞌọnọdụ mgbagwoju anya. Ha nujiiri bata nꞌebe nzukọ ha, na-adọkpụgharị Gaịọs na Aristakọs ikpe ha ikpe, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ. Pọl gbalịsịrị ike ịbanye nꞌebe ahụ, ma ndị kwere ekwe nile gbochiri ya. Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nꞌetiti ndị na-achị achị nꞌobodo ahụ zigakwara ya ozi na-arịọ ya, ka ọ hapụ iji aka ya kpatara onwe ya ọnwụ site nꞌịbanye. Ndị obodo a nile nọ na-eti mkpu nꞌụlọ nzukọ a. Ebe ahụ nile jupụtara nꞌaghara. Nꞌezie, ọtụtụ nꞌime ha amataghị ihe ha jiri nọdụ nꞌebe ahụ. Ụfọdụ ndị Juu hụrụ Alegzanda nꞌime igwe mmadụ ahụ, dọkpụrụ ya sepụta ya nꞌihu igwe mmadụ ahụ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ikwu okwu. Ma nꞌotu ntabi anya ahụ, mgbe igwe mmadụ ahụ matara na ọ bụ onye Juu, ha bidoro iti mkpu ihe dị ka ogologo awa abụọ na-asị, “Ukwuu ka Daịana ndị Efesọs dị! Ukwuu ka Daịana ndị Efesọs dị!” Nꞌikpeazụ, onye na-elekọta obodo, kwụsịrị ha nꞌụzụ a. Ọ gwara ha okwu sị, “Ndị ikom Efesọs, onye ọ bụla maara na obodo Efesọs bụ obodo a maara aha ya nꞌihi chi anyị a na-akpọ Daịana onye oyiyi ya si nꞌeluigwe daara anyị. Ebe nke a bụ ihe a maara amara, unu ekwesịghị isogbu onwe unu, ọ bụladị ma mmadụ kwuo okwu megide ya. Unu emela ihe ọ bụla nꞌobi ilu. Lee ugbu a, unu sepụtara nꞌebe a ndị a na-abụghị ndị ohi, ndị na-ezukwaghị ihe ọ bụla nꞌogige chi nwanyị a a na-akpọ Daịana, ma ha emerụkwaghị ya. Ọ bụrụ na Dimitriọs na ndị ọkpụụzụ ibe ya nwere ihe ọ bụla megide ha, ha gaa nꞌụlọ ikpe. Ndị na-ekpe ikpe ga-eleba okwu ha anya. Kama ha mee ya nꞌusoro iwu. Ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọzọ bụ mkpa ha, a pụrụ imedo ya na nzukọ ndị ọchịchị obodo. Nꞌihi na anyị na-etinye onwe anyị na nsogbu ịsa ajụjụ nꞌihu ndị isi Rom, nꞌihi aghara nile nke ụbọchị taa. Ma nke ka nke, ọ dịghị ihe anyị ga-asị na ọ bụ isi aghara a. Amaghị m ihe m ga-ekwu ma ọ bụrụ na akpọọ m.” Mgbe ọ gbasara ha, ha nile lakwara. Mgbe ọgba aghara ndị a kwụsịrị, Pọl zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị kwere ekwe nile. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu ịgba ume ikpeazụ iji kelee ha. Emesịa, ọ hapụrụ gawa Griis. Mgbe ọ na-aga ije ya, ọ na-agba ndị kwere ekwe nile ume, nꞌobodo nile ha gafere tutuu ruo mgbe ha rutere Griis. Ọ nọgidere na Griis ruo ọnwa atọ. Emesịa, mgbe o kpebiri isoro ụgbọ mmiri gaa Siria, ọ chọpụtara izuzu ọjọọ ndị Juu banyere ndụ ya. Ya mere, o kpebiri isite ụzọ ọzọ ka o buru ụzọ rute Masidonia. Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Aristakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi, na Timoti, na Tikikọs, na Trofimọs, ndị na-alaghachi nꞌụlọ ha na Tọki sokwa ya na-aga ije a. Ebe ha buru anyị ụzọ malite, ha nọrị na-eche anyị mgbe anyị rutere na Troas. Mgbe mmemme ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai nke dị nꞌugwu Griis. Ma mgbe ụbọchị ise gafere, anyị rutere Troas nꞌime Tọki ebe anyị nọdụrụ otu izu ụka. Nꞌabalị mbụ nꞌizu ụka, anyị zukọrọ ife Chineke ofufe na ịnata oriri nsọ. Pọl bụ onye kwuru okwu Chineke nꞌebe a. Ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nꞌetiti abalị. E tinyere ọkụ nꞌọtụtụ oriọna nke nyere ìhè nꞌụlọ ahụ anyị nọ na-ezukọ. Mgbe Pọl kwuru okwu ruo oge dị anya ụra bidoro ịtụ otu nwokorọbịa a na-akpọ Yutikọs. Emesịa, o siri na windo dapụ daa nꞌala. Mgbe ọ daruru ala, ọ bụụrụ onye nwụrụ anwụ. Pọl mere ngwangwa rituo nꞌala selite Yutikọs elu jikụọ ya. Ọ gwara ndị gbakọrọ nꞌebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.” Nꞌezie, Yutikọs dịkwara ndụ. Ha nie laghachikwara nꞌụlọ elu ahụ ebe ha nọ rikọọ oriri nsọ. Ha kwugidere okwu tutuu chi abọọ mgbe Pọl ji hapụ ha bilie ije ya. Nwokorọbịa ahụ ha kulitere na ndụ mere ka ọṅụ jupụta ha nꞌobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu. Anyị banyere nꞌụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ma Pọl esoghị anyị nꞌihi na o zubere iji ụkwụ ruo Asọs, ebe ọ ga-abanye nꞌụgbọ anyị. Ọ bụkwa nꞌAsọs ka o zutere anyị. Emesịa, anyị nile sooro gaa Mitilen. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nꞌụbọchị nke ọzọ kwa, anyị rutere Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs. Nꞌoge a Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nꞌEfesọs nꞌihi na ọ na-eme ngwangwa ka o nwee ike irute Jerusalem nꞌụbọchị mmemme Pentikọọsụ. Ma nꞌoge anyị rutere Melitọs, Pọl zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị Efesọs. Oge ha bịaruru, Pọl bidoro ịgwa ha okwu sị, “Unu maara nke ọma na site nꞌụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nꞌala Tọki tutuu ruo ugbu a, arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nꞌobi umeala na anya mmiri. Anatakwara m ntaramahụhụ dị ukwuu site nꞌizu ọjọọ ndị Juu nwere maka ịnapụ m ndụ m. Unu matakwara na akwụsịghị m ịgwa unu eziokwu ahụ ga-enyere unu aka nꞌezi ma ọ bụ nꞌụlọ aka unu. Ọ bụ nanị otu ozizi ahụ ka m nyere ndị Juu na ndị mba ọzọ, ozizi mkpa ọ dịrị mmadụ nile ịhapụ mmehie ha ma lọghachikwute Chineke site nꞌokwukwe nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. “Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dị ka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nꞌebe ahụ. Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-ekpughere m nꞌebe ọ bụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nꞌebe ahụ. Ma akpọghị m ndụ m ihe ọ bụla karịa na m ji ya arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọrụ izisa ozi ọma nye ndị ọzọ banyere oke ebere na ịhụnanya Chineke. “Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọ bụla nꞌime unu, bụ ndị m jegharịrị nꞌetiti ha na-ezi ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ. Ya mere, ana m agwasị unu ike taa na ọ bụrụ na onye ọ bụla efuo nꞌetiti unu agaghị ajụta ọbara ya nꞌaka m. Nꞌihi na esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu. “Ma ugbu a kpacharanụ anya! Leziekwanụ anya ịzụzi igwe atụru Chineke bụ chọọchị ya, nke Mmụọ Nsọ tinyere nꞌaka unu. Chineke emeela igwe atụrụ ndị a ihe nke aka ya, nꞌihi na o ji ọbara Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zụọ ha. Nꞌihi na amaara m na mgbe m si nꞌetiti unu pụọ, ndị ozizi ụgha yiri ọdụm ga-apụta nꞌetiti unu mee ka igwe atụrụ Chineke site nꞌeziokwu kpafuo. “Ụfọdụ nꞌime unu ga-elefu eziokwu ahụ anya ka unu dọtara onwe unu mmadụ. Ya mere, lezienụ anya! Chetakwanụ na nꞌime afọ atọ m nọ nꞌetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri zi unu ihe bụ eziokwu. “Ugbu a ana m etife unu nꞌaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nꞌaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu eme na inyekwa unu akụ na ụba o kwadobeere ndị ahụ ọ họpụtara ka ha dị iche nye onwe ya. “Ọ dịghị mgbe ọ bụla agụụ ịdọtara onwe m akụ na ụba ma ọ bụ uwe nke onye ọ bụla ji gụọ m. Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa m nile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so. Nꞌoge ọ bụla, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka. Nꞌihi na echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru mgbe ọ sịrị, ‘Ọ̀ dị mma inye enye karịa ịnara anara.’ ” Mgbe Pọl kwusịrị okwu ndị a, o soro ha nile gbuo ikpere nꞌala kpeekwa ekpere. Ha kwara akwa nke ukwuu, jikụọ ya, sutụkwa ya ọnụ mgbe ha na-ekele ya ekele ikpeazụ. O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duuru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri. Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo Kos. Mgbe chi bọrọ, anyị rutere Rods. Anyị sitere nꞌebe ahụ jeruo Patara. Nꞌebe ahụ, anyị banyere ụgbọ mmiri na-aga Siria na akụkụ obodo ndị Fonisia. Anyị rutere ebe anyị nọ nwee ike ịhụ Saiprọs, ma anyị hapụrụ ịga Saiprọs chee ihu nꞌụzọ Siria, tutuu anyị erute nꞌọnụ mmiri Taịa nꞌime Siria. Ebe a ka e bupụsịrị ibu nile dị nꞌụgbọ ahụ. Anyị banyere nꞌime obodo Taịa, hụ ndị kwere ekwe, nọnyere ha otu izu ụka. Ma ụmụ Chineke a dọrọ Pọl aka na ntị dị ka Mmụọ Nsọ Chineke kpugheere ha ka ọ ghara ịga Jerusalem. Ma mgbe otu izu ụka ahụ gasịrị, anyị lọghachiri nꞌụgbọ ahụ, ma ọ bụ ndị inyom na ụmụntakịrị dupụtara anyị nꞌọnụ mmiri ahụ. Anyị kpere ekpere kelee onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesia, anyị banyere nꞌime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nꞌụlọ ha. Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nꞌebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nꞌime obodo a, nọnyere ha nanị otu ụbọchị. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nꞌihu nꞌije anyị rute Sizaria. Nꞌebe ahụ anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa ozi ọma. Ọ bụ otu nꞌime mmadụ asaa ahụ a họpụtara maka ije ozi na Jerusalem. Nwoke a mụtara ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma. Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị, otu nwoke a na-akpọ Agabọs onye nwekwara onyinye ibu amụma, sitere Judia bata. Ọ bịara ileta anyị. Ma ọ chịlitere belịtị Pọl na-eke nꞌukwu kee onwe ya nꞌụkwụ na aka sị, “Dị ka Mmụọ Nsọ kwuru, otu a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nꞌaka ndị Rom.” Mgbe mmadụ nile nụrụ nke a, ndị kwere ekwe bi na Sizeria na ndị ya na ha so na-ejegharị rịọrọ Pọl ka ọ kwụsị ịga Jerusalem. Ma Pọl jụru ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa? Unu na-eme ka obi gbawaa m! Nꞌihi na ọ bụghị nanị na m jikeere ịghọ onye mkpọrọ na Jerusalem, kama ejikeere m iwere ndụ m nye nꞌihi Jisọs.” Mgbe mmadụ nile hụrụ na o kpebiela nꞌobi ya ịga Jerusalem, anyị kwụsịrị igbochi ya. Kama anyị nile sịrị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.” Ya mere, mgbe nwa oge nta gafere anyị chịkọtara ihe anyị bilie iga Jerusalem. Ụfọdụ ndị kwere ekwe bi na Sizaria sooro anyị, duru anyị rute nꞌụlọ Mnasin, onye anyị ga-anọ nꞌụlọ ya. Mnasin onye Saiprọs bụ otu nꞌime ndị mbụ kweere na Jisọs. Ọ nabatara anyị nke ọma. Ndị nile kwere ekwe bi na Jerusalem jikwa obi ụtọ nabata anyị. Nꞌụbọchị nke abụọ, Pọl duuru anyị mee ka anyị zute Jemes, na ndị okenye nzukọ Kraịst nọ na Jerusalem. Mgbe anyị keletasịrị ekele, Pọl kọọrọ ha ọtụtụ akụkọ, banyere ihe Chineke jiri ya rụọ nꞌetiti ndị mba ọzọ. Mgbe ha nụchara ihe o kwuru ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha gwara Pọl sị, “Ị maara nwanna anyị na ọtụtụ ndị kwere ekwe. Ma ha nile nọgidere na-asị na ndị Juu kwere ekwe aghaghị ịnọgide na mmemme na omenala ndị Juu. Ndị Juu kwere ekwe nọ nꞌebe a enweela uche abụọ banyere gị. Ha nụrụ na ị na-ezi ndị Juu bi na mba ọzọ sị ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosisi, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu dị ka omenala ndị Juu si dị. Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara. “Ntụpụta anyị bụ ka ị kpọrọ mmadụ anọ ndị a kwere Chineke nkwa. Soro ha gaa nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, sorokwa ha kpụchaa isi gị. Kwụọkwara ha ụgwọ ịchụ aja ịdị ọcha ha, ka ha kpụchaakwa isi ha. Ọ bụrụ na i mee nke a, ọ ga-edo onye ọ bụla anya na okwu nile e kwuru megide gị abụghị eziokwu. Ha ga-ahụkwa na gị onwe gị na-erube isi nꞌiwu Mosisi, na i sokwa anyị nwee otu uche banyere ya. Ma nꞌebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, iwu na omenala ndị Juu agbasaghị ha. Anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ka kwụsị iri ihe ọ bụla a chụrụ nꞌịta nye arụsị na iri ọbara, ma ọ bụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.” Pọl nabatara atụmatụ ha. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya ọ kpọọrọ mmadụ anọ ndị ahụ banye nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, maka mmemme ịdị ọcha. Emesịa, ọ gara nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ kwupụta abalị ole ọ ga-abụ mmemme ịdị ọcha ha agwụchaa, na oge ịchụ aja ha nꞌotu nꞌotu ga-abụ. Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si akụkụ Tọki bịa hụrụ Pọl nꞌụlọ nso ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ megide ya, jidekwa ya. Ha na-eti mkpu na-asị, “Ndị ikom Izirel, nyenụ aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nꞌebe nile na-ezi ozizi megidere ndị anyị. Ọ na-ezikwa ozizi megidere iwu Mosisi na ụlọ nsọ ukwu a. Ma ugbu a o merụọkwala ụlọ nsọ a site nꞌịkpọbata ndị mba ọzọ nꞌime ya.” Ha kwuru nke a nꞌihi na ha hụrụ Pọl na Trofimọs onye Efesọs, bụ onye a na-ebighị ugwu nꞌime obodo Jerusalem. Ha chere na Pọl kpọbatara ya nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Ọgba aghara jupụtara nꞌobodo ahụ nile nꞌihi ama ụgha a. Oke mkpọtụ sooro ya. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Nꞌotu mgbe ahụ, ha mechiri ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ukwu ahụ. Igwe mmadụ ahụ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo Pọl mgbe ozi ruru ọchịagha ndị Rom ntị na Jerusalem nile nọ nꞌaghara. Otu mgbe ahụ ọchịagha ahụ duuru ụfọdụ ndị isi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nꞌebe igwe mmadụ ahụ nọ. Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe. Ọchịagha ahụ jidere Pọl, nye ndị agha ya ike ka ha kee ya agbụ nke ọma. Mgbe ahụ ọ jụrụ ajụjụ sị, “Onye bụ nwoke a? Gịnị ka o mere?” Ụfọdụ na-eti otu ihe, ma ụfọdụ na-eti ihe ọzọ. Mgbe ọchịagha na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na aghara ahụ, o nyere iwu ka e duru Pọl gaa nꞌogige ndị agha. Mgbe ha na-eru nꞌụlọ elu ahụ, igwe mmadụ ahụ gbalịrị nke ukwuu igbu Pọl, ma ndị agha ahụ buuru ya tụkwasị ya nꞌubu ha, gbochie ihe ọjọọ ahụ. Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu na-asị, “Wepụnụ ndụ ya! Wepụnụ ndụ ya!” Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nꞌime ogige ahụ, ọ gwara ọchịagha ahụ okwu sị, “Ì nwere ike inye m ohere nta ịgwa gị okwu?” “Ị̀ maara asụ asụsụ ndị Griik?” Ka ọchịagha ahụ jụrụ ya. “Ị̀ bụghị onye Ijipti ahụ bidoro ọgba aghara afọ ole na ole gara aga. Onye duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nꞌozara?” “É,è!” ka Pọl zaghachiri. “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nke bụ oke obodo. Biko ka m gwa ndị a okwu ntakịrị.” Ọchịagha ahụ nyere ya ike. Ya mere, Pọl guzoro nꞌọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, Pọl gwara ha okwu nꞌasụsụ Hiburu sị, “Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nꞌihu unu.” Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nꞌasụsụ Hiburu ha deere duu karịa. “Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nꞌime Silisia. Azụrụ m na Jerusalem nꞌebe a nꞌụkwụ Gamaliel onye nkụzi m. Amụtara m nꞌaka ya usoro ịgbaso iwu anyị dị ka ndị Juu na ịsọpụrụ omenala anyị nꞌụzọ doro anya. Ọ na-anụ m ọkụ nꞌobi dị ka ọ na-anụkwa unu onwe unu taa. Akpagburu m ndị nile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nꞌaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nụlọ mkpọrọ. Ma onyeisi nchụaja na ụfọdụ nꞌime ndị nzukọ anyị nọ nꞌebe a pụrụ ịgba akaebe na okwu m bụ eziokwu. Anatara m nꞌaka ha akwụkwọ e deere ụmụnna anyị na Damaskọs. Nꞌime ya ka e nyere m ike ijide ndị na-eso ụzọ Jisọs na ịkpụta ha Jerusalem maka ịta ha ahụhụ. “Ma mgbe m na-aga nꞌụzọ, nꞌebe dị Damaskọs nso, ìhè si nꞌeluigwe, nke na-enwụ karịa ìhè anyanwụ kpuchigidere m. Adara m nꞌala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-esogbu m?’ “ ‘Ònye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. Olu ahụ zara sị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-esogbu.’ Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha aghọtaghị ihe mere. “Ma etiri m mkpu sị, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ Olu ahụ zaghachiri sị m, ‘Bilie banye Damaskọs. Ebe ahụ ka ị ga-amata ihe ị gaje ịhụ nꞌihi aha m.’ Enweghị m ike ịhụ ụzọ nꞌihi ìhè ahu chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nꞌaka bata na Damaskọs. “Nꞌebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nꞌọnye ezi omume nꞌihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị ukwuu site nꞌọnụ ndị Juu bi na Damaskọs. Ọ bụkwa ya bịakwutere m. O guzoro nꞌakụkụ m kwuo okwu sị, ‘Nwanna anyị Sọl, hụụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ enwetara m ike ịhụkwa ụzọ ọzọ. “Mgbe ahụ ka ọ gwara m sị, ‘Chineke nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye nzọpụta ahụ na ịnụ okwu ya. A kpọpụtara gị ka i were okwu ya na-enye ndụ gaa ebe nile, gbaakwa ama banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ. Site ugbu a, atụfukwala mgbe. Gaa ka e mee gị baptizim ka a sachaakwa gị site na mmehie ka ị kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.’ “Alọghachikwara m na Jerusalem. Ma mgbe m nọ na-ekpe ekpere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ otu ụbọchị ahụrụ Onyenwe anyị nꞌime ọhụ. Ọ gwara m sị, ‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nꞌihi na ndị bi nꞌala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere okwu m.’ “Ma asịrị m ya, ‘Onyenwe anyị, ha matakwara nke ọma na m tụru ndị na-eso ụzọ Jisọs mkpọrọ, tiekwa ndị kweere nꞌaha gị ihe otiti nꞌụlọ nzukọ ha nile. Nꞌoge e gburu onye ama gị bụ Stivin, eguzogidere m na-ekwe nꞌisi na ihe e mere dị mma, nꞌihi na ọ bụ m chịkọtara uwe ndị tụrụ ya nkume.’ “Ma Onyenwe anyị gwara m sị, ‘Hapụ Jerusalem! Nꞌihi na aga m ezipụ gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ!’ ” Igwe mmadụ ahụ ṅara ntị ruo mgbe Pọl kwuru okwu a. Mgbe ahụ ha nile tiri mkpu nꞌotu olu sị, “Wepụ ya! Tigbuo ya! O kwesịghị ka onye dị otu a dịrị ndụ!” Ha tiri mkpu akwa, na-atụli uwe mgbokwasị ha elu, na-achịlikwa aja nꞌala na-efesasị ya ebe nile igosi na iwe dị ukwuu na-ewe ha. Ọchịagha ahụ kpọbatara Pọl nꞌụlọ nye iwu ka a pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nꞌọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere igwe mmadụ a ji nwee obi ụfụ nꞌebe ọ nọ. Ma mgbe ha na-eke Pọl agbụ ịpịa ya ụtarị, Pọl jụrụ onye agha guzo ya nso ajụjụ sị, “Ọ bụ ihe ziri ezi na unu ga-eti nwa diala Rom ihe na-ekpeghị ya ikpe?” Mgbe onye agha a nụrụ okwu a o jekwuuru ọchịagha jụọ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ ime? Onye a bụ onye Rom!” Ọchịagha a mere ngwangwa bịakwute Pọl jụọ ya sị, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Pọl zara ya sị, “Ee, agụgọ adịghị ya.” “Abụkwa m,” ka ọchịagha kwuru, “ma o furu m ego dị ukwuu ịbụ onye Rom!” Pọl zara ya sị, “Abụ m nwa diala!” Ndị agha ahụ chọrọ ịpịa ya ihe mere ngwangwa gbapụ mgbe ha nụrụ na Pọl bụ nwa diala Rom. Egwu tụkwara ọchịagha nꞌonwe ya nꞌihi na ọ bụ ya nyere iwu ka e kee ya eriri. Nꞌechi ya, ebe ọchịagha ahụ chọrọ ịmata ihe bụ ebubo ndị Juu na-ebo Pọl, o nyere iwu ka ndị isi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ ọ tọpụrụ agbụ e kere Pọl, duru ya gaa nꞌihu ha. Mgbe Pọl lekwasịrị ndị nzukọ a anya, o kwuru okwu sị, “Ụmụnna m, akọnụche m amaghị m ikpe banyere ndu m nꞌihu Chineke.” Nꞌihi okwu a o kwuru, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ Pọl nso pịa ya aka nꞌọnụ. Ma Pọl, na-atụghị ụjọ, gwara Ananayas okwu sị, “Otu a ka Chineke ga-esi pịa gị aka nꞌọnụ, gị onye dị ka mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nꞌonwe gị site nꞌinye iwu ka e si otu a tie m ihe?” Ndị guzo Pọl nso jụrụ ya sị, “Ọ̀ bụ otu a ka i si ekwuru onyeisi nchụaja Chineke okwu?” Ma Pọl zara ha sị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m, na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ọ dịghị mma ikwu okwu ọjọọ megide ndị na-achị achị.” Mgbe Pọl ghọtara na ndị bịara nzukọ ahụ dị ụzọ mmadụ abụọ, ndị Sadusii nꞌotu ụzọ, ndị Farisii nꞌụzọ nke ọzọ, o tiri mkpu sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii. Nna m bụkwa onye Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nꞌihi okwukwe m nwere na mbilite nꞌọnwụ dị.” Mgbe o kwusịrị nke a nzukọ ahụ kewara abụọ. Ndị Farisii na ndị Sadusii bidoro ise okwu. Nkewa dị ukwuu dịkwara nꞌetiti ha. Nꞌihi na ndị Sadusii ekweghị na mbilite nꞌọnwụ ọ bụla dị. Ha ekwekwaghị na mmụọ ozi dị, ma ọ bụ na mmụọ ọ bụla dị nꞌime anyị. Ma ndị Farisii kweere nꞌihe ndị a. Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nꞌotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nꞌoke olu sị, “O nweghị ihe ọjọọ anyị chọpụtara nwoke a mere. Ma eleghị anya ọ ga-abụ na mmụọ ma ọ bụ mmụọ ozi gwara ya okwu nꞌụzọ Damaskọs ahụ.” Esemokwu ha bara ụba nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro ịdọkpụgharị Pọl nꞌakụkụ nile. Nꞌikpeazụ, ọchịagha tụru egwu na ha ga-emerụ Pọl ahụ ma ọ bụ gbuo ya. Ya mere o nyere iwu ka ndị agha ya jiri ike wepụta Pọl, ka ha kpọlaa ya nꞌụlọ ebe a na-edebe ngwa agha. Nꞌabalị ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Pọl gwa ya sị, “Atụla egwu Pọl, nꞌihi na dị ka i si gwa ha okwu nꞌebe a otu a ka ị ga-emekwa na Rom.” Nꞌechi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu na ha agaghị eri nri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla tutuu ruo mgbe ha gburu Pọl. Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a ruru iri mmadụ anọ. Emesịa, ha jekwuuru ndị isi nchụaja kọọrọ ha ihe ha na-ezube ime. Ha gwara ha sị, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri ma ọ bụ ịnụ ihe ọ bụla tutuu ruo mgbe anyị gburu Pọl. Ugbu a, lee ihe anyị chọrọ ka unu meere anyị. Gwanụ ọchịagha ka ọ kpọpụta Pọl ọzọ nꞌihi na unu chọrọ ka nzukọ kpee ya ikpe. Meenụ dị ka unu nwere ajụjụ dị mkpa unu chọrọ ịjụ ya. Anyị ga-ejikere igbu ya nꞌụzọ.” Ma nwa nwanne Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ bịakwara nꞌebe e dotere Pọl kọọrọ Pọl. Pọl kpọrọ otu nꞌimen dị isi agha ahụ gwa ya sị, “Biko kpọrọ nwantakịrị a gaa nꞌebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.” Nwoke a kpọọrọ nwanta ahụ jekwuru ọchịagha gwa ya sị, “Pọl kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwanta a nꞌihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.” Ọchịagha ahụ duuru nwanta ahụ nꞌaka ya gaa nꞌakụkụ ọzọ jụọ ya sị, “Gịnị bụ mkpa gị, nwa m?” Nwanta ahụ sịrị, “Echi na-abịa abịa, ndị Juu ga-agwa gị ka ị kpọpụtara Pọl nꞌụlọ ikpe. Ha ga-eme dị ka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya. Ma aṅala ha ntị. Nꞌihi na ihe dị ka iri mmadụ anọ ga-ezo onwe ha na-eche mpụta unu. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla tutuu Pọl abụrụ onye nwụrụ anwụ.” Ọchịagha ahụ gwara nwanta ahụ okwu sị, “Emekwala ka onye ọ bụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.” Mgbe e mesịrị, ọchịagha ahụ kpọrọ mmadụ abụọ nꞌime ndị isi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ. Ndị a ga-aga Sizaria nꞌelekere toolu nke abalị a. Họpụtakwa narị ndị na-ama ube abụọ na iri ndị na-agba inyinya asaa. Nyekwa Pọl inyinya nke ọ ga-agba, ma mee ka o rute nꞌebe Feliks onye na-achị akụkụ a nọ nꞌudo.” Ọchịagha ahụ deere Feliks akwụkwọ sị ya, “Site nꞌaka Kladiọs Lisias, ruo nꞌaka Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị. Ana m ekele. “Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya. Ma egbochiri m nke a mgbe m zipụrụ ndị agha ka ha napụta ya. Ahụkwara m na ọ bụ onye Rom. Achọrọ m ịmata ebubo ha ga-ebo ya, nꞌihi ya eduuru m ya gaa nꞌọgbakọ ha ka ha tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ma na-atụfughị mgbe achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere okwukwe ndị Juu. Nꞌeziokwu o nweghị ihe ọ bụla kwesịrị mkpọrọ ma ọ bụ onwụ nꞌime ya. Ma mgbe m nụrụ ihe banyere izuzu ọjọọ ha na-agba ịla ndụ ya nꞌiyi, ekpebiri m izitere gị ya ka ọ dịrị ndị na-ebo ya ebubo mfe ikwu ihe o mere nꞌihu gị.” Ya mere, nꞌabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris. Nꞌụtụtụ echi ya ndị agha ji ụkwụ lọghachiri Jerusalem, ma ndị na-agba inyinya duuru Pọl bata Sizaria. Ha duuru Pọl jekwuru Feliks onyeisi obodo ahụ. Mgbe ha rutere ha nyekwara Feliks akwụkwọ ahụ Lisias dere. Feliks gụrụ akwụkwọ ahụ jụọ Pọl akụkụ obodo o si. Pọl zara gwa ya na ọ bụ Silisia. Emesịa Feliks gwara Pọl okwu sị, “Aga m enye okwu gị ezi ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” Feliks nyekwara iwu ka e tinye Pọl nꞌụlọ mkpọrọ dị nꞌobi eze Herọd. Mgbe abalị ise gasịrị, Ananayas na ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara nꞌihu Feliks ịgbagide Pọl ama. Mgbe a kpọbatara Pọl, Tatulọs pụtara guzo kwuo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka gị Feliks bụ. I nyela anyị ndị Juu ahụ udo. I meela ka anyị hapụ ịbụkwa ndị a na-eleda anya. Nꞌihi nke a ọnụ anyị jupụtara nꞌekele. Kama iji oke okwu mee ka ike gwụ gị, ana m arịọ ka i gee ntị mgbe m ga-eji nwa oge kwuo okwu anyị nwere megide nwoke a. Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-ewetakarị aghara, onye ọrụ ya bụ ikwagide ndị Juu nọ nꞌebe nile nꞌụwa a ka ha nupụ isi. Ọ na-akpali ọgba aghara megide ọchịchị ndị Rom. Ọ bụkwa onyeisi ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu onye Nazaret. Ewezugakwa nke a, ọ chọkwara imerụ ụlọ nsọ anyị nꞌoge anyị jidere ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dị ka omenala anyị si dị, ma Lisias ọchịagha ahụ, bịara jiri ike napụ ya nꞌaka anyị. Lisias nyere iwu ka e ekpee ya ikpe nꞌusoro iwu ndị Rom. Ị ga-achọpụta ma ama anyị ọ bụ eziokwu mgbe gị onwe gị jụrụ nwoke a ajụjụ.” Mgbe ahụ ndị Juu nọ nꞌebe ahụ kwere nꞌisi na-akwagide okwu nile Tatulọs kwuru. Emesịa, Feliks feere Pọl aka ka o bilie kwuo okwu. Pọl siri otu a bido. “Amaara m nna anyị, na ị bụrụla onye ọkaikpe nꞌihe gbasara ndị Juu site nꞌogologo afọ ndị a gara aga. Nke a na-enye m ntụkwasị obi mgbe m na-asa ọnụ m. Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ ụkwụ m zọbatara na Jerusalem. Abịakwara m ife Chineke nꞌụlọ nsọ ukwu ya. Ị ga-achọpụtakwa na ndị Juu ahụghị m ka mụ na onye ọ bụla na-ese okwu, ma ọ bụ na o nwere ebe m kpatara aghara nꞌime ụlọ nzukọ, ma ọ bụ ebe ọ bụla nꞌime obodo. Ndị a enwekwaghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m. “Ma otu ihe ka m na-ekwupụta, ya bụ, na m kweere nꞌụzọ nzọpụta ahụ ha na-akpọ Otu onye Nazaret. Ana m eso uzọ a na-efe Chineke nna anyị ha ofufe. Ma ekwenyesịrị m ike nꞌiwu Mosisi, tinyere ihe nile e dere nꞌiwu Mosisi na nꞌakwụkwọ ndị amụma. Ma enwere m olileanya dị ka ha onwe ha nwekwara na mbilite nꞌọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị. Nꞌihi nke a ka m ji na-agbalị mgbe nile ibi obi dị ọcha nꞌihu Chineke na mmadụ. “Mgbe m si Jerusalem pụọ nọọ ọtụtụ afọ, alọghachiri m Jerusalem iwetara ụmụnna m ego ha ga-eji gboo mkpa ha. Abịakwara m ịchụ aja nke ịnata ihuọma nꞌaka Chineke. Ndị a na-agbagide m ama hụrụ m nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ mgbe m na-enye onyinye ekele ahụ. Akpachara m isi m dị ka e siri nye nꞌiwu. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m ma ọ bụ aghara ọ bụla e mere. Ma ụfọdụ ndị Juu si Tọki nọ nꞌebe ahụ. Ha kwesịrị ịnọ nꞌebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọ bụla megide m. Ma jụọ ndị a nọ nꞌebe a ugbu a ihe ọjọọ ha chọtara nꞌime m mgbe m guzoro nꞌụlọ nzukọ ha. Karịa na m kwuru nanị otu ihe mgbe m tiri mkpu sị, ‘Unu na-ekpe m ikpe taa nꞌihi okwukwe m na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ.’ ” Mgbe ahụ Feliks onye maara nke ọma ihe nile banyere ndị na-eso ụzọ Kraịst yigharịrị ikpe a. Ọ gwara Pọl na ndị na-ebo ya ebubo sị, “Aga m eleba anya nꞌikpe a mgbe Lisias onyeisi agha bịara.” Emesịa, o nyere iwu ka ha tinyekwa Pọl nꞌụlọ mkpọrọ. Ma o nyere ndị nche iwu ka ha lezie ya anya nke ọma. Ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa ileta ya. Mgbe abalị ole na ole gasịrị, Feliks na nwụnye ya Drusila bụ onye Juu, batara nꞌụlọ ikpe. O ziri ka a kpọọ Pọl. Ya na nwụnye ya gere ntị mgbe Pọl gwara ha okwu banyere inwe okwukwe nꞌime Jisọs Kraịst. Ma mgbe Pọl gara nꞌihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dịrị mmadụ ijide onwe ya aka nꞌihe ọ bụla ọ na-eme, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nꞌoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ gwara Pọl okwu sị ya, “Ị nwere ike ịpụ ugbu a, Aga m akpọkwa gị nꞌoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.” Feliks chekwara na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ Pọl site nꞌoge ruo nꞌoge ka ya na ya na-akparịta ụka. Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe Feliks chọrọ inweta ihuọma nꞌaka ndị Juu, ọ hapụrụ Pọl nꞌụlọ mkpọrọ. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nꞌoge Festọs bịaruru Sizaria, o mere njegharị ruo Jerusalem. Nꞌebe ahụ ka ndị isi nchụaja na ndị isi ndị Juu nọ kọọrọ ya ihe nile ha maara banyere Pọl. Ha rịọrọ Festọs ka ọ kpọta Pọl na Jerusalem. Nꞌihi na ha agbaala izu igbu ya nꞌụzọ. Ma Festọs gwara ha sị, “Pọl nọ dị ka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya. Dunyerenụ m ụfọdụ ndị isi unu ka ha bịa gbaa ya akaebe nꞌisi, ma ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ o mere.” Mgbe ihe dị ka abalị asatọ ma ọ bụ abalị iri gasịrị, Festọs lọghachiri na Sizaria. Nꞌechi ya, o bidoro ikpe Pọl ikpe. Mgbe e dupụtara Pọl, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-apụghị ịkọwa. Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere megide iwu ndị Juu ma ọ bụ eze ndị Rom.” Ma ebe Festọs chọrọ ka ya na ndị Juu dị na mma, ọ jụrụ Pọl sị, “Ị̀ ga-ejekwa Jerusalem ka m kpee gị ikpe nꞌebe ahụ?” Ma Pọl zaghachiri ya, “Ọ dịghị! Eguzo m nꞌụlọ ikpe Siza nꞌonwe ya, ebe a ka e kwesịrị ikpe m ikpe. Ị maara nke ọma na aka m dị ọcha. Adaghị m iwu ndị Juu ma ọ bụ nke Siza. Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesịrị ọnwụ, akwadoro m ịnwụ. Ma ọ bụrụ na aka m dị ọcha, gị, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ enweghị ike ịrara m nye nꞌaka ndị Juu ka ha gbuo m. Ana m akpọku Siza ka o lenye anya nꞌikpe m.” Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ gwara Pọl sị, “Ị chọrọ ka Siza lenye anya nꞌikpe gị, ọ dị mma, ị ga-ahụkwa Siza.” Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na nwụnye ya Benaisị bịara ileta Festọs. Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị, Festọs kọwaara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌebe a. Mgbe m gara Jerusalem, ndị isi nchụaja na ndị isi ndị Juu gwara m ihe ha maara banyere nwoke a. Ha rịọkwara m ka e gbuo ya. Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịma onye ọ bụla ikpe tupuu e kpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nꞌihu ndị na-ekpe ya ikpe. “Mgbe ha bịara ebe a nꞌihi ikpe a, akpọrọ m ikpe a mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ, nyekwa iwu ka a kpọbata Pọl. Ma ihe nile ha kwuru megide Pọl abụghị ihe mụ onwe m lere anya ịnụ nꞌọnụ ha. O nweghị ihe ọjọọ ọ bụla ha kwuru megide ya. Okwu ha nile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ndị Juu, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusikwa ike na ọ dị ndụ. Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nꞌihi ya ajụrụ m Pọl ma ọ ga-esoro m gaa nꞌụlọ ikpe dị na Jerusalem ka ọ nọdụ nꞌebe ahụ gọrọ onwe ya. Ma Pọl bugaara Siza ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nꞌụlọ mkpọrọ tutuu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.” Agripa gwara Festọs sị, “Achọrọ m ịnụ okwu site nꞌọnụ nwoke a nꞌonwe ya.” Festọs zaghachiri ya, “Ị ga-anụ ya echi.” Ya mere, nꞌechi ya, Agripa na Benaisị rutere nꞌụlọ ikpe nꞌoke nganga. Ọtụtụ ndị isi agha na ndị a maara aha ha nꞌobodo a sooro ha. A kpọbatakwara Pọl. Mgbe ahụ ka Festọs kwuru okwu sị, “Eze Agripa na ndị nile soro ya nọkọọ. Nke a bụ nwoke ahụ ndị Juu bi nꞌobodo a na ndị Juu bi na Jerusalem na-achọsi ọnwụ ya ike. Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesịrị ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya. Ma enweghị m ihe ọ bụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nꞌihu unu nile. Karịsịa nꞌihu gị onwe gị eze Agripa ka i lee anya nꞌime okwu a gwa m ihe m ga-edere Siza. Nꞌihi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi na m ga-ezipụrụ Siza onye mkpọrọ na-egosighị iwu ji ya.” Mgbe ahụ Agripa gwara Pọl sị, “Gaa nꞌihu kọọrọ anyị ihe nile i maara.” Pọl gbasara aka ya abụọ kwuo okwu ịgọrọ onwe ya sị, “Ana m agụ onwe m dị ka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịsara ọnụ m nꞌihu gị nꞌihe nile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m. Nꞌihi na amatara m na ị bụ ọkachamara nꞌihe gbasara iwu na omenala ndị Juu. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị. “Dị ka ndị Juu maara nke ọma, esitere m na nwanta nwee ọzụzụ nke ibi obi ndị Juu nꞌobodo anyị bụ Tasọs, emesịakwa, na Jerusalem. Ebikwara m obi dị ka onye Juu. Ọ bụrụ na eziokwu dị ha nꞌọnụ ha maara na dị ka iwu na omenala ndị Juu siri dị, abụ m onye idebe iwu nile na omenala nile nꞌusoro ndị Farisii na-anụkarị ọkụ nꞌobi karịa ndị ibe m nile. Ma ugbu a, a na-ekpe m ikpe nꞌihi na enwere m olileanya na nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị ochie ha. Nkwa nke ebo iri na abụọ nile nke Izirel na-ele anya ịnata mgbe ha na-efe Chineke ehihie na abalị. Ọ bụ nꞌihi olileanya a ka ndị Juu ji na-ebo m ebubo. “Gịnị mere unu, ndị Juu, jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka mmadụ site nꞌọnwụ bilie ọzọ? “Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso ndị nile kweere na Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ nile. Etinyere m ọtụtụ ndị na-eso ụzọ a bi na Jerusalem nꞌụlọ mkpọrọ, site nꞌike m natara nꞌaka ndị isi nchụaja. Mgbe a mara ndị ha ikpe ọnwụ, ana m akwagide ka e gbuo ha. Ọtụtụ mgbe atara m ndị na-eso ụzọ a ahụhụ, mekpaa ha ahụ nꞌebe nzukọ ha nile, ime ka ha gọnarị Kraịst. Nꞌihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nꞌobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu. “Ọ bụkwa nꞌihi ịkpagbu ndị na-eso ụzọ a ka m ji gaa Damaskọs. Anatakwara m ike nꞌaka ndị isi nchụaja. Otu ụbọchị nꞌoge ehihie, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nꞌụzọ Damaskọs, ìhè dị ka amụma egbe eluigwe sitere nꞌeluigwe chaa anyị gburugburu. Anyị nile dara nꞌala. Ma anụrụ m olu na-agwa m okwu nꞌasụsụ Hiburu sị, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-esogbu m? Ị na-enye mkpụrụ obi gị nsogbu!’ “Ajụrụ m onye na-ekwu okwu ahụ ajụjụ sị, ‘Ị bụ onye, Onyenwe anyị?’ Onyenwe anyị zaghachiri, ‘Abụ m Jisọs onye gị onwe gị na-esogbu. Ugbu a, bilie ọtọ! Nꞌihi na ahọpụtala m gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa nile mara ihe banyere nzute i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị. Aga m echebe gị site nꞌaka ndị Juu na nꞌaka ndị mba ọzọ kwa, ndị m na-eziga gị ka i jekwuru. Imeghe anya ha ka ha hụ ọnọdụ ha. Ka ha chegharịa biekwa ndụ nꞌime ìhè nke Chineke, kama ịwagharị nꞌọchịchịrị bụ ụzọ nke ekwensu. Ka ha soro ndị ọzọ nꞌebe nile nata mgbaghara mmehie na nketa nke Chineke na-enye ndị nile a sachapụrụ mmehie na ndị e sitere nꞌokwukwe ha mee ka ha bụrụ ndị Chineke doro iche.’ “Ya mere, eze Agripa, enupụghị m isi nꞌọhụ nke eluigwe ahụ. Ebidoro m izisa ozi ọma a nye ndị anyị bi na Damaskọs. Emekwara m otu a na Jerusalem na nꞌime Judia nile na nꞌetiti ndị mba ọzọ. Ana m ekwusa mkpa ọ dị ka mmadụ nile nwee nchegharị lọghachikwute Chineke. Ka ha gosikwa nchegharị ha site nꞌezi ọrụ nke ha na-arụ. Ọ bụ nꞌihi nke a ka ndị Juu jiri nwụchie m nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ ma chọsiekwa ụzọ ike ịnapụ m ndụ m. Ma Chineke chebere m mee ka bụrụ onye dị ndụ taa ịkọrọ mmadụ nile akụkọ a, ndị ukwu na ndị nta. Ihe m na-ekwu bụkwa ihe ndị amụma na Mosisi kwuru na ọ ga-emezu. Na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ bụrụkwa onye ga-esi nꞌọnwụ bilie iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ nzọpụta!” Mgbe Pọl na-ekwu okwu ndị a, na mberede Festọs tiri mkpu sị, “Pọl, ị bụ onye isi mebiri! Oke mmụta gị na-achọ iwetara gị isi mmebi!” Ma Pọl zaghachiri sị, “Isi emebighị m ezigbo nna anyị Festọs. Ihe m na-ekwu bụ nanị eziokwu. Eze Agripa nꞌonwe ya makwaara ihe ndị a nile. Ana m ekwu eziokwu nꞌihi na o doro m anya na emeghị ihe ndị a nile na nzuzo. Gị eze Agripa, i kwenyeghị na ndị amụma? Amaara m na i kweere.” Agripa gbochiri ya ikwu okwu ọzọ sị ya, “Pọl, ọ bụ site nꞌokwu ndị a na-erijughị afọ ka ị chọrọ isite na ya mee ka m bụrụ onye kweere na Kraịst?” Ma Pọl zara ya sị, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na Chineke ga-ekwe ka e site nꞌokwu m ndị a, ma ha rijuru afọ, ma ha erijughị afọ, mee ka gị na ndị nile nọ nꞌebe a bụrụ ihe mụ onwe m bụ nꞌime Kraịst ma ewezuga agbụ ndị a!” Mgbe ahụ eze Agripa na Festọs na Benaisị nwụnye ya na ndị ọzọ biliri pụọ. Mgbe ha gbarịtara izu banyere Pọl nꞌetiti onwe ha, ha kwekọrịtara sị, “Nwoke a ekwesịghị ọnwụ ma ọ bụ mkpọro.” Agripa gwara Festọs sị, “A gaara ahapụ ya ma ọ bụrụ na o nyefeghị Siza ikpe ya.” E mere njikere ikpeazụ banyere iji ụgbọ mmiri gaa Rom. Ya mere, e mere ka Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nwee onye ga-elekọta ha. Aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha so nꞌotu ndị agha pụrụ iche eze nwere. Anyị banyere ụgbọ mpempe nke na-akwụsị nꞌọnụ mmiri Tọki ọ bụla. Aristakọs onye Griik nke Tesalonaịka sokwa anyị nꞌije a. Nꞌechi ya, anyị rutere Saidọn. Juliọs nwere obi ọma nꞌebe Pọl nọ. Ọ ha-pụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ezi ọbịa. Ịgakwa nꞌihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere ka ije anyị jupụta na nsogbu. Nꞌihi ya, anyị gara ala Saiprọs nso. Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nꞌime obodo Lisia. Nꞌebe ahụ ka onye na-edu anyị kpọgharịrị anyị nꞌụgbọ ndị Ijipti na-aga Itali. Anyị nwere ọtụtụ ụbọchị nke na-enyeghị anyị ahụ udo. Nꞌoge anyị na-erute nso Snidus, oke ifufe bidoro ifesi ike. Anyị enwekwaghị ike ịga nꞌihu nꞌụzọ ahụ. Nꞌihi ya anyị chigharịrị ihu site ụzọ ọnụ mmiri Salmone. Anyị jikwa nwayọọ na-agba nꞌakụkụ ọnụ mmiri tutuu ruo mgbe anyị sitere nꞌoke nsogbu rute ebe a na-akpọ Ọnụ Mmiri Ọma nke dị nso na Lasia. Ebe a ka anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị. Ma ihu eluigwe adịghị mma inye mmadụ nkasịobi ịnyalị ụgbọ ije ebe dị anya nꞌihi na ugbu a oge ịchụ aja ngabiga agafeela. Pọl gwara ndị isi ụgbọ ahụ okwu sị, “Ndị nwe m, ahụrụ m na anyị ga-enwe nsogbu ma ọ bụrụ na anyị agaa nꞌihu. Eleghị anya ụgbọ mmiri anyị ga-ekpu, ma ọ bụ ibu nile ga-efu, ma ọ bụ na anyị ga-enwe mmerụ ahụ, ma ọ bụ na ọnwụ ga-adị.” Ma ndị isi na-achị ndị mkpọrọ ahụ aṅaghị Pọl ntị, kama ha ṅara ntị nꞌihe onyeisi ụgbọ ahụ na onye nwe ụgbọ ahụ kwuru karịa ihe Pọl kwuru. Ma Ọnụ Mmiri Ọma abụghị ọnụ mmiri dị ezi mma, ebe kwesịrị ekwesị ịnọdụ nꞌoge oyi. Nꞌihi ya ndị na-eso ụgbọ ahụ họọrọ ịga nꞌihu ịgbalị iru Fonikisi ka ha nọdụ nꞌebe ahụ nꞌoge oyi. Ọnụ mmiri Fonikisi dị ezi mma. Ọ na-enwe ezi ikuku nke na-esi nꞌugwu na ndịda. Mgbe ha nọ na-atụle ihe ndị a, ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda. Nke a mere ka ha chee na ụbọchị ahụ ga-adị mma. Nꞌihi ya ha kwọpụrụ ụgbọ, nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri. Ma ọ dịghị anya ihu eluigwe gbanwere, oke ifufe bidoro na-efe. O buuru ụgbọ mmiri anyị buba ya nꞌosimiri. Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nꞌọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Ha hapụrụ ụgbọ ahụ ka o soro ikuku. Nꞌikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nꞌazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klauda. Nꞌebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nꞌazụ nꞌelu ụgbọ mmiri ahụ. Emesịa anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nꞌọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị nꞌAfrika. Ha wedatara akwa e kobere nꞌelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga. Mgbe chi echi bọrọ, dị ka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụdasị ngwongwo dị nꞌụgbọ ahụ nꞌime osimiri. Nꞌechi ya kwa ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọ bụla nke nke aka ha ghọtara nꞌime osimiri. Oke ifufe ọjọọ ahụ magharịrị ọtụtụ ụbọchị na-enweghị nkwụsị. Eluigwe hujiri ehuji, anyị ahụkwaghị anwụ ma ọ bụ kpakpando ọ bụla anya tutuu ruo nꞌikpeazụ olileanya anyị nile gwụsịrị. Nꞌoge a nile o nweghị onye ọ bụla nri ọ bụla bara ọnụ. Ma nꞌikpeazụ, Pọl kpọrọ ndị na-eso ụgbọ ahụ sị ha, “Ndị iko m ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nꞌokwu m na mbụ anyị agaraghị ahapụ Ọnụ mmiri ọma. Anyị gaara agbanarị oke nsogbu an ntụfu ndị a nile. Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla nꞌime anyị a ga-achọ achọ. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu. “Nꞌihi na nꞌabalị gara aga mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m, gwa m sị, ‘Atụla egwu Pọl, nꞌihi na ị ghaghị iguzo nꞌihu Siza. Nke ọzọ kwa Chineke anụla arịrịọ gị, ọ ga-anapụta ndụ ndị a nile gị na ha so site nꞌaka ọnwụ mberede.’ Ya mere, nweenụ obi ike! Nꞌihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe o kwuru. Ma a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nꞌotu agwa etiti.” Ihe dị ka nꞌetiti abalị nꞌụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nꞌosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso. Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nꞌọnụ ya nꞌime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nꞌebe ahụ ha nọ. Ha jekwara nꞌihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ toolu. Ha matara nꞌoge a na ebili mmiri ahụ ga-eburu anyị gaa nꞌọnụ mmiri. Ma egwu juru ha obi nꞌihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nꞌakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara ụdọ igwe anọ e ji ejide ụgbọ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ. Ụfọdụ nꞌime ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha weturu ụgbọ mpempe e dobere maka ihe mberede, mee dị ka ha na-aga itinye ụdọ igwe nꞌọnụ mmiri ahụ. Ma Pọl ghọtara nzube ha, gwa ndị agha na ọchịagha ha okwu sị, “Unu nile ga-anwụ ma ọ bụrụ na ndị a na-anya ụgbọ a ahapụ ugbu a.” Nꞌihi okwu a, ndị agha ahụ chabiri ụdọ e ji kee ụgbọ mpempe ahụ hapụ ụgbọ mpempe ahụ ka ọ daba nꞌime osimiri. Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ nile ka ha rie nri. Ọ sịrị ha, “O nweghị onye ọ bụla nꞌime unu nri bara ọnụ kemgbe izu ụka abụọ. Nꞌihi ọdịmma unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla nꞌime unu otu agịrị isi ya ga-ala nꞌiyi.” Mgbe ahụ Pọl weere achịcha nye Chineke ekele nꞌihu ha nile, nyawaa ya, taa. Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ nile nꞌobi, ha bidokwara iri nri. Anyị nile nọ nꞌụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii. Mgbe anyị richara nri, ndị na-eso ụgbọ ahụ buuru akpa ọka nile dị nꞌụgbọ ahụ tụba ha nꞌime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa efere. Mgbe chi bọrọ ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nꞌime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nꞌagbata nkume dị nꞌọnụ mmiri ahụ gafee. Ka ikuku nwee ike ibuba ụgbọ mmiri ahụ nꞌelu ala. Nꞌikpeazụ ha kpebiri ịgbalị ike ha. Ha chabiri ụdọ igwe nwere ike ijide ụgbọ ahụ, hapụ ha nꞌime osimiri. Ha wedatara ụmara e ji anyagharị ụgbọ, weliekwa akwa ifufe, meekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nꞌelu ala. Ma ụgbọ ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mịkpuo nꞌịta. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu. Nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa ụgbọ ahụ. Ndị agha gwara ọchịagha ha ka o nye ha ike igbu ndị mkpọrọ nọ nꞌụgbọ ahụ. Ka ha hapụ igwuru mmiri ruo nꞌọnụ mmiri site nꞌebe ahụ gbafuo. Ma Juliọs achọghị ka ihe ọ bụla mee Pọl. Nꞌihi ya ọ jụrụ inye ha ike. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị nile maara igwu mmiri si nꞌụgbọ ahụ wụba nꞌime mmiri, gwuru mmiri gaa nꞌelu ala. Ma ọ sịrị ndị na-enweghị ike igwu mmiri gbalịa ịchọ ụzọ ọzọ, site nꞌịghọnye aka na mkpirikpi osisi na nꞌihe ndị ọzọ si nꞌahụ ụgbọ ahụ. Ya mere mmadụ nile rutere elu ala nꞌudo. Ọ dịghị anya anyị chọpụtara na anyị nọ nꞌagwa etiti Malta. Ndị obodo a nwere ọmiko nꞌahụ anyị. Ha kwanyeere anyị ọkụ nke dị ka ọkụ e ji esi ite, nꞌakụkụ mmiri ahụ iji ịchụrụ anyị oyi na iji sị anyị “Unu abịala.” Nꞌoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nꞌọkụ a otu agwọ ọjọọ sitere nꞌime nkụ na-enwụ ọkụ mapụta nꞌihi okpomọkụ. Agwọ a tụhịkọtara onwe ya nꞌaka Pọl, tagidesiekwa ya eze ike nꞌaka. Mgbe ndị obodo a hụrụ agwụ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nꞌaka Pọl ha gwarịtara onwe ha sị, “Onye a bụ ogbu mmadụ, anaghị eji ọkụ enyo ya! Ọ bụ ezie na ọ gbanarịrị mmiri, ma ikpe ziri ezi aghaghị ikpe onwe ya.” Ma Pọl hụpụrụ agwọ ahụ nꞌaka ya, mee ka ọ daba nꞌọkụ. Ma ọ dịghị ihe mere ya. Mmadụ ndị a na-ele anya ma aka Pọl ga-aza, ma ọ bụ na Pọl ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na ihe abụọ ndị a emeghị, ha gbanwere obi ha banyere ihe ha na-eche. Ha bidoro iche na Pọl bụ chi. Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pọbiliọs onye na-achị agwa etiti ahụ. Nwoke a nabatara anyị nke ọma zụọkwa anyị nri ụbọchị atọ. Nꞌoge ahụ nna Pọbiliọs nwere ahụ ọkụ na afọ ọsisa. Pọl banyere nꞌime obodo gaa leta ya kpeere ya ekpere bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịrị ya mma ọsịịsọ. Mgbe ahụ, ndị nile nwere nrịrịa nꞌagwa etiti ahụ bịakwutere Pọl. Ọ gwọkwara ha. Nꞌihi ọrụ ebube Chineke ndị a, anyị natara ọtụtu onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nꞌije ahụ. Anyị nọrọ ihe dị ka ọnwa atọ nꞌagwa etiti ahụ tutuu anyị anyalie ụgbọ. Nꞌoge a ọ bụ ụgbọ a na-akpọ Ejima nke sitere Alegzandria bịa nọọ nꞌagwa etiti ahụ nꞌoge oyi ka anyị soro pụọ. Ebe isi mbụ anyị kwụsịrị mgbe anyị hapụrụ bụ na Sirakọs. Nꞌebe a anyị nọrọ ụbọchị atọ. Site na Sirakọs anyị gara gburugburu tutuu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere ikuku bidoro ife site na ndịda. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Pọteọli. Nꞌebe a anyị chọpụtara ụfọdụ ndị kwere ekwe ndị rịọrọ ka anyị nọnyere ha ụbọchị asaa. Site nꞌebe a anyị rutere Rom. Ụmụmma anyị nọ na Rom nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara chere anyị nꞌebe a na-akpọ Forum, nꞌahịa dị nꞌụzọ Apịa. Ndị ọzọ zutere anyị nꞌebe ọzọ a na-akpọ Ụlọ ndị ije. Mgbe Pọl hụrụ ha o kelere Chineke ma nweekwa obi ike. Na Rom e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dị ka o si chọọ nꞌebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Pọl ziri ozi ka a kpọọrọ ya ndị isi ndị Juu bi nꞌobodo a. Ọ gwara ha okwu sị, “Ụmụnna m, ọ bụ ndị Juu bi na Jerusalem jidere m nyefee m nꞌaka ndị ọchịchị obodo Rom ka e kpee m ikpe. Ọ bụ ezie na emekpaghị m onye ọ bụla ahụ, emerụkwaghị m omenala nna anyị ha. Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nꞌikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa. Nꞌihi na ha achọtaghị ihe kwesịrị ịma m ikpe ọnwụ dị ka ndị anyị chọrọ. Ma mgbe ndị Juu jụrụ na a ga-ahapụ m, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nꞌuche megide ha. Akpọrọ m unu taa ka mụ na unu hụkọọ ka unu matakwa na anọ m nꞌagbụ nꞌihi okwukwe m kweere na Onye nzọpụta abịala.” Ndị Juu ahụ zara ya sị, “Anyị anataghị ozi ọ bụla banyere gị. Anyị anụbeghị akụkọ ọ bụla site na Judia ma ọ bụ okwu ọjọọ ọ bụla site nꞌọnụ ndị isi na Jerusalem banyere gị. Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịmata ihe i kwenyere na ya. Nꞌihi na anyị maara na a na-ekwujọ ndị na-eso ụzọ a nꞌebe nile.” Ha yiri ọnụ mgbe ha ga-abịaghachi. Nꞌụbọchị ahụ, ọtụtụ mmadụ bịara nꞌụlọ ya. Ọ gwara ha banyere alaeze Chineke na Jisọs site nꞌakwụkwọ nsọ. O mere nke a site nꞌakwụkwọ Mosisi na nke ndị amụma. O bidoro izi ha ihe site nꞌụtụtụ ruo anyasị. Ụfọdụ kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha. Ma mgbe ha tụlechara okwu ndị a nꞌobi ha, ha hapụrụ Pọl laa, ma ha bukwa okwu a Pọl kwuru nꞌobi: “Eziokwu ka Mmụọ Nsọ Chineke kwuru mgbe o sitere nꞌọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu sị, ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu sị, Unu ga-anụ ma unu agaghị aghọta, unu ga-ele anya, ma o nweghị ihe unu ga-ahụ. Nꞌihi na obi unu mara abụba, ntị unu adịkwaghị anụ ihe. Unu mechikwara anya unu nꞌebe nghọta dị. Nꞌihi na unu achọghị ịhụ, unu achọghị ịnụ, unu achọkwaghị ịghọta ma lọghachikwute m ka m gwọ unu.’ ” Pọl kwukwara sị, “Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta na okwu nzọpụta a si nꞌaka Chineke bịa dịkwaara ndị mba ọzọ. Ha ga-anatakwa ya.” *** Pọl biri obi nke onwe ya afọ abụọ nꞌụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ nabatakwara ndị nile bịara ileta ya, na-akọrọ ha, na-atụghị egwu, ihe banyere alaeze Chineke na banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla gbalịrị igbochi ya. Ndị enyi m nọ na Rom, akwụkwọ ozi a si nꞌaka mụ onwe m Pọl, odibo Jisọs Kraịst onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onye na-ekwu ọnụ Kraịst, na onye e zipụkwara ịgbasa ozi ọma Kraịst. Ozi ọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nꞌoge gara aga site nꞌọnụ ndị amụma ya. Ọ bụkwa ozi ọma e dekwara ihe banyere ya nꞌakwụkwọ nsọ. Ozi ọma a metụtara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke, onye bụ nwa nwa Devidi site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ. Chineke gosiri na Jisọs bụ Ọkpara ya, onye ike nile dị nꞌaka ya, na onye nwekwara Mmụọ nke dị nsọ, mgbe o mere ka o si nꞌọnwụ bilie. Ugbu a, ọ bụ site na Kraịst ka Chineke ji họpụta anyị ịbụ ndị ga-ejegharị ebe nile ịgwa ndị nọ ebe nile ihe Chineke meere ha, na ime ka ha kwerekwa na Chineke, kpebiekwa irubere ya isi. Unu sokwa nꞌime ndị ahụ Chineke kpọrọ ka unu bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst. Nꞌihi ya, ana m edere unu nile bi na Rom akwụkwọ a, unu ndị Chineke hụrụ nꞌanya, ndị a kpọkwara ka ha dị nsọ. Ekpere m bụ ka Chineke nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nye unu amara ya na udo ya. Aghaghị m imalite site nꞌikele Chineke ekele nꞌihi unu, site nꞌaha Jisọs Kraịst. Nke a bụ nꞌihi na ụwa nile anụla ihe gbasara okwukwe unu, nꞌihi na ebe ọ bụla m gara ana m anụ ka a na-ekwu okwu banyere okwukwe unu nwere na Chineke. Chineke nꞌonwe ya, onye m na-ejere ozi, site nꞌikwusa ozi ọma nke Ọkpara ya, ga-agbara m akaebe na m na-echeta unu mgbe nile nꞌekpere m ehihie na abalị. Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nꞌike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu. Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nꞌihi na achọrọ m ka unu keta oke nꞌonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzsi ike nꞌokwukwe. Ọ bụkwaghị nanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume. Unu gbaa m ume, mụ onwe m agbaa unu ume. Site nꞌụzọ dị otu a anyị ga-abụ ngọzi nye onwe anyị. Ụmụnna m, achọrọ ime ka unu mata na atụọla m ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe ma tutuu ruo ugbu a enwebeghị ike ịbịa. Ezubere m ịbịa ime ka unu mata Kraịst dị ka m mere nꞌetiti ndị mba ọzọ ndị na-abụghị ndị Juu. Nꞌihi na ọrụ m na-aghaghị ịrụ bụ ikwusa ozi ọma nye mmadụ nile, ikwusa ozi ọma nye ndị Griik na ndị na-abụghị ndị Griik, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu. Nꞌihi ya, dị ka ike Chineke nyere m ha, ejikekwara m ịbịa ikwusa ozi ọma Jisọs Kraịst nye unu nile bi na Rom. Nꞌihi na ihere ikwusa ozi ọma Kraịst adịghị eme m. Nꞌihi na amaara m na ọ bụ ụzọ dị ike nke Chineke kwadooro isite ịzọpụta onye ọ bụla kweere na ya. E buru ụzọ kwusaara ndị Juu ozi ọma a, ugbu a a na-akwusara ya ndị mba ọzọ. Ọ bụ ozi ọma nke naakọrọ anyị na Chineke edoziela ụzọ anyị ga-esi dị ọcha nꞌihu ya site nꞌokwukwe na ntụkwasị obi anyị nwere na Kraịst. Ozi ọma a na-agwakwa anyị na anyị pụrụ inweta ihe ndị a nile nanị site nꞌokwukwe. Nꞌihi na e deela ya rị nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ọ bụ nanị site nꞌokwukwe ka onye ezi omume ga-esi dị ndụ.” Nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe mee ka iwe Chineke pụta ìhè megide mmehie na ajọ omumue nile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nꞌajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ. Nꞌihi na ndị a maara ihe ha kwesịrị ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nꞌihi na Chineke nꞌonwe ya emeela ka o doo ha anya, site nꞌitinye ụdị amamihe a nꞌime ha. Site nꞌoge Chineke kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya, ụmụ mmadụ ahụla ụwa na eluigwe, na ihe nile Chineke kere eke. Ha sitekwara nꞌihe ndị a mata ụdị ike ebighị Chineke nwere. Ya mere, ebe ọ bụ na ha maara ihe ndị a nile, ha enwekwaghị ngọpụ ọ bụla nꞌụbọchị ikpe ahụ ha gaeguzo nꞌihu Chineke. Ọ bụ eziokwu na ha maara na Chineke dị, ma na ndụ ha, ha adịghị ezipụta na ha maara na Chineke dị. Ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye Chineke ekele nꞌihi nchebe ọ na-echebe ha. Nanị ihe ha na-eche nꞌobi ha bụ ihe nzuzu, ịtụpụta nꞌuche ha ihe ha chere na Chineke yiri, na ihe ha chere na ọ chọrọ ka ha mee. Ọ bụkwa ụdị echiche dị otu a mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị. Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu. Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesịrị inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ, ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nꞌala. Nꞌihi na ha gosiri onwe ha dị ka ndị nzuzu, Chineke gbaketara ha azụ, hapụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ, bụ ịhe ọjọọ ndị ahụ ha ji merụọ anụ ahụ ha. Kama ha ga-ekwere ihe ahụ ha maara na ọ bụ eziokwu Chineke, ha kpebiri ikwere nꞌokwu ụgha. Nꞌihi ya ha gara nꞌihu ife na ịsọ pụrụkwa ihe Chineke kere eke kama ha ga-efe Chineke, Onye kere ha na onye kwesịrị ka e nye otuto mgbe nile ebighị ebi. Amin! Ọ bụ nke a mere Chineke ji hapụ ha ka ha na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ ime. Nꞌihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nꞌụzọ na-ezighị ezi nye ha. Ọzọ kwa, ndị ikom ha họrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta a. Nꞌụzọ dị otu a ha natakwara ntaramahụhụ kwesịri ha nꞌihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme. Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chine nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ nile nke ajọ echiche obi ha chepụtara. Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu. Ha bụ ndị kpọrọ Chineke asị, bụrụkwa ndị nkwutọ, ndị nganga, ndị na-anya isi, ndị na-eme ibe ha ihe ihere. Oge nile ihe na-eche uche ya bụ ụzọ ha ga-esi gaa nꞌihu asọpụrụghị ndị mụrụ ha. Nꞌezie ewu tara akọnuche ha. Ha adịghị emezu nkwa ọ bụla ha kwere. Ihe mmadụ ibe ha adịkwaghị atọ ha ụtọ. Ebe ha bụ ndị kwara obi nꞌazụ ha enweghị obi ebere nꞌebe mmadụ ibe ha nọ. Ọ bụ eziokwu na ha maara nke ọma na Chineke ga-ekpe ha ikpe nꞌihi ihe ọjọọ ha na-eme, matakwa na Chineke ga-ama ndị nile na-eme ihe dị otu a ikpe ọnwụ, ma ha gara nꞌihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalikwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha. Enyi m nwoke, ọ bụrụ na ị na-edo onwe gị ugbu a dị ka onye ikpe megide ndị ahụ mehiere, achọrọ m ime ka ị mata na o nweghị ụzọ o si kwesị ekwesị ka gị, onye ọ bụla ị bụ, kpee onye ọzọ ikpe. Nꞌihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, chetakwa na ọ bụkwa onwe gị ka ị na-ama ikpe, ebe ọ bụ na gị onwe gị na-emekwa otu ụdị mmehie ahụ. Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nꞌụzọ ziri ezi. Ya mere, mgbe gị onwe gị nọdụrụ ala na-atụ onye ọzọ aka nꞌihu nꞌihe ndị ahụ ị na-emekwa, i chere na Chineke ga-ekpe ya ikpe hapụ ikpe gị ike? Ka ị na-eche na o nwere ụzọ ị ga-esi gbanarị ikpe ọmụma Chineke? Ka ị na-eleda obi ebere Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachi obi ya anya? Ị maghị na obi ebere o nwere nꞌebe ị nọ kwesịrị ime ka i site na mmehie gị chegharịa? Ma ọ naghị emetụ gị nꞌobi ikwere na Chineke, nꞌihi mkpọchị nke obi gị kpọchịrị! Ma ihe ị na-eme bụ nanị ijikere onwe gị nye ụbọchị ahụ Chineke ga-esite nꞌiwe ya kpee gị ikpe dị egwu. Mgbe Chineke ga-ekpughe na ọ bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Nꞌụbọchị ahụ, Chineke ga-akwụghachi onye ọ bụla dị ka ọrụ ya si dị. Chineke gaenye ndị nile sitere na ntachi obi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide ndụ ebighị ebi. Ma ndị nile na-akpa iche, ndị jụkwara iso eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka Chineke ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma ya. Ee, nsogbu na iru uju gaabịakwasị ha nile, ndị Juu na ndị mba ọzọ, bụ ndị nọgidere na mmehie. Ma otuto na nsọpụrụ na udo nke si nꞌebe Chineke nọ, ga-abụ nke onye ọ bụla na-eme ihe Chineke na-achọ, ee, onye Juu ọ bụla na ndị mba ọzọ. Nꞌihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nꞌihu. Nꞌdị nile mehiere nꞌọnọdụ enweghị iwu ga-ala nꞌiyi na-agbanyeghị ihe iwu kwuru. Ma ndị nile mehiere megide iwu ahụ ha maara ihe banyere ya ka a ma-ama ikpe dị ka iwu si kwuo. Nꞌihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dị ka ndị ezi omume, kama ọ bụ ndị ahụ nile na-eme ihe ha nụrụ iwu kwuru. Nꞌezie, mgbe ndị mba ọzọ na-enweghị iwu sitere nꞌobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ inwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede. Nꞌihi na ndụ ha na-egosipụta na e deela ihe ndị ahụ iwu kwuru nꞌobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ufọdụ, ma na-etokwa ya mgbe ụfọdụ. Ya mere, anyị maara na a ga-agụkọ ihe ndị a nile nꞌụbọchị ahụ Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo nile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs. Ihe ndị a sokwa nꞌozi ọma nke m na-ekwusa. Leenụ! gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nꞌiwu ahụ Chineke nyere gị, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke. Ee, o juru gị afọ na ị maara ihe Chineke na-achọ, ọ jukwara gị afọ na i nwere ike ịkọwa ihe dị iche nꞌetiti ajọ ihe na ihe ziri ezi. Ụzọ e si eme uche Chineke doro gị nnọọ anya, ruo na i nwere ike iguso ndị na-amaghị ụzọ a otu ha ga-esi bịakwute Chineke. Ị na-agụ onwe gị dị ka ìhè na-edu ndị nọ nꞌọchịchịrị ụzọ. Ị na-agụkwa onwe gị dị ka onye nkuzi ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nꞌihi na ị maara iwu Chineke nke ọma, jupụtakwa nꞌamamihe na eziokwu. Ma ugbu a, enyi m nwoke, mgbe a nile ị na-ezi ndị mmadụ ihe ị na-ezikwa onwe gị? Ị na-ezi ndị ọzọ na izu ohi bụ ihe ọjọọ, i leziela anya hụ na ị naghị ezu ohi? Ị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịkwa iko, i leziela anya hụ na gị onwe gị adịghị akwa iko? Ị chọghị iji anya hụ ka mmadụ na-ekpere arụsị a kpụrụ akpụ, ma ọ naghị ezukpọ ego dị nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke? Ị na-akpa nganga na ị maara iwu nke ọma, ma lee na mgbe ị na-emebi otu nꞌime iwu ndị a ọ bụ ihe ihere ka ị na-ewetara Chineke. Ọ bụghị ihe iju anya na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nꞌihi unu ndị Juu.” Uru ọ bara na mmadụ bụ onye Juu bụ na onye ahụ na-edebe iwu Chineke. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu emebie iwu ya o nweghị ihe dị iche nꞌetiti unu na ndị na-amaghị Chineke. Nꞌihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ edebe iwu Chineke, Chineke ga-agụ ha dị ka ndị Juu. Ọ bụ ezie na unu ndị Juu nwere iwu e dere nꞌakwụkwọ, ma ndị ahụ na-abụghị ndị Juu, ndị na-eme ihe iwu na-achọ ga-ama unu ikpe. Ha ga-ama unu ikpe nꞌihi na unu anaghị eme ihe iwu na-achọ. Mmadụ abụghị onye Juu site nanị nꞌọmụmụ a mụrụ ya nꞌezinụlọ ndị Juu, ma ọ bụ nꞌihi na e biri onye ahụ ugwu nꞌusoro omenala ndị Juu. É, è, onye bụ onye Juu nꞌezie bụ onye ahụ bụ onye Juu nꞌime mmụọ ya, onye e biri obi ya ugwu. Obibi ugwu a bụkwa ọrụ Mmụọ Chineke ọ bụghị ọrụ nke iwu e dere ede na-arụ. Otuto onye dị otu a na-enweta na-esitekwa nꞌebe Chineke nọ bịa, ọ bụghị site nꞌaka mmadụ. Ọ̀ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nꞌihi na ọ bụ onye Juu? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke ndị e biri ugwu nꞌusoro omenala ndị Juu nwere? Ọ bara uru nꞌụzọ nile na mmadụ bụ onye Juu. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nꞌaka. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu ekwesịghị ntụkwasị obi, ma ekwesịghị ntụkwasị obi ha ọ̀ pụrụ ime ka Chineke ghara imezu nkwa o kwere ndị ahụ hụrụ ya nꞌanya? Tụfịakwa! Chineke ekwela! Ọ bụrụdị na mmadụ nile nọ nꞌụwa aghọọ ndị okwu ụgha, eziokwu nke Chineke ga-adịgide. Nꞌihi na e dere nꞌakwụwkọ nsọ sị na okwu ọ bụla Chineke kwuru ga-abụ eziokwu mgbe nile. Ka e si otu a mee ka Chineke bụrụ onye mmeri mgbe ọ bụla onye ọ bụla jụrụ ajụjụ banyere okwu ahụ. Ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume Chineke pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na Chineke adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nꞌihi ajọ omume anyị? Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ si ekwu ya. Ọ̀ bụ ụdị okwu dị aṅaa dị nke a? Ọ bụrụ na ihe esi otu ahụ mee, oleekwanụ otu Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe? Nꞌihi na ọ bụrụ na a na-esite nꞌokwu ụgha m na-ewetara Chineke otuto, ebe ọ bụ na okwu ụgha m na-eme ka eziokwu Chineke pụtazie nke ọma, gịnị mere a ga-eji maa m ikpe mmehie? Nꞌihi na ọ bụrụ na ajọ omume m na-ewetara Chineke ezi otuto, mgbe ahụ ihe anyị ga-ekwu bụ na ọ dị mma ka anyị nọgide na-eme ihe ọjọọ ka ihe ọma si na ya bịa. (Nꞌezie, ọmụma ikpe na-eche ndị na-ekwu ụdị okwu a bụ ọmụma ikpe ziri ezi.) Ma ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ụdị okwu a ka m na-ekwusa. Ugbu a, ọ̀ dị ụzọ anyị bụ ndị Juu si ka ndị ọzọ mma? Mbaa! O nweghị ụzọ anyị si ka ha mma. Nꞌihi na e meela ya rị ka ọ pụta ìhè na mmadụ nile bụ ndị mmehie, ndị Juu na ndị mba ọzọ. Akwụkwọ nsọ ekwuola ya sị, “Ọ dịghị onye ọ bụla dị mma nꞌụwa. Ọ dịghị onye ọ bụla, ọ bụladị otu onye nꞌụwa bụ onye ezi omume. “Ọ dịghị onye ọ bụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ agụụ igbaso Chineke. “Mmadụ nile esila nꞌebe Chineke nọ kpafuo. Ha nile emehiela. Ọ dịghị onye na-eme ihe dị mma, ọ bụladị otu onye. “Okwu na-esi ha nꞌọnụ apụta bụ okwu rere ure, nke na-esi isi dị ka isi na-esite nꞌili ghe oghe na-apụta. Ire ha jupụtakwara nꞌokwu ụgha. Okwu ọjọọ ha na-ekwu nwere ike igbu mmadụ. Ọ dị ka elo si nꞌọnụ ajụala apụta. “Nanị okwu ilu jupụtara ha nꞌọnụ. “Ihe ha na-eme ọsịịsọ bụ igbu ọchụ na imerụ mmadụ ahụ. Ebe ọ bụla ha gara, ha na-eweta mbibi na nsogbu nye ndị ahụ. Ha amaghị ihe a na-akpọ udo. “Ha amụtabeghị ihe ịtụ Chineke egwu bụ.” Anyị maara na idebe iwu dịịrị ndị ahụ Chineke nyere iwu ya. Ma e mekwara ka iwu bụrụ ihe ga-eme ka ọnụ ndị mmadụ nile dere duu, ka mmadụ nile nọ nꞌụwa mata na nꞌihu Chineke ha bụ ndị ikpe mara. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a pụrụ ịgụ nꞌonye ezi omume nꞌihu Chineke maka na o debere iwu. Kama ihe iwu na-eme bụ igosi anyị na anyị bụ ndị mmehie. Ma ugbu a, Chineke egosila anyị ụzọ ọhụrụ, nke ya na ụmụ mmadụ ga-esi dịrị nꞌudo. Ọ bụghị ụzọ metụtara idebe iwu. Ọ bụ ụzọ ọhụrụ. Nꞌezie, ọ bụghị ụzọ ọhụrụ, nꞌihi na ndị amụma agbaalarị ama, e dekwara ya nꞌakwụkwọ iwu, na Chineke ga-eme ihe dị otu a. Chineke ekwuola na ya ga-anabata anyị, gụọ anyị na ndị na-emeghị mmehie, ma ọ bụrụ na anyị ekwere na Jisọs Kraịst. Chineke na-anabatakwa ndị nile kweere na Kraịst na-ajụghị ajụjụ ma ha bụ ndị Juu ma ọ bụkwanụ ndị mba ọzọ. Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee. Ma ugbu a, Chineke na-agụ anyị na ndị ezi omume site nꞌamara ya, nke ọ na-enye nꞌefu, site na Kraịst Jisọs, onye sitere nꞌọnwụ nke ọ nwụrụ gbapụta anyị, mee ka anyị nwere onwe anyị. Nꞌihi na Chineke zitere Kraịst ka ọ bụrụ aja a chụrụ nꞌihi ikpuchi mmehie anyị, ka ọbara Kraịst na okwukwe anyị nwere nꞌime ya bụrụ ihe ịjụrụ obi nye ya maka mgbaghara mmehie. Chineke sitere nꞌụzọ a mee ka ọ pụta ìhè na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ebe o sitere na ntachi obi ya hapụ ịta ndị ahụ mehiere megide ya nꞌoge mgbe ochie ahụhụ. Ugbu a, Chineke na-anabata ndị mmehie site nꞌụzọ a igosikwa na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi na Onye ahụ na-agụ ndị nile nwere okwukwe nꞌime Jisọs dị ka ndị na-emeghị mmehie. Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ dị ihe inya isi ọ bụla dị nye anyị? Chineke ọ zọpụtara anyị nꞌihi na anyị debere iwu? É,è, nzọpụta anyị dabeere nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst. Ya mere Chineke zọpụtara anyị nꞌihi okwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ bụghị nꞌihi na anyị mere ihe iwu kwuru. Chineke ọ na-azọpụta nanị ndị Juu? Mba! Nꞌihi na Chineke bụkwa Chineke ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabatakwa ndị mba ọzọ bụ ndị bịakwutere ya site nꞌokwukwe nꞌime Kraịst. Nꞌihi na dị ka Chineke si emeso ndị Juu omume, otu a ka o si emesokwa ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabata ndị Juu nile kweere na Kraịst, nabatakwa ndị mba ọzọ site nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs Kraịst. Ọ bụrụ na Chineke na-anabata anyị site nꞌokwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ̀ pụtara na iwu adịkwaghị mkpa? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesịrị ya. Ka anyị lee anya nihe ịma atụ anyị nwere nakwụkwọ nsọ. Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Eberaham, nna nna ndị Juu? Gịnị pụtara ìhè na ndụ Eberaham banyere inwe okwukwe na nzọpụta? Gịnị mere Chineke ji nabata ya? Ọ bụ nihi ọrụ ọma ọ rụrụ? Ọ bụrụ na Chineke nabatara Eberaham nihi ọrụ ọma, mgbe ahụ Eberaham nwere ihe ọ ga-eji nyaa isi. Ma nebe Chineke nọ, Eberaham enweghị ihe ọ bụla ọ ga-eji nyaa isi. Nihi na a gwara anyị nakwụkwọ nsọ sị, Chineke gụrụ Eberaham dị ka onye ezi omume nihi na o kweere na Chineke. Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nihi ọrụ ọ rụrụ. Ma mmadụ ahụ na-arụghị ọrụ ọ bụla, nke tụkwasịrị Chineke ahụ na-agụ ndị ajọ omume dị ka ndị na-enweghị mmehie obi, ka a na-agụrụ okwukwe ahụ o nwere dị ka ezi omume. Ọ bụkwa otu okwu a ka Devidi kwuru ihe banyere ya, mgbe o kwuru sị na, “Ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke ọgụgụ Chineke gụrụ ya nonye ezi omume na-esiteghị nọrụ ọma ọ rụrụ.” Devidi kwukwara sị, “Ngọzi na-adịrị ndị nile Chineke gbaghaara ajọ omume ha nile, ndị Chineke kpuchiri mmehie ha. Ngọzi dịịrị nwoke ahụ, onye Chineke na-adịkwaghị agụ mmehie ya, megide ya.” Onye ka ngọzi a Devidi kwuru okwu ya dịịrị? Ọ dịịrị ndị Juu kweere na Kraịst ma na-edebekwa iwu? Ka ọ dịịrị ndị ahụ kweere na Kraịst ma ha adịghị edebekwa iwu? Ka anyị lee anya na ndụ Eberaham. Ihe anyị kwuru bụ na Chineke nabatara ya nihi okwukwe ya. Chineke ọ nabatara ya nihi okwukwe ya nanị? Ka ọ nabatara ya nihi na o debekwara iwu? Anyị ga-asa ajụjụ a site nịjụ ajụjụ ọzọ. Olee mgbe Chineke gụrụ Eberaham dị ka onye ezi omume? Ọ bụ tupuu e bie ya ugwu nke mere ka ọ bụrụ onye Juu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Chineke anabatachaala ya dị ka onye ezi omume tupuu e bie ya ugwu. Chineke ekwechaala nkwa na ya ga-agọzi Eberaham tupuu e bie ya ugwu. Obibi ugwu ya bụ nanị ihe ngosi na Chineke anabatala ya, gụọ ya nonye ezi omume nihi okwukwe ya nime Chineke. Ọ bụ nke a mere Eberaham ji bụrụ nna ndị nile kweere na Chineke, ndị ahụ ọ gụrụ dị ka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu. Nụzọ di otu a kwa Eberaham bụ nna ndị nile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nihi na Chineke nabatara Eberaham nanị site nokwukwe o nwere tupuu e bie ya ugwu. Ọ pụtala ìhè ugbu a na nkwa ahụ Chineke kwere Eberaham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị nihi na Eberaham debere iwu Chineke, kama ọ bụ nihi na o kweere na Chineke. Ọ bụkwa site nokwukwe ya, ka Chineke ji gụọ Eberaham nonye ezi omume. Nihi na ọ bụrụ na nkwa Chineke dịịrị nanị ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abaghị uru, inwe okwukwe bụkwa nzuzu, nihi na nkwa ahụ Chineke kwere enwekwaghị isi ọ bụla. Ma eziokwu ahụ pụtara ìhè bụ na iwu nonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Nihi na ebe iwu na-adịghị, mmehie adịkwaghị. Ya mere Chineke na-enye anyị ngọzi ya nile site nokwukwe anyị nwere nime ya. Ọ na-enyekwa anyị ya nefu. Anyị ga-anata onyinye ndị a ma ọ bụrụ na anyị enwee ụdị okwukwe Eberaham nwere. Ya mere nihe gbasara inwe okwukwe nime Chineke, Eberaham bụ nna anyị. Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu nebe ahụ e dere ya sị, “Emeela m gị ka ị bụrụ nna ọtụtụ mba.” Ya mere, nihu Chineke ahụ Eberaham kweere nime ya, Eberaham bụ nna anyị. Ee, ọ bụ nna anyị nihu Chineke ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-enye iwu mee ka ihe na-adịbeghị dịrị. Eberaham kweere okwu Chineke mgbe ihe ọ bụla na-adịghị nke ọ pụrụ iji tụkwasị Chineke obi. O sitere nụzọ dị otu a bụrụ nna nke ọtụtụ mba, dị ka Chineke gwara ya na ụmụ ụmụ ya gaamụba. Noge ahụ Eberaham agbaala narị afọ. Ọ maara nke ọma na ọ kaala nka ịmụta nwa. Ọ makwaara na Sera nwụnye ya, onye gbara iri afọ toolu noge a, agaghị amụkwa nwa ọzọ. Ma o kweghị ka ihe ndị a gbochie ya ikwesi ike na Chineke ga-eme ihe o kwere na nkwa, nye ya nwa nwoke. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe nile o kwere ya na nkwa. Okwukwe o nwere na Chineke siri nnọọ ike mee ka Eberaham bido ito Chineke nihi mmezu nkwa o kwere ya, tupuu Chineke emeere ya ihe ahụ. O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe nile ọ bụla o kwere ya na nkwa. Ọ bụ nihi ụdị okwukwe a Eberaham nwere ka Chineke ji gụọ ya nonye ezi omume, onye na-enwekwaghị mmehie ọ bụla. Ugbu a, edeghị nakwụkwọ nsọ ihe banyere otu Chineke siri gụọ Eberaham nonye ezi omume, nihi ọdịmma nke Eberaham nanị. Kama e dere ya nihi anyị, iji gosi anyị na Chineke kwadokwara ịnabata anyị site notu ụzọ ahụ o si nabata Eberaham, ma ọ bụrụ na anyị ekwere na nkwa Chineke, onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si na ndị nwụrụ anwụ bilie. E gburu Jisọs nihi mmehie anyị, ma o si nọnwụ bilie ọzọ ịzọpụta anyị site na mmehie anyị, ime ka anyị na Chineke dị na mma, na imejupụta anyị nịdị mma nke Chineke nonwe ya. Ugbu a ebe e sitere nꞌokwukwe anyị mee ka anyị na Chineke dịrị na mma, udo dị ugbu a nꞌetiti anyị na Chineke nꞌihi ihe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst meere anyị. Nꞌihi na site nꞌokwukwe anyị, Kraịst akpọbatala anyị nꞌime amara nke Chineke, ebe anyị nọ ugbu a. Anyị nọ nꞌọṅụ nweekwa olileanya na Chineke ga-eme ka anyị keta oke nꞌebube ya. Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌime nsogbu anyị nile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachi obi. Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike. Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke. Leenụ nụ ka obi ebere Chineke siri dị ukwuu. Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọ bụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Jisọs bịara nwụọ ọnwụ nꞌihi anyị ndị mmehie. A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nꞌihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nꞌihi ezi mmadụ. Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kraịst ka ọ bịa nwụọ nꞌihi anyị. Ọ bụrụ na Chineke gụrụ anyị dị ka ndị ezi omume site nꞌọbara Jisọs wụsịrị, a ga-esitekwa na Kraịst zọpụta anyị site nꞌọnụ ma Chineke. Nꞌihi na ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro ya, Chineke mere ka anyị na ya dịrị nꞌudo, site nꞌọbara ahụ Kraịst kwafuru, ọ̀ bụkwaghị eziokwu na Chineke ga-azọpụta anyị ugbu a o bi nꞌime anyị, nꞌihi na e meela ka anyị na ya dịrị nꞌudo? Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌọnọdụ ọhụrụ a, nke anyị na Chineke ịnọ nꞌudo, nke e mere ka ọ dịrị site nꞌihe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst meere anyị mgbe ọ nwụrụ, ka e site nꞌaka ya mee ka mgbaghara Chineke rute anyị aka. Dị ka o si dị, ọ bụ site nꞌaka otu nwoke ka mmehie si bata nꞌụwa. Ọ bụkwa mmehie ya wetara ọnwụ. Ugbu a ọnwụ erutela onye ọ bụla aka nꞌihi na mmadụ nile emehiela. Ọ bụ nꞌezie na ndị mmadụ na-eme mmehie site nꞌoge Adam ruo mgbe Chineke nyere iwu, ma a dịghị agụ onye ọ bụla dị ka onye mmehie mgbe ahụ, nꞌihi na Chineke enyebeghị ha iwu ya, ma ọ bụ gwa ha ihe ọ chọrọ ka ha mee. Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọ bụla site nꞌoge Adam ruo nꞌoge Mosisi. Ma ha anwụghị nꞌihi mmehie nke aka ha, ebe ọ bụ na ọ bụghị ha onwe ha nupụrụ isi nꞌiwu ahụ Chineke nyere Adam. Adam nꞌonwe ya nọkwa ọnọdụ dị ka ihe ịma atụ nke na-egosi Onye ahụ nke gaje ịbịa. Leekwa ihe dị iche nꞌetiti mmehie mmadụ mere na mgbaghara mmehie Chineke! Nꞌihi na ọ bụ site na mmehie otu onye ka ọnwụ ji zuo ọha ọnụ. Ugbu a ọ bụkwa site nꞌaka otu onye, Jisọs Kraịst, ka mgbaghara mmehie ji rute mmadụ nile aka site nꞌobi ebere Chineke. Mmehie Adam buteere mmadụ nile ọmụma ikpe ọnwụ, ma Kraịst bịara wepụ ọtụtụ mmehie, site nꞌụzọ dị otu a wetara anyị onyinye Chineke, nke bụ ndụ na-ejubiga oke. Ọ bụ ezie na ọnwụ malitere ịchị ụwa nꞌihi mmehie otu nwoke, ma ndị nile ga-anabatara onwe ha onyinye mgbaghara Chineke, na onyinye nke ịbụ ndị ezi omume nke ọ na-enyekwa, ga-esite nꞌihe Kraịst meere ha bụrụ ndị nwere ndụ nke ọnwụ na-agaghị eemri. Nꞌezie, mmehie nke Adam mehiere, bụ ihe wetara ikpe ọmụma nye mmadụ nile, ma ezi omume nke Kraịst, bụ ihe na-eme ka mmadụ na Chineke dịrị nꞌudo. Dị ka ọtụtụ mmadụ si bụrụ ndị mmehie nꞌihi nnupụ isi Adam, ugbu a ọtụtụ mmadụ ga-abụkwa ndị ezi omume nꞌihi nrube isi nke Kraịst. Mgbe iwu bịara, e sitere na ya mee ka mmadụ nile hụ otu mmehie si babiga ụba oke. Ma mgbe anyị na-ahụ ịba ụba nke mmehie anyị anya, mgbe ahụ ka anyị na-ahụkwa ịbabiga ụba oke nke amara Chineke na mgbaghara ya. Na mbụ ọ bụ mmehie na-achị ụwa. Ọ bụkwa mmehie wetara ọnwụ. Ma ugbu a, obi ebere Chineke na-achị ụwa, obi ebere ya nke kpọbatara anyị nꞌihu ya, ebe anyị guzo ugbu a, obi ebere Chineke, nke ga-eduba anyị na ndụ ebighị ebi site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. Ugbu a, gịnị ọzọ kwa ka anyị gaekwu? Anyị ga-anọgide nꞌime mmehie ka Chineke nọgide na-emere anyị ebere, ma na-agbaghara anyị? Tụfịakwa! Chineke ekwela! Olee otu anyị ga-esi nọgide na mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị. Nꞌihi na unu kwesịrị ịmata, na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtara anyị na ya nꞌọnwụ ya. Ya mere, e likọtara anyị na ya na baptizim ka anyị si otu a keta oke nꞌọnwụ ya. Ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ, mgbe e sitere nꞌike dị ebube nke Nna mee ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie. Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nꞌọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nꞌọnwụ. Nꞌihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ ochie anyị na Kraịst nꞌelu obe, ime ka anụ ahụ mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nꞌiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nꞌịbụ ohu nye mmehie. Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ bụrụla onye nwere onwe ya site nꞌebe mmehie dị. Ọ bụrụkwa nꞌeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwaara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ. Nꞌihi na anyị maara na ebe Chineke mere ka Kraịst site nꞌọnwụ bilie, Kraịst agaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe ọ nọ ọzọ. Mgbe ọ nwụrụ, ọ nwụrụ nanị otu mgbe nye mmehie. Ma ndụ ọ dị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke. Ya mere, gụọ onwe gị ugbu a dị ka onye nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dị ka onye dị ndụ nꞌebe Chineke nọ, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị. Ekwela ka mmehie na-achị anụ ahụ gị ọzọ, enyekwala onwe gị nꞌaka mmehie imezu agụụ ihe ọjọọ na-agụ gị. Ekwekwala ka akụkụ ọ bụla nke ahụ gị bụrụ ngwa ọrụ mmehie. Kama nyefee onwe gị kpamkpam nꞌaka Chineke, akụkụ ahụ gị nile, ka ị bụrụkwa ezi ngwa ọrụ nꞌaka ya. Nꞌihi na ọ bụ nzọpụta ka a zọpụtara gị site nꞌaka ọnwụ. Ka Chineke jiri gị rụpụta nzube ọma ya nile. O kwesikwaghị ka ị bụrụ odibo mmehie ọzọ, nꞌihi na ugbu a ị nọkwaghị nꞌokpuru iwu, kama ị nọ nꞌokpuru amara. Ka m jụọ gị ajụjụ. Ò ziri ezi na anyị ga-anọgide na-eme mmehie ebe anyị nọ ugbu a nꞌokpuru amara Chineke? Mba! Chineke ekwela. Ọ bụ na unu amataghị na onye ọ bụla unu na-ejere ozi, na onye unu na-erubekwara isi bụ Onyenwe unu? Unu ka ọ dịrị ịhọrọ ịbụ ohu mmehie nke na-eduba nꞌọnwụ, ma ọ bụkwanụ irubere Chineke isi onye na-enye ndụ ebighị ebi. Ekele dịrị Chineke nꞌihi na mbụ unu jiri aka unu họrọ ịbụ ohu mmehie, ma ugbu a, unu ekpebiela ịnabatara onwe unu ozizi ahụ Chineke nyefere nꞌaka unu. Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site nꞌaka nna unu ukwu ochie bụ mmehie, unu abụrụla ndị ohu nke nna unu ukwu ọhụrụ, bụ ezi omume. Eji m odibo na nna ya ukwu na-amara unu atụ nꞌihi na ọ ga-eme ka unu ghọta ihe m na-ekwu. Ya mere, dị ka unu si rubere mmehie isi, rụọ ọrụ ọjọọ nile ọ chọrọ na mbụ, sitekwanụ otu a jeere Chineke ozi, ịrụpụta ihe nile dị mma, na ihe dị nsọ na ndụ unu. Na mgbe ochie ahụ, mgbe unu bụ odibo mmehie, ọ naghị agụ unu agụụ ime ihe ọ bụla dị mma. Ma gịnị bụ uru unu nwetara nꞌọrụ ahụ nile unu rụrụ? Amaara m na ọ dịghị uru ọ bụla unu ritere. Nꞌihi na leenụ otu ihere si eme unu, mgbe ọ bụla unu chetara ndụ ochie unu ahụ. Unu makwaara na ọgwụgwụ ihe ndị ahụ nile bụ ọnwụ. Ma ugbu a, ụmụnna m, unu abụkwaghị ohu mmehie, kama unu bụ ohu Chineke. Uru Chineke kwadoro na unu ga-erita nꞌọnọdụ ọhụrụ a, bụ ịdị nsọ na ndụ ebighị ebi. Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. Ọ̀ pụtara na unu amatabeghị ụmụnna m, na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, iwu enwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe ọ nọ? Ọ bụ unu ndị maara iwu ka m na-agwa okwu a. Ka m nye ihe ịma atụ: Mgbe nwanyị lụrụ di, ọ bụ iwu na-ejikọta di na nwụnye ahụ tutuu otu nꞌime ha anwụọ. Ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, nwanyị a anọkwaghị nꞌokpuru iwu jikọtara di na nwụnye. O nwere ike pụọ lụrụ di ọzọ, ma ọ chọọ. Ma ọ ga-abụ ihe megidere iwu ma ọ lụọ dị ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Nꞌụzọ dị otu a, unu onwe unu dị ka nwanyị lụrụ di. Na mbụ, di unu bụ iwu ndị Juu. Ma mgbe Kraịst nwụru, unu soro ya nwụọ. Nꞌihi nke a, ebe a gụrụ unu na ndị nwụrụ anwụ, ihe ọ bụla ejikọtakwaghị unu na iwu ndị Juu. O nwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe unu nọ. Mgbe Kraịst biliri nꞌọnwụ, unu sokwara ya bilie bụrụ ndị dị ọhụrụ. Ugbu a, onye na-alụ unu bụ onye ahụ si nꞌọnwụ bilie. Ọ na-alụ unu ime ka unu nwee ike ịmị ezi mkpụrụ, nke bụ ezi omume nye Chineke. Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị unu, ọchịchọ ọjọọ jupụtara nꞌime unu, na-eme ka ọ na-agụ unu agụụ ime nanị ajọ omume nke iwu Chineke megidere. Ma ugbu a, ebe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe iwu kere anyị agbụ dị, a napụtakwala anyị site nꞌaka ya, ime ka anyị bụrụ ndị sitere nꞌụzọ ọhụrụ nke Mmụọ na-ejere Chineke ozi. Ọ bụkwaghị nꞌụzọ ochie nke iwu e dere ede si chọọ. Ugbu a, ụmụnna m, ihe anyị na-ekwu nꞌebe a abụghị na iwu Chineke bụ ihe ọjọọ. Mba! O nweghị ụzọ iwu si bụrụ ihe ọjọọ, kama ọ bụ iwu mere ka m mata ihe mmehie bụ. Agaraghị m eche echiche ime ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na iwu asịghị, “Echela echiche ime ihe ọjọọ.” Ma mmehie sitere nꞌiwu a megidere ọchịchọ ọjọọ, mee ka echiche m mgbe nile bụrụ ihe gbasara ihe ọjọọ, na otu m ga-esi mee ha. A sị na iwu adịghị, mmehie agaraghị adị. Mgbe m na-amaghị ihe iwu chọrọ ka m mee, ana m eche na m nọ na-ebi ezi ndụ, ma mgbe m mụtara eziokwu dị nꞌime iwu e dere ede, amatara m na m bụ onye gba aka, onye ikpe ọnwụ dị na-eche, nꞌihi na ọ dịghị iwu ọ bụla m debere. Iwu ahụ kwesịrị izi m ụzọ m ga-esi nweta ndụ juru afọ, ka m chọpụtara na ọ bụ ikpe ọnwụ ebighị ebi ka ọ na-eduba m. Ma ọ bụ mmehie ghọgburu m! Nꞌihi na mmehie ji ezi iwu ahụ Chineke nyere gbaara m ọnya, ime ka m bụrụ onye ikpe ọnwụ mara. Ma nꞌezie, iwu ahụ bụ ihe dị nsọ, bụrụkwa ihe dị mma. Olee otu iwu siri bụrụ ihe dị mma? Ọ̀ bụghị iwu wetara ikpe ọmụma? Ò si aṅaa bụrụkwanụ ihe dị mma? Ka m kọwaa. Ọ̀ bụghị iwu bụ ihe dị njọ, kama ọ bụ mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. Nꞌihi na ọ bụ mmehie weere iwu dị mma, mee ka e site na ya wetara m ikpe ọmụma. Ị hụla ka mmehie si bụrụ nnọọ ihe arụrụ ala na ihe aghụghọ na ihe na-eweta ọnwụ? O ji iwu ọma Chineke mere ngwa ọrụ ihe ọjọọ ya. Ka anyị site nꞌụzọ ọzọ lee ya anya, ịwu bụ ihe dị mma, ma ebe nsogbu a nile si bụ nꞌaka m. Adịghị m nsọ nꞌihi na abụ m onye e refuru erefu, dị ka ohu, nye nꞌaka mmehie. Ọ bụkwa mmehie na-achị ndụ m. O nweghị ụzọ ụdị ndụ m na-ebi si doo m anya. Nꞌihi na mgbe ọ bụla m chọrọ ime ihe dị mma, ọ naghị ekwe m, kama ihe ahụ m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe nile. O doro m anya na ihe ndị a nile m na-eme jọrọ njọ, akọnuche m na-agbakwa ama nꞌime m banyere ihe ọjọọ ndị a, na-egosi na o nwere akụkụ ahụ m kwenyere na ihe iwu kwuru bụ eziokwu. Ma ịkwụsị ime ihe ọjọọ ndị a bụ ihe nyịrị m. Agbalịala m ka ike m nile ha, ma enweghị m ike inyere onwe m aka, nꞌihi na ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ọjọọ ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nꞌime m, nke dị ike karịa m, na-akwanye m ime ihe ndị a. O doro m anya na ọ bụ nanị ihe ọjọọ jupụtara nꞌime m. Enweghị m ike mee otu ihe dị mma. Ọtụtụ mgbe ọ na-agụ m ka m mee ihe dị mma ma anaghị m eme ya. Mgbe ọ bụla m chọrọ ime ezi ihe, anaghị m eme ya. Ma mgbe ọ bụla m jisiri ike chọọ ịhapụ ime ihe ọjọọ, ọ bụ ihe ọjọọ m na-achọghị ime ka m na-eme. Eziokwu pụtara ìhè bụ nke a, ọ bụrụ na m na-anọgide na-eme ihe ọjọọ m kpọrọ asị, ọ dịkwaghị otu ọzọ a ga-esi kọwaa omume a, karịakwa na mmehie ahụ dị nꞌime m, eriela m ahụ, mee ka m na-eme nanị ihe ọ chọrọ. Nꞌihi na ahụla m ya na ndụ m, na tupuu m cheta echiche ime ihe dị mma, echiche ọjọọ eburularị ụzọ were oche nꞌime m. Ihe na-agụ obi m agụụ mgbe nile bụ nanị ime ihe Chineke na-achọ. Ma ana m ahụ na ọ dị akụkụ ahụ m nke na-alụso echiche obi m ọgụ, na-emerikwa ya, si otu a mee m ka m bụrụ ohu mmehie. Nꞌime obi m ọ na-agụ m agụụ ịbụ ezi ohu Chineke, ma ihe m chọpụtara bụ na abụ m mmadụ mmehie na-achị. Leenụ ka o si dị: ndụ ọhụrụ dị nꞌime m na-achọ ime ihe ziri ezi, ma ndụ ochie ahụ bi nꞌime m hụrụ mmehie nꞌanya. Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Onye pụrụ ịzọpụta m site nꞌanụ ahụ ochie m nke na-eduba m nꞌọnwụ? Ma ekele dịrị Chineke site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ana m eji mmụọ m nile na-ejere iwu Chineke ozi, ma nꞌanụ ahụ m, abụ m ohu mmehie. Ya mere, ikpe ọmụma ọ bụla adịkwaghị ugbu a nye ndị nile nọ nꞌime Jisọs Kraịst. Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị. A zọpụtaghị anyị nꞌihi na anyị debere iwu, nꞌihi na ọ dịghị mgbe anyị na-edebe ya, anyị enwekwaghị ike idebe ya. Ma Chineke sitere nꞌụzọ dị iche zọpụta anyị. Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nꞌụdị anyị bụ mmadụ ka ọ laa ike nke mmehie nꞌiyi, site nꞌiji onwe ya chụọ aja nꞌihi mmehie anyị. Ya mere, anyị pụrụ idebezu ihe nile iwu chọrọ ugbu a, site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ bụkwaghị ọrụ anyị ime ihe anụ ahụ anyị chọrọ. Ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka anụ ahụ si chọọ, na-ebi ya nanị imezu agụụ nile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị nile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ Nsọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Chineke na-achọ. Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo. Nꞌihi na ọdịdị ochie dị nꞌime anyị na-ebu agha imegide Chineke. Ọ naghị erubere Chineke isi, ọ nakwaghị eme ihe Chineke na-achọ. Ya mere, ndị nile ọdịdị ochie ha na-achị, ndị na-eme ihe ọ chọrọ, enweghị ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ma lee! Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke bi nꞌime unu na-achị ndụ ọhụrụ unu, unu agaghị emekwa uche ọdịdị ochie unu. Chetakwa na ọ bụrụ na Mmụọ Kraịst ebighị nꞌime gị, ị bụghị onye nke Kraịst. Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nꞌime gị, anụ ahụ gị ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị, ma Mmụọ Nsọ bi nꞌime gị ga-enye gị ndụ, nꞌihi na o burularị ụzọ mee ka ị bụrụ onye ezi omume. Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke, onye mere ka Jisọs si nꞌọnwụ bilie, bi nꞌime gị, ọ ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ ọzọ, mgbe ị nwụchara, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nꞌime gị. Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ. Ma ọ bụghị ọdịdị ochie anyị ka anyị ji ụgwọ ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee. Nꞌihi na ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe ọdịdị ochie anyị chọrọ, anyị ga-ala nꞌiyi. Kama ọ bụrụ na anyị esite nꞌike Mmụọ Chineke gwepịa, ma wezuga ọrụ ọjọọ nke anụ ahụ, anyị ga-adịkwa ndụ. Nꞌihi na ndị nile Mmụọ Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. Anyị bụ ụmụ Chineke. O kwesịkwaghị ka anyị na-eme dị ka ndị ohu, ndị ụjọ na-atụ. A kpọbatala anyị nꞌezinụlọ Chineke. Ya mere, ka anyị kpaa agwa dị ka ụmụ Chineke. Ka anyị kpọọkwa Chineke “Nna, Nna” nꞌihi na ọ bụ Nna anyị. Mmụọ Nsọ na-agwakwa anyị okwu nꞌime mmụọ anyị, na-agbara anyị ama na anyị bụ ụmụ Chineke nꞌezie. Ugbu a, ọ bụrụkwa na anyị bụ ụmụ ya, anyị gaeketa oke nꞌakụ ahụ dị nꞌalaeze Chineke. Nꞌihi na ihe nile Chineke nyere Jisọs abụrụla nke anyị. Ọ bụrụkwa nꞌezie na anyị ga-eso Kraịst keta oke nꞌotuto ya, anyị aghaghị iso ya keta oke na ntaramahụhụ ya. Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị. Nꞌihi na ụwa na ihe nile e kere eke dị nꞌime ya ji ndidi na olileanya na-echesi ike ịhụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esite nꞌọnwụ kpọlite ụmụ ya. Nꞌihi na Chineke bụrụ ihe nile o kere eke ọnụ, ọ bụghị nꞌihi na ihe ndị a chọrọ ịnọ ọnọdụ a, kama, ọ bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka o si otu ahụ dịrị. Ma otu ọ dị, ihe ndị a nile nwere olileanya na, otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-azọpụta ha site nꞌaka ịbụ ohu nke ire ure, mee ka ha soro ụmụ Chineke nile nwere onwe ha, sorokwa ha keta oke nꞌebube ahụ ga-abụ nke ha. Anyị maara na tutuu ruo ugbu a, ihe nile e kere eke, dị ka ụmụ anụmanụ, na ahihia, nọ na-asụ ude, nꞌihi ihe mgbu ha nọ nꞌime ya. Ma ha nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ. Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ. A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a. Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya na ọ dị ihe Chineke ga-emere anyị, anyị kwesịrị iji ndidi chere ruo mgbe o mezuru ihe ahụ. Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ. Chineke Nna anyị, onye na-enyocha obi mmadụ nile makwaara ihe Mmụọ Nsọ ahụ na-eche, mgbe ọ na-arịọ arịrịọ ahụ nꞌusoro, dị ka Chineke si chọọ. Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị. Nꞌihi na site na mmalite ihe nile, Chineke maararị ndị ga-abịakwute ya. O kpebikwara na ndị a ga-abịakwute ya ga-adị ka Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ka Jisọs bụrụ onye okenye e bu ụzọ mụọ nꞌetiti ọtụtụ ụmụnna. Ọ bụkwa ndị ahụ nile Chineke họpụtara, ka ọ kpọrọ ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, Chineke mere ka ha bụrụ ndị ya na ha dị na mma. Ọ gụrụ ha dị ka ndị na-emeghị mmehie ọ bụla, meekwa ka ha bụrụ ndị gaeketa oke nꞌebube ahụ o kwere na nkwa. Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ọma ndị a nile Chineke meere anyị. Ọ bụrụ na Chineke dịnyeere anyị, onye pụrụ iguzo megide anyị? Tulee ya nꞌonwe gị: Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, nke weere ya nye nꞌihi mmehie anyị, ọ̀ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị? Ònye pụrụ ịpụta nꞌihu Chineke boo anyị bụ ndị ya ọ họpụtara ebubo mmehie? Ònye ka ọ bụ? Chineke nꞌonwe ya ọ ga-ebo anyị ebubo nꞌihi mmehie anyị? Mba! Nꞌihi na ọ bụ ya onwe ya gbaghaara anyị mmehie anyị, mee ka anyị na ya dị na mma. Mgbe ahụ, olee onye ọzọ nwere ike ịma anyị ikpe ọnwụ? Ọ̀ bụ Kraịst? Mba! Nꞌihi na Kraịst bụ onye ahụ nwụrụ nꞌihi anyị, ọ bụkwa onye ahụ e mere ka o si nꞌọnwụ bilie, mee ka ọ nọọ nꞌaka nri Chineke, ebe ọ nọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba! Nꞌihi na akwụwkọ nsọ na-agwa anyị sị, “Ọ bụ nꞌihi gị, Chineke, ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị nile. A na-ele anyị anya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.” Ma nꞌime ihe ndị a nile, mmeri bụ nke anyị site na Kraịst, onye ahụ hụrụ anyị nꞌanya, nwụọ nꞌihi anyị. Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke. Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ihe m na-agwa unu bụ eziokwu dị ka onye Kraịst nke m bụ. Ekwughị m okwu ụgha. Mmụọ m, nke Mmụọ Nsọ na-achị, na-agbakwara m ama, na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu. Ihe banyere ọnọdụ ụmụnna m ndị Juu na-ewute m nnọọ nke ukwu. Ana m anọ nꞌobi ọjọọ ehihie na abalị nꞌihi ha. A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye Chineke bụrụ ọnụ na onye a ga-ewepụ site nꞌebe Kraịst nọ, ma ọ bụrụ na nke a ga-enyere ụmụnna m ndị Juu a aka ịmata Kraịst, na ịnabata ya nye onwe ha. Nꞌihi na ndị Juu bụ ndị Chineke nyere ọtụtụ onyinye. Chineke mere ha ụmụ ya, mee ka ha keta oke nꞌebube ya. O nyere ha ọgbụgba ndụ ya, na iwu ya. O kwenyere ka ha fee ya ofufe, ma kwekwa ha nkwa ihe dị ukwuu ọ ga-emere ha. Ndị a maara aha ha dị ka ndị ha na Chineke nwere mmekọ ka nna nna ha bụ. Kraịst nꞌonwe ya, site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, sikwa nꞌetiti ha bịa. Ee, Kraịst ahụ, onye bụ Chineke na-achị ihe nile ugbu a. Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Amin. Ugbu a, ọ̀ ga-abụ na nkwa Chineke kwere ndị Juu enwekwaghi isi? Mba! Nꞌihi na nkwa ahụ dịrị nanị ndị bụ ndị Juu nꞌezie. Ọ bụkwaghị onye ọ bụla a mụrụ nꞌezinụlọ ndị Juu bụ onye Juu. Na mmadụ sitere nꞌagbụrụ Eberaham pụta emeghị ka ọ bụrụ nwa Eberaham nꞌezie. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ gwara anyị na nkwa ahụ Chineke kwere Eberaham dịrị nanị Aizik na ụmụ ya, Ọ bụ ezie na Eberaham mụtakwara ụmụ ọzọ. Nke a na-egosi na ọ bụghị ụmụ nile a mụrụ nꞌezinụlọ Eberaham bụ ụmụ Chineke. Kama ndị bụ ụmụ Chineke bụ ụmụ Eberaham ndị kweere nkwa nzọpụta ahụ Chineke kwere Eberaham. Lee ka e si kwe nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.” Ọ bụghị nanị nke a. Aizik toro bụrụ dimkpa, lụọ nwụnye. Mgbe oge ruru ka Rebeka nwụnye ya mụọ nwa, Chineke ziri ha ozi gwa ha na Rebeka gaamụ ụmụ ejima. Chineke gwara Rebeka na Ịsọ, nwa ọ ga-ebu ụzọ mụpụta, ga-abụ odibo Jekọb nwanne ya nke ga-apụta mgbe Ịsọ pụtasịrị. Nꞌakwụwkọ nsọ, Chineke kwuru sị, “Ekpebiela m igọzi nanị Jekọb, ọ bụghị Ịsọ.” Chineke kwuru okwu tupuu a mụọ ụmụ ahụ. O kwuru okwu a tupuu ha etoo, mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla. Nke a gosiri na Chineke mere ihe o kpebiri na ọ ga-eme site na mmalite. Mkpebi Chineke adabereghị nꞌihe ụmụaka ahụ mere, kama ọ dabeere nꞌihe Chineke chọrọ. *** *** *** Nꞌihi na Chineke gwara Mosisi sị, “Nanị onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ inwe ọmiko nꞌahụ ya ka m gaenwe ọmiko.” Ya mere, Chineke anaghị agọzi mmadụ nꞌihi na onye ahụ chọrọ ka ọ gọzie ya. Ọ naghị agọzi mmadụ nꞌihi na onye ahụ rụsịrị ọrụ ike. Kama ndị Chineke na-agọzi bụ ndị o kpebiri nꞌonwe ya igọzi, ndị o kpebiri imere ebere. Fero bụ onye akwụkwọ nsọ ji maa atụ banyere mmeso Chineke na-emeso ndị mmadụ. Nꞌakwụwkọ nsọ, Chineke gwara Fero sị, “Emere m ka ị bụrụ eze nꞌihi na achọrọ m isite nꞌihe ọjọọ ị na-eme zipụta ike m, ka ụwa nile nụ ihe banyere m.” Ọ pụtara ìhè na ọ bụ nanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị isi ike. Ma eleghị anya ajụjụ ị ga-ajụ bụ nke a, “Gịnịkwanụ mere Chineke ji na-ata ndị na-adịghị eme ihe ọ chọrọ ụta, ebe ọ bụ na ha na-eme ihe dị ka o si kee ha?” Ajụkwala ụdị ajụjụ ahụ! Onye ka ị bụ i ji ajụ Chineke ajụjụ? Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ sị, “Ònye sị gị kpaa m otu a?” Otu a kwa, ọ̀ bụghị onye na-akpụ ite ka ọ dịrị ikpebi iji ụrọ o nwere kpụọ ụdị ite ọ bụla masịrị ya, ite mara mma e ji eku mmiri, ma ọ bụ ite e ji ekpofu unyi? Nꞌụzọ dị otu a, Chineke emeghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na o kpebiri igosi ike ya na iwe ya site nꞌịla ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ nꞌiyi, ebe ha na-adịghị eche uche banyere ndidi na ntachi obi Chineke ji anagide ajọ omume ha. Chineke na-emekwa ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na o kpebie iji ndị dị ka anyị, o mere ka anyị jupụta nꞌebube ya, mee ihe nlere anya nye ndị ọzọ, ma anyị bụ ndị Juu, ma ọ bụ ndị mba ọzọ, igosi ha otu o si emere anyị ebere. *** Chineke sitere nꞌọnụ onye dere akwụkwọ Hosiya kwuo okwu sị, “Aga m achọtara onwe m ndị ọzọ ga-abụ ụmụ m, ndị na-esiteghị nꞌagbụrụ ndị Juu. Aga m ahụ ndị a nꞌanya, bụ ndị onye ọ bụla na-egosibeghị ịhụnanya mgbe ọ bụla.” Chineke kwukwara okwu sị, na ndị mba ọzọ ahụ a gwara na ha abụghị ndị Chineke, ka a gaakpọkwa ụmụ Chineke dị ndụ. Aịzaya onye amụma kwara akwa nꞌihi ụmụ Izirel sị, “Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ụmụ Izirel ga-adị ka ụzụzụ dị nꞌakụkụ osimiri, ma ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta. Nꞌihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ikpe ahụ ga-adịkwa egwu. Ọ gaekpe ya ọsịịsọ.” Nꞌebe ọzọ kwa, nꞌakwụkwọ nsọ, Aịzaya onye amụma kwuru sị, “Ọ bụrụ na Chineke abụghị onye obi ọma, ndị Juu nile gaara ala nꞌiyi dị ka e si laa ndị nile bi nꞌobodo Sodọm na Gomora nꞌiyi.” Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a? Anyị ga-asị na Chineke enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ọ bụla ha ji obi ha chọọ Chineke, ohere ịbụ ndị a ga-anabata site nꞌokwukwe, ma ndị Juu nọ kemgbe na-agbalisi ike ime ka ha na Chineke dịrị nꞌudo site nꞌidebe iwu, enwebeghị ike ime onwe ha ndị Chineke ga-anabata? Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nꞌihi na ha achọghị isite nꞌokwukwe bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Ha chere na ha pụrụ isite nꞌịrụ ọrụ ọma bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Site nꞌụzọ dị otu a, ha abụrụla ndị sụrụ ngọngọ nꞌoke nkume ịsụ ngọngọ ahụ. Nꞌihi na Chineke dọrọ ha aka na ntị sị, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn oke nkume ga-eme ka ụmụ mmadụ sụọ ngọngọ. Ọtụtụ mmadụ ka nkume a ga-eme ka ha daa (oke nkume a bụ Jisọs Kraịst). Ma onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi, ihere agaghị eme ya.” Ụmụnna m, ọ na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwuu ịhụ na a zọpụtara ndị Juu. Nke a mere m ji ekpe ekpere banyere ha mgbe nile. Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nꞌobi nke ukwuu. Kama ihe na-ewute m bụ na ịnụ ọkụ nꞌobi ha abụghị site na mmazu Chineke. Nꞌihi na ha jụrụ ịnabata ụzọ ezi omume ahụ si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama ha nọgidere na-agbalịsi ike isite nꞌụzọ idebe iwu ndị Juu ịchọ ime ka Chineke nabata ha. Ma ụzọ ahụ abụghị ụzọ Chineke kwadoro isite ịzọpụta mmadụ. Ha amaghị na Kraịst naenye ndị nile tụkwasịrị ya obi ihe nile ha chọrọ inweta site nꞌidebe iwu. Nꞌihi na ọbịbịa Kraịst mere ka ọgwụgwụ idebe iwu bụrụ ihe dị ire. Nꞌihi na Mosisi kọwara ya nꞌụzọ doro anya sị, a ga-azọpụta onye na-edebe iwu nanị ma onye ahụ debezuo iwu nile na ndụ ya na-adaghị mba nꞌidebe ọ bụladị nanị otu iwu. Ma nzọpụta ahụ si nꞌokwukwe rute mmadụ aka adịghị ajụ ajụjụ sị, “Ònye pụrụ irigo nꞌeluigwe ịchọta Kraịst kudata ya nꞌụwa ka o nyere anyị aka?” Nzọpụta ahụ adịghị ajụkwa sị, “Ònye kwa pụrụ ịrịdata nꞌime ili, ime ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie dịrị ndụ ọzọ?” Kama nzọpụta ahụ, nke okwukwe nꞌime Kraịst na-eweta na-agwa anyị sị, “Ozi ọma nzọpụta ahụ dị onye ọ bụla nso. Nꞌezie ozi ọma ahụ anyị na-ekwusa ihe gbasara ya dị gị nꞌọnụ, dịkwa nꞌime obi gị. Ọ na-ekwu sị, ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ọ bụrụkwa na ị ga-ekwere nꞌobi gị na Chineke mere ka Jisọs Kraịst si nꞌọnwụ bile, a ga-azọpụta gị. Nꞌihi na ọ bụ nanị mgbe i kweere nꞌobi gị, na mgbe i ji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ka a ga-azọpụta gị.” Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ihere agaghị eme ya, bụ onye ọ bụla kweere na Jisọs Kraịst.” Ozi a dịrị ndị Juu na ndị mba ọzọ. Nꞌihi na ọ dịghị ihe dị iche nꞌetiti ha. Ha nile nwere otu Chineke ahụ, Onyenwe ihe nile, onye na-agọzi onye ọ bụla na-akpọku ya. Ya mere, onye ọ bụla na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta. Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esi kwere nꞌonye ahụ ha na-anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị? Oleekwanụ otu mmadụ ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ya? Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ sịrị, “Lee ka ọbịbịa ndị na-ekwusa ozi ọma udo nke dị nꞌetiti Chineke na mmadụ si maa mma.” Ma ọ bụghị ndị nile nụrụ ozi ọma a na-anabata ya. Aịzaya onye amụma kwuru nꞌoge ya sị, “Onyenwe anyị, onye kwanụ nꞌetiti ha bụ onye kweere nꞌihe m kwusara?” Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nꞌige ntị nꞌozi ọma a ka mmadụ ji ekwere. Ozi ọma bụkwanụ ikwusa Jisọs Kraịst. Ị̀ na-eche na ndị Juu anụghị ozi ọma mgbe e kwusara ya? Nꞌezie, ha nụrụ ya. “Nꞌihi na ụwa nile anụla olu ndị na-ekwusa ozi ọma a. Ihe ha na-ekwusa eruola nꞌebe ụwa sọtụrụ.” O dokwara ndị Juu anya na ọ bụrụ ha ha ajụ ịnabatara onwe ha ụzọ nzọpụta a, na Chineke ga-ewere ya nye ndị ọzọ. Nꞌihi na Mosisi kwuru sị na Chineke ga-akpasu ndị Juu iwe mee ka ha kwosi ndị mba ọzọ ekworo, nꞌihi nzọpụta ọ ga-enye ndị mba ọzọ. Otu a kwa Chineke kwukwara okwu site nꞌọnụ Aịzaya onye amụma sị, “Ndị gaachọta m bụ ndị ahụ na-adịghị achọ m. Ọ bụkwa ha ka m ga-eme ka ha mata onye m bụ.” Ma banyere ndị Juu Chineke kwuru okwu sị, “Agbasara m aka m ehihie na abalị nye ụmụ na-adịghị asọpụrụ nna ha, ma ha jụkwara ịbịakwute m.” Ka m jụọ ajụjụ ọzọ. Ọ̀ ga-abụ na Chineke ajụla ndị Juu? Mba! Ana m asị mba nꞌihi na mụ onwe m bụkwa onye Juu. Abụ m nwa nwa Eberaham, bụrụkwa onye si nꞌagburu Benjamin pụta. Chineke ajụbeghị ndị ya ọ họpụtara site na mmalite ihe nile. Chetakwa ihe Chineke gwara Ịlaija mgbe ọ bịakwutere ya na-agwa ya banyere otu ndị Juu si gbuo ndị amụma na otu ha si dọtusịa ebe ịchụ aja Chineke. Ịlaịja gwara Chineke okwu sị, “Onyenwe m, ha egbuchaala ndị amụma gị nile, mebisịakwa ebe ịchụ aja gị nile, ma ọ bụ nanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.” *** Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? Chineke zara sị ya, “Amaara m nke ọma na ọ bụghị nanị gị fọdụrụ, nꞌihi na enwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nꞌanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nꞌala nye arụsị ọ bụla.” Otu a ka ọ dịkwa. Chineke ahọrọla mmadụ ole na ole zọpụta ha nꞌihi obi ebere ya. Ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌobi ebere Chineke mgbe ahụ nzọpụta abụghị site nꞌọrụ ọma ha rụrụ. Nꞌihi na ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌọrụ ọma ha amara Chineke agaghị abụkwa onyinye a na-anata nꞌefu. Ya mere, nke a bụ ọnọdụ ihe nile. Ndị Juu ji ike ha nile na-achọ Chineke, ma ha enweghị ike ịchọta ya. Ụfọdụ nꞌime ha achọtala ya, ndị ahụ Chineke nꞌonwe ya họpụtara nꞌetiti ha site na mmalite. Ma Chineke emeela ka obi ndị ọzọ gbaa itiri. Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, “Chineke emeela ka ha bụrụ ndị na-arahụbiga ụra oke. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe: o mere nke a tutuu ruo taa.” Devidi nꞌọnwe ya kwukwara okwu sị, “Ka ihe oriri ha ghọọrọ ha igbudu na ọ̀nya, ha bụrụkwa ndị na-asụ ngọngọ na ndị ahụhụ bịakwasịrị. Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha ghara ịhụ ọzọ. Ka ha bụrụ ndị azụ ha gaehuru ehuhu, ka ha huru ehuru naagagharị ruo mgbe ebighị ebi.” Nke a ò gosiri na Chineke ajụla ndị Juu ruo mgbe ebighị? Mbaa! Kama nzube Chineke bụ na ọ ga-esite nꞌọdịda ndị Juu mee ka nzọpụta ruo ndị mba ọzọ aka. Ọ chọkwara ka nnabata a ga-anabata ndị mba ọzọ kpalie mmụọ ekworo ndị Juu ịchọrọ onwe ha nzọpụta ahụ. Nꞌezie, ọ bụrụ na e mere ka ngọzi pụrụ iche rute ụwa nile aka nꞌihi na ndị Juu mehiere, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye nꞌime mmụọ ha mere ka ndị mba ọzọ keta oke na ngọzi ahụ dị ukwuu, ngọzi babigara ụba oke ọ̀ gaghị adị mgbe a gụnyekọrọ ọnụ ọgụgụ ndị Juu ahụ nile a ga-azọpụta? Geenụ ntị, unu ndị mba ọzọ, matanụ nke ọma na Chineke họpụtara m ịbụ onyeozi Kraịst nye unu. Ana m anyakwa isi nꞌihi ya. Nꞌihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nꞌụzọ a kpasuo ekworo ụfọdụ ndị Juu, ka e site nꞌekworo ha zọpụta ụfọdụ nꞌime ha. Ọ bụrụ na ọ bụ site nꞌọjụjụ a jụrụ ndị Juu ka e si mee ka ụwa na Chineke dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ gaghị adị ka ebe ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie ọzọ? Ebe ọ bụkwa na ibiribe achịcha e ji chụọra Chineke aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ achịcha ahụ nile bụ ihe dị nsọ. Nꞌihi na ọ bụru na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa alaka ya ga-adịkwa nsọ. Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, bụ ndị Juu, werekwa unu bụ ndị mba ọzọ, ndị bụ alaka osisi ọhịa nyapagide nꞌọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola ndị Juu keta oke na ngọzi nile dịrị ha. Ma unu ekwesịghị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dọchie nꞌọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ nanị alaka dị nꞌosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu. Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo sị, “Ma a nyakapụrụ ha nꞌihi na a chọrọ ka ohere dịrị ebe a ga-anyapagide anyị.” Nke ahụ bụ eziokwu. Ma cheta na a nyakapụrụ ha nꞌihi na ha enweghị okwukwe. Ma ị nọ nꞌebe ahụ nꞌihi na i kweere. Ya mere anyala isi banyere ọnọdụ gị, kama tụọ egwu. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka nke osisi ahụ wapụtara nꞌonwe ya ebere, ọ pụkwara iwepụ gị. Lee otu Chineke si bụrụ onye na-eme ebere na onye na-adịghị eme ebere. Ọ bụ nanị ndị na-adịghị erubere ya isi ka ọ na-emesi ike, ma ọ na-enwe obi ebere nꞌebe ndị ahụ na-anọgịde nꞌime obi ebere ya. Ọ bụrụ na unu anọgideghị nꞌobi ebere ya, ọ ga-anyakapụkwa unu. Otu aka ahụ, ọ bụrụ na ndị Juu ahụ e bipụrụ nꞌihi enweghị okwukwe emesịa bụrụ ndị kweere na Chineke, a ga-anyapagidekwa ha dị ka alaka osisi ahụ. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke weere unu bụ alaka osisi ọhịa nyapigide unu nꞌosisi ọma ya ahụ, gịnịkwanụ ga-egbochi Chineke ịnabata ndị Juu, mee ka ha laghachi azụ nꞌosisi ahụ e si nyakapụ ha. Bikonụ ụmụnna m, achọrọ ka unu mata eziokwu Chineke a dị omimi, ka unu ghara isite nꞌọnọdụ unu bido na-anya isi. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu na-edo onwe ha imegide ozi ọma ahụ ugbu a, ma omume dị otu a ga-adịgide nanị ruo nꞌoge ọnụ ọgụgụ ndị mba ọzọ a na-anabata zuru. Mgbe ahụ a ga-azọpụta Izirel. Nꞌihi na nke a bụ ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye nzọpụta ga-esi na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka ndị Juu nile site na ndụ ekweghị na Chineke tụgharịa. Nke a bụkwa ọgbụgba ndụ m nke ga-adịrị ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha nile.” Ugbu a, ndị Juu bụ ndị iro ozi ọma ahụ. Ha kpọrọ ya asị. Ma ịkpọ asị ha kpọrọ ozi ọma a bụ nꞌihi ọdịmma unu, ndị mba ọzọ. Ma ebe ha bụ ndị dị iche a họpụtara, Chineke ka hụkwara ha nꞌanya nꞌihi nkwa ahụ o kwere Eberaham, Aizik na Jekọb. Nꞌihi na Chineke agaghị ala azụ nara mmadụ onyinye ọ bụla o nyere ya. Otu a kwa, ọ gaghị ahapụ imezu nkwa ọ bụla o kwere mmadụ. Chetakwanụ ihe unu bụ na mbụ, ndị na-enupụ isi nꞌebe Chineke nọ. Ma mgbe ndị Juu jụrụ onyinye Chineke nyere ha, Chineke chigharịrị meere unu ebere. Otu a ka ọ dịkwa ndị Juu taa. Ha bụ ndị na-enupụ isi ugbu a, ma otu ụbọchị ha gaesoro unu keta oke nꞌebere Chineke. Nꞌihi na Chineke enyefeela onye ọ bụla nꞌaka mmehie, ka o si otu a gosi mmadụ nile obi ebere ya. Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya si dị ukwuu! Ònye pụrụ ịghọta nzube ya nile, na ụzọ o si eme ihe o zubere ime? Ònye maara uche Chineke? Ònye maara ihe ruo ogo ịdụ Chineke ọdụ? Ònye ka mmadụ ahụ bụ, onye pụrụ inyeju Chineke onyinye aka, nke ga-eme ka Chineke meere ya ihe ọ chọrọ? Nꞌihi na Chineke kere ihe nile. Ihe nile na-adịkwa ndụ site nꞌike ya. Ihe nile dịkwa inye ya otuto. Ka otuto dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi! Amin. Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu. Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke. Dị ka onyinye amara Chineke nyere m si dị, ana m adọ onye ọ bụla nꞌime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nꞌechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesị. Kama jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dị ka okwukwe Chineke nyere unu ha. Dị ka anyị nile nꞌotu nꞌotu si nwee anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, otu a ka ọ dịkwa nꞌanụ ahụ Kraịst. Ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma anyị nile bụ otu anu ahụ e jikọtara ya na Kraịst. E sikwa otu a jikọtaa anyị nile nꞌotu nꞌotu, dị ka akụkụ dị iche iche nke dị nꞌotu anụ ahụ. Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nꞌamara nye anyị. Ọ bụrụ na onyinye gị bụ onyinye ibu amụma, buo amụma dị ka okwukwe i nwere ha. Ọ bụrụ na onyinye Chineke nyere gị bụ ijere ndị ọzọ ozi, mee ya, mezie ya emezie. Ọ bụrụkwa na onyinye nke gị bụ izi ihe, were obi dị umeala zie ha. Onyinye gị bụrụ ịgba ndị mmadụ ume site nꞌikwusa okwu Chineke, biko mee ya nꞌụzọ ndị ọzọ gaesi nata inyeaka. Ọ bụrụkwanụ na onyinye gị bụ inye ndị nọ na mkpa ụfọdụ nꞌime ihe i nwere, gbasapụ aka nye ha. Ọ bụrụ na i nwere onyinye ịbụ onyendu, kpachapụ anya duzie ndị i na-edu. Ka ndị Chineke nwere onyinye inwe obi ebere nꞌebe ndị mmadụ nọ, jiri obi ọcha zipụta onyinye ha. Egosila ndị mmadụ na ị hụrụ ha nꞌanya mgbe ị maara nꞌobi gị na ị hụghị ha nꞌanya. Ka ịhụnanya bụrụ ihe si gị nꞌobi pụta. Kpọọ ihe ọjọọ nile asị, guzosie ike ime ihe nile dị mma. Hụrịtanụ onwe unu nꞌanya dị ka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụrụkwanụ ibe unu. Abụla onye umengwụ nꞌọrụ gị. Kama were obi na-anụ ọkụ na-ejere Chineke ozi mgbe nile. Nweenụ obi aṅụrị nꞌihi ihe nile Chineke na-akwado imere unu. Nweenụ ntachi obi nꞌime nsogbu, na-ekpesikwanụ ekpere ike. Ọ bụrụ na ụmụnna unu nꞌime Kraịst anọọ na mkpa, meenụ ka ha keta oke nꞌihe unu nwere. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa nke ọma. Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ gị, abụla ya ọnụ, kama kpeere ya ekpere. Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soro ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nꞌakwa soro ha bee akwa. Soronụ ndị ọzọ biri nꞌudo. Anyala isi, kama wedata onwe gị ala. Jirikwa ọṅụ mee ka gị na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe nile. Bie ndụ ga-egosi ndị mmadụ na ị bụ onye Kraịst. Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo. Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.” Kama, ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie. Nye ya mmiri, ma ọ bụrụ na ọ chọọ ịṅụ mmiri. Nꞌịhi na ọ bụrụ na ị na-eme otu a, ọrụ ọma gị ga-eme ka ihere mee ya mgbe o chetara ihe ọjọọ o mere gị. Ekwela ka ihe ọjọọ na-achị gị, kama site nꞌezi ọrụ ị na-arụ merie ihe ọjọọ nile. Ruberenụ ndị na-achị achị isi nꞌihi na ọ bụ Chineke tọrọ ntọ ala ọchịchị nile dị nꞌụwa taa. Ọ dịghị ọchịchị gọọmentị dị, ma ọ bụghị nke Chineke tọrọ ntọ ala ya. Ya mere ndị ọ bụla na-eguzo imegide ọchịchị ọ bụla, na-emegide Chineke. Ọ na-ewetakwara ha ikpe ọmụma. Ndị na-achị achị anaghị esogbu ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Kama ọ bụ ndị mehiere iwu ka ha na-ahụ. Nꞌihi na onye na-emeghị ihe, ihe anaghị eme ya. Ọ bụrụ na ị chọghị ka e sogbuo gị, mee ihe iwu chọrọ. Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ. Nꞌihi nke a, rube isi nꞌiwu gọọmentị nile, na iwu ndị na-achị achị nyere. Ọ bụghị nanị nꞌihi na Chineke ga-esite nꞌaka ha taa onye na-erubeghị isi ahụhụ, kama ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị mee. Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka unu ga-eji tụọ ụtụ taksi unu nꞌoge, ka ndị ọrụ gọọmentị nwee ike nọgide na-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere ha ịrụ. Kwụọnụ ụgwọ ọ bụla unu ji, ọ bụrụ na ị tụbeghị ụtụ taksi gị, gaa tụọ ya. Ruberenụ ndị isi unu isi. Sọpụrụnụ ndị nsọpụrụ ruru, ma na-akwanyerenụ ndị nkwanye ugwu ruru. Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ. Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị. O nweghị onye na-echere onye ọ hụrụ nꞌanya echiche ọjọọ. Ọ bụ nke a mere ịhụnanya ji bụrụ idebezu iwu nile. Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya na-abịa nso. Ya mere, sitenụ nꞌụra bilie! Ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Nꞌezie ọ dị nso karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ. Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ, mgbe Kraịst ga-alọghachi. Ya mere, wezuganụ ọrụ ọjọọ nile nke ọchịchịrị, yikwasịkwanụ onwe unu ihe agha nke ezi ndụ, ụdị nke ndị bi nꞌihè kwesịrị iyiri. Bụrụnụ ndị dị ọcha, na ndị na-ekwu eziokwu nꞌihe nile, ma ọ bụ nꞌehihie ma ọ bụkwanụ nꞌabalị. Unu atụfula oge unu ịkpọ oke oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ịkwa iko. Ndụ rere ure, esemokwu, ịlụ ọgụ na ekworo, bụ ihe unu na-ekwesịghị ịtụfu oge unu nꞌime ha. Kama yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka o nyere unu aka ibi ezi ndụ. Ka ihe unu na-eche nꞌobị unu hapụ ịbụ otu unu ga-esi na-eme ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ mmehie unu. Nabatanụ ụmụnna ndị akọnuche ha na-esogbu ma ha soro ndị ọzọ okwukwe ha siri ike mee ihe ha na-eme. Unu ekwujọla ha, nꞌihi na ụzọ ha si ele ihe anya abụghị ụzọ unu si ele ya. Nꞌihi na, dị ka ịma atụ, ọ dị ndị okwukwe ha siri ike, ndị kweere na ha nwere ike iri anụ ọ bụla. Ọ dịkwa ndị ọzọ okwukwe ha na-esighị ike ndị na-eri nanị ahihia nri. Onye ahụ kpebiri nꞌobi ya iri ihe nile ekwesịghị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ kpebiri na ya agaghị eri ihe nile ekwesịghị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nꞌihi na Chineke anabatala onye ahụ. Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nꞌihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike. E nwekwara ụfọdụ ndị Kraịst ndị na-eche na ọ dị otu ụbọchị dị nsọ karịa ụbọchị ndị ọzọ, ma ndị ọzọ na-eche na ụbọchị nile bụ nke Chineke. Nꞌụdị okwu dị otu a, ọ dị mma ka onye ọ bụla kpebiere onwe ya. Ọ bụrụ na o nwere ụbọchị dị iche ị họpụtara dị ka ụbọchị dị nsọ karịa ibe ya, gaa nꞌihu mee ihe ị na-eme nꞌihi na ọ bụ otuto ka ị naenye Chineke. Ọ bụrụkwa na i kpebie nꞌobi gị ịta anụ ọ bụla e ji chụọra arụsị aja, gaa nꞌihu nꞌihe ị na-eme, ọ bụ ihe ziri ezi ka ị na-eme, ebe i nyere Chineke ekele nꞌihi anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na ị jụ iso taa ụdị anụ ahụ, i mere nke ọma, nꞌihi na echiche obi gị bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị ikpebi ma anyị ga-adị ndụ ma ọ bụ na anyị ga-anwụ. Ọ bụ nanị Chineke ka ọ dịrị ime ka anyị dị ndụ. Ọ bụkwa ya ga-eme ka anyị nwụọ. Ma anyị na-adị ndụ, ma ọ bụ na anyị na-anwụ anwụ, anyị bụ nke Chineke. Ọ bụ nꞌihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe anyị nꞌọnọdụ ọ bụla anyị nọ, ma ọ bụ na ndụ, ma ọ bụ nꞌọnwụ. Ya mere, o kwesịghị ka i kwujọọ nwanna gị. O kwesikwaghị ka i leda ya anya. Nꞌihi na anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Chineke nꞌụbọchị ahụ ọ ga-ekpe ụwa ikpe. Nꞌihi na Chineke kwuru nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ebe m na-adị ndụ, mmadụ nile nꞌotu nꞌotu aghaghị igbu ikpere nꞌala nye m. Mmadụ nile ga-ekwupụtakwa mmehie ha nꞌihu m.” Ee, anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nꞌihu Chineke. Ya mere kwụsị ikwujọ nwanna gị, kwụsị ikpe ya ikpe. Kama gbalịa hụ na i biri ndụ gị nꞌụzọ ga-eme ka nwanna gị hapụ ịsụ ngọngọ, mgbe ọ na-ahụ gị ka ị na-eme ihe ahụ o chere nꞌobi ya na ọ bụ mmehie. Ma nꞌụche m, ana m ekwukwa ya nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya na nri ọ bụla adịghị nke mmadụ na-ekwesịghị iri. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie na ụfọdụ nri adịghị mma oriri, nri dị otu a bụụrụ onye ahụ nri na-adịghị ọcha. Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nꞌanya ma ị gaa nꞌihu nọgide na-eri ihe ahụ. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe gaewetara nwanna gị ịla nꞌiyi, nꞌihi na cheta na ọ bụkwa nꞌihi ya ka Kraịst ji bịa nwụọ. A sịkwarị na ihe ị na-eme dị mma, emela ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ kwujọọ gị. Nꞌihi na ihe dị mkpa na ndụ onye Kraịst abụghị ihe anyị riri, ma ọ bụ ihe anyị ṅụrụ. Kama ọ bụ ime ka ezi omume, na udo, na ọnụ na-esi nꞌaka Mmụọ Nsọ abịa dịrị na-aga nꞌihu. Nꞌihi na ọ bụrụ na i nye Kraịst ohere ka ọ bụrụ onye ga-ekpebi ụdị omume ị ga-eme, obi ga-atọ Chineke ụtọ, ndị mmadụ ga-ahụkwa ya nꞌime gị. Ka ihe naagụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe gaeweta udo na ime ihe nꞌụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu. Emebila ọrụ Chineke rụrụ nꞌihi ihe oriri. Cheta na nri nile dị ọcha dịkwa mma, ma erila nke ọ bụla ga-eme ka mmadụ mee mmehie. Nꞌezie, ọ ga-aka mma ịhapụ iri ihe nile ga-eme ka nwanna anyị nwee obi ọjọọ, ma ọ bụ daba nꞌime mmehie. Ka okwukwe i nwere banyere ihe dị mma oriri dịrị nꞌetiti gị na Chineke. Egosila ya nꞌebe ọ ga-ewute ndị ọzọ, na mmụọ ha. Ngọzi na-adịrị onye na-adịghị emehie nꞌihi na ọ maara na ihe bụ ezi ihe. Ma onye ahụ maara na ihe ọ na-achọ ime bụ ihe ọjọọ ekwesịghị ime ya. Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ emee ya, ọ bụụrụ ya mmehie. Nꞌihi na ihe ọ bụla na-esiteghị nꞌokwukwe bụ mmehie. Ya mere, ka anyị nile ndị okwukwe ha siri ike hapụ ichefu na anyị ka ọ dịrị inyere ndị okwukwe ha na-esighị ike aka. Anyị ekwesịghị ime nanị ihe na-atọ anyị ụtọ. Ka onye ọ bụla nꞌime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbata obi ya ụtọ. Ka anyị na-eme ihe ga-enyere ha aka, na ihe ga-ewuli okwukwe ha elu nꞌime Onyenwe anyị. Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya emeghị ihe tọrọ onwe ya ụtọ, kama dị ka onye dere akwụkwọ Abụ ọma si gwa anyị, “Ọ bịara ka ịta ụta nile na mkparị nile nke ndị na-emegide Chineke dakwasị ya!” Ihe ndị a nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ nꞌoge gara aga bụ maka izi anyị ntachi obi, na ịgba anyị ume. Ka anyị site na ha na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ Chineke ga-ala ike mmehie na ọnwụ nꞌiyi. Ka Chineke, onye na-enye ntachi obi, onye na-agbakwa ndị na-ada mba ume, nye unu mmụọ nke ịdị nꞌotu, ka unu nwee ike ibi nꞌudo, ka unu nweekwa ike mesoo ibe unu ụdị mmeso ahụ Kraịst mesoro anyị. Nꞌihi na nke a ga-eme ka unu nile jikọtaa obi unu, na olu unu nꞌotu, inye Chineke nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto. Ya mere, ọ bụ ihe dị mma na unu ga na-akpọbata onwe unu dị ka Kraịst si kpọbata unu. Nke a ga-ewetara Chineke otuto. Chetakwanụ na Kraịst bịara igosi anyị na Chineke bụ onye na-emezu nkwa o kwere. Chetakwa na ọ bịakwara inyere ndị Juu aka. Chetakwa na ọ bịara ime ka ndị mba ọzọ bụrụ ndị Chineke ga-anabata, ndị ga-eto Chineke nꞌihi obi ebere ya o gosiri ha. Nke a bụ ihe onye dere akwụkwọ Abụ Ọma bu nꞌobi mgbe o dere sị, “Aga m eto aha gị nꞌetiti ndị mba ọzọ. Aga m abụ abụ otuto nye aha gị.” Ọzọ kwa, o kwukwara sị, “Unu ndị mba ọzọ, soronụ ndị Chineke nile ṅụrịa ọṅụ.” Nꞌebe ọzọ kwa, o dekwara sị, “Toonụ Chineke, unu ndị mba ọzọ, gwakwanụ mmadụ nle ka ha na-aja ya mma.” Aịzaya onye amụma dekwara nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ọ dị onye a gaamụ nꞌezinụlọ Jeesi, onye ga-abụ onye ga-eketa alaeze Devidi. Ọ ga-abụ onye ga-achị ụwa nile. Ndị mba ọzọ gaenwekwa nchekwube na olileanya nꞌime ya.” Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu. Amaara m, ụmụnna m, na unu jupụtara nꞌezi ndụ, na mmụta. Amakwaara m, na unu maara ihe ndị a nile ruo izi ya ndị ọzọ. Ma ana m ede ụfọdụ ihe ndị a nꞌakwụkwọ nꞌihi na amaara m na ihe dị mkpa bụ nanị ime ka unu cheta ha. Nꞌihi na site nꞌamara ahụ Chineke nyere m, abụ m onyeozi Kraịst; ọrụ pụrụ iche e nyere m bụ igbasara ndị mba ọzọ ozi ọma, na iche ha nꞌihu Chineke dị ka aja dị ụtọ nke Chineke ga-anabata. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ emeela ka unu bụrụ ndị dị ọcha, ndị ihe ha na-atọ Chineke ụtọ. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ m mere, ma ọ bụrụ na m anya isi nꞌọrụ ahụ nile Kraịst rụrụ site nꞌaka m. Ọ bụghị m ka ọ dịrị ikwu otu Kraịst si jiri ndị ọzọ rụọ ọrụ ya. Ma nꞌihe banyere mụ onwe m, amaara m na Kraịst esitela nꞌokwu ọnụ m, na ihe ndị ọzọ m mere mee ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke, ka ha bụrụ ndị na-erubere ya isi. Emeela m ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke site na nkwusa m, site nꞌụdị ndụ m biri nꞌetiti ha, na sitekwa nꞌọrụ ịrịba ama nile m rụrụ nke ha hụrụ, bụ ọrụ m rụrụ site nꞌike Mmụọ Nsọ Chineke. Nꞌụzọ dị otu a emezuola m ihe Chineke chọrọ ka m mee, site nꞌikwusa ozi ọma Kraịst site na Jerusalem ruo nꞌobodo Ilirikum. Ma ọ na-agụsikwa m agụụ ike ịga nꞌihu ikwusa ozi ọma Kraịst, karịsịa, nꞌebe ọ bụla ndị mmadụ na-anụbeghị ihe banyere ya. Nꞌihi na achọghị m ịrụ ọrụ nꞌebe onye ọzọ tacharala ahụhụ. Kama, ana m eso ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ka ndị a na-agwabeghị ihe banyere ya, jiri anya ha hụrụ, ka ndị na-anụbeghị nụrụ, ghọtakwa.” Nꞌezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu. Nꞌihi na ọ dịla anya kemgbe m bidoro ịpịa na m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a ọrụ m nwere nꞌakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a. Nꞌihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọ bụla m gaagakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na Rom ka mụ na unu nọọ. Emesịakwa unu edupụ m nꞌije m. Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem iwejere nzukọ ndị Juu nọ nꞌebe ahụ onyinye. Nꞌihi na nzukọ Kraịst dị na Masidonia, na Akaịa, tụkọrọ ego ha chọrọ ka e nye nzukọ Kraịst dị na Jerusalem, iji inyere ha aka nꞌọnọdụ mkpa ha ugbu a. Ha ji ọṅụ nye onyinye ndị a nꞌihi na o metụrụ ha nꞌobi na o kwesịrị ka ha nyere nzukọ Kraịst dị na Jerusalem aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ site nꞌaka ndị Juu ka ha si nata ngọzi nile nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nꞌakụ na ụba ha nwere nyere ndị Juu aka na mkpa ha. Mgbe m wegachara onyinye a, mee ka o ruo ndị nwe ya aka, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen. Ọ bụkwa olileanya m na mgbe m bịara, Chineke ga-esite nꞌaka m wetara unu ngọzi dị ukwuu. Esi m nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nꞌime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m kpee ekpere, na-echeta m nꞌekpere unu nꞌihu Chineke. Biko, rịọnụ Chineke ka ọ zọpụta m nꞌaka ndị na-amaghị ya nọ na Jerusalem. Kpeekwanụ ekpere ka Chineke mee ka ndị Kraịst ahụ anyị na-ewegara onyinye a jiri obi ọma nata ya. Nke a ga-eme ka m nwee ike iji ọṅụ bịakwute unu, ka mụ na unu gbarịtaa onwe anyị ume. Ugbu a ka Chineke anyị onye na-enye udo, nọnyere unu nile. Amin. Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị nwanyị, Fibi, ezi onye Kraịst si na chọọchị dị nꞌobodo Sinkria, ga-abịa ịhụ unu na Rom na mgbe na-adịghị anya site ugbu a. Biko nabatanụ ya nꞌime Onyenwe anyị dị ka nwanne aka unu. Nyekwaranụ ya aka nꞌụzọ nile unu nwere ike, nꞌihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị Kraịst ọzọ aka. Kelere m Prisilia na di ya Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs. Nꞌezie, mmadụ abụọ a nyeere m aka na-ajụghị ajụjụ ihe gaadakwasị ha. Ọ bụkwaghị nanị m na-ekele ha, kama nzukọ Kraịst dị na mba ọzọ nile na-ekelekwa ha. Biko kelekwaranụ m ndị nile naezukọ nꞌụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyị m Epinetus. Nwoke a bụ onye bu ụzọ nabata Kraịst nꞌobi ya, nꞌakụkụ Esia nile. Keleerenụ m Meri, onye unu maara na-arụsi ọrụ ike inyere anyị aka. Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nꞌụlọ mkpọrọ. Ndị ozi nile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst. Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nꞌanya nꞌime Onyenwe anyị. Ya na Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyị m. Otu a kwa, keleekwa Apelis onye ihe ya dị Kraịst mma, na ndị nile na-arụ ọrụ nꞌụlọ Aristobulọs. Keleere m nụ Herodian onye ikwu m. Keleekwanụ ndị bi nꞌụlọ Nasisọs. Ha bụ ndị Chineke. Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa nꞌihi na ụmụ nwanyị ndị a na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleekwanụ Pesis, onye a hụrụ nꞌanya na onye na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleere m Rufọs onye Chineke nꞌonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne. Ana m ekele unu Asinkritọs, Elegọn, Hamis, Patrobas, Hamas na ụmụnna anyị nile ndị ha na ha bi. Keleere m nụ Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị Kraịst nile ha na ha nọ. Werekwanụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịtaa onwe unu. Nzukọ Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekelekwa unu. Ugbu a, ụmụnna m, o nwere otu ihe ọzọ m chọrọ ịgwa unu tupuu m mechie akwụkwọ ozi a. Wezuganụ onwe unu site nꞌebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, ndị na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nꞌihi ozizi ha na-ezi banyere Kraịst nke megidere ihe ahụ nile e ziri unu. Ndị ozizi dị otu a abụghị ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ nanị nꞌihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike. Obi dị m ụtọ nꞌihi na mmadụ nile maara na unu bụ ndị guzosiri ike nꞌeziokwu, bụrụkwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ma achọrọ m ka unu nọgide na-abụ ndị maara ihe bụ ezi ihe, na ndị aka ha na-adị ọcha nꞌebe ihe ọjọọ nile dị. Mgbe na-adịghị anya, Chineke onye na-enye udo ga-azọpịa ekwensu na ndị ọrụ ya nꞌokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. Yenwe anyị Jisọs dịnyere unu. Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sospata, ndị ikwu m na-ekele unu. Mụ onwe m bụ Taitọs, ode akwụkwọ Pọl, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nꞌaha Onyenwe anyị. Gayọs, onye m nọ nꞌụlọ ya, na onye na-elekọta m, na-ekele unu. Otu a kwa, ndị nile naezukọ nꞌụlọ ya na-ekelekwa unu. Irastọs, onye na-eche ego ndị obodo a na nwanna anyị nwoke, na-ekelekwa unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu nile. Amin. Ugbu a, ana m enyefe unu nꞌaka Chineke onye pụrụ ime ka unu guzosie ike, dị ka ozi ọma ahụ anyị na-ekwusa kwuru, na dị ka ihe m gwara unu si dị. Nke a bụ ụzọ Chineke họpụtara a ga-esi zọpụta ndị mba ọzọ, ụzọ dị omimi nke e zoro ezo oge ndị a nile. Ugbu a, ekpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè, dị ka ndị amụma dere nꞌakwụkwọ nsọ na a ga-eme. A na-ekwusakwa ozi ọma a nꞌebe nile ka mmadụ nile nọ nꞌụwa kwere na Kraịst, ma tụkwasịkwa obi ha na ya. Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye nanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site nꞌaha Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. Amin. Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onye e sitere nꞌọchịchọ Chineke kpọọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Nwanne m nwoke Sostenis sokwa m na-ede akwụkwọ a. Ọ bụ unu ka m na-edetara akwụkwọ a, unu nzukọ Chineke dị na Kọrint, ndị Chineke kpọrọ ka unu bụrụ ndị nke ya, ndị e mekwara ka unu site na Jisọs bụrụ ndị Chineke na-anabata. Anyị na-edekwara unu ndị Kraịst nile nọ nꞌebe nile akwụkwọ a, unu nile bụ ndị na-akpọku aha Jisọs Kraịst, dị ka Onyenwe anyị na Onyenwe unu. Ka Chineke nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara na udo nke na-esi nꞌaka ya na-abịa. Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m ekele Chineke ekele nꞌihi onyinye amara nile o nyere unu site na Kraịst Jisọs. Nꞌihi na Chineke emeela ka unu baa ụba nꞌụzọ nile, ebe ọ bụ na unu na Kraịst bụ otu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu nile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwuwapụta okwu banyere ozi ọma ya. Ihe ahụ m gwara unu na mbụ emezuola! Ozi ọma Kraịst Jisọs agbaala mgbọrọgwụ nꞌime unu. Nꞌihi na ugbu a, Chineke enyela unu amara ya na ngọzi ya nile. O nyekwala unu onyinye Mmụọ Nsọ nile na ike dum unu chọrọ iji mee ihe na-atọ ya ụtọ. Chineke nyere unu ihe ndị a nile ugbu a unu nọ na-ele anya ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ bụkwa Chineke ga-echebe unu ruo ọgwụgwụ, meekwa ka unu bụrụ ndị a ga-agụ dị ka ndị ezi omume nꞌụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-ekpe ụwa nile ikpe. Chineke nꞌonwe ya ga-emere unu nke a. Nꞌihi na ọ bụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ bụkwa Chineke kpọbatara unu nꞌọnọdụ ahụ nke unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ ugbu a na-enwe mmekọrịta. Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu. Nꞌihi na ụmụnna m, esi m nꞌọnụ ndị si nꞌezinụlọ Kloyi bịara nꞌebe a nụrụ na esemokwu dị nꞌetiti unu. Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nꞌetiti unu. Na ụfọdụ nꞌime unu na-anya isi na-agwa ibe ha sị, “Abụ m onye na-eso Pọl.” Ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”, ndị ọzọ kwa na-asị, “Ana m eso Pita”, ma ndị ọzọ na-asị kwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso”. Mgbe unu na-eme ihe ndị a, ihe pụtara ìhè bụ na unu ekewasịala Kraịst, mee ka ọ dị ọtụtụ. Ma ka m jụọ unu, Kraịst, ọ̀ dị abụọ? Ọ̀ bụ mụ onwe m bụ Pọl ka a kpọgidere nꞌobe nꞌihi unu? Ọ̀ dị onye e mere baptizim nꞌetiti unu baa nꞌaha Pọl? Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọ bụla nꞌime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gatọs. Nꞌihi na nke a ga-eme ka onye ọ bụla ghara ikwu na e mere unu baptizim ka unu bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Ahaa! Echetara m na emekwara m Stevanas na ezinụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nꞌonwe m. Nꞌihi na Kraịst eziteghị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa ozi ọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta mmadụ nke ga-eme ka ike ahụ dị na nkwusa ozi ọma nke obe Kraịst, bụrụ ihe efu. Nꞌanya ndị na-efu efu, ozi ọma Kraịst bụ ihe nzuzu ma nꞌanya ndị a na-azọpụta azọpụta, ọ bụ ike Chineke. Chineke kwuru nꞌakwụkwọ nsọ sị “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe ạga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.” Mgbe Chineke mere ihe dị otu a, gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị amamihe, ndị mụrụ akwụkwọ na ndị nrụrịta ụka nke ihe ọmụma ụwa a? Chineke emeela ka amamihe ha na oke mmụta ha bụrụ ihe efu. Chineke sitere nꞌamamihe ya chọpụta na ụmụ mmadụ enweghị ike ịmata onye ọ bụ site nꞌoke mmụta ha. Ọ bụ nke a mere o ji webata ụzọ ọ ga-esi zọpụta ndị ga-anabata ozi ọma ya. Ee, ụzọ ozi ọma a anyị na-ekwusa, nke ndị mmadụ na-akpọkwa ihe nzuzu. Ozi ọma a bụ ihe nzuzu nye ndị Juu nꞌihi na ha chọrọ ịhụ ihe ịrịba ama na mbara eluigwe nke ga-egosi ha na ozi ọma a bụ eziokwu tupuu ha ekwere. Ọ bụ ihe nzuzu nye ndị mba ọzọ, nꞌihi na ihe ha na-anabata bụ nanị ozizi nke ya na usoro oke mmụta ha na-adakọta. Ma anyị na-ekwusa na-asị na Kraịst nwụrụ nꞌelu obe ịzọpụta ha site na mmehie ha, okwu a na-ewe ndị Juu iwe, ma na ntị ndị mba ọzọ ọ dị ka okwu nzuzu. Ma Chineke emegheela anya ndị nile ọ kpọrọ, ka ha hụ na Kraịst bụ ike dị ukwuu nke Chineke ji azọpụta ha. Kraịst nꞌonwe ya bụkwa onye Chineke sitere nꞌime ya gosi amamihe ya. Ugbu a ihe ahụ ndị mmadụ kpọrọ nzuzu Chineke, aghọọla ihe karịrị amamihe nile nke ndị mmadụ mma. Ihe ahụ ha chekwara na ọ bụ adịghị ike Chineke, nꞌihi ọnwụ Kraịst nwụrụ nꞌobe, aghọọkwala ihe karịrị ike mmadụ nile. Ma chetakwanụ ihe unu bụ tupuu Chineke akpọọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nꞌime unu bụ ndị maara ihe, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nꞌobodo. Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dị ka ihe nzuzu, ihe na-abaghị uru, ka ọ masịrị Chineke iji mee ka ihere mee ndị amamihe ahụ. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dị ka ihe na-adịghị ike ka Chineke ji mee ka ihere mee ndị dị ike. Nꞌihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru. Chineke mere nke a nꞌihi na ọ chọrọ ka anụ ahụ nile, bụ mmadụ, hapụ ịnya isi nꞌihi ihe ọ bụla, nꞌebe Chineke nọ. Nꞌihi na ọ bụ Chineke nanị mere ka unu nwee ndụ nꞌime Kraịst Jisọs, onye bụ mmụta anyị na amamihe anyị. Ọ bụ site na Kraịst ka anyị ji nwere onwe anyị, bụrụkwa ndị nsọ, na ndị Chineke zọpụtara. Ọ bụ nke a mere akwụkwọ nsọ ji kwuo sị, “Ka onye ọ bụla chọrọ ịnya isi nyaa isi nanị nꞌihe Chineke mere.” Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere unu na mbụ, gwa unu ihe banyere ozi ọma Chineke, ejighị m mmụta m na oke okwu megharịa unu anya. Nꞌihi na tupuu m bịa, ekpebiri m na nanị ihe m ga-eme bụ ikwuru unu ihe banyere Jisọs Kraịst na ihe banyere ọnwụ ya nꞌelu obe. Mgbe m bịakwara nꞌetiti unu, ọ bụ nꞌọnọdụ oke ụjọ na ahụ ịma jijiji ka m ji bịa. Ihe nile m ziri unu na ihe nile m kwusara, bụ ihe dịrị onye ọ bụla nꞌime unu mfe ịghọta. Ejighị m oke okwu na-ezipụta mmụta m, ma ọ bụ amamihe m gwa unu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ Chineke gbara okwu ndị ahụ nile m gwara unu ume, mee ka ọ pụta ìhè nye ndị nụrụ okwu ahụ, na ihe m kwuru bụ okwu Chineke. Ejighị m okwu na-ezipụta oke mmụta m gwa unu okwu, nꞌihi na achọghị m ka okwukwe unu dabere na mmụta mmadụ, kama ọ bụ ọchịchọ m ka okwukwe unu guzosie ike nꞌime Chineke. Otu ọ dị, mgbe ọ bụla m nọ na-ekwuru ndị okwukwe ha siri ike nꞌime Kraịst okwu, ana m eji okwu amamihe gwa ha okwu. Ma okwu amamihe nke m na-ekwu ihe banyere ya abụghị okwu amamihe nke ụwa a, ọ bụghị okwu amamihe nke na-atọ ndị ọkachamara ụwa a ụtọ, nꞌihi na ndị dị otu a aghaghị ịla nꞌiyi. Kama okwu anyị na-ekwusa bụ okwu amamihe, nꞌihi na o si nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ okwu nke na-akọwa nzube zoro ezo nke Chineke, nzube ahụ Chineke zubere tupuu o kee ụwa, iwebata anyị nꞌotuto ya nꞌeluigwe. Ọ dịghị ọkachamara ọ bụla nọ nꞌụwa a maara ihe banyere nzube a. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nꞌobe. Ọ bụ ihe a ka e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ndị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nꞌobi ya, na ọ bụ ihe ga-eme, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị nile hụrụ ya nꞌanya.” Ọ bụ nanị anyị ka Chineke kpugheere ihe omimi a; o sitere na Mmụọ Nsọ ya mee ka anyị mata ya. Mmụọ Nsọ Chineke bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo nile dị Chineke nꞌobi, ọ bụ ya na-egosikwa anyị ihe ha bụ. Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nꞌobi ya. Ọ bụ nanị mmụọ nọ nꞌime onye ahụ bụ onye maara ihe nile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya, ma ọ bụghị nanị Mmụọ Chineke nꞌonwe ya. Ma mmụọ nke anyị nwere abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ Chineke nyere anyị inyere anyị aka, ịmata onyinye amara nile Chineke nyere anyị. Mgbe anyị gwara unu okwu banyere onyinye ndị a, anyị ji okwu ahụ Mmụọ Nsọ tinyere anyị nꞌọnụ kwuo ya, ọ bụghị okwu nke anyị ji aka anyị họrọ site na mmụta anyị. Ya mere, ọ bụ okwu nke Mmụọ Nsọ tinyere anyị nꞌọnụ ka anyị ji kọwaa ihe gbasara Mmụọ Nsọ. Ma mmadụ ahụ mkpụrụ obi nke onwe ya na-achị enweghị ike ịnabatara onwe ya onyinye si nꞌaka Mmụọ Nsọ Chineke, nꞌihi na onye dị otu a adighị aghọta ihe ha bụ. Nꞌebe ọ nọ, ha bụ ihe nzuzu. Kama ọ bụ nanị ndị Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha na-aghọta ihe ọ bụla banyere Mmụọ Nsọ. Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọ bụla. Ụdị nghọta ọ na-enwe banyere ihe ọ bụla na-agba onye ụwa gharịị, na-agbagwoju ya anya, nꞌihi na onye ụwa enweghị ike ịghọta ụdị mmadụ ọ bụ. Ma onye ụwa ọ̀ ga-esi aṅaa ghọtakwanụ? Ò nweela oge ọ bụla o ji mata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya? Ò nweela mgbe o ji nwee ike ịdụ Chineke ọdụ ịgwa ya ihe ọ ga-eme? Ma dị ka o si dị, anyị bụ ndị nke Kraịst, nwere nꞌime anyị Mmụọ Kraịst. Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dị ka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nꞌime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dị ka ndị na-etozughị etozu nꞌime mmụọ, ndị bụ ụmụntakịrị nꞌime Kraịst. Ejighị nri siri ike na-azụ unu, kama eji m mmiri ara na-azụ unu, nꞌihi na unu apụghị iri nri dị ike. Nꞌezie, ọ bụladị ugbu a, unu erubeghị iri nri siri ike. Nꞌihi na unu na-adị ndụ dị ka ndị bi nꞌụwa, ndị ọchịchọ nke anụ ahụ na-enugharị. Ebe ọ bụ na ekworo na esemokwu na-adị nꞌetiti unu, nke a o zipụtaghị na unu na-eme dị ka ndị ụwa, dị ka ndị mmadụ efu nọ nꞌụwa. Nꞌihi na mgbe nkewa pụtara ìhè nꞌetiti unu ruo na ụfọdụ nꞌime unu na-asị, “Anyị bụ nke Pọl”, ndị ọzọ na-asịkwa, “Anyị bụ nke Apọlọs”, o gosighị na unu na-akpa agwa dị ka ndị bi nꞌụwa? Ma ka m jụọ unu ajụjụ, ònye ka m bụ? Ònye kwa ka Apọlọs bụ? Ọ̀ bụ na anyị abụghị ndị na-eje ozi, ndị wetaara unu ozi ọma unu kweere nꞌime ya. Ọrụ dị iche iche anyị rụrụ bụkwa nke anyị rụrụ dị ka Onyenwe anyị si kenye anyị ọrụ ahụ. Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ okwu Chineke nꞌobi unu, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, ma ọ bụ Chineke mere ka o too. Onye kụrụ mkpụrụ ahụ na onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri adịghị mkpa. Ọ bụ Chineke onye mere ka ha too dị mkpa. O nweghị ihe dị iche nꞌetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bụ nꞌobi. Chineke ka ọ dịrị ịkwụghachi onye ọ bụla nꞌime anyị dị ka ọrụ anyị si dị. Anyị so Chineke na-arụ ọrụ, dị ka a ga-asị na anyị na ya jikọtara aka nꞌọrụ ahụ. Unu onwe unu bụkwanụ ubi Chineke, bụrụkwa ụlọ ya a na-ewuli elu. Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọ ala ọrụ a, dị ka ezi onye ọka na-ese ihe osise ụlọ. Ugbu a onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. Ma ka onye ọ bụla kpachapụ anya otu o si ewu. O nweghị onye ọzọ pụrụ ịtọ ntọ ala karịrị ntọ ala ahụ e bururị ụzọ tọọ. Jisọs Kraịst bụkwa ntọ ala ahụ. Ma e nwere ọtụtụ ihe dị iche iche mmadụ pụrụ iji wuo ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. Ụfọdụ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụ ahịa wuo nke ha ṅdị ọzọ ga-eji osisi okporo ọka ma ọ bụ ahịhịa wuo nke ha. Ma otu ụbọchị na-abịa mgbe ọrụ nke onye ọ bụla rụrụ ga-apụta ìhè, ụbọchị ahụ a ga-anwapụta ụdị ihe anyị ji wuo ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. A ga-esite nꞌọkụ na-enwụsi ike wefee ọrụ nile onye ọ bụla rụrụ lee ọrụ ahụ ule, ịchọpụta ma ọrụ ahụ ọ ga-adịgide adịgide. Nꞌụbọchị ahụ, ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọ bụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nꞌelu ntọ ala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ. Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọ bụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nꞌiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma nzọpụta ahụ ga-adị ka a ga-asị na e si nꞌụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke. Ọ̀ bụ na unu aghọtakwaghị na Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime unu? Ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie ụlọ nsọ Chineke, Chineke ga-emibikwa onye ahụ. Nꞌihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ. Ya mere, ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu onwe ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu na-eche nꞌobi ya na ya bụ onye maara ihe, dị ka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ịghọ ewu, onye na-enweghị uche, kama amimihe ahụ o chere na o nwere ga-eme ya ka ọ hapụ ịnata ezi amamihe ahụ si nꞌelu na-abịa. Nꞌihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nꞌanya Chineke. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ọ bụ site nꞌihe ahụ mmadụ kpọrọ amamihe ya ka Chineke si ejide ya, mee ka ọ daa.” Ọzọ kwa, akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.” Nꞌihi nke a, ka onye ọ bụla ghara ịnya isi nꞌihi na ọ na-agbaso mmụta na amamihe mmadụ. Nꞌihi na Chineke enyela gị ihe nile dị gị mkpa. Chineke enyela unu Pọl, na Apọlọs, na Pita ka ha bụrụ ndị ozi unu. Chineke emeekwala ka ndụ, na ọnwụ bụrụ ndị na-ejere unu ozi. O nyela unu ihe nile dị taa, na ihe nile ga-adị nꞌoge dị nꞌihu ka ha bụrụ nke unu. Unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Chineke. Achọrọ m ka unu na-ele mụ na Apọlọs anya dị ka ndị na-ejere Kraịst ozi, ndị e nyefere nkọwa okwu omimi Chineke nꞌaka. Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesịrị ka odibo ọ bụla bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌọrụ ọ bụla e tinyere ya nꞌaka. Ọ bụghị m ka ọ dịrị ikwu na m bụ ezi odibo, ma ọ bụ ajọ odibo. Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m, ajụkwaghị m ajụjụ banyere ihe ndị ọzọ na-eche. Nꞌezie, anaghị m atụkwasịkwa uche nꞌihe akọnuche m na-ekwu banyere ọrụ m na-arụ. O doro m anya na akọnuche m adịghị ama m ikpe, ma nke a egosighị na m bụ onye na-eme ihe ziri ezi. Ọ bụ Onyenwe anyị nanị ka ọ dịrị inyocha ọrụ m, ikpebi ma m rụziri ọrụ m ma m arụzighị ya. Nꞌihi ya jienụ onwe unu aka ikpe onye ọ bụla ikpe tutuu oge ikpe eruo. Cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-abịa igbubi ikpe nile. Ọ ga-eme ka ihe nile ụmụ mmadụ na-eme ugbu a na nzuzo pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo dị ndị mmadụ nꞌobi nꞌanwụ. Mgbe ahụ onye ọ bụla ga-anatakwa nꞌotu nꞌotu, otuto ruuru ya site nꞌaka Chineke. Ụmụnna m, eji m onwe m na Apọlọs maara unu atụ ime ka unu mata na o kwesịghị ka unu lee mmadụ anya karịa ihe ọ bụ. Ka onye ọ bụla gharakwa iji otu onyeozi Chineke nyaa isi karịa ibe ya. Nꞌihi na gịnị mere i ji akpa nganga? Olee ihe i nwere nke ọ na-abụghị Chineke nyere gị ya? Ugbu a, ọ bụrụ na ihe nile i nwere si nꞌaka Chineke rute gị, gịnị na-ebu gị isi? Gịnị mere i ji eme dị ka ọ dị ihe ị pụrụ ime nꞌonwe gị? Ndụ unu na-ebi na-egosi na echiche unu bụ na unu enwezuola ihe nile dị unu mkpa. Ee, unu na-ebi ndụ dị ka ndị afọ juru nꞌihe nke Mmụọ. Unu na-ebi ndụ dị ka ndị eze, ndị nọkwasịrịla nꞌocheeze ha, ma anyị onwe anyị nọ nꞌezi. Nꞌezie, ọ gaara atọ ma a sị na unu anọrọla nꞌocheeze unu, nꞌihi na mgbe oge ịnọ nꞌocheeze ruru, ghọtanụ na anyị onwe anyị ga-anọkwa nꞌebe ahụ, iso unu ịchị achị. Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m nnọọ ka Chineke na-eme ka anyị bụ ndị ozi bụrụ ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta nanị mgbe ihe nile na-agwụsị agwụsị. Anyị dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ, ndị a na-akpọpụta nꞌihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. Okwukwe anyị kwere na Kraịst emeela ka anyị ghọọ ndị nzuzu nꞌihu unu, ma unu onwe unu bụkwa ndị Kraịst maara ihe! Lee ka anyị si bụrụ ndị na-adịghị ike, mgbe unu na-awụgharị dị ka agụ. Lee ka anyị si bụrụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-agụ dị ka ndị na-abaghị uru, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ! Tutuu ruo ugbu a anyị na-ebu ọnụ nꞌihi ahụghị ihe anyị ga-eri. Anyị na-ejegharị na-arụ ọrụ nꞌọnọdụ akpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-ekpere ha ekpere. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutuu ruo ugbu a a na-emeso anyị mmeso dị ka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dị ka ihe a jụrụ ajụ nꞌanya ndị ụwa. Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dị ka ụmụ m hụrụ nꞌanya. Ọ bụ ezie na ihe ruru puku mmadụ iri ọzọ nwere ike bịakwute unu izi unu ihe banyere Kraịst, ma chetakwanụ na ọ bụ nanị m bụ nna unu nwere. Nꞌihi na ọ bụ m kpọtara unu nye Kraịst mgbe m bịara kwusaara unu ozi ọma. Ya mere, arịọọ m unu, meenụ nzọ ụkwụ m ihe ịma atụ nye onwe unu. Ọ bụ nke a mere m ji ezitere unu Timoti ka ọ bịa nyere unu aka ime nke a. Nꞌihi na Timoti bụ ezi nwa m, onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-eme ka unu mata ihe nile m na-ezi nꞌụlọ nzukọ Kraịst nile m na-aga. Amaara m na e nwere ụfọdụ nꞌetiti unu ndị na-akpa nganga nꞌihi na enweghị m ike bịa leta unu. Ma site nꞌike Onyenwe anyị, aga m abịa ịhụ unu anya nꞌoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, aga m achọpụta ihe ndị ahụ na-akpa nganga pụrụ ime, ọ bụghị ihe ha nwere ike ikwu. Nꞌihi na ihe e ji amata ndị so nꞌalaeze Chineke abụghị oke okwu ha, kama ọ bụ site nꞌike Chineke dị nꞌime ha. Ya mere, unu ka ọ dịrị ịhọrọ nke unu chọrọ. Unu chọrọ ka m jiri ụtarị bịakwute unu, ka ọ bụ ka m jiri obi dị umeala na mmụọ nke ịhụnanya bịa? Ọtụtụ mmadụ agwala m ụdị ihe ọjọọ na-eme nꞌụlọ chọọchị unu. Ihe jọgburu onwe ya, nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. A gwara m na ọ dị otu nwoke nọ nꞌime ụlọ chọọchị unu onye ya na nwụnye nna ya na-akwa iko. Ugbu a, olee ihe bụ isi nganga unu? Ihe unu kwesịrị ime ọ̀ bụghị ịkwa akwa na iru uju, na ime ka nwoke ahụ si nꞌọgbakọ unu pụọ? Ọ bụ ezie na mụ na unu anọghị ugbu a, ma mụ na unu nọkwa nꞌime mmụọ. Ikwuru unu eziokwu, amaala m rị onye ahụ ikpe site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs, dị ka a ga-asị na mụ na unu nọ. Ya mere, mgbe ọ bụla unu zukọrọ nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs, aga m esoro unu nọdụ nꞌime mmụọ m, ike Onyenwe anyị Jisọs ga-adịnyekwara unu. Mgbe ahụ sitenụ nꞌụlọ chọọchị Chineke wepụ nwoke a, werenụ ya nyefee nꞌaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị Jisọs lọghachiri. Olee uru ọ bara na unu nọ na-anya isi mgbe ihe ọjọọ dị otu a na-eme nꞌetiti unu? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu agbaa nkịtị, hapụ nwoke a, ka ọ na-eme mmehie ya gaa nꞌihu, na ihe ọjọọ a ga-emekụta ndị ọzọ nọ nꞌụlọ chọọchị unu? Wepụnụ ekwensu a nọ nꞌetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nꞌihi na egbuolarị Kraịst nwa atụrụ Chineke nꞌihi anyị. Ugbu a ka anyị dabere na Kraịst, si otu a na-eto eto nꞌime ndụ anyị dị ka ndị nke ya. Ka anyị wezuga ndụ ochie ahụ jupụtara nꞌekworo na ọrụ ọjọọ nile. Ka anyị jiri eziokwu na ịdị ọcha zụjuo onwe anyị afọ dị ka nri. Nꞌakwụkwọ mbụ m deere unu, adọrọ m unu aka na ntị ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọ bụla. Mgbe m gwara unu okwu ahụ, ọ bụghị ihe gbasara mmekọ unu na ndị na-ekweghị ekwe na-akwa iko, na ndị na-enwe anya ukwu, na ndị na-ezu ohi, na ndị na-efe arụsị ka m na-ekwu. Nꞌihi na o nweghị ụzọ unu na ndị dị otu a pụrụ isi hapụ imekọrịta nꞌụwa, karịa ma unu si nꞌụwa pụọ kpamkpam. Kama ndị m bu nꞌuche dee ihe ahụ bụ ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ma ha nọgidere na-akwa iko, ma ọ bụ na-enwe anya ukwu, ma ọ bụ na-efe arụsị. Ee, ndị ahụ sị na ha bụ ndị Kraịst ma nọgidekwa na-ekwutọ ibe ha, na-aṅụbiga mmanya oke, ma na-ezukwa ohi. Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ ọ bụla. Unu esola ha rikọọ ihe. Ọ bụghị ọrụ anyị ikpe ndị na-esoghị anyị bụrụ ndị Kraịst ikpe. Ma ọ bụ ọrụ anyị ikpe ndị nọ nꞌọgbakọ anyị na-eme mmehie ikpe. Ọ bụ nanị Chineke ka ọ dịrị ikpe ndị na-abụghị ndị Kraịst ikpe. Ya mere, sitenụ nꞌetiti unu wepụ nwoke a. Gịnị mere o ji bụrụ na unu na nwanne unu nwoke nꞌime Kraịst nwee esemokwu, unu eburu okwu ahụ gaa nꞌụlọ ikpe ka ndị na-ekweghị ekwe kpeere unu ikpe? Gịnị gbochiri unu iji okwu ahụ gaa nꞌọgbakọ Kraịst, ka ndị kwere ekwe nọkọọ doziere unu okwu ahụ? Ọ̀ bụ na unu amabeghị na ọ bụ anyị ụmụ Chineke gaje ikpe ụwa a ikpe? Ebe unu gaje ịchị ụwa nile, gịnị mere unu enweghị ike dozie ihe ntakịrị pụtara nꞌetiti unu? Ọ̀ bụ na unu amatakwaghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi nsogbu nile dapụtara nꞌetiti anyị nꞌụwa a? Ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nꞌetiti gị na nwanne gị, gịnị mere ị ga-eji were okwu ahụ jekwuru ndị na-enweghị ọnọdụ nꞌime Kraịst ka ha kpee ya? Ana m ekwu okwu ndị a ime ka ihere mee unu. Ọ̀ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nꞌetiti unu onye ga na-ekpe ikpe dịrị ụmụnna nꞌime Kraịst? Leenụ! nwanne ji nwanne ya aga ụlọ ikpe, na-ebo ya ebubo nꞌihu ndị na-ekweghị ekwe! Ebe unu na-enwe esemokwu nke unu ji aga nꞌụlọ ikpe, ọ pụtara ìhè na unu na-ala azụ nꞌokwukwe unu. Gịnị gbochiri gị idi na ịnagide mmejọ e mejọrọ gị na nghọgbu a ghọgburu gị? Ma kama unu ga-anagide mmejọ, ma die nghọgbu, ọ bụ unu onwe unu na-emegbu ndị ọzọ, ọ bụladị ụmụnna unu nꞌime Kraịst. Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, ndị nile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nꞌalaeze Chineke. Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume. Enwere m ike ime ihe nile m maara na m kwesịrị ime, ma ọ bụghị ihe nile ga-abara m uru. Ọ bụrụ na iwu ọ bụla ejighị m ma m mee ihe ọ bụla m kwesịrị ime, agaghị m eme ihe ọ bụla m maara na emesịa, agaghị m enwe ike ịkwụsị ime ya maa m kpebie ịhapụ ime ya. Ka anyị jiri ihe dị ka nri maa atụ. Ọ bụ Chineke nyere anyị nri. Ọ bụ ya nyekwara afọ anyị ga-erinye nri ahụ. Ma otu ụbọchị Chineke ga-eme ka ihe oriri na afọ anyị ghara ịdịkwa. Ma e meghị ahụ mmadụ maka mmehie ịkwa iko, kama e mere ahụ mmadụ maka Onyenwe anyị, meekwa Onyenwe anyị maka ahụ mmadụ. Dị ka Chineke si site nꞌike ya mee ka Onyenwe anyị site nꞌọnwụ bilie, otu ahụ kwa ka ọ ga-esitekwa nꞌike ya mee ka anyị si nꞌọnwụ bilie. Ọ̀ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ̀ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụla? Tụfiaa! Chineke ekwela. Ọ̀ bụ na unu amataghị na nwoke ọ bụla ya na nwanyị akwụla nwere mmekọrịta esorola nwanyị ahụ bụrụ otu anụ ahụ? Nꞌihi na e kwuru ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” Ma ọ bụrụ na e jikọtaa mmadụ ọ bụla na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nꞌime mmụọ. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya. Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto. Ugbu a, achọrọ m ịsa ajụjụ ndị ahụ unu jụrụ nꞌakwụkwọ unu deteere m. Ndị a bụ ọsịsa m banyere ajụjụ ịlụ nwanyị. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na nwoke emetụghị nwanyị aka. Ma ọ ka mma ka onye ọ bụla lụọ nwanyị, nwoke ọ bụla nwụnye nke aka ya, nwanyị ọ bụla di nke aka ya. Nke a ga-eme ka ha ghara ime mmehie. Ka nwoke ọ bụla nwere nwụnye nye nwụnye ya ihe nile ruuru ya dị ka nwanyị nwere di. Nwanyị ọ bụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ. Nꞌihi na nwanyị ọ bụla lụrụ di adịkwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwụnye ya na-achị ya. Ka di na nwụnye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa ma ọ bụ na mkpebi ha nwere nꞌetiti onwe ha ịnọrọ iche nwoge nta nꞌihi inyefe onwe ha ikpe ekpere nye Chineke. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nꞌihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nꞌihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka. Anaghị m ekwu nke a ịkwagide unu ịlụ di na nwụnye, kama onye chọrọ ịlụ nwere ike lụọ. Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ nile nọrọ dị ka m ṅa-alụghị nwụnye. Ma onye ọ bụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ di ma ọ bụ nwụnye, ndị ọzọ ka o nyere onyinye ịnọrọ onwe ha na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye. Ya mere geenụ ntị, unu ụmụ nwanyị nile na-alụbeghị di, na unu nile di ha nwụrụ anwụ, ọ ga-akara unu mma ịnọrọ nke onwe unu dị ka m. Ma ọ bụrụ na ị pụghị ijide onwe gị, igbaso nwoke ma ọ bụ nwanyị, gaa chọrọ di ma ọ bụ nwụnye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, karịa ịnọ na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye na-anwụ nꞌihi agụụ inwe mmekọrịta nke nwoke na nwanyị. Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwụnye nile, enwere m iwu m na-enye unu. Iwu a esighị nꞌaka m, kama o si nꞌaka Onyenwe anyị. O kwesịghị ka nwanyị ọ bụla hapụ di ya. A sịkwa na nwanyị ọ bụla ahapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, ma ọ bụ ya laghachikwuru di ya. Nwoke ọ bụla ekwesịkwaghị ịchụpụ nwụnye ya. Ka m tụnyetụ aro nke m. Ọ bụ ezie na ọ bụghị Chineke kwuru ha, kama ha ziri ezi nꞌanya m. Ọ bụrụ na onye kwere ekwe alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dị ka nwụnye ya. Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya achọkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ka nwanyị ahụ nọgide dị ka nwụnye ya. Nꞌihi na a na-eme ka nwoke ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na nwụnye ya, otu a kwa a na-emekwa ka nwụnye ahụ na-ekweghị ekwe bịarute Chineke nso site na di ya. Nꞌihi na, ọ bụrụ na ha agbaara onwe ha achọkwaghị m, a ga-agụ ụmụ ha dị ka ndị na-amaghị Chineke. Ma ọ bụrụ na ha ebiri, a ga-agụ ha dị ka ndị dị nsọ. Ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwụnye nke na-ekweghị ekwe achọọ ikewapụ onwe ya, ka di ma ọ bụ nwụnye nke kwere ekwe ghara ịkwụsị ha. Ha kewapụ onwe ha. Nke a bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka ụmụ ya bie ndụ udo nꞌezinụlọ ha. Nꞌihi na gị nwanyị na-adọ ka di gị nọgide, gịnị nyere gị olileanya iche na di gị ga-emesịa kwere na Kraịst? Otu a kwa gị nwoke na-adọ ka nwụnye gị nọgide, olee otu i si mara na ị pụrụ ime ka nwụnye gị bụrụ onye Kraịst? Bikonụ mgbe unu na-enwe mkpebi unu nꞌihe ndị a, ka onye ọ bụla na-ebi ndụ ya dị ka Chineke chọrọ ka o bie ya. Onye na-alụ di ma ọ bụ nwụnye, ya mee ya dị ka otu Chineke si duzie. Onye nke na-adịghị alụkwa, ya meekwa dị ka Chineke siri duzie ya. Nke a bụ iwu m na-enye nꞌụlọ chọọchị nile m gara. Dị ka ihe ịma atụ, ọ bụrụ na ọ dị onye e biri ugwu tupuu ya anabata Onyenwe anyị, ka nke a hapụ iwute ya. Ka onye a na-ebighị ugwu hapụ inye onwe ya nsogbu, ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu. Nꞌihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ọ dịghị ihe ndị a pụtara nꞌihu Chineke. Ihe dị mkpa bụ irube isi nꞌiwu Chineke na ime ihe na-atọ ya ụtọ. Ka onye ọ bụla nọgide dị ka ọ dị mgbe a kpọrọ ya. Ọ bụrụ na ị bụ ohu echegbula onwe gị nꞌihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, mee ya. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu, cheta na Kraịst emeela ka ị bụrụ onye nweere onwe ya site nꞌike mmehie. Ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe i nweere onwe gị, cheta na ị bụ ohu Kraịst ugbu a. Kraịst akwụọla ụgwọ isi unu, unu bụ nke ya ugbu a. Ya mere, bienụ ndụ dị ka ndị nwe onwe ha, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ. Ụmụnna m, nꞌọnọdụ ọ bụla mmadụ nọ mgbe ọ nabatara Kraịst, ya nọgidesie ike nꞌime ya, kama nanị ihe ọ ga-eme bụ ịtụkwasị Kraịst obi nꞌihi na Onyenwe anyị nọ nꞌebe ahụ inyere ya aka. Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ banyere ụmụ agbọghọ na-alụbeghị di. Unu na-ajụ ma o ziri ezi nꞌezie ka ha lụọ di. Enweghị m iwu ọ bụla site nꞌaka Chineke banyere ajụjụ a, ma o nyere m amamihe nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Nꞌihi nke a, leenụ ihe m chere banyere ajụjụ a. Echere m na ọ ka mma ugbu a, nꞌihi nsogbu na-adakwasị ndị Kraịst nꞌoge a, ka nwoke na nwanyị onye Kraịst ọ bụla nọọrọ onwe ya na-alụghị di ma ọ bụ nwụnye. Ma ọ bụrụ na ị nwere di ma ọ bụ nwụnye, ahapụla ya, a sịkwa na ị bụ okokporo, emela ngwangwa ịchọ nwanyị ị ga-alụ ugbu a. Ma ọ bụrụ na i kpebie nꞌobi gị ịlụ nwụnye, i meghị mmehie ọ bụla; ọ bụrụkwa na nwagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ma chezie echiche ma ị ga-ebulitekwa nsogbu nke ya na mkpebi gị so nꞌoge a. Ihe unu kwesịrị ịmata bụ na oge anyị nwere nꞌụwa a fọdụrụ nanị ntakịrị, nꞌihi nke a, ka ndị nwere di na nwụnye bụrụ ndị ji oge ha nile na-arụ ọrụ Chineke. Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dị ka ndị na-enweghị obi ọjọọ ọ bụla, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dị ka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọ bụla. Ka ndị na-etinye oge nꞌihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe nile dị nꞌụwa nꞌuru. Nꞌihi na ụwa a, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga. Nꞌime ihe nile unu na-eme, unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya nile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ma nwoke nwere nwụnye enwezighị ohere ịrụrụ Onyenwe anyị ọrụ nꞌihi na echiche ya nile na ihe na-agụ ya agụụ bụ igbo mkpa dị nꞌezinụlọ ya, na ime ihe ga-atọ nwụnye ya ụtọ. Nꞌụzọ dị otu a, ọ na-enwekwa obi abụọ nꞌihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nwagbọghọ lụrụ di. Echiche ya nile bụ ime ka ihe dị nꞌezinụlọ ya dị mma, na ime ihe ga-atọ di ya ụtọ. Ma ọchịchọ nwagbọghọ na-enweghị di bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ihe m na-eme abụghị ịgbalị igbochi unu ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, kama ọ bụ inyere unu aka. Ya mere, achọrọ m ka unu mee ihe ahụ unu maara ga-enyere unu aka iji otu obi rụọra Chineke ọrụ. Ọ bụrụkwa na nwoke ọ bụla ekpebie ịlụ nwụnye nꞌihi na o siiri ya ike ijide onwe ya nꞌihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya, o meghị mmehie ọ bụla ma ọ lụọ nwụnye. Ma ọ bụrụ na nwoke ekpebie nꞌobi ya na ọ gaghị alụ nwụnye ma nweekwa ike ijide onwe ya aka, ọ bụ ihe dị mma ka o mere. Ya mere, onye ahụ lụrụ di ma ọ bụ nwụnye mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa. Njikọta e jikọtara nwụnye na di ya na-adị ire nanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nanị onye nke Kraịst. Nꞌuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nꞌobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na ndụmọdụ ndị a m nyere unu si na Mmụọ Chineke bịa. Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ ihe banyere iri anụ e ji chụọra arụsị aja. Nꞌụdị ajụjụ dị otu a onye ọ bụla na-eche na ọsịsa nke ya dị mma. Ma ọ bụ ezie na anyị na-anya isi nꞌihi na anyị na-akpọ onwe anyị ndị maara ihe, ma ihe dịkarịsịrị mkpa iji iwuli ụlọ nzukọ Kraịst elu bụ nanị ịhụnanya. Ọ bụrụ na ọ dị onye sị na ya maara ihe nile, onye ahụ na-ekwu okwu ụgha nꞌihi na ọ matabeghị ihe o kwesịrị ịmata. Ma onye ahụ hụrụ Chineke nꞌanya bụ onye Chineke maara. Ugbu a ka anyị tulee ajụjụ unu. Ò kwesịrị ka anyị rie anụ e ji chụọra arụsị aja? Anyị nile maara na o nweghị arụsị dị, na ihe ndị mmadụ na-akpọ arụsị abụghị ihe ọ bụla. Anyị matakwara na ọ bụ nanị otu Chineke dị. A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nꞌeluigwe ma ọ bụ nꞌụwa nꞌezie, ọtụtụ chi na ndị nwe mmadụ dị otu a dị. Ma nꞌebe anyị nọ anyị maara na ọ bụ nanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye okike, onye kere ihe nile, meekwa ka anyị bụrụ ndị nke ya. Ọ bụkwa nanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst. Onye e sitere nꞌaka ya kee ihe nile, onye na-enyekwa anyị ndụ. Ma otu ọ dị, ọ bụghị ndị Kraịst nile maara eziokwu a. Nꞌime ndụ ha nile, ha na-ele arụsị anya dị ka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọ bụla e ji chụọra arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọra aja. Nꞌihi nke a, mgbe ọ bụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nꞌihi na ha na-eche na ihe ha riri emerụọla ha. Ma chetanụ na ọ bụghị nri ga-eme ka anyị dị ezi ndụ nꞌihu Chineke. Ma anyị riri ma anyị erighị, ọ dịghị ihe ọhụrụ anyị ga-enweta. Ọ dịkwaghị ihe anyị ga-atufu. Ọ bụ eziokwu na anyị pụrụ iri ihe ọ bụla, ma jie onwe gị aka ka ị ghara iri ihe ga-eme ka nwanna gị nꞌime Kraịst, nke okwukwe ya na-esighị ike daba nꞌime mmehie. Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ chere na nri e nyere arụsị bụ ihe ọjọọ, ahụ gị ka ị nọ na-eri nri nꞌụlọ arụsị, ọ ga-enwe obi ike soro gị nọdụ rie nri ahụ. Ma mgbe ọ na-eri ya akọnuche ya ga-anọ na-ama ya ikpe na o meela ihe ọjọọ. Site nꞌụzọ dị otu a, nwoke a mmụọ ya na-esighị ike, onye bụ nwanne gị, onye Kraịst nwụrụ nꞌihi ya, ga-ala nꞌiyi nꞌihi na o sooro gị, onye maara ihe nile, mee ihe ahụ akọnuche ya gwara ya na ọ bụ mmehie. Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, ma ọ bụrụ na ị kwagide nwanne gị nꞌime Kraịst, ka o mee ihe ahụ o chere na ọ bụ ihe ọjọọ. Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na iri anụ e ji chụọra arụsị aja ga-eme ka nwanne m mee mmehie, agaghị m eso rie ya mgbe ọ bụla, ka m ghara ime ka nwanne m mee mmehie. Abụ m onyeozi Kraịst, bụrụkwa onye nwe onwe m. Abụkwa m otu nꞌime ndị ji anya ha hụ Jisọs Onyenwe anyị. Ndụ ọhụrụ ahụ unu nwere ugbu a sitekwara nꞌọrụ Onyenwe anyị m rụrụ nꞌetiti unu. Ọ bụrụ na ndị ọzọ asị na m abụghị onyeozi Kraịst, unu onwe unu maara na m bụ onyeozi Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌọrụ m, dị ka onyeozi ya, ka unu ji bụrụ ndị kwere na Kraịst. Mgbe ọ bụla ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ banyere ihe m bụ, ihe a bụ ọsịsa m na-enye ha. Ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị na a ga-enye m ihe ruru m dị ka onyeozi Kraịst? Ọ̀ ga-abụ na enweghị m ike ịbata nꞌụlọ unu nọnyere unu, ka unu jiri nri unu zụọ m, dị ka ndị ozi Kraịst ọzọ na-eme? A sịkwa na m nwere nwụnye, onye bụ onye Kraịst, ọ̀ bụ na m enweghị ike iduru ya gaa ebe ọ bụla m na-aga dị ka ndị ozi ọzọ na-eme, na dị ka ụmụnne Onyenwe anyị na Pita na-emekwa? Ọ̀ ga-abụ nanị mụ na Banabas ga-anọgide na-arụpụtara onwe anyị ihe anyị ga na-eri, mgbe unu na-egboro ndị ọzọ mkpa ha? Olee onye agha unu maara nke na-esi nꞌakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ̀ dị onye ọrụ ubi unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nꞌubi ya weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nꞌatụrụ ọ na-azụ apịpụta? Nꞌezie, anaghị m ekwu ihe a nꞌihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị nile nꞌetiti ndị mmadụ, kama akwụkwọ nsọ kwagidekwara ihe ndị a. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ ahụ Chineke nyere Mosisi sị, “Ị gaghị ekechi ọnụ ehi nke na-arụ ọrụ nꞌubi gị, ime ka ọ ghara ịta ọka mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ nanị ehi ka Chineke bu nꞌobi kwuo okwu a? É, è! O bukwa anyị nꞌobi kwuo ya. Nꞌezie, e dere ihe ndị a nꞌihi anyị, nꞌihi na onye kụrụ mkpụrụ nꞌubi na onye gara wee ihe dị nꞌubi ahụ, kwesịrị iketa oke site na mkpụrụ e si nꞌubi ahụ weta. Mkpụrụ anyị kụrụ nꞌime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ̀ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ihe oriri na akwa oyiyi unu? Echere m na ọ bụ anyị kwesịrị isite nꞌaka unu nata ihe ndị a karịa ndị ọzọ a unu na-enye ihe ndị a. Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọ bụla, kama anyị na-agbalịsi ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nꞌozi ọma Kraịst nke anyị wetara. Ma unu maara na ndị na-arụ ọrụ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke na-esi nꞌụlọ nsọ ahụ na-eweta ihe ha na-eri. Otu a kwa, ndị nchụaja na-eketakwa oke nꞌụfọdụ ihe ha ji chụọ aja. Nꞌotu aka ahụ kwa, Chineke ekwuola na ndị nile na-ekwusa ozi ọma ya ga-esi nꞌozi ọma eweta nri ha ga-eri. Ma ajụbeghị m unu ihe ọ bụla. Nꞌeziokwu, anaghị m ede akwụkwọ a ime ka unu bido izitere m ihe. Ọ ga-akara m mma na m nwụrụ karịa na m ga-ana unu ihe ọ bụla nꞌihi ozi ọma m na-ekwusara unu! Nke a bụ ihe m ji anya isi! Ọ bụghị na ọ dị ihe ọzọ pụrụ iche ikwusa ozi ọma na-ewetara m. Enweghị m ike ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Nꞌihi na ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma, agaghị enwe udo na ọṅụ ọ bụla. Onye a bụrụ ọnụ ka m ga-abụ ma ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma Onyenwe anyị. A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe olileanya na Chineke ga-akwụ m ụgwọ ọnwa. Ma o sighị otu a dịrị. Ọ bụ Chineke nꞌonwe ya họpụtara m, nyefee m ọrụ nꞌaka. Ya mere, ọ bụ ọrụ nke m na-aghaghị ịrụ. Ebe m na-arụ ya dị ka ọrụ m na-aghaghị ịrụ, gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nꞌizisa ozi ọma a, na-anaghị onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ọ bụla, ma ọ bụ ihe ruru m. Site nꞌụzọ dị otu a, abụghị m ohu onye ọ bụla nꞌihi na o nweghị onye m nọ nꞌokpuru ya nke na-akwụ m ụgwọ ọrụ, kama abụ m onyenwe onwe ya. Ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ nile ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụ obi nꞌuru nye Kraịst. Mgbe ọ bụla m bịara nꞌetiti ndị Juu ana m eme dị ka onye Juu, ka m nwee ike nwetara Kraịst ụfọdụ nꞌime ha. Ọ bụ ezie na anọghị m nꞌokpuru iwu Mosisi, ma mgbe m nọ nꞌetiti ndị mba ọzọ ndị na-ebi ndụ dị ka usoro okpukpe iwu ndị Juu si dị, ana m emekwa dị ka m bụ otu nꞌime ndị nọ nꞌokpuru iwu, ka m si otu a nwee ike ikwusara ha ozi ọma, inyere ha aka. Otu aka ahụ kwa, mgbe mụ na ndị mba ọzọ na-anọghị nꞌokpuru iwu nọkọrọ, ana m eme dị ka ha si eme ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a mee ka ha mata Kraịst. Ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe Chineke na-achọ. Mba! Ana m emekwarị dị ka onye nọ nꞌokpuru iwu Kraịst. Ọ bụrụkwa na mụ na ndị okwukwe ha na-esighị ike anọkọọ, ana m emekwa dị ka ha, ka m nwee ike mee ka ha mata Kraịst. Ee, otu ọ bụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike gwa ya ihe banyere Kraịst, Ka Kraịst zọpụta ya. Ana m eme ihe ndị a ka ozi ọma nwee ike ruo ha nile ntị. Ana m emekwa ya nꞌihi ngọzi m na-enweta mgbe m na-ele ha ka ha na-anabata Jisọs dị ka Onyenwe ha na Onye nzọpụta ha. Unu maara na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ, nꞌoge a na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ otu onye nanị na-enwe ihe onyinye nke mbụ. Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta ụdị onyinye ahụ. Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi. Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nꞌazụ, tutuu ruo mgbe m ruru na njedebe ije ahụ. Ana m alụsi ọgụ ike ka m nwee ike merie, dị ka ọkụ ọkpọ nke na-adịghị akụjọ akụjọ. Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ. Ụmụnna m, ka anyị hapụ ichefu ihe mere nna nna anyị ha mgbe ha jere ije nꞌime ọzara. Chineke ji igwe ojii duo ha. O mekwara ka ha si nꞌetiti osimiri uhie gafee. A pụrụ ịsị na ọ bụ nꞌime igwe ojii ahụ na mmiri ahụ ha gafere ka e mere ha baptizim, nke mere ha ndị na-eso ụzọ Mosisi. Ha nile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ Chineke zitere. Ha ṅụkwara mmiri nke mmụọ ahụ, mmiri sitere nꞌoke nkume nke mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nꞌonwe ya. Ma mgbe Chineke mechaara ha ihe ndị a nile, ha nupụrụ isi nꞌebe Chineke nọ. Ọ bụ nnupụ isi a mere Chineke ji laa ha nꞌiyi nꞌime ọzara ahụ. Ihe dakwasịrị ha bụ ihe ịma atụ dịịrị anyị. Ọ bụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị, ka anyị hapụ ịbụ ndị agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ dị ka ha. Ka anyị hapụkwa ịbụ ndị na-ekpere arụsị dị ka ụfọdụ ha mere. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụmụ Izirel nọdụrụ ala na-eri na-aṅụ, ha bilikwara ọtọ ite egwu nꞌihu ehi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.” Ihe mmụta ọzọ dịrị anyị bụ ihe dakwasịrị ha mgbe ụfọdụ nꞌime ha mere mmehie ịkwa iko. Ọ bụ iri puku mmadụ abụọ na atọ nꞌime ha nwụrụ nꞌotu ụbọchị ahụ. Ka anyị hapụ ịnwa Chineke ọnwụnwa dị ka ụfọdụ nꞌime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha. Ka anyị hapụkwa ịtamụ dị ka ụfọdụ ha tamụrụ megide Chineke. Chineke zitere mmụọ ozi ya ka o gbuo ha. *** Ihe ndị a nile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị, ka ọ bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị. Ka anyị hapụ ime ihe ndị a ha mere. E dekwara ihe dakwasịrị ha nꞌakwụkwọ ka anyị bụ ndị bi nꞌoge a ọgwụgwụ ụwa dị nso, site na ha mụta ihe. Ọ bụrụ na ị na-eche nꞌobi gị na ị nweghị ike ime ihe ndị a, leziekwa onwe gị anya, nꞌihi na ị pụrụ ịdabakwa na mmehie. Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị. Bikonụ ụmụnna m, gbaaranụ ife arụsị ọ bụla ọsọ. Dị ka ndị nwere uche nke unu bụ, leenụ ihe ndị a anya matakwanụ ma ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu. Nꞌoge oriri nsọ, mgbe anyị na-arịọ Chineke ka ọ gọzie iko mmanya ahụ tupuu anyị aṅụọ ya, o gosighị na anyị ndị na-aṅụ ihe dị nꞌiko a kwere na ọ bụ ngọzi si nꞌọbara Kraịst ka anyị na-eketa? Mgbe anyị na-ata beredi anyị nyawara, ọ bụkwaghị uru nke ahụ Kraịst na-eweta ka anyị na-eketa? Ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu ogbe beredi ahụ ka anyị na-ata. Nke a na-egosi na anyị nile bụ akụkụ ahụ nke otu anụ ahụ Kraịst, onye bụ beredi ahụ. Otu a kwa ka ọ dị nꞌetiti ndị Juu. Ndị nile soro rie ihe e ji chụọ aja, bụ ndị e jikọtara nꞌotu site nꞌoriri ahụ. Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Ọ̀ bụ na arụsị ahụ ndị na-ekpere arụsị na-achụrụ aja bụ Chineke nꞌezie? Ka m na-ekwu na aja ha chụrụ bara uru ọ bụla? Tụfịakwa, nke a abụghị ihe m na-ekwu. Ihe m na-ekwu bụ na ndị nile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nꞌotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ, ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu mgbe unu so ha rie nri ahụ ha ji chụọra arụsị ha aja. Nꞌihi na mmadụ enweghị ike isoro rie oriri nsọ, sorokwa rie nri ekwensu. Gịnị ka unu na-achọ ime? Ọ̀ bụ ime ka iwe wee Chineke? Unu dị ike karịa ya? Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ime ihe nile, dị ka iri nri e ji chụọra arụsị aja, ma ọ bụghị ihe nile dị mma omume. Anyị nwekwara ike ime ihe nile, ma ọ bụghị ihe nile nwere ike inyere anyị aka. Ka anyị hapụ ịchọ ọdịmma nke anyị nanị, kama anyị ga na-achọ ọdịmma nke ndị ọzọ, ime ihe ga-enyere ha aka. Nke a bụ ihe i kwesịrị ime. Ọ bụrụ na ị gaa ahịa, zụrụ ụdị anụ ọ bụla ị chọrọ nke a na-ere nꞌahịa, ajụla ajụjụ ọ bụla ịmata ma e ji ya chụọra arụsị aja ma ọ dịghị, nꞌihi na ọsịsa ị ga-anata pụrụ iwute mmụọ gị. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụwa nile na ihe ọma nile dị nꞌime ya bụ nke Chineke. Ọ dịkwara anyị iji ha ime onwe anyị obi ụtọ.” Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ gị, sị gị bịa nꞌụlọ ya, gaa, riekwa nri ọ bụla e nyere gị na-ajụghị ajụjụ. Nꞌihi na ọsịsa ya pụrụ imerụ mmụọ gị. Ma ọ bụrụ na e nwee onye gwara gị sị, “E jikwa anụ a chụọra arụsị aja” erila ya, nꞌihi nwoke ahụ gwara gị na e ji ya chụọ aja, na nꞌihi na ọ ga-ewute mmụọ ya ma i rie ya. Nꞌoge a ihe dị mkpa abụghị ihe i chere banyere anụ ahụ, kama ihe dị mkpa bụ ime ka mmụọ nwoke ahụ gwara gị na e ji ya chụọra arụsị aja hapụ ịda mba. I nwere ike ịjụ ajụjụ sị, “Gịnị mere m ga-eji hapụ ime ihe ọ bụla nꞌihi na ọ ga-ewute mmụọ onye ọzọ? Ọ bụrụ na m nwere ike kelee Chineke ekele nꞌihi ya, were nri m rie, olee otu o si gbasa onye bịara ịjụ m ọnụ?” Ka m gwa gị ihe mere o ji dị mkpa. I kwesịrị ime ihe ọ bụla ị na-eme, ma ọ bụ iri nri ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ, i kwesịrị ime ihe nile nꞌụzọ ọ ga-esi wetara Chineke otuto. Ya mere, ekwela ka ị bụrụ ihe ịsụ ngọngọ nye onye ọ bụla ma ọ bụ onye Juu, ma ọ bụ onye mba ọzọ, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke. Na-agbalịsinụ ike ime dị ka m si eme. Nꞌihe ọ ọ bụla m na-eme ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọ bụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m nanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha. Ya mere, bụrụnụ ndị na-eṅomi m, na ndị na-eso nzọ ụkwụ m, dị ka m si eṅomi Kraịst, ma na-esokwa nzọ ụkwụ ya. Ọṅụ juru m obi nꞌihi na unu na-echeta m na nꞌihi na unu na-eme ihe m ziri unu. Ma ọ dị otu ihe dị mkpa m chọrọ ichetara unu. Achọrọ m ka unu mata na dị ka Kraịst si bụrụ isi nwoke nile, otu a ka nwoke ọ bụla si bụrụ isi nwụnye ya. Chineke bụkwa isi Kraịst. Nwoke ọ bụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi ihe na-eme Kraịst onye bụ isi ya ihe ihere. Ma nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi okwu Chineke, ma o kpuchighị isi ya, na-eme di ya ihe ihere, nꞌihi na ọ dịghị ihe dị iche nꞌebe nwanyị a na nwanyị kpụchara isi ya nọ. Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya. Ma nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihi na Chineke kere nwoke nꞌoyiyi ya izipụta otuto ya. Ma nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya nꞌihi na nwanyị na-ezipụta otuto nwoke. E si na nwoke kee nwanyị mbụ, ma e sighị na nwanyị kee nwoke. E keghị nwoke mbụ maka nwanyị, ma e kere nwanyị mbụ maka nwoke. Nꞌihi nke a, nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nꞌokpuru di ya, ime ka ndị mmụọ ozi hụ ụdị omume a, site nꞌihi ya ṅụrịa ọṅụ. Ma dị ka nzube Chineke si dị, mkpa nwanyị na-akpa nwoke, mkpa nwoke na-akpa nwanyị. Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwanyị mbụ si na nwoke pụta, ma ọ bụ ụmụ nwanyị na-amụ ụmụ nwoke nile, nwoke na nwanyị nile sitekwara nꞌebe Chineke onye kere ha nọ na-abịa. Achọrọ m ka unu tulee ihe a nꞌonwe unu, ọ̀ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihu ọha mmadụ? Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka Chineke siri mee ya. Nwanyị nwere agịrị isi dị ogologo na-aṅụrị ọṅụ na-anyakwa isi. Akọnuche anyị na-agwakwa anyị na o kwesịrị ka nwanyị na-ekechi isi ya. Ọ bụrụ na ọ dị onye jụrụ ịnabata ozizi a, ọ bụrụkwa na onye ahụ achọọ ịrụ ụka, nanị ihe m maara bụ na anyị, na chọọchị nile, adịghị ezi ihe ọ bụla karịa na nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ nke na-ekwusa ozi ọma nꞌebe ndị mmadụ nọ kwesịrị ikechi isi ya. Ihe ndị ọzọ m chọrọ ikwu ugbu a bụ ihe gbasara ihe unu na-eme nke m na-ekwesịghị inye unu otuto nꞌihi ha. Nꞌihi na omume unu na-eme mgbe unu zukọtara nꞌime chọọchị unu bụ omume jọgburu onwe ya na njọ. Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe nile unu zukọrọ, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nꞌetiti unu. Ọ na-adịkwa m ka ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu. Ana m echekwa na ụdị nkewa a na-atọ unu bụ ndị na-eme ezi ihe mgbe nile ụtọ nꞌihi na unu chọrọ ka e site nꞌụzọ dị otu a mata unu. Mgbe unu zukọtara iri nri, ọ bụghị oriri nsọ ka unu na-eri. Nꞌihi na anụrụ m na onye ọ bụla na-eri nri nke aka ya. Anụkwara m na ndị nile bu nri ha bịa na-ericha ya ngwangwa. Ha anaghị echere ka ndị na-enweghị nri ha ji bịa soro ha keta oke na nri ha ji bịa. Nꞌihi nke a ụfọdụ na-eribiga nri oke mgbe ndị ọzọ na-anọ agụụ. Ụfọdụ kwa na-aṅụbiga mmanya oke bụrụ ndị mmanya na-egbu. A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iri nri na ịnụ mmanya nꞌụlọ unu tupuu unu abịa nꞌụlọ chọọchị? Karịa na unu ga-ebu ihe ndị a bịa nꞌime chọọchị ime ndị ogbenye na ndị na-enweghị ike iweta nri nke ha ihe ihere. Gịnị ọzọ ka unu chọrọ ka m kwuo banyere ihe ndị a? Ùnu chọrọ ka m too unu? Mbaa! Nꞌihi na ihe m ziri unu banyere oriri nsọ bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nꞌabalị ụbọchị ahụ Judas rara ya nye nꞌaka ndị ga-egbu ya, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe beredi. Mgbe o nyechara Chineke ekele nꞌihi ya ọ nyawara ya nye ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ beredi a taa, nꞌihi na nke a bụ anụ ahụ m nke a na-enye nꞌihi unu. Na-emenụ nke a iji cheta m.” Nꞌụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risịrị nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị nꞌetiti unu na Chineke, nke e ji ọbara m mee ka o guzosie ike. Meekwanụ otu a icheta m.” Nꞌihi na mgbe ọ bụla unu na-eri nri a na-aṅụkwa site nꞌiko a, unu na-akọ akụkọ banyere ọnwụ Jisọs. Na-emekwanụ nke a tutuu ruo mgbe ọ laghachiri ọzọ. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla ataa beredi Onyenwe anyị ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko Onyenwe anyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, onye ahụ na-emehie megide anụ ahụ Kraịst na ọbara ya. Ọ bụ nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka onye ọ bụla nyochaa onwe ya nke ọma tupuu o rie beredi ahụ ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko ahụ. Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ ataa beredi ahụ ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko ahụ nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na-echeghị echiche banyere anụ ahụ Kraịst na ihe ọ pụtara, ọ na-eri, na-aṅụtara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, nꞌihi na ọ bụ ọnwụ Kraịst ka o ji egwuri egwu. Ọ bụ nke a mere ọtụtụ nꞌime unu ji bụrụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị nọ nꞌọrịa na ndị dara nꞌụra ọnwụ. Ọ bụrụ na unu enyochaa onwe unu nke ọma tupuu unu erie oriri nsọ unu agaghị adaba nꞌikpe na ahụhụ Chineke. Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekpee anyị ikpe, ma ọ bụ taa anyị ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na ọ chọrọ ka a hapụ ịmakọ anyị na ndị ụwa ikpe. Ya mere, ụmụnna m, mgbe unu bịara iri oriri nsọ cherenụ ibe unu. Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọ bụla ya rie nri nꞌụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, mgbe unu nile zukọtara. Aga m edozi okwu ndị ọzọ mgbe m bịara. Ugbu a ụmụnna m, ka anyị gafee nꞌokwu gbasara onyinye dị iche iche Mmụọ Nsọ na-enye. Aga m akọwa ya nꞌụzọ ọ ga-esi doo unu nile anya. Unu ga-echeta na tupuu unu abụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst unu bụ rị ndị na-eso arụsị nke na-adịghị ekwu okwu ọ bụla. Ugbu a e nwere ọtụtụ ndị na-asị na Mmụọ Nsọ Chineke si nꞌọnụ ha na-ekwu okwu. Ùnu ga-esi aṅaa mata na ọ bụ Chineke si nꞌọnụ ha ekwu okwu nꞌezie? O nweghị onye ọ bụla pụrụ ịkpọku aha Jisọs sị, “Jisọs bụ Onyenwe m” ma ọ bụghị site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla Mmụọ Chineke na-achị nke pụrụ ịsị, “Jisọs bụ onye a bụrụ ọnụ.” Ọ bụ ezie na onyinye Mmụọ Nsọ Chineke dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha. Anyị na-esite nꞌụzọ dị iche iche na-efe Chineke, ma ọ bụ nanị otu Chineke ahụ ka anyị na-efe. E nwere ụzọ dị iche iche Chineke si arụ ọrụ nꞌime anyị, ma ọ bụkwa otu Chineke ahụ na-arụ ihe ndị a nile nꞌime mmadụ nile. Mmụọ Nsọ na-arụpụta ọrụ ya nꞌime onye ọ bụla nꞌụzọ ọ ga-esi bara chọọchị nile uru. Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, dị ka o si chọọ. Otu Mmụọ Nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe pụrụ iche, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. Ụfọdụ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, ndị ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọ kwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu. Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a nile. Ọ na-enye onye ọ bula onyinye dị iche iche dị ka o si kpebie na dị ka o si dị ya mma. Dị ka ahụ anyị si nwee akụkụ dị iche iche, ma bụrụkwa otu ahụ, na-agbanyeghị na o nwere ọtụtụ akụkụ, otu a ka anụ ahụ Kraịst dịkwa. Onye ọ bụla nꞌime anyị bụ otu akụkụ anụ ahụ Jisọs Kraịst. Ụfọdụ nꞌime anyị bụ ndị Juu, ụfọdụ abụghị ndị Juu, ụfọdụ bụ ndị nwe onwe ha, ndị ọzọ bụ ndị ohu. Ma ọ bụ otu Mmụọ ahụ mere anyị nile baptizim baa nꞌime otu ahụ Kraịst ahụ. Chineke enyekwala anyị nile nꞌotu nꞌotu Mmụọ Nsọ ahụ. Ahụ mmadụ abụghị nanị otu akụkụ, kama o nwere ọtụtụ akụkụ. Ọ bụrụ na ụkwụ, nke bụ otu akụkụ ahụ mmadụ asị, “Ebe m na-abụghị aka abụkwaghị m otu akụkụ ahụ ahụ.” Okwu dị otu a egbochighị ya ịnọgide bụrụ akụkụ ahụ ahụ. Otu a kwa, ọ bụrụ na ntị asị, “Ebe m na-abụghị anya abụghị m otu akụkụ ahụ ahụ.” Okwu a kwa agaghị eme ka ntị ghara ịbụ akụkụ ahụ ahụ. Olee otu mmadụ gaara esi nụ ihe ma ọ bụrụ na ahụ ya nile bụ anya? Ọ bụrụkwa na ahụ mmadụ bụ nanị ntị mmadụ ọ̀ ga-esi aṅaa nụ isisi ihe ọ bụla? Onye maara otu ahụ mmadụ gaara adị ma ọ bụrụ na o nwere nanị otu akụkụ? Ma ọ bụghị otu a ka Chineke si kee ya. Chineke kpụrụ akụkụ ahụ mmadụ nile tinyekwa ha ebe ọ chọrọ ka ha dịrị. Nꞌezie, mmadụ agaghị adị ma ọ bụrụ na ọ bụ nanị otu akụkụ dị nꞌahụ ya. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na akụkụ ahụ mmadụ dị ọtụtụ, ma ọ bụ nanị otu ahụ ka mmadụ nwere. Nꞌihi nke a, anya enweghị ike ịgwa aka okwu sị, “Achọghị m gị, nꞌihi na ị dịghị m mkpa.” Isi agakwaghị agwa ụkwụ okwu sị, “Achọghị m inye aka gị.” Ma lee ihe Chineke mere. O mere ka akụkụ ahụ anyị ndị na-esighị ike bụrụ ndị dị anyị mkpa karịa. Ee, akụkụ ndị ahụ anyị na-eche na ha adịghị mkpa ka anyị na-eji nsọpụrụ na-elekọta. Akụkụ ndị ahụ na-ekwesịghị ile anya ka anyị na-enye ugwu, ma na-ekpuchi ha. Ma anyị adịghị e si otu a elekọta akụkụ ndị ahụ anya nile na-ahụ, nꞌihi na Chineke kpachapụrụ anya mee ka akụkụ ndị ahụ dịkarịsịri nta bụrụ nke anyị kwesịrị inye nsọpụrụ karịa. Nꞌụzọ dị otu, nkewa ọ bụla adịghị nꞌahụ mmadụ. Akụkụ ọ bụla maara mkpa ibe ya, ha na-egborịtakwara onwe ha mkpa ha. Ọ bụrụ na otu akụkụ enwee nsogbu akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ nile na-enwe otuto ahụ. Ugbu a ghọtanụ ihe m na-ekwu; unu nile nꞌotu nꞌotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nꞌotu nꞌotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nꞌahụ ahụ. Nke a bụ ụfọdụ nꞌime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị bụ ahụ Kraịst: ndị ozi, ndị amụma, ndị nkụzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe nile nꞌusoro, na ndị na-asụ aụsụ dị iche iche. Nꞌime ọrụ ndị a nile, ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ịrụzucha ha nile. Mmadụ nile abụghị ndị ozi, ọ bụkwaghị mmadụ nile na-ebu amụma. Mmadụ nile agaghị abụ ndị nkụzi, ọ bụkwaghị mmadụ nile na-arụ ọrụ ịtụnanya. Otu aka ahụ, ọ bụghị mmadụ nile nwere ike ịgwọ ọrịa, ọ bụkwaghị mmadụ nile ka Chineke nyere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche. Ọ bụkwaghị mmadụ nile pụrụ ịkọwa asụsụ ndị a. Ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ime ihe nile ndị a, kama gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị mma nꞌime ha. Geenụ ntị ka m gwa unu onyinye ọzọ kachasị onyinye ndị a nile mma. A sị na m nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, na asụsụ ndị mmụọ ozi, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, ọ bụ nanị ụzụ ka m na-eme. A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe nile gaje ime nꞌoge dị nꞌihu, na onye maara ihe nile, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya olee uru onyinye ndị a baara m? A sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nꞌebe ọ nọ gaa nꞌebe ọzọ, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, abụghị m ihe ọ bụla. A sịkwa na m ewere ihe nile m nwere nye ndị ogbenye, kwerekwa ka e ree m ọkụ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst, ihe ndị a nile abaghị uru, ma ọ bụrụ na m ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya. Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya. Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya. Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta. Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma nile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma nile ga-agabiga. Ugbu a ihe anyị maara adịghị ukwuu, mmụta anyị na amụma anyị na-ebu ezughị oke, nꞌihi na ihe anyị maara bụ nanị nwa ntịị. Ma mgbe e mere ka anyị zuo oke, mgbe ahụ, mkpa nke onyinye ndị a na-ezughị oke na-egboro anyị agaghị adịkwa. Onyinye ndị a ga-agwụsịkwa. Ọ dị nnọọ dị ka mgbe m bụ nwanta. Mgbe ahụ, ekwuru m okwu dị ka nwanta, echiche m nile bụ echiche nwanta. Izuzu obi m nile bụkwa nke ụmụntakịrị. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịkwaghị m akpa agwa dị ka nwantakịrị ọzọ. Otu aka ahụ kwa, ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-aghọtakwa bụ nanị ihe ntakịrị banyere Chineke, dị ka a ga-asị na anyị na-ele anya nꞌime enyo gbajiri ojii. Ma otu ụbọchị, anyị ga-ahụ ya ihu na ihu. Ugbu a, ihe mụ onwe m maara banyere ya dị ntakịrị, ma oge na-abịa mgbe m ga-ama ihe nile nke ọma, dị ka Chineke si mara obi m ugbu a. Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya. Ka ịhụ mmadụ ibe unu nꞌanya bụrụ ihe na-agụsi unu agụụ ike. Rịọkwanụ Chineke ka o nye unu onyinye nke Mmụọ Nsọ ya na-enye, nke ka nke, onyinye ibu amụma, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke. Ọ bụrụ na onyinye i nwere bụ onyinye ịsụ asụsụ nke i na-amụghị amụ, cheta na ọ bụ nanị Chineke ka ị na-agwa okwu, nꞌihi na ọ dịghị onye na-aghọta ihe ị na-ekwu. Okwu ị na-ekwu ga-abụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ma ha nile bụ ihe mmadụ na-aghọtaghị. Ma onye ahụ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma, na-agwa ndị mmadụ okwu na-enyere ha aka ito eto nꞌime Onyenwe anyị. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu. Ya mere, nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma na-enyere chọọchị nile aka ito eto nꞌime mmụọ, ma nwoke ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere nanị onwe ya aka. Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu nile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu nile enwee onyinye izisa ozi ọma. Nke a bụ nꞌihi na nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma bara uru karịa nwoke na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, onye nwekwara ike ikọwara chọọchị ihe o kwuru. Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ nke unu na-adịghị anụ, olee uru m baara unu? Ọ baghị uru ọ bụla! Kama ọ bụrụ na m ekwuo okwu nꞌụzọ doro anya, banyere ihe Chineke kpughere gosi m, ma ọ bụ ihe nile m maara, ma ọ bụ ihe gaje ime, ma ọ bụ ozizi nke eziokwu Chineke, nke a ọ̀ gaghị abara unu uru? Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nꞌetiti ihe nile na-enweghị ndụ, ma ha bụ ihe na-eme ụzụ dị ka opi, ma ọ bụ ụbọ akwara. O nweghị onye ga-aghọta ihe onye na-afụ opi na-egbu ma ọ bụ ihe onye na-akpọ ụbọ akwara na-akpọ ma ọ bụrụ na ọ maliteghị ya nke ọma. Ọ bụrụkwa na nwoke na-egbu opi ike egbuzighị ya dị ka o si kwesị, olee otu ndị agha ga-esi mata na agha dị? Nꞌotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nꞌasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Ịgwa mmadụ okwu otu ahụ dị ka mmadụ ichenye ọnụ nꞌezi na-ekwuru ifufe okwu. Asụsụ a na-asụ nꞌụwa a dị ukwuu, ma ha nile bara uru nye ndị na-anụ ha. Ọ bụrụ na mmadụ e jiri otu nꞌime asụsụ ndị a gwa m okwu, aga m abụ ọbịa nꞌebe onye na-asụrụ m asụsụ ahụ m na-adịghị anụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nꞌebe m nọ. Ebe unu na-achọsi ike inwe onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ Chineke elu. Ọ bụrụ na Chineke nyere onye ọ bụla onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ya rịọ Chineke ka o nyekwa ya ike ịkọwa ihe ọ na-ekwu. Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe. Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị jirikwa uche kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m ghọtara. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị, jirikwa uche m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m ghọtara, ka m nwee ike ịmata ihe m na-ekwu na ihe m na-abụ nꞌabụ. Nꞌihi na mgbe i ji asụsụ nke ndị ọzọ na-amaghị na-ekpere Chineke ekpere, olee otu ndị nile nọ nꞌụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amin? Ọ bụ ezie na ekpere gị ga-ama mma, ma o nyereghị onye ahụ na-anụghị ya aka. Ana m ekele Chineke nꞌihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu nile. Ma mgbe ọ bụla ndị Kraịst zukọrọ nꞌofufe, ọ na-akara m mma ikwu nanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ nile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nꞌasụsụ dị iche nke onye ọ bụla na-apụghị ịghọta. Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nꞌechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nꞌihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nꞌihe gbasara ụdị okwu a. E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na Chineke ga-eji asụsụ ndị mba ọzọ gwa ndị ya bụ ụmụ Izirel okwu, ma ha agaghị ege ntị. Nke a na-egosi na ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe dị mkpa nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ịrịba ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma, nke bụ ikwusa eziokwu Chineke, bụ ihe dị ndị kweere na Kraịst mkpa. Ndị na-ekweghị ekwe anaghị ahụ mkpa nke a dị. Ọ bụrụ na onye na-ekweghị na Kraịst abata nꞌụlọ chọọchị unu mgbe unu nile ji asụsụ dị iche iche na-ekwu okwu, gịnị ka ọ ga-eche? Ọ̀ gaghị asị na unu nile bụ ndị ara, ndị isi mebiri? Ma ọ bụrụ na unu nile nọ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma Chineke, mgbe onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye bụ onye Kraịst ọhụrụ batara nꞌụlọ chọọchị unu, okwu nile ọ ga-anụ ga-emetụ ya nꞌobi, maakwa ya ikpe mmehie. Akọnuche ya agaghị enwekwa ozuzu ike nꞌihi ihe nile ọ nụrụ. Mgbe ọ ga-anọ na-ege ntị, ihe ọ ga-anụ ga-emekụta echiche nzuzo ya nile, mee ka ndụ ọjọọ ya pụta ìhè. Nke a ga-emekwa ka o gbuo ikpere nꞌala kpọọ isi ala nye Chineke sị, “Nꞌezie, Chineke nọ nꞌetiti unu.” Ugbu a, ụmụnna m, gịnị bụ isi ihe m na-ekwu? Mgbe ọ bụla unu zukọrọ ife Chineke, ụfọdụ kwesịrị ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe, ma ọ bụ gwa unu ozi dị mkpa Chineke gosiri ya, ma ọ bụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọ bụla e mere nꞌime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-abara onye ọ bụla uru. A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu nꞌime chọọchị, ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nꞌotu nꞌotu nꞌusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nꞌebe ahụ. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịtaa ya. Ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nꞌotu nꞌotu, mgbe mmadụ nile nọrọ nwayọọ na-ege ha ntị. Ọ bụrụ na onye ọzọ anata ozi site nꞌaka Chineke, mgbe onye ọzọ na-ekwu okwu, ka onye ahụ natara ozi ahụ chere tutuu onye nke na-ekwu ekwuchaa tupuu o kwuo nke ya. Nꞌụzọ dị otu a, ndị nile nwere onyinye ibu amụma nwere ike izisa ozi ọma Chineke. Nꞌụzọ dị otu a kwa, a ga-enyere mmadụ nile aka kasiekwa ha obi. Chetanụ na onye ahụ Chineke chọrọ isite nꞌọnụ ya kwuo okwu nwere ike iji ndidi chere ruo mgbe o ruru oge nke ya ikwu okwu. Nꞌihi na Chineke abụghị onye na-achọ ka ihe nile na-aga aghara aghara. Chineke chọrọ ka ihe nile na-aga nꞌusoro nꞌime chọọchị nile nke ndị ya. Ụmụ nwanyị ekwesịghị ikwu okwu nꞌime chọọchị. Ha ekwesịghị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọ bụla, nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-edo onwe ha nꞌokpuru ụmụ nwoke. Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nꞌụlọ. Nꞌihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nꞌime ọgbakọ chọọchị. Ùnu jụrụ ịnabata okwu a? Ùnu chere na okwu Chineke malitere nꞌaka unu? Ùnu chekwara na ọ ga-akwụsị nꞌaka unu? Ụgha! Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, ma ọ bụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, nanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nꞌonwe ya nyere m. Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ige ntị nꞌihe m kwuru nꞌakwụkwọ a, unu aṅala ya ntị! Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke nꞌụzọ doro anya. Kama unu akwụsịkwala ndị nwere onyinye ịsụ asụsụ nke ha na-amụghị amụ. Ma meenụ ihe nile nꞌụzọ dị mma, ka ha dịkwa nꞌusoro. Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta ozi ọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nꞌelu ya. E si nꞌozi ọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu nile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nꞌihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka. Ihe m nyefere unu nꞌaka bụ ihe a gwara m, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nꞌihi mmehie anyị, dị ka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ. Na e liri ya, ma Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie dị ndụ ọzọ nꞌụbọchị nke atọ, dị ka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme. Mgbe o si nꞌọnwụ bilie o gosiri Pita onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya. Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise onwe ya nꞌotu oge. Ọtụtụ nꞌime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nꞌime ha anwụọla. Emesịa, Jemes hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi nile hụ ya. Nꞌikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dị ka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nꞌoge. Nꞌihi na ọ bụ m kachasị nta nꞌime ndị ozi Kraịst nile. O kwesịkwaghị rị ka a kpọọ m onyeozi ya nꞌihi na alụsoro m nzukọ Chineke ọgụ nke ukwuu. Ma site nꞌamara Chineke, abụ m ihe m bụ taa. Chineke meere m ebere dị ukwuu, wụkwasị m amara ya. Ana m egosikwa na obi ebere Chineke nꞌebe m nọ abụghị ihe efu, nꞌihi na arụọla m ọrụ karịa ndị ozi nile. Ma nꞌezie ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nꞌonwe ya na-arụ ọrụ ya nꞌime m, ịgọzi m. Ma ihe dị mkpa abụghị na m rụrụ ọrụ karịa ha, ma ọ bụkwanụ na ha rụrụ ọrụ karịa m. Ihe dị mkpa bụ na anyị kwusaara unu ozi ọma, na unu kweere nꞌozi ọma ahụ anyị kwusaara unu. Ma ebe unu kweere ihe anyị kwusara, na Kraịst si nꞌọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nꞌọnwụ bilie ọzọ. Nꞌihi na ọ bụrụ eziokwu na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nꞌọnwụ bilie. Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere nꞌime Chineke bụ ihe efu. Mgbe ahụ kwa, anyị bụ ndị ozi Kraịst na-aghagide Chineke ụgha, nꞌihi na anyị na-asị na o mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie, mgbe ndị nwụrụ anwụ na-apụghị ịdị ndụ ọzọ. Nꞌihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, Kraịst ebilikwaghị, nꞌihi na ọ nwụrụ anwụ. Ma ọ bụrụ na Kraịst esighị nꞌọnwụ nilie, unu bụ nnọọ ndị nzuzu inọgide na-atụkwasị obi na Chineke ga-azọpụta unu. Karịsịa, unu nọkwa ugbu a nꞌime mmehie unu. Ọ bụrụ na ihe si otu a dị, ọ pụtakwara na ndị nile nwụrụ anwụ kweere na Kraịst alaala nꞌiyi. Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nꞌime Kraịst gwụrụ nanị na ndụ anyị nꞌime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesịrị ka e meere ebere. Ma eziokwu ahụ pụtara ìhè bụ na e mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie nꞌezie, ọ bụkwa onye mbụ nꞌetiti ndị nile nwụrụ nꞌime ya, ndị na-aghaghị isi nꞌọnwụ bilie nꞌotu ụbọchị. Nꞌihi na dị ka ọnwụ si site nꞌaka otu nwoke rute anyị, otu a kwa ka mbilite nꞌọnwụ si site nꞌaka otu nwoke rute anyị. Dị ka mmadụ nile si nwụọ nꞌihi na ha si nꞌAdam pụta, otu a kwa ka mmadụ nile ga-esi site nꞌọnwụ bilie nꞌihi njikọta e jikọtara ha na Kraịst. Onye ọ bụla ga-ebili mgbe oge ya ruru, ma Kraịst eburula ụzọ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị nile bụ nke ya ga-ebili dịkwa ndụ ọzọ. Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe nile ga-abịa, mgbe Kraịst ga-enyefe alaeze nꞌaka Chineke bụ Nna, nꞌihi na o meriela ndị ọchịchị nile, ndị isi nile na ndị iro nile. Nꞌihi na Kraịst ga-abụ eze tutuu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya nile, doo ha nꞌokpuru ụkwụ ya. Ee, Kraịst ga-abụ eze tutuu ruo mgbe o meriri onye iro nke ikpeazụ bụ ọnwụ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ ekwuola sị, “Chineke edoola ihe nile nꞌokpuru ọchịchị Kraịst.” Ma “Ihe nile” a apụtaghị na Chineke so, nꞌihi na ọ bụ ya na-edo “Ihe nile” nꞌokpuru Kraịst. Mgbe e mere ka ihe nile dịrị nꞌokpuru ọchịchị Kraịst, Kraịst nꞌonwe ya ga-edo onwe ya nꞌokpuru Chineke, ka Chineke onye nyere Kraịst ike, bụrụ onye na-achị ihe nile. Ọ bụrụ na mbilite nꞌọnwụ adịghị, ọ̀ bara uru ime ndị mmadụ baptizim nꞌaha ndị nwụrụ anwụ? Gịnị mere e ji mee ha baptizim ma ọ bụrụ na ha enweghị olileanya na ndị nwụrụ anwụ ga-emesị bilie dị ndụ ọzọ? Gịnị mere anyị ji na-adọgbu onwe anyị nꞌọrụ kwa ụbọchị? Gịnị mere anyị na ọnwụ ji na-agba mgba mgbe nile? Nꞌihi na ọ bụ eziokwu na m na-ahụ ọnwụ anya kwa ụbọchị dị ka o si bụrụ eziokwu na ana m eji ito eto unu nꞌime Kraịst anya isi. Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nꞌụwa a, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nꞌihi ọgụ m na-alụso anụ ọhia, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, ịdọgbu onwe anyị nꞌọrụ adịghị mkpa, kama ka anyị nọọ nꞌoriri na ọṅụṅụ mgbe nile, nꞌihi na ọ bụrụ na anyị nwụọ echi, ebe a ka ihe nile gwụsịrị. Unu ekwela ka e duhie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu egee ndị na-ekwu ụdị okwu ahụ ntị, unu ga-ebido na-akpa agwa dị ka ha. Sitenụ na ndụ mmehie pụta! Unu emehiekwala ọzọ. Ùnu makwaara na ụfọdụ nꞌime unu amaghị Chineke? Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu. Ma mmadụ pụrụ ịjụ ajụjụ sị, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ọ ga-enwe mgbe o si nꞌọnwụ bilie?” Onye nzuzu! Ọ̀ bụ na ị maghị na mkpụrụ ọka i tinyere nꞌala ga-epu nanị ma ọ bụrụ na o buru ụzọ nwụọ? Mgbe o bidokwara ipu, ahihia ndụ nke na-apụta na-adịkwa iche site na mkpụrụ ahụ ị kụrụ. Nꞌihi na mkpụrụ ahụ i tinyere nꞌime ala bụ nanị mkpụrụ kpọrọ nkụ. Ọ bụ Chineke na-enye mkpụrụ ahụ ụdị ahụ ọ chọrọ dị ka o si masị ya. Chineke na-enye mkpụrụ ọ bụla ahụ nke kwesịrị ya. Dị ka e si nwee mkpụrụ dị iche iche, otu a ka e si nwee anụ ahụ dị iche iche. Mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhia nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Nnụnụ nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha. Ndị nọ nꞌeluigwe nwekwara anụ ahụ nke ha, nke dịkwa iche site na nke anyị ndị bi nꞌụwa. Ịma mma ha na ebube nke ndị nọ nꞌeluigwe dịkwa iche na nke ndị bi nꞌụwa. Ịma mma na ebube nke anyanwụ dị iche, ọnwa nwekwara nke pụrụ iche. Otu a kwa, kpakpando nwekwara ịma mma pụrụ iche. Ma ụfọdụ kpakpando na-enwu ọcha karịa kpakpando ndị ọzọ. Otu a ka mbilite nꞌọnwụ ga-adị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nꞌọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Anụ ahụ nke anyị nwere ugbu a, bụ nke pụrụ ịrịa ọrịa na nke pụrụ ịnwụ anwụ. Ma mgbe e mere ka anyị dịrị ndụ ọzọ, a ga-eme ka o bilie nꞌotuto. Ee, ha bụ anụ ahụ na-adịghị ike ugbu a, ma mgbe anyị biliri ọzọ, a ga-eme ka ọ bụrụ anụ ahụ nwere ike. Ọ bụ nanị anụ ahụ mmadụ ka ha bụ mgbe e liri ya, ma mgbe e si nꞌọnwụ kpọlite ha, ha ga-abụ anụ ahụ nke mmụọ na-achị. Dị ka e nwere anụ ahụ nke mkpụrụ obi mmadụ na-achị, otu a kwa ka e nwere anụ ahụ nke mmụọ na-achị. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “E kere Adam nwoke mbụ ka ọ bụrụ mmadụ dị ndụ, ma Kraịst, Adam ikpeazụ, bụ mmụọ na-enye ndụ.” Na mbụ anyị na-enwe anụ ahụ mmadụ, ma nꞌikpeazụ Chineke ga-enye anyị anụ ahụ nke mmụọ na-achị. E si nꞌịta kee Adam nwoke mbụ, ma Kraịst, Adam nke ikpeazụ, si nꞌeluigwe bịa. Mmadụ nile nwere anụ ahụ dị ka Adam, nke e si nꞌịta kpụọ. Ma ndị nile bụ nke Kraịst ga-enwe ụdị anụ ahụ ahụ Kraịst nwere, anụ ahụ nke si nꞌeluigwe. Dị ka anyị nile si nwee anụ ahụ yiri nke Adam, nke si nꞌịta, otu ahụ kwa ka anyị ga-esi nwee anụ ahụ ga-adị ka nke Kraịst onye si nꞌigwe. Ihe m na-agwa unu ụmụnna m, bụ na ihe ọ bụla nke nwere anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Nꞌihi na anụ ahụ anyị a, nke na-anwụ anwụ, abụghị ụdị anụ ahụ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe nzuzo a! Ọ bụghị anyị nile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche. Ihe ndị a ga-emezu na mberede, nꞌotu ntabi anya, mgbe opi ike ahụ dara. Nꞌihi na a ga-esi nꞌelu fụọ opi ike ahụ, nke ga-eme ka ndị nile nwụrụ anwụ nꞌime Kraịst si nꞌọnwụ jiri anụ ahụ ọhụrụ bilie. Mgbe ahụ a ga-agbanwekwa anyị bụ ndị dị ndụ nye anyị anụ ahụ ọhụrụ. Nꞌihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a, nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ. Mgbe nke a mere, ihe ahụ e dere nꞌakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ nke sịrị, “E lomiela ọnwụ, meriekwa ike ya nile. Ọnwụ, olee ebe ike ahụ i ji emeri mmadụ dị? Gị ọnwụ ebee ka ihe ahu i ji agba mmadụ dị?” Nꞌihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbatu mmadụ bụ mmehie, ma iwu ahụ na-egosi mmehie agaghị abụkwa onye ikpe anyị. Ka ekele dịrị Chineke nꞌihi ihe ndị a. Nꞌihi na ọ bụ Chineke nyere anyị mmeri site na Jisọs Kraịst. Ya mere, ụmụnna m, ebe unu maara na unu ga-emeri nꞌikpeazụ, guzosienụ ike nꞌokwukwe unu. Bụrụnụ ndị guzo chịm, ndị nọgidesịrị ike na-arụ ọrụ Onyenwe anyị, nꞌihi na unu maara na ọ dịghị ọrụ ọ bụla unu rụụrụ Onyenwe anyị bụ ihe efu, ebe ha ga-adị mgbe anyị bilitere nꞌọnwụ. Ma okwu banyere ego a na-atụrụ ndị Kraịst nọ na Jerusalem. Leenụ otu unu ga-esi nakọtaa ya. Ihe m na-agwa unu ugbu a bụkwa ihe m gwara ndị chọọchị dị nꞌakụkụ Galatia. Ụbọchị ụka nile, ka onye ọ bụla site nꞌihe ọ kpatara nꞌizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Ihe mmadụ kwesịrị inye dabeere nꞌihe onye ahụ nwere, dị ka Onyenwe anyị si gọzie ya nꞌizu ụka ahụ. Nakọtaanụ onyinye ndị a nile tupu m bịa. Ka a hapụ iche tutuu ruo mgbe m bịara. Mgbe m bịara, aga m enye ndị unu họpụtara onyinye a ka ha bulaara ya ndị Kraịst nọ na Jerusalem. Aga m enyekwa ha akwụkwọ ozi nke ga-akọwa ndị ha bụ, nye nzukọ Kraịst dị na Jerusalem. Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro. Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Agaghị m atufu ọtụtụ oge nꞌebe ahụ. Mgbe m bịara ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutuu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site nꞌinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ. Ọ bụrụ na Chineke ekwee, achọrọ m ka mụ na unu nọọ ogologo oge. Achọghị m ka m bịa taa, laa echi. Ma aga m anọ nꞌEfesọs tutuu emechaa mmemme Pentikọọsụ, nꞌihi na ọrụ ikwusa na izi ihe banyere ozi ọma nke dị ukwuu dịrị m nꞌebe a. Ma dị ka ọrụ si dị ukwuu, otu a ka ndị iro si dịkwa ukwuu nꞌEfesọs. Bikonụ ọ bụrụ na Timoti abịa, nabatanụ ya nꞌihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dị ka m si arụ ya. Ka onye ọ bụla ghara ileda ya anya nꞌihi na ọ bụ okorọbịa. Kama nyerenụ ya aka ka o nwee ike jiri ọṅụ lọghachikwute m. Mụ na ndị nile na-akwado ịlọghachikwute unu na Kọrint na-ele anya ịhụ unu. Arịọrọ m nwanna anyị Apọlọs ka o soro ndị ọzọ ahụ bịara ileta unu bịa, ma o kweghị. Nꞌihi na ọ bụ uche ya na ọ bụbeghị uche Chineke ka ọ bịa ịhụ unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọ bụla ohere pụtara. Na-echenụ nche mgbe nile, guzosienụ ike nꞌime Onyenwe anyị. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọ bụla unu na-arụ. Ùnu chetara Stefanas na ezinụlọ ya? Ha bụ ndị mbụ kweere na Kraịst nꞌala Griis. Ha na-enyekwa onwe ha ijere ndị Chineke nọ ebe nile ozi. Ana m arịọ unu ụmụnna m, ka unu na-eso ihe ọ bụla ndị dị otu a gwara unu. Nyekwaranụ ha aka, ha na ndị ọzọ nile so unu jiri obi ha nile na-arụ ọrụ. Obi tọrọ m ụtọ na Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs bịara nꞌebe a ileta m. Ha emeelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nꞌebe a. Ha mesiri m obi ike, dị ka m si chee na ha sikwa otu a na-agba unu ume. Eji m aka na unu na-egosi ndị dị otu a na ọrụ ha dị unu mma. Ụlọ chọọchị nile dị nꞌokpuru Esia na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na nwụnye ya Prisilia, na nzukọ Kraịst dị nꞌụlọ ha na-ekelekwa unu. Ụmụnna nꞌime Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekele unu. Jirinụ ikwe nꞌaka nke obi aghụghọ na-adịghị kelerịtaa onwe unu. Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede okwu ikpeazụ ndị a dị nꞌakwụkwọ a. Ka onye ọ bụla na-ahụghị Chineke nꞌanya bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị Jisọs bịa ngwangwa! Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. Ka ịhụnanya m dịnyere unu site nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amin. Akwụkwọ ozi a sitere nꞌaka m Pọl onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst na site nꞌaka nwanna anyị bụ Timoti. Ọ bụ unu ndị chọọchị Chineke dị na Kọrint ka anyị na-edere akwụkwọ a, na ụmụ Chineke nile nọ na Griis. Ka amara na udo na-esite nꞌebe Chineke Nna anyị, na nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ, dịrị unu. Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa. Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke. Nꞌihi na dị ka anyị si eketa oke nꞌime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a ka Chineke si na-akasị anyị obi nꞌime Kraịst. Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka a kasie unu obi, na ka a zọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, e sikwa ụzọ dị otu a enyere unu aka, nꞌihi na a na-enye unu ike na ume iji ntachi obi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa. Anyị nwere olileanya na ọ bụrụ na unu enwee nsogbu dị ka anyị nwere, Chineke ga-akasị unu obi, ma nyekwara unu aka dị ka o si nyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị. Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nꞌEsia. Nꞌezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesị dịrị ndụ. Ee, ọ dị nnọọ nꞌoge ahụ, dị ka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesịghị ka anyị tụkwasị obi nꞌike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nꞌime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie. Ọ bụ Chineke bụ onye dọpụtara anyị site nꞌime oke ọnwụ dị otu a. Ọ bụ Chineke ga-adọpụtakwa anyị nꞌoge dị nꞌihu. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nꞌihu na-adọpụtakwa anyị. Ma unu onwe unu nwere ike inyere anyị aka site nꞌikpere anyị ekpere. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ anọgide na-ekpere anyị ekpere, ọtụtụ mmadụ ga-ekelekwa Chineke ekele nꞌihi ngọzi ọ na-agọzi anyị na nꞌihi nchebe ọ na-echebe ndụ anyị. Nꞌihi na otu ihe anyị ji na-anya isi, nke akọnuche anyị na-agwakwa anyị na ọ bụ eziokwu, bụ na mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ, karịsịa mmeso anyị na-emeso unu, bụ mmeso nke obi ịdị ọcha na ikwu eziokwu site na ndabere anyị nꞌime Onyenwe anyị. Anyị emeghị nke a site nꞌamamihe ụwa a, kama site nꞌamara Chineke. Anyị na-edere unu nanị ihe anyị maara na unu nwere ike ịgụ ma ghọtakwa. Mgbe anyị na-edere unu akwụkwọ anyị, ọ dịghị ihe zoro ezo ọzọ anyị dere, bụ nke anyị na-achọghị ka unu ghọta. Ọ bụ ezie na unu amaghị anyị nke ọma ugbu a, ma enwere m olileanya na ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs ga-abịa ọzọ, anyị ga-abụ ihe unu ga-eji nyaa isi, dị ka unu onwe unu ga-esi bụrụkwa ihe anyị ga-eji nyaa isi. Ọ bụ nꞌihi ntụkwasị obi m nwere na unu ga-aghọta, ka m ji zubekwa na mbụ ịbịakwute unu. Ebu m ya nꞌobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nꞌobi na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka m si otu a bụrụ ngọzi nye unu ugboro abụọ, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judia. Ùnu chere na mgbe m zubere ime nke a, na ihe m zubere ime edoghị m anya? Ka ùnu chere na mgbe m zubere nke a, na m zubere ime ya dị ka onye ụwa, nke na-asị, ee, mgbe ihe o bu nꞌobi bụ é,è? Mbaa! Dị ka Chineke si bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, abụghị m onye na-ekwu otu ihe mee ihe ọzọ. Nꞌihi na ee m bụ ee! Ọ dịghị m, bụkwa ọ dịghị. Nꞌihi na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke, onye e sitere nꞌọnụ Sailas na Timoti na mụ onwe m bụ Pọl kwusaa abụghị onye na-asị ee, mgbe ihe o bu nꞌobi bụ ọ dịghị, kama Kraịst bụ onye na-eme ihe o kwuru. Nꞌihi na nkwa nile Chineke kwere mezuru nꞌime Jisọs Kraịst. Ọ bụ nꞌihi nke a ka anyị ji na-enye Chineke otuto a site nꞌaha Jisọs Kraịst. Ọ bụ Chineke nꞌonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nꞌime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e doro iche nye ya. Chineke akakwasịla anyị akara ya igosi na anyị bụ ndị nke ya. O nyekwala anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌime obi anyị dị ka ihe akaebe na anyị ga-anata ihe nile o zubere inye anyị. Chineke bụ onye akaebe m, nꞌihi na ọ maara obi m, ọ maara na ekpebiri m ịhapụ ịbịa Kọrint nꞌihi na achọghị m ime ka obi jọọ unu njọ site na mba nke m bu nꞌobi ịbara unu. Ọbịbịa m ga-abịa abụghị ka m gwa unu ihe unu na-aghaghị ikwere, nꞌihi na okwukwe unu siri ike. Kama, ihe m chọrọ bụ ime ka ọṅụ unu dịwanye ukwuu. Ekpebiri m nꞌime obi m na agaghị m abịakwute unu ọzọ, ime ka obi jọọ unu njọ. Nꞌihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ gaakasị m obi? Ọ̀ bụghị unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ? Ọ bụ nke a mere m ji deere unu akwụkwọ ahụ ka unu nwee ike idozicha ihe nile tupuu ọbịbịa m. Achọghị m ka ndị ahụ kwesịrị ime ka obi tọọ m ụtọ, bụrụ ndị ga-eme ka obi jọọ m njọ. O doro m anya na ọ bụrụ na m ejiri obi ụtọ bịa, obi gaadịkwa unu ụtọ. Nꞌezie, akwụkwọ ahụ m detaara unu wutere mmụọ m nke ukwuu. Nꞌihi na ọ bụ nꞌọnọdụ oke mkpagbu na ihe mgbu, ya na anya mmiri, ka m ji dee ya. Edeghị m ya ime ka unu nọọ nꞌihe mgbu, kama edere m ya ka unu mara otu m si hụ unu nꞌanya, na otu o si na-emetụ m nꞌobi bụ ihe na-eme nꞌetiti unu. Ọ bụghị nanị m ka nwoke ahụ m deere unu ihe banyere ya wetaara obi ọjọọ. Ana m ekwu ihe banyere nwoke ahụ butere nsogbu ndị a nile. Kama o wetakwaara unu obi ọjọọ. Ya mere, achọghị m ka ọ hụọ ahụhụ karịa ka o kwesịrị. Nꞌihi na ntaramahụhụ unu nile kpebiri nye ya ezuola. Ugbu a, bikonụ ụmụnna m, o kwesịrị ka unu gbaghara ya, ma kasie ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu ma ọ bụ daa mba na mmụọ ya, nke ga-eme ka o kpebie ịhapụ iso Kraịst ọzọ. Ya mere, bikonụ, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nꞌanya. Ihe mere m ji dee ihe m dere nꞌakwụkwọ m nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe nile irube isi ime ihe m nyere unu nꞌiwu. Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọ bụla, mụ onwe m kwa ga-agbaghara onye ahụ unu gbaghara. Ọ bụrụkwa na m agbaghara onye ahụ, ana m agbaghara ya nꞌihi unu, na site nꞌike nke Kraịst nyere m. Ihe mere anyị ga-eji gbaghara ya bụ na anyị achọghị inye ekwensu ohere ọ bụla inwe mmeri nꞌebe anyị nọ, nꞌihi na anyị maara ihe ekwensu na-agbalị ime. Mgbe m bịarutere Troas ikwusa ozi ọma Kraịst, Onyenwe anyị megheere m ụzọ izisa ozi ọma. Ma enweghị m izuike nꞌime obi m, nꞌihi na ahụghị m Taitọs ezi nwanna m nꞌebe ahụ. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji sị ndị Troas nọdụnụ nke ọma, mgbe m hapụrụ ha palie ije ịga Masidonia ịgbalị ịchọ Taitọs. Ma ekele dịrị Chineke, onye naedugharị anyị na-enye anyị mmeri, nꞌihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst. Ekele dịkwara Chineke onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọ bụlạ nụrụ isisi ụtọ nke ozi ọma Kraịst. Nꞌihi na nꞌetiti ndị ahụ Chineke na-azọpụta na nꞌetiti ndị ahụ na-ala nꞌiyi, anyị dị ka ụda na-esi isi ụtọ nke Kraịst naachụrụ Chineke. Nꞌetiti ndị ahụ na-ala nꞌiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nꞌetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị hụrụ onwe anyị dị ka ndị zuru oke ịrụ ọrụ dị otu a. Nꞌihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahia. Kama anyị bụ ndị na-edebe onwe ha ọcha nꞌihu Chineke, ndị Chineke nꞌonwe ya họpụtara ịrụ ọrụ a. Anyị na-agba ama na-agwa ndị ọzọ ihe banyere ozi ọma a dị ka a ga-asị na anyị nọ nꞌihu Chineke eje ozi a, na dị ka ndị e jikọtara ha na Kraịst. Okwu ndị a nile anyị na-ekwu o gosiri na anyị na-anya isi nꞌime onwe anyị? Dị ka ndị ọzọ na-eme, ọ̀ dị anyị mkpa iwetara unu akwụkwọ nke ga-akọwa ụdị mmadụ anyị bụ? Ka ọ̀ dị mkpa ka anyị rịọọ unu ka unu nye anyị akwụ-kwọ nke ga-ezi ndị ọzọ ịma mma anyị? Nꞌezie, akwụkwọ ọ bụla adịghị anyị mkpa, nꞌihi na unu onwe unu bụ akwụkwọ e dere iji kọwaa ụdị mmadụ anyị bụ nke mmadụ nile nwere ike ịhụ na ịgụ. Nꞌihi na mgbe ndị mmadụ hụrụ mgbanwe dị na ndụ unu, ha ga-ahụ ọrụ ọma anyị rụrụ nꞌetiti unu. Ọ pụtara ìhè na unu bụ akwụkwọ ozi si nꞌebe Kraịst nọ bịa, nke anyị dere. Ọ bụghị ihe e ji mkpịsị akwụkwọ dee na mbadamba nkume, kama e dere ya nꞌobi mmadụ site na mmụọ Chineke na-adị ndụ. Anyị pụrụ ikwu ụdị okwu a banyere onwe anyị nꞌihi na anyị nwere ntụkwasị obi nꞌime Chineke site na Kraịst, na ọ ga-enyere anyị aka iguzosi ike nꞌeziokwu ahụ anyị na-ekwu. Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nꞌime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọ bụla bara uru site nꞌike aka anyị, kama ihe ọ bụla anyi nwere, ihe ọ bụla anyị rụpụtara, sitere nꞌaka Chineke. Ọ bụ nanị Chineke mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya, na-akọwara ndị mmadụ ihe banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke Chineke chọrọ iji zọpụta ha. Anyị anaghị agwa ha na ọ dị mkpa ka ha debe iwu nile Chineke nyere, kama anyị na-agwa ha na ndụ dịrị ha site na Mmụọ Nsọ. Nꞌihi na ụzọ ochie ahụ nke inwe nzọpụta site nꞌidebe iwu na-eweta ọnwụ, ma nꞌime ụzọ ọhụrụ a, Mmụọ Nsọ na-enye ha ndụ. Ma iwu ahụ na-eweta ọnwụ ji ebube dị ukwuu bịa. Ebube ahụ dị nnọọ ukwuu mee ka ụmụ Izirel hapụ inwe ike ilegide Mosisi anya nꞌihu mgbe o si nꞌelu ugwu Sainai rịdata. Ma nꞌezie, ebube ahụ mesịrị bido ịgabiga. Ọ bụrụ na iwu ahụ ji ebube bịa, anyị kwesịrị ile anya na ụzọ a Mmụọ Nsọ si enye ndụ ga-eji ebube dịkarịrị ukwuu bịa. Ọ bụrụ na ụzọ ahụ na-eweta ọnwụ ji ebube bịa, ebube nke ụzọ ọhụrụ ahụ na-eweta udo nꞌetiti Chineke na mmadụ ga-adịkwa ukwuu. Nꞌezie, a pụghị iji ịdị ukwuu nke ebube ụzọ ọhụrụ a tụnyere ebube pụtara ìhè nꞌihu Mosisi na mgbe oche. Ya mere, ọ bụrụ na iwu ahụ gafere agafe ji ebube bịa, ebube nke ụzọ ọhụrụ a Chineke mere nꞌihi ịzọpụta anyị, nwere ebube ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, ebe anyị nwere olileanya na ebube ụzọ ọhụrụ a agaghị agwụ agwụ, anyị nwere ike ugbu a ikwusa ozi ọma na-atụghị egwu. Anyị agakwaghị ekwu okwu dị ka Mosisi onye weere akwa kpuchie ihu ya, nꞌihi na ọ chọghị ka ụmụ Izirel hụ ebube ahụ mgbe ọ na-agafe agabiga. Ma nꞌezie, ọ bụghị nanị ihu Mosisi ka e jiri akwa kpuchie, kama e mechiri obi ụmụ Izirel ruo taa. Nꞌihi na mgbe ọ bụla ụmụ Izirel gụrụ akwụkwọ nsọ, ọ na-adị ka e ji akwa kpuchie obi ha, nꞌihi na ha adịghị ahụ ma ọ bụ aghọta ihe ha gụrụ. Ma a pụrụ iwepụ akwa mkpuchi dị otu a, nanị ma ọ bụrụ na nwoke ọ bụla ekwere na Kraịst. Ee, tutuu ruo taa, mgbe ọ bụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosisi dere, ihe mkpuchi na-adịgide nꞌobi ha, ime ka ha chee na a ga-azọ-puta ha site nꞌidebe iwu. Ma mgbe onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa, lọghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ a na-eme ka ihe mkpudo ahụ gharakwa ịdị. Nꞌihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ ahụ anyị na-ekwu ihe banyere ya. Ebe ọ bụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nꞌebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya. Ma anyị nile ndị bụ ụmụ Chineke enweghị ihe mkpudo ọ bụla nꞌihu anyị. Anyị dị ka enyo na-egosi ndị mmadụ ebube Chineke. Mgbe Mmụọ Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ya nꞌime anyị, ọ na-agbanwe anyị, ime ka anyị dịrị ka ya. Ya mere, ebe anyị maara na ọ bụ Chineke nyere anyị ọrụ a, site nꞌebere ya, ike adịghị agwụ anyị inwe olileanya. Anyị adịghị ejegharị naaghọgbu ndị mmadụ ime ka ha kwere. Anyị adịghị ejegharị na-agwa onye ọ bụla ka o kwere ihe anyị maara na akwụkwọ nsọ ekwughị. Anyị adịghị etinye aka nꞌihe ihere dị otu a. Kama dị ka a ga-asị na anyị guzo nꞌihu Chineke, anyị na-ekwu eziokwu, dị ka onye ọ bụla na-anụ olu anyị maara na anyị na-ekwu eziokwu. Ma a sịkwa na ozi ọma nke anyị na-ekwusa dị ka ihe e zoro ezo nye onye ọ bụla, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nꞌiyi, ndị ahụ na-ekweghị, nꞌihi na chi nke oge a bụ ekwensu, emeela ka anya nke akọnuche ha kpuo ìsì, ka ìhè nke ebube Kraịst ghara ịmụkwasị ha, ka ha ghara ịnụ ihe anyị na-ekwusa banyere ebube Kraịst, onye dị nꞌụdị Chineke nꞌonwe ya. Nꞌihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma nanị ihe anyị na-ekwu banyere onwe anyị bụ na anyị bụ ndị ọrụ unu nꞌihi ihe Kraịst rụrụ nꞌime anyị. Nꞌihi na Chineke ahụ sịrị ka ìhè si nꞌime ọchịchịrị nwupụta, bụ Chineke ahụ mere ka ìhè ya nwuo nꞌime obi anyị, ka anyị nwee ike ịmata na ìhè ebube ahụ pụtara ìhè nꞌihu Kraịst, bụ ebube nke ya. Ma oke akụ dị otu a, ya bụ ìhè ahụ na ike ahụ si nꞌime anyị na-achapụta ugbu a, na-acha nꞌime anụ ahụ anyị e jiri aja kpụọ, ka e mee ka ọ pụta ìhè, na ike dị ukwuu a, nke na-arụ ọrụ nꞌime anyị, abụghị nke anyị, kama ọ bụ Chineke. A na-akpagbu anyị nꞌakụkụ nile, ma a dịghị akpagbubiga anyị oke. Mgbe ụfọdụ anyị na-enwe obi abụọ nꞌihi na anyị adịghị aghọta otu ihe nile si aga, ma anyị adịghị anọgide nꞌobi abụọ. Ọtụtụ ndị mmadụ na-esogbu anyị ma Chineke adịghị ahapụ nanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nꞌala ma anyị na-ebilikwa na-aga nꞌihu. Ọtụtụ mgbe anyị na-ahụ ọnwụ anya, dị ka Jisọs hụrụ ya. Ka e si otu a mee ka ọ pụta ìhè, na ọ bụ Kraịst onye bi nꞌime anyị na-echebe anyị na-eme ka anyị dịrị ndụ na-aga nꞌihu. Nꞌezie, mgbe nile a na-arara anyị bụ ndị di ndụ na-enye nꞌaka ọnwụ, nꞌihi na anyị na-ejere Jisọs ozi. Ma nke a na-enye anyị ohere igosi ike Jisọs nke na-arụsi ọrụ ike nꞌime ndụ anyị. Nꞌihi ozi ọma anyị na-ekwusa, anyị na-anọ nso nꞌọnụ ọnwụ, ma nkwusa ozi ọma anyị ewetarala unu ndụ ebighị ebi. Anyị na-ekwupụta ihe anyị kweere na-atụghị ụjọ ọ bụla, nꞌihi na anyị kweere na Chineke, dị ka e si dee ya nꞌakwụkwọ Abụ Ọma sị, “Ekweere m na Chineke, ya mere aga m ekwupụtakwa ihe m kwenyere.” Anyị maara na Chineke, onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nꞌọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nꞌọnwụ bilie. Anyị makwaara na ọ gaechebe anyị na unu, tutuu ruo mgbe ọ kpọbatara anyị nꞌihu ya. Nꞌihi na ahụhụ ndị a anyị na-ata ugbu a, bụ nꞌihi ọdịmma nke unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ ekwenye na Kraịst, ọtụtụ mmadụ ga-enyekwa Chineke ekele nꞌihi oke ịhụnanya ya. A gaesikwa otu a nye aha Chineke otuto karịa. Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nꞌobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma Chineke na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. Nꞌihi na nsogbu ndị a anyị na-enwe ugbu a, na-adịgide nanị nwa oge nta. Ma ahụhụ ndị a ga-ewetara anyị ebube na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, nke dị ukwuu karịa nsogbu ndị a. Nꞌihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nꞌihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nꞌihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị nanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Nꞌihi na anyị matara na mgbe anyị nwụrụ, pụọ site nꞌanụ ahụ anyị ndị a pụrụ ire ure, Chineke ga-enye anyị anụ ahụ ọzọ nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nꞌeluigwe. Anụ ahụ ọ ga-enye anyị abụghị nke e ji aka mee, kama ọ bụ nke Chineke nꞌonwe ya kpụrụ. Nꞌezie, anyị nọ ugbu a naasụ ude nꞌime anụ ahụ a anyị nwere. Ọ na-agụsikwa anyị agụụ ike ka e yikwasị anyị anụ ahụ eluigwe ahụ, nke anyị ga-eyikwasị dị ka uwe. Nꞌihi na mgbe e yikwasịrị anyị ụdị anụ ahụ nke eluigwe, anyị agaghị abụkwa nanị mmadụ efu. Mgbe ahụ nile anyị nọ nꞌime anụ ahụ nke ụwa a, anyị naanọgide nꞌịsụ ude. Ọ bụghị nꞌihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị naenweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ ahụ pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi. Nke a bụ ihe Chineke kwadebeere anyị. O nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ya ka ọ bụrụ ihe ga-egosi anyị na ọ ga-emezuru anyị nkwa ahụ. Nꞌihi nke a anyị nwere obi ike na ntụkwasị obi mgbe nile, nꞌihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nꞌihu naadị ndụ nꞌụwa a, anyị anọghị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe. Nꞌihi na ọ bụ okwukwe ka anyị ji mata na ihe ndị a bụ eziokwu site nꞌịtụkwasị Onyenwe anyị obi. Ọ bụghị nꞌihi na anyị ahụla ha. Ya mere, anyị nwere obi ike, ụjọ adịghị atụ anyị. Ọ dị anyị nnọọ ezi mma ịnwụ anwụ anwụ, nꞌihi na site nꞌụzọ dị otu a, anyị ga-alakwuru Onyenwe anyị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe. Ya mere, ma anyị nọ nꞌeluigwe, anyị na Onyenwe anyị, ma anyị nọ nꞌebe a, nꞌụwa a, uche anyị mgbe nile bụ ime ihe ga-adị ya ezi ụtọ. Nꞌihi na anyị nile ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Kraịst, ka o kpee anyị ikpe. Mgbe ahụ onye ọ bụla nꞌime anyị, nꞌotu nꞌotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dị ka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nꞌime ụwa si dị. Ọ bụ nꞌihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Kraịst. Chineke makwaara obi anyị na ha dị ọcha. Enwekwara m olileanya na unu maara m nke ọma nꞌime obi unu. Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ụdị ezi agwa ha nwere. Ara ọ̀ dị anyị ikwu ihe dị otu a banyere onwe anyị? Ọ bụrụ na anyị dị ka ndị akọnuche ha na-ezughị oke, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ iwetara Chineke otuto. Ọ bụrụkwa na ihe anyị na-ekwu na-egosi na anyị bụ ndị isi zuru oke, ọ bụkwa nꞌihi ọdịmma unu. Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nꞌihi na ọ bụrụ na anyị kwenyere na Kraịst nwụrụ nꞌọnọdụ mmadụ nile, anyị na-ekwerekwa na mmadụ nile nwụrụ nye ndụ ochie ha mgbe Kraịst nwụrụ. Kraịst nwụrụ nꞌihi mmadụ nile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị ndụ ga-atọ Jisọs, onye ahụ nwụrụ nꞌọnọdụ ha ụtọ. Ee, Kraịst ahụ e mekwara ka o si nꞌọnwụ bilie ọzọ. Anyị onwe anyị adịghị elekwa onye ọ bụla anya site nꞌihe ndị mmadụ na-eche banyere ha. Nꞌihi na anyị sitere nꞌụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a anyị amakwaghị ya nꞌụzọ dị otu a. Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela. Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nꞌaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo. Ma ugbu a o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nꞌudo. Ozi ọma Chineke ziri anyị ikwusa bụ na ọ chọrọ ka ya na mmadụ nile dị nꞌudo site na Kraịst. Chineke agụkwaghị mmehie nile mmadụ mere megide ya, kama o jirila ọbara Kraịst sachapụ ha. Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nꞌụwa. Chineke ji anyị naagwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dị ka ọ bụ Kraịst nꞌonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke bụrụ enyi. Kraịst emehieghị mgbe ọ bụla, kama, nꞌihi anyị, Chineke mere ka o kere oke nꞌime mmehie anyị, ka o si otu a mee ka e jikọtaa anyị na ya, ka anyị nwee oke nꞌime ezi omume Chineke na-enye. Dị ka ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ nꞌotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nꞌefu, nꞌihi na Chineke egosila unu oke obi ebere o nwere nꞌebe unu nọ. Ma geenụ ntị nꞌihe Chineke na-ekwu, “Nꞌoge a na-anara mmadụ nke ọma ka akwa unu rutere m ntị. Ọ bụkwa nꞌụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Ya mere, ugbu a bụ oge Chineke chọrọ inyere gị aka. Taa ka Chineke jikeere ịzọpụta gị. Anyị na-ebi ndụ anyị nꞌụzọ mmadụ ọ bụla na-agaghị achọpụta ntụpọ ọ bụla nꞌọrụ anyị si otu a taa Chineke ụta. Anyị achọkwaghị ka onye chọrọ ikwere nꞌOnyenwe anyị sụọ ngọngọ nꞌihi ụdị ndụ anyị na-ebi. Kama nꞌime ihe nile, anyị na-agbalịsi ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị ji eziokwu na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachi obi na-edi nsogbu nile na mkpagbu nile na ahụhụ nile naadakwasị anyị. A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nꞌime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nꞌọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nꞌime ịmụ anya. Anyị nọkwara ọtụtụ mgbe naerighị nri. Anyị emeekwala ka unu mata na anyị bụ ndị sitere na ndụ dị ọcha anyị na-ebi, na ezi nghọta anyị ghọtara ozi ọma ahụ, na ogologo ntachi obi na-ejere Chineke ozi. Anyị egosikwala unu na anyị bụ ndị nwere obi ọma, ndị hụrụ unu nꞌanya, na ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ Chineke. Anyị bụ ndị eziokwu na ndị ike Chineke dịnyeere. Ngwa agha anyị bụ ezi omume nke anyị ji alụso onye iro ọgụ, ya kwa ka anyị ji echedo onwe anyị. Ụfọdụ mmadụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu. Ụwa amaghị anyị, ma Chineke maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe nile, ma lee anyị ka anyị dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee Chineke na-echebe anyị ka a hapụ igbu anyị. Anyị na-anọ nꞌihe mwute mgbe nile, ma lee ọṅụ Onyenwe anyị na-enye juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọ bụla, ma lee anyị nwere ihe nile. Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe nile dị anyị nꞌobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu. Anyị ji obi anyị nile hụ unu nꞌanya, ma ọ bụ unu mechiri obi unu nꞌebe anyị nọ. Ana m ekwuru unu okwu ugbu a dị ka a ga-asị na ọ bụ ụmụ nke aka m ka m na-agwa okwu. Anyị chọrọ ka unu gosi na unu hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ unu nꞌanya. Megheenụ obi unu nꞌebe anyị nọ. Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọ bụla. Nꞌihi na gịnị ka ezi omume na ihe ọjọọ nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ? Ọ̀ bụ nnwekọ dị aṅaa dị na-agbata onye Kraịst na ekwensu? Gịnị kwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ? Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọ nsọ Chineke na arụsị? Nꞌihi na anyị onwe anyị bụ ụlọ nsọ Chineke dị ndụ. Ọ bụ Chineke kwuru sị, “M ga-ebi nꞌime ha, jegharịakwa nꞌime ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.” Ọ bụ nke a mere Chineke ji kwuo sị, “Sinụ nꞌetiti ha pụta, wezuganụ onwe unu nꞌebe ha nọ. Unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka, mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu. Mụ onwe m ga-abụ Nna unu, unu onwe unu ga-abụkwa ụmụ m ndị nwoke na ndị nwanyị.” Nkwa ndị a nile ka Chineke kwere anyị, ndị enyi m. Ya mere, ka anyị debe onwe anyị ọcha nꞌime ihe nile, ka ihe ọ bụla ghara imerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Kama ka anyị bie ndụ ịdị nsọ na ịtụ egwu Chineke. Megheenụ obi unu nabata anyị, nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla nꞌetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla anyị rigburu. Anaghị m ekwu okwu ndị a ime ka ihere mee unu, nꞌihi na dị ka m si gwa unu na mbụ, ana m echeta unu nꞌime obi m mgbe nile. Ma o doro m anya, ma ọ bụ na ndụ o, ma anyị na-anwụ anwụ, anyị aghaghị ịnọkọta nꞌotu. Enwere m ntụkwasị obi dị ukwuu nꞌebe unu nọ, ana m anyakwa isi nꞌihi unu. Unu agbaala m ume nke ukwuu. Unu emeela ka m ṅụrịa ọṅụ ọ bụladị nꞌime ahụhụ m. Nꞌihi na mgbe anyị bịaruru ala Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nꞌaka nri na aka ekpe bịakwute anyị. Egwu jupụtakwara anyị obi. Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nꞌọbịbịa Taitọs. Ọ bụkwaghị nanị nꞌihi na ọbịbịa Taitọs nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si nabata ya, na otu unu si kasie ya obi, ma gbaakwa ya ume, mekwara ka anyị ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ọ gwakwara anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru uju nꞌihi ihe nile mere, na otu unu si guzosie ike nꞌukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nꞌebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu. Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nꞌihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla nanị nke nwa oge nta. Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nꞌihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nꞌihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nꞌihi akwụkwọ anyị deere unu. Nꞌihi na Chineke na-eji ihe naewute anyị enyere aka ime ka anyị site na mmehie anyị chegharịa. Ka ọ zọpụta anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ịnabata ihe mwute dị otu a mgbe ọ bụla ha dakwasịrị anyị. Ma ihe naewute onye na-amaghị Kraịst abụghị ihe ga-eme ka o chegharịa, kama ọ bụ ihe na-ewetara ya ọnwụ. Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nꞌihe mwute dakwaịrị unu. Ugbu a unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwa otu unu si mee ihe nile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nꞌokwu ndị a nile. Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nꞌihi onye ahụ mehiere, ma ọ bụ nꞌihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Onyenwe anyị gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nꞌobi. Ewezugakwa ụzọ unu si gbaa anyị ume site nꞌịhụnanya unu nwere nꞌebe anyị nọ, a gbara anyị ume karịa site na nnabata unu nabatara Taitọs, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu. Nꞌihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyaara m isi nꞌihu ya banyere unu; ugbu a obi dị m ụtọ nke ukwuu nꞌihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a ịnya isi m nꞌebe Taitọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu. Ugbu a, ịhụnanya o nwere nꞌebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nꞌihi ncheta ọ na-echeta otu unu nile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya. Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nꞌihi na enwere m ntụkwasị obi nꞌebe unu nọ nꞌime ihe nile. Anyị chọrọ ịgwa unu ihe Chineke sitere nꞌamara ya rụpụta nꞌime nzukọ Kraịst nile dị na Masidonia. Ọ bụ eziokwu na ha nọ nꞌime oke mkpagbu na ihe mwute mgbe nile, ma ha nwere ịnụ ọkụ nꞌobi dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, ewezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye. Nꞌezie, ọ bụghị nanị na ha nyere ihe ha nwere, kama ha nyere karịa ihe ha nwere. Ha nyekwara ihe ha nwere nꞌihi na ha chọrọ inye, ọ bụghị nꞌihi na mmadụ kwagidere ha ka ha nye. Nꞌezie, ha rịọsịrị anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye ha nyere nꞌihi na ha chọrọ iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nꞌihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nꞌọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha. Nꞌihi ụzọ dị otu a ha si nye onyinye ha, anyị rịọrọ Taitọs, onye malitere ọrụ ịnakọta onyinye a, ka ọ rụzuo ya site nꞌịbịa ileta unu na inyere unu aka ịrụzụ ọrụ nke ikenye ndị ọzọ ihe unu nwere. Unu babigara ụba oke nꞌihe nile unu nwere. Unu nwere okwukwe dị ukwuu, nweekwa ọtụtụ mmadụ ndị maara ikwusa ozi ọma nke ọma, na ndị maara ihe. Unu hụkwara anyị nꞌanya nke ukwuu ma gosikwa ịnụ ọkụ nꞌobi unu inye aka. Nꞌihi nke a anyị chọrọ ka unu gbasaa aka unu ịrụ ọrụ ịhụnanya a. Anaghị m enye unu iwu, kama site nꞌizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nꞌobi inye aka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nꞌobi unu ọ ga-adakọtakwa. Nꞌihi na unu maara ụdị oke ịhụnanya na obi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nꞌihi unu, ka unu onwe unu site nꞌogbenye ya bụrụ ọgaranya. Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nꞌokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nꞌafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya. Ma ugbu a achọrọ m ka unu mezuo ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nꞌobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dị ka ihe unu nwere si dị. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ejikere inye onyinye, ọ dịghị mkpa ihe unu nwere ike inye. Ihe Chineke chọrọ bụ ka mmadụ nye ihe o nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye. Nke a apụtaghị na m chọrọ ka unu nye nꞌụzọ ihe ga-esi siere unu ike nꞌihi na unu nyere. Ọ dịghị! Kama, ebe unu nwere hie nne ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nꞌụzọ dị otu a onye ọ bụla ga-enwe ihe dị ya mkpa. *** Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Nwoke ahụ chikọtara hie nne agaghị enwe karịa. Nwoke ahụ chịkọtara ihe dị nta ga-enwezukwa ihe ọ chọrọ.” Anyị kelere Chineke onye nyere Taitọs obi inyere unu aka ekele, dị ka ihe banyere unu si emetụ anyị nꞌobi. Ọ bụghị nanị na o kweere ime dị ka anyị si rịọrọ ya, kama nꞌihi ịhụnanya o nwere nꞌebe unu nọ, o kpebiri nꞌime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka. Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị nwoke ahụ nzukọ nile na-asọpụrụ nꞌihi ọrụ ikwusa ozi ọma Kraịst ya. Ma ọ bụghị nanị nke a, kama ndị nzukọ Kraịst nile họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka nꞌije ozi ịhụnanya a, nꞌụzọ ọ ga-esi wetara Onyenwe anyị otuto. Ije ozi a ga-ezipụta na anyị jikeere inyere ibe anyị aka. Ije anyị na nwanna anyị ga-ejekọta ga-egbochi onye ọ bụla ịta anyị ụta nꞌihe ọ bụla, nꞌihi na anyị achọghị ka onye ọ bụla nwee ohere ịta anyị ụta nꞌihi otu anyị si jizie onyinye a. Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị nanị nꞌihu Chineke, kama nꞌihu ndị mmadụ kwa. Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nꞌobi inye aka. Ugbu a o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nꞌebe unu nọ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ ajụjụ banyere Taitọs, sị ya na ọ bụ onye mụ na ya na-arụ ọrụ inyere unu aka. Sịkwanụ na ụmụnna anyị abụọ ndị ọzọ, ndị ya na ha so, bụ ndị na-anọchi anya nzukọ Kraịst, na ndị na-ewetara Kraịst otuto. Gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nꞌanya. Meekwanụ ka ha mata na ịnya isi anyị banyere unu bụ eziokwu. Ọ dịghị mkpa idere unu akwụkwọ banyere inyere ụmụ Chineke nọ na Judia aka. Amaara m na unu jikeere inyere ha aka, dị ka m nyara isi nye ndị Masidonia banyere unu. Nꞌihi na agwara m ha na unu ndị bi na Akaịa ejikerelarị inyere ha aka kemgbe afọ gara aga. Ọ bụkwa ịnụ ọkụ nꞌobi unu kwaliri obi ha, ime ihe ha mere. Ugbu a ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dị ka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye. Nꞌihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị naanya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụru m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere afọ ojuju na unu gaejikere ejikere. Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nꞌihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nꞌihi na a gwara unu ka unu nye. Ma mgbe unu na-enye onyinye unu, achọrọ m ka unu cheta na nwoke ọ bụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu nꞌubi ya ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. Ka onye ọ bụla nye dị ka o buru ụzọ kpebie nꞌime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nꞌihi na mmadụ kwagidere ya, ma ọ bụ inye nꞌihi na ndị ọzọ na-enye, nꞌihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye oninye ha nꞌanya. Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu naenwezukwa ihe unu chọrọ mgbe nile. Mgbe ahụ unu ga-enwezukwa ihe nile unu ji arụ ọrụ ọma. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Chineke agaghị echefu ọrụ ọma nile nke onye ahụ naagbasa aka ya na-enye ndị ogbenye ihe.” Ma Chineke ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-akụ nꞌubi ya, onye na-enyekwa ya nri nꞌoge owuwe ihe ubi, ga-enyekwa unu nile mkpụrụ dị unu mkpa, nke unu ga-eji kụọ mkpụrụ obi ọma. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ndị a too eto, meekwa ka owuwe ihe ubi unu hie nne. Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya mgbe nile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe nile. Mgbe ndị ọzọ sitere nꞌaka anyị nata onyinye unu, ha nile ga-enye Chineke ekele nꞌihi inyeaka unu nyere ha. Nꞌihi na ọrụ inyeaka nke unu na-enye abụghị nanị na unu gboro mkpa ụmụ Chineke, kama ọ bụkwa na unu na-eme ka ọtụtụ mmadụ nye Chineke ekele. Ndị ahụ unu nyeere aka agaghị aṅụrị ọṅụ nanị nꞌihi onyinye unu nyere ha, kama ha ga-enye Chineke otuto, nꞌihi na unu esitela nꞌinyeaka unu gosi na ozi ọma Kraịst unu na-ekwusa, ma na-agbasokwa bụ eziokwu. Nke a ga-emekwa ka ha nile jiri obi jupụtara nꞌekele kpeere unu ekpere, nꞌihi ịdị ukwu nke amara ahụ Chineke gosiri nꞌebe unu nọ. Ka anyị kelee Chineke ekele nꞌihi onyinye ahụ ọnụ na-apụghị ịkọ o nyere anyị. Ugbu a, mụ onwe m bụ Pọl, onye na-eme nwayọọ nwayọọ mgbe m nọ nꞌetiti unu, na onye naemesi ike mgbe m na-anọghị nꞌetiti unu, na-arịọ unu, dị ka ọ bụ Kraịst na-arịọ unu. Olileanya m bụ na mgbe ọ bụla m bịara ka m ghara inwe obi ike nꞌetiti unu, nꞌihi omume unu nꞌebe m nọ. Nꞌihi na o doro m anya na m nwere ike imesi ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya ike. Ọ bụ ezie na anyị bi nꞌụwa, ma ọ bụghị ike anụ ahụ ka anyị ji alụso mmehie ọgụ. Nꞌihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke ụwa, kama ha bụ ngwa agha dị ike nke Chineke na-enye; ngwa agha ahụ anyị ji akwada nzube nile nke ekwensu wusiri ike, laa ya nꞌiyi. Anyị na-eji ngwa agha ndị a emegide okwu ụgha nile na okwu nganga nile, nke ndị mmadụ na-eji ekpuchi eziokwu nile gbasara Chineke. Anyị na-ejikwa ngwa agha ndị a eme ka obi nile bụrụ ihe e meriri emeri irubere Kraịst isi. Aga m ejikwa ngwa agha a megide ndị nile na-enupụ isi fọdụrụ, mgbe m buru ụzọ jiri ya mee ka unu onwe unu nyefee onwe unu nꞌaka Kraịst. Ihe na-enye unu nsogbu bụ na unu na-ele m anya nanị nꞌelu anụ ahụ chee na m adịghị ike, ma unu adịghị ele m anya nꞌime obi. Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na o nwere ike nke Kraịst na-enye ndị bụ ndị nke ya, ya matakwa na mụ onwe m nwekwara ụdị ike ahụ. Ma ọ bụrụ na unu na-eche na m naanya isi banyere ike ahụ Chineke nyere m nꞌebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji merụọ unu ahụ, aga m emekwa ka unu mata na ihere adịghị eme m ịnya isi otu ahụ. Esi m otu a na-agwa unu okwu nꞌihi na achọghị m ka unu chee na ọ bụ mba ọnụ efu ka m na-aba nꞌakwụkwọ ozi m na-edere unu. Ụfọdụ nꞌime unu na-asị, “Unu echegbula onwe unu banyere ihe Pọl kwuru mgbe ọ na-edere anyị akwụkwọ, nꞌihi ọ na-aba nnọọ mba, ma mba ya enweghị isi. Mgbe ọ bịara nꞌonwe ya, nꞌetiti anyị, ọ na-adị ka otu onye nꞌime anyị. Ọ madịghị okwu ekwu.” Ma ana m adọ ndị na-ekwu ihe dị otu a aka na ntị ka ha jikere chere m, nꞌihi na mgbe m bịara ha ga-ahụ na m ga-emezu ihe m bara mba ya nꞌakwụkwọ ozi a. Agaghị m asị na m bụ onye maara okwu ekwu, dị ka ndị ọzọ ahụ na-azọ agụ agụ nꞌetiti unu, na-akọrọ unu ihe banyere oke okwu ha. Ihe na-enye ndị ahụ nsogbu bụ na ha na-eji onwe ha atụnyere mmadụ ibe ha. Ha lee mmadụ ibe ha anya, ha elee onwe ha anya nyochapụta ụzọ ha si dị mma karịa ndị ọzọ. Ma nke a bụ nzuzu! Ma anyị onwe anyị adịghị anya isi banyere ihe ọ bụla anyị na-enweghị ike ime. Olileanya anyị na nzube anyị mgbe nile bụ ime ihe nile ruo nꞌebe ahụ Chineke chọrọ ka anyị meruo ihe, nꞌọrụ nke anyị na-arụ nꞌetiti unu. Nꞌihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nꞌihe gbasara unu, nꞌihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu ozi ọma gbasara Kraịst. Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ nile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nꞌetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu nꞌime Chineke ga na-eto eto mgbe nile, ka ọrụ ahụ Chineke chọrọ ka anyị rụọ nꞌetiti unu bụrụ nke ga-eto eto. Ka o si otu a bụrụ na mgbe anyị rụsịrị ọrụ anyị nꞌetiti unu, anyị gaenwekwa ike pụọ gaa izisa ozi ọma Kraịst nꞌebe ọzọ dị iche, ebe onye ọ bụla na-adịghị arụ ọrụ; mgbe ahụ o nweghị onye ga-ebo anyị ebubo na anyị na-arụ ọrụ anyị nꞌebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ. Dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịnya isi, ya nyaa isi nꞌihe ahụ Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụghị nꞌihe banyere ihe nke ya onwe ya rụrụ. Nꞌihi na ọ baghị uru onye ọ bụla ịgwa onwe ya okwu sị, “Emere m nke ọma”. Kama ihe dị mkpa bụ Onyenwe anyị ịgwa anyị okwu sị, “Ị mere nke ọma”. Echere m na unu ga-anagide ya ma ọ bụrụ na m ekwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nweenụ ndidi nꞌebe m nọ mgbe m na-ekwu ihe dị m nꞌobi. Ana m echegbu nnọọ onwe m nꞌihi unu, ihe banyere unu na-emetụ m nꞌobi dị ka o si emetụ Chineke nꞌobi. Ọ na-agụ obi m agụụ ịhụ na Kraịst nanị bụ onye unu gaahụ nꞌanya. Achọrọ m ka unu hụ Kraịst nꞌanya dị ka nwagbọghọ naamaghị nwoke si ahụ onye na-achọ ịlụ ya nꞌanya, na-edebekwa onye ya ọcha nꞌihi nwoke ahụ. Ma ana m atụ egwu, nꞌihi na ọ na-adị m ka unu gaekwe ka ụfọdụ mmadụ duhie unu, mee ka unu ghara iwere obi unu nile hụ Onyenwe anyị nꞌanya, dị ka agwọ ahụ si jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv. Ọ pụtara ìhè na ọ gaghị abụ ihe siri ike ụfọdụ mmadụ ịbịakwute unu duhie unu, nꞌihi na ọ bụ ihe e jiri mara unu bụ ịnabata onye ọ bụla bịakwutere unu kwusaara unu Jisọs ọzọ nke naabụghị nke anyị na-ekwusa. Ma ọ bụ kwusaara unu ihe banyere mmụọ ozi dị iche, ma ọ bụ zi unu ụzọ ọzọ dị iche a ga-esi zọpụta unu. Unu ga-anabata ozizi ahụ nile. Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọ bụla ndị ozi a a maara aha ha si kara m mma. A sịkwarị na m amaghị okwu ekwu, ihe m na-ekwu doro m anya. Nꞌihi na o were m anya na unu onwe unu maara nke a, nꞌihi na anyị emeela ka ike ahụ dị nꞌozi ọma anyị na-ekwusa pụta ìhè nꞌihu unu ọtụtụ mgbe. Ọ̀ ga-abụ na emere m ihe ọjọọ nꞌihi na asịghị m unu nye m ihe ọ bụla mgbe m na-ekwusara unu ozi ọma Chineke? Ọ bụ nzukọ Kraịst nọ nꞌebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nꞌetiti unu. Ọ bụ site nꞌaka ha ka m ji nata ego, dị ka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka. Ma mgbe m nọ nꞌetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọ bụla nꞌoge mkpa m. Nꞌihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe nile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nꞌụzọ ọ bụla nꞌoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nꞌoge dị nꞌihu. Nke a bụ nkwa m na-ekwe onwe m. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla nꞌime Griis pụrụ igbochi m ịnya isi na anataghị m inyeaka ọ bụla site nꞌaka onye ọ bụla nꞌetiti unu. Nꞌihi gịnị? Ọ̀ bụ nꞌihi na m ahụghị unu nꞌanya? É, è! Nꞌihi na Chineke maara na m hụrụ unu nꞌanya. Ma aga m aga nꞌihu na-arụ ọrụ m naachọghị ka unu nyere m aka nꞌụzọ ọ bụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dị ka anyị si arụ ọrụ anyị nꞌetiti unu. Nꞌihi na ndị dị otu a abụghị ndị ozi nꞌezie. Ha bụ ndị ụgha, ndị ghọgburu unu ime ka unu chee na ha bụ ndị ozi Kraịst. Ma omume ha adịghị eju m anya, nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya nwere ike ịgbanwe onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè. Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ekwensu ozi emee onwe ha dị ka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nꞌọgwụgwụ oge, ha ga-anata ịta ahụhụ dị ukwuu nꞌihi ajọ ọrụ ha rụrụ. Dị ka m kwuru na mbụ, ka onye ọ bụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dị ka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dị ka ndị ọzọ si eme. Ma ụdị ịnya isi a m chọrọ igosi unu abụghị ihe Onyenwe anyị chọrọ ka m mee, ma achọrọ m ịkpa agwa ugbu a dị ka onye na-enweghị uche. Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ, mụ onwe m gaanyakwa isi nke nta. Ọ bụ unu na-akpọ onwe unu ndị nwere uche, ma unu na-eji obi ụtọ na-ege ntị, na-anabatakwa ihe nile ndị nzuzu na-agwa unu. Ihe mmadụ ndị a na-eme unu agbasaghị unu. Ee, ọ gbasaghị unu ma ha mee unu ndị ohu ha. Ọ gbasaghị unu ma ha nakọrọ unu ihe nile unu nwere, mesoo unu mmeso dị ka ndị karịrị unu ike, ma ọ bụ ndị maara ihe karịa. Ọ gaghị agbasa unu ma ha tie unu aka nꞌihu. Ma ọ bụ na-asị na anyị bụ ndị na-enweghị ike! Nꞌezie, anyị nabatara ka unu kpọọ anyị ndị na-adịghị ike karịa na a ga-agụ anyị dị ka ndị na-emegbu unu. Ma ka m gwa unu, ihe ọ bụla ndị ahụ nwere, ma ọ bụ ihe ọ bụla ha bụ, nke na-eme ha ịnya isi, achọrọ m ka unu mata na m nwekwara otu ihe ahụ, na m bụkwa ihe ahụ ha bụ. Ma ana m ekwu okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Ha na-anya isi na ha bụ ndị Juu! Lee na mụ onwe m bụkwa onye Juu. Ha na-ekwu na ha bụ ndị Izirel ahụ Chineke họpụtara. Otu a kwa, mụ onwe m bụkwa onye Izirel. Ha na-anya isi na-asị na ha bụ ụmụ Eberaham. Mụ onwe m bụkwa nwa Eberaham. Ha na-ekwu na ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi. Ma mụ onwe m ejerrela Kraịst ozi karịa ha nile (amaara m na ụdị okwu a m na-ekwu bụ ụdị okwu onye isi na-adịghị mma na-ekwu). Ma adọgbuola m onwe m nꞌọrụ karịa ha nile. Etinyela m nꞌụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe nꞌihi ikwusa ozi ọma. Etiela m ihe otiti ọtụtụ mgbe. Mgbe mgbe kwa anọọla m nꞌọnụ ọnwụ. Ndị Juu apịala m ọnụ ụtarị iri atọ na toolu ha ugbo ise. E jirila okporo igwe tie m ihe ruru ugboro atọ. A tụọla m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nꞌime ya kpuru nꞌoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nꞌelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m. Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nꞌime ya. Ọtụtụ mgbe ka mmiri gaara eri m. Ọtụtụ mgbe ka ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike gaara ala ndụ m nꞌiyi. Ọtụtụ mgbe kwa ka ndị Juu, ndị obodo nke aka m chọrọ igbu m. Otu a kwa, ọtụtụ mgbe ka m na-eze ndụ m ka ndị mba ọzọ ghara igbu m. Nꞌọtụtụ obodo ukwu, igwe ndị mmadụ achọọla itigbu m, ọtụtụ oge dịkwa mgbe m gaara etufu ndụ m nꞌọzara ma nꞌoke osimiri, na nꞌaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị iro m nꞌezie. Adọgbuola m onwe m nꞌọrụ, anọọla m nꞌọnọdụ ịhụju anya na ịmụ anya ọtụtụ abalị. Ọtụtụ mgbe ana m anọ agụụ na-erighị ihe ọ bụla, ma ọ bụ ịṅụ ihe ọ bụla. Anọọla m ọtụtụ mgbe nꞌoge oyi na-ama jijiji nꞌihi enweghị uwe dị mma m ji achụ oyi. Ma e wezụga ihe ndị a nile, ana m anọ nꞌechiche mgbe nile banyere otu ihe nile si aga nꞌime nzụkọ Kraịst. Ònye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Ònye ka e mere ka ọ daa mba nke ịda mba ya na-adịghị emetụ m nꞌobi, ime ka m baara onye mesoro ya mmeso ahụ mba? Kama ọ bụrụ na o kwesịrị ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m. Chineke, Nna Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesịrị ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a nile m na-ekwu bụ eziokwu. Mgbe m nọ nꞌobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ, nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, dotere ndị agha ya ka ha nọọ na nche nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ ijide m ma ọ bụrụ na m achọọ isite obodo ahụ pụọ. Ma e tinyere m nꞌime nkata, site nꞌoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, ime ka m si otu ahụ gbapụ ọsọ site nꞌaka ya. Ọ bụ ezie na ịnya isi m ndị a bụ ihe nzuzu, ma ebe ọ bụ na m amalitela ịnya isi, ka m gaa nꞌihu nꞌime ya. Ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe nile Onyenwe anyị kpughere gosi m. Afọ iri na anọ gara aga Chineke kpọọrọ m gaa nꞌeluigwe. Amaghị m ihe bụ ọnọdụ m ji gaa nꞌebe ahụ, ma ọ bụ nꞌanụ ahụ, ma ọ bụ nꞌime mmụọ. Ọ bụ nanị Chineke maara ihe mere nꞌụbọchị ahụ. Kama ihe doro m anya bụ na agara m nꞌeluigwe. *** Mgbe m ruru nꞌebe ahụ, ahụrụ m ihe dị omimi, bụ ihe ọnụ mmadụ na-enweghị ike ịkọwa. Ma dị ka ọ dị, e nyeghị m ike ikwu ihe ọ bụla banyere ihe nile m hụrụ. Ebe ahụ m gara na ihe nile m hụrụ bụ ihe mmadụ kwesịrị iji nyaa isi. Ma agaghị m anya isi nꞌihi ha, kama ihe m ga-eji nyaa isi bụ adịghị ike m na otu Chineke si eji onye na-adịghị ike na-arụ ọrụ iwetara onwe ya otuto. A sị na m chọrọ ịnya isi, enwere m ọtụtụ ihe m pụrụ iji nꞌihi ya nyaa isi. Agaghị m abụkwa onye nzuzu ma m nyaa isi nꞌihi ha. Ma agaghị m eji ha nyaa isi nꞌihi na achọghị m ka onye ọ bụla gụọ m na m bụ mmadụ dị mkpa karịa ihe o ji anya ya hụ na ndụ m, na nke ọ nụrụ site nꞌozi ọma si m nꞌọnụ pụta. Ma nꞌihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesị, Chineke emeela ka m nwee ọrịa na-egbu m mgbu oge nile. Ahụ mgbu a nọ ọnọdụ dị ka onyeozi ekwensu. Ọ naenye m nsogbu na-egbukwa m mgbu, ime ka, m ghara iweli onwe m elu. Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọọ Chineke ka o wepụrụ m ahụ mgbu a. Ma ihe ọ zara bụ nke a, “Amara m ezuolara gị. Nꞌihi na ike m na-apụta ìhè karịa nꞌahụ ndị nile na-adịghị ike.” Ugbu a obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nꞌahụ m. Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike. Ọ bụ unu mere m ji si otu a kwuo okwu. Nꞌihi na ọ bụ onwe unu kwesịrị ide ihe ndị a banyere m, ọ bụghị m kwesịrị ide ha. O nweghị ihe ọ bụla mmadụ ndị a unu na-anabata nwere nke m na-enweghị. Ma nꞌezie, abụghị ihe ọ bụla. Mgbe m nọ nꞌetiti unu o nweghị ụzọ m na-esighị gosi unu na m bụ onyeozi Kraịst. Nꞌezie, egosiri m unu na m bụ onye Chineke nꞌonwe ya ziteere unu. Eji m obi dị umeala rụọ ọrụ ebube na ihe ịrịba ama nꞌetiti unu. Ihe ọzọ m na-emere ụlọ nzukọ ndị ọzọ nke m jụrụ imere unu bụ ịnara unu ihe oriri na ịrịọ unu ebe obibi. Bikonụ gbaghara m nꞌihi ihe ọjọọ a m mere unu. Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Ọ dịkwaghị ihe ọbịbịa m ga-efu unu, nꞌihi na achọghị ego unu. Ọ bụ unu onwe unu ka m chọrọ. Unu bụ ụmụ m. Ọ bụkwaghị ọrụ ụmụntakịrị ịkwụrụ nne na nna ha ụgwọ nri ha riri. Ọ bụ nne na nna na-azụtara ụmụ ha nri ha naeri. Nꞌezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe nile m nwere nye unu, maka ọdịmma ndụ mmụọ unu, nꞌihi na ahụrụ m unu nꞌanya. Ma ọ na-adị m ka mgbe ịhụnanya m nꞌebe unu nọ na-adị ukwuu, mgbe ahụ ka ịhụnanya unu nꞌebe m nọ na-adị nta. Ụfọdụ nꞌime unu nwere ike ikwu sị, ọ bụ ezie na Pọl adịghị anara anyị ihe ọ bụla, ma ọ bụ onye aghụghọ! Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ego. Ka m jụọ unu ajụjụ, Ọ̀ bụ nꞌụzọ dị aṅaa ka m si anara unu ego? Ò nwere ụzọ ụmụnna ndị m zitere unu si nara unu ego? Mgbe m rịọrọ Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ, ọ dị uru ọ bụla ha ritere site nꞌọbịbịa ha bịara nꞌebe unu nọ? É,è! Nꞌihi na ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-achị ndụ anyị. Anyị na-agbasokwa nzọ ụkwụ ibe anyị na-arụ otu ọrụ ahụ. Ma eleghị anya unu ga-anọ naeche na okwu ndị a nile m na-ekwu bụ nꞌihi na m chọrọ ka unu nabatakwa anyị. É,è! Kama ana m ekwu nke a nꞌihu Chineke, onye na-anụ okwu m na-ekwu, na ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ inyere unu aka ka anyị ji na-ede ihe ndị a. Ee, inyere unu aka iwuli mmụọ unu elu, ọ bụghị nꞌihi ọdịmma nke anyị. Nꞌihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nꞌetiti unu, ihe m gaahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emo unu agakwaghị atọ unu ụtọ. Nꞌihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ aga m ahụ ọtụtụ nꞌime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nꞌaghụghọ na ịkpa iche iche. Ana m atụ egwu na mgbe m gaabịakwute unu ọzọ Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nꞌihu unu, mee ka m kwaa akwa nꞌihi ụfọdụ nꞌime unu ndị mere ajọ ihe, ma ha achọghị ichegharị site nꞌihe ọjọọ ha mere, na nꞌihi ọtụtụ nꞌime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ. Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Akwụkwọ nsọ ekwuola ya na a ga-esite nꞌama mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ taa onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Nke a na-emekwa ya ịdọ aka na ntị nke ugboro atọ m na-adọ unu ugbu a m na-akwado ịbịakwute unu. Eburula m rị ụzọ dọọ ndị na-eme mmehie aka na ntị nꞌoge gara aga m bịakwutere unu. Ugbu a ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ha na ndị ọzọ nile, dị ka m mere mgbe ahụ m bịara, nꞌihi na mgbe m bịara ugbu a aga m ejikere ịta onye ọ bụla mehiere ahụhụ, o nweghị onye ga-ala nꞌefu. Ebe unu chọrọ ka m gosi unu na ọ bụ Kraịst na-ekwu okwu nꞌime m, unu ga-ahụ ya. Unu ga-ahụ na Kraịst abụghị onye na-adịghị ike, kama na ọ bụ onye na-eji ike ukwuu ya na-arụ ọrụ nꞌime unu. Ọ bụ ezie na a kpọgidere anụ ahụ ya na-adịghị ike nꞌelu obe, ma ugbu a ọ na-adị ndụ site nꞌike dị ukwuu nke Chineke. Anyị onwe anyị adịkwaghị ike nꞌanụ ahụ anyị dị ka Kraịst dị mgbe ọ nọ nꞌụwa, ma ugbu a anyị dị ndụ nweekwa ike, dị ka o nwere. Ike dị ukwuu nile Chineke nwere bụ nke anyị iji ịrụ ọrụ nꞌime unu. Ya mere, ka onye ọ bụla lezie onwe ya anya nwapụta ụdị ndị ọ na-ebi. Ùnu bụ ndị Kraịst nꞌezie? Ùnu agafeela ule ahụ e ji anwapụta ndị bụ nke Kraịst nꞌezie? Leenụ onwe unu anya, Kraịst ò bi nꞌime unu? Ịrụ ọrụ nke ike ya ọ̀ na-apụta ìhè na ndụ unu? Ka ùnu na-ejegharị dị ka ndị Kraịst mgbe unu na-abụghị ndị ya nꞌezie? Enwere m olileanya na unu nile ga-ekwekọta na agafeela m ule ahụ, na abụ m onye Kraịst nꞌezie. Ana m ekpekwa ekpere na Chineke ga-enyere unu aka ibi ezi ndu. Ọ bụghị nꞌihi na anyị chọrọ ka mmadụ site na ndụ unu hụ na anyị ziri unu ihe bụ ezi okwu, kama ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka unu na-eme ezi ihe ọ bụladị mgbe a na-ekwujọ anyị. Nꞌihi na ike ahụ anyị nwere bụ nke anyị ji akwado eziokwu, ọ bụghị nke anyị ji emegide eziokwu. Anyị na-aṅụrị ọnụ mgbe ndị mmadụ na-eleda anyị anya dị ka ndị na-adịghị ike, ma ọ bụrụ na unu onwe unu abụrụ ndị dị ike. Nꞌihi na ekpere anyị bụ ka unu tuozuo oke nꞌime Kraịst. Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nꞌihi na achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ike ahụ Kraịst nyere m inye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dị ka ụlọ. Ugbu a ụmụnna m nꞌime Kraịst, ka m jiri okwu ndị a mechie akwụkwọ ozi a. Na-aṅụrịnụ ọnụ! Na-etokwanụ eto nꞌime Kraịst. Werenụ okwu ndị a m gwara unu rụọ ezi ọrụ. Na-ebikwanụ nꞌudo. Ka Chineke onye hụrụ anyị nꞌanya, na onye na-enye anyị udo dịnyeere unu. Jirinụ ekele obi ọcha keleere m ibe unu nke ọma. Ndị Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekele unu. Ka mara naesite nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ abịa, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ naeweta, dịnyere unu nile. Amin. Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m, Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi. Ọ bụghị mmadụ kpọrọ m ịbụ onyeozi, kama ọkpụkpọ m si nꞌaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka Kraịst site na dnị nwụrụ anwụ bilie. Ndị sokwa m na-ede akwụkwọ a, bụ ụmụnna anyị nile ndị mụ na ha nọ nꞌebe a. Ọ bụkwa unu nzukọ Kraịst dị nꞌobodo Galetia ka anyị na-edetara akwụkwọ a. Ka amara na udo nke na-esite nꞌaka Chineke bụ Nna anyị na nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst apụta dịnyere unu nile. Ọ bụ Kraịst nwụrụ nꞌihi mmehie anyị dị ka Chineke Nna zubere na ọ ga-anwụ, ịgbapụta anyị site nꞌụwa ọjọọ a, nke anyị bi nꞌime ya. Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. O juru m anya, na unu esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe unu, na-agbaso ozi ọma ọzọ, nke na-abụghị ozi ọma Chineke, Onye jiri amara ya, na ịhụnanya ya, kpọbata unu, ime ka unu keta ndụ ebighị ebi ahụ ọ na-enye site na Kraịst. Nꞌihi na ọ dịghị ozi ọma ọzọ dị, ma ọ bụghị nanị ozi ọma nzọpụta ahụ anyị kwusaara unu. Ma ụfọdụ mmadụ a, ndị na-agbanwe ozi ọma Kraịst, na eziokwu dị nꞌime ya, na-eduhie unu ime ka unu si nꞌezi ụzọ jehie. Ka ikpe ọmụma Chineke dị nꞌisi onye ọ bụla, ma mụ onwe m kwa, nke ga-ekwusara unu ozi ọma ọzọ dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị kwusaara unu. Ee, ka ikpe ọmụma dịkwa, ọ bụladị nꞌisi mmụọ ozi ọ bụla si nꞌeluigwe bịa kwusaara unu ozi ọma ọzọ dị iche. Ka m kwuokwa ya ọzọ, “Ikpe ọmụma Chineke ga-adakwasị onye ọ bụla kwusaara unu ozi ọma dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị buru ụzọ kwusaara unu.” *** Eji m aka na unu na-ahụ ugbu a, na achọghị m isite nꞌokwu ire ụtọ, mee ka unu nabata m, kama ihe m chọrọ bụ nanị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Nꞌihi na a sị na m chọrọ ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ onye na-ejere Kraịst ozi. Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na ozi ọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nꞌuche ya, kama ọ bụ ihe si nꞌobi Chineke Nna anyị pụta. Nꞌihi na anataghị m ozi ọma ahụ site nꞌaka mmadụ ọ bụla, ọ dịkwaghị onye ọ bụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nꞌonwe ya bụ onye kpughere ya nye m. Amaara m na unu amatala ihe banyere ndụ m nꞌoge gara aga, otu m si bụrụ onye weere onwe ya nye nꞌihi ofufe ndị Juu, na otu m siri sogbuo nzukọ Kraịst nꞌebe nile, ma gbalịsiekwa ike imegide ya. Abụ m otu nꞌime ndị a maara aha ha nꞌetiti ndị ọgbọ m, nꞌihe banyere ofufe ndị Juu. Enwekwara m oke ịnụ ọkụ nꞌobi ịgbaso, na idebezu ụkpụrụ na omenala ofufe ndị Juu, nke nna nna anyị ha nyere anyị nꞌaka idebe. Ma mgbe m na-eme ihe ndị a, ọ dị otu ihe mere. Nꞌihi na tupuu a mụpụta m site nꞌafọ nne m, Chineke esitelarị nꞌamara ya họpụta m, ịbụ onye nke ya. O sitekwara nꞌamara ya kpọọ m ka m bụrụ onyeozi ya. Chineke mere ka m mata Ọkpara ya, ka m nwee ike ikwusara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere ya. Mgbe Chineke zipụrụ m ikwusa ozi ọma ya nꞌetiti ndị mba ọzọ, o nweghị onye ọ bụla m jewkuru ka o zi m ihe ọ bụla. Agaghị m Jerusalem ịhụ ndị buru m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama e jere m nꞌime ọzara Arebia. Mgbe m nọchasịrị nꞌebe ahụ, alọghachiri m azụ nꞌobodo Damaskọs. Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ileta Pita. Mụ na ya nọkọrọ ụbọchị iri na ise nꞌime Jerusalem. Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ mụ na ya hụrụ anya, karịa kwa Jemes nwanne Onyenwe anyị Jisọs. Ana m agwa unu okwu a nꞌihu Chineke, onye maara na ha bụ eziokwu. Ihe ndị a m na-edegara unu abụghị okwu ụgha. Mgbe m si Jerusalem pụta, agara m Siria na Silisia. Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị nile dị nꞌala Judia amaghị onye m bụ. Ihe ha ma banyere m, bụ nanị ihe ndị ọzọ gwara ha, na “Onye ahụ na-esogbu ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst nꞌoge gara aga, na-ekwusazi ozi ọma ahụ ọ gbalịsịri ike imegide nꞌoge ahụ.” Ha nyere Chineke otuto nꞌihi na echegharịala m. Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas na Taitọs so laghachi Jerusalem nke ugbu abụọ a. Agara m Jerusalem nꞌihi na ọ bụ uche Chineke ka m gaa. Na nzukọ nzuzo nke mụ na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere ozi ọma nke m na-ekwusa nꞌetiti ndị mba ọzọ. Nꞌihi na achọghị m ka ọrụ nile m rụrụ nꞌoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu. Ma ọ bụ ezie na Taitọs onye mba ọzọ so m gaa ije a, ndị isi nọ na Jerusalem akwagideghị ka e bie ya ugwu. Okwu banyere obibi ugwu agaraghị adapụta, ma ọ bụghị na e nwere ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ndị na-abụkwaghị ndị Kraịst nꞌezie, ndị batara nꞌọgbakọ ahụ na nzuzo. Ndị a batara inyocha ụdị inwe onwe anyị nke anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs, na ịchọpụta ma anyị na-erubekwa isi nꞌiwu ndị Juu. Ndị a gbalịrị iji iwu ndị Juu kee anyị agbụ ime anyị ka anyị bụrụ ndị ohu nke iwu ahụ. Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nꞌihe ha kwuru, nꞌihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nꞌozi ọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọ bụla. Ndị isi chọọchị nile nọ nꞌebe ahụ, atụkwasịghị ihe ọ bụla nꞌozi ọma m na-ekwusa nꞌetiti ndị mba ọzọ. Ma ihe banyere ọnọdụ ha dị ka ndị ozi emetụghị m nꞌobi, nꞌihi na anyị nile bụ otu nꞌihu Chineke. Kama, mgbe Pita, Jemes na Jọn, ndị bụ ndị isi chọọchị hụrụ otu Chineke si jiri m rụọ ọrụ, ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, dị ka Chineke nꞌonwe ya si gọzie Pita, nꞌọrụ ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị Juu, nꞌihi na ọ bụ otu Chineke ahụ nyere Pita onyinye ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị Juu, nyekwa m onyinye ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, ndị isi ahụ nile nara mu na Banabas aka, gbaa anyị ume, sị anyị gaa nꞌihu nꞌọrụ anyị, ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nꞌihu ịrụ ọrụ nke ha nꞌetiti ndị Juu. *** *** Kama nanị otu ihe ha rịọrọ anyị, bụ ka anyị cheta inyere ndị ogbenye aka. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike inyere ha aka. Ma mgbe Pita bịaruru Antiọk, atara m ya ụta nke ukwuu nꞌihu ụmụ Chineke nile, nꞌihi na ihe o mere jọrọ njọ nke ukwuu. Nꞌihi na mgbe o buru ụzọ bịa Antiọk, Pita na ụmụnna anyị ndị a na-ebighị ugwu, na-erikọta nri. Ma mgbe ndị Juu, ndị Jemes zitere, bịaruru Antiọk, Pita ekwekwaghị iso ndị mba ọzọ ahụ rikọọ nri, nꞌihi na ọ na-atụ egwu ihe ndị Juu a bu iwu nꞌisi, ndị sị na ọ dị mkpa ibi mmadụ ugwu tupuu a zọpụta ya, ga-ekwu. Nꞌihi ihe a Pita mere, ndị Juu nile bụ ndị Kraịst so anyị nọdụ nꞌebe ahụ, sooro nzọ ụkwụ Pita, mee ihe o mere, jụ iso ndị a irikọta nri, si otu a ghọọ ndị ihu abụọ. Mgbe m hụrụ ihe ọjọọ a ha na-eme, hụ na ha adịghị agazi ije dị ka eziokwu nke ozi ọma ahụ si dị, agwara m Pita okwu nꞌihu ha nile, sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ onye Juu site nꞌọmụmụ a mụrụ gị, ma ị kwụsịla idebe iwu ndị Juu, gịnị mere i ji na-agbalị ugbu a ime ka ndị mba ọzọ a debe iwu ndị Juu ahụ ị jụrụ ajụ?” Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Juu site nꞌọmụmụ a mụrụ anyị, ọ bụ ezie na anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ na-ebi ndụ mmehie, ma anyị bụ ndị Juu maara na mmadụ ọ bụla na Chineke enweghị ike ịdị nꞌudo, site nꞌidebe iwu ndị Juu, kama, na udo na-adị nꞌetiti Chineke na mmadụ nanị site nꞌokwukwe anyị nwere na Jisọs ịsachapụ mmehie anyị. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst, ka e mee ka Chineke nabata anyị, site nꞌokwukwe anyị, ọ bụghị nꞌihi na anyị debere iwu ndị Juu. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a ga-azọpụta nꞌihi na o debere iwu ndị Juu. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Kraịst obi ka ọ zọpụta anyị, mesịa chọpụta na anyị jehiere ụzọ ịtụkwasị ya obi, nꞌihi na nzọpụta dị nanị mgbe e biri anyị ugwu, na mgbe anyị debere iwu ndị Juu, ọ̀ gaghị abụ ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị ekwuo na okwukwe anyị nwere na Kraịst abụrụla ihe wetaara anyị ịla nꞌiyi? Ma Chineke ekwela na mmadụ ga-eche ụdị echiche a banyere Onyenwe anyị. Kama aga m abụ onye na-emebi iwu ma ọ bụrụ na m ebido na-akwalị ozizi ochie ahụ m na-agbalị ịla nꞌiyi, bụ ozizi nke na-asị na nzọpụta na-adịrị nanị ndị debere iwu ndị Juu. Nꞌihi na abụ m onye nwụrụ anwụ nꞌebe iwu dị. Ee, ọ bụ iwu mere ka m nwụọ, ka m si otu a bụrụ onye na-adị ndụ nye Chineke. A kpọgidekọtala mụ na Kraịst nꞌobe, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nꞌime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a, nꞌanụ ahụ m, bụ nke m na-adị nꞌihi okwukwe m nwere nꞌime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nꞌanya, ma werekwa onwe ya nye ka a kpọgide ya nꞌobe nꞌihi m. Ugbu a abụkwaghị m otu nꞌime ndị na-akpọ ọnwụ Kraịst ihe na-enweghị isi. Nꞌihi na a sị na a pụrụ ịzọpụta anyị site nꞌidebe iwu ọ garaghị adị mkpa na Kraịst ga-abịa nwụọ. Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galetia! Ònye bụ dibia ahụ tara ose gbụọ unu nꞌanya, ime ka unu gharakwa ịghọta ihe ọnwụ Kraịst pụtara, dị ka unu si ghọta ya mgbe m kọwaara unu ya na mbụ? Zaanụ m otu ajụjụ a m chọrọ ịjụ unu. Olee otu unu si nata Mmụọ Nsọ? Ọ̀ bụ site nꞌidebe ihe iwu kwuru, ka ọ bụ site nꞌozi ọma unu nụrụ, na nkwere unu kweere? Ọ̀ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Ebe unu na-esiteghị nꞌidebe iwu nata Mmụọ Nsọ na mbụ, ùnu si aṅaa chee na idebe iwu ga-eme ka unu bụrụ ndị Kraịst tozuru oke ugbu a. Bịaa! ahụhụ ndị a nile unu tara nꞌihi na unu bụ ndị Kraịst, ha abụrụla nke efu? Nꞌezie, omume unu gbara m gharịị. Ka m jụọkwa unu ajụjụ ọzọ, Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, na ọrụ ebube ọ rụrụ nꞌetiti unu, ò mere ha nꞌihi iwu unu debere? Ka ọ bụ nꞌihi na unu nụrụ ma kwerekwa ozi ọma ahụ? Nke a bụkwa ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ banyere Eberaham sị, Chineke gụrụ ya nꞌonye ezi omume nꞌihi na o kweere na Chineke ga-emezu nkwa o kwere. Matanụ nke a, na ndị bụ ụmụ Eberaham nꞌezie bụ ndị nile na-atụkwasị Chineke obi dị ka Eberaham mere. Akwụkwọ nsọ lere anya oge ahụ dị nꞌihu, nke bụ ugbu a, mgbe Chineke ga-azọpụta ndị mba ọzọ, site nꞌokwukwe ha nwere nꞌime ya. Nꞌihi na Chineke gwara Eberaham okwu nꞌoge gara aga sị ya, “Aga m agọzi ndị nile tụkwasịrị m obi na mba dị iche iche, dị ka i si tụkwasị m obi.” Ya mere ndị nile tụkwasịrị Kraịst obi, bụkwa ndị na-eso Eberaham eketa ngọzi ahụ Chineke gọziri ya. *** Ma ndị nile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nꞌihi na ha debere iwu ndị Juu, ka ọbụbụ ọnụ Chineke na-adakwasị. Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọ bụla na-edebeghị ọ bụladị otu nꞌime iwu nile e dere nꞌakwụkwọ iwu Chineke.” Ugbu a ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọ bụla Chineke ga-agụ nꞌonye ezi omume nꞌihi na o debere iwu. Akwụkwọ nsọ agwala anyị na ọ bụ nanị site nꞌịtụkwasị Chineke obi ka mmadụ ọ bụla pụrụ inwe ndụ. Leenụ ka ụzọ ịtụkwasị Chineke obi si dị iche site nꞌụzọ nke idebe iwu. Nꞌihi na iwu kwuru na a ga-azọpụta onye na-edebe iwu nanị ma o debezuchara iwu nile Chineke nyere. Ma Kraịst agbapụtala anyị site nꞌọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. O bokwasịrị onwe ya ịbụ ọnụ gaara abụ nke anyị nꞌihi mmehie anyị. Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a na-akwụba nꞌelu osisi.” Ugbu a Chineke nwere ike iji ngọzi ahụ o kwere Eberaham na nkwa gọziekwa ndị mba ọzọ. Anyị nile kwa, dị ka ndị Kraịst, nwere ike isite nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime ya nata Mmụọ Nsọ ahụ e kwere na nkwa. Unu maara ụmụnna m na mgbe mmadụ kwere mmadụ ibe ya nkwa, nkwa ahụ na-adịgide ma ọ bụrụ na e dee ya nꞌakwụkwọ, ma ọ bụrụkwa na onye kwere nkwa edekwasị aha ya nꞌakwụkwọ ahụ. Onye kwere ụdị nkwa a agaghị emesịa gbanwee uche ya kpebie ime ihe ọzọ dị iche. Otu a kwa, Chineke kwere Eberaham na nwa ya nkwa. Ma nkwa a Chineke kwere dịịrị nanị otu nwa Eberaham, onye bụ Kraịst. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na nkwa ahụ adịrịghị ụmụ Eberaham nile. Ihe m na-akọwa bụ nke a: Chineke ekweela nkwa ịzọpụta ndị sitere nꞌokwukwe bịakwute ya. O kwuola ya, dee ya nꞌakwụkwọ, mgbanwe ọ bụla apụghị ịdịkwa. Ọ bụ ezie na mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ gasịrị, Chineke mesịrị nye ndị Juu iwu iri ya, ma nke a apụtaghị na a kagbuola nkwa mbụ ahụ Chineke kwere Eberaham ịzọpụta mmadụ site nꞌokwukwe. Ọ bụrụ na a na-esite nꞌidebe iwu zọpụta anyị, o gosiri na nke a bụ ụzọ ọhụrụ Chineke si anabata anyị. Ọ bụkwa ụzọ dị iche site na nke Eberaham, onye Chineke nabatara nꞌihi na o kweere na Chineke ga-emezu nkwa ya. Gịnị mere Chineke ji nye mmadụ iwu? Chineke nyere iwu ndị a igosi na mmehie dị, na mmehie bara ụba. Ma e mere ka iwu ndị a dịgide nanị tutuu ruo mgbe Mkpụrụ ahụ bịara, onye bụ nwa Eberaham ahụ nkwa Chineke dịịrị. Mgbe Chineke nyere iwu ya o sitere nꞌaka mmụọ ozi ya nye iwu ahụ. Ọ bụkwa mmadụ natara iwu ahụ nyeruo ya ụmụ Izirel. Ebe ọ bụ na o nwere onye natara iwu a nyeruo ya ndị kwesịrị ịnata ya, o gosiri na nke a abụghị mmezu nkwa ahụ. Nꞌihi na ọ dịghị mkpa na a ga-enwe mmụọ ozi ma ọ bụ onye nnyeru ọzọ dị iche, ndị ga-agba ama banyere mmezu Chineke mezuru nkwa o kwere. Nꞌihi na mmezu nkwa ahụ dịịrị, ma daberekwa nanị na Chineke. Nke a ọ̀ na-egosi na iwu Chineke na nkwa ya na-emegide onwe ha? Mba! Chineke ekwela! Nꞌihi na a sị na a pụrụ ịzọpụta anyị site nꞌidebe iwu ọ garaghị adị mkpa Chineke inye anyị ụzọ ọzọ a pụrụ isi gbapụta anyị site nꞌagbụ mmehie. Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na anyị bụ ndị mmehie kere agbụ. Ụzọ mgbapụ dịịrị anyị bụ inwe okwukwe nꞌime Jisọs Kraịst. Tupuu Jisọs Kraịst abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutuu ruo mgbe anyị ga-enwere onwe anyị site nꞌịtụkwasị Kraịst Onye nzọpụta ahụ na-abịa obi. Iwu ahụ dịkwa ka onye ozizi anyị, iduzi anyị nꞌụzọ anyị ga-agbaso, tutuu Kraịst abịa, mee ka anyị bụrụ ndị ezi omume nꞌihu Chineke, site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime ya. Ma ebe ọ bụ na Kraịst abịala, iwu ndị ahụ adịkwaghị anyị mkpa ịbụ ihe ga-eche anyị, na ihe ga-edu anyị bịa nꞌebe Kraịst nọ. Nꞌihi na anyị nile abụrụla ụmụ Chineke ugbu a, site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs. Anyị nile kwa, ndị e sitere na baptizim e mere anyị, mee ka e jikọta anyị na Kraịst nꞌotu, abụrụla ndị e ji ọdịdị Kraịst kpuchie. Ọ dịkwaghị ihe dị iche ugbu a. Nkewa ọ bụla adịkwaghị. A naghị ahụkwa anyị dị ka ndị Juu, ma ọ bụ ndị Griik, ma ọ bụ ndị ohu, ma ọ bụ ndị nwere onwe ha, ma ọ bụkwanụ ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị, kama anyị nile bụ ndị nke Kraịst, ndị e jikọtara nꞌotu nꞌime Kraịst Jisọs. Ọ bụrụkwa na anyị bụ ndị Kraịst, anyị bụkwa mkpụrụ Eberaham. Nkwa nile Chineke kwere Eberaham bụkwa nke anyị. Achọrọ m ka unu cheta na ọ bụrụ na nna nwe ụlọ anwụọ hapụrụ nwa ya dị ntakịrị akụ ya nile, o nweghị ihe dị iche nꞌetiti nwa ahụ na ohu nọ nꞌụlọ ahụ, nꞌihi na nwantakịrị ahụ enweghị ike ilezi akụ ahụ anya. Ọ bụ ezie na akụ ahụ nile bụ nke ya, ma o nweghị ihe ọ pụrụ iji ya mee, tutuu o too, bụrụ dimkpa. Mgbe ọ ka bụ nwantakịrị, ọ ga-eme ihe ndị ahụ e tinyere akụ nna ya nꞌaka kwuru, tutuu ruo mgbe o toruru ọnụ ọgụgụ afọ ahụ nna ya kwuru. Otu a ka ọnọdụ anyị dị tutuu ruo mgbe Kraịst bịara. Anyị nọ dị ka ohu nꞌokpuru iwu ndị Juu, na omenala ha nile, nꞌihi na anyị nwere olileanya na ha ga-azọpụta anyị. Ma mgbe oge a kara aka ruru, oge ahụ Chineke kpebiri, o zitere Ọkpara ya, ka nwanyị mụọ ya dị ka onye Juu. Chineke zitere ya ka ọ gbapụta anyị, ndị nọ nꞌokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ Chineke nꞌezie. Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ ya, Chineke zitere Mmụọ Nsọ ya, ka ọ bịa biri nꞌobi anyị, inyere anyị aka, ikpere Chineke Nna anyị ekpere nꞌụzọ ziri ezi. Ugbu a, anyị abụkwaghị ndị ohu, kama anyị bụ ụmụ Chineke. Ebe ọ bụkwa na anyị bụ ụmụ ya, Chineke ga-enye anyị ihe nile o kwere na nkwa inye ụmụ ya. Tupu unu bụ ndị mba ọzọ amata Chineke, unu bụ ohu nye chi nile mmadụ jiri aka mee, chi nke na-abụghị chi dị ndụ. Ma ugbu a unu amatala Chineke, ka m ga-asị na ọ bụ Chineke chọpụtara unu. Ùnu si aṅaa na-achọkwa ịlaghachi azụ ịghọ ndị ohu nye okpukpe na-enweghị isi, okpukpe nke ike afụ na-adịghị nꞌime ya, okpukpe nke ịchọ ịbụ ndị a na-azọpụta site nꞌidebe iwu? Lee ka unu si agbalị ịchọ ihuọma Chineke, site nꞌidebe ụbọchị ụfọdụ, na ọnwa ụfọdụ, na oge ụfọdụ, na afọ ụfọdụ iche. Unu na-emenye m egwu! Ọ̀ pụtara na ọrụ nile m rụrụ nꞌetiti unu abụrụla ihe efu? Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, na-agbasonụ ụzọ m, bụrụnụ ndị nwe onwe ha dị ka m si bụrụ onye nwe onwe m, site nꞌiwu. O nweghị ihe ọjọọ ọ bụla unu mere m. Mgbe m buru ụzọ bịa nꞌetiti unu, kwusaara unu ozi ọma ahụ, unu maara na ọ bụ nꞌime adịghị ike nke anụ ahụ ka m ji kwusaara unu ozi ọma. Ma ọ bụ ezie na m nọ nꞌọrịa nꞌoge ahụ, unu eledaghị m anya, ma ọ bụ jụ ige m ntị, nꞌihi ahụ ọjọọ m nke gaara abụrụ unu ihe ọnwụnwa iji jụ m. Kama unu nabatara m, dị ka a ga-asị na m bụ mmụọ ozi Chineke zitere, ma ọ bụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nꞌonwe ya. Èbee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere dị, nke anyị nile ji nọkọọ nꞌoge ahụ? Nꞌihi na unu maara nꞌoge ahụ, na a sị na ọ bụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu, tinye ya nꞌọnọdụ anya nke m, iji nyere m aka. Ugbu a, àghọọla m onye iro unu, nꞌihi na m na-agwa unu eziokwu? Ndị ozizi ụgha ahụ ihe banyere unu na-anụ ọkụ nꞌobi achọghị ịdọtara unu onwe ha nꞌihi ọdịmma unu. Kama ihe ha na-achọ ime bụ ka nkewa dị nꞌetiti mụ na unu, ka unu si otu a hapụ ige m ntị. Ọ bụkwanụ ihe dị mma, ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ejiri obi na-anụ ọkụ na obi zuru oke na-achọ ọdịmma unu, nke ka nke, ọ bụrụ na ha adịghị eme ya nanị mgbe m nọ nꞌetiti unu. Ezi ụmụ m, lee ka omume unu si ewute mmụọ m. Lee ka m si nọdụkwa nꞌọnọdụ ihe mgbu, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka unu zuo oke nꞌime Kraịst, dị ka nwanyị nọ nꞌihe mgbu si eche ọmụmụ nwa ọhụrụ ya. Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nọ nꞌetiti unu ugbu a, nwee ike ịmata otu m ga-esi gbanwee olu okwu m, nꞌihi na amaghị m ihe m kwesịrị ime nꞌihi ọnọdụ unu. Ugbu a geenụ m ntị, unu ndị na-eche na ọ dị mkpa idebe iwu ndị Juu tupu a zọpụta unu. Gịnị mere unu ebughị ụzọ chọpụta ihe iwu ndị ahụ pụtara? Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na Eberaham mụtara ụmụ nwoke abụọ. Otu nꞌime ha bụ nwa nke ohu ya nwanyị mụrụ, nke ọzọ bụ nke nwụnye ya na-abụghị ohu mụtara. A mụrụ nwa ahụ ohu nwanyị ahụ mụrụ dị ka e si amụ ụmụaka ndị ọzọ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ nke a mụrụ nanị mgbe Chineke kwere Eberaham nkwa na-aga amụ ya. Ugbu a, akụkọ otu e si mụọ ụmụ abụọ a bụ ihe na-egosi anyị ụzọ abụọ pụtara ìhè Chineke si enyere mmadụ aka. Otu ụzọ bụ ụzọ inye ha iwu ya ka ha debe. O nyere ha iwu a nꞌugwu Sainai mgbe o nyere Mosisi iwu iri ahụ. Aha ọzọ ndị Araab na-akpọ ugwu Sainai bụ Ugwu Hega. Hega bụ ohu nwanyị ahụ Eberaham lụrụ. Ọ nọchiri anya obodo Jerusalem nke bụ obodo ndị Juu, ebe isi oche okpukpe ime ihe na-atọ Chineke ụtọ site nꞌidebe iwu dị. Ndị Juu ahụ na-agbalịkwa iso ụzọ a bụ ụmụ Hega, bụrụkwa ndị ohu dị ka ya. *** Ma obodo anyị, ebe isi oche okpukpe anyị dị bụ Jerusalem dị nꞌeluigwe. Ọ bụ obodo na-anọghị nꞌohu nye iwu ndị Juu. Ọ bụ nke a mere Aịzaya jiri buo amụma sị, “Ṅụrịa ọṅụ ugbu a, gị nwanyị ahụ na-amụtaghị nwa. Tie mkpu ọṅụ gị onye na-enweghị ike mụta nwa ọ bụla. Nꞌihi na aga m enye gị ọtụtụ ụmụ, ụmụ gị ga-akarị ụmụ nke nwanyị ohu ahụ nwere.” Ma anyị onwe anyị ụmụnna m bụ ụmụ ahụ Chineke kwere nkwa ya. Anyị dị ka Aịzik. Nꞌihi nke a, anyị ndị e sitere na Mmụọ Nsọ mụọ ka ndị chọrọ ka anyị soro ha na-edebe iwu na-emegbu, na-esogbukwa, dị ka Ishmel nwa Hega, nwanyị ohu, si megbuo, ma sogbuokwa Aịzik. Ma akwụkwọ nsọ gwara anyị na Chineke nyere Eberaham iwu sị ya chụpụ Hega, nwanyị ohu ahụ na nwa ya, nꞌihi na nwa nwanyị ohu enweghị ike isoro nwa nwanyị na-abụghị ohu keta oke nꞌakụ na ụba Eberaham. Ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nwanyị ohu mụtara, ndị a mụrụ ka ha na-edebe iwu ndị Juu, kama anyị bụ ụmụ nwanyị nwere onwe ya, nne nwe ụlọ, ndị Chineke na-anabata nꞌihi okwukwe anyị nwere nꞌime ya. Ugbu a, Kraịst emeela ka anyị pụọ nꞌohu. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu nọ dị ka ndị nwe onwe ha. Unu alaghachikwala azụ idebe iwu na omenala ndị Juu. Geenụ m ntị! Mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu echee na obibi ugwu na idebe iwu ndị Juu ga-eme ka unu bụrụ ndị ezi omume nꞌihu Chineke, Kraịst enweghị ike ịzọpụta unu. Ka m kwuokwa ya ọzọ. Onye ọ bụla kweere ka e bie ya ugwu, nꞌihi na ọ chọrọ ka Chineke si otu a nabata ya, aghaghị idebezu iwu nile ndị Juu, ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịla nꞌiyi. Kraịst agaghị abara unu uru, ma ọ bụrụ na olileanya unu bụ isite nꞌidebe iwu bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Unu abụrụla ndị furu efu nꞌebe amara Chineke dị. Ma anyị onwe anyị na-esite nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ na-enwe olileanya na ọnwụ Kraịst nwụrụ asachapụla mmehie anyị, ime ka anyị na Chineke dịrị na mma. Anyị, ndị Kraịst mere ka anyị keta oke na ndụ ebighị ebi, adịghị echegbu onwe anyị ma anyị bụ ndị e biri ugwu ma anyị abụghị. Anyị adịkwaghị echegbu onwe anyị ma anyị na-edebe iwu na omenala ndị Juu, ma anyị adịghị edebe ha. Ihe dị anyị mkpa bụ okwukwe nke si nꞌịhụnanya na-egosi onwe ya. Unu naara ejezi ije okwukwe unu nke ọma, ònye bịara gbochie unu ịga nꞌihu nꞌije a? Ọ pụtạra ìhè na ọ bụghị Chineke mere nke a nꞌihi na ọ bụ ya onwe ya kpọbatara unu nꞌọnọdụ inwe onwe unu nꞌime Kraịst. Ma chetanụ na ọ bụ nanị otu mkpịsị aka na-arụta mmanụ nke na-emetụta mkpịsị aka ndị ọzọ. Ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi ka ọ kpọghachite unu nꞌọnọdụ okwukwe ahụ ga-eme ka unu kwenye nꞌihe nile dị ka m si kwenye na ha. Chineke ga-atakwa onye ahụ ahụhụ, bụ onye ahụ buteere unu nsogbu a, ma na-agbalị iduhie unu. Ụfọdụ mmadụ dị ndị na-asị na m na-ekwusa na-asị na ibi mmadụ ugwu na idebe omenala ndị Juu dị mkpa tupuu azọpụta mmadụ. Ọ bụrụ nꞌezie na m na-ekwusa ihe dị otu a, agaghị m abụ onye a na-akpagbu, nꞌihi na ụdị okwu dị otu a adịghị ewetara onye na-ekwusa ya nsogbu. Ma ebe ọ bụ na a na-akpagbu m, o gosiri na ihe m na-ekwusa bụ na nzọpụta dị nanị site nꞌokwukwe nꞌobe Kraịst. Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na ndị a chọrọ ka e bie unu ugwu ga-ebipụ onwe ha site nꞌebe unu nọ. Nꞌihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu enweghị onwe unu ime ihe ọjọọ, kama Kraịst mere ka unu nwere onwe unu ime ka unu hụ ibe unu nꞌanya, na ijere ibe unu ozi. Nꞌihi na ọ bụrụ na a chikọtaa iwu nile nꞌotu, ihe iwu nile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nꞌanya dị ka unu si hụ onwe unu nꞌanya.” Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kama ịhụ ha nꞌanya, kpacharanụ anya. Jienụ onwe unu aka ka unu hapụ ịla onwe unu nꞌiyi. Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu. Kweenụ ka Mmụọ Nsọ na-achị ndụ unu, ịgwa unu ihe unu ga-eme, ma ọ bụ ebe unu ga-aga. Nke a ga-eme ka unu hapụ imezu ihe ọjọọ ndị ahụ anụ ahụ ochie unu chọrọ ka unu mee. Nꞌihi na ihe anụ ahụ ochie anyị chọrọ bụ ime nanị ihe ọjọọ ahụ megidere ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ka anyị mee. Ihe ọma ọ bụla anyị na-eme mgbe Mmụọ Nsọ na-achị ndụ anyị abụghị ihe ndụ anyị chọrọ. Ọchịchọ nke ndụ anyị na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ anaghị adakọta. Nke a mere o ji bụrụ na ịgba mgba na-adị mgbe nile nꞌuche anyị, mgbe anyị chọrọ ime ihe ọ bụla, nꞌihi na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ na ọchịchọ nke anụ ahụ anyị na-agbalị ịchị mkpebi anyị banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime. Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nꞌokpuru iwu. Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko. Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu. Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke. Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na ịdị nwayọọ, na nke emebigaghị ihe oke. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. Ma ndị nile bụ ndị Kraịst akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nꞌelu obe. Ọ bụrụkwa na anyị na-adị ndụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ka anyị soro nduzi na ntụzi Mmụọ Nsọ nꞌakụku nile nke ndụ anyị. Mgbe anyị na-eso ụzọ a, anyị agaghị abụ ndị na-ele anya ka ndị ọzọ sọpụrụ anyị, ma ọ bụ too anyị, nꞌihi na nsọpụrụ na otuto dị otu a, na-ebute ekworo na obi ilu nꞌetiti anyị. Ụmụnna m, asị na nwa Chineke ọ bụla adaba na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nꞌezi ụzọ. Nꞌihi na ònye ma ihe ga-eme echi? Ònye ma onye ọ bụ nꞌetiti unu nke ga-adaba na mmehie echi? Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma sitenụ otu a debezuo iwu Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌetiti unu echee na ya bụ onye dị mkpa, onye na-apụghị iweda onwe ya ala mee ihe ndị a, onye ahụ na-eme onwe ya onye nzuzu. O nwekwaghị ihe onye ahụ bụ nꞌezie. Ka onye ọ bụla nꞌetiti unu ghọta ma kpebie nꞌobi ya na ihe ọ na-eme ziri ezi. Mgbe ahụ ọ ga-enwe afọ ojuju nꞌime onwe ya na ọrụ ya bụ ezi ọrụ. Ọ gaghị adịkwa mkpa na ọ ga-eji onwe ya tụnyere onye ọzọ. Anyị nile nꞌotu nꞌotu kwesịrị ibu ibu ịta ụta dịrị anyị. Ka ndị nile a na-ezi okwu Chineke kenye ndị na-ezi ha ihe, ihe ọma nile ha nwere. Unu ekwela ka e duhie unu, nꞌihi na mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịgbaketa Chineke azụ, ghara ịta ahụhụ dịrị ya, nꞌihi omume ahụ. Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-ewetakwa nꞌubi ya. Onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ anụ ahụ ya, ga-esitekwa nꞌanụ ahụ ahụ webata ọnwụ dị ka ihe ubi, ma onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ Mmụọ Nsọ, ga-esite na Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi. Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nꞌihi na mgbe e mesịrị, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzi dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba. Nꞌihi nke a, dị ka anyị si nwee oge, ka anyị na-arụ ezi ọrụ nꞌebe mmadụ nile nọ, ma nke ka nke, ka anyị na-arụ ezi ihe, karịsịa, nꞌebe ụmụnna anyị nꞌime Kraịst nọ. Aga m eji aka m depụta okwu ndị a m chọrọ ka unu gụọ. Leenụ otu mkpụrụ akwụkwọ m ji dee ha si dị okpotokpo. Ndị ozizi ahụ na-abịakwute unu, na-agbalị iduhie unu ka e bie unu ugwu, na-eme ya nꞌihi otu ihe. Ha chọrọ ka ndị mmadụ mara ha, ka ha si otu a gbanarị mkpagbu a gaara akpagbu ha, ma ọ bụrụ na ha kwusaa sị na ọ bụ obe Kraịst nanị nwere ike ịzọpụta anyị. Ndị ozizi ahụ na-ezi unu na obibi ugwu bara uru, adịghị agbalị idebe iwu ndị Juu ndị ọzọ. Ma ha chọrọ ka e bie unu ugwu, ka ha site na ya na-anya isi, na unu bụ ndị na-eso ụzọ ha. Ma Chineke ekwela ka m nyaa isi nꞌihe ọ bụla karịakwa nꞌobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌobe ahụ ka ihe nile dị nꞌụwa, nke na-atọ m ụtọ, na nke na-agụ m agụụ, ji bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Ụtọ nke ụwa na-enwetakwa site nꞌaka m, abụrụkwala ihe nwụrụ anwụ. O nweghị ihe ọ bụla dị iche nꞌime ya, ma e biri anyị ugwu ma e bighị anyị ugwu. Ihe dị mkpa bụ ma a gbanweela anyị nꞌezie, ịbụ ndị dị ọhụrụ na ndị dị iche. Ka udo na ebere dinyere ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka ụkpụrụ ndị a nile si dị. Ka udo na ebere dịkwara ndị nile nọ ebe nile, bụ ndị nke Chineke nꞌezie. Bikonụ, site ugbu a gaa nꞌihu, achọghị m ka onye ọ bụla nyee ndụ m nsogbu, nꞌihi ihe ndị a. Nꞌihi na ebu m nꞌahụ m, mpa apịpịa nile a pịara m, na ọnya nile ndị iro Jisọs nyere m nꞌahụ, nke na-egosi na abụ m odibo Jisọs nꞌezie. Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu nile. Akwụkwọ ozi a sitere nꞌaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ka m na-edere ya, unu ụmụ Chineke bi nꞌEfesọs. Ee, ọ bụ unu ka m na-edere akwụkwọ a, unu bụ ụmụ Chineke kwesịrị ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke na-esite nꞌebe Chineke Nna anyị na nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ dịrị unu. Ka otuto dịrị Chineke, Onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ gọziri anyị site nꞌinye anyị ngọzi nile nke eluigwe nꞌihi na anyị bụ nke Kraịst. Nꞌihi na leenụ ihe Chineke meere anyị! Tupu o kee ụwa, ọ họpụtara anyị ịbụ ndị nke ya nꞌihi na ọ maara ihe Kraịst ga-emere anyị. Ọ họpụtara anyị ka o nwee ike mee anyị ndị dị nsọ na ndị na-agaghị enwe ịta ụta nꞌihu ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Ọ bụ rị uche ya ime anyị ụmụ ya site nꞌihe Kraịst ga-eme. Ma o mekwara ihe ndị a nile nꞌihi na ọ tọrọ ya ụtọ nꞌobi ime ya. Ka anyị site na nke a too ya nꞌihi obi ọma ya bara ụba nke ukwuu, nke o gosiri anyị, na ihuọma ya, nke o mere ka o rute anyị aka nꞌihi na anyị bụ ndị nke Jisọs Kraịst, Nwa ya ọ hụrụ nꞌanya. Lee otu obi ọma Chineke siri dị ukwuu nꞌebe anyị nọ! Nꞌihi na site nꞌọnwụ Kraịst, o mere ka anyị nwere onwe anyị. Ọ bụkwa site nꞌọnwụ Kraịst ka ọ gbaghaara anyị mmehie anyị. Chineke egosila anyị ịba ụba nke amara ya. Nꞌihi na ọ maara anyị nke ọma. Ọ na-ewerekwa ihe kachasị mma nye ndụ anyị mgbe nile. Chineke emeela ihe o zubere na ọ ga-eme. O meela ka nzube ya zoro ezo pụta ìhè site nꞌizite Kraịst. Nꞌihi na nke a bụ ihe o zubere site na mgbe ochie. Nke a bụkwa ihe o zubere: Na mgbe oge ahụ ruru, ọ ga-akpọkọta ụmụ ya nile na ihe nile o kere nꞌeluigwe na nꞌụwa, ka Kraịst bụrụ isi ihe nile. Nꞌihi na site nꞌihe Kraịst meere anyị, anyị abụrụla ndị ga-eso keta ihe ndị ahụ Chineke kwere nkwa inye Kraịst. Nꞌihi na Chineke họpụtara anyị site nꞌoge gara aga ịbụ nke ya. Ihe ndị a ga-emezukwa dị ka ọchịchọ Chineke siri dị. Ya mere, ka anyị bụ ndị buru ụzọ tụkwasị Kraịst obi, too ebube Chineke nꞌihi ihe ndị a o meere anyị. Nꞌihi na otu a ka ọ dịkwa unu onwe unu. Unu kweere nꞌozi ọma ahụ na-eweta nzọpụta mgbe unu nụrụ ya. Mgbe unu kwekwara, Chineke nyere unu Mmụọ Nsọ ya ka o biri nꞌime unu dị ka akara a kakwasịrị unu igosi na unu bụ ndị nke ya. Mmụọ Nsọ nọkwa ọnọdụ dị ka ihe akaebe igosi na anyị ga-anata ihe nile Chineke kwere nkwa inye ndị ya. Mmụọ Nsọ a bụkwa ihe ga-eme ka anyị nwee obi siri ike na Chineke ga-arụzu ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ nile bụ nke ya. Ya mere, ka anyị too ebube Chineke. Ọ bụ nꞌihi ihe ndị a nile, site na mgbe m nụrụ akụkọ otu okwukwe unu siri sie ike nꞌime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa otu unu siri na-ahụ ndị kwere ekwe nọ ebe nile nꞌanya, esepụghị m aka ikele Chineke ekele nꞌihi unu. Nꞌihi na mgbe nile ka m na-echeta unu nꞌekpere m nile, na-arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube nile, ka o nye unu mmụọ amamihe ka unu nwee ike ịhụ na ịghọtakwa nke ọma onye ọ bụ. Ana m arịọkwa Chineke ka o meghee obi unu ka unu hụ ìhè ya, ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nꞌihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu. Ana m arịọkwa Chineke ka o nyere unu aka ịmata ụdị ngọzi ndị ahụ dị ebube o kwere nkwa inye ndị ya. Ana m arịọkwa Chineke ka o mee ka unu ghọta na ike dị ukwuu nke na-arụ ọrụ nꞌime anyị bụkwa otu ike ahụ, Chineke jiri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, mee ya ka ọ nọdụ nꞌakụkụ aka nri ya nꞌeluigwe. Nꞌebe ahụ ka Kraịst na-achị ndị ọchịchị nile nọ nꞌeluigwe, na ndị isi nile, na ndị nwere ike nile, na ndị nwe mmadụ nile. Ọkwa eze ya dị elu karịa ọkwa eze ndị dị ike nile nọ nꞌụwa a, na nꞌụwa ọzọ. Chineke emeela ka ihe nile dị nꞌokpuru ike Kraịst, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe nile nke nzukọ ya bụ chọọchị. Nꞌihi na chọọchị bụ anụ ahụ Kraịst. Ọ bụkwa ihe na-emezu Kraịst onye ya onwe ya bụ mmezu ihe nile nꞌebe nile. Na mgbe ochie, unu bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ unu nꞌihi na ndụ unu jupụtara na mmehie na nnupụ isi. Ma Chineke emeela ka mmụọ unu dịkwa ndụ ọzọ. Nꞌihi na unu bụ ndị biri na mmehie na mgbe ochie, na-agbaso ụzọ ọjọọ nile nke ụwa. Unu na-erubekwara ekwensu isi, onye na-achị mmụọ ọjọọ nile bi nꞌikuku, onye ya onwe ya bụ onye anya na-adịghị ahụ. Ọ bụkwa ekwensu na-achị ndị nile na-adịghị erubere Chineke isi. Ọ bụkwa nꞌetiti ndị dị otu a ka anyị jegharịrị nꞌoge gara aga, na-agbaso ọchịchọ nile nke anụ ahụ ma na-emekwa ihe ọ bụla ahụ anyị na obi anyị chọrọ. Nꞌihi na site nꞌọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nꞌọmuma ikpe Chineke. Ma ebere Chineke bara ụba nke ukwuu! Ịhụnanya ya nꞌebe anyị nọ dịkwa ukwuu! Nꞌihi na mgbe mmụọ anyị nwụrụ anwụ nꞌime mmehie, Chineke nyekwara anyị ndụ ọzọ mgbe o mere ka Kraịst site nꞌọnwụ dịrị ndụ. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e jiri zọpụta anyị. Dị ka o siri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, otu a ka Chineke siri kpọlitekwa anyị site na ndụ ochie anyị, mee ka anyị soro Kraịst nọkọọ nꞌeluigwe. Chineke mere nke a igosi ịdị ukwuu nke amara ya nꞌọgbọ nile, na igosi obi ọma ya nꞌebe anyị nọ nꞌime Kraịst. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke! Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta. Ọ bụ Chineke mere anyị ihe anyị bụ! O kere anyị ọhụrụ nꞌime Kraịst Jisọs ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka o siri kwadoo na anyị kwesịrị ibi ndụ ụbọchị nile. Ya mere, chetanụ na unu bụ ndị mba ọzọ site nꞌọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na ndị Juu ndị kpọrọ onwe ha ndị e biri ugwu, na-akpọkwa unu ndị a na-ebighị ugwu, nꞌihi ihe ndị a e mere ha nꞌanụ ahụ. Chetakwanụ ihe unu bụ nꞌoge gara aga. Nꞌoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. Unu bụ ọbịa nꞌebe ụmụ Izirel ndị Chineke họpụtara nọ. Unu enweghị òke nꞌime ọgbụgba ndụ na nkwa nile Chineke nyere ụmụ Izirel. Unu biri nꞌụwa na-enweghị olileanya, na-enwekwaghị Chineke. Ma ugbu a, site na njikọta e jikọtara unu na Kraịst, unu ndị nọ nꞌebe dị anya, ka e mere ka unu bịaruo Chineke nso site nꞌọbara Kraịst nke a wụsịrị. Nꞌihi na Kraịst wetaara anyị udo. O mere ka ndị Juu na ndị mba ọzọ buru otu. Ọ kwaturu mgbidi kewera ha na mgbe ochie. Ọ kagburu iwu ndị Juu ka o nwee ike mee ndị Juu na ndị mba ọzọ otu agbụrụ ndị e jikọtara ọnụ nꞌime ahụ ya. Site nꞌụzọ dị otu a, o mere ka udo dịrị. Site nꞌọnwụ ya nꞌelu obe, o mere ka ekworo dị nꞌetiti ndị Juu na ndị mba ọzọ gwụsịa. Sitekwa nꞌọnwụ ya nꞌobe, o mekwara ha abụọ ka ha bụrụ otu. O sitekwara nꞌụzọ dị otu a mee ka ha bịaghachikwute Chineke. Ya mere, Kraịst bịara kwusaa ozi ọma nye mmadụ nile. O kwusara ozi ọma nye ndị Juu nọ nso, na unu ndị mba ọzọ nọ nꞌebe dị anya. Nꞌihi na ọ bụ site na Kraịst ka anyị nile, ndị Juu na ndị mba ọzọ, nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke site nꞌotu Mmụọ ahụ. Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ụmụ Chineke nile bụrụ diala nꞌezinụlọ Chineke. Unu bụkwa ndị a na-ewusi ike nꞌokwukwe site na ntọ ala nke ndị ozi Kraịst na ndị amụma ya tọrọ. Kraịst bụkwa nkume dị mkpa na ntọ ala ahụ. Kraịst bụkwa onye na-ejikọta ụlọ obibi ahụ nile nke ọma. Ọ bụkwa ya na-eme ka o too bụrụ ụlọ dị nsọ, nke e doro iche nye Chineke. Ọ bụkwa nꞌime Kraịst ka a na-ewusi unu ike dị ka e si ewusi ndị ọzọ ike, ka unu nile bụrụ ebe obibi nke Chineke site na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ nꞌihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl, onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst nye unu bụ ndị mba ọzọ, jiri na-ekpere Chineke ekpere. Nꞌihi na echere m na unu nụrụ otu Chineke jiri site nꞌamara ya nye m ọrụ ikwusara unu ozi ọma. Chineke kpughere nzube nzuzo ya nile nye m. Ọ bụkwa nke a ka m gwara unu ihe banyere ya nꞌokwu dị nta nꞌakwụkwọ ozi ahụ m detaara unu. Ọ bụrụkwa na unu agụọ akwụkwọ ahụ m deere unu, unu ga-aghọta ụdị nghọta m nwere banyere ihe omimi nke Kraịst. Nꞌoge gara aga o nweghị onye ọ bụla a gwara banyere ihe omimi a. Ma ugbu a Chineke ekpugheela ya nye ndị ozi ya dị nsọ na ndị amụma ya site nꞌike nke Mmụọ Nsọ. Nke a bụkwa ihe omimi ahụ, na unu bụ ndị mba ọzọ ga-esoro ndị Juu keta ngọzi Chineke site nꞌịnụ na ịnabata ozi ọma ya. Na unu na ndị Juu ga-abụ otu anụ ahụ soro keta nkwa Chineke kwere nꞌime Kraịst. Abụrụla m onye nkwusa ozi ọma a, nꞌihi na Chineke nyere m ọrụ a dị ka onyinye site nꞌịrụ ọrụ nke ike ya. Ee, Chineke nyere m ọrụ a, mụ bụ onye dịkarịsịrị nta nꞌetiti ụmụ Chineke nile. Ma Chineke họpụtara m ịgwa ndị mba ọzọ ozi ọma banyere agwụghị agwụ nke akụ ebube ahụ pụrụ ịbụ nke ha site nꞌime Kraịst. Chineke zikwara m ịkọwara mmadụ nile na Chineke bụkwa onye nzọpụta nke ndị mba ọzọ. Nꞌihi na nke a bụ ihe onye kere ihe nile zubere na nzuzo ime site na mbụ. Gịnị mere Chineke jiri zube ime ihe ndị a? Ọ bụ nꞌihi na ọ chọrọ ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe mata ịba ụba nke amamihe ya nꞌụzọ dị iche iche dị ka o si na-arụpụta nzube ya nꞌime nzukọ Kraịst bụ chọọchị. Na dị ka Chineke siri zubekwarị ime ya site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. Ya mere, mgbe anyị bịakwutere Kraịst tukwasị obi anyị nꞌime ya, anyị nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke na-atụghị egwu nꞌihi na anyị maara na ọ ga-anabata anyị. Ya mere, unu adala mba nꞌihi ahụhụ nke m na-ahụ ugbu a. Ha bụ nꞌihi ọdịmma unu. Mgbe m nọdụrụ chee ihe banyere amamihe Chineke na ịdị ukwuu nke nzube ya, ana m ada nꞌala gbuo ikpere nꞌihu Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Onye ezinụlọ nile dị nꞌụwa a na nke dị nꞌeluigwe na-esite nꞌaka ya enwe aha. Ana m arịọkwa Chineke ka o site nꞌịba ụba nke ebube ya nye unu ike na-esite na Mmụọ Nsọ ya bịa, ka unu bụrụ ndị dị ike nꞌime mmụọ unu. Ana m arịọkwa ka Kraịst mee ka obi unu bụrụ ebe obibi ya site nꞌokwukwe unu nꞌime ya. Ana m arịọkwa ka Chineke mee ka unu bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ nꞌime ịhụnanya Chineke. Ana m arịọkwa, ka unu na ndị Kraịst nile nwee ike ịghọta enweghị atụ nke ịba ụba na ịdị ukwu nke ịhụnanya Kraịst nꞌebe anyị nọ. Ka unu mata, mazuokwa ụdị ịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ. Ka unu bụrụkwa ndị e mere ka ha jupụta nꞌọdịdị Chineke nꞌonwe ya. Ugbu a, ka otuto dịrị Chineke onye nwere ike imere anyị karịa ka anyị pụrụ ịrịọ ya, ma ọ bụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nꞌuche anyị, site nꞌike ya na-arụ ọrụ nꞌime anyị. Ka otuto dịrị ya nꞌime nzukọ ya bụ chọọchị na nꞌime Kraịst mgbe nile, na site mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi! Amin. Ya mere, mụ onwe m bụ Pọl onye nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi na m na-ejere Onyenwe anyị ozi, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesịrị ọkpụkpọ Chineke kpọrọ unu ịnata ngọzi ndị a nile dị ebube. Bụrụnụ ndị dị umeala nꞌobi, ndị dị nwayọọ na ndị na-enwe ntachi obi oge nile. Sitekwanụ nꞌịhụnanya na-anabatakwa ibe unu ọ bụladị mgbe ha mejọrọ unu. Nọọnụ nꞌudo nꞌetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nꞌotu unu dịgide nꞌime Mmụọ Nsọ. Ọ bụ nanị otu anụ ahụ Kraịst dị, otu Mmụọ Nsọ dịkwa. Anyị nwekwara nanị otu olileanya nke Chineke debere nꞌihu anyị. Ọ bụ nanị otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim. Ọ bụkwa nanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe nile na onye na-achị ihe nile, na onye na-arụ ọrụ ya nꞌime ihe nile, na-ebikwa nꞌime ihe nile. Ma Chineke enyela anyị nile nꞌotu nꞌotu onyinye dị iche iche site nꞌụlọ akụ onyinye Kraịst. Nꞌihi na dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nꞌelu, o duuru igwe ndị a dọtara nꞌagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye.” Lee na akwụkwọ nsọ kwuru na ọ rigoro nꞌeluigwe! Nke a na-egosi na o buru ụzọ site nꞌeluigwe rịdata jeruo na nsọtụ ala. Onye ahụ si nꞌelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nꞌelu, ka ọ bụrụ onye na-achị ihe nile nꞌebe nile. Ọ bụkwa ya nyere ndị mmadụ onyinye. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ ndị ozi, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị amụma, ndị ọzọ onyinye ikwusa ozi ọma, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ụkọchukwu, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ozizi. Gịnị mere o jiri nye ha onyinye ndị a? O nyere onyinye ndị a ime ka ụmụ Chineke bụrụ ndị zuru oke ịrụrụ Chineke ọrụ iwuli nzukọ ya bụ ahụ Kraịst elu. Ka onye ọ bụla nꞌime ụmụ Chineke bụrụ ndị dị ike na ndị tozuru oke nꞌihe ọmụma, tutuu anyị nile ekwekọtaa nꞌotu ihe ahụ banyere nzọpụta anyị, tutuu anyị enwee ọmụma ihe juru eju banyere Ọkpara Chineke. Na tutuu anyị abụrụ ndị tozuru oke nꞌime Onyenwe anyị, mgbe e mere ka ọdịdị Kraịst jupụta nꞌime anyị. Mgbe ahụ anyị agaghị adịkwa ka ụmụntakịrị ndị na-agbanwe obi ha mgbe nile banyere ihe ha kweere nꞌime ya, mgbe ha nụrụ ihe ọzọ dị iche ma ọ bụ mgbe onye ọzọ jiri aghụghọ kwuo okwu ụgha nke ga-adị ka eziokwu. Kama ka anyị gbasoo eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, ka anyị gwarịtaa ibe anyị eziokwu mesokwaa ha mmeso eziokwu, gbalịsiekwa ike ịghọ Kraịst onye bụ onyeisi nzukọ ya bụ chọọchị. Nꞌihi na ọ bụ site na ya ka e mere ka anụ ahụ nile jikọtaa bụrụ otu. Akụkụ nile ọ bụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nꞌụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, na iwuli ha elu site nꞌịhụnanya. Ya mere, dị ka ndị e jikọtara ha na Onyenwe anyị nꞌotu, ana m agwa unu, na-arịọkwa unu, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị na-amaghị Chineke, ndị echiche ha na-abaghị uru. Ndị obi ha jupụtara nꞌọchịchịrị. Ndị dị otu a enweghị òke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nꞌihi na ha mechiri obi ha nꞌebe Chineke nọ. Ha adịghị aghọtakwa ụzọ ya. Ihere adịghị eme ha; ihe ọ bụla adịkwaghị emetụ ha nꞌobi. Ha enyefeela onwe ha ime ihe rụrụ arụ nile na-ajụghị ajụjụ banyere ihe ọjọọ ha na-eme. Ma nke a abụghị ụdị ndụ Kraịst ziri unu ibi ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nꞌaka ya banyere ezi ndụ ahụ dị nꞌime Kraịst. Ya mere, tufuonụ ọdịdị ochie ahụ dị nꞌime unu, ọdịdị ochie ahụ na-eme ka unu mee ihe ọjọọ dị iche iche nꞌoge gara aga. Ee, ọdịdị ochie ahụ rere ure, nke jupụtara nꞌagụụ ime ihe ọjọọ nile. Ugbu a, e nwoghaala ndụ unu site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ. Dịkwanụ ka ndị dị ọhụrụ na ndị dị iche, ndị dị nsọ na ndị dị mma. Yikwasịnụ onwe unu ọdịdị ọhụrụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị ka ya nꞌịdị nsọ na nꞌịrụ ọrụ ezi omume. Kwụsịnụ ịgha ụgha nye ibe unu. Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, nꞌihi na unu nile bụ ndị e jikọtara nꞌotu nꞌanụ ahụ. Ọ bụrụ na iwe ewee gị, emehiela site nꞌibu iro nꞌobi gị. Ewela iwe site nꞌụtụtụ ruo nꞌanyasị. Enyela ekwensu ohere. Nꞌihi na mgbe iwe na-ewe gị, ị pụrụ inye ekwensu ohere ime gị ka i mehie. Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụpụta ego, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi. Unu emela ka obi jọọ Mmụọ Nsọ bi nꞌime unu njọ. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ bụ akara Chineke kwakwasịrị unu igosi na unu bụ nke ya. Ọ nọ dị ka ihe akaebe nke na-egosi na otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka unu nwere onwe unu. Wepụnụ obi ilu, na obi ọjọọ na iwe nꞌetiti unu. Wepụkwanụ ise okwu na ịkọ ọnụ nꞌetiti unu. Nꞌọnọdụ ihe ndị a nile, nweenụ obi ọma nꞌebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dị ka Chineke sitere nꞌamara ya gbaghara unu nꞌihi na unu bụ nke Kraịst. Ebe unu bụ ụmụ Chineke, gbalịanụ ka unu dịrị ka ya, dị ka ụmụ si agbalị ịdị ka nna ha. Ka ịhụnanya bụrụ ihe pụtara ìhè na ndụ unu, ụdị ịhụnanya nke Kraịst hụrụ anyị mgbe o nyere Chineke ndụ ya nꞌihi anyị, dị ka onyinye na aja iwepụ mmehie anyị, Aja a tọrọ Chineke ụtọ, nꞌihi na o nwere isisi ụtọ nꞌihu Chineke. Ka ahapụ ịkọta akụkọ mmehie ịkwa iko, ma ọ bụ nke adịghị ọcha, ma ọ bụ nke inwe anya ukwu nꞌebe ihe ndị ọzọ nꞌetiti unu nwere dị. Ka ntị ọ bụla hapụ ịnụ ya, nꞌihi na omume ọjọọ dị otu a ekwesịghị ụmụ Chineke. Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ ma ọ bụ okwu nzuzu. Kama werenụ oge unu gwarịtaa onwe unu ihe banyere ịdị mma Chineke. Werekwanụ oge unu kelee Chineke ekele. Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, ma ọ bụ mmadụ na-adịghị ọcha, ma ọ bụ onye anya ukwu, nꞌihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nꞌalaeze Kraịst na Chineke. Unu ekwela ka onye ọ bụla jiri okwu nzuzu duhie unu. Ana m ekwu ihe banyere ndị ahụ na-asị na mmehie ndị a abụghị ihe ọjọọ, nꞌihi na iwe Chineke na-adakwasị ndị na-eme ha. Ka unu na ndị na-ekwu ụdị okwu a hapụ inwe mmekọrịta ọ bụla. Nke a bụ ihe unu na-eme nꞌoge gara aga, ma kemgbe unu jiri bụrụ ụmụ Chineke unu nọ nꞌime ìhè. Ya mere, bienụ ndụ dị ka ndị nọ nꞌìhè. Nꞌihi na ebe ọ bụla ìhè dị, ebe ahụ ka ịma mma nile na ezi omume nile na eziokwu nile dị. Gbalịanụ mgbe nile ịchọpụta na ịmụta ihe na-atọ Chineke ụtọ. Unu etinyela aka nꞌọrụ ọchịchịrị ọ bụla, kama meenụ ka ọrụ ọjọọ ndị a pụta ìhè ka ndị mmadụ mata otu ha siri dị njọ. Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị na-amaghị Chineke na-eme na nzuzo. Ma mgbe unu mere ka ọrụ ọjọọ ha pụta ìhè, ìhè ga-achakwasị mmehie ha, gosikwa ihe ọ bụ. Nꞌihi na ìhè na-eme ka a hụzie ihe ọ bụla anya nke ọma. Ọ bụ nꞌihi nke a ka akwụkwọ nsọ jiri kwuo sị, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nꞌọnwụ bilie! Kraịst ga-emekwa ka ìhè ya mụkwasị gị.” Ya mere, kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe. Jirinụ oge nile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nꞌihi na ụbọchị ndị a dị njọ. Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Chineke chọrọ ka unu mee, meekwa ya. Unu aṅụbigala mmanya oke nke ga-emerụ unu. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ. Gosinụ ọṅụ unu site nꞌisoro ndị enyi unu ịbụ abụ ọma, na abụ nile dị iche iche e ji eto Onyenwe anyị. Bụọnụ abụ mgbe nile na-eto Onyenwe anyị nꞌobi unu. Na-enyenụ Chineke Nna ekele ụbọchị nile nꞌihi ihe nile nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Sọpụrụnụ Chineke site nꞌido onwe unu nꞌokpuru ibe unu. Unu bụ ndị nwanyị a na-alụ alụ, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nꞌokpuru Onyenwe anyị. Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya. Ya mere, dị ka nzukọ Kraịst si edo onwe ya nꞌokpuru Kraịst, otu a ka ụmụ nwanyị nwere di kwesịrị ido onwe ha nꞌokpuru di ha. Unu bụ ndị nwoke na-alụ nwụnye, hụnụ nwụnye unu nꞌanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nꞌanya nwụọ nꞌihi ya. Jisọs Kraịst sitere nꞌọnwụ ya mee ka nzukọ ya dịrị nsọ, site na nsacha nke baptizim na nke okwu Chineke. Ka nzukọ ahụ bụrụ nzukọ jupụtara nꞌebube, na ịma mma, na ịdị ọcha na-enweghị ntụpọ ọ na-enweghibụla. Otu a ka ndị nwoke kwesịrị isi hụ nwụnye ha nꞌanya dị ka ha bụ anụ ahụ ha. Nꞌihi na onye ọ bụla hụrụ nwụnye ya nꞌanya na-ahụ anụ ahụ ya nꞌanya. Mmadụ ọ bụla adịghị nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama ọ na-azụ ya na-edozikwa ya. Nke a bụkwa ihe Kraịst meere anụ ahụ ya bụ chọọchị. Nꞌihi na anyị nile bụ akụkụ anụ ahụ ya. Dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, “Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ ụlọ nne na nna ya ka e jikọtaa ya na nwụnye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu.” Amaara m na okwu a siri ike ịghọta, ma ọ bụ ihe e ji ama atụ banyere njikọta e jikọtara Kraịst na nzukọ ya. Ya mere, ọ dị mkpa na nwoke ga-ahụ nwụnye ya nꞌanya dị ka onwe ya. Nwanyị ọ bụla kwesịkwara ịsọpụrụ di ya. Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nꞌihi na nke a bụ ọrụ unu dị ka ndị nke Kraịst. Ọ bụkwa ihe ziri ezi ka unu mee. “Sọpụrụ nna gị na nne gị,” bụ iwu mbụ dị mkpa nke nwekwara ụgwọ ọrụ nye ndị ọ bụla debere ya. Ụgwọ ọrụ ahụ bụ, “Ka ihe nile gaara unu nke ọma, ka unu biekwa ogologo ndụ.” Unu bụ nne na nna, emesola ụmụ unu mmeso nꞌụzọ ga-eme ka iwe wee ha. Kama zụlitenụ ha nꞌụzọ kwesịrị ezinụlọ nke Kraịst. Ndị na-eje ozi, ruberenụ ndị unu na-ejere ozi isi. Jirinụ nsọpụrụ na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ. Ọ bụghị nanị mgbe ha nọ unu nso na-ele unu anya, kama sitenụ nꞌobi unu nile jeere ha ozi dị ka ndị ozi Kraịst. Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya. Nꞌihi na unu maara na ọrụ ọma ọ bụla mmadụ rụrụ ka ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya site nꞌaka Onyenwe anyị, ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya. Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nꞌụzọ dị otu a. Abarala ha mba. Chetakwanụ na unu na ndị na-ejere unu ozi bụ ohu Kraịst onye nọ nꞌeluigwe. Ọ dịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-eme ihe ọ chọrọ ime. Tupu m mechie okwu m, achọrọ m ime ka unu cheta na ịdị ike unu kwesịrị ịbụ site nꞌike dị ukwuu nke Onyenwe anyị, onye nọ nꞌime unu. Yikwasịnụ ngwa agha Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ nile nke ekwensu. Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a. Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha nile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ. Ime nke a, meenụ ka eziokwu dịịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike. Ezi omume bụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu. Meenụ ka njikere unu mgbe nile ikwusa ozi ọma nke udo bụrụ ihe dị ka akpụkpọ e yikwasịrị nꞌụkwụ unu. Mgbe nile unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ akụ nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nꞌebe unu nọ. Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu. Kpeenụ ekpere mgbe nile. Rịọnụ Chineke ihe ọ bụla mgbe ọ bụla Mmụọ Nsọ kwaliri unu ikpe ekpere. Rosiekwanụya arịrịọ ike, na-echetara ya mkpa unu, na-ekpekwa ekpere nꞌihi ndị kwere ekwe nọ nꞌebe nile. Kpeekwaranụ m ekpere, ka Chineke tinye nꞌọnụ m okwu ahụ bara uru ọ chọrọ ka m kwuo. Ka m nweekwa ike ịgwa ndị ọzọ banyere Onyenwe anyị na-atụghị egwu. Ịgwa ha ihe omimi ahụ dị nꞌozi ọma. Ọ bụ nꞌihi ozi ọma a m na-ekwusa, ka m ji nọọ nꞌụlọ mkpọrọ. Ma kpeerenụ m ekpere ka m nwee ike ikwusa ozi ọma na-atụghị egwu, ọ bụladị nꞌụlọ mkpọrọ a, dị ka o si kwesị ekwesị. Tikikọs nwanna anyị nke anyị hụrụ nꞌanya, na onye bụkwa onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe nile banyere ọnọdụ m nꞌebe a. Ana m ezitere ya unu nꞌihi nke a, ka o mee ka unu mata ọnọdụ anyị meekwa ka obi sie unu ike. Ka Chineke nye unu udo, ụmụnna m. Ka o nyekwa unu ịhụnanya nke ya na okwukwe unu nwere nꞌime ya so, nke na-esite nꞌebe Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ abịa. Ka amara na ngọzi Chineke dịnyere ndị nile ji obi ọcha na-ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nꞌanya. Akwụkwọ ozi a si nꞌaka Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Jisọs Kraịst na-abịara ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị isi nile nọ nꞌụlọ nzukọ Kraịst dị nꞌobodo Filipai. Anyị na-edekwa ya nye ndị nile kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka Chineke gọzie unu nile. Ọ bụkwa ekpere m ka Chineke nna anyị, onye bi nꞌeluigwe, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu nile. Ka o nyekwa unu udo zuru oke nꞌime obi unu. Ana m ekele Chineke m ekele nke ukwuu, mgbe ọ bụla m chetara unu. Nꞌime arịrịọ nile m na-arịọ ya nꞌekpere m nꞌihi unu, obi m na-ejupụta nꞌọṅụ. Nꞌihi inyeaka nile unu na-enye, ime ka izisa ozi ọma Onyenwe anyị na-aga nꞌihu ọ bụladị ruo ugbu a. Ya mere, amaara m nꞌezie na Chineke ahụ wuliri mmụọ unu ime ka unu malite ọrụ ọma dị otu a, ga-aga nꞌihu inyere unu aka ito eto nꞌime amara ya, tutuu ruo mgbe ọ ga-arụzu ọrụ a ọ malitere ịrụ nꞌime unu, ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-alọghachi dị ka o kwere na nkwa. Ọ bụ ihe ziri ezi nꞌebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu nile nꞌihi na unu dị m nꞌobi. Mụ na unu esorola keta oke na ngọzi ahụ Chineke na-enye ọ bụladị mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, na mgbe m si nꞌụlọ mkpọrọ pụta na-arụ ọrụ igbasa ozi ọma. Chineke pụrụ ịgbara m ezi ama, otu m si hụ unu nꞌanya, na otu ihe gbasara unu si na-emetụ mmụọ m, site nꞌụdị obi ebere Jisọs dị nꞌime m. Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji na-ekpesi ekpere ike, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-aba ụba. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nꞌinwe mmazu na nghọta nke eziokwu ahụ. Ka unu si otu a bụrụ ndị na-enwe nghọta banyere ihe dị iche nꞌetiti ihe ọma na ihe ọjọọ. Ka unu bụrụkwa ndị dị ọcha nꞌobi unu, ndị onye ọ bụla na-agaghị enwe ihe ọjọọ ha ga-ekwu megide unu, tutuu ruo ụbọchị ahụ Kraịst ga-alọghachi. Bụrụkwanụ ndị na-eme ihe dị mma mgbe nile, ụdị ihe ọma ahụ ga-egosi na unu bụ ụmụ Chineke, nꞌihi na nke a bụ ihe ga-ewetara Chineke otuto. Ugbu a, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu nile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa ozi ọma Kraịst na-aga nꞌihu. Nꞌihi na ọ pụtala ìhè nye ndị nche ụlọ mkpọrọ na onye ọ bụla ọzọ nọ nꞌebe a, na ọ bụ nanị nꞌihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m kpọrọ. Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị siri ike, ịmalite inwe nkwuwa okwu, izisa ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ nꞌime ha ji ekworo na anya ụfụ na-ezisa ozi ọma a. Ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nꞌọchịchọ obi nke ziri ezi. Ndị ji obi dị ọcha na-ezisa ozi ọma ahụ na-eme ya nꞌihi na ha hụrụ m nꞌanya, ebe ọ bụ na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka m nọọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ịkwali ọrụ izisa ozi ọma. Ndị ọzọ na-ezisa ozi ọma ahụ ime ka obi jọọ m njọ. Echiche ha bụ na ịga nꞌihu nke ozi ọma ha na-ekwusa ga-eme ka obi jọọ m njọ nꞌụlọ mkpọrọ karịa. *** Otu ọ dị, ihe ọ bụla ha bu nꞌuche mgbe ha na-ekwusa ozi ọma adịghị ewute m. Ihe dị mkpa bụ na ozi ọma Kraịst ka a na-ekwusa. Ọ bụkwa nke a na-enye m ọṅụ mgbe nile. Nꞌihi nke a, amaara m na site nꞌekpere unu, ya na ịgba ume nke Mmụọ Nsọ, ihe ndị a nile dakwasịrị m ga-emesị ghọọrọ m ihe ọma. Nꞌihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na Chineke agaghị ekwe ka m mee ihe ọ bụla ga-eme ka ihere mee m nꞌụzọ ọ bụla. Enwekwara m olileanya na m ga-aga nꞌihu nọdụ na njikere ikwupụta okwu na-atụghị egwu nꞌihi Kraịst, ọ bụladị ugbu a m nọ nꞌahụhụ ndị a. Aga m ekwupụta okwu ahụ dị ka m si ekwu ya nꞌoge gara aga. Aga m agakwa nꞌihu ịhụ na ndụ m bụ ihe ga-ewetara Kraịst otuto nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ na ndụ ma ọ bụ nꞌọnwụ. Nꞌihi na nꞌebe m nọ, ịdị ndụ bụ ịnọ nꞌime Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru nye m. Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ ga-enye m ohere iritere Kraịst ọtụtụ ndị mmadụ nꞌuru, amakwaghị m nke ka mma, ma ọ bụ ịdị ndụ ma ọ bụ ịnwụ anwụ. Nꞌihi na mgbe ụfọdụ ụzọ ihe abụọ na-agụsi m ike. Ọ na-agụ m ịdị ndụ na-aga nꞌihu, ma mgbe ụfọdụ ọ na-agụ m ikewapụ onwe m site nꞌanụ ahụ nke a, ka m lakwuru Kraịst, ebe mụ na ya ga-anọ mgbe nile. Ọ bụkwa ịlakwuru Kraịst kachasị ihe nile ọ bụla mma. Ma ọ pụtara ìhè na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ gaa nꞌihu. Nꞌezie, amaara m na m nwere ọrụ nke m ga-arụ nꞌụwa. Nꞌihi ya amaara m na m ga-anọgide ịdị ndụ. Ka mụ na unu jikọtaakwa aka rụọ ọrụ Onyenwe anyị, nke ga-enyere unu aka ito eto nꞌokwukwe, na inwe ọṅụ nꞌime Kraịst. Mgbe m si nꞌebe a pụta, bịa ileta unu, nnọkọ nke mụ na unu ga-anọkọ ga-ewetara unu ọṅụ nke ga-akwali unu inye Kraịst Jisọs otuto nꞌihi nchebe o chebere m. Ma nꞌọnọdụ ọ bụla m nọ, na-ebinụ ndụ ga-egosi na unu bụ ndị Kraịst nꞌezie. Ka ọ bụrụ na a sị na m mesịrị nwee ike ịbịa ịnọnyere unu, ma ọ bụ, a sị na m enweghị ike ịbịa ịnọnyere unu, akụkọ m ga na-anụ banyere unu ga-abụ nke ga-akọ otu unu si jiri otu obi guzosie ike, jikọtaa onwe unu nꞌotu, ikwusa ozi ọma Kraịst, na-atụghị ụjọ ihe ndị iro unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nꞌiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nꞌebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu ihe ngosi si nꞌebe Chineke nọ bịa, igosi na ọ nọnyeere unu, na o nyela unu ndụ ebighị ebi. Nꞌihi na ohere ahụ e nyere unu abụghị ohere ikwere nanị nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, kama ọ bụ ohere ịhụkwa ahụhụ nꞌihi aha ya. Ọ bụ anyị nile na-ebukọ agha a nꞌotu. Mụ onwe m ahụọla ahụhụ nꞌihi Kraịst nꞌoge gara aga. Ma ruo ugbu a, unu na-ahụkwa na m nọkwa nꞌime ahụhụ dị ukwuu, dị ka unu maara. Ugbu a, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọ bụla dịrị anyị nꞌihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere ihe dị ka inyeaka nke si nꞌịhụnanya na-abịa, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọ bụla anyị na-enwekọ nꞌime Mmụọ Nsọ, ọ bụrụ na unu nwere obi ebere, jikerekwa ime ebere, meenụ ka m ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, site nꞌibi obi nke ịhụrịta onwe unu nꞌanya, site nꞌinwe nkwekọta nꞌihe ọ bụla, sitekwa nꞌiji otu obi, otu nzube, na otu mmụọ na-arụkọta ọrụ unu. Echela echiche nanị banyere ọdịmma nke gị, ebila ndụ nꞌụzọ ịdọtara onwe gị otuto ndị ọzọ. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye echiche ya bụ ile ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ya mma. Echela echiche banyere nanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nꞌihe banyere ndị ọzọ na ihe ha na-eme. Ka omume unu nile dịrị ka nke Jisọs Kraịst. Onye, ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke, ma ọ gụghị ike ya na ọdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike. Kama, o wedara onwe ya ala bịa nꞌụwa dị ka ohu, na onye na-adịghị ike. O kwenyere ka a mụọ ya dị ka e si mụọ mmadụ nile bi nꞌụwa. Ebe ọ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, o wedakwara onwe ya ala, rube isi họrọ ịnwụ ọnwụ jọkarịsịrị njọ, ọnwụ ihere, nke ịbụ onye a kpọgidere nꞌelu obe. Ọ bụ nꞌihi nke a ka Chineke ji site nꞌọnwụ kpọlite ya, welie ya elu, mee ka ọ nọdụ ugbu a nꞌebe kachasị elu, nyekwa ya aha nke karịrị aha nile ọ bụla elu. Ka e site nꞌịkwanyere ya ugwu, mee ka ndị nile bi nꞌụwa, na ndị bi nꞌeluigwe, na ndị bi nꞌokpuru ụwa, gbuo ikpere ha nꞌala, ịsọpụrụ Jisọs mgbe ọ bụla a kpọrọ aha ya. Ọzọ kwa, ka ire nile kwupụta na Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e si otu a nye Chineke bụ Nna otuto. Nꞌihi ihe ndị a, ndị enyi m, mgbe mụ na unu nọ, unu na-erube isi nꞌihe ọ bụla m gwara unu. Ugbu a kwa m na-anọghị unu nso, gbalịanụ ime ihe ndị ahụ ya na nzọpụta a zọpụtara unu so. Jirinụ ịtụ egwu na-eme ihe Chineke chọrọ, ma na-alanụ azụ nꞌihe ọ bụla pụrụ ime ka obi jọọ ya njọ nꞌebe unu nọ. Nꞌihi na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya na-arụ ọrụ nꞌime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ. Nꞌihe ọ bụla unu na-eme, wezuganụ ntamụ na ịrụ ụka nꞌetiti unu. Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nꞌime ụwa ọjọọ a, nꞌetiti ndị gbagọrọ agbagọ, na nꞌetiti ndị nwere obi nꞌazụ. Na-enwunụ nꞌetiti ha dị ka ìhè. Na-echekwanụ nꞌihu ha okwu ahụ na-enye ndụ. Ka ọ bụrụ na mgbe Kraịst bịara ọzọ, aga m aṅụrị ọṅụ, nꞌihi na ọrụ m rụrụ nꞌetiti unu abụghị ihe efu. Nꞌezie, ọ bụrụ na a wụsịa ọbara m dị ka ihe ịchụ aja nye Chineke nꞌihi okwukwe unu, ee, a sị na e gbuo m nꞌihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ meekwa ka unu soro m ṅụrịa ọṅụ. Unu kwesịrị ịṅụrị ọṅụ nꞌihi nke a, na isoro m ṅụrịa ọṅụ. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Jisọs ekwe, aga m ezite Timoti ka ọ bịa hụ unu na mgbe na-adịghị anya. Olileanya m bụ na mgbe ọ bịasịrị lee unu lọghachi, ọ ga-akọrọ m ihe banyere unu, na ọnọdụ unu, si otu a kasie m obi. Enweghị m onye ọzọ nọ m nso, bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, na onye ga-akpachapụ anya banyere ọdịmma unu dị ka Timoti. Ndị ọzọ na-echegbu onwe ha banyere mkpa nke aka ha. Ihe banyere ozi Onyenwe anyị Jisọs abụkwaghị mkpa dịrị ha. Ma unu nile maara Timoti. Ọ dị nnọọ dị ka nwa m, site nꞌinyeaka ọ na-enyere m nꞌọrụ Onyenwe anyị. Enwere m olileanya nꞌezie izitere unu ya. M ga-emekwa nke a, ma ọ bụrụ na m chọpụta ihe ọnọdụ m nꞌebe a ga-abụ. Nꞌezie enwere m olileanya na site nꞌinyeaka Onyenwe anyị, mụ onwe m ga-abịakwutekwa unu na mgbe na-adịghị anya. Otu ọ dị, echere m na ọ dị mkpa ugbu a izighachiri unu Epafroditọs. Unu zitere ya ka ọ bịa nyere m aka nꞌọnọdụ mkpa m. Mụ na ya bụ nnọọ ezi nwanne, ndị na-arụkọ ọrụ nꞌotu, dị ka ndị agha Jisọs Kraịst. Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nꞌihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nꞌoge gara aga. Nꞌezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nꞌọrịa ahụ daa nꞌụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị ya nanị ka Chineke meere ebere, kama o mekwaara m ebere, nꞌihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m mwute gaara abụ nke m, ma a sị na Epafroditọs nwụrụ. Nꞌihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nꞌobi izite ya nꞌebe unu nọ. Nꞌihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe. Ya mere, arịọọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nꞌime Onyenwe anyị. Gosinụ ya na ọrụ ya dị unu ụtọ. Nꞌihi na ọ fọdụrụ nwa ntịị ka ọ nwụọ, nꞌihi ọrụ ọ na-arụrụ Kraịst. O kwenyere itufu ndụ ya na mgbalị nile ọ gbalịrị, inyere m ụdị aka ahụ unu gaara enyere m, ma ọ bụrụ na unu nọ nso. Na nchịkọta okwu ndị a nile, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ nꞌime Onyenwe anyị mgbe nile. Ike adịghị agwụ m ịgwa unu ihe ndị a. Ọ bakwaara unu uru ịnụ ụdị okwu a mgbe nile. Kpachapụrụnụ onwe unu anya nꞌebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-ezi unu na ọ bụ nanị mgbe e biri unu ugwu ka a ga-azọpụta unu. Nꞌihi na obibi ugwu nke elu ahụ abụghị ihe dị mkpa ime anyị ụmụ Chineke. Kama ọ bụ iji mmụọ anyị na-efe Chineke. Nke a bụkwa ihe bụ ezigbo obibi ugwu. Anyị bụ ndị Kraịst na-anya isi nꞌihe ahụ Kraịst Jisọs meere anyị, anyị ghọtakwara na anyị enweghị ike ọ bụla ịzọpụta onwe anyị. A sị na e nwere otu onye pụrụ ịnya isi na o nwere ike ịzọpụta onwe ya, onye ahụ gaara abụ mụ onwe m. A sị na ndị ọzọ na-eche na a ga-azọpụta ha nꞌihi ihe ha bụ, a gaara azọpụtakwa m nꞌihi ihe m bụ. Nꞌihi na a mụrụ m nꞌezinụlọ ndị Juu, ezinụlọ si nꞌagbụrụ Benjamin pụta. E biri m ugwu nꞌụbọchị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, nke mere ka m bụrụ onye Juu nꞌezie. Karịsịa, eso m nꞌotu ndị Farisii, ndị ahụ ọ na-anụ ọkụ nꞌobi idebe iwu nile na omenala nile ndị Juu nwere. Igosi na m nwere ịnụ ọkụ nꞌobi dị ukwuu banyere ihe m kwenyere nꞌime ya, emesiri m nzukọ Kraịst ike, kpagbuo ndị nọ nꞌime ya. Agbalịrị m idebezu iwu ndị Juu, bụrụkwa onye a pụrụ ịkpọ onye ezi omume tozuru oke, dị ka idebe iwu ndị Juu si dị. Ma ihe ndị a nile m gụrụ dị ka ihe bara uru nꞌoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru. Ugbu a, achịfuola m ha nile, ka m nwee ike ịtụkwasị Kraịst obi, na inwe olileanya nanị nꞌime ya. Ee, akpọọla m ihe ndị a nile ihe efu, nꞌihi na a pụghị iji ha tụnyere ihe dị oke ọnụ ahia dị ka ịmazu Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Etufuola m ihe ndị a nile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike nwezuo Kraịst. Ka m nwee ike bụrụ onye e jikọtara ya na Kraịst, onye na-adịghị agụkwa onwe ya dị ka onye pụrụ ịzọpụta onwe ya site nꞌezi omume ya, ma ọ bụ site nꞌidebezu iwu Chineke. Kama ka m bụrụ onye a na-azọpụta nanị site nꞌịtụkwasị Kraịst obi. Nꞌihi na ụzọ ahụ Chineke chọrọ isi mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo dabeere nꞌokwukwe, ọ dabeere nꞌokwukwe anyị nꞌime Kraịst nanị. Ugbu a ewezugala m ihe ndị ahụ nile, nꞌihi na achọpụtara m na nke a bụ nanị ụzọ mmadụ si amara Kraịst na ike ahụ e ji kpọlite ya site nꞌọnwụ. Ọ bụkwa nanị site nꞌụzọ a ka e si achọpụta ihe iso Kraịst hụọ ahụhụ, na iso ya nwụkọọ ọnwụ pụtara. Ya mere, na-ajụghị ihe ọ bụla ọ ga-efu m, aga m abụ otu nꞌime ndị na-ebi ndụ ọhụrụ ahụ nke dịrị ndị e mere ka ha site nꞌọnwụ dịrị ndụ. Anaghị m ekwu nꞌebe a na etozuola m, mara ihe nile. Amụtachabeghị m ihe nile m kwesịrị ịmụta. Kama ihe m na-eme bụ ịgbalịsị ike ịrụ ọrụ m na-aga nꞌihu, tutuu ruo ụbọchị ahụ m ga-abụ ihe ahụ nile Kraịst onye zọpụtara m, chọrọ ka m bụrụ. Ụmụnna m, nꞌezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesịrị ịbụ. Ma ihe m ji ike m nile na-eme bụ ichefu ihe nile gara aga, na ilekwasị anya nꞌihe ahụ m na-agbaso dị m nꞌihu. Ana m agbasi ọsọ ike ịga nꞌihu, iru na njedebe ebe ahụ a ga-agbaru ọsọ, ka m nwee ike inweta ihe ahụ a na-agbata nꞌọsọ, nke Chineke kwadebere inye ndị ya nꞌeluigwe, nꞌihi ọrụ zuru oke ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst rụrụ nꞌihi anyị. Enwere m olileanya na unu nile, bụ ndị tozuru oke nꞌiso Jisọs Kraịst, ga-aghọta ihe ndị a m na-ekwu. Ọ bụrụkwa na unu nwere nghọta ọzọ dị iche banyere ihe m kwuru, amaara m na Chineke ga-eme ka ọ pụtara unu ìhè, ma ọ bụrụ na unu na-ejidesi eziokwu ahụ unu natara aka ike, na-emekwa ihe unu nụrụ. Ụmụnna m, na-agbasonụ ụdị ndụ m na-adị, chọpụtakwanụ ndị ọzọ na-adị ndụ ha dị ka anyị si adị, mee ha ihe ilere anya unu. Nꞌihi na agwala m unu nke a ọtụtụ mgbe, na-achọkwa ịgwa unu ya ọzọ ugbu a. Lee, anya mmiri dị m nꞌanya ugbu a m na-ekwu ya sị na e nwere ọtụtụ ndị na-ebi ndụ ha dị ka ha bụ ndị iro obe Kraịst nꞌezie. Ọgwụgwụ ndụ ndị dị otu a bụ mbibi na ịla nꞌihi, nꞌihi na ihe ha ji mere chi ha bụ ihe ọ bụla na-agụ ha agụụ. Ihe ahụ kwesịrị ime ka ihere mee ha bụ ihe ha na-anya isi nꞌime ya. Ọ bụkwa nanị ihe banyere ndụ nke ụwa a ka ha na-eche echiche ya. Ma anyị onwe anyị ụmụnna m, eluigwe bụ ụlọ anyị, ebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. Anyị na-elekwa anya mgbe ọ ga-esi nꞌeluigwe lọghachi. Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-eji anụ ahụ dị ebube, nke yiri nke ya, gbanwee anụ ahụ anyị ndị a nke na-anwụ ọnwụ. Ọ bụkwa ike ya ahụ dị ukwuu, nke ọ ga-eji lụgbuo ihe nile dị nꞌụwa, ka ọ ga-eji nye anyị ahụ ọhụrụ ahụ. Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nꞌanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ ụgwọ ọrụ m nꞌihi ọrụ m na-arụ, bikonụ, guzosienụ ike nꞌime Onyenwe anyị. Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, ha kwụsị ise okwu. Ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, sị gị biko, nyere ụmụ nwanyị a aka idozi okwu ha, nꞌihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, sorokwa ndị ọzọ mụ na ha rụkọrọ ọrụ rụọ ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ. Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe nile nꞌime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ! Meenụ ka mmadụ nile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obi ọma nꞌihe nile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke. Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs. Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya. Na-emenụ ihe ọ bụla unu si nꞌaka m mụta, ma ọ bụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu. Obi dị m nnọọ ụtọ nꞌihi inyeaka unu nyeere m ọzọ. Ana m etokwa Onyenwe anyị nꞌihi ya. Amaara m na ọ dị unu nꞌobi kemgbe izitere m ihe unu nwere ike, ma unu enwebeghị ohere ime ya. Ọ bụghị na m nọ nꞌọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nꞌihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọọ nꞌọnọdụ ọ bụla, ma m nwere ihe ma m enweghị ihe. Amụtala m otu m ga-esi nọọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ mgbe m na-anọ agụụ, ma ọ bụ mgbe m rijuru afọ ma ọ bụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu ma ọ bụ nꞌoge ụkọ. Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike. Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nꞌọnọdụ nsogbu nke m nọ nꞌime ya ugbu a. Dị ka unu maara, na mmalite, site na mgbe m kwusaara unu ozi ọma tutuu ruo mgbe m si nꞌetiti unu pụọ, gaa Masidonia, ọ bụ nanị unu ndị Filipai, bụ ndị na-enyere m aka site nꞌinye m onyinye. O nwebeghị chọọchị ọzọ mere ihe dị otu a. Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaika, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m. Ọ bụ ezie na obi na-atọ m ụtọ nꞌihi onyinye unu na-enye m, ma ihe na-enyekarị m ọṅụ nꞌobi m, bụ ncheta m na-echeta ụgwọ ọrụ zuru ezu, unu ga-anata nꞌihi obi ọma unu. Ugbu a enweela m ihe nile na-akpa m mkpa, nꞌezie enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetarạ, egboola mkpa m nile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma. Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị. Ugbu a ka otuto dịrị Chineke Nna anyị ruo mgbe ebighị ebi. Amin. Keleere m ụmụnna nꞌime Kraịst nile nọ nꞌebe ahụ. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu. Ndị Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nꞌụlọ Siza. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Ọ bụ Pọl, onye e mere onyeozi site nꞌọchịchọ Kraịst Jisọs, na ọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti, na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị akwụkwọ a. Ndị ahụ bụ ụmụnna anyị nꞌime Kraịst site nꞌokwukwe ha. Ka Chineke Nna anyị nye unu amara ya na udo ya. Mgbe ọ bụla anyị na-ekpere unu ekpere, anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele. Nꞌihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nꞌime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị Chineke nꞌanya. Mgbe eziokwu ahu bụ ozi ọma rutere unu, unu nụrụ banyere olileanya dịrị ndị nabatara ya. Nꞌihi ya okwukwe unu na ịhụnaya unu na-ele anya ya, bụ ihe e chebere nke ọma nꞌihi unu nꞌeluigwe. Ozi ọma ahụ e kwusaara unu bụkwa otu ozi ọma ahụ a na-agbasa nꞌụwa nile, nke na-eweta mgbanwe na ndụ ndị nụrụ ya, dị ka o si wetara unu mgbanwe mgbe unu nụrụ ya, ghọtakwa ụdị obi ebere Chineke nwere nꞌebe ndị mmehie nọ. Ọ bụ Epafras onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, onye anyị hụkwara nꞌanya, wetaara unu ozi ọma a. Epafras bụ odibo Kraịst, onye nọ ugbu a na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ unu. Ọ bụ ya gwara anyị ihe banyere ịhụnanya Mmụọ Nsọ nyere unu. Nꞌihi nke a site nꞌụbọchị anyị nụrụ ihe banyere unu, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-ekpe ekpere na-arịọ Chineke ka o nyere unu aka ịghọta ihe ọ chọrọ ka unu mee. Anyị na-arịọkwa ya ka o nye unu amamihe nke ga-enyere unu aka ịmata ihe nke mmụọ. Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyi chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe nile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, na ndị na-eto eto nꞌihe banyere ịma Chineke mgbe nile. Anyị na-arịọkwa Chineke ka ọ gbaa unu ume, ka o mejụpụta unu nꞌike ya dị ebube ka unu nwee ike ịga nꞌihu nꞌọrụ unu nꞌọnọdụ ọ bụla, bụrụkwa ndị jupụtara nꞌọṅụ nke Onyenwe anyị na-enye, na ndị na-ekele Nna anyị ekele mgbe nile, nꞌihi na o mere ka anyị bụrụ ndị kwesịrị iketa oke nꞌihe nile ahụ o mere ka ọ bụrụ nke ndị ahụ bi nꞌalaeze nke ìhè. Nꞌihi na ọ bụ ya sitere nꞌike nke ọchịchịrị, bụ alaeze ekwensu, gbapụta anyị, ma kpọbata anyị nꞌime alaeze Ọkpara ya ọ hụrụ nꞌanya. Onye e sitere nꞌaka ya mee ka anyị nwere onwe anyị; onye gbaghakwaara anyị mmehie anyị nile. Kraịst bụ nnọọ oyiyi Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya. Ọ nọ na-adị ndụ tupuu Chineke ekee ihe ọ bụla e kere eke. Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto. Kraịst nọ anọ tupuu e kee ihe nile, ọ bụkwa ike aka ya ka o ji ejikọta ihe nile, mee ka ha dịrị ebe ha dị. Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị, nzukọ Kraịst ahụ o bidoro. O sitere nꞌọnwụ bilie bụrụ onyeisi mbụ nꞌetiti ndị nile ga-esi nꞌọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nꞌime ihe nile. Nꞌihi na ọ bụ mkpebi Chineke nꞌonwe ya, na ọdịdị ya bụ Chineke ga-apụta ìhè nꞌime Ọkpara ya. Ọ bụ site nꞌihe Ọkpara ya mere ka Chineke ji kpebie ka ụwa nile bịaghachikwute ya. Nꞌihi na site nꞌọnwụ nke Kraịst nwụrụ nꞌelu obe, na ọbara ọ wụsịrị, e meela ka udo dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ nile. Ihe nile dị nꞌụwa na nꞌeluigwe nwekwara ike ịbịakwute Chineke ugbu a. Nke a metụtakwara unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-anọghị Chineke nso na mbụ. Mgbe ahụ unu bụ ndị iro ya, ndị mmehie ha na echiche ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha, mere ka Chineke dị anya nꞌebe unu nọ. Ma ugbu a, ọ kpọbatala unu dị ka ndị enyi ya. Chineke mere nke a site nꞌọnwụ nke Ọkpara ya nwụrụ nꞌelu obe, nke mere ka unu bụrụ ndị enyi ya, ndị a kpọbatara nꞌihu ya, ndị guzokwa nꞌihu ya dị ka ndị dị nsọ na ndị dị ọcha, ndị na-enweghị ntụpọ ọ bụla. Ihe ọzọ Chineke chọrọ nꞌaka unu bụ ka unu nọgide bụrụ ndị guzosiri ike nꞌihe unu kwenyere, na ndị guzosiri ike nꞌime Onyenwe anyị, ndị ozi ọma ahụ doro anya nke ọma. Ozi ọma ahụ nke kwuru na Jisọs nwụrụ nꞌihi unu. Hụnụ na unu esiteghị nꞌozi ọma a wezuga onwe unu, ma ọ bụ kwụsị ịtụkwasị ya obi ịzọpụta unu. Nke a bụ ozi ọma ahụ e wetaaara unu nke a na-ezisakwa nꞌụwa nile. Mụ onwe m bụ Pọl, jikwa ọṅụ na-agwa ya ndị ọzọ. Nꞌezie, ana m aṅụrị ọṅụ nꞌihi na m na-ata ahụhụ ndị a, ana m emejupụta ihe fọdụrụ nꞌahụhụ ahụ Kraịst tara nꞌihi anụ ahụ ya bụ chọọchị. Chineke emeela ka m bụrụ odibo chọọchị ya. O nyere m ọrụ a m na-arụ nꞌihi ọdịmma unu. Nzube dị omimi ahụ o zonarịrị mmadụ nile nꞌoge gara aga, nke o mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị ya hụrụ ya nꞌanya nꞌoge a. Ọ bụkwa ọchịchọ Chineke ime ka ndị mba ọzọ mata ịba ụba na ịdị ebube nke nzube ya dị omimi. Ihe omimi ahụ bụkwa nke a, na obibi nke Kraịst bi nꞌime unu, bụ nanị olileanya unu nwere iketa oke nꞌebube Chineke. Ọ bụ ya mere ebe ọ bụla anyị gara, anyị na-ekwusa ihe banyere Kraịst, na-ezikwa ihe nile anyị maara banyere ya. Nꞌihi na anyị chọrọ ịkpọbata onye ọ bụla nꞌihu Chineke dị ka ndị zuru oke, nꞌihi ihe Kraịst meere ha nꞌotu nꞌotu. Nke a bụ ọrụ m na-arụ. Ana m arụkwa ya nꞌihi ike dị ukwuu nke na-arụkwa ọrụ nꞌime m. Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu ga-ghọta otu m si gbasie mgba ike nꞌekpere m nꞌihi unu, na nꞌihi ndị nọ nꞌobodo Laodisia, na ndị nile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu. Ihe m na-arịọ Chineke nꞌihi unu bụ ka ọ gbaa unu ume, jikọtaa unu nꞌotu nꞌime ịhụnanya, ka unu nwee ike ịmaju Kraịst nke ọma, na ịghọtazi ya. Nꞌihi na nzube omimi nke Chineke ahụ bụ Kraịst nꞌonwe ya. Onye matara Kraịst nke ọma enweela amamihe nile, na ihe ọmụma nile, nꞌihi na Kraịst dị ka ụlọ akụ, ọ bụkwa nꞌime ya ka ihe zoro ezo nile nke amamihe na ihe ọmụma dị. Ana m agwa unu ihe ndị a nꞌihi na ma eleghị anya ụfọdụ mmadụ ga-abịa iji okwu dị ụtọ duhie unu. Nꞌihi na ọ bụ ezie na anọghị m unu nso, ma anọ m nꞌetiti unu nꞌime mmụọ oge nile. Ọ na-atọ m ụtọ nke ukwuu na unu guzosiri ike nꞌokwukwe unu nꞌime Kraịst. Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs kwere na ya ịzọpụta unu, sikwanụ otu a tụkwasị ya obi inyere unu aka na nsogbu unu nke ụbọchị nile. Na-ebinụ ndụ unu nꞌime ya. Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nꞌime ya, ka unu si otu a na-enweta ike unu, na nri unu nꞌime ya. Gbalịanụ ito eto, bụrụnụ ndị dị ike na ndị maara okwu ya. Ka ndụ unu jupụta nꞌọṅụ na ekele nꞌihi ihe nile o meere unu. Ekwelanụ ka onye ọ bụla jiri okwu amamihe nke ụwa mebie ọṅụ unu, na okwukwe unu, okwu amamihe ahụ nke ọsịsa ya nile dabeere nꞌechiche na ntụpụta mmadụ, kama ịdabere nꞌihe Kraịst kwuru. Nꞌihi na nꞌime Kraịst ka e nwere ụdị izu oke Chineke nke pụrụ ịpụta ìhè nꞌahụ mmadụ. Ya mere, unu nwere ihe nile nꞌime Kraịst. Ọ bụ ya na-achị ihe nile, onye ike ya karịrị ike nile na ọchịchị nile. Mgbe unu bịakwutere Kraịst o mere ka unu nwere onwe unu site nꞌike ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ jupụtara na mmehie. O meghị ka unu nwere onwe unu site nꞌibi unu ugwu nke elu ahụ, kama o mere ya site nꞌobibi ugwu nke ime mmụọ, ime mkpụrụ obi unu baptizim. Nꞌihi na mgbe e mere unu baptizim, o gosiri na unu na ya nwụkọrọ, na e likọtakwara unu na ya. Mgbe ahụ kwa ka unu sooro Kraịst si nꞌọnwụ bilie banye na ndụ ọhụrụ, nꞌihi na unu kweere nꞌokwu Chineke dị ukwuu ahụ, onye mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie. Mgbe ahụ, unu bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ unu nꞌihi mmehie, mgbe ahụ kwa, unu bụ ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu na-achị ndụ ha, ma Chineke mere ka unu soro Kraịst keta ndụ ọhụrụ, nꞌihi na ọ gbaghaara unu mmehie unu nile. O hichapụrụ ụgwọ mmehie nile unu ji, ụgwọ iwu ahụ nile unu na-edebeghị. O weere mmehie ndị a nile laa ha nꞌiyi, site nꞌịkpọgide ya nꞌelu obe Kraịst. Nꞌelu obe ahụ, Chineke napụrụ ekwensu ike o ji ebo unu ebubo mmehie. O mekwara ka mmeri Kraịst meriri ekwensu nꞌelu obe ahụ e si wezuga mmehie unu, pụta ìhè nye mmadụ nile. Nꞌihi ya, unu ekwela ka onye ọ bụla gụọra unu iwu banyere ihe ọ bụla unu na-eri, ma ọ bụ ihe unu na-aṅụ, ma ọ bụ ihe banyere ido ụbọchị nsọ, ma ọ bụ ime mmemme ọnwa ọhụrụ ma ọ bụ mmemme ụbọchị izuike. Nꞌihi na emeghị ka ihe ndị a bụrụ ihe ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Uru ha bara gwụsịrị mgbe Kraịst bịara. Nꞌihi na ha bụ onyinyo na-egosi ihe ga-abịa abịa, bụ Kraịst nꞌonwe ya. Ekwela ka onye ọ bụla gụọ gị dị ka onye furu efu nꞌihi na i kweghị iso ya fee ndị mmụọ ozi, dị ka ha si kwuo. Ha pụrụ ikwu na ha hụrụ ọhụ, gwa unu na unu kwesịrị ịhụ ụdị ihe ha hụrụ. Ndị dị otu a na-afụli onwe ha elu nꞌefu, nꞌihi ụdị echiche mmadụ a ha na-eche. Ma e jikọtaghị ha na Kraịst, onye bụ isi ebe e jikọtara anyị nile bụ anụ ahụ ya. Nꞌihi na ọ bụ akwara dị ya nꞌahụ jikọtara anyị nile nꞌotu. Ito eto anyị bụkwa nanị mgbe anyị si na ya na-eriju afọ, na-anatakwa ike na ume. Ebe ọ bụ na unu sooro Kraịst nwụọ mgbe ọ nwụrụ, ọ bụrụkwa na unu enwerela onwe unu site nꞌiso ụzọ ntụpụta nke ụwa, dị ka ịrụ ezi ọrụ na idebe iwu dị iche iche, gịnị mekwaranụ unu ji na-eso ha ugbu a na-ekwe ka e jiri iwu ha na-atụrụ unu ihe unu ga-eme, na ihe unu na-ekwesịghị ime, dị ka, “Erila nke a,” “Edetụla nke a ire,” “Ebitụla nke a aka?” *** Ọ bụ mmadụ tụpụtara iwu ndị a nile, ma e mere nri ka ọ bụrụ ihe a ga-eri eri, nke e kwesịrị iji mee ihe. Ọ bụ ezie na iwu ndị a na-adị ka ihe dị mma, nꞌihi na onye na-edebe ha kwesịrị itunyezi uche ya idebe ha, bụrụkwa ihe na-ewetara mmadụ obi umeala na ihe na-enye ahụ anyị ahụhụ, ma o nweghị uru ha bara nꞌihe gbasara inwe mmeri nꞌebe echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ mmadụ dị. Ihe iwu a na-eme bụ nanị ime ka mmadụ na-afụli onwe ya elu. Ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nꞌọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nꞌakụ na ọṅụ dị nꞌeluigwe ebe Kraịst nọ nꞌocheeze ya nꞌakụkụ Chineke. Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nꞌụwa. Nꞌihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nꞌime Chineke site na Kraịst. Mgbe Kraịst, onye ahụ ji ndụ unu nꞌaka ya ga-alọghachi, unu ga-enwukwa dị ka ya, soro ya keta oke nꞌebube ya. Wezuganụ mmehie na ihe ụwa nile na-arụ arụ nꞌime unu. Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ nile dị nꞌime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nꞌịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nꞌihi na anya ukwu bụkwa ikpere arụsị). Iwe ọkụ Chineke ga-adakwasị ndị nile na-eme ihe dị otu a. Ihe ndị a bụ ihe unu onwe unu na-eme nꞌoge gara aga mgbe unu na ndị ụwa bụ otu. Ma ugbu a bụ oge iwezụga ihe ndị a na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu nile, ya na okwu ihere nile na-esi unu nꞌọnụ na-apụta. Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nꞌihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a. Ugbu a unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke bụ mmadụ ọhụrụ ahụ Chineke onye kere ya na-eme ka ọ na-adị ọhụrụ mgbe nile, na nke na-agbalị ịdị ka Kraịst. Nkewa ọ bụla adịghị nꞌime ndụ a. Ọ dịghị mkpa ebe onye ọ bụla si pụta, ma ọ bụ onye Juu ma ọ bụ onye mba ọzọ, ma ọ bụ onye e biri ugwu, ma ọ bụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa ma ọ bụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bụ onye ime ọhịa, ma ọ bụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ ma Kraịst o bikwa nꞌime onye ahụ, nꞌihi na Kraịst dịrị mmadụ nile. Ebe Chineke họpụtara unu mee unu ndị nke ya site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ a, ebe ọ bụkwa nꞌihi na ọ hụrụ unu nꞌanya ka o ji họpụta unu, bụrụnụ ndị nwere obi ebere, ndị obi ọma, ndị dị nwayọọ, na ndị na-enwe ogologo ntachi obi. Jirinụ obi dị umeala na-anagide mmejọ ibe unu mejọrọ unu, ma gbagharakwa ha. Chetanụ na Chineke nꞌonwe ya gbaghaara unu, ya mere gbaghakwaranụ ibe unu. Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nꞌihi na ọ bụ nke a ga-ejikọta unu nile nꞌotu. Ka udo ahụ Chineke na-enye bụrụ ihe ga-adị nꞌobi unu, ma pụtakwa ìhè na ndụ unu. Nꞌihi na ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, Chineke kpọrọ unu ka unu nọdụ nꞌudo. Mgbe nile kwa nọọnụ na-ekele Chineke ekele. Kwerenụ ka okwu Kraịst nwee ọnọdụ nꞌime unu, ime unu ndị bara ụba nꞌamamihe. Zikwanụ ndị ọzọ okwu amamihe a. Na-abụnụ abụ ọma na abụ na-ebuli mmụọ elu. Na-abụkunụ Onyenwe anyị abụ ndị a site nꞌobi jupụtara nꞌekele. Ka ihe nile unu na-eme, ya na okwu unu na-ekwu, bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs. Jirikwanụ obi ekele bata nꞌihu Chineke bụ Nna anyị site nꞌaha Kraịst. Unu bụ ụmụ nwanyị nwere dị, doonụ onwe unu nꞌokpuru di unu nꞌihi na nke a bụ ihe unu kwesịrị ime dị ka ndị Kraịst. Ma unu ndị bụ di, unu enwela obi ilu nꞌebe nwụnye unu nọ, kama na-ahụnụ ha nꞌanya. Unu bụ ụmụntakịrị, na-emenụ ihe na-atọ Chineke ụtọ site nꞌirubere nne na nna unu isi. Nke a bụ ihe unu kwesịrị ime dị ka ndị Kraịst. Unu bụ nne na nna, unu emela ihe ga-ebutere ụmụ unu iwe, ka ha ghara inwe obi ụfụ nꞌebe unu nọ. Ndị bụ ohu, na-asọpụrụnụ nna unu ukwu nꞌihe nile. Na-emenụ ihe ha gwara unu mee, ọ bụghị nanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama werenụ obi unu nile jeere ha ozi, nꞌihi na unu bụ ndị kwesịrị ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ. Ihe ọ bụla unu na-eme, werenụ obi unu nile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Chineke ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ. Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Chineke kwadobere inye unu, ndị ya. Nꞌihi na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi. Onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nꞌihi ihe ọjọọ nile o mere. Nꞌihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-ekpe ikpe ya. Unu ndị nwe odibo, werenụ ezi obi na obi dị umeala na-emeso odibo unu mmeso. Chetakwanụ na ọ dị onye ka unu ukwu, Onyenwe unu, nke bi nꞌeluigwe, onye nọkwa na-ele unu anya. Na-anọgidenụ nꞌekpere. Nọọkwanụ na nche mgbe unu na-ekpe ekpere, ma na-ekelekwanụ Chineke ekele. Na-echetakwanụ anyị nꞌekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa ozi ọma, nke bụ ikwusa ihe omimi Kraịst. Ọ bụkwa nꞌihi ikwusa ozi ọma a ka m ji nọrọ nꞌụlọ mkpọrọ taa. Na-ekperenụ m ekpere ka m nwee ike ịkọwa ozi ọma a nꞌụzọ ọ ga-esi kwe mmadụ nile ịghọta ya. Kpacharanụ anya otu unu si akpasị ndị na-ekweghị ekwe agwa. Ohere ọ bụla unu nwere jirinụ ya mee ka ndị ọzọ nụrụ ozi ọma a. Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke na-atọ ụtọ na ntị. Mụtakwanụ otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma. Tikikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesịkwara ntụkwasị obi nꞌọrụ Onyenwe anyị, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nꞌọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu akụkọ nile banyere m. Ana m ezitere unu ya ka ọ gbaa unu ume, site nꞌịkọrọ unu otu anyị si agbalị. Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesịrị ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nꞌime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe nile na-eme nꞌebe a. Aristakọs, onye mụ na ya nọ nꞌụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne Banabas na-ekelekwa unu. Dị ka m kwuru na mbụ, jirinụ obi unu nile nabata Mak mgbe ọ bịarutere nꞌebe unu nọ. Jisọs, onye aha ya ọzọ bụ Jọstus na-ekelekwa unu. Mmadụ atọ ndị a bụ nanị ndị Juu mụ ha na-arụkọ ọrụ alaeze Chineke nꞌebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ. Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nꞌime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge nile ka ọ na-ekpe ekpere nꞌihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike nꞌokwukwe dị ka ndị tozuru oke, ndị maara ihe ha na-eme, ndị weere onwe ha nyefee nꞌaka ọchịchọ Chineke. Ana m agba akaebe na ọ na-adọgbu onwe ya nꞌọrụ ikpe ekpere nꞌihi unu na nꞌihi ndị Laodisia na ndị Hierapolis. Luuku onye dibia ukwu anyị na Dimas na-ekele unu. Keleerenụ m ụmụnna anyị ndị bi na Laodisia na nwanna anyị nwoke Nimfas na chọọchị na-ezukọ nꞌụlọ ya. Mgbe unu gụchara akwụkwọ a, hụnụ na a gụkwara ya na nzukọ Kraịst dị na Laodisia. Gụọkwanụ nꞌotu mgbe ahụ akwụkwọ nke m deere ndị Laodisia. Gwanụ Akipos ka ọ kpachapụ anya rụchaa ọrụ Chineke nyere ya ịrụ. Ka m jiri aka m dee ekele nke m: mụ onwe m Pọl na-ekele unu. Unu echefula na m nọ nꞌagbụ nꞌụlọ mkpọrọ. Ka amara Chineke dịnyere unu. Akwụkwọ ozi a si nꞌaka anyị, Pọl na Saịlas na Timoti, na-abịara nzukọ Kraịst dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka Chineke gọzie unu, ma nyekwa unu udo. Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe nile, na-echetakwa unu nꞌekpere anyị. Mgbe nile ka anyị na-echeta nꞌekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nꞌokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nꞌịhụnanya, na iguzosị ike unu nke sitere nꞌolileanya unu nwere nꞌOnyenwe anyị Jisos Kraịst. Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nꞌanya nke ukwuu, họpụta unu. Nꞌihi na mgbe anyị wetaara unu ozi ọma, unu eweghị ya dị ka okwu na-erijughị afọ, kama unu gere nnọọ ntị nke ọma. Okwu nile anyị gwara unu metụkwara mmụọ unu, nꞌihi na Mmụọ Nsọ mere ka unu ghọta nꞌezie na ihe anyị kwuru bụ eziokwu. Unu matakwara otu ndụ anyị si bụrụ ihe ilere anya nye unu, igosi unu na okwu anyị ji bịa bụ eziokwu. Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eso ụzọ anyị na ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị. Nꞌihi na unu jiri ọṅụ Mmụọ Nsọ na-enye nabata ozi ọma anyị, na-ajụghị ajụjụ banyere ọnwụnwa na obi ọjọọ o wetaara unu. Nꞌụzọ dị otu a unu mesịrị bụrụ ihe ilere anya nye ndị kwere ekwe nile nọ na Masidonia na Griis. Ugbu a unu esitela na ndụ unu mee ka ozi ọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Griis. Nꞌihi na ebe ọ bụla anyị gara anyị na-ahụ ndị na-agwa anyị ihe banyere okwukwe dị iche unu nwere. Anyị adịkwaghị agwa ndị mmadụ ihe banyere okwukwe unu. Nꞌihi na ha onwe ha na-ebu ụzọ gwa anyị ihe banyere nnabata unu nabatara anyị, na otu unu si site nꞌikpere arụsị tụgharịa bido ife Chineke, na otu unu si na-ebi ndụ unu ugbu a nye ezi Chineke ahụ bụ Onyenwe unu. Ha na-akọkwa otu unu si na-ele anya nlọghachi Okpara Chineke site nꞌeluigwe, Jisọs ahụ Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie, onye bụ Onye nzọpụta anyị site nꞌiwe Chineke dị egwu megide mmehie. Unu onwe unu maara, ụmụnna anyị, na ọbịbịa anyị bịakwutere unu bara uru. Unu maara ụdị ahụhụ anyị tara na Filipai tupuu anyị abịakwute unu. Unu makwaara ụdị ahụhụ anyị tara na Tesalonaịka mgbe anyị bịaruru. Ma Chineke nyekwara anyị obi ike ikwukwara unu ozi ọma ahụ, ọ bụladị mgbe anyị maara na ndị iro gbara anyị gburugburu. Dị ka unu ga-echeta, anyị agwaghị unu ihe ọ bụla site nꞌọchịchọ nke na-adịghị ọcha, ma ọ bụ site nꞌobi nke aghụghọ dị. Kama anyị gwara unu ihe nile hoo haa, nꞌụzọ guzo ọtọ, nke eziokwu. Nꞌihi na anyị na-ekwu okwu anyị dị ka ndị ozi Chineke họpụtara, ndị ọ tụkwasịrị obi ikwu eziokwu, tinye ọrụ ozi ọma a nꞌaka. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, Chineke ahụ na-enyocha echiche obi zoro ezo. Ọ dịghị mgbe ọ bụla, dị ka unu maara, anyị ji ire ụtọ chọọ ime ka unu bụrụ ndị nke Kraịst. Chineke makwaara na anyị ejighị aghụghọ bịakwute unu ịrịọ ka unu bụrụ ndị enyi anyị nꞌihi na anyị chọrọ ịnata unu ego nꞌaka. Ma ọ dịghị mgbe anyị rịọrọ unu ma ọ bụ ndị ọzọ, ka unu too anyị. Nꞌezie, dị ka ndị ozi Kraịst ọ bụ ihe ruru anyị ịsị unu kwanyere anyị ugwu. Kama anyị biri nꞌetiti unu dị ka ndị bụ nna na-azụ ụmụntakịrị ha, na-elekọta ha. Nꞌihi na anyị hụrụ unu nꞌanya nke ukwuu ruo na ọ bụghị nanị na anyị kwusaara unu ozi ọma, kama anyị nyekwara unu onwe anyị. Nꞌezie, ụmụnna m amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ nꞌetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nꞌihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọ bụla mgbe anyị na-ezisara unu ozi ọma nke Chineke. Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe dị ka Chineke si bụrụ onye akaebe, na mmekọrịta anyị na unu, bụ mmekọrịta dị ọcha na nke guzoziri eguzozi, na nke ịta ụta ọ bụla na-adịghị. Ọ bụrụ na unu ga-echeta, anyị mesoro unu mmeso dị ka nna si na-emeso ụmụ ya. Mgbe nile, anyị nọ na-arịọ unu, na-agba unu ume, ma na-akwagidekwa unu. Na o kwesịrị ka unu na-ebi ndụ kwesịrị ụmụ Chineke, nke ga-ewetara Chineke onye kpọbatara unu nꞌime alaeze ya ọṅụ, ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya. Nꞌihi nke a, anyị ga-aga nꞌihu na-ekele Chineke ekele nꞌihi na mgbe anyị bịakwutere unu, unu anabataghị ozizi anyị dị ka ozizi nke aka anyị, kama unu nabatara ya dị ka ozizi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Otu a ka ọ dịkwa. Okwu ahụ bụ okwu Chineke. Ọ gbanweela ndụ unu, mgbe unu kweere ya. Mgbe unu kweere okwu ahụ, ụmụnna m, unu onwe unu ketara oke nꞌụdị ahụhụ nke ndị Kraịst nọ na Judia hụrụ mgbe ndị obodo unu bidoro ịkpagbu unu, dị ka ndị Juu si kpagbuo ndị Kraịst na Judia. Nꞌihi na mgbe ndị Juu gbusịrị ndị amụma Chineke ziteere ha, ha gbukwara Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ. Ha na-agbalị igbochi anyị izisara ndị mba ọzọ ozi ọma ka ha ghara ichegharị. Ha na-esite nꞌụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịla ha rị ịla ha nꞌiyi. Otu ọ dị, ụmụnna anyị, mgbe anyị si nꞌetiti unu pụọ nọọ nwa oge nta, ọ bụ ezie na anyị na unu nọkwa nꞌime mmụọ, anyị gbalịsịrị ike ịbịakwute unu, karịsịa, mụ onwe m bụ Pọl gbalịrị, gbalịa ịbịa, ma ekwensu gbochiri anyị. Nꞌihi na olee ihe bụ olileanya anyị, ma ọ bụ okpu eze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi? Ọ bụ unu onwe unu. Ee, unu onwe unu ga-abụ ọṅụ anyị mgbe a ga-eme ka anyị nile guzo nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-esi nꞌeluigwe bịa ọzọ. Nꞌezie, unu onwe unu bụ ọṅụ na otuto anyị. Ya mere, mgbe anyị na-apụghị ịnagide ya gaa nꞌihu, anyị kpebiri ịnọ nanị anyị nꞌobodo Atens. Anyị zipụrụ Timoti, nwanna anyị, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ ọma Jisọs Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasie unu obi, nyekwara unu aka nꞌokwukwe unu. Ka unu hapụ ịda mba nꞌihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nsogbu dị otu a bụ ihe Chineke zubere nye anyị. Nꞌihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a ihe anyị kwuru emezuola. Dị ka m na-ekwu na mbụ, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, ezipụrụ m Timoti, ka ọ bịa chọpụta ma okwukwe unu ọ dịkwa chịm. Nꞌihi na ihe tụrụ m ụjọ bụ na ma eleghị anya onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ bụ ekwensu ga-emeri unu nꞌoge ọnwụnwa ndị a, mee ka ọrụ nile anyị rụrụ nꞌetiti unu bụrụ ihe lara nꞌiyi. Ma ugbu a, Timoti esitela nꞌebe unu nọ lọghachikwute anyị. O mere ka anyị mata na okwukwe unu guzo chịm; o mekwara ka anyị mata na unu na-echeta anyị mgbe nile. Na ọ na-akpasị unu mkpa ike ịhụ anyị anya, dị ka o si akpa anyị mkpa ịhụ unu anya. Nꞌihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a kasịrị obi nke ukwuu ọ bụladị nꞌime mkpagbu nile nke anyị nọ nꞌime ya, nꞌihi iguzosi ike nke unu guzoro nꞌokwukwe unu. Ugbu anyị pụrụ ịnagide ọnọdụ ọjọọ ọ bụla ruo oge ọ bụla, ebe anyị maara na unu guzosiri ike nꞌime Onyenwe anyị. Olee ụdị ekele anyị pụrụ ikele Chineke nꞌihi akụkọ a anyị nụrụ banyere unu? Nꞌihi na ehihie na abalị nile, na-esepụghị aka, ka anyị na-arịọ Chineke arịrịọ banyere unu site na ntọ ala obi anyị. Arịrịọ anyị na-arịọ ya bụ ka o mee ka anyị hụ unu anya ọzọ. Ka anyị nwee ike inyere unu aka nꞌokwukwe unu. Ugbu a, ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst megheere anyị ụzọ ịbịakwute unu ọzọ. Ka Chineke meekwa ka ịhụnanya unu too eto, ka ọ babiga oke, rute ibe unu, na ndị ọzọ kwa, dị ka ịhụnanya anyị si dị nꞌebe unu nọ. Nke a ga-eme ka Chineke Nna anyị nye unu obi siri ike, nke dị nsọ, na nke na-enweghị ntụpọ ọ bụla, ka unu nwee ike iguzo nꞌihu ya dị ka ndị a na-apụghị ịta ụta nꞌụbọchị ahụ Jisọs na ndị ya nile ga-alọghachi. Ụmụnna anyị, unu nile amatala otu unu ga-esi bie ndụ na-atọ Chineke ụtọ, nꞌihi na unu amatala iwu ahụ si nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu. Ugbu a anyị na-arịọ unu, nꞌezie, anyị ji aha Onyenwe anyị Jisọs na-arịọ unu sị unu biko, na-aganụ nꞌihu ibi ụdị ndụ ahụ na-adị Chineke mma. Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ. *** Ọ bụghị nꞌụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme, nꞌihi enweghị nghọta ha banyere ihe bụ ụzọ Chineke chọrọ ka ha gbasoo. Chineke achọkwaghị ka unu megbuo ibe unu site na nwoke iduru nwụnye onye ọzọ ka ha abụọ dinakọọ. Nꞌihi na Chineke ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ. Nꞌihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha na ndụ ọchịchọ ọjọọ, kama ọ chọrọ ka anyị dịrị ọcha. Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ ibi ndụ ya dị ka anyị kwuru, ọ bụghị iwu mmadụ ka ọ na-eleda anya, kama ọ bụ iwu Chineke onye nyere anyị Mmụọ Nsọ ya. *** Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesịrị ịdị nꞌetiti ụmụnna, o kwesịghị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nꞌihi na Chineke nꞌonwe ya na-ezi unu inwe ịhụnanya nꞌebe ibe unu nọ. Ma nꞌezie, ọ pụtala ìhè na unu hụrụ ụmụ Chineke nile nọ nꞌobodo unu nꞌanya. Ma anyị na-arịọsikwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nꞌanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a. Jisienụ ike ibi obi nke ịdị nwayọọ, na ibi obi nke ilezi ọrụ nke aka unu anya nke ọma, dị ka anyị gwara unu. Ka ndị na-abụghị ndị Kraịst sọpụrụ unu, ma tụkwasịkwa unu obi. Ka ọ hapụ ịdị mkpa na unu ga-elekwasị ndị ọzọ anya inyere unu aka, inye unu ego, ma ọ bụ igbo mkpa unu. Otu ọ di ụmụnna anyị, achọrọ m ka unu mata ihe bụ ọnọdụ ụmụ Chineke, mgbe ha dara nꞌụra ọnwụ. Mgbe unu maara nke a unu agaghị abụ ndị na-anọ na mwute, ma ọ bụ unu adịrị dị ka ndị na-enweghị olileanya mgbe mmadụ nwụrụ nꞌetiti unu. Nꞌihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nꞌọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kraịst nile nwụrụ anwụ soro Jisọs lọghachi na ndụ. Nꞌihi na, ihe m na-agwa unu ugbu a si nꞌọnụ Onyenwe anyị nꞌonwe ya. Anyị bụ ndị dị ndụ mgbe Onyenwe anyị ga-alọta, agaghị eburu ndị dara nꞌụra ọnwụ ụzọ bilite. Nꞌihi na Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-esi nꞌeluigwe rịdata. Mgbe ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kraịst nile dara nꞌụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si nꞌọnwụ bilite. Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nꞌụwa, ka a ga-eweli elu nꞌime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na ya ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-akasịrịta ibe unu obi mgbe nile. Ugbu a, ụmụnna anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Echeghị m na m nwere ihe ọ bụla ikwu banyere oge ha ga-emezu. Nꞌihi na dị ka unu nile maara nke ọma, ọ dịghị onye maara mgbe ha ga-emezu. Onyenwe anyị ga-abịa mgbe a na-eleghị anya ya, dị ka onye na-ezu ohi si abịa mgbe a na-eleghị anya ya. Mgbe ọtụtụ mmadụ ga-asị, “Udo dị, ihe nile na-aga nke ọma,” mgbe ahụ, na mberede, ka oke ịla nꞌiyi dị egwu ga-adakwasị ha, ọ dịkwaghị otu onye ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ. Ihe mgbu ahụ ga-adị ka ihe mgbu na-adakwasị nwanyị ime na-eme. Ma unu onwe unu, ụmụnna anyị, abụghị ndị na-amaghị ihe ndị a, echekwaghị m na ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dị ka ndị ohi si abịakwute mmadụ. Nꞌihi na unu nile bụ ụmụ ìhè, unu na-ejegharị nꞌehihie. Unu abụkwaghị ụmụ nke ọchịchịrị na abalị. Nꞌihi nke a, nọọnụ na nche. Unu arahụkwala ụra dị ka ndị ọzọ. Kama nọọnụ na nche na-ele anya ọbịbịa ya. Nꞌihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nꞌabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke. Ka anyị nile, bụ ndị bi nꞌìhè bụrụ ndị anya doro, ndị ji okwukwe na ịhụnanya kpuchie onwe ha, na ndị yikwasịrị onwe anyị okpu igwe ahụ nke bụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị. Nꞌihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ọ bụ nzube ya ka ọ zọpụta anyị site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ nwụrụ ọnwụ nꞌihi anyị, ka anyị nwee ike isoro ya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nke a ga-emezukwa mgbe ọ lọghachiri, ma anyị nwụrụ anwụ, ma anyị dị ndụ. Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọ bụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme. Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna anyị, ka unu na-asọpụrụ ndị nile na-adọgbu onwe ha nꞌọrụ nꞌihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nꞌime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ. Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nꞌịhụnanya nꞌihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nꞌudo. Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna anyị, ka unu dọọ ndị ahụ nile aka na ntị, bụ ndị na-adịghị agazi ije ha, ha na ndị umengwụ. Kasienụ ndị ụjọ na-atụ obi. Lekọtazienụ ndị na-adịghị ike. Jirinụ ntachi obi na-anagideritanụ ibe unu nꞌime ịhụnanya. Ka onye ọ bụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nꞌọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ịrụ ọrụ ziri ezi nye onye ọ bụla. Na-aṅụrịnụ ọṅụ nꞌime okwukwe unu oge nile. Na-ekpenụ ekpere oge nile na-esepụghị aka. Na-enyenụ Chineke ekele mgbe nile banyere nile, nꞌihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs. Unu abịanyụla Mmụọ Nsọ dị nꞌime unu. Ọzọ, unu eledala onyinye ibu amụma anya. Kama nwapụtanụ ihe nile ịchọpụta ma ha bụ ọchịchọ Chineke. Ha bụrụ ọchịchọ ya jidesienụ ihe nile ahụ ziri ezi aka nke ọma. Wezụganụ onwe unu nꞌihe ọjọọ nile. Ka Chineke nꞌonwe ya, onye bụ isi udo, mee ka unu dị nsọ nꞌihe nile. Ka Onyenwe anyị debezuo mmụọ unu na mkpụrụ obi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọ bụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Onye ahụ kpọbatara anyị nꞌokwukwe a ga-emezu ihe ndị a, nꞌihi na ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Biko ụmụnna anyị, na-ekperenụ anyị ekpere. Werenụ isutụ ọnụ dị nsọ kelee ụmụnna anyị dum. Iwu m na-enye unu site nꞌaha Onyenwe anyị bụ ka unu gụpụta akwụkwọ a nꞌihu ụmụnna nile. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu nile. Ọ bụ Pọl, na Saịlas, na Timoti na-edegara nzukọ Kraịst dị nꞌobodo Tesalonaịka akwụkwọ a, bụ ndị a na-echebe nꞌime Chineke Nna anyị, na nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka Chineke bụ Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu, ma tụkwasịkwara unu udo nke ya. Inye Chineke ekele nꞌihi unu abụghị nanị ihe dị mma ka anyị mee, kama ọ bụ ụgwọ ọrụ anyị ji Chineke, ụmụnna anyị, karịsịa, mgbe anyị chetara na dị ka unu si na-eto eto nꞌime okwukwe unu na otu a ka oke ịhụnanya unu nwere nꞌebe ibe unu dị si bụrụ ihe a na-enweghị ihe a ga-eji tụnyere ya. Nꞌihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nꞌetiti nzukọ Kraịst nile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachi obi nọgidesie ike nꞌime nsogbu nile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu nꞌime Chineke, ọ bụladị nꞌetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu. Nke a bụ nanị otu ụzọ Chineke si gosi na ihe nile ọ na-eme bụ ihe ziri ezi. Nꞌihi na Chineke na-eji nsogbu ndị a dakwasịrị unu na-akwado unu maka alaeze ya. Ma ya onwe ya, site na mkpagbu ndị a, na-akwadoro ndị ahụ na-akpagbu unu ikpe ọmụma na ahụhụ. Ya mere, anyị na-agwa unu, ndị so anyị na-ahụ ahụhụ, na Chineke ga-anapụta unu, nye unu izuike, mgbe Onyenwe anyị Jisọs ga-apụta ìhè na mbara eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya. Ọ ga-ata ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ ebighị ebi nꞌọkụ ala mmụọ. Ee, ọ ga-ata ndị ahụ ahụhụ, bụ ndị jụrụ ịnabata ụzọ nzọpụta ya nke o mere ka ọ pụta ìhè nꞌime Jisọs Kraịst. A ga-etinye ndị a nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya ruo mgbe ebighị ebi, mgbe ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto dị nsọ, nꞌihi ihe nile o meere ndị nsọ ya. Unu na ya ga-anọ nꞌoge a, nꞌihi na unu kweere okwu Chineke ahụ anyị gwara unu. Ebe ihe ga-esi otu a dịrị, anyị na-arịọ Chineke arịrịọ nꞌihi unu, ka o mee unu ụdị ụmụ ya ọ chọrọ ka unu bụrụ. Ka o mee ka unu dị mma dị ka ọ chọrọ, ka o site nꞌokwukwe unu nye unu ike ya. Mgbe ahụ, mmadụ nile ga-eto aha Onyenwe anyị mgbe ha ga-ahụ ọrụ ọ rụpụtara nꞌime unu. Nsọpụrụ dị oke elu nke unu ga-enwe ga-abụ na unu bụ ndị Chineke. Ọ bụ obi ebere Chineke anyị na obi ebere Onyenwe anyị Jisọs mere ka ihe dị otu a rute unu aka. Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta. Anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna anyị ka unu ghara ikwenye akụkọ a na-akọ ugbu a, nke na-asị na oge ọbịbịa Onyenwe anyị eruola. Ọ bụrụ na unu ahụ ndị na-ahụ ọhụ pụrụ iche banyere nke a, ma ọ bụ ndị na-ekwu na ha sitere nꞌaka Chineke nata ozi pụrụ iche banyere ya, ma ọ bụ ndị ga-agwa unu na ha nwetara akwụkwọ m dere banyere okwu a, unu ekwenyela nꞌihe ndị a nile. Unu ekwela ka e duhie unu, nꞌihi na ụbọchị ọbịbịa Kraịst agaghị eru tutuu ihe abụọ emezuo. Nke mbụ, a ghaghị iburu ụzọ nwee oge oke imegide Chineke ga-adị, mgbe ajọ omume ga-aba ụba dịrịkwa nꞌụdị dị iche iche. Nke abụọ, a ghaghị iburukwa ụzọ mee ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu imegide ndị nile na-asọpụrụ chi dị iche iche, na ofufe nile dị iche iche, na ndị na-ekpere Chineke nꞌeziokwu. Ọ ga-abanye nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke nodụ nꞌebe ahụ kpọọ onwe ya Chineke. Unu echetaghị ihe m gwara unu nꞌoge mụ na unu nọ banyere ya? Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ìhè. Nꞌihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru. Ma ọrụ nke onye mmebi iwu ahụ ga-arụ mgbe ọ bịara ebidolarị ugbu a, ma nwoke ahụ nꞌonwe ya agaghị apụta ìhè tutuu ruo mgbe onye ahụ na-egbochi ya nyere ya ohere. Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye ahụ Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nꞌọnụ ya kupụta laa nꞌiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ. Ekwensu ga-eji onye mmebi iwu ahụ na-abịa mere ngwa ọrụ. Ọ ga-ejupụta nꞌike ekwensu. Ọ ga-ejikwa aghụghọ rụọ ọrụ ebube pụrụ iduhie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-esitekwa nꞌaghụghọ dị iche iche mee ihe ịrịba ama dị iche iche. Nꞌezie, ọ ga-eduhie ndị ahụ nile na-aga nꞌọkụ ala mmụọ, ndị ahụ jụrụ ikwenye eziokwu ahụ. Nꞌihi na ha jụrụ ịnabatara onwe ha eziokwu ahụ, jụ ikwere na ya, na ịhụ ya nꞌanya ka ọ zọpụta ha. Nꞌihi ọjụjụ nke ha jụrụ eziokwu ahụ, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha nile nabata okwu ụgha ndị a. Site na nke a, ọmụma ikpe Chineke ga-adịrị ha nꞌihi na nọ na-enwe aṅụrị nꞌọrụ nile nke ajọ omume kama ikwere eziokwu ahụ. Ma ụmụnna anyị, ndị Chineke anyị hụrụ nꞌanya, ọ bụ ọrụ anyị ikele Chineke ekele mgbe nile nꞌihi na o buru ụzọ họpụta anyị maka ịzọpụta anyị na ịsacha anyị site nꞌọrụ Mmụọ Nsọ rụrụ, na site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌeziokwu ahụ. Ọ bụ site nꞌọrụ ịgbasa ozi ọma anyị ka Chineke ji kpọbata unu. Ọ bụkwa site nꞌozi ọma ahụ anyị ziri unu ka o ji kpọbata unu iketa oke nꞌebube Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ya mere, ụmụnna anyị, ebe unu maara ihe ndị a nile, guzosienụ ike, jidesiekwanụ ozizi ahụ anyị ziri unu ike. Nọgidenụ nꞌozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nꞌozizi anyị ziri unu, ya na akwụkwọ anyị deere unu. Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nꞌonwe ya, na Chineke Nna, onye sitere nꞌobi ebere ya hụ anyị nꞌanya, nye anyị nkasịobi na olileanya ebighị ebi nke anyị na-ekwesịghị iketa. Ya nye unu nkasịobi na ụdị ike ahụ ga-enyere unu aka ịrụ ọrụ ọma, na ikwu okwu ọma. Na mmechi okwu anyị, ụmụnna anyị, kpeerenụ anyị ekpere. Rịọnụ arịrịọ ka Chineke mee ka ozi ọma Onyenwe anyị na-aga nꞌihu. Ka ike dị nꞌozi ọma ahụ weta nchegharị nꞌime ndị nile ga-anụ ya dị ka o wetara nꞌime ndụ unu, mgbe anyị bịakwutere unu na mbụ. Ọzọ kwa, kpesiekwaranụ anyị ekpere ike, ka anyị ghara ịdaba nꞌaka ndị mmadụ ọjọọ nꞌihi na ọ bụghị mmadụ nile hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya. Ma Chineke bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-eme ka unu dịrị ike. Ọ ga-echebekwa unu ka unu hapụ ịdaba nꞌaka ekwensu. Anyị nwere olileanya na ntụkwasị obi nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na unu na-eme ihe ahụ nile anyị ziri unu, na unu ga-agakwa nꞌihu na-eme ha. Ka Onyenwe anyị duzie unu ịghọta ịhụnanya Chineke nwere nꞌebe unu nọ. Ee, ka o duziekwa unu ịghọta ụdị ntachi obi ahụ na-esite nꞌebe Kraịst nọ abịa. Ụmụnna anyị, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu na onye ọ bụla kpọrọ onwe ya onye Kraịst na-ebi ndụ umengwụ na nke arụsịghị ọrụ ike dị ka anyị ziri unu hapụ inwekọ ihe ọ bụla. Nꞌihi na unu maara nke ọma nꞌime onwe unu na unu kwesịrị ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọ bụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesịrị ịrụ. O nweghị onye ọ bụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọ bụla. Anyị mere ihe ndị a, ọ bụghị nꞌihi na anyị enweghị ike ịkwagide unu ka unu na-enye anyị nri dị ka o kwesịrị ịdị. Kama nzube anyị bụ ka anyị bụrụ ihe ilere anya nye unu, na ndị unu ga-eji maa ezi atụ banyere mkpa ọ dị ịrụsị ọrụ ịke. Mgbe anyị na unu nọkwa anyị nyere unu iwu sị, “Onye na-arụghị ọrụ agaghị eri nri.” Ma emeela ka o ruo anyị ntị na ọtụtụ mmadụ nꞌetiti unu nọ nꞌefu, na-arụghị ọrụ ọ bụla. Kama ha ga-arụ ọrụ dịrị ha, ha na-ejegharị na-etinye anya nꞌihe na-agbasaghị ha. Anyị na-enye ndị dị otu a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, sị ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta. Otu ọ dị ụmụnna anyị, unu ekwela ka ike ịrụ ọrụ ọma gwụ unu. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ ime ihe anyị kwuru nꞌime akwụkwọ a, hụọnụ onye ahụ ama, kwụsịkwanụ iso ya nwekọọ ihe ọ bụla. Ka e si otu a mee ka ihere mee ya. Unu agụkwala ya dị ka onye iro unu. Kama dụọnụ ya ọdụ dị ka unu ga-esi dụọ nwanna ọ bụla e kwesịrị ịdụ ọdụ. Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nꞌaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe nile, nꞌime ọnọdụ ọ bụla unu nọ nꞌime ya. Ka ọ nọnyekwara unu. Mụ onwe m bụ Pọl ji aka m depụta ekele a, nke m na-ekele unu nile. Nke a bụ ihe m na-eme nꞌakwụkwọ nile m dere, igosi na ọ bụ m dere ya nꞌezie. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu. Mụ onwe m Pọl, onye Chineke Onye nzọpụta anyị, na Kraịst Jisọs, onye bụ olileanya anyị họpụtara zipụ ịbụ onyeozi Kraịst, na-edegara gị akwụkwọ a. Timoti ezi nwa m dị ka okwukwe anyị nwere nꞌime Onyenwe anyị si dị. Ka Chineke Nna na Kraịst Onyenwe anyị gosi gị obi ọma ya. Ya meekwara gị ebere, nyekwa gị udo nke obi na nke mmụọ. Dị ka m rịọrọ gị ka ị nọgide nꞌEfesọs mgbe m hapụrụ gaa Masidonia, nọgidekwa nꞌebe ahụ. Nꞌihi na achọrọ m ka i mee ka ụfọdụ mmadụ nọ nꞌEfesọs kwụsị ozizi ụgha ha. Mee ka ha kwụsị ịkọ ogologo akụkọ, na inyocha ihe gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche nke na-adịghị agwụ agwụ. Nꞌihi na ihe ndị a na-eweta ajụjụ na ịrụ ụka na-abaghị uru, kama inyere ndị mmadụ aka ịnabata ụzọ ahụ Chineke kwadoro site nꞌokwukwe. Ihe m chọrọ ịhụ bụ ka ụmụ Chineke nile jupụta nꞌịhụnanya nke na-esite nꞌobi dị ọcha. Achọkwara m ịhụ na ha nwere akọnuche zuru oke, na okwukwe siri ike, nke aghụghọ na-adịghị. Nꞌihi na ndị ozizi ụgha ahụ esitela nꞌokwukwe anyị wezụga onwe ha. Ha nọ ugbu a na-atụfu oge ịjụ ajụjụ na ikwu okwu nzuzu. Ha chọrọ ịbụ ndị a maara aha ha dị ka ndị ozizi iwu Mosisi, ma ha amaghị ihe iwu ahụ naegosi anyị. Ma anyị maara na iwu Chineke dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ewere ya mee ihe Chineke chọrọ ka e jiri ya mee. Ma emeghị iwu ahụ nꞌihi anyị ndị a zọpụtara. Kama e mere ya nꞌihi ndị ahụ na-emebi iwu, ndị na-akpọ Chineke asị, ndị ahụ naenupụ isi nꞌobi ha megide Chineke, ndị mmehie, na ndị obi ha na-adịghị ọcha, ndị ahụ na-egbu nne na nna ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha. Ee, Chineke nyere iwu a ime ka ndị naakwa iko pụta ìhè dị ka ndị mmehie. Ha na ndị na-eche uche na-adịghị ọcha, na ndị ikom na-emerụ onwe ha nꞌebe ndị ikom ibe ha nọ, ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche megide ezi ozizi na-eweta ndụ. Nꞌezie, ndị nile naemegide ozi ọma ebube Chineke ahụ e nyere m nꞌaka idebe. Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike ikwusa ozi ọma. Ana m ekelekwa ya ekele nꞌihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi. Ọ bụ ezie na nꞌoge gara aga ekwuru m okwu ọjọọ megide Kraịst, meekwa ndị na-eso ụzọ ya ihe ihere. Ma Chineke meere m ebere nꞌihi na amataghị m ihe m na-eme mgbe m na-eme ihe ndị a. Nꞌihi na amaghị Kraịst nꞌoge ahụ. Ma lee ka obi ọma Onyenwe anyị si dị ukwuu, nꞌihi na o gosiri m ụzọ m ga-esi tụkwasị ya obi, na otu ịhụnanya Kraịst ga-esi jupụta m obi. Okwu a bụ okwu e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-agụkwa m ka onye ọ bụla mata ya nke ọma, ma kwerekwa ya, na Kraịst Jisọs bịara nꞌụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha. Ma Chineke meere m ebere ime ka Kraịst Jisọs were m gosi ndị ọzọ otu o si bụrụ onye ogologo ntachi obi nꞌebe ndị ajọ omume nọ, ka m bụrụ ihe àma nye ndị ọzọ na ha onwe ha nwekwara ike inweta ndụ ebighị ebi. Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Onye bụ eze nꞌọgbọ nile, onye a na-apụghị ịhụ anya. Chineke na-adịghị anwụ anwụ, Onye nanị ya bụ Chineke. Ka otuto na nsọpụrụ dịrị ya ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. Ugbu a, Timoti nwa m, iwu a ka m na-enye gị nꞌaka idebe. Lụsie ọgụ okwu Onyenwe anyị ike, dị ka Onyenwe nꞌonwe ya si nye anyị iwu ka anyị, lụọ ya site nꞌọnụ ndị amụma ya. Jidesie okwukwe i nwere nꞌime Kraịst ike. Meekwa ka akọnuche gị dị ọcha mgbe nile. Nꞌihi na ụfọdụ mmadụ eleziela anya jụ ime ezi ihe akọnuche ha gwara ha. Ma ha emeela ihe ahụ ha maara na ọ jọrọ njọ. Ugbu a ọ bụghị ihe iju anya na ha esitela nꞌokwukwe anyị dapụ. Haimeniọs na Alegzanda bụ ndị ikom abụọ mere ụdị ihe a. Ewerela m ha nyefee ekwensu nꞌaka, ka ọ taa ha ahụhụ tutuu ruo mgbe ha mụtara na ha ekwesịghị ikwu okwu ọjọọ megide Chineke. Ihe mbụ m na-adụsị gị ọdụ ike ka i mee bụ nke a. Na-ekpesịrị ndị ọzọ ekpere ike. Rịọ arịrịọ ka Chineke meere ha ebere. Nꞌime ekpere gị nile na-enyekwa Chineke ekele nꞌihi ihe ọ ga-emere ha. Kpeekwara ndị eze ekpere, ha na ndị nile nọ nꞌọnọdụ dị elu, ma ọ bụ ndị na-achị anyị. Ka anyị nwee ike ibi ndụ udo na nke ịdị nwanyọọ, jiri oge anyị nile na-ebi ndụ ịsọpụrụ Chineke, na nke ime ezi omume. Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke onye nzọpụta anyị ezi ụtọ. Nꞌihi na Chineke chọrọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha matakwa eziokwu ahụ. Ka ha ghọta na ọ bụ nanị otu Chineke dị, na e nwekara nanị otu onye na-ekpe udo nꞌetiti Chineke na mmadụ, onye ahụ bụ Kraịst Jisọs, onye weere ndụ ya nye nꞌihi ịgbapụta mmadụ nile. Nke a bụ ozi ọma ahụ Chineke nyere ụwa mgbe oge ya ruru. A họpụtakwala m nꞌeziokwu ka m bụrụ onyeozi Chineke, ikwusara na izi ndị mba ọzọ ozi ọma a, na igosi ha ụzọ ahụ Chineke kwadoro isi zọpụta ndị mmadụ site nꞌokwukwe. Nꞌihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom nile nọ nꞌebe nile, ndị aka ha dị ọcha, na ndị aka ha na-ejupụtaghị na mmehie, ndị naebughị iro nꞌobi na ndị na-adịghị arụ ụka, ka ha chilie aka ha elu kpọkuo Chineke nꞌekpere. Achọkwara m ka ndị inyom chọọ onwe ha mma nꞌụzọ uche zuru oke, nꞌihe gbasara uwe ha na-eyi na omume ha. Ihe e kwesịrị iji mata ndị inyom Kraịst abụghị otu ha si kpaa isi ha, ma ọ bụ ụdị uwe mara mma ha na-eyi ma ọ bụkwanụ ụdị ihe olu ma ọ bụ mgba nꞌaka ha na-eyi, kama ọ bụ ụdị ndụ ha na-ebi. Ndụ obi ọma na ịdị mma. *** Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe. Ekweghị m ka nwanyị zi ndị ikom ihe, ma ọ bụ ka nwanyị bụrụ onyeisi nꞌebe ndị ikom nọ. Ha kwesịrị ịnọ nwayọọ mgbe ọ bụla unu zukọrọ. Nke a ọ̀ bụ nꞌihi gịnị? Ọ bụ nꞌihi na Chineke buru ụzọ kee Adam tupu o kee Iiv. Ọ bụkwaghị Adam ka ekwensu ghọgburu, kama ọ bụ Iiv ka ọ ghọgburu mee ka o mebie iwu Chineke. Ma ọ ga-azọpụta ndị inyom site nꞌọmụmụ nwa ha ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuru oke. Okwu ahụ bụ okwu anyị kwesịrị ịtụkwasị obi nke na-asị na nwoke ọ bụla chọrọ ịbụ ụkọchukwu na-achọ ezi ọrụ. Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya. *** Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinụlọ nke aka ya nke ọma. Onye nwere ụmụ ndị dị nwayọọ na ndị na-asọpụrụ ya. Nꞌihi na ọ bụrụ na nwoke enweghị ike chịkọtazie ezinụlọ ya ọ̀ ga-esi aṅaa chịzie ụlọ chọọchị Chineke. Onye a ga-enye ụdị ọrụ a agaghị abụ onye nabatara Kraịst ọhụrụ, nꞌihi na ọnọdụ dị elu a pụrụ ime ka o bido ịnya isi. Unu maara na ịnya isi nwere ike ibutere ya ịla nꞌiyi. Dị ka ekwensu si welie onwe ya elu, ma Chineke chụpụrụ ya. Onye a ga-enye ọnọdụ a aghaghị ịbụ onye ndị na-abụghị ndị Kraịst na-agba ezi ama banyere, ka ekwensu hapụ isiste nꞌọnụ ndị a boo ya ebubo ga-eme ka ọ ghara inwe nkwuwa okwu ịchịzi ndị nọ nꞌokpuru ya. Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị omume ha dị mma na ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị hụrụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị ji obi ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike. Tupuu a họpụta ha ịrụ ọrụ a a ga-ebu ụzọ nye ha ọrụ ọzọ dị iche nꞌime chọọchị iji nwapụta ike ije ozi ha na ikwesị ntụkwasị obi ha. Ọ bụrụ na ha agafee ule ahụ, mgbe ahụ a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị. Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke. Ndị nile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinụlọ nke aka ha nke ọma. Nꞌihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkuwa okwu ha nwere banyere okwukwe ha nꞌime Kraịst Jisọs. Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a nꞌihi na a sị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ ị ga-amata ụdị ndị ị ga-ahọpụta dị ka ndị na-eje ozi nꞌụlọ chọọchị Chineke dị ndụ, ebe eziokwu nile dị, na ebe a na-akwado eziokwu nile nke Chineke. Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mfe mmadụ ibi ndụ dị nsọ. Ma ụzọ e si ebi ndụ dị nsọ ahụ bụ site na Kraịst, onye ahụ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, onye e gosiri na o nweghị mmehie ọ bụla, na o nwere Mmụọ zuru oke, onye ndị mmụọ ozi hụkwara ma jeere ozi, onye e kwusara ihe banyere ya nꞌetiti mba nile. Onye ndị mmadụ kweere na ya, nabatakwa nꞌebe nile, na onye a nabanyere nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a nꞌebube ya. Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nꞌoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nꞌime chọọchị ga-esite na Kraịst wezụga onwe ha, bụrụ ndị naagbaso ndị ozizi na-ezi ihe mmụọ ọjọọ na-etinye ha nꞌuche. Ndị ozizi a gaekwu okwu ụgha, kwuokwa ya tutuu ruo mgbe akọnuche ha na-agaghị amakwa ha ikpe. Ha ga-akụziri ndị mmadụ ozizi ụgha dị iche iche na-asị, na ọ bụ ihe jọrọ njọ mmadụ ịlụ di na nwụnye, ma ọ bụ ịta anụ ma ọ bụ iri ụfọdụ ihe oriri dị iche iche. Ma anyị maara na ọ bụ Chineke kere ihe ndị a, nye ha ndị Kraịst a kuziiri eziokwu ya ka ha rie, keleekwa ya nꞌihi ha. Ihe nile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe oriri ọ bụla anyị na-ekwesịghị iri ma ọ bụrụ na anyị ji obi ụtọ na ekele nara ya, rịọ Chineke ka ọ gọzie ya, nꞌihi na a na-eme ka nri ahụ bụrụ ihe dị mma site nꞌokwu Chineke na ekpere. Ọ bụrụ na ị kọwaara ndị ọzọ ihe ndị a nke ọma, mee ka ụmụnna anyị mata ha, ị ga-abụ onye na-arụ ọrụ gị nke ọma, onye a na-esite nꞌokwukwe ị nwere, ya na ezi ozizi ọma nke ị naagbaso, na-azụju afọ. Atụfula oge gị ịrụ ụka banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama jiri oge i nwere na ike i nwere na-azụ onwe gị. Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma, kama iji oge gị mee ihe ahụ na-ewuli mmụọ elu bara uru karịa nꞌụzọ nile. Ya mere, gbalịa ịzụ mmụọ gị, na-agbalịkwa ime onwe gị ezi onye nke Kraịst nꞌihi na nke a bụ ihe ga-enyere gị aka ugbu a nꞌime ndụ a, ma nꞌime ndụ nke na-abịa nꞌihu. Nke a bụ eziokwu ahụ nke onye ọ bụla kwesịrị ịnabatara onwe ya. Anyị na-adọgbu onwe anyị nꞌọrụ na-ahụjukwa anya ime ka ndị mmadụ kwere ya, nꞌihi na olileanya anyị dị nꞌime Chineke dị ndụ, onye nwụrụ ọnwụ nꞌihi mmadụ nile, nke ka nke nꞌihi ndị ahụ kweere na ya. *** Na-ezi ihe ndị a, ma gbalịa ka ị hụ na onye ọ bụla matara ya nke ọma. Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya nꞌihi na ị bụ okorọbịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịma atụ na ihe ilere anya nye ndị kwere ekwe. Mee ka ha soro ụzọ i si ezi ihe na ụzọ i si ebi ndụ gị. Bụrụkwa ihe ịma atụ nye ha, ma ọ bụ ihe ilere anya nꞌime okwukwe gị, na ịhụnanya gị, na iche uche zuru oke gị. Tutuu ruo mgbe m ga-abịa nꞌebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nꞌime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke. Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nꞌibu amụma nke pụtara ìhè mgbe ndị okenye chọọchị bikwasịrị gị aka nꞌisi. Jiri onyinye ndị a nile rụọ ọrụ, ma nọgidesie ike nꞌọrụ gị, ka onye ọ bụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma. Na-elezi anya nꞌihe ị na-eche, na ihe nile ị na-eme. Nọgidesie ike nꞌụzọ ziri ezi. Chineke ga-agọzikwa gị, jiri gị nyere ndị ọzọ aka. Abarala okenye mba, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorọbịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nꞌanya okwu. Na-emeso ndị bụ agadi nwanyị omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche dị ọcha banyere ha. O kwesịrị ka chọọchị na-enyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ma ọ bụrụ na ha enweghị onye ọ bụla gaelekọta ha anya. Kama ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesịrị ibu mkpa ha. Nꞌihi na anyị kwesịrị isite nꞌụlọ anyị gosi obi ọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nꞌihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ. Nwanyị di ya nwụrụ, nke nọ nanị ya nꞌụwa, na-enweghị onye inyeaka, nwere olileanya na Chineke ga-enyere ya aka. Ọ na-anọgidekwa nꞌekpere ehihie na abalị na-arịọ enyemaka Chineke. Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nꞌaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụ rịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ. Ihe ndị a bụ ihe i kwesịrị inye ndị chọọchị gị dị ka iwu, ka ụmụ Chineke mụta, ma na-emekwa ihe dị mma. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị. Ma nwanyị ọ bụla dị ya nwụrụ nke chọrọ ịbụ otu onye nꞌime ndị na-eje ozi na chọọchị, aghaghị ịbụ onye gbara iri afọ isii. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ nanị otu di na ndụ ya nile. Ọ ga-abụ onye mmadụ nile na-agbara ezi ama, nꞌihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nꞌụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, na onye jikeere mgbe nile ime ihe ọma. Ma o kwesịghị ka a kpọbata ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nꞌòtù ụmụ nwanyị na-eje ozi na chọọchị. Nꞌihi na nwa oge nta gafee ha nwere ike lụọ di ọzọ, chefuo nkwa ha kwere na ha gaanọgidesi ike rụọra Kraịst ọrụ. Ụdị omume a pụrụ iwetara ha ikpe ọmụma, nꞌihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ. Ewezugakwarị na ha nwere ike lụọ di ọzọ, ụmụ agbọghọ dị otu a bụ ndị umengwụ, ndị na-atụfu oge ha na-akpa asịrị site nꞌotu ụlọ ruo nꞌụlọ ọzọ, na-etinye onwe ha nꞌokwu na-agbasaghị ha, na nꞌọrụ na-abụghị nke ha kwesịrị ịrụ. Nꞌihi nke a echere m na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesi ka ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye ọ bụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide ha. Nꞌihi na ekwensu eduhiela ụfọdụ mee ka ha mehie, ma site na chọọchị gbapụ. Ka m chetara gị ya ọzọ ndị ikwu na ibe nwanyị di ya nwụrụ kwesịrị igboro ya mkpa dịrị ya. O kwesịghị ka ha hapụrụ ya chọọchị. Nꞌihi na ọ bụ ọrụ chọọchị inyere ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, ndị na-enweghị onye inyeaka nꞌebe ọ bụla. O kwesịrị ka akwụọ ndị ụkọchukwu na-arụzi ọrụ ha ụgwọ dị mma, nke kwesịrị ọrụ ha na-arụ. O kwesịkwara ka a na-enye ha nsọpụrụ ruru ha, karịsịa, ndị ahụ na-arụsị ọrụ ike ikwusa na izi okwu Chineke. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ejila ihe kechie ehi ọnụ mgbe ọ na-azọcha ọka, kama hapụ ya ka ọ na-eri nri mgbe ọ na-arụ ọrụ!” Akwụkwọ nsọ kwukwara nꞌebe ọzọ sị, “Onye na-arụ ọrụ kwesịrị ịnata ụgwọ ọrụ ya”. Egela ntị nꞌebubo ọjọọ ọ bụla a naebo onye okenye karịakwa ma ọ bụ na ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ gbara ama megide ya. Ọ bụrụ na ọ mehiere nꞌezie, kpọpụta ya baara ya mba nꞌihu mmadụ nile na chọọchị, ka onye ọzọ gharakwa iso omume ya. Ana m enye gị iwu a nꞌihu Chineke na nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ ka i nye okenye ọ bụla mehiere ntaramahụhụ kwesịrị mmehie ya, ma okenye ahụ ọ bụ enyị gị ma ọ bụghị, elekwala onye ọ bụla anya nꞌihu. Ebikwasịkwala onye ọ bụla aka nꞌisi ọsịịsọ ime ya okenye ma ọ bụ onye na-eje ozi. Nꞌihi na ị pụrụ ilefu mmehie ya anya. Nke a pụkwara ime ka ọ dị ka ị naakwagide mmehie ha. Hụ na gị onwe gị wezugara onwe gị nꞌebe mmehie nile dị. Aṅụkwala nanị mmiri. Kama o kwesịrị ka ị na-aṅụtụ mmanya ntakịrị ntakịrị nꞌihi ọrịa afọ nke ị na-arịa mgbe nile. Cheta na ụfọdụ mmadụ, ọ bụladị ụfọdụ ndị ụkọchukwu, na-ebi ndụ mmehie nke onye ọ bụla maara ihe banyere ya. Nꞌụdị mmehie dị otu a, i nwere ike ikwu okwu banyere ya. Ma e nwere mmehie ndị ọzọ nke anya naadịghị ahụ. Ha ga-apụta ìhè nꞌụbọchị ikpe. Otu a kwa, ndị mmadụ maara ụfọdụ ihe ọma nke ndị ụkọchukwu na-eme, ma o nwere ụfọdụ ihe ọma ha na-eme nke na-agaghị apụta ìhè tutuu ruo oge ikpeazụ. O kwesịrị ka ndị Kraịst bụ ohu naarụsiri ndị nwe ha ọrụ ike, ma naenyekwa ha nsọpụrụ kwesịrị ha. Ha emekwala ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ sị na ụmụ Chineke bụ ndị na-adịghị arụsị ọrụ ike. Ekwekwala ka a chịa aha Chineke ọchị, ma ọ bụ ka a chịa ihe a na-ezi banyere ya ọchị nꞌihi nke a. Ọ bụrụ na ndị nwe ha bụ ndị Kraịst, nke a ekwesịghị ime ka ha hapụ ịrụzi ọrụ ha, kama ha kwesịrị ịrụsi ọrụ ike nꞌihi na ọ bụ nwanna nꞌime okwukwe ka ha na-enyere aka. Na-ezi ndị mmadụ eziokwu ndị a. Naagbakwa ha ume ka ha mee ihe ndị a. Ụfọdụ mmadụ nwere ike ịjụ ịnabata okwu ndị a, ma ha bụ ezi ozizi nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụrụkwa ntọ ala nke ezi ndụ. Onye ọ bụla naekwu ihe ọzọ dị iche bụ onye na-eweli onwe ya elu na onye nzuzu. Ọ bụkwa onye hụrụ ịrụ ụka na ịjụ oke ajụjụ nꞌanya, nke na-eweta ekworo, esemokwu, nkọcha na ajọ echiche. Ndị a hụrụ irụ ụka nꞌanya, ndị mmehie kpuchiri obi, amaghị otu e si ekwu eziokwu. Nꞌebe ndị dị otu a nọ, ozi ọma a bụ ụzọ dị mfe ha si akpata ego. Si nꞌebe ha nọ wezuga onwe gị. Ị chọrọ ịbụ onye nwere akụ hie nne? Lee na akụ i nwere dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ị bụ onye nwere obi ụtọ na onye na-eme ezi ihe. Nꞌihi na anyị ejighị ihe ọ bụla mgbe anyị na-abịa nꞌime ụwa a, otu aka ahụ, anyị agaghị ejikwa ọ bụladị otu kobo si nꞌime ya pụọ mgbe anyị nwụrụ. Nꞌihi nke a o kwesịrị ka afọ ju anyị nꞌihe anyị nwere, ma ọ bụrụ na anyị enwee nanị ihe anyị ga-eri na uwe anyị ga-eyi. Ma ndị na-achọ inwebiga akụ nke ụwa oke ọsịịsọ, na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, ka ha hụ na ha nwetara ego. Ha na-eme ihe na-ewetara ha nsogbu na ihe na-eme ka ha na-enwe uche ọjọọ, nke na-emesịa duba ha nꞌọkụ ala mmụọ. Nꞌihi na ịhụ ego nꞌanya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ nile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nꞌanya, ndị na-achọsi ya ike, esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe ha, si otu a tinye onwe ha nꞌọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru uju. Timoti, gị onwe gị bụ onye nke Chineke, gbanarị ihe ọjọọ ndị a nile, ma rụsie ọrụ ike ịgbaso ezi omume na ihe dị mma. Mụta ịtụkwasị Chineke obi na ịhụ ndị ọzọ nꞌanya, na inwe ogologo ntachi obi na ịdị nwayọọ. Gbasie ọsọ ọma nke okwukwe gị ike. Jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ Chineke nyere gị aka ike. Ndụ ebighị ebi ahụ i nwere, nke i kwupụtakwara ihe banyere ya nꞌihu ọtụtụ ndị ama. Ana m enye gị iwu nꞌihu Chineke, onye na-enye mmadụ nile ndụ, na nꞌihu Kraịst Jisọs onye gbasiri ama ike nꞌihu Pailet na-atụghị ụjọ. Ka i debezuo ihe nile Chineke nyere gị nꞌiwu idebe. Ka onye ọ bụla ghara ịchọpụta ntụpọ ọ bụla nꞌime gị, site ugbu a ruo mgbe Kraịst ga-abịaghachi ọzọ. Nꞌihi na mgbe oge ahụ ruru, Chineke onye a gọziri agọzi na onye nanị ya bụ Chineke dị ike, eze kachasị eze nile na onye kachasị ndị nwe mmadụ nile ga-eme ka Kraịst pụta ìhè site nꞌeluigwe. Chineke bụ onye nanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebi nꞌime ìhè, nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọ bụla na-ahụbeghị anya mgbe ọ bụla, onye a na-apụkwaghị ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amin. Gwa ndị nile nwere akụ hie nne ka ha ghara ịnya isi. Gwakwa ha ka ha ghara ịtụkwasị obi ha nꞌego ha nke ga-agwụ mgbe nwa oge gafere. Kama gwa ha ka ịnya isi ha, na ntụkwasị obi ha, dịrị na Chineke dị ndụ, onye naenyeju mmadụ nile ihe na-akpa ha, nke ga-eme ka ha nile ṅụrịa ọṅụ mgbe nile. Gwa ndị ahụ nile nwere ego ka ha jiri ego ha rụọ ọrụ ọma. Ha kwesịrị ịbụ ndị bụ ọgaranya nꞌịrụ ọrụ ọma, na iji obi ụtọ na-enyere ndị nọ na mkpa aka. Gwa ha ka ha nọọ na njikere mgbe nile ikenye ndị ọzọ ihe nile Chineke nyere ha. Mgbe ha na-eme ihe ndị a ha na-akpata akụ nke ha naedebe nꞌụlọ akụ nke eluigwe. Nke a bụkwa nanị akụ anyị nwere ike ịkpado nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-abụkwara anyị ihe ga-eme ka anyị na-ebi ndụ juru afọ nꞌụwa a. Biko, Timoti, ahapụkwala imezu ihe ndị a Chineke tinyere gị nꞌaka ime. Wezuga onwe gị nꞌirụ ụka nzuzu nile nke ndị ahụ na-anya isi banyere amamihe ha nwere, na-achọ ka i soro ha rụọ ụka. Ndị a na-esite nꞌinya isi ha gosi nꞌezie na ha amaghị ihe ọ bụla. Ndị a atụfuola ohere ha nwere ịmata ihe ahụ kachasị mkpa na ndụ ha. Ha amaghị Chineke. Ka amara Chineke dịnyere gị. Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, onye Chineke zipụrụ ịgwa ndị nile nọ nꞌebe nile, nwoke na nwanyị, ihe banyere ndụ ebighị ebi o kwere ha na nkwa site nꞌokwukwe nꞌime Jisọs Kraịst. Ọ bụ gị nwoke m hụrụ nꞌanya Timoti, ezi nwa m, ka m na-edere akwụkwọ a. Ka Chineke Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, wụkwasị gị obi ebere na amara ya na udo ya. Ana m ekele Chineke ekele nꞌihi gị Timoti. Ana m ekpere gị ekpere kwa ụbọchị. Ọtụtụ mgbe kwa, ma ọ bụ nꞌime abalị, ka m na-ebili na-arịọ Chineke arịrịọ ka ọ gọzie gị. Chineke, onye bụ Chineke nke nna nna m ha, na Chineke nke m kwa. Ọ bụkwa nanị otu ihe ka m na-ezube nꞌime ndụ a, ọ bụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ. Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ gị anya ọzọ. Ịhụ gị ga-abụkwa ihe oke ọṅụ nye m, nꞌihi na echetara m anya mmiri gị mgbe anyị gbasara nꞌoge ikpeazụ anyị zukọrọ. Amatara m ụdị ntụkwasị obi i nwere nꞌime Onyenwe anyị, ụdị ntụkwasị obi ahụ buru ụzọ dịrị nꞌime nne gị Yunaịsi, na nꞌime nne nne gị Lọịsi. Enwekwara m olileanya na ị na-atụkwasịkwa Onyenwe anyị obi ugbu a karia. Nꞌihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka ike nkwuwa okwu ahụ i nwere na-enwụ dị ka ọkụ. Ike ahụ Chineke nyere gị mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nꞌisi, gọziekwa gị. Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke. Ọ bụrụ na ị na-akwali ike nke ime mmụọ ahụ i nwere, ụjọ agaghị atụ gị ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Onyenwe anyị, ma ọ bụ ime ka ha mata na m bụ enyi gị. Ọ bụ ezie na m nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi aha Kraịst. Ị ga-ejikerekwa isoro m hụọ ahụhụ nꞌihi Kraịst, nꞌihi na ọ ga-agba gị ume nꞌime ahụhụ. Ọ bụ Chineke zọpụtara anyị, kpọbata anyị nꞌọrụ ya dị nsọ. Ọ bụghị nꞌihi na anyị kwesịrị ka a kpọọ anyị, kama ọ bụ rịị nzube ya ịkpọ anyị tupuu a tọọ ntọ ala ụwa a, nꞌihi na ọ chọrọ isite nꞌihe ọ ga-emere anyị gosi anyị ịhụnanya ya na obi ọma ya, na amara ya site na Jisọs Kraịst. Ugbu a o meela ka ihe nile o zubere ime nꞌobi ya pụta ìhè site nꞌọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike nke ọnwụ nꞌiyi zi anyị ụzọ anyị gaesi nwee ndụ ebighị ebi site nꞌịtụkwasị ya obi. Chineke ahọpụtala m ka m bụrụ onye na-ekwusa ozi ọma a, na onyeozi, na onye nkuzi. Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji naahụ ahụhụ ndị a nꞌime ụlọ mkpọrọ nꞌebe a, ma nꞌeziokwu, ihere adịghị eme m, nꞌihi na amaara m onye m naatụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe nile m nyere ya nꞌaka idebe tutuu ruo ụbọchị ahụ ọ ga-alọghachi. Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ nke mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ nke gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nꞌime Kraịst Jisọs. Chezie onyinye ọma ahụ Chineke sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ nke bi nꞌime gị nye gị idebe. Dị ka ị maara, ndị Kraịst nile si nꞌEsia bịa nꞌebe a agbaketala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamoganis ahapụla m laa. Ka Onyenwe anyị gọzie ezinụlọ Onisiferọs. Nꞌihi na ọ bịara leta m, gbaa m ume ọtụtụ mgbe. Ọbịbịa ya kpọtere mmụọ m. Ihere emekwaghị ya ịbịakwute m nꞌụlọ mkpọrọ. Nꞌezie, mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nꞌebe nile, ma nꞌikpeazụ, ọ chọtara m. Ekpere m bụ ka Onyenwe anyị nye ya ezi ngọzi pụrụ iche nꞌụbọchị ahụ Kraịst ga-alọghachi. Ị makwaara nke ọma karịa ka m nwere ike ịgwa gị, otu o si nyere m aka nꞌEfesọs. Timoti, nwa m, bụrụ onye dị ike site nꞌike na amara ahụ Kraịst Jisọs na-enye gị. Nꞌihi na ị ghaghị izi ndị ọzọ ihe ahụ nile gị na ndị ọzọ nụrụ site nꞌọnụ m. Zi ndị kwesịrị ntụkwasị obi eziokwu ahụ, ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a. Soro m hụọ ahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst. Ma dị ka onye agha Kraịst, ekekọtala onwe gị nꞌihe nke ụwa a. Nꞌihi na ọ dịghị onye agha ọ bụla na-ekekọta onwe ya nꞌihe nke ụwa a pụrụ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ. Na-eso ụkpụrụ Onyenwe anyị nꞌọrụ ị na-arụrụ ya, dị ka onye na-agba ọsọ si eso iwu nile e mere maka ịgba ọsọ, si otu a nata onyinye. Ma onye na-esoghị iwu ndị a anaghị anata onyinye ọ bụla. Na-arụsikwa ọrụ gị ike dị ka onye ọrụ ubi nke na-enweta ego hiri nne, ma ọ bụrụ na ọ kụọ mkpụrụ hiri nne. Na-atụgharị uche nꞌihe ịma atụ atọ ndị a, ka Onyenwe anyị nye gị nghọta nke ga-enyere gị aka iji ihe ịma atụ ndị a rụọ ọrụ na ndụ gị. Echefula na Jisọs Kraịst bụ mmadụ. Na a mụrụ ya nꞌezinụlọ eze Devidi. Na ọ bụkwa Chineke nꞌihi na o sitere nꞌọnwụ bilie ọzọ. Ọ bụ nꞌihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a, nꞌụlọ mkpọrọ. Ma ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ike m agbụ, ma ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ike okwu Chineke agbụ. Ma ejikeere m ịnọ na-ahụ ahụhụ ma ọ bụrụ na nke a pụrụ ime ka ndị nile Chineke họpụtara bụrụ ndị a ga-azọpụta, na ndị gaenwe ebube ebighị ebi ahụ dị nꞌime Kraịst Jisọs. Ihe na-enye m nkasịobi bụ eziokwu a, na ọ bụrụ na anyị ahụọ ahụhụ nwụọ nꞌihi Kraịst, nke a na-egosi na anyị amalitelarị isoro Kraịst na-adị ndụ nꞌeluigwe. Ọ bụrụkwa na anyị echee na ọrụ anyị na-arụrụ ya ugbu a siri ike, ka anyị cheta na otu ụbọchị anyị na ya ga-anọkọ. Anyị ga-esorokwa ya bụrụ ndị na-achị achị. Ma ọ bụrụ na anyị agọnarị Kraịst mgbe anyị nọ nꞌahụhụ, ya onwe ya ga-agọnarịkwa anyị nꞌalaeze ya. Ma ọ bụrụ na anyị adaa mba, nọọ nꞌọnọdụ nke enweghị okwukwe ọ bụla, ya onwe ya na-anọgide bụrụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi, na onye ga-enyere anyị aka. Ọ gaghị agọnarị anyị, nꞌihi na anyị bụ akụkụ anụ ahụ ya, ọ ga-emezukwa nkwa ya nile o kwere anyị. Na-echetara ndị mmadụ eziokwu ndị a, na-agwasikwa ha ike nꞌaha Onyenwe anyị ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nꞌihi na okwu nzuzu ndị a na-eweta mgbagwoju anya. Ha bụkwa okwu na-abaghị uru nke naeweta nsogbu. Na-arụsị ọrụ gị ike ka ị bụrụ onye Chineke ga-agwa okwu sị, “Ị meela nke ọma.” Bụrụ onye naarụ ọrụ ọma, onye ihere na-apụghị ime mgbe Chineke ga-enyocha ọrụ gị. Mara ihe okwu Chineke na-ekwu, matakwa otu e si akọwa ya. Wezuga onwe gị nꞌokwu nzuzu na nke rụrụ arụ nile, ụdị okwu nke na-eduba mmadụ nꞌime mmehie, ma na-eweta iwe nꞌetiti mmadụ na ibe ya. Nꞌihi na okwu ndị a bụ okwu na-eweta obi ọjọọ. Ha dị ka nsi nke na-egbu mmadụ. Haimenaus na Filetus, ndị hụrụ ịrụ ụka nꞌanya, bụ ndị na-ekwu ụdị okwu ndị a. Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, naasị na oge mbilite nꞌọnwụ mmadụ nile agafeela. Site nꞌokwu a, ha naemekwa ka ụfọdụ ndị na-ekwere okwu ha bụrụ ndị na-ada mba nꞌokwukwe ha. Ma okwu Chineke na-eguzosi ike dị ka oke nkume. Ọ dịkwaghị ihe ọ bụla pụrụ ifopụta ya. Okwu Chineke bụkwa ntọ ala nkume, nke e dere okwu ndị a nꞌelu ya, “Onyenwe anyị maara ndị bụ ndị nke ya.” E dekwara nꞌelu ya sị, “Ka onye ọ bụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraịst kwụsị ime ihe ndị ahụ dị njọ.” Nꞌime ụlọ onye ọgaranya, ọtụtụ efere dị iche iche dị ya. Ụfọdụ nꞌime efere a ka e ji ọlaedo kpụọ, ụfọdụ ka e ji ọlaọcha kpụọ. Ndị ọzọ dịkwa e ji osisi ma ọ bụ aja kpụọ. Efere ndị ahụ dị oke ọnụ ahịa bụ nke e ji enye ndị ọbịa nri. Ma ndị ahụ dị ọnụ ala, bụ ndị e ji esi ihe, ma ọ bụ ndị e ji ekpofu unyi. Ọ bụrụ na onye ọ bụla edozie onwe ya ọcha hapụ ime mmehie, ọ ga-adị ka efere ndị e ji ọlaedo kpụọ, nke a na-enye nsọpụrụ nꞌụlọ ahụ. Ọ ga-abụkwa onye e doro iche, onye Kraịst doziri iji rụọ ọrụ ọma nile. Gbanarị ihe ọ bụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorọbịa naenwe nꞌime gị. Kama nọọ nso ihe ọ bụla ga-eme gị ịchọ ime ezi ihe. Bụrụ onye nwere okwukwe na ịhụnanya na onye mmekọrịta nke ya ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya na ndị nwere obi ọcha na-atọ ụtọ. Wezuga onwe gị nꞌịrụ ụka nzuzu nile, nꞌihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu na ịlụ ọgụ. O kwesịkwaghị ka ụmụ Chineke bụrụ ndị na-ese okwu ma ọ bụ ndị na-alụ ọgụ. Kama ha ga-abụ ndị dị nwayọọ na ndị ji ntachi obi na-ezi ndị jehiere ụzọ ihe. Jiri obi dị nwayọọ mgbe ị na-ezi ndị naadịghị agbaso ụzọ eziokwu ahụ ihe. Nꞌihi na ọ bụrụ na i jiri obi dị nwayọọ na nsọpụrụ gwa ha okwu, ha nwere ike site nꞌinyeaka Chineke chegharịa, site nꞌihe na-abụghị eziokwu kwere nꞌihe bụ eziokwu. Mgbe ahụ, site nꞌinyeaka gị, ha ga-aghọta eziokwu ahụ, wezuga onwe ha site nꞌọnya nke ekwensu gbaara ha, nke ọ chọrọ isite na ya jide ha, ime ka ha na-eme uche ya. Ha ga-ebido ime ihe Chineke naachọ. Ma mata nke a, Timoti, na nꞌoge ikpeazụ ahụ, ọ ga-esiri ụfọdụ ike ịbụ ndị nke Kraịst. Nꞌihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha nꞌanya, na ndị na-ahụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwulu Chineke, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nꞌobi ha. Ndị na-enweghị ịhụnanya nꞌobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị nkwutọ, ndị okwu na ụka na-atọ ụtọ, ndị na-agha ụgha mgbe nile, ndị na-eme omume dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ. Ndị na-arara ibe ha nye nꞌaka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nꞌanya, kama ịhụ Chineke nꞌanya. Ha ga-abụ ndị na-aga chọọchị, ma ha agaghị ekwenye nꞌihe ọ bụla ha nụrụ. Wezuga onwe gị nꞌebe ndị dị otu a nọ. Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị na-abanye nꞌime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nꞌihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ. Ọ bụ ụdị ụmụ nwanyị a ka ha na-ezi ozizi ọhụrụ ha. Ụmụ nwanyị ndị a bụ ndị na-agbaso ozizi ọhụrụ nile, ma ha anaghị enwe ike aghọta eziokwu ahụ. Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosisi ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ila bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nꞌebe okwukwe anyị dị. Ma ha agaghị aga nꞌihu na-eme ihe ndị a ruo mgbe ebighị ebi. Otu ụbọchị mmadụ nile ga-amata aghụghọ ha, dị ka ndị mmadụ si mata mmehie Jenas na Jambaras mgbe ọ pụtara ìhè. Ma gị onwe gị amatala omume m, matakwa na adịghị m ka ha. Ị maara ihe m kweere, na ụzọ m si ebi ndụ m, na ihe m chọrọ. Ị maara ụdị okwukwe m nwere nꞌime Kraịst na ahụhụ m nile. Ị maara ịhụnanya m nwere nꞌebe ị nọ, na ntachi obi m. Ị makwaara banyere nsogbu m nile na ahụhụ m nile, nꞌihi ikwusa ozi ọma ahụ. Ị maara nsogbu nile dakwasịrị m nꞌAntiọk, na nꞌime Aikoniọm, na Listira. Ma Onyenwe anyị dọpụtakwara m nꞌime ha nile. Nꞌezie, ndị nile chọrọ ime ihe ga-atọ Kraịst Jisọs ụtọ, site nꞌibi ndụ ịsọpụrụ Chineke, ga-ahụ ahụhụ site nꞌaka ndị iro Kraịst. Nꞌeziokwu, ndị ajọ omume nile na ndị ozizi ụgha nile ga-ajọ njọ karịa ka ha dị ugbu a. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ, nꞌihi na ekwensu eduhiela ha. Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nꞌime eziokwu ahụ e ziri gị. Nọgidesie ike nꞌime ha, nꞌihi na gị onwe gị maara na ha bụ eziokwu. Ndị ziri gị eziokwu a bụkwa ndị i kwesịrị ịtụkwasị obi. Ị maara na ọ bụ site nꞌoge ị bụ nwantakịrị ka e ji zi gị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ ihe ndị a nyere gị uche ịnata nzọpụta Chineke site na ntụkwasị obi na okwukwe i nwere nꞌime Kraịst Jisọs. Ihe nile ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ nsọ bụ ihe si nꞌuche Chineke pụta. Ọ bakwara uru izi anyị ihe bụ eziokwu, na ime ka anyị mata ihe dị njọ na ndụ anyị. Ọ̀ na-enyere anyị aka iguzozi nke ọma, na ime ihe dị mma. Ọ bụ ụzọ Chineke họpụtara ime ka anyị bụrụ ndị a kwadobere nke ọma nꞌụzọ nile, na ndị e mere ka ha bụrụ ndị jikeere ịrụ ọrụ ọma nye onye ọ bụla. Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nꞌihu Chineke na nꞌihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe otu ụbọchị, mgbe ọ ga-abịa idozi alaeze ya, na-asị gị, kwusaa okwu Chineke mgbe nile, mgbe ọ bụlạ i nwere ohere, mgbe a naanabata ya na mgbe a na-adịghị anabata ya, mgbe o kwesịrị ekwesị; na mgbe ọ na-ekwesịghị ekwesị, na-egosi ndị mmadụ ajọ omume ha, na-abara ha mba mgbe o kwesịrị ka a baara ha mba. Na-agba ha ume ka ha mee ezi ihe, ma jiri ntachi obi na-enyeju ha okwu Chineke afọ. Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị gburugburu ịchọ ndị ozizi ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ. Ha agaghị ege ntị nꞌihe akwụkwọ nsọ na-ekwu, kama ha gaege ntị nꞌakụkọ na-enweghị isi. Ma guzosie ike nọọ na nche mgbe nile. Atụla ụjọ ịhụ ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị. Rụzie ọrụ gị dị ka onye na-akpọtara Kraịst ndị mmadụ. Ahapụkwala ime ihe ọ bụla i kwesịrị ime. Ana m ekwu okwu ndị a nꞌihi na site na mgbe na-adịghị anya ugbu a agaghị m anọkwa gị nso inyere gị aka. Oge ụla m eruola. Na mgbe na-adịghị anya site nꞌugbu a, aga m anọ nꞌụzọ ịla nꞌeluigwe. Alụọla m ọgụ ukwu na nke nta nꞌihi Onyenwe m. Nꞌime ha nile kwa, edebeziela m onwe m nye ya dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ugbu a oge ahụ ezuola mgbe m gaakwụsị ịlụ ọgụ ma zuru ike. Nꞌeluigwe, okpueze nke ezi omume dị na-eche m, nke Onyenwe anyị, onye naekpe ikpe ziri ezi ga-enye m nꞌụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi. Kama ọ bụghị nanị mụ onwe m ka ọ ga-enye okpueze ahụ, ọ ga-enyekwa ya ndị nile ga-eji ịhụnanya na-eche ọbịbịa ya. Mee ọsịịsọ bịakwute m, nꞌihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nꞌanya ahapụla m gaa Tesalonaika. Kresens agaala Galetia, Taitọs kwa agaala Dalmetia. Ọ bụ nanị Luuku nọnyeere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nꞌihi na achọrọ m ya ka ọ nọọ m nso. Ezipụla m Tikikọs ka ọ gaa Efesọs. Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ na Troas nꞌaka Kapọs, wetakwara m akwụkwọ nile ahụ dị nꞌebe ahụ, nke ka nke akwụkwọ akpụkpọ anụ ahụ. Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-ata ya ahụhụ. Kpachara anya nꞌebe ọ nọ, nꞌihi na o kwuru okwu megide ihe nile anyị kwuru. Na mbụ mgbe a kpọtara m nꞌihu onye ikpe, ọ dịghị onye ọ bụla bịara nyere m aka, mmadụ nile gbara ọsọ hapụ m. Ekpere m bụ ka Chineke hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie. Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ohere iguzosi ike na-atụghị egwu ikwusa ozi ọma ka ụwa nile nụrụ. Ọ zọpụtara m, mee ka a hapụ ịtụnye m nꞌolulu ọdụm. Nꞌezie, Onyenwe anyị ga-agakwa nꞌihu ịnapụta m site nꞌihe ọjọọ nile. Ọ gaakpọbatakwa m nꞌime alaeze ya nke eluigwe. Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. Biko, keleere m Prisila na Akwila na ndị nile bi nꞌụlọ Onisiforọs. Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Militọs nꞌọnọdụ ahụ esighị ike. Biko, jisie ike bịarute nꞌebe a tupuu oge oyi eruo. Yubutọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainus na Kodia na ụmụnna anyị nile. Ka onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọnyere mmụọ gị. Ka amara Chineke dinyere gị. Nọọ nke ọma. Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, odibo Chineke, na onyeozi Jisọs Kraịst, onye Chineke họpụtara, zipụ, ime ka ndị ahụ ọ họpụtara kwere, na ikuziri ha eziokwu ahụ nke na-agbanwe ndị na-anabata ya, ime ka ha si otu a nwee ndụ ebighị ebi. Chineke onye na-adịghị agha ụgha ekwelarị nkwa tupuu e kee ụwa, inye anyị ndụ ebighị ebi a. Ugbu a oge imezu nkwa ahụ ruru, o meela ka ozi ọma a pụta ìhè. O nyefekwara m ọrụ ịgwa onye ọ bụla ihe gbasara ozi ọma a. Nkwusa nke m na-ekwusakwa ya bụ dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si chọọ. Ọ bụ gị Taitọs, ezi nwa m nwoke nꞌime okwukwe nke anyị nwekọrọ, ka m naedetara akwụkwọ ozi a. Ka Chineke onye bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị, nye gị amara ya na udo ya. Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ọ bụla dị mkpa nꞌusoro nke ga-enyere ụlọ nzụkọ dị nꞌebe ahụ aka. Ahapụkwara m gị ka ị họpụta ndị isi chọọchị nꞌobodo ahụ nile, ndị ga-eme ihe m nyere gị nꞌiwu. Ndị isi chọọchị ọ bụla ị ga-ahọpụta ga-abụ ndị a maara nke ọma dị ka ndị na-enweghị ntụpọ, ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị ụmụ ha kwa bụ ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya, nke ndị mmadụ na-agbara akaebe dị mma na ha abụghị ụmụ naebi ndụ ọjọọ, na ndị na-adịghị erube isi. Ebe ndị isi chọọchị a ga-abụ ndị na-elekọta ọrụ Chineke, ha ga-abụ ndị mmadụ na-apụghị ibo ebubo ihe ọjọọ ọ bụla. Ha agaghị abụ ndị nganga, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị isi ike, ndị na-alụ ọgụ nꞌihi ịṅụbiga mmanya oke, ndị hụrụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke. Ha ga-abụkwa ndị guzosiri ike nꞌeziokwu nke ozi ọma ahụ anyị ziri ha. Nke a ga-eme ka ha nwee ike izi ndị ọzọ eziokwu ahụ, na iji ya zi ndị ahụ na-arụ ụka ebe ha si jehie. Nꞌihi na e nwere ọtụtụ mmadụ ndị na-ekweghị ozi ọma a, nke ka nke, ndị ahụ na-asị na ọ dị mkpa ka onye nke Kraịst debe iwu ndị Juu nile nke. Ma okwu ndị a bụ okwu nzuzu, nke naegbochi ndị mmadụ iso eziokwu. Ihe dị mkpa ugbu a bụ ịkwụsị ndị na-ezi ihe dị otu a, nꞌihi na ha esitela nꞌihe ha na-ezi weta oke nsogbu nꞌọtụtụ ezinụlọ, meekwa ka ndị na-anabata ihe ha na-ezi lefuo amara Chineke anya. Ndị na-ezi ihe a na-eme ya nꞌihi ego ha na-enweta. Ọ bụ otu onye nꞌime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit nile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nꞌazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.” Nꞌezie, ọ bụ eziokwu ka o kwuru. Nꞌihi nke a gwasie ha okwu ike banyere mmehie ha na-atụghị ụjọ. Ọ bụ nanị nke a ga-enyere ha aka ibi ezi ndụ nꞌime okwukwe anyị. Kwụsị ha ige ntị nꞌakụkọọ ifo ndị Juu na-akọ. Ekwekwala ka ha gee ntị nꞌiwu ahụ ndị jụrụ eziokwu ahụ na-enye ha. Onye ọ bụla obi ya dị ọcha na-ahụ nanị ihe dị mma na ihe dị ọcha nꞌihe nile. Ma onye ahụ obi ya na-adịghị ọcha, nke na-adịghị atụkwasị onye ọ bụla obi, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ka ọ na-ahụ nꞌihe nile. Nꞌihi na obi ruru unyi, nke na-ekweghị ekwe, na-eme ka ihe nile ọ na-ahụ bụrụ nanị ihe rụrụ arụ. Ọ bụ ezie na ndị dị otu a na-asị na ha maara Chineke ma e lee anya nꞌomume ha, ọ na-ezipụta na ha amaghị ya. Ha bụ ndị ọjọọ, ndị rere ure na ndụ ha, ndị na-adịghị ekwenye nꞌihe ọ bụla gbasara Chineke, ndị na-enweghị ike ịrụpụta ezi ọrụ ọ bụla na ndụ ha. Ma gị onwe gị Taịtọs, ahapụkwala ịkụzi eziokwu ahụ ya na ịbụ onye Kraịst so. Gwa ndị agadi nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuru oke, ka ha bụrụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nꞌanya, na ndị nwekwara ntachi obi. Nꞌotu aka ahụ, gwa ndị agadi nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-akpa asịrị, na ndị na-aṅụbiga mmanya oke. Ka ha na-akụzi ihe dị mma. Ọ bụ ha kwesịrị ịzụpụta ụmụ agbọghọ ka ha nwee uche zuru oke, bụrụ ndị na-ahụ di ha na ụmụ ha nꞌanya. Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuru oke, ndị dị ọcha nꞌobi, ndị bụ ezi nwụnye na-edozi ezinụlọ di ha, ndị na-edo onwe ha nꞌokpuru di ha, ime ka onye ọ bụla ghara ikwulu ozi ọma Chineke. Nꞌotu ụzọ ahụ kwa, gwakwa ụmụ okorọbịa ka ha nwee akọnuche zuru oke. Nꞌebe a ka gị onwe gị ga-abụrụ ha ihe ịma atụ na ihe ilere anya nꞌịrụ ọrụ ọma. Mee ka ihe nile ị na-eme gosi na ị hụrụ eziokwu ahụ nꞌanya, na ị bụkwa onye na-adịghị eji ya egwuri egwu. Hụ na mkparịta ụka gị nile bụ site nꞌuche zuru oke, nke guzokwa ọtọ. Nke a ga-eme ka onye ọ bụla bịakwutere gị ka gị na ya rụrịtaa ụka laa nꞌihere, nꞌihi enweghị ihe ọ bụla o jidere aka ọ ga-eji kwujọọ gị. Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe nile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu. Gwa ha ka ha hapụ izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Nꞌụzọ dị otu a, ha ga-eme ka ndị mmadụ chọọ ikwere nꞌOnyenwe anyị na Chineke anyị. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla chọrọ ịnara ya onyinye amara nzọpụta ebighị ebi ahụ nꞌefu. Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị na Chineke achọghị ka anyị na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nꞌụwa a, kama na ọ chọrọ ka anyị bie ndụ dị mma, ndụ ịtụ egwu Chineke ụbọchị nile. Ndụ ile anya ọbịbịa ụbọchị ahụ a gọziri agọzi, mgbe a ga-eme ka ebube Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst pụta ìhè. Kraịst bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nꞌihi anyị, ịgbapụta anyị site nꞌajọ omume anyị nile. Ọ bụkwa ya sachara anyị, ime ka anyị bụrụ ndị nke aka ya, ndị dị ọcha, na ndị ọ na-agụ agụụ ime ihe dị mma mgbe nile. Na-akụzi ihe ndị a. Werekwa ha na-adụ ndị gị ọdụ. Werekwa ha na-atụ ha mmehie ha nꞌihu. Ma ekwekwala ka ha lelịa gị anya. Chetara ndị gị mkpa ọ dị ido onwe ha nꞌokpuru ọchịchị gọomenti na nꞌokpuru ndị na-achị achị. Ka ha naerubere ha isi, bụrụkwa ndị ọ na-agụ agụụ ime ezi ihe. Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama ka ha bụrụ enyi mmadụ nile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nꞌebe mmadụ nile nọ. Nꞌihi na mbụ, anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupụ isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ, na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị. Ma mgbe ịhụnanya na obi ọma Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ìhè, ọ zọpụtara anyị. Ma ọ zọpụtaghị anyị nꞌihi ọrụ ọma anyị rụrụ, kama ọ zọpụtara anyị nanị site nꞌobi ebere ya na ọmiko ya. Ọ sachapụrụ mmehie anyị, nyekwa anyị ọṅụ ọhụrụ nke ya na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị so. O sitere nꞌịba ụba nke ebere ya wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌihi ihe ahụ nile Jisọs Kraịst Onye nzọpụta anyị mere. O sitekwara nꞌobi ebere ya dị ukwuu gụọ anyị na ndị ga-eketa oke na ndụ ebighị ebi ahụ ọ na-enye. Anyị naelekwa anya ọbịbịa oge ahụ anyị gaanata ya. Ihe ndị a m kwuru nꞌebe a bụ eziokwu. Achọrọ m ka okwu ndị a dị gị nꞌọnụ mgbe nile, meekwa ka o doo ndị gị anya. Ọ bụ ya ga-eme ka ndị nile kweere na Chineke kpọọ ime ihe ọma mkpa. Nꞌihi na ezi ọrụ bara uru. Ọ na-ewetakwa ụgwọ ọrụ. Etinyela onwe gị nꞌọnọdụ ịrụ ụka ọ bụla. Atụfula oge ịrụ ụka banyere ajụjụ na-enweghị ọsịsa ma ọ bụ ajụjụ gbasara usoro ọmụmụ. Wezụga onwe gị nꞌịrụ ụka na-eweta esomokwu dị ka ajụjụ banyere idebe iwu ndị Juu, nꞌihi na ihe ndị a abaghị uru. Dọọ onye ọ bụla na-eweta ọgba aghara nꞌetiti unu aka na ntị ugboro abụọ. Ọ bụrụ na ọ jụ ịnabata ndụmọdụ gị, gị na ya enwekọkwala ihe ọ bụla ọzọ. Nꞌihi na ọgụgụ isi onye dị otu a bụ ọgụgụ isi ime ihe ọjọọ. Ọ bụ onye na-eme mmehie, ọ matakwara na ọ na-eme ya. Biko, ana m akwado izitere gị Atemas ma ọ bụ Tikikọs. Mgbe ọ bụla onye ọ bụla nꞌime ha bịaruru, gbalịsie ike bịa hụ m nꞌobodo Nikopolis, nꞌihi na ọ bụ nꞌobodo a ka m kpebiri ịnọ nꞌoge oyi. Hụ na ị gbalịsịrị ike inyere Zenal okpe ikpe na Apọlọs aka mgbe ha malitere njem ha. Hụkwa na ha nwetara ihe nile ha chọrọ maka njem a. Nꞌihi na ọ dị mkpa ka ndị anyị mụta inyere ndị nile chọrọ enyemaka ha aka. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha bụrụ ndị na-amị mkpụrụ. Ndị nile mụ na ha nọ nꞌebe naekele gị. Keleekwara anyị ndị enyi nile, bụ ndị kwere ekwe. Ka amara dịnyere unu nile. Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Kraịst Jisọs na site nꞌaka nwanna anyị Timoti. Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Faịlimọn. Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nꞌụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipọs onye anyị na ya so na-alụ agha a. Ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara ya na udo ya. Nwanna m Faịlimọn, ana m ekele Chineke ekele mgbe ọ bụ m na-echeta gị nꞌekpere nile m na-ekpe. Nꞌihi na oge nile ka m na-anụ ihe banyere otu i si hụ ụmụ Chineke nile nꞌanya, na ụdị okwukwe i nwere nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. Ekpere m na-ekpe nꞌihi gị bụ ka Chineke mee ka ndị ahụ nile naesite na ndụ gị na nꞌọnụ gị na-anụ ozi ọma ahụ bụrụ ndị ga-ekpebi iso Kraịst nꞌihi ihe ọma ha na-ahụ nꞌime gị nke na-esi nꞌebe Kraịst nọ abịa. Ịhụnanya gị na-enye mụ onwe ọṅụ nke nkasịobi, ezi nwanna m Faịlimọn, nꞌihi na e sitela nꞌobi ọma gị zụọ ọtụtụ ụmụ Chineke. Ugbu a, ọ dị ihe m chọrọ ka i meere m. Enwere m ike ịsị na ihe a bụ ihe ị na-aghaghị ime site nꞌaha Kraịst nꞌihi na ọ bụ ihe dị mma ime eme. Ma nꞌihi ịhụnanya m nwere nꞌebe ị nọ, achọghị ịkwagide gị ka i mee ya. Kama ọ kaara m mma ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Jisọs Kraịst na-arịọ gị arịrịọ a. Biko, arịrịọ m na-arịọ gị bụ nꞌisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m nꞌime Kraịst, onye m ritere nꞌuru nye Kraịst oge a m nọ nꞌụlọ mkpọrọ. Na mbụ, o nweghị uru ọ bụla Onisimọs baara gị, ma ugbu a, ọ bụ onye ga-abara gị uru na onye gaabakwara m uru. Ana m eme ka ọ laghachikwute gị. Ma mgbe ọ na-alọghachikwute gị achọrọ m ka ị mata na mkpụrụ obi m so ya na-alọta. Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nꞌebe a, ka ọ na-enyere m ụdị aka ị gaara enyere m nꞌime ụlọ mkpọrọ a m nọ nꞌihi ozi ọma. Ma otu ọ dị, ekpebiri m na ebe ọ bụ na ị maghị ihe ọ bụla banyere ya agaghị m ejide ya. Achọghị m ka i nyere m aka nꞌihi na a kwagidere gị, kama ọ dị mma ka o si gị nꞌobi pụta. Ma eleghị anya Onisimọs si nꞌụlọ gị gbapụ maka ịnọ nwa oge nta, ma ugbu a ọ na-alọghachi ka gị na ya nọọ ruo ebighị ebi. Ugbu a, ọ naghị alọghachi nanị dị ka ohu, kama ọ na-alọghachi dị ka onye karịrị ohu. Nꞌihi na ugbu a Onisimọs bụ nwanna anyị nꞌime Kraịst. Nꞌezie, Faịlimọn, Onisimọs dị m nꞌobi nke ukwuu. Nꞌihi nke a, ọ bụrụ nꞌezie na ị gụrụ m dị ka enyi gị, nabata Onisimọs dị ka ị ga-esi nabata m. Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nꞌụzọ ọ bụla, ọ bụrụkwa na ọ dị ihe ọ bụla o zuru, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị. Aga m akwụghachi gị ya! Ka m jiri aka m dee ya nꞌebe a: mụ onwe m bụ Pọl ga-akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nꞌihi na ụgwọ i ji m bụ mkpụrụ obi gị nꞌonwe ya. Biko nwanna m, nꞌaha Onyenwe anyị, ana m arịọ gị ka i meere m nke a, ka obi m nwee izuike. Meere m ya dị ka nwanna m nꞌime Kraịst. Obi siri m ike na ị ga-emere m ihe m rịọrọ gị nꞌime akwụkwọ a, ọ bụladị mee karịa dị ka m rịọrọ. Were okwukwe kwadooro m ebe m ga-anọ nꞌihi na enwere m olileanya na Chineke ga-aza ekpere unu ime ka m si nꞌebe a pụta bịakwute unu. Epafras, onye mụ na ya nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi Kraịst Jisọs na-ekele unu. Mak, na Aristakus, na Dimas, na Luuku, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Na mgbe ochie Chineke gwara nna anyị ha okwu nꞌoge dị iche iche. Ọ gwara ha okwu site nꞌọnụ ndị amụma, na site nꞌụzọ ndị ọzọ dị iche iche. Ma nꞌoge ikpeazụ ndị a anyị nọ nꞌime ya Chineke agwala anyị okwu site nꞌọnụ Ọkpara ya bụ Jisọs, onye Chineke nyefere ihe nile nꞌaka. Ọ bụ site nꞌaka Jisọs ka Chineke siri kee ụwa nile na ihe dị nꞌime ya. Jisọs Ọkpara Chineke na-enwụpụta ebube Chineke. Ihe Jisọs bụ na ihe nile o mere gosiri na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. Jisọs na-esite nꞌike aka ya na-achị eluigwe na ụwa nile. Jisọs bụkwa onye ahụ nwụrụ ka ọ sachapụ ma hichapụkwa mmehie anyị nile. Mgbe o mechara nke a, ọ nọdụrụ nꞌebe nsọpụrụ dị elu, nꞌakụkụ Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe. Jisọs dị ukwuu karịa ndị mmụọ ozi. Aha ya bụ Ọkpara Chineke gosiri nke a. Ọ bụ Nna ya nyere ya aha a. Aha ahụ dịkwa ukwuu karịa aha ma ọ bụ ọkwa nile nke ndị mmụọ ozi. O nweghị oge Chineke jiri gwa mmụọ ozi ọ bụla okwu sị “Ị bụ Ọkpara m, taa enyela m gị ugwu na nsọpụrụ nke ya na aha ahụ so.” Ma Chineke kwuru okwu dị otu a banyere Jisọs. Nꞌoge ọzọ kwa Chineke kwuru sị, “Abụ m Nna ya, Nwa m ka Jisọs bụkwa.” Ọzọ kwa, mgbe Ọkpara ya bụ Jisọs, onye ọ mụrụ nanị ya bịara nꞌụwa, Chineke nyere iwu sị “Ka ndị mmụọ ozi nile fee ya ofufe.” Mgbe Chineke kwuru okwu banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị na ha bụ ndị na-eje ozi. Ha dị ka ikuku na-efesi ike. Ha na-agakwa ozi ha nile dị ka ọkụ na-enwusi ike. Ma mgbe Chineke kwuru okwu banyere Ọkpara ya ọ sịrị, “Alaeze Gị, Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpa nꞌaka ziri ezi ka mkpa nꞌaka alaeze gị bụ. Ị hụrụ ezi omume nꞌanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nꞌihi nke a, Chineke nke bụ Chineke gị, ahọpụtala gị mee ka i nwee ugwu na nsọpụrụ karịa ndị ibe gị nile.” Chineke kpọkwara Jisọs “Onyenwe anyị,” mgbe o kwuru sị “Onyenwe anyị, na mbụ ọ bụ gị kere ụwa. Eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. Ha ga-ala nꞌiyi bụrụ ihe efu. Ma gị onwe gị ga-anọgide ruo mgbe nile ebighị ebi. Eluigwe na ụwa ga-akacha nka dịrị ka akwa ochie, ma otu ụbọchị ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụ ọgụgụ afọ gị agaghị agbanwe ruo mgbe ebighị ebi.” Ò nweela oge Chineke gwara ndị mmụọ ozi okwu, dị ka o siri gwa Ọkpara ya sị “Nọdụ nꞌebe a nꞌakụkụ m, nꞌugwu na nsọpụrụ, tutuu ruo mgbe m ga-egwepịa ndị iro gị nile nꞌokpuru ụkwụ gị?” E, è! O nweghị mmụọ ozi ọ bụla Chineke gwara okwu dị otu a! Nꞌihi na ndị mmụọ ozi ya bụ nanị mmụọ na-eje ozi. Ha bụ ndị a na-ezipụ ka ha nye aka. Ha na-elekọtakwa ndị ahụ ga-anata nzọpụta Chineke. Anyị anụla akụkọ nzọpụta a Jisọs wetaara anyị. Ka anyị ṅazie ntị nke ọma jidesiekwa ihe anyị nụrụ ike ka anyị hapụ ikwe ka ha si nꞌobi anyị pụọ. Iwu ahụ ndị mmụọ ozi nyere Mosisi bụ ezi iwu. Onye ọ bụla nupụrụ isi nꞌiwu ahụ, natara ahụhụ nꞌihi nnupụ isi ya. Egeghị ntị ọ bụla natakwara ntaramahụhụ dị ka o si kwesị. Ndị nupụrụ isi natara ntaramahụhụ kwesịrị ihe ọjọọ ha mere. Ọ bụrụ na a tara ha ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ ha mere, anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị elefuo oke nzọpụta ahụ anya, bụ nke Kraịst wetara? Ọ dịghị! anyị apụghị ịgbanarị ahụhụ. Onyenwe anyị nꞌonwe ya kwuru okwu nzọpụta a. Ndị na-eso ụzọ ya, bụ ndị nụrụ okwu ya kwukwara ya, gosi anyị na ọ bụ eziokwu. Chineke nꞌonwe ya tụkwasịrị akaebe nke ya iji kwagide na okwu ndị a bụ ezie, site nꞌịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịba ama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche. Chineke kesakwara ọtụtụ onyinye Mmụọ Nsọ, dị ka o siri dị ya mma. Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu karịsịa ihe banyere ụwa gaje ịbịa abịa. Otu onye nꞌime ndị dere ihe nꞌakwụkwọ nsọ, chere echiche banyere ihe ndị a sị, “Chineke, gịnị mere i ji gụọ mmadụ na-abụghị ihe ọ bụla dị ka ihe? Gịnị mere i ji enwe obi ọcha nꞌebe mmadụ nọ? Gịnị mere gị na nwa nke mmadụ ji enwe mmekọ? Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwa ntịntị oge i mere mmadụ ka ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi. Ma ugbu a i werela ịma mma kpube ya nꞌisi dị ka okpueze. I werekwala ihe nile mee ha ka ha bụrụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya.” Chineke edoola ihe nile nꞌokpuru ụkwụ Jisọs. Ọ dịghị ihe ọ bụla na-adịghị nꞌokpuru ụkwụ ya. Ma anyị adịghị ahụ ka ihe ndị a mezuru ugbu a. Ma anyị ga-ahụ ha mgbe Jisọs ga-abịa ịbụ eze. Ma anyị na-ahụ Jisọs, onye e mere ka ọ dị ala nanị otu mgbe. Onye e mere ka ndị mmụọ ozi dị elu karịa ya, ka ọ hụọ ahụhụ nwụọkwa nꞌihi mmadụ nile. Nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ, Chineke ewerela nsọpụrụ kpube ya nꞌisi dị ka okpueze. E mere ka ọ bụrụ ihe ziri ezi nꞌanya Chineke, onye kere ihe nile, na Jisọs ga-ahụ ahụhụ. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnwụ ya mee ka ọtụtụ mmadụ bịaruo nso nzọpụta. Ma ahụhụ Jisọs hụrụ mere ya ka ọ bụrụ onyeisi zuru oke nke nwere ike iduba ndị ya na mmeri nke nzọpụta. Jisọs na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị ọcha site na mmehie ha. Nꞌezie, onye na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị nsọ, na ndị a e mere ka ha dị nsọ nwere Chineke dị ka Nna ha. Nke a mere ihere adịghị eme Jisọs ịkpọ ha ụmụnna ya. Jisọs sitere nꞌọnụ onye dere akwụkwọ Abụ Ọma sị, “Aga m agwa ụmụnna m ihe banyere Chineke bụ Nna m. Anyị nile ga-eji otu olu too ya. Aga m ekwuwa aha Chineke nꞌọgbọ ọha.” Nꞌebe ọzọ nꞌakwụkwọ nsọ, o sitere nꞌọnụ onye ọzọ kwuokwa sị “Aga m eji obi m nile kwere na Chineke. Olileanya nke m, na nke ụmụ Chineke nyere m ga-adịgide nꞌime gị Chineke.” Nꞌebe ọzọ kwa nꞌakwụkwọ nsọ o kwukwara sị “Lee mụ na ụmụ nke Chineke nyere m.” Anyị bụ ụmụ Chineke ka e jiri ọbara na anụ ahụ mee. Jisọs gbokwasịrị onwe ya ụdị dị otu a. A mụrụ ya dị ka mmadụ efu. Nꞌihi na ọ bụ nanị dị ka mmadụ ka ọnwụ ya pụrụ ịdị ire. Site nꞌọnwụ ọ nwụrụ, ọ lara ike ajọ onye ahụ bụ ekwensu nꞌiyi. Ekwensu ahụ nwere ike ọnwụ. Jisọs mere nke a, ka ọ dị mfe ịtọpụ ụmụnna ya site nꞌagbụ. Ha nọ nꞌagbụ nke ụjọ ọnwụ. Jisọs abịaghị ịzọpụta ndị mmụọ ozi. Kama ọ bịara inyere ụmụ ụmụ Eberaham aka. Ọ dị mkpa na Jisọs bịara nꞌụdị anyị bụ ụmụnna ya. Nꞌihi na ọ bụ nanị site nꞌụzọ dị otu a, ka ọ pụrụ ịbụ onyeisi nchụaja nwere obi ebere nꞌebe anyị nọ, na onyeisi nchụaja kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihu Chineke, ikwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihi mgbaghara mmehie anyị. Nꞌihi na ebe ya onwe ya hụrụ ahụhụ, ọ pụrụ inyere ndị na-ahụ ahụhụ aka. Ihe banyere ọnwụnwa doro ya anya. Nꞌihi nke a ọ maara ihe bụ nsogbu anyị mgbe anyị dabara nꞌọnwụnwa. Ọ pụkwara inyere anyị aka. Ya mere ụmụnna m nꞌime Onyenwe anyị, unu ndị Chineke doro iche mee unu ndị nke ya na ndị ozi ya. Chineke emeela unu ndị ezinụlọ ya. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ekwesị ka unu cheta Jisọs Kraịst onye e mere onyeisi ozi nke Chineke, na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị. Jisọs sitere nꞌaka Chineke nata nke a. Ọ rụkwara ọrụ ya dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihe nile e zitere ya ka o mee. Dị ka Jisọs, Mosisi bụkwa nwoke biri ndụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ma Jisọs nwere nsọpụrụ dị elu karịa Mosisi. Nꞌihi na Jisọs nꞌonwe ya bụ ntọ ala ebe obibi ahụ. O nwekwara ugwu na nsọpụrụ karịa ebe obibi ahụ na ozi nile e jere nꞌime ya. Nꞌihi na ụlọ ọ bụla nwere onye tọrọ ntọ ala ya. Chineke bụ onyeisi ntọ ala ihe nile nꞌime eluigwe na nꞌelu ụwa. Ọ bụkwa Chineke kere ha nile. Mosisi jere ozi ya nile dị ka ohu kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ọ nọ nꞌọrụ Chineke. Ma ọ bụ nanị ohu nꞌoge ahụ. Ọrụ nile ọ rụrụ tụrụ aka gosi anyị ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu. Ma Kraịst bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ọkpara e nyefere nlekọta ụlọ Chineke nꞌaka. Anyị bụkwa ụlọ ya, ma ọ bụrụ na anyị anọgide bụrụ ndị nwere obi ike na ntụkwasị obi nꞌihe ahụ anyị na-ele anya ya. Mmụọ Nsọ Chineke enyela anyị okwu ndụmọdụ nke na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu Chineke taa, unu ekwela ka obi unu sie ike dị ka nkume, dị ka unu mere mgbe unu nupụrụ isi megide Chineke, dị ka unu mere nꞌụbọchị ahụ nꞌime ọzara mgbe unu nwara ya ọnwụnwa. Nꞌebe ahụ ka nna nna unu ha nọ nwaa m ọnwụnwa, lee m ule, ka Chineke kwuru. Ọ bụ ezie na ha hụrụ ihe m meere ha nꞌime iri afọ anọ. Nꞌihi ya ewesoro m ndị ahụ iwe sị ha, ‘Ha bụ ndị nnupụ isi, na ndị jụrụ irube isi nꞌiwu m.’ “Ewere m iwe, ṅụọ iyi sị, ‘Ha agaghị abata soro m zuru ike.’ ” Ya mere, lezienụ anya ụmụnna m, ka ajọ omume nile na ekweghị ekwe nile nke obi ghara ịdị nꞌime onye ọ bụla nꞌetiti unu, nke ga-eme ka unu site nꞌiso Chineke dị ndụ tụgharịa. Kama na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị, ogologo ụbọchị ahụ nile ihe banyere ụbọchị ahụ bụ Taa metụtara unu. Ka a hapụ inwekwa onye ọ bụla a ga-esite nꞌaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. Nꞌihi na anyị abụrụla ndị ga-eso Kraịst keta oke, ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ntụkwasị obi anyị nwere na mmalite ruo ọgwụgwụ. Chetanụ nke ọma ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu sị: “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike dị ka nkume, dị ka unu mere mgbe unu nupụrụ isi nꞌebe m nọ.” Olee ndị bụ ndị a nụrụ olu Chineke ma nupụ isi megide ya? Ọ bụ ndị ahụ Mosisi dupụtara site nꞌala Ijipti. Ọ bụkwa olee ndị ka Chineke wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ ndị ahụ mehiere megide ya. Ndị ahụ nwụrụ ọnwụ nꞌọzara ebe ozu ha tọgbọkwara. Mgbe Chineke ṅụrụ iyi sị, “Ha agaghị aba nꞌebe izuike m ma ọlị.” Ọ bụ olee ndị ka ọ na-ekwu ihe banyere ha? Ọ bụ ndị ahụ nwere nnupụ isi dị egwu, nꞌime ha. Ugbu a anyị maara nke ọma na ha enweghị ike ịbanye nꞌebe izuike Chineke, nꞌihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe. Ma nkwa dịkwara anyị ugbu a ịbanye ndụ ebighị ebi, ebe izuike nke Chineke. Ya mere, ka anyị lezie anya nke ọma, ka a hapụ ịchọta onye ọ bụla nꞌetiti anyị nke na-agaghị abanye. E kwusaalara anyị ozi ọma a. Ha onwe ha nụkwara ya. Ma ozi ọma ahụ ha nụrụ enyereghị ha aka. Nꞌihi na ha ejighị okwukwe nara ya, ha egekwaghị ntị. Ma ọ bụ nanị anyị onwe anyị ndị kwere ga-aba nꞌebe izuike Chineke. Ma banyere ndị na-ekweghị ekwe ka Chineke sịrị “Dị ka m ṅụrụ iyi nꞌiwe m, ha agaghị aba nꞌebe izuike m ma ọlị.” Ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke kwuru okwu a, ma malite na mgbe ụwa bidoro, Chineke ejikerelarị na-eche ha. Anyị maara na Chineke ejikerela ugbu a na-eche anyị. Akwụkwọ nsọ kpugheere anyị nke a site nꞌụbọchị asaa nke okike. Nꞌụbọchị nke asaa Chineke zuru ike site nꞌọrụ ya. Ma nꞌebe ọzọ, Chineke kwuru okwu banyere ụfọdụ ndị Juu a sị “Ha agaghị aba nꞌebe izuike m.” Nꞌihi nke a anyị na-ahụ na ozuzu ike dị nꞌihu nye ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ndị mbụ nụrụ ozi ọma a abanyeghị nꞌebe izuike ahụ. Ha abanyekwaghị nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌokwu Chineke site na-ekweghị ekwe ha. Ma mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Chineke kwuru okwu. Nꞌoge Devidi, Chineke kwuru okwu ọzọ banyere ozuzu ike. Ọ dọrọ ha aka na ntị sị “Gee ntị nꞌolu ya taa ụnu emekwala ka obi unu sie ike dị ka ndị ahụ mere ka iwe wee m.” Nꞌoge gara aga, Joshua nyeere ụmụ Izirel aka ịchọta otu ụdị ezumike. Ma ala ahụ Chineke kwere ha na nkwa enyezughị ha ezumike zuru oke. Nꞌihi na a sị na ezumike ahụ zuru oke, Chineke agaraghị ekwukwa okwu banyere ụbọchị ọzọ. Nke a na-egosi anyị na ndị Chineke nile na-ele anya ezumike zuru oke nꞌebe Chineke nọ, ezumike ga-adị ka ezumike Chineke nꞌụbọchị nke asaa. Nꞌihi na onye ọ bụla banyere nꞌezumike Chineke esitela nꞌọrụ nwee izuike, dị ka Chineke siri banye nꞌizuike nke ya mgbe o kechara ihe nile. Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nꞌebe izuike nke eluigwe, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọ bụla nꞌime anyị nke na-agaghị aba nꞌihi ekweghị ekwe dị ka ụmụ Izirel. Nꞌihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọ bụla. Ọ na-adụba ruo nꞌebe mkpụrụ obi na mmụọ kewara onwe ha, na ruo nꞌebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha gbaa nꞌanwụ ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla nꞌime ihe nile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nꞌebe Chineke nọ. Ihe nile ghere oghe, gbara ọtọ nꞌihu anya ya. Ọ bụ nꞌihu ya ka anyị nile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nile. Ma anyị nwere Jisọs Ọkpara Chineke dị ka onyeisi nchụaja ukwu nke ndụ anyị. Ọ nọ ugbu a nꞌeluigwe nꞌihu Chineke. Nꞌihi nke a ka anyị jidesie okwukwe ahụ anyị kwupụtara aka ike. Nꞌihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara Jisọs ọnwụnwa nꞌụzọ nile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma o meghị mmehie nꞌụzọ ọ bụla mgbe a nwara ya. Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa. Nꞌihi na a na-esite nꞌetiti ndị mmadụ họpụta onyeisi nchụaja. A na-ahọpụta onye ahụ ka ọ bụrụ onye na-anọchite anya mmadụ ibe ya nꞌihu Chineke. Ọ na-achụkwa aja, na-enye Chineke onyinye nꞌihi mmehie ndị ya. Onyeisi nchụaja esi otu a họpụta na-enwe ọmiko nꞌahụ ndị ya. Ọ maara ndị na-amaghị ihe nꞌetiti ha. Ọ maara ndị na-adịghị ejezi ije. Ọ makwaara na dị ka ha, ya onwe ya nwere ọrụ. Nꞌihi ọrụ nke ya onwe ya nwere, aja mbụ ọ na-achụrụ Chineke bụ nꞌihi ya onwe ya. Emesịa, ọ na-achụ aja ọzọ nꞌihi ndị ya. Mmadụ ọ bụla apụghị ime onwe ya onye nchụaja. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ime mmadụ ka ọ bụrụ onye nchụaja. Cheta na ọ bụ Chineke mere Erọọn ka ọ bụrụ onye nchụaja. Otu a kwa Kraịst emeghị onwe ya onye nchụaja, ọ bụ Chineke mere ya onye nchụaja. Chineke gwara ya okwu sị “Nwa m, taa ebuliela m gị elu.” Mgbe ọzọ kwa Chineke gwara Kraịst okwu sị ya “Dị ka Melikizedeki, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe Jisọs nọ nꞌụwa, o kpere ekpere nye Chineke. Mgbe ụfọdụ nꞌọnọdụ ekpere ahụ, ọ na-akwa akwa. Mgbe ọzọ kwa, anya mmiri na-ejupụta ya nꞌanya. O kpere ekpere ya nye Chineke nꞌihi na ọ maara na Chineke pụrụ ịzọpụta ya site nꞌọnwụ. Chineke nụkwara ekpere ya, nꞌihi na Jisọs bụ onye nchụaja na-erube isi. Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ma ọ hụrụ ahụhụ. Nꞌime ahụhụ a nile, ọ mụtara irube isi site nꞌihe nile dakwasịrị ya. Ma Kraịst sitere nꞌahụhụ ghọọ onye zuru oke. Ọ ghọrọ ụzọ nzọpụta zuru oke, nye mmadụ nile bụ ndị na-erubere ya isi. Cheta na Chineke gụrụ ya onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. O yiri Melikizedeki. Cheta na o siteghị nꞌagbụrụ ndị nchụaja. Ma Chineke mere ya onyeisi nchụaja pụrụ iche. Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ m nwere ikwu banyere Kraịst na otu o siri bụrụ onye nchụaja. Ma ọ rara ahụ ịkọwa ya nꞌụzọ unu ga-aghọta ya. Ọ dị ka ịghọta eziokwu nke ime mmụọ adịghị ekwe unu. Lee kemgbe unu kweere na Kraịst! Unu kwesịrị izi ndị ọzọ ihe ugbu a, ma unu nọrịrị na-ele anya ka ndị ọzọ bịa zie unu, dị ka unu bụ ọbịa nꞌokwu Chineke. Ụfọdụ nꞌime unu enwebeghị ike ịghọta ozizi dị mfe dị nꞌime akwụkwọ nsọ. Ndị a dị ka ụmụ ọhụrụ. Ha na-achọ ihe dị mfe, ihe na-esighị ike, dị ka ịṅụ ara. Ma onye ọ bụla na-aṅụ ara, bụ nwa ọhụrụ, ee, nwa ọhụrụ nꞌime Kraịst. Ọ dị ka onye nke Kraịst na-enweghị ike ịkọwa ihe dị iche nꞌetiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ bụkwa nwa ọhụrụ nꞌime Kraịst. Nri dị ike dị ka ụtara dịrị ndị Kraịst katara ahụ. Anyị chọrọ dimkpa nꞌokwu Chineke. Ha pụrụ ịmata ihe dị iche nꞌetiti ezi ihe na ajọ ihe. Ya mere ka anyị hapụtụ ozizi ndị ahụ a na-ezi ndị kweere na Kraịst ọhụrụ, ma ka anyị lenye anya nꞌokwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ kwesịghị ka anyị malitekwa tọwa ntọ ala gbasara inwe okwukwe na Chineke, na inwe nchegharị site na ndụ ọjọọ ndị ahụ na-eweta ọnwụ. Ọ dịghị mkpa na a ga-akụziri unu ihe banyere ime baptizim, onyinye nke Mmụọ Nsọ, mbilite nꞌọnwụ na ikpe ebighị ebi. Site nꞌike Chineke, anyị ga-aga nꞌihu ikwu ihe ọzọ. Ọ bụ ihe rara ahụ ime, ka ụfọdụ laghachikwute Chineke, ma ọ bụrụ na ha aghọtala ozi ọma ahụ, detụkwa onyinye ahụ si nꞌigwe ire. Ọ bụrụ na ndị a eketakwala oke nꞌime Mmụọ Nsọ. Ma ọ bụrụ na ha anụrụla ụtọ nke okwu Chineke, na ebube ọ dị bụ ike nke ụwa gaje ịbịa. Ọ bụrụ na ndị dị otu a ajụ Chineke, ọ rara ahụ imekwa ka ha chegharịa. Ọ pụghị ime! Ihe ha mere mgbe ha jụrụ Chineke, bụ ịkpọgide Ọkpara Chineke nꞌobe ọzọ, na imekwa ya ihe ihere nꞌihu ọha. Mgbe mmiri zokwasịrị ubi mmadụ, nke mere ka ubi ahụ mịa ezi mkpụrụ, Chineke agọziela ubi ahụ. Ma ọ bụrụ na ubi ahụ epuo nanị ogwu na ahihia, kama ịmị mkpụrụ, ubi a abaghị uru. Ihe a ga-eme ya bụ ịkpọ ya ọkụ. Ma echeghị m na ọ bụ unu ka okwu a dịrị ụmụnna m. Unu bụ ndị kwere ekwe, ya mere unu na-amị ezi mkpụrụ nke ya na nzọpụta unu so bịa. Nꞌihi na Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Olee otu ọ ga-esi chefuo ọrụ nile unu rụụrụ ya? Olee otu ọ ga-esi chefuo ịhụnanya unu gosiri nꞌihi ya site nꞌinyere ibe unu ndị kwere ekwe aka? Anyị chọrọ ka unu nọgide na-eme ka ịnụ ọkụ nꞌobi unu dịgide na-aga nꞌihu tutuu ruo ọgwụgwụ ndụ. Unu ga-anata ụgwọ ọrụ unu nke zuru ezu. Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama na-adịnụ ka ndị ahụ ji okwukwe na ntachi obi na-anata ihe ọ bụla Chineke kwere na nkwa. Ihe ịma atụ bụ nkwa nke Chineke kwere Eberaham. Mgbe Chineke kwere Eberaham nkwa, ọ ṅụrụ iyi. O jiri aha ya, Chineke, ṅụọ iyi, nꞌihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya. Ọ ṅụrụ iyi sị “Nꞌezie aga m agọzi gị. Aga m eme ka ị ghọọ nna nke mba dị ukwuu.” Eberaham jiri ntachi obi chere tutuu Chineke emezuo nkwa ya. Eberaham nwetara nwa nwoke. Anyị na-eji ndị dimkpa ṅụọ iyi ka anyị mezuo nkwa anyị kwere. Nkwa e kwere nꞌụzọ dị otu a enweghị ịrụ ụka. Chineke jiri ịṅụ iyi kee onwe ya agbụ, ka ndị nile nwere nkwa ya hapụ inwe obi abụọ. Ha agaghị eche na Chineke ga-agbanwe ihe o zubere ime. Ugbu a Chineke ji ụzọ ihe abụọ nke na-enweghị mgbanwe kee onwe ya agbụ ime ka nkwa ya guzosie ike. Ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na Chineke ga-ekwu okwu ụgha. Ya mere, anyị nwere oke ntụkwasị obi na ọ ga-echebe anyị mgbe anyị gbakwuuru ya, Ntụkwasị obi nchebe ebighị ebi a nke guzo chịm bụ ebe mkpụrụ obi anyị na-adabere nꞌime olileanya. Ntụkwasị obi a dị ka eriri nke jikọtara anyị na Chineke. Jisọs eburula anyị ụzọ laa nꞌeluigwe. Ebe ahụ ka ọ na-arịrịọ anyị arịrịọ dị ka onyeisi nchụaja anyị ruo mgbe ebighị ebi. Ọnọdụ ya dịkwa dị ka nke Melikizedeki. Melikizedeki a bụ eze obodo Salem. Ọ bụkwa onye nchụaja Chineke onye kachasị ihe nile elu. Ọ bụ ya zutere Eberaham mgbe Eberaham si nꞌogbugbu ndị eze iri ahụ na-alọghachi. Ọ gọziri Eberaham. Eberaham kewapụtara otu ụzọ nꞌụzọ iri nke ihe nile ọ dọtara nꞌagha nye ya. Otu ụzọ nꞌụzọ iri a bụ onyinye ọchụchụ aja nꞌomume ndị na-efe Chineke. Ugbu a ihe aha a bụ Melikizedeki pụtara bụ Eze ezi omume. Aha obodo ya bụ Salem pụtara Udo. Nꞌihi nke a, a kpọkwara Melikizedeki Eze Udo. Eze a enweghị nna, o nwekwaghị nne, o nweghị akụkọ e dere banyere nna nna ya ha. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, ma ọ bụ ọgwụgwụ ndụ. Ma e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. Leenụ ka Melikizedeki si dị ukwuu! Ọ bụladị Eberaham, nna mbụ nke ụmụ Izirel, nyere ya onyinye ọchụchụ aja! O nyere ya otu ụzọ nꞌime ụzọ iri nke ngwa kachasị mma ọ kwatara nꞌagha! Ọ bụ ihe a maara nke ọma na ndị sitere nꞌezinụlọ Livayị bụ ndị e nyere iwu pụrụ iche ịnakọta onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri site nꞌaka ndị obodo ha. Ụmụnna ha nyere ha onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri a nꞌihi na ọ bụ ihe Chineke nyere nꞌiwu. Ma lee onye a na-abụghị onye Juu, onye a na-esiteghị nꞌagbụrụ Livayị pụta! Ya onwe ya naara Eberaham onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri! Mgbe o mesiri nke a, o sitere na ya tụkwasịrị Eberaham ngọzi! Anyị maara na onye karịrị ukwuu bụ onye na-agọzi onye dịkarịrị nta. Ndị nchụaja na-anata otu ụzọ nꞌụzọ iri ga-anwụ, mgbe oge ọnwụ ha ruru. Ma akwụkwọ nsọ kwuru na Melikizedeki na-adị ndụ na-aga nꞌihu. Livayị onye bụ nna ndị nchụaja, ndị na-anata onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri a sitere nꞌagbụrụ Eberaham. O ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị asị na Livayị nꞌonwe ya kwụrụ Melikizedeki otu ụzọ nꞌụzọ iri nke ya site nꞌokpuru Eberaham. Nꞌihi na ọ bụ ezie na a mụbeghị Livayị nꞌoge a, ma mkpụrụ afọ Livayị nọ rị nꞌime Eberaham mgbe Eberaham kwụrụ Melikizedeki ụgwọ a. Ugbu a ọ bụrụ na a pụrụ isite nꞌọrụ ọtụtụ ndị nchụaja zọpụta mmadụ, gịnị mere Chineke jiri zite Kraịst? Olee uru ọ bara inwe onye nchụaja dị ka Melikizedeki? Chineke gaara ezite onye nchụaja dị ka Erọọn! Ma ọ bụ nꞌihi na ọ dịghị onye nchụaja ọ bụla e sitere nꞌaka ya mee ka onye ọ bụla zuo oke. Ọ dịghị onye ọ bụla e mere ka ọ bụrụ onye ezi omume site nꞌaka ndị nchụaja nile a. Ndị nchụaja nile a batara nꞌọrụ ha site nꞌusoro iwu. Ebe Chineke gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nꞌotu aka ahụ ọ ghaghị ịgbanwekwa iwu. Ebe Jisọs, onye a ghọrọ onye nchụaja ọhụrụ, na-esiteghị nꞌagbụrụ Livayị, o megidere iwu ochie ma ọ bụrụ na ọ rụọ ọrụ nchụaja ya nꞌebe ịchụ aja ndị Juu. Ọ bụ ihe a maara nke ọma na Jisọs si nꞌagbụrụ Juda pụta, agbụrụ nke dị iche nꞌagbụrụ Livayị ebe ndị nchụaja na-aesite apụta. Mosisi ekweghị ka ebo Juda bụrụ ndị nchụaja. Ọ pụtala ìhè na Chineke agbanweela iwu! Onye nchụaja ọhụrụ, nke yiri Melikizedeki abịala! Kraịst abụghị onye nchụaja site nꞌọmụmụ nke a mụrụ ya nꞌezinụlọ ndị nchụaja. Ọ bụkwaghị onye nchụaja site na nhọpụta nke iwu. Kama ọ bụ onye nchụaja site nꞌike ịdị ndụ nke na-enweghị ọgwụgwụ! Abụ ọma isi narị na iri kwuru banyere Kraịst sị “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. Ị dịkwa nꞌoyiyi Melikizedeki.” A kagbuola ọnọdụ nchụaja ochie ahụ. Nꞌihi na ọ dịghị ike ọ bụla o nwere. O nwekwaghị onye ọ bụla ọ zọpụtara. Ọ dịghị mgbe ọ bụla e sitere nꞌiwu mee mmadụ ọ bụla ka ọ bụrụ onye ya na Chineke ga-adị na mma. Ma ugbu a Kraịst ewetala ụzọ kachasị mma, nke anyị ga-eji nwee olileanya. Ọ na-eme ka anyị bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Ọ na-emekwa anyị ka anyị bịaruo Chineke nso. Chineke aṅụghị iyi ọ bụla nye ndị nchụaja ndị Juu. Kama ndị nchụaja na-aṅụ iyi. Ọ bụ nanị Kraịst ka Chineke ṅụrụ iyi nye. Chineke kwuru sị, “Onyenwe gị aṅụọla iyi, ọ dịkwaghị mgbe ọ ga-agbanwe uche ya. Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.” Chineke emeela ka ọnọdụ nchụaja Kraịst guzosie ike site nꞌịṅụ iyi. Nꞌihi iyi a Chineke ṅụrụ, Kraịst pụrụ ime ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ a guzosie ike. Ọ bụkwa ezi ọgbụgba ndụ nke ga-adịgide na-enweghị mgbanwe. Chineke aṅụọla iyi na ọ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Nꞌọnọdụ omenala ochie ahụ, e nwere ọtụtụ ndị nchụaja dị iche iche. Ndị ochie aghaghị ịnwụ anwụ. O kwesịrị ekwesị na a ga-enwe ndị ọhụrụ nꞌọnọdụ ha. Ma Jisọs ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gaghị anwụ hapụ gị ka ị chọọ onye nchụaja ọhụrụ ọzọ. Ọnọdụ onye nchụaja o nwere enweghị mgbanwe ruo mgbe nile. Ọ na-azọpụta ruo ọgwụgwụ oge. Ọ ga-azọpụtakwa ndị nile ga-esite nꞌaka ya bịakwute Chineke. O nwere ike ime nke a nꞌihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-adị ndụ ka o chetara Chineke na ọ kwụchaala ụgwọ mmehie anyị nile. Ọ na-adịkwa ndụ mgbe nile, na-arịọrọ anyị arịrịọ nꞌihu Chineke. Ọ bụ Jisọs bụ onyeisi nchụaja mmadụ nile kwesịrị inye ndụ ha. Ọ dị nsọ dịkwa ọcha. O nweghị ntụpọ ọ bụla nꞌahụ ya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o mehiere. Ọ dịkwaghị mgbe ọ ga-emehie. Jisọs adịghị ka ndị nchụaja ọzọ. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja nke ụmụ anụmanụ ụbọchị nile nꞌihi mmehie ya. Ọ dịkwaghị mkpa na ọ ga-achụrụ ndị mmadụ aja nꞌihi mmehie ha. Nanị otu aja karịrị ukwuu ka Jisọs chụrụ. O weere onwe ya chụọ aja nꞌelu obe nꞌihi anyị, ka ọ bụrụ ọgwụgwụ ọchụchụ aja nile, nꞌihi na aja ahụ ọ chụrụ zuru oke ruo mgbe nile. Iwu ochie họpụtara ndị mmadụ mee ha ndị nchụaja. Ma ha adịghị ike nꞌihi na ha na-eme ka iwe wee Chineke. Ma nꞌoge ikpeazụ, Chineke ṅụrụ iyi nke mere ka iwu gwụsịa. Iyi a Chineke ṅụrụ họpụtara Jisọs Ọkpara Chineke. Ya ka Chineke wusiri ike dị ka onyeisi nchụaja zuru oke ruo mgbe ebighị ebi. Ihe anyị na-ekwu bụ nke a, anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a. Ọ na-anọdụkwa nꞌebe nsọpụrụ dị elu nꞌakụkụ aka nri Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe. Jisọs na-arụkwa ọrụ ya dị ka onyeisi nchụaja nꞌebe kachasị nsọ nke eluigwe. Ọ bụkwaghị nꞌụlọ nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, kama nꞌụlọ nsọ ahụ Chineke nꞌonwe ya wuru. Onyeisi nchụaja ọ bụla a họpụtara na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nꞌihi nke a Kraịst kwesịkwara ịchụ aja. A sịkwarị na Kraịst nọ nꞌụwa, a garaghị anabata ya dị ka onye nchụaja nꞌihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro ọchụchụ aja ndị Juu si dị. Ma ọrụ nile ndị nchụaja na-arụ bụ nanị onyinyo banyere ihe nke dị nꞌeluigwe. Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka Chineke jiri gosi Mosisi mgbe ọ na-akwado iwuru ya ebe a ga-anọ fee ya ofufe nꞌọzara, otu ọ ga-esi wuo ụlọ ahụ. Chineke gwara ya okwu sị, “Lezie anya hụ na i mere ihe nile nꞌusoro dị ka m si gosi gị nꞌelu ugwu.” Ma ọrụ nchụaja nke Chineke nyere Jisọs karịrị nke ndị nchụaja ndị Juu mma. Otu a kwa, ọgbụgba ndụ Kraịst mere ka ọ dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa nkwa ọgbụgba ndụ ochie ahụ. O nweghị oge Chineke nwapụtara na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuru oke. A sịkwarị na ọgbụgba ndụ ochie ahụ juru afọ, Chineke agaraghị ekwe nkwa iwere ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie nke ochie ahụ. Ma Chineke nꞌonwe ya sitere nꞌọnụ Jeremaya onye amụma kwuo okwu banyere ezughị oke nke ọgbụgba ndụ ochie ahụ sị “Lezienụ anya! Oge ga-adị mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ guzosie ike nꞌetiti mụ onwe m na ụlọ Izirel na ndị Juda nile. Ọgbụgba ndụ ọhụrụ a agaghị adị dị ka nke mụ na nna nna unu ochie ha gbara nꞌime ọzara. Nꞌoge ahụ, eji m aka m dupụta ha site nꞌala Ijipti, ma ha edebeghị ọgbụgba ndụ ahụ. Nꞌihi nke a mụ onwe m hapụrụ ha. Ma otu a ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-esi dịrị nꞌetiti mụ onwe m na ụmụ Izirel. Aga m etinye iwu m nile nꞌime mmụọ ha ka ha nwee ike ịmata ihe m chọrọ ka ha mee. Aga m edekwa iwu m nile nꞌime obi ha ka ha hapụ ichefu iwu m nile. Aga m akpọbata ha dị ka ụmụ nke m. Mụ onwe m ga-abụ Chineke ha. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla nꞌetiti ha ga-ezi ibe ya ma ọ bụ zisaa ozi ọma nye nwanne ya, ma ọ bụ gwa onye agbata obi ya okwu sị, ‘O kwesịrị ka ị mata Chineke!’ Nꞌihi na onye ọ bụla nꞌime ha, onye ukwu na onye nta, ga-amata m, sọpụrụ m site nꞌobi ha nile. Mgbe ahụ, aga m enwe obi ebere banyere amaghị ihe ha. Aga m agbaghara ha mmehie ha nile. Agaghị m echetakwa mmehie ha nile ọzọ.” Okwu a Chineke kwuru banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ a na-egosi na ọgbụgba ndụ ochie agabigala. Ọ dị ka akwa ochie dọkara adọka, nke e tufuru ruo mgbe ebighị ebi. Nꞌime ịgba ndụ nke mbụ, Chineke nyere ụmụ Izirel ụkpụrụ ha ga-eso ife ya ofufe. Ha nwere ụlọ ikwu ebe ha na-efe Chineke. Ụlọ ikwu a nwere ọnụ ụlọ abụọ. Nꞌime ọnụ ụlọ nke mbụ e nwere ebe a na-adọkwasị iheọkụ. Tebulu ebe a na-adọkwasị beredi dị nsọ dịkwa nꞌime ụlọ a. A na-akpọ ọnụ ụlọ nke mbụ a, Ebe Nsọ. Nꞌetiti ọnụ ụlọ nke mbụ na nke abụọ, akwa mgbochi dị. Nꞌazụ akwa mgbochi a, a ga-ahụ ọnụ ụlọ nke ọzọ, nke a na-akpọ Ebe Nsọ kachasị Ebe Nsọ. Nꞌime ụlọ nke abụọ ahụ, ebe ịchụ aja dị ya nke e jiri ọlaedo wuo. Nꞌelu ebe ịchụ aja a ka a na-achụ aja nsure ọkụ. Nꞌebe a kwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị. E ji ọlaedo machie ahụ ya. Nꞌime igbe a mbadamba nkume dị ya. Nke a bụ nkume ahụ Chineke dere iwu iri nꞌelu ya. Otu ite ntakịrị e jiri ọlaedo kpụọ dịkwa nꞌime igbe a. Nꞌime ite ahụ, mana dị ya. Mana bụ nri dị iche Chineke jiri zụọ ndị Juu mgbe ha na-aga ije nꞌọzara. Mkpa nꞌaka Erọọn dịkwa nꞌime igbe a. Nke a bụ mkpa nꞌaka ahụ wepụtara ahihia ndụ nꞌọzara. Nꞌime ọnụ ụlọ nke abụọ ahụ, ọ bụrụ na e lee anya nꞌelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, a ga-ahụ ndị mmụọ ozi a kpụrụ akpụ. Ha nwere nku dị ka nnụnụ. Aha ha bụ Cherubim. Ha bụ ndị na-echekwa otuto Chineke. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe nile ndị a. Mgbe e doro ihe nile ndị a nꞌusoro, onye nchụaja na-abata. Ọ na-abata mgbe ọ bụla nꞌime ọnụ ụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nꞌebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ ụbọchị nile nye Chineke. Ma ọ bụ nanị onyeisi nchụaja na-aba nꞌebe ahụ a na-akpọ Ebe Nsọ Kachasị ebe Nsọ. Ọ na-aba nꞌebe ahụ nanị otu mgbe nꞌafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nꞌebe ahụ. Ọbara ọ ga-eji buru ụzọ chụọ aja nꞌihi mmehie nke onwe ya. Mgbe ọ chụchara aja nꞌihi onwe ya, ọ na-achụkwa aja nꞌihi ndị ya nile. Mmụọ Nsọ jiri ihe ndị a nile na-ezi anyị na nꞌime ọnọdụ ọchụchụ aja ochie, mmadụ efu ọ bụla enweghị ike ịba nꞌebe nsọ kachasị ebe nsọ ahụ nꞌihi na ọnụ ụlọ nke mbụ ahụ a na-akpọ ebe nsọ dị ya. Nke a bụụrụ anyị ihe mmụta taa. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ochie ahụ, ha na-achụ aja na-enye onyinye, ma aja ha nile emeghị ka ha zuo oke. Nꞌime usoro nke mgbe ochie ahụ, a gwara ha ụdị ihe oriri na ụdị ihe ọṅụṅụ ha kwesịrị iri na ịṅụ. A gwakwara ha ụdị mmemme dị iche iche ha ga-eme nꞌihi ido onwe ha nsọ. Ma enyeghị ha usoro ndị a ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. E nyere ha usoro ndị a ka ọ bụrụ iwu ga-enyere ha aka ife Chineke tutuu ruo mgbe Chineke ga-edozigharị ihe nile. Ma Kraịst abịalarị. Ya onwe ya bụ ezi onyeisi nchụaja nke ọnọdụ ọhụrụ ahụ anyị nwere ugbu a. Ebe ọ na-arụ ọrụ nchụaja ya abụghị nꞌụlọ mmadụ jiri aka wuo. Kama ọ bụ nꞌụlọ nchụaja zuru oke dị nꞌeluigwe. Otu mgbe nanị ka Kraịst bara nꞌebe kachasị nsọ nke ụlọ ikwu ahụ. O jighị ọbara ewu na ọbara ebule chụọ aja. Kama o jiri ọbara nke ya onwe ya. O jiri ọbara ya chụọ aja nanị otu mgbe. O sitere na nke a mee ka anyị nweta nzọpụta ebighị ebi. Na mgbe ochie, ọ bụrụ na ọbara ewu na nke ehi, ya na ntụ e wetara site nꞌebe a kpọrọ anụ ndị a ọkụ, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ihicha mmehie, meekwa ka ha dị ọcha, ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ. Kraịst wetara ọgbụgba ndụ ọhụrụ a ka ndị nile Chineke kpọrọ bịaruo nso iketa nkwa ebighị ebi Chineke kwere ha. Ugbu a ndị nile Chineke kpọrọ nwere ike ịbịaru ya nso, nꞌihi na Kraịst nwụrụ gbapụtakwa ha site nꞌikpe ọmụma dịrị ha nꞌihi mmehie nile ha mehiere nꞌọnọdụ ọgbụgba ndụ ochie ahụ. Mmadụ ọ bụla nwere ike idepụta ihe ọ chọrọ ka onye ọzọ keta nꞌime ihe nile o nwere mgbe ọ nwụrụ. A gaghị ekenye onye ọ bụla ihe onye ahụ nwere tutuu ruo mgbe onye depụtara ihe ahụ nwụrụ. Nꞌihi na a gaghị eke ihe o nwere mgbe ọ dị ndụ. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, ihe nile o nwere ga-adị otu ahụ. Ndị nketa ga-echekwa ruo mgbe ọ nwụrụ. Nke a mere e jiri were ọbara mesie ọgbụgba ndụ ochie ahụ ike. Nꞌihi na mgbe Mosisi nyechara ndị Juu iwu Chineke ahụ, o weere ọbara ewu na nke ehi tinyere mmiri, fesaa ya nꞌelu akwụkwọ iwu Chineke na nꞌelu mmadụ nile nọ nꞌebe ahụ nꞌoge ahụ. Ọ bụ alaka osisi hisọpụ na akpụkpọ aji nwa atụrụ na-acha odo odo ka o ji fesaa ọbara na mmiri ahụ. Mgbe ọ na-eme ihe ndị a ọ gwara ndị mmadụ sị, “Ọbara a bụ ihe na-emesi ọgbụgba ndụ ahụ ike, bụ ọgbụgba ndụ dị nꞌetiti unu na Chineke. Ọ bụkwa Chineke nyere m iwu ka unu debe ọgbụgba ndụ a.” Mgbe o kwuchara nke a o fesakwara ọbara ahụ nꞌelu ụlọ ikwu na nꞌelu ihe nile dị nꞌụlọ ikwu, bụ ihe e ji efe Chineke. Nke a na-ezipụta otu ihe: na nꞌọnọdụ ochie ahụ, a na-eji ọbara mee ka ihe nile dịrị ọcha. Nke a na-ezikwa anyị na a sị rịị na a wụsịghị ọbara mgbaghara mmehie agaraghị adị. Nke a na-ezipụta na ụlọ ikwu ahụ na ihe nile dị nꞌime ya bụ ụdị ihe nile dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a, ọ dị mkpa na ihe nile dị nꞌime ụlọ ikwu a na ụlọ ikwu nꞌonwe ya kwesịrị ka e were ọbara mee ka ha dị ọcha. Otu aka ahụ, ihe nile dị nꞌeluigwe, bụ ihe ahụ ụlọ a dị nꞌụwa yiri, ka e mere ka ha dịkarịa ọcha site nꞌịta dị oke ọnụ ahịa bụ obara Kraịst. Nꞌihi na Kraịst abanyeghị nꞌụlọ nsọ dị nꞌụwa, nke mmadụ wuru. Kama o rigooro nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a na-ekwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihu Chineke nꞌonwe ya. Ma Kraịst ejighị onwe ya chụọ aja ọtụtụ mgbe dị ka onyeisi nchụaja ndị Juu na-eji ọbara ewu na-abanye nꞌebe nsọ ahụ afọ nile. A sịkwarị na ọ bụ ihe dị mkpa na Kraịst kwesịrị iji onwe ya chụọ aja ọtụtụ mgbe ọ gaara na-anwụ site nꞌoge ruo nꞌoge kemgbe ụwa bidoro. Ma o sighị otu a dị! Kama Kraịst bịara nanị otu ugboro mgbe ọgwụgwụ ihe nile dị nso, iwepụ mmehie site nꞌiji onwe ya chụọ aja. Nꞌihi na dị ka o si bụrụ ihe a kwadobeere mmadụ na ọ ga-anwụ nanị otu ugboro, ma nke a gasịa ikpe eso ya, otu a kwa, Kraịst nwụrụ nanị otu ugboro, dị ka aja a chụrụ nꞌihi mmehie mmadụ nile. Ọ nwụrụ ma Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilie. Ọ ga-abịa ọzọ! Ma ọ bụghị maka ịchụ aja ọzọ nꞌihi mmehie anyị, kama ọ ga-abịa iwetara ndị nile ji okwukwe na olileanya na-eche ọbịbịa ya nzọpụta. Ma iwu ahụ ezipụtaghị ihe nile. Iwu ahụ bụ nanị onyinyo gosiri ihe gaje ịbịa abịa, bụ ihe karịrị ya mma, nꞌihi na o zughị oke nꞌonwe ya. Nꞌihi nke a, iwu ahụ enweghị ike isite nꞌọchụchụ aja nile a na-achụ kwa afọ, ọtụtụ mgbe, mee ka ndị ahụ na-abịakwute Chineke zuo oke. Ọ bụrụ na iwu pụrụ ime ihe dị otu a otu ugboro ka a gaara achụ aja. Otu aja ahụ gaara ewepụkwa echiche mmehie ọ bụla nꞌime ndị chụrụ ya. Ma aja nile ahụ ha na-achụ kwa afọ ehichapụghị mmehie ha. Nanị ihe aja ndị a mere bụ ichetara ha na mmehie ha dị. Nꞌezie, ọ pụghị ime! Ọbara ewu na ehi apụghị ihichapụ mmehie mmadụ! Ọ bụ nꞌihi ọnọdụ dị otu a ka Kraịst nꞌonwe ya, mgbe ọ na-akwado ịbịa nꞌụwa, ji gwa Chineke okwu sị, “Ị chọghị aja na onyinye, Nꞌihi ya i meela ahụ a nye m. Gị bụ Chineke adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌịta nsure ọkụ ma ọ bụ nꞌịta na-esi isi ụtọ ọ bụla maka ịsachapụ mmehie. Mgbe ahụ ka m kwuru okwu sị, ‘Lee, abịala m Chineke, ime ihe ị chọrọ ka m mee.’ Nke a bụkwa ihe akwụkwọ iwu ahụ na-ekwu banyere m.” Mgbe Jisọs kwuchara okwu a o kwukwara okwu ọzọ sị, “Ị dịghị aṅụrị ọṅụ nꞌịta ọ bụla a chụrụ nꞌihi mgbaghara mmehie.” Jisọs kwuru okwu ndị a ọ bụladị na a chụrụ aja ndị a nꞌusoro iwu! Ma mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs kwuru sị, “Lee abịala m Chineke, ime ihe ị chọrọ ka m mee.” Nꞌihi aja Jisọs jiri onwe ya chụọ, Chineke ewepụla ụzọ ịchụ aja ochie ahụ e ji agbaghara mmehie, were ụzọ ọhụrụ nke ọchụchụ aja Kraịst dochie nꞌọnọdụ ya. Ebe ọ bụ na Jisọs mere ihe Chineke chọrọ, anyị abụrụla ndị a sachapụrụ mmehie ha site nꞌịta Jisọs ji onwe ya chụọ nanị otu ugboro. Nꞌọnọdụ usoro ochie ahụ, ndị nchụaja na-eje ozi ha ụbọchị nile. A na-ahụ ha ka ha ji otu ụdị aja ahụ, aja na-apụghị iwepụ mmehie. Ma Jisọs nyere onwe ya dị ka aja nanị otu ugboro. Aja o ji onwe ya chụọ dịkwa ire ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe o mesịrị ọ gara nọdụ ala nꞌaka nri Chineke. Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka Chineke mee ndị iro ya nile ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya. Site nꞌotu aja ahụ Kraịst jiri onwe ya chụọ o mere ka ndị ahụ zuo oke ruo mgbe ebighị ebi bụ ndị ahụ a sachapụrụ mmehie ha. Mmụọ Nsọ na-agbakwara anyị ama na nke a bụ eziokwu nꞌihi na o kwuru sị, “Nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụmụ Izirel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m eme ka ha mara iwu nꞌime obi ha. Aga m ede ha nꞌime mmụọ ha. Ha ga na-echeta ha nꞌechiche ha nile. Agaghị m echetakwa mmehie ha nile, ya na nnupụ isi ha nile ọzọ.” Ya mere, mgbe Chineke gbaghaara mmehie ndị a nile, ọ dịkwaghị mkpa na a ga-achụ aja ọzọ nꞌihi mgbaghara mmehie. Nꞌihi nke a ụmụnna m, anyị nwere ike ugbu a ịga nꞌihu Chineke. Ọbara Jisọs emegheelara anyụ ụzọ ịbịaru Chineke nso. Jisọs Kraịst emegheelara anyị ụzọ ndụ ọhụrụ. O mere nke a site nꞌinye ahụ ya ka ọ bụrụ ihe e tiwara dị ka akwa mgbochi ụlọ nsọ, nke nọchiri nꞌetiti anyị na Chineke. Ugbu a anyị nwere Jisọs Kraịst dị ka onyeisi nchụaja anyị! Ọ na-achị nꞌụlọ Chineke. Ka anyị bịaruo Chineke nso site nꞌobi nke aghụghọ na-adịghị, obi nke nwere okwukwe na ọ ga-anabata anyị, obi nke e fesara ọbara maka ime ka anyị si nꞌechiche ọjọọ nile nke obi gbagọrọ agbagọ dị ọcha, na ahụ nke e ji mmiri dị ọcha sachapụ. Ya mere, ka anyị were obi nke egwu na-adịghị jidesie nkwupụta olileanya anyị ike. Ka anyị kwupụta nke a na-enweghị obi abụọ. Nꞌihi na Chineke aghaghị imezu nkwa ya. Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-emezu okwu ya nile. Ka anyị hụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, nyere ha aka ma wulitekwa ha elu. Ka anyị ghara ilefu isoro ndị kwere ekwe ọzọ na-enwe nzukọ dị ka ụfọdụ na-eme. Ka anyị dụọ onwe anyị ọdụ, dọọkwa onwe anyị aka na ntị banyere nke a, karịsịa ugbu a anyị maara na ọbịbịa Onyenwe anyị na-abịa nso. Ka anyị kwụsị ibi ndụ nꞌime mmehie. Nꞌihi na anyị amatala ihe bụ eziokwu na ezi ndụ. Chineke adịghị agbaghara onye maara eziokwu ahụ ma nọgidesie ike nꞌime mmehie. Aja ọzọ adịkwaghị nke ga-ewepụ mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị elezie anya mee mmehie. Kama ihe fọdụrụ bụ ikpe ga-adị nꞌoge ikpeazụ. Chineke ga-ejikwa ọkụ na-ere girigiri repịa ndị nile na-eguzo imegide ya na okwu ya. Nꞌoge Mosisi, a na-ama onye ọ bụla mebiri iwu ikpe ọnwụ. Ikpe ọnwụ a na-esite nꞌakaebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ndị ga-ekwupụta na ha hụrụ onye mibiri iwu ahụ oge ọ dara iwu ahụ. Ọ bụrụ na o si otu a dịrị nꞌoge Mosisi, gịnị ga-abụ ọnọdụ onye lelịrị Ọkpara Chineke? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme ọbara ọgbụgba ndụ ahụ ka ọ bụrụ ihe ọchị na ihe na-adịghị ọcha? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme Mmụọ nke amara ihe ihere? Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-eme ihe dị otu a ga-enwe ịta ahụhụ dị egwu nꞌoge na-abịa abịa. Dị ka ndị maara Chineke na ọ bụ onye okwu ya na-adị dị ka o si kwuo ya, anyị maara na ọ bụ Chineke kwuru sị, “Mụ onwe m nwe ọbọ, mụ onwe m ga-enyeghachikwa.” Ọ bụkwa Chineke kwuru sị, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.” Ọ bụ ihe dị egwu na ihe dị njọ mmadụ ahụ mere ihe ndị a ịdaba nꞌaka Chineke dị ndụ. Ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ka unu chefuo ụbọchị ndị ahụ gara aga. Nꞌoge ahụ ìhè Chineke mụkwasịrị unu, unu guzosikwara ike ọ bụladị nꞌọnọdụ mkpagbu. Mgbe ụfọdụ a kparịrị unu nꞌihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nꞌoge ọzọ unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso guzokọọkwa. Unu sooro ndị ha tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụkọọ ahụhụ. Mgbe ha na-apụnara unu akụ unu na ihe obibi unu nile unu jiri obi ụtọ nꞌime Onyenwe anyị nara nke a. Nꞌihi na unu maara na unu nwere akụ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, unu etufula ntụkwasị obi ahụ unu nwere. Nꞌihi na ntụkwasị obi unu ga-ewetara unu ụgwọ ọrụ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Kama nweenụ ndidi ka unu meekwa uche Chineke. Nꞌụzọ dị otu a unu ga-anata ihe Chineke kwere unu nkwa. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Nꞌoge na-adịghị anya onye ahụ na-akwado ịbịa ga-abịa.” Ọ gakwaghị ala azụ na nkwa ya. Ma ndị ahụ e mere ka ha zuo oke nꞌihu Chineke site nꞌokwukwe ga-adịkwa ndụ site nꞌokwukwe. Ọ bụrụ na ha alaa azụ nꞌokwukwe ha ihe banyere ha agaghị atọ Chineke ụtọ. Ma dị ka ọ dị, anyị abụghị ndị na-ala azụ si otu a laa nꞌiyi. Kama anyị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara. Gịnị bụ okwukwe? Okwukwe bụ inwe ntụkwasị obi na ihe anyị na-ele anya ya ga-amezu. Ọ bụkwa inwe ntụkwasị obi siri ike banyere ihe anyị na-ahụghị anya. Ọ bụ site nꞌokwukwe ha ka ndị mbụ kweere na Chineke ji nwee nnwapụta ọma ya. Ọ bụ site nꞌokwukwe ka anyị ji mara na e mere ụwa na ihe nile anyị na-ahụ anya site nꞌokwu Chineke. Nꞌihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nꞌihe anyị na-adịghị ahụ anya. Ebel bụ nwoke nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ọ chụrụ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke nwanne ya Ken chụrụ. Site nꞌokwukwe o nwere nnwapụta Chineke na ọ bụ onye ezi omume. Chineke nabatara Ebel nꞌihi na o nyere onyinye ya site nꞌokwukwe. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na Ebel anwụọlarị, anyị nwere ike ịmụta ihe site na ndụ ya banyere inwe okwukwe nꞌime Chineke. Enọọk tụkwasịkwara Chineke obi nꞌụzọ dị otu a. Nꞌihi nke a, Chineke kuuru ya laa nꞌeluigwe na-anwụghị anwụ. Otu mgbe ahụ o furu mgbe Chineke wezụgara ya. Akwụkwọ nsọ gwara anyị na Enọọk mere ihe tọrọ Chineke ụtọ. Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nꞌihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị inwe okwukwe na Chineke dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọ bụla na-achọ ya. Noa bụ otu onye nꞌime ndị nwere okwukwe na Chineke. Chineke dọrọ Noa aka na ntị banyere ihe gaje ime. Noa kweere. Ọ bụ ezie na otu mkpụrụ igwe ojii adịghị nꞌeluigwe, ma na-atụfughị mgbe, Noa wuru ụgbọ mmiri o ji zọpụta onwe ya na ndị ezinụlọ ya. Okwukwe Noa adịghị ka nke ndị ọzọ nọ nꞌụwa nꞌoge ahụ. Ya mere, Noa sitere nꞌokwukwe bụrụ onye nketa alaeze Chineke. Site nꞌokwukwe, Eberaham rubeere Chineke isi. Chineke gwara ya ka ọ hapụ ala ya gaa nꞌala ọzọ dị anya Chineke ga-egosi ya. Ọ bụ nanị ala e kwere na nkwa! Ma Eberaham biliri gaa, ma ọ mataghị ebe ọ na-aga. Site nꞌokwukwe Eberaham biri nꞌala ahụ Chineke kwere ya na nkwa. Ma ọ bụ ọbịa nꞌebe ahụ. Otu aka ahụ Jekọb na Aizik bikwara nꞌebe ahụ dị ka ndị ọbịa. Ma Chineke kwere ha nkwa na ha ga-enwe ala ahụ. Eberaham mere nke a nꞌihi na ọ na-ele anya ala eluigwe ahụ. Ọ tụkwasịrị Chineke onye wuru obodo ahụ obi na ọ ga-akpọbata ya nꞌala ahụ. Sera emeela agadi ịmụta nwa. Ma ọ tụkwasịrị obi na Chineke ga-edebezu nkwa ya. Nꞌihi nke a Chineke nyere ya ike ịmụta nwa. Site nꞌotu nwa a Eberaham ghọrọ nna mba dị ukwuu. Ndị mmadụ chere na Eberaham na Sera emeela agadi ịmụta nwa. Ma taa, site nꞌotu nwoke a bụ Eberaham e nwere ụmụ ụmụ ya dị ukwuu dị ka kpakpando eluigwe. Ha dị ukwuu dị ka aja dị nꞌakụkụ osimiri. Ndị a nile bụ ndị nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ma ha nwụrụ na-ele anya nkwa Chineke kwere ha. Ha ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi nke a, na-aghọtakwa na ha bụ ndị ọbịa nꞌụwa. Nꞌezie, ndị a nile gụrụ onwe ha dị ka ndị ọbịa nꞌụwa lere anya ala ọzọ. Ha na-ejikere maka ụlọ ha dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a, ha achọghị ile anya nꞌazụ nꞌihe ụwa ha hapụrụ. Ha gaara alaghachi azụ ịchọ ọganihu ụwa. Ma ha dabeere na-ele anya ngọzi sị nꞌeluigwe nke Chineke na-enye. Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ibi nꞌụlọ ha dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a Chineke naara ha dị ka ụmụ ya. Ihere ha emeghị ya. Nꞌihi na o dozielara ha ebe obibi nꞌeluigwe. Ọ bụ okwukwe Eberaham nwere nꞌime Chineke mere o ji kwere iwere nwa ya Aizik chụọ aja mgbe Chineke nwara ya ọnwụnwa. Eberaham bụ onye Chineke kwere nkwa ma o kwadoro iji nwa ahụ ọ mụrụ nanị ya chụọra Chineke aja. Nꞌezie, Eberaham kwadoro igbu Aizik, onye ahụ Chineke sị na a ga-esite nꞌaka ya kpọọ Eberaham nna ọtụtụ mba! Nꞌime nke a Eberaham tụkwasịrị Chineke obi. O nwere okwukwe na a sịkwa na Aizik anwụọ na Chineke ga-eme ka ọ dị ndụ ọzọ. Ee, Chineke anọghị nꞌụra! O chebere ndụ Aizik. Ọ bụ okwukwe ka Aizik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzi banyere ihe dị nꞌihu. Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef tupuu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isi ala nye Chineke mgbe ọ na-adabere na mkpa nꞌaka ya. Josef gosiri okwukwe tupuu ọ nwụọ. O kwuru okwu banyere otu ndị Izirel ga-esi hapụ ala Ijipti, nye ndụmọdụ banyere ịchịkọta ọkpụkpụ ya. Nne na nna Mosisi zipụtara okwukwe mgbe ha mụrụ Mosisi. Ha zoro ya ọnwa atọ nꞌihi na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu nke eze ala Ijipti bụ Fero nyere. Mosisi nwere okwukwe mgbe o toro ghọọ dimkpa. O kweghị ka a kpọọ ya nwa ada Fero. Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke takọọ ahụhụ karịa inwe anụrị nke mmehie. Ọ jụrụ ibi na mmehie jụkwa akụ na ụba nke Ijipti. Ọ matara na ihe ndị a agaghị adịgide ruo ebighị ebi. Nꞌihi nke a ọ họọrọ isoro ụmụ Izirel ịhụ ahụhụ. O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nꞌihi Kraịst, onye e kwere nkwa ya, kama inweju akụ nile nke Ijipti afọ. Nꞌihi na ọ na-ele anya na Chineke ga-akwụghachi ya. Okwukwe ka Mosisi ji hapu Ijipti. Ọ tụghị egwu iwe eze nꞌihi na ọ dị ka ọ na-ahụ Chineke anya, na Chineke nọnyere ya mgbe nile. O sitekwara nꞌokwukwe debe mmemme ngabiga. O fesara ọbara ka mmụọ ozi ahụ Chineke zipụrụ igbu ụmụ ndị Ijipti nile e buru ụzọ mmụọ, hapụ imetụ ụmụ ndị Izirel aka. Osimiri uhie ka ụmụ Izirel gafere dị ka a ga-asị na ọ bụ ala efu. Ma ndị Ijipti nwara ime nke a ka mmiri gbagburu nꞌime osimiri a. Mgbidi Jeriko dara mgbe ụmụ Izirel jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa. Rehaab (nwanyị akwụla), esoghị ndị na-ekweghị ekwe lakọọ nꞌiyi nꞌobodo Jeriko nꞌihi na ọ bụ site nꞌokwukwe ka o jiri lekọtaa ndị Izirel ledoro obodo Jeriko anya. Ọ dịkwa ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị biri ndụ okwukwe. Ma enweghị m oge ikwu ihe banyere ha. Ndị dị ka Berak, Samsin, Jefta, Devidi, Samuel na ndị amụma. Okwukwe ka ha jiri merie mba dị iche iche. Okwukwe ka ha jiri bie ndụ ezi omume, nata nkwa dị iche iche. Okwukwe ka ha jiri meekwa ka ike ọdụm ghara ịdị ire. Ọ bụkwa okwukwe ka ha jiri nọọ nꞌime ọkụ na-enweghị mmerụ ahụ. Okwukwe ka ọtụtụ jiri gbanarị ọnwụ. Okwukwe ka ndị dara mba jiri dịrị ike, meekwa ka ụmụ ndị iro dị ike gbalaga. Site nꞌokwukwe ụmụ nwanyị ụfọdụ ka e nyeghachiri ụmụ ha site nꞌọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ nꞌihi na ha sitere nꞌokwukwe jụ ịgọnarị Chineke. Ha kweere na Chineke ga-enye ha mbilite nꞌọnwụ kachasị mma ma ọ bụrụ na ha nọgide bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. E mere ụfọdụ ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti. A tụrụ ndị ọzọ mkpọrọ. Ma ha nọgidesịrị ike bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. A tụrụ ụfọdụ nkume, kwọbie ụfọdụ abụọ. Ụfọdụ bụkwa ndị dara ụkpa, bụrụ ndị a na-amaghị ama. A kpagbukwara ụfọdụ. Ha wagharịrị nꞌọzara na nꞌugwu, nꞌọnụ nkume na nꞌọnụ ala. Agụụ, ahụ ọkụ, na mmekpa ahụ dị iche iche dịgidere ha nꞌahụ. Nꞌanya ụwa a gụrụ ha nꞌihe efu. Ma lee! ndị a nile natara ezi ọgbụgba ama site nꞌokwukwe ha, ma ha anataghị nkwa ahụ Chineke kwere ha. Ha enwetaghị nkwụghachi okwukwe ha nꞌihi na Chineke pịara na ha ga-echere soro anyị keta ihe nketa kachasị mma nke Chineke kwadooro anyị. Ugbu a, igwe ndị okwukwe a nile nọ na-ele anyị anya. Ha gbara anyị gburugburu. Ka anyị wezuga ihe nile ga-egbochi anyị. Ka anyị tụpụ mmehie nile tụhịkọtara onwe ya nꞌahụ anyị. Ka anyị jiri ike anyị nile, na-eleghị anya nꞌazụ gbaa ọsọ ahụ dị anyị nꞌihu. Ka anyị lekwasịkwa Jisọs anya. Ọ bụ onyendu na onye mmezu okwukwe anyị. Ihe ihere nke obe ahụ amasịghị ya. Ma ọ tachiri obi nagide ihe ihere ahụ. O lere anya ọṅụ nke ga-eso ahụhụ nile ọ hụrụ nꞌelu obe. Site na nke a, ọ nọ ugbu a nꞌaka nri ocheeze Chineke. Na-atụgharịnụ uche nꞌihe banyere Jisọs oge nile. Tụgharịanụ uche banyere mmeso o mesoro ndị mmehie ahụ megidere ya. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịda mba nꞌọsọ unu na-agba. Chetanụ na mmadụ ọ bụla anwụbeghị nꞌetiti unu nꞌihi ọgụ nke unu na-alụso mmehie. Unu echefuola ihe akwụwkọ nsọ kwuru? Nꞌime ya ka Chineke na-agwa unu okwu dị ka ụmụ sị: “Nwa m ewela iwe mgbe Chineke na-apịa gị ụtarị. Adala mba mgbe ọ na-egosi gị ụzọ i siri mejọọ. Nꞌihi na onye Chineke hụrụ nꞌanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.” Tachie obi, mụta ihe site nꞌahụhụ. Nꞌihi na Chineke na-emeso gị mmeso dị ka nna ọ bụla hụrụ ụmụ ya nꞌanya si emeso ha mmeso. Nwanta ọ bụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. Ya mere ọ bụrụ na Chineke adịghị abara unu mba mgbe unu na-enupụ isi nꞌiwu ya, unu abụghị ụmụ ya. Unu enwekwaghị oke nꞌezinụlọ ya. Nꞌihi na ụmụ ya nile ka ọ na-abara mba. Dị ka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọ bụla anyị nupụrụ isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesịkwaghị ka anyị rubere Chineke bụ Nna mmụọ anyị isi? Anyị mee nke a, ihe ga-agara anyị nke ọma. Ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nꞌuche ha. Ma Chineke na-azụ anyị nꞌihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nꞌịdị nsọ ya. Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a. Ya mere, setipụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzozie ike nꞌụkwụ gị ahụ na-ama jijiji. Debe ụkwụ gị nꞌụzọ ziri ezi. Ka ndị na-adịghị ike hụ gị. Ọ bụrụ na ha esoro gị ha ga-adị ike. Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke. Ka onye ọ bụla hapụ ime ihe ga-egbochi ihuọma Chineke. Ekwela ka obi ilu gbaa mgbọrọgwụ nꞌime unu ibutere unu nsogbu. Ụdị obi ilu ahụ pụrụ ime ka ndị ọzọ daa mba nꞌokwukwe ha. Ka onye ọ bụla hapụ ịdaba na mmehie ịkwa iko. Ka onye ọ bụla hapụ iji Chineke gwurie egwu dị ka Ịsọ mere. Ịsọ bụ onye rere ọnọdụ ọkpara ya nꞌezinụlọ nna ya nꞌihi otu efere nri. Unu maara na o mechara chọọ ka nna ya gọzịe ya, ma nna ya agọzighị ya. Nꞌanya mmiri ọ rịọrọ ka a gọzie ya ma ọ nataghị ngọzi ahụ. Nꞌihi na oge agafeela imezi ihe o mibiri na mbụ. O nwebeghị oge unu gozoro ọtụ nꞌihu ihe na-eyi egwu, na ọkụ na-enwusi ike, na ọchịchịrị na oke ifufe. Ụmụ Izirel hụrụ ihe ndị a nile nꞌugwu Sainai oge Chineke nyere ha iwu ya. Nꞌihi na nꞌoge ahụ ha nụrụ ụda opi. Ndị mmadụ nụkwara olu Chineke. Ma ha enweghị ike nagide ihe ha nụrụ. Ha rịọrọ Chineke ka ọ kwụsị ịgwa ha okwu. Ha enweghị ike ịnagide iwu Chineke. A sịkwarị na anụmanụ ọ bụla bịaruru ugwu ahụ nso ọ gaara anwụ. Mosisi nꞌonwe ya tụrụ egwu, maakwa jijiji. Nꞌihi na ihe ọ hụrụ karịrị ya ukwuu. Ma unu abịakwutela Kraịst! Ọ dị ka unu guzo na-ele ugwu Zayọn anya. Unu abịala nꞌobodo Chineke dị ndụ. Unu abịala nꞌobodo ahụ a na-akpọ Jerusalem ọhụrụ. Nꞌebe a igwe ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta agụta zukọrọ. Unu abịala nꞌụlọ nzukọ Kraịst ebe ndị nile e dere aha ha nꞌeluigwe na-anọkọ. Unu abịakwutela Chineke onye ga-ekpe mmadụ nile ikpe. Unu abịakwutekwala ndị nile a gbapụtara, bụ ndị nọ nꞌeluigwe. Ndị ahụ e mere ka ha bụrụ ndị zuru oke. Unu abịakwutela Jisọs onye e sitere nꞌaka ya mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ. Unu abịakwala nꞌọbara e fesara, nke na-ekwu okwu mgbaghara mmehie. Ọbara a dị mma karịa ọbara Ebel, nꞌihi na ọbara Ebel lere anya ịbọ ọbọ. Ya mere gbalịsienụ ike ịhụ na unu na-erubere Chineke isi. Chineke tara ụmụ Izirel ahụhụ nꞌihi na ha nupụrụ isi nꞌebe Mosisi nọ. Ọ ga-atakwa anyị ahụhụ ma ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị. Nꞌihi na Chineke nꞌonwe ya si nꞌelu na-agwa anyị okwu. Mgbe Chineke si nꞌugwu Sainai kwuo okwu, olu ya mere ka ụwa maa jijiji. Ma ugbu a Chineke na-asị, “Mgbe ọzọ ọ bụghị nanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.” Ihe Chineke na-ezube ime bụ iwezụga ihe ndị ahụ na-agaghị anọgide mgbe ịma jijiji a gasịrị. Ihe ga-afọdụ ga-abụ nanị ihe guzosịrị ike. Chineke kwadoro inye anyị alaeze nke ihe ọ bụla na-apụghị ịgbanwe. Ka anyị na-ele anya mgbe nke a ga-emezu. Ka anyị jiri obi ekele na-ejere Chineke ozi. Ka anyị fee ya ofufe nꞌụzọ ọ ga-anabata. Ka anyị jiri egwu na nsọpụrụ fee ya ofufe. Nꞌihi na Chineke anyị dị ka ọkụ na-ere ọzara. Ọ na-erepịa ndị nile na-adịghị eme ihe ọ na-achọ. Hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya, nꞌihi na unu bụ otu nꞌime Kraịst. Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nꞌihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị na ọ bụ ndị mmụọ ozi ka ha lekọtara. Chetanụ ndị nọ nꞌụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nꞌụlọ mkpọrọ. Sorokwanụ ndị a na-emegbu nwekọọ ahụhụ dị ka a ga-asị na ọ bụ unu ka a na-emegbu. Ọlụlụ di na nwụnye bụ ihe mmadụ nile ga-enye ugwu. Njikọta ya ka a ga-asọpụrụ. A gaghị elefuru ya anya, nꞌihi na Chineke ga-enye ndị nile na-akwa iko ahụhụ, ha na ndị nile na-adịghị asọpụrụ ahụ ha. Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.” Ya mere anyị pụrụ iji nganga na-atụghị egwu kwuo sị, “Chineke bụ onye inye aka m. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” Chetanụ ndị isi unu ndị wetaara unu ozi ọma Chineke. Ha bụ mkpụrụ ndụ ọma ahụ. Unu ga-ejekwa ije na nzọ ụkwụ ha, tụkwasịkwa Chineke obi dị ka ha mere. Jisọs Kraịst adịghị agbanwe agbanwe. Ihe ọ bụ ụnyaahụ ka ọ bụkwa taa. Nke a ka ọ ga-abụkwa ruo mgbe ebighị ebi. Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu site nꞌịgbaso ezi ụzọ ahụ. Ọ dị mma ka e site nꞌamara mee ka mkpụrụ obi anyị bụrụ ihe dị ike, ọ bụghị site nꞌidebe iwu ụfọdụ e nwere maka iri nri. Ndị na-edebe iwu ndị a enweghị inye aka ọ bụla site na ya. Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị nile na-eje ozi ha nꞌụlọ nzute ndị Juu na-enweghị ike iri aja a chụrụ nꞌelu ya. Dị ka iwu ndị Juu si dị, onyeisi nchụaja na-eji ọbara anụ e gburu egbu baa nꞌime ime ụlọ ikwu ahụ ịchụ aja nꞌihi mmehie. Emechaa, a na-esite nꞌime obodo wepụ ahụ anụ ndị a e gburu kpọọ ha ọkụ nꞌezi. Ọ bụ nke a mere Jisọs ji nwụọkwa, ma ọ bụghị nꞌime obodo. Ebe ahụ ka ọbara ya sachapụrụ mmehie anyị. Ya mere, ka anyị si nꞌime obodo pụọ, ka anyị pụkwuru Kraịst nꞌazụ obodo, sorokwa ya nwekọọ ihe ihere. Nꞌihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, anyị na-ele anya ụlọ ebighị ebi anyị dị nꞌeluigwe. Site nꞌinye aka Jisọs, anyị ga-anọgide na-achụrụ Chineke aja otuto. Anyị ga-eto ya site nꞌịgwa ndị ọzọ ihe banyere ebube aha ya. Unu echefula iyikwasị onwe unu ịma mma dị ka uwe. Meekwanụ ka ndị nile chọrọ inye aka unu soro unu nwekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ. Ruberenụ ndị isi unu isi. Gbalịanụ ime ihe ha gwara unu. Nꞌihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụ obi unu. Chineke ga-ekpekwa ha ikpe dị ka ọrụ ha si dị. Ruberenụ ha isi ka ha nwee obi aṅụrị ịrụ ọrụ ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha ejiri ihu mgbarụ rụọ ọrụ ha, ọrụ ha agaghị abara unu uru. Kpeerenụ anyị ekpere nꞌihi na akọnuche anyị amaghị anyị ikpe. Anyị chọkwara ibi ndụ anyị nꞌime nkwanye ugwu nꞌihe nile. Eji m nwayọọ na-arịọ unu ka unu kpeere m ekpere, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ. Ugbu a ka Chineke ahụ na-enye udo, Chineke ahụ sitere nꞌọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ ndụ site nꞌọnwụ nye unu ihe ọma nile unu chọrọ, nke ga-enyere unu aka ime uche ya. Ka Chineke mejupụta nꞌime unu ihe ndị ahụ nile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst. Ka otuto dịrị Kraịst ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. Ụmụnna m bikonụ werenụ ntachi obi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nꞌime akwụkwọ mkpụmkpụ a. Ezi ụmụnna m, ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nꞌụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nꞌebe a na mgbe na-adịghị anya. Kelerenụ m ndị isi unu nile na ndị ọzọ bụ ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ. Ndị kwere ekwe si Itali na-ezitere unu ekele ha. Ka amara Chineke dịnyere unu nile. Akwụkwọ ozi a sitere nꞌaka m Jemes, onye bụ onyeozi Chineke na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwa. Ọ bụ unu ndị Juu kweere na Kraịst ka m na-edere ya. Unu ndị e sitere na mkpagbu a na-akpagbu unu mee ka unu gbasasịa biri nꞌebe dị iche iche nꞌụwa. Ndeewonụ! Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nꞌọṅụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu. Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto. Ya mere, agbalịla ịgbara nsogbu ọsọ, ma ọ bụ ịchọ ụzọ dị mfe ị ga-esi wepụ onwe gị na nsogbu ahụ. Kama nye ntachi obi gị ohere ka o too. Nꞌihi na mgbe o toro tozuo oke, ị ga-abụkwa onye pụrụ iguzo chịm, onye zuru ezu nꞌime onwe ya, nke ihe ọ bụla naagaghị akọ. Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị ụdị amamihe ahụ dị mkpa nꞌoge ọnwụnwa, ya rịọ Chineke ka o nye ya. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla rịọrọ ya amamihe nꞌefu. Ọ dịghị atakwa onye ọ bụla ụta. Ma mgbe ọ rịọrọ arịrịọ ahụ, ya site na mmụọ nke na-enweghị obi abụọ, mmụọ nke nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe ọ rịọrọ ya ka o mee. Nꞌihi na onye sitere nꞌobi abụọ rịọ Chineke ihe ọ bụla dị ka mpempe akwụkwọ nke ikuku naebugharị. Onye dị otu ahụ ekwesịghị ile anya na ọ ga-esite nꞌaka Chineke nata ihe ọ bụla. Nꞌihi na onye ahụ dịkwa ka nwoke na-enwe obi abụọ mgbe nile, nke na-adịghị enwe mkpebi nꞌime onwe ya banyere ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Ka nwanna nꞌime Kraịst, nke bụ ogbenye nꞌihe nke ụwa a, ṅụrịa ọṅụ, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya nꞌihu Onyenwe anyị. Ka onye bụ ọgaranya nꞌakụ na ụba nke ụwa ṅụrịakwa ọṅụ nꞌihi na e meela ka ọ mata, na akụ na ụba ya abaghị uru nꞌihu Onyenwe anyị. E meela ka ọ ghọtakwa na ya onwe ya ga-anwụkwa, dị ka okoko osisi si ada nꞌala kpọnwụọ. Nꞌihi na mgbe ọ bụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahihia kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nꞌala, ka mma ya gwụsịakwa. Ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke naanọgide na-adịghị ada mba nꞌoge ọnwụnwa. Nꞌihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị nile hụrụ ya nꞌanya. Ka onye ọ bụla hapụ ịsị mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke wetaara m ọnwụnwa a.” Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ. Ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọ bụla ka o mee ihe ọjọọ. Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nꞌọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya. Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ a, mgbe ha bara ụba nꞌime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe anyị mehiekwara, ọ bụ mmehie na-eduba nꞌọnwụ. Ya mere, ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu ụmụnna m. Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe. Ọ bụ nanị Chineke kpebiri ime ka anyị dịrị ndụ site nꞌokwu ya bụ eziokwu. O mekwara nke a nꞌihi na ọ chọrọ ka anyị bụrụ ụmụ mbụ ọ mụrụ nꞌezinụlọ ọhụrụ ahụ o mere ka ọ dịrị. Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. Nꞌihi na iwe mmadụ abụghị ụzọ ziri ezi anyị pụrụ isi rụpụta ihe Chineke gụrụ dị ka ezi ihe. Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ nile na ihe ọ bụla dị njọ nke fọdụrụ nꞌime ndụ unu. Nꞌọnọdụ ya nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nꞌobi unu, nke nwere ike ịzọpụta unu. Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ nanị, site nꞌụzọ dị otu a na-aghọgbu onwe unu. Kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. Nꞌihi na onye ọ bụla na-ege ntị nꞌokwu ọ bụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nꞌenyo. O lesịa onwe ya pụọ, ọ naechefukwa ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa. Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nꞌime iwu ahụ zuru oke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya ee, nwoke ahụ na-aga nꞌihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka Chineke ga-agọzi mgbe ọ na-aga nꞌihu na-eme ihe ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka ma ọ bụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru. Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke na-anabata dị ka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị ọrụ, bụ ka anyị lekọtaa ndị na-enweghị nne na nna nꞌime nsogbu ha. Ka anyị debe onwe anyị iche hapụ ịmerụ onwe anyị nꞌụwa. Ụmụnna m, ebe anyị nile bụ ndị kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst onye dị ebube, ka anyị hapụ ile mmadụ anya nꞌihu, si otu a na-akpa oke. Dị ka ihe ịma atụ, ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgba nꞌaka e ji ọlaedo mee na mkpisi aka ya, abata nꞌụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ anya sị ya, “Bịa nọdụ nꞌotu oche e debere iche nꞌihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, i nwere ike iguzo nꞌebe ahụ,” ma ọ bụ “Bịa nọdụ ala nꞌebe a ụkwụ m dị,” ọ bụ na unu esitebeghị nꞌụzọ dị otu a gosi na unu nabatara otu onye karịa ibe ya? Nke a o gosikwaghị na unu abụrụla ndị ikpe nwere echiche ọjọọ? Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ̀ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dị ka ndị ogbenye mee ha ka ha bụrụ ọgaranya site nꞌokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ Chineke kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nꞌanya? Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ̀ bụghị ndị ọgaranya na-apụnarị unu ihe unu nwere? Ọ̀ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nꞌụlọ ikpe? Ọ̀ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma nke Onyenwe anyị? *** Ọ bụrụ na unu na-edebe iwu ahụ dị mkpa dị nꞌakwụkwọ nsọ nke na-asị “Hụnụ ndị agbata obi unu nꞌanya dị ka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. Ma ọ bụrụ na unu anabata otu onye jụkwa onye nke ọzọ, unu na-eme mmehie. Nꞌebe iwu dịkwa unu bụ ndị na-emebi iwu. Nꞌihi na onye ọ bụla debere iwu nile ma daa nꞌotu, dara iwu dị ka a gaasị na ọ bụ iwu nile ka o mebiri. Nꞌihi na Chineke ahụ sịrị “Akwala iko” bụkwa onye sịrị “Egbula mmadụ”. Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu. Ya mere, na-ekwunụ okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nꞌiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha. Nꞌihi na Chineke agaghị emere onye ọ bụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Ma ọ bụrụ na unu emeere ndị ọzọ ebere, matanụ na ebere Chineke nꞌebe unu nọ ga-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya. Olee utu ọ bara ụmụnna m, na mmadụ kpọrọ onwe ya onye nwere okwukwe nꞌime Chineke, ma ọ bụrụ na ndụ ya na omume ya adakọtaghị nꞌihe ọ na-akpọ onwe ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ̀ pụrụ ime ka Chineke nabata ya? Ọ bụrụ na i nwere enyi nke bịakwutere gị, nke mkpa nri na uwe ọ ga-eyi na-akpa, ma ị sị enyi gị ahụ, “Laa nꞌudo nwanna m, Chineke gọzie gị. Ya nyekwa gị uwe ị ga-eji chụọ oyi, na nri ị ga-eji zụọ afọ gị,” ma ọ dịghị ihe ọ bụla i mere iji nyere ya aka igbo mkpa agụụ na-agụ ya na oyi na-atụ ya, ọ̀ dị ụzọ okwu ọma nile i kwuru siri nyere ya aka? Nꞌụzọ dị otu a, okwukwe gị nꞌime Chineke abaghị uru, ma ọ bụrụ na ndụ gị na omume gị egosighị ihe ndị a nile. Mmadụ pụrụ ịgwa m sị, “I nwere okwukwe ma e nwere m ọrụ ọma.” Ma ihe m ga-asa onye ahụ bụ nke a, “Zi m otu i siri nwee okwukwe nꞌime Chineke mgbe ị na-arụghị ọrụ ọma ọ bụla iji gosi ya, ma mụ onwe m ga-egosikwa gị na m bụ onye nwere okwukwe nꞌime Chineke site nꞌọrụ ọma m naarụ.” Amaara m na i kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dị. Nke a bụ ezi ihe. Chetakwa na ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dịkwa. Ọ bụ nke a na-eme ha ji atụ egwu, na-amakwa jijiji. Onye nzuzu, ruo olee mgbe ka ị ga-amụta na ọ bụ nanị site nꞌọrụ ị rụrụ ka ị pụrụ igosi na i nwere okwukwe nꞌime Chineke. Leenụ Eberaham nna anyị ochie, gịnị mere Chineke jiri gụọ ya nꞌonye ezi omume? Ọ̀ bụghị nꞌihi ihe o mere? Ọ̀ bụghị nꞌihi na o duuru Aizik chọọ iji ya chụọra Chineke aja? Site na nke a ka anyị jiri mata na okwukwe o nwere nꞌime Chineke gosiri onwe ya nꞌọrụ ọma ọ rụrụ. Ọ bụkwa ọrụ ọma ya mere ka okwukwe ya zuo oke. Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na-asị, “Eberaham kweere na Chineke, ma Chineke nꞌonwe ya ebe ọ bụ na Eberaham rubeere ya isi, gụrụ Eberaham nꞌonye ezi omume, kpọọkwa ya ‘Enyi Chineke.’ ” O weela anya ugbu a na ọ bụghị nanị na mmadụ kweere na Chineke ka e ji agụ ya nꞌonye ezi omume, kama ọ bụkwa nꞌihi na ndụ onye ahụ na omume ya, na-egosi na ọ na-erubere Chineke isi. Rehaab, nwanyị akwụla ahụ, bụkwa otu onye anyị ga-eji maa atụ. A zọpụtara ya nꞌihi ihe o mere. O lekọtara ụmụ Izirel bịara iledo obodo Jeriko anya. O gosikwara ha ụzọ ha siri gbapụ! Ya mere, dị ka o siri bụrụ ihe rara ahụ na a pụrụ ịhụ mmadụ dị ndụ nke na-enweghị mmụọ, otu a kwa, okwukwe nke na-adịghị egosi onwe ya site nꞌọrụ ọma, bụ ihe nwụrụ anwụ. Ụmụnna m, ka ọtụtụ nꞌime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, ndị ọrụ ha bụ igosi ndị ọzọ ebe ha siri mehie. Nꞌihi na ebe ndị nkuzi bụ ndị a na-ele anya na ha ma ihe karịa ibe ha, ha gaanata ikpe ọmụma karịrị ukwuu ma ọ bụrụ na ha emehie. Ọtụtụ mgbe, na nꞌụzọ dị iche iche, ka anyị na-emehie. Ma onye ọ bụla nke na-adịghị emehie site nꞌikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya aka. Anyị nwere ike ime ka inyinya mee ihe anyị chọrọ ka o mee, ma ọ bụ gaa ebe anyị chọrọ ka ọ gaa, ma ọ bụrụ na anyị etinye eriri igwe nꞌọnụ ya. Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nꞌosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nꞌịtụgharị ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ. Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Kwụsịdị chee echiche ụdị ọhia nke icheku ọkụ ntakịrị pụrụ ime ka o nwuru ọkụ. Ire anyị dị ka ọkụ. A tulee ya na akụkụ ọzọ dị nꞌahụ anyị, ọ dị ka nsi. Ọ pụrụ ịmerụ na imebi ndụ anyị nile dị ka otu icheku ọkụ pụrụ isi repịa ụlọ. Ọ bụkwa ọkụ na-esite nꞌọkụ ala mmụọ abịa ka e ji amụnye ire anyị ọkụ ime ka okwu na-esite nꞌire anyị pụta bụrụ ihe na-ebute mmebi na ịla nꞌiyi nye ndụ anyị. Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri, ma mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire ya. Ọ bụ ire anyị ka anyị ji eto Chineke bụ Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ire anyị ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nꞌoyiyi nke ya. Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị! Ọ̀ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nꞌotu isi iyi ahụ na-asọpụta? Ụmụnna m, osisi oroma ọ̀ pụrụ ịmụ ube? Ka osisi ube ọ pụrụ ịmịpụta oroma? Nꞌụzọ dị otu a anyị makwaara na mmiri nnu na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ apụghị isite nꞌotu isi iyi asọpụta. Ọ̀ dị onye ọ bụla nꞌime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nꞌibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nꞌobi umeala nke ịnya isi na-adịghị. Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nꞌihe ilu na ekworo, o kwesịghị ka unu kwusie okwu ike banyere amamihe unu na ịdị mma unu. Nꞌihi na nke a abụghị eziokwu. Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa, amamihe nke ekwensu, ọ bụghị amamihe nke Mmụọ Nsọ. Nꞌihi na ebe ọ bụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka unu ga-achọta igba aghara na omume ọjọọ. Ma amamihe na-esite nꞌebe Chineke nọ abịa dị ọcha. Ọ hụrụ udo nꞌanya, ọ na-eme obi ọma, o jupụtara nꞌebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịkwaghị nꞌime ya. Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ nke ezi omume. Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nꞌetiti unu? Ọ̀ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nꞌime onwe unu? Ọtụtụ ihe dị nke ọ na-agụ unu agụụ inweta ma unu adịghị enweta ya. Nꞌihi ya unu na-egbu mmadụ nara ha ihe ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na unu ahụ ihe onye ọzọ nwere nke dị unu mma, unu na-enwe anya ukwu nꞌebe onye ahụ nọ. Ma nꞌihi na unu apụghị inweta ihe ahụ, unu na-alụ ọgụ na-ese okwu. Ma unu adịghị enweta ihe unu chọrọ nꞌihi na unu adịghị arịọ Chineke ihe ndị a. Ọ bụladị mgbe unu rịọrọ Chineke, ọ dịghị enye unu ihe unu rịọrọ ya nꞌihi na ihe unu chọrọ iji ihe ndị ahụ mee abụghị ezi ihe. Ọ bụ iji ha mee nanị ihe ga-atọ obi unu ụtọ. Ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi! Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Ọ bụrụ na uche unu bụ inwe aṅụrị nꞌihe nke ụwa, unu apụghị ịbụ enyi Chineke. Gịnị ka unu na-eche na akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe e dere nꞌime ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime anyị na-eche anyị nche ka anyị hapụ ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nꞌebe Chineke nọ?” Ma Chineke na-enye anyị amara anyị pụrụ isite na ya jụ ime ihe ọchịchọ ọjọọ nke obi anyị na-achọ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Amara Chineke dịịrị ndị dị umeala nꞌobi, ma ọ naeguzo megide ndị na-ebuli onwe ha elu.” Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ. Bịakwụtenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, ndị mmehie, ma meekwanụ ka obi unu dị ọcha. Unu abụla ndị obi abụọ. Ruonụ uju, tienụ aka nꞌobi nꞌọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru uju werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ ọ bụla dị nꞌime unu. Wedanụ onwe unu ala nꞌihu Chineke ka o nwee ike ibuli unu elu. Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nꞌihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, ma ọ bụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu Chineke. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Ọ bụ nanị otu onye dị nke na-enye ndị mmadụ iwu. Ọ bụkwa nanị otu onye ikpe dị, Chineke nꞌonwe ya. Ọ bụ nanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọ bụla nꞌiyi. Ma gị, nwanna m, ònye ka ị na-eche na ị bụ i ji na-ekpe nwanna gị ikpe? Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa ma ọ bụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, ma ọ bụ obodo dị otu a, ịzụ ahia na ire ahia, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.” Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo. Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị gaadị ndụ. Anyị ga-emekwa ihe dị otu a.” Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi banyere ihe unu chọrọ ime. Ụdị ịnya isi a adịghị atọ Chineke ụtọ, nꞌihi na ha dị njọ. Ya mere, mmadụ ọ bụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie megide Chineke. Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge ruola mgbe unu kwesịrị ịkwa akwa na ịsụ ude nꞌihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. Akụ na ụba unu ebidola ịta ajarị, mkpu ebidokwala irichasị uwe ọma unu. Ọlaọcha na ọlaedo unu ejupụtala nꞌịtarị. Ajarị a ga-abụkwa ama megide unu, ọ gaerepịa anụ ahụ unu dị ka ọkụ. Unu akpakọtaala akụ nꞌụbọchị ikpeazụ ndị a. Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesịrị na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị bụ Onye pụrụ ime ihe nile. Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ, ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọ bụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ikpe nke na-abịa. Unu amaala ndị aka ha dị ọcha ikpe ọmụma, gbuokwa ha, ọ bụladị mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ ha bu nꞌobi ha megide unu. Nweenụ ndidi ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa nke Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nꞌubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. Unu onwe unu kwesịkwara inwe ndidi guzosiekwa ike nꞌihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Ụmụnna m, unu atamụla ntamụ megide ibe unu, ka Chineke hapụ ikpe unu ikpe. Ọbịbịa ya dị nso. Ọ gaabịakwa! Ụmụnna m, ùnu chọrọ ihe ga-abụrụ unu ihe ilere anya banyere otu ndị Chineke si anagide ahụhụ? Mgbe ahụ mụtanụ ihe site na ndụ ndị amụma kwuru okwu nꞌaha Chineke, na ahụhụ nke ha hụrụ. Anyị na-agụ ha ugbu a dị ka ndị a gọziri agọzi nꞌihi na ha diri ahụhụ. Unu anụla akụkọ Job, otu o siri hụọ ahụhụ na otu Chineke siri gọzie ya nꞌikpeazụ. Chineke bụ onye jupụtara nꞌobi ebere na ọmiko. Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọ bụla, ọ bụladị iji eluigwe ma ọ bụ ụwa ṅụọ iyi. Kama ka “ee” unu bụrụ “ee”. Ka “é, è” unu bụrụkwa “é, è”. Ka unu hapụ isite nꞌụzọ dị otu a mehie wetakwara onwe unu ịbụ ọnụ Chineke. Ọ̀ dị onye ọ bụla nꞌetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ̀ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ ito Chineke. Ọ̀ dị onye nọ nꞌetiti unu ahụ naesighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nꞌisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. Ọ bụrụkwa na ha sitere nꞌokwukwe kpeere Chineke ekpere ha, a ga-eme ka ahụ dị onye ọrịa ahụ mma. Onyenwe anyị ga-emekwa ka o site nꞌute ọrịa bilie. Ọ bụrụkwa na o mehiere, ọ ga-agbaghara ya mmehie ya. Ya mere, kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu, kpeekwara ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Chineke na-anụ ekpere onye ezi omume, na-azakwa ya. Ịlaịja onye amụma, bụrị mmadụ efu dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị ruo afọ atọ na mkpirisi. Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, nke mere ka mmiri zoo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri. Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌetiti unu esite nꞌeziokwu Chineke jehie, ma otu onye nꞌime unu akpọghachi ya azụ nꞌeziokwu ahụ, onye ahụ kpọghachiri onye njehie ahụ nꞌebe Chineke nọ azọpụtala mkpụrụ obi kpafuru akpafu site nꞌọnwụ. Ọ bụ ihe pụrụ ime na mkpụrụ obi ahụ ga-anata mgbaghara nꞌihi ọtụtụ mmehie ya. Ọ bụ mụ onwe m Pita, onyeozi Jisọs Kraịst na-edegara ndị nile Chineke họpụtara akwụkwọ a, ndị ahụ nile si Jerusalem gbara ọsọ ndụ gaa biri nꞌobodo nile nke Pọntus, Galetia, Kapadosia, Esia na Bitinia. Ndị enyi m, nꞌoge gara aga, Chineke onye bụ Nna họpụtara unu dị ka nzube ya si dị. Ọ makwaara na unu ga-emesị bụrụ ụmụ ya. Mmụọ Nsọ ya emeekwala ka unu bụrụ ndị dị nsọ, ndị a sachara nꞌọbara Jisọs Kraịst, na ndị na-erubere ya isi. Ka amara na udo dịrị unu. Ka otuto na nsọpụrụ nile dịrị Chineke, Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌobi ebere ya nke o nwere nꞌebe anyị nọ ka o ji nye anyị ndụ ọhụrụ ahụ mere ka a kpọbata anyị nꞌezinụlọ ya. Ugbu a anyị nwere olileanya iketa ndụ ebighị ebi nꞌihi na Kraịst esitela nꞌọnwụ bilie. Chineke akwadobela onyinye ndụ ebighị ebi ọ ga-enye ụmụ ya nile. Onyinye a dị nꞌeluigwe ebe Chineke na-echebe ya. Nꞌebe ahụ ọ gaghị emebi emebi, ọ gakwaghị agbanwe ọdịdị ya ma ọ bụkwanụ ree ure. Ihe ndị a nile ga-abụ nke unu nꞌihi na Chineke ji ike ya na-eche unu nche nꞌihi na unu tụkwasịrị ya obi. Chineke ga-enye unu ya nꞌụbọchị ọgwụgwụ oge ahụ nꞌụzọ ọ ga-apụta ìhè nye mmadụ nile. Ya mere, na-aṅụrịnụ ọṅụ, nꞌihi na ụbọchị ga-ewetara unu oke ọṅụ na-abịa. Ọ bụ ezie na unu nọ nꞌọnọdụ mwute ugbu a nꞌihi ọtụtụ mkpagbu na ọnwụnwa na-abịakwasị unu, ma ihe ndị a nile na-adị nanị nwa oge. Ọnwụnwa na mkpagbu ndị a na-enyere unu aka ịnwapụta ma okwukwe unu nwere o sikwara ike. A na-anwa okwukwe unu dị ka a ga-asị na ọ bụ ọlaedo e ji ọkụ na-anwapụta. Ọ bụ ezie na ọlaedo bụ ihe pụrụ imebi emebi, ma a ga-eji ọkụ nwaa ya, ịmata nke bụ ezi ọlaedo, na nke na-abụghị ya. Ya mere, ebe ọ bụ na okwukwe unu dị oke ọnụ ahia karịa ọlaedo, a ga-anwakwa unu ịhụ ma ọ ga-eguzosikwa ike. Ọ bụrụ na okwukwe unu eguzo chịm nꞌọnọdụ ọnwụnwa ndị a nile, iguzosi ike unu ga-ewetara unu otuto, ebube na nsọpụrụ nꞌụbọchị ahụ Jisọs ga-alọghachi. Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ Kraịst mgbe ọ bụla, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu hụrụ ya nꞌanya. Nꞌezie, ọ bụladị ugbu a unu nwere obi nke jupụtara nꞌụdị ọṅụ ahụ ọnụ na-apụghị ịkọwa. Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nꞌihi ntụkwasị obi unu nꞌime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụ obi unu. Nzọpụta a bụ ihe ndị amụma na-aghọtaghị nke ọma. Ha dere ọtụtụ ihe banyere ya, jụọkwa ọtụtụ ajụjụ banyere ihe nzọpụta ahụ pụtara. Ha gbalịsịrị ike ịchọpụta ihe Mmụọ Kraịst ahụ bi nꞌime ha na-ekwu, mgbe ọ na-agwa ha okwu. Nꞌihi na okwu ahụ nile Mmụọ Kraịst gwara ha bụ ihe mezuru na ndụ Kraịst. O mezuru nꞌahụhụ ya nile na ebube nile ga-eso ahụhụ a. Ma nꞌoge ahụ ha aghọtaghị mgbe ihe ahụ ha na-ebu amụma banyere Kraịst ga-emezu. Ha amakwaghị nꞌoge ahụ onye ọ ga-emezu nꞌahụ ya. Ma Chineke mere ka ndị amụma mata na ọrụ ha rụrụ abụghị maka ọdịmma nke aka ha, kama ọ bụ nꞌihi ọdịmma nke ndị ga-ebi nꞌoge dị nꞌihu, bụ unu onwe unu. Ugbu a kwa a na-ekwusara mmadụ nile ozi ọma a. A na-ekwusakwa ya site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ kwuru ha. Ee, a na-ekwusa ozi ọma a nke na-agụ ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe agụụ ịnụ ihe banyere ya. Nꞌihi ya, kwadoonụ obi unu, nọọkwanụ na njikere dị ka ndị maara ihe ha na-eme. Tụkwasịkwanụ olileanya unu na ngọzi ahụ Chineke ga-enye unu, mgbe a ga-eme ka Jisọs Kraịst bịa ọzọ. Na-eruberenụ Chineke isi. Unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nꞌọchịchịrị, na-achị ndụ unu. Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nꞌihe nile unu na-eme, dị ka Chineke, onye kpọrọ unu si dị nsọ. Nꞌihi na Chineke ekwuola na “Unu aghaghị ịdị nsọ.” Matanụ nke ọma na Chineke, onye ahụ unu na-akpọku nꞌekpere, adịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-ekpe mmadụ ikpe. Ọ na-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị, nꞌihi ya, jiri itu egwu Chineke bie ndụ gị nꞌụwa. Nꞌihi na Chineke ji ihe na-apụghị imebi emebi, ihe dị oke ọnụ ahia karịa ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site na ndụ ọjọọ ahụ unu ketara site nꞌaka nna nna unu ha. Ọ bụ ọbara dị oke ọnụ ahia nke Kraịst wụsịrị ka e ji gbapụta unu; ọbara Kraịst ahụ, onye na-emeghị mmehie, na onye dị ka nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọ bụla. Chineke ahọpụtalarị Kraịst tupuu e kee ụwa. Kama ọ bụ nꞌọgwụgwụ oge ndị a ka Chineke mere ka ọ pụta ìhè iwetara unu ngọzi. Ọ bụkwa site nꞌaka ya ka unu ji tụkwasị Chineke obi, onye mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, tụkwasịnụ okwukwe unu na olileanya unu na Chineke. Ugbu a, ebe unu sitere nꞌirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya, werenụ obi unu nile hụ onwe unu nꞌanya. Nꞌihi na unu enweela ndụ ọhụrụ ugbu a. Ọ bụghị ndụ unu ketara site nꞌọmụmụ nke nne na nna unu, nꞌihi na ụdị ndụ na-esite nꞌọmụmụ ahụ na-emesi gabiga. Ma ndụ ọhụrụ unu nwere ga-adị ruo mgbe ebighị ebi nꞌihi na o si nꞌaka Kraịst bụrụ nke unu, ee, nꞌaka Kraịst, onye bụ okwu ahụ dị ndụ Chineke na-ekwu nye ụmụ mmadụ. Nꞌihi na okwu Chineke gwara anyị sị, Ndụ mmadụ nile na-agabiga dị ka ahihia nke na-emesi kpọnwụọ, daa. Ịma mma nile nke mmadụ na ebube ya dịkwa ka okoko osisi nke na-ama mma, ma emesịa, ọ daa nꞌala laa nꞌiyi. Ma okwu Onyenwe anyị ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi. Okwu ahụ bụkwa ozi ọma ahụ anyị wetaara unu. Ya mere, sitenụ nꞌajọ omume unu pụta, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, ndị na-ekwutọ mmadụ ihe ha. Ọ bụrụ na unu edetụla obi ebere Onyenwe anyị ite, mara na ọ dị mma, na-adịnụ dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ndị agụụ ịṅụ mmiri ara na-agụ. Bụrụnụ ndị ọ na-agụ agụụ ịṅụ mmiri ara ka unu bụrụ ndị na-eto eto, na ndị a zọpụtara. *** Bịakwutenụ Kraịst, oke nkume ahụ dị ndụ, nke ụmụ mmadụ kpọrọ ihe efu, ma nke Chineke họpụtara mee ya ka ọ bụrụ onyenwe nsọpụrụ. Bịakwutenụ Chineke dị ka nkume dị nsọ, ka e were unu wuo ụlọ ukwu ahụ dị nsọ. Ebe unu ga-eje ozi dị ka ndị nchụaja dị nsọ. Nꞌihi na unu bụ ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja dị nsọ, nke na-atọ Chineke ụtọ site na Jisọs Kraịst. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ na-ekwu sị, “Ahọpụtala m Kraịst ka ọ bụrụ nkume dị oke ọnụ ahia, nke m ga-eji wusie isi nkuku ụlọ nzukọ m bụ chọọchị m ike. Agaghị m ekwekwa ka ihere mee onye ọ bụla kweere na ya.” Ma Kraịst bụ nkume dị oke ọnụ ahịa nye unu ndị kwere ekwe, ma nꞌebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ ọ bụ “Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke e mere ugbu a ka ọ bụrụ nkume kachasị mkpa nꞌụlọ ahụ.” Nꞌebe ọzọ nꞌime akwụkwọ nsọ e kwuru sị, “Nke a bụ nkume ahụ ga-eme ka ụfọdụ ndị mmadụ maa nꞌọnya, ọ bụkwa nkume ga-eme ka ha daa.” Ha ga-abụ ndị ọnya mara nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌokwu ahụ. Nꞌihi ya ahụhụ dịịrị ha, dị ka uche Chineke si dị, bụ na ha ga-ada. Ma unu abụghị ndị ahụ ga-ada ada. Kama unu bụ agbụrụ Chineke ji aka ya họpụta. Unu bụ ndị nchụaja onye eze ahụ. Unu bụ ndị dị nsọ, ndị nke Chineke nꞌonwe ya. Unu bụ ndị a họpụtara ka ha kwusaa ọrụ ebube Chineke, onye ahụ si nꞌọchịchịrị kpọbata unu nꞌime ìhè ya. Nꞌoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mgbe ochie, unu amaghị ihe ọ bụla banyere obi ebere Chineke, ma ugbu a obi ebere ya erutela unu aka. Nꞌihi ya ndị enyi m, ana m arịọ unu, dị ka ndị ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ unu bụ nꞌụwa a na-asị unu, unu enyefela onwe unu nꞌaka ihe na-agụ unu agụụ nꞌihi na ha bụ ihe na-alụso mkpụrụ obi unu agha. Ka ndụ unu na-ebi nꞌetiti ndị na-amaghị Chineke bụrụ ihe e ji ama atụ. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha ghara inwe ọnụ, ọ bụladị mgbe ha chọrọ ikwutọ unu. Ndụ unu na ọrụ ọma unu ga-eme ka ha ghọta ma tookwa Chineke nꞌụbọchị Kraịst ga-alọghachi. Ana m arịọ unu nꞌaha Onyenwe anyị ka unu doo owe unu nꞌokpuru ọchịchị nile. Sọpụrụnụ ndị eze na ndị isi ọchịchị obodo. Sọpụrụnụ ndị na-ejere ndị isi ọchịchị ozi nꞌihi na ha bụ ndị e zitere ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ na itokwa ndị na-eme ezi ihe. Ọ bụ uche Chineke ka unu site nꞌihe ọma unu na-eme na ndụ unu kpuchie ọnụ ndị nzuzu, na okwu na-abaghị nꞌihe ha na-ekwu megide ozi ọma ahụ ha na-amaghị ihe ọ pụrụ imere ha, na ike dị nꞌime ya. Bienụ ndụ unu dị ka ndị na-anọghị nꞌokpuru iwu. Ma unu ejikwala onwunwe unu nwe onwe unu eme ihe ọ bụla masịrị unu. Unu ejila ya eme ihe ọjọọ, kama na-ebinụ ndụ unu ime nanị ihe Chineke chọrọ mgbe nile. Sọpụrụnụ mmadụ nile. Na-ahụkwanụ ndị nile kwere ekwe nꞌanya. Na-atụnụ egwu Chineke Nna, na-asọpụrụnụ ndị na-achị achị. Ndị bụ odibo ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye nanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obi ọma nꞌebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri. Chineke ga-agọzi unu ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachi obi na-edi ahụhụ ga-adakwasị unu nꞌihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ. Unu maara na o nweghị otuto ọ bụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ unu mere. Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachi obi mgbe a na-ata unu ahụhụ nꞌihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-atọ Chineke ụtọ. Ọ bụ nꞌihi ime ihe dị otu a ka Chineke ji kpọọ unu, nꞌihi na Kraịst sitere nꞌụzọ dị otu a hụọ ahụhụ nꞌihi unu. Ọ bụkwa ihe ịma atụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya. O nweghị mgbe ọ bụla Kraịst mehiere, o nwekwaghị mgbe ọ bụla onye ọ bụla nụrụ okwu ụgha nꞌọnụ ya. O kwutọghị onye ọ bụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọ bụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama nanị ihe o mere bụ iwere ihe nile nyefee nꞌaka Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Nꞌelu obe ahụ, Kraịst buuru mmehie anyị nile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị, ma dịrị ndụ nꞌebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site na mpa ọnya dị ya nꞌahụ ka o ji gwọọ anyị. Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a e meela ka unu laghachikwute onye na-azụ unu dị ka atụrụ, na onye na-echebe mkpụrụ obi unu. Unu ndị inyom nwere di na-eruberenụ di unu isi nꞌihi na ọ bụ site na mmeso unu na-emeso ha ka ndị na-ekweghị nꞌokwu Chineke nwere ike ikwere. Ndụ ọma unu na-ebi pụrụ ime ka ha chegharịa karịa okwu ọnụ ọ bụla unu ga-agwa ha. Unu abụla ndị na-achọ ịkwa mma nke anụ ahụ nanị, ndị na-atụfu oge ijikwa ma ọ bụ iyi iyeri ma ọ bụ ihe ntị dị iche iche ma ọ bụkwanụ ndị na-achọ ka ha yie uwe ọhụrụ ma ọ bụ maa akwa ọhụrụ pụtara mgbe ọ bụla. Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke. Nke a bụ ụdị ịma mma a hụrụ na ndụ ndị inyom ihe ha dị Chineke mma na mgbe ochie. Ndị inyom tụkwasịrị Chineke obi, na ndị echiche ha na nzube di ha dakọtara. Nke a bụ ihe Sera nꞌonwe ya mere. O doro onwe ya nꞌokpuru di ya bụ Eberaham, sọpụrụ ya dị ka nna nwe ụlọ. Ugbu a ọ bụrụ na unu emee otu a, unu na-agbaso nzọ ụkwụ Sera dị ka ụmụ na-eme ezi ihe. Mgbe ahụ ịtụ egwu agaghị adịrị unu na unu ga-emejọ di unu. Unu bụ di na-alụ nwụnye lezienụ nwụnye unu anya nke ọma. Cheenụ echiche banyere ihe na-akpa ha mkpa nꞌihi adịghị ike ha. Nye ha ugwu ruuru ha nꞌihi na ọ bụ unu na nwụnye unu ga-abụ otu ịnata ndụ ahụ Chineke ga-enye. Ọ bụrụ na unu emesoghị ha mmeso dị ka o si kwesị Chineke agaghị aza ekpere unu. Ihe ọzọ m chọrọ ịgwa unu bụ nke a, nweenụ otu obi, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu. Bụrụnụ ndị nwere obi ọma na obi dị umeala. Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onye ọ bụla chọrọ ibi ndụ dị ụtọ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ọma ahụ anya, ya kwụsị ikwu okwu ọjọọ na okwu ụgha. Ya sitekwa nꞌajọ omume ya tụgharịa bido ime ezi ihe. Ya gbalịakwa ibi ndụ udo, ma na-agbasokwa ndụ udo. Nꞌihi na Chineke si nꞌelu na-ele ndị ezi omume anya mgbe nile, ọ na-egekwa ntị nꞌekpere ha, ma ọ na-ele ndị ajọ omume anya ọjọọ.” O nweghị onye ga-emerụ unu ahụ nꞌihi na unu na-eme ezi ihe. Ma a sịkwarị na ha ataa unu ahụhụ nꞌihi na unu mere ihe dị mma, ngọzi dịrị unu. Unu atụla ha egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri. Na-enyenụ Chineke nsọpụrụ nꞌime obi unu. Nọọkwanụ na njikere mgbe nile iguzo kọwaara onye ọ bụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nꞌime unu. Ma werenụ obi dị umeala na nsọpụrụ na-eme ya. Meenụ obi unu ka ọ dị ọcha, ka ndị na-akọ unu ọnụ na ndị na-ekwulu unu bụrụ ndị ihere ga-eme mgbe ha hụrụ na ihe ha na-ebo unu ebubo banyere ya bụ ihe ọma. Nꞌihi na ọ ka mma ịta ahụụ nꞌihi ọrụ ọma ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụụ nꞌihi ọrụ ọjọọ. Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nꞌihi unu. Ọ nwụrụ ọnwụ nanị otu ugboro nꞌihi anyị nile bụ ndị mmehie. Ezi mmadụ na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla nwụrụ nꞌihi ndị ajọ omume, nꞌihi ime ka anyị bịa nꞌihu Chineke. Ọ bụ ezie na e gburu ya nꞌanụ ahụ ma e mere ka ọ dịrị ndụ nꞌime mmụọ ya. Ọ bụkwa nꞌime mmụọ ya ka ọ gara kwusaa ozi ọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nꞌụlọ mkpọrọ. Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachi obi chere ha nꞌoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ nanị mmadụ asatọ nꞌime ndị bi nꞌoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ riri ndị bi nꞌụwa. Nke a bụ ihe ịma atụ na-ezi anyị ihe baptizim pụtara. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-egosi na a zọpụtala anyị site nꞌọnwụ na mbibi nꞌihi mbilite nꞌọnwụ Kraịst. O gosighị na e meela ka anụ ahụ anyị dịrị ọcha nꞌihi baptizim e mere anyị, kama ọ na-egosi na anyị, ndị e mere baptizim na-alọghachikwute Chineke na-arịọ ya ka ọ sachaa mmehie dị nꞌobi anyị. Ugbu a Kraịst nọ nꞌeluigwe. Ọ nọkwa nꞌakụkụ aka nrị Chineke. Ọ bụ ya na-achị ndị mmụọ ozi nile, ndị ọchịchị nile, na ike nile nke eluigwe. Ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nꞌanụ ahụ, unu kwesịkwara inwe ụdị obi ahụ o nwere. Unu kwesịrị ijikere ịhụ ahụhụ. Nꞌihi na mgbe anụ ahụ unu na-ahụ ahụhụ ime mmehie anaghị atọkwa ya ụtọ. Unu atụfula oge unu ịgbaso ọchịchọ ọjọọ nile na-agụ unu agụụ, kama bụrụnụ ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi ime ihe Chineke chọrọ. Nꞌoge gara aga unu tụfuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị na-amaghị Chineke ụtọ. Ndụ unu jupụtara nꞌagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ife arụsị, nke na-eduba na mmehie ọjọọ dị iche iche. Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ndị enyi unu na-amaghị Chineke anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ. Nke a pụkwara ime ka ha were unu na-eme ihe ọchị ma ọ bụ ilelị unu anya. Ma chetanụ nke ọma na ụbọchị na-abịa mgbe ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nꞌihu Chineke onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, taa ndị na-ebi ndụ ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa ozi ọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ, ndị ahụ e kpere ikpe nꞌanụ ahụ mgbe Chineke ji mmiri bibie ụwa. E kwusaara ha ozi ọma a ime ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee ka ha dịrị ndụ nꞌime mmụọ ha dị ka Chineke si na-adịkwa ndụ. Ọgwụgwụ ihe nile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuru oke, ndị nọ na njikere, na ndị na-ekpekwa ekpere. Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. Jirinụ obi ọma na-elerita ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọ bụla. Ka onye ọ bụla jiri onyinye pụrụ iche Chineke nyere ya na-enyere ndị ọzọ aka. Bụrụnụ ndị ji onyinye dị iche iche Chineke nyere unu na-achịzi ezinụlọ Kraịst nke ọma. Ọ bụrụ na Chineke nyere gị onyinye izisa ozi ọma na-ezisa ya dị ka a ga-asị na Chineke si nꞌọnụ gị na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-enyere ndị ọzọ aka, were ike ahụ nile Chineke nyere gị mee ya. Ka e site nꞌime ihe nile nye Chineke otuto site nꞌaha Jisọs Kraịst Onyenwe ike na otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara unu nꞌihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nꞌebe unu nọ. Kama ṅụrịanụ ọnụ nꞌihi na ọnwụnwa ndị a na-enyere unu aka iketa oke nꞌahụhụ Kraịst. Mgbe ọnwụnwa ndị a gabigasịrị, obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ mgbe a ga-eme ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya nꞌụbọchị ahụ a ga-eme ka ọ pụta ìhè. Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe ọ bụla a na-abụ unu ọnụ, ma ọ bụ na-ekwutọ unu, nꞌihi na unu bụ ndị na-eso Kraịst. Nke a na-ezipụta na Mmụọ ahụ dị ebube, Mmụọ Chineke, bi nꞌime unu. Ka onye ọ bụla nꞌime unu ghara ịta ahụhụ nꞌihi na o gburu mmadụ ma ọ bụ dị ka onye ohi, ma ọ bụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nꞌaka ike. Ma ihere ekwesịghị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke ekele na a na-akpọ unu ndị Kraịst. Nꞌihi na oge ikpe ikpe eruola, ọ ga-amalịtekwa nꞌebe ndị Chineke nọ. Ọ̀ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwereghị na Kraịst? Ọ̀ bụrụ na ọ ga-esi ike ịzọpụta ndị ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie? Ya mere, ọ bụrụ na unu na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, gaanụ nꞌihu na-eme ihe ziri ezi. Nyefeekwanụ onwe unu nꞌaka Chineke onye kere unu, onye kwesịrị ntụkwasị obi. Mụ onwe m, onye bụkwa okenye chọọchị, na-agwa ndị okenye chọọchị nile nọ nꞌetiti unu okwu a. Eji m anya m abụọ hụ Kraịst mgbe ọ nwụrụ nꞌelu obe. Aga m esokwa keta oke nꞌebube ya na otuto ga-abụ nke ya mgbe ọ lọghachiri. Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi. Unu abụla ọpụtaobie nꞌebe ndị e nyefere unu nꞌaka nọ, kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye ha. Nke a ga-eme ka unu nata ụgwọ ọrụ iketa oke nꞌebube ahụ na-agaghị agwụ agwụ, mgbe onye ọzụzụ atụrụ dị ukwuu ahụ bịara. Nꞌotu aka ahụ, unu ụmụ okorọbịa, doonu onwe unu nꞌokpuru ndị bụ okenye. Unu nile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nꞌihi na Chineke na-enye onye dị umeala nꞌobi amara na ngọzi ya, ma onye mpako ka ọ na-eguzo imegide. Nꞌihi nke a, werenụ obi dị umeala doo onwe unu nꞌokpuru Chineke onye dị ike. Mgbe oge ya rukwara ọ ga-eweli unu elu. Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile. Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nꞌihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dị ka ọdụm agụụ na-agụ na-achọ onye ọ ga-ala nꞌiyi. Guzosienụ ike nꞌokwukwe unu mgbe ọ ga-alụso unu ọgụ. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nꞌụdị ahụhụ a unu na-ahụ nꞌụwa nile. Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike. Ka ike nile bụrụ nke ya ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. Ọ bụ site nꞌinyeaka Saịlas ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole a dị nꞌime akwụkwọ a. Dị ka unu maara nke ọma, Saịlas bụ nwanna anyị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ olileanya m na a ga-eji ihe m dere nꞌebe a gbaa unu ume, nꞌihi na edeere m unu ihe bụ eziokwu gbasara otu Chineke si agọzi ndị ya. Ihe nile m dere nꞌebe a bụ ihe ga-enyere unu aka iguzosi ike nꞌịhụnanya ya. Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke Chineke họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu. Jirinụ isurịta ọnụ ịhụnanya ndị Kraịst kelerịtaa onwe unu. Ka udo Chineke dịnyere unu nile nọ nꞌime Kraịst. Ọ bụ Saịmọn Pita, odibo Jisọs Kraịst na onyeozi na-edegara ndị nile nwere ụdị okwukwe anyị nwere akwụkwọ a. Okwukwe m na-ekwu ihe banyere ya bụ ụdị okwukwe ahụ Jisọs Kraịst Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị na-enye. Ọ bụ okwukwe dị oke ọnụ ahịa, nke na-egosikwa ịdị mma onye nyere anyị ya. Ka mara na udo Chineke dịnyere unu na mmaji na mmaji, ụdị udo na amara ya na-esite na mmazu unu maara ya na-abịa. Chineke esitela nꞌike ya nye anyị ihe nile dị anyị mkpa. O nyela anyị ihe ahụ ga-enyere anyị aka ibi ezi ndụ dị ka ndị ma onye Chineke bụ. Nꞌihi na ọ bụ ya kpọrọ anyị site nꞌebube ya na nꞌịdị mma ya. Ọ bụkwa site nꞌike aka ya ka o ji nye anyị onyinye ahụ dị ukwuu, nke o kwere anyị na nkwa. Nkwa o kwere anyị, nke o mezuru, bụ nzọpụta ọ zọpụtara anyị site nꞌagụụ ihe ọjọọ nile, na ndụ rere ure nile dị nꞌụwa, na inye anyị ọdịdị ya onwe ya bụ Chineke. Ọ bụrụ na anyị achọọ ịnata onyinye ndị a nile, anyị kwesịrị ime ihe karịrị ịtụkwasị Chineke obi nanị; anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụ ndị dị mma. Ma ịdị mma abụghị nanị ọrụ dịrị anyị. Anyị kwesịkwara ịga nꞌihu ịmụta ihe nile banyere Chineke. Ihe ọzọ anyị ga-atụkwasị nꞌelu ihe ọmụma bụ mmụọ nke emebigaghị ihe ọ bụla oke, ka anyị si otu a bụrụ ndị nwere ntachi obi na ndị dị nsọ. Mgbe anyị mere nke a, anyị ga-agakwa nꞌihu ime ka ihe gbasara ndị ọzọ na-adị anyị mma. Nke a ga-eme ka ịhụnanya anyị nwere nꞌebe ndị ọzọ nọ baa ụba. Mgbe anyị na-aga nꞌihu na-eme ihe ndị a, mgbe ha jubigakwara oke nꞌime anyị, mgbe ahụ ka anyị ga-abụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nꞌihe anyị maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ma onye ọ bụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nꞌokwukwe ya nọ nꞌọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na Chineke sachapụrụ mmehie ya nile ime ka o bie ndụ dị mma nꞌihu Onyenwe anyị. Nꞌihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike igosi na unu so nꞌime ndị ahụ Chineke kpọrọ họpụta. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsụ ngọngọ ma ọ bụ dapụ. Chineke ga-emeghekwara unu ụzọ, nye unu ike ịbanye nꞌalaeze ahụ na-adịgide adịgide, bụ alaeze Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst. Ọ bụ nzube m na m ga na-echetara unu ihe ndị a site nꞌoge ruo nꞌoge. Ọ bụ ezie na unu maara ha na-eguzosikwa ike nꞌeziokwu ahụ unu natara. Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoo haa na oge m nwere nꞌụwa adịkwaghị ukwuu, na m ga-anwụ nꞌoge na-adịghị anya. Ya mere, na nwa oge ahụ fọdụrụ, ana m agụ ya nꞌihe ziri ezi ịkpọtụ mmụọ unu na uche unu site nꞌichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nꞌụwa a. *** Aga m agbalịsi ike ịhụ na a sịkwarị na m nwụọ, unu ga na-echeta ihe ndị a. Ihe nile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nꞌamamihe ya. Nꞌihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbia ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya m abụọ ka m ji hụ ebube na ịma mma ya. Eso m nọdụ nꞌelu ugwu ahụ dị nsọ mgbe Chineke mere ka otuto ya na nsọpụrụ ya pụta ìhè. Eji m ntị m nụrụ mgbe olu ahụ dị ebube si nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ nꞌanya nke ukwuu, onye ihe ya dịkwa m ezi mma.” *** Nꞌezie, anyị ahụla, nwapụtakwa na amụma ahụ ndị amụma buru emezuola. Ọ ga-abara unu uru ilezi anya nꞌihe ahụ nile ndị amụma dere, nꞌihi na ozi ha dị ka ìhè nke na-acha nꞌakụkụ ụlọ gbara ọchịchịrị. Okwu ha na-enyere anyị aka ịghọta ọtụtụ ihe gaara esiri anyị ike ịghọta. Mgbe unu tulere eziokwu ahụ dị nꞌokwu ahụ ndị amụma kwuru, ìhè ga-enwụbata nꞌobi unu, mgbe ahụ kwa Kraịst onye dị ka kpakpando na-acha nꞌisi ụtụtụ ga-eme ka ihè ya chabata nꞌime unu. Nke ka nke, chetanụ nke a, na okwu amụma ọ bụla e dere nꞌakwụkwọ abụghị nke onye ọ bụla nwere ika ịkọwa otu o si dị ya mma. Nꞌihi na o nweghị okwu amụma ọ bụla ndị amụma ochie sitere nꞌobi ha chepụta dee ma ọ bụ kwuo. Kama ọ bụ Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha nyere ha ozi ahụ Chineke chọrọ ka ha kwuo. Ma na mgbe ochie ahụ kwa e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nꞌetiti ha, dị ka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nꞌetiti unu, ndị na-eweta ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nꞌiyi, ndị ga-agọnarị Onyenwe anyị, onye ji ọbara ya gbapụta ha. Ma ọnwụ ha ga-abụ nnọọ na mberede, ha ga-anwụchakwa ọnwụ. Ma nꞌihi otu ha si ebi ndụ ha ọtụtụ mmadụ ga-ekwu okwu megide ụzọ nke eziokwu ahụ. Ndị nkuzi ụgha a ga-esite nꞌakpịrị ego ha nwere gwa unu ihe ọ bụla, nke ga-eme ka ego unu bata ha nꞌaka. Ma ha bụ rị ndị Chineke mara ikpe kemgbe oge gara aga ọge ịla nꞌiyi ha na-abịa nso. Nꞌihi na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama, o weere ha kpọchie nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ nꞌime ọchịchịrị na-eche ụbọchị ikpe ahụ. Chineke emereghị ndị ụwa mbụ ebere. O mere ka mmiri zoo, kpuchie ụwa ahụ jupụtara na ndị na-amaghị Chineke, ka ọ bụrụ nanị Noa onye gwara ndị ọgbọ ya okwu banyere omume Chineke ka o chebere ndụ, ya na mmadụ asaa ọzọ. Ọzọ, Chineke mara obodo Sodọm na Gomora ikpe, werekwa ọkụ rechapụ obodo ahụ, ya na ndị nile bi nꞌime ya, ime ka nke a bụrụ ihe ịma atụ nye ndị na-amaghị Chineke ihe ga-abụ ọnọdụ ha mgbe Chineke ga-ekpe ha ikpe. Ma nꞌoge ọ na-emebi Sodọm na Gomora, ọ napụtara Lọt site nꞌaka ọnwụ. Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ ndị obodo ahụ na-ebi wutere nke ukwuu. Ụbọhcị nile, ehihie na abalị, ihe ọjọọ nile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, wutere mkpụrụ obi ya nke ukwuu. Nke a na-egosi na Chineke maara otu o si adọpụta mụ na gị site nꞌọnwụnwa gbara anyị gburugburu. Ọ makwaara otu o si ata ndị ọjọọ ahụhụ, tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ. Nke ka nke, Chineke maara otu o si emeso ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ rere ure nke anụ ahụ mmeso, bụ ndị ahụ jupụtara na nganga na isi ike, ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nꞌebube nke anya na-adịghị ahụ. Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ndị na-eguzo nꞌihu Onyenwe anyị, dị ike karịa mmadụ ndị a, ma ha adịghị eji ọnụ ha ekwulu mmụọ ndị a dị ike, na ndị dị ebube, nke ndị ozizi ụgha ndị a na-emeghe ọnụ ha ha ekwutọ. Ma ana m eche na ndị ozizi ụgha a bụ ndị nzuzu. Ha na-eme ihe ọ bụla ha kpebiri nꞌobi ha. Ha dị ka ụmụ anụ ọhia ndị a na-amụ nanị nꞌihi ka ndị mmadụ gbuo ha rie. Lee ka ha si ekwulu ndị dị ike ha na-aghọtaghị ihe ọ bụla banyere. A ga-alakwa ha nꞌiyi, ha na mmụọ ọjọọ nile na ike nile nke ọkụ ala mmụọ. Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị ozizi ụgha ahụ nꞌihi mmehie ha. Nꞌihi na ihe na-atọ ha ụtọ bụ nanị ibi ndụ nke imejupụta ihe ọjọọ ahụ nile na-agụ anụ ahụ ha agụụ. Ha bụ ndị na-ewetara unu ihe ihere mgbe ọ bụla ha so unu na-eri oriri ịhụnanya unu, nꞌihi na nꞌotu akụkụ, ha na-ebi ndụ ajọ omume. Ma ha na-eso unu ezukọ dị ka a ga-asị nꞌezie, na ha bụ ndị dị ọcha nꞌobi ha. O nweghị nwanyị si nꞌebe ha nọ gafee nke ha na-adịghị ele anya ọjọọ; mmehie ịkwa iko anaghị ejukwa ha afọ, nꞌihi na agụụ ime mmehie dị nꞌime ha adịghị akwụsị akwụsị. Ha maara otu ha si arafu ụmụ nwanyị ndị okwukwe ha na-esighị ike, mee ka ha soro ha mee mmehie. Ha na-azụ obi ha inwe anya ukwu. Nꞌezie, Chineke bụrụ ha ọnụ. Ha esitela nꞌezi ụzọ ahụ jehie, bụrụ ndị furu efu dị ka Belam, nwa Beoa onye chọrọ ime ihe ọjọọ nꞌihi ego ọ maara na ọ ga-enweta. Ma e mere ka Belam si nꞌụzọ ọjọọ dị otu a pụta, mgbe e mere ka inyinya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu, baara ya mba. Ndị ozizi ụgha a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọ bụla na-adịghị nꞌime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị nke na-adịghị ezo mmiri ọ bụla. Ha na-agwa ndị a ha na-eduhie okwu sị, “A zọpụtaghị unu nꞌihi ọrụ ọma unu rụrụ, ya mere ọ bụghị ihe ọjọọ ma unu gaa nꞌihu ime mmehie. Nꞌihi nzọpụta a zọpụtara unu, unu enwerela onwe unu, meenụ ihe ọ bụla dị unu mma nꞌanya.” Ma ndị ozizi a na-ezi ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi nwere onwe ha site nꞌiwu, bụ ohu mmehie na ịla nꞌiyi nꞌonwe ha. Nꞌihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọ bụla na-achị ya. *** Mgbe mmadụ sitere nꞌụzọ ọjọọ nke ụwa gbapụ, nꞌihi na ọ mụtala ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, ọ ga-abụ onye ọnọdụ ya ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na onye ahụ emesịa bido ime mmehie, nke ga-eme ka ọ ghọọ ohu mmehie. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na o nweghị oge o ji mata ihe banyere Kraịst na ụzọ ya, karịa na ọ matara ya, mụta ihe banyere ya, mesịa gbaketa iwu ahụ nile e nyere ya azụ. Ọ bụrụ na ihe dị otu a emee, a ga-eji omume onye ahụ tụnyere ilu ndị a nke kwuru sị, “Nkịta gbọchaa agbọ, ọ laghachi rachaa ihe ọ gbọrọ.” “A sachaa ezi ahụ, ya eburu onwe ya tụnye nꞌunyi.” Ndị m hụrụ nꞌanya, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu. Nꞌime ha abụọ ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ nile unu maara, nke bụ ihe nile unu mụtara site nꞌaka ndị amụma dị nsọ, na site nꞌọnụ anyị bụ ndị ozi, ndị wetaara unu okwu Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị. Ihe mbụ m chọrọ ichetara unu bụ nke a: matanụ na nꞌoge ikpeazụ ahụ ụfọdụ mmadụ ga-apụta, ndị ga-eme ihe ọjọọ ọ bụla ha nwere ike ichepụta nꞌuche ha. Ha ga-achịkwa eziokwu ahụ unu na-ekwusa ọchị. Lee ụdị ihe ha ga-agwa unu, “Jisọs ò kwere unu nkwa na ọ ga-alọghachi ọzọ? Olee kwanụ ya? O nweghị nke ọ na-abịa! Leenụ kemgbe nna nna anyị ha biri ndụ nwụọ, ihe nile dịkwa otu ha dị site na mgbe e kere ụwa. Ọ dịghị ihe mgbanwe ọ bụla dị.” Ma ndị na-ekwu ụdị okwu a kpachaara anya chefuo na Chineke onye sitere nꞌokwu ọnụ ya kee eluigwe na ụwa, bụkwa onye mere ka e jiri mmiri dị ukwuu laa ụwa mbụ ahụ nꞌiyi nꞌoge gara aga. Ọ bụ otu Chineke ahụ mere ka e sitekwa na mmiri kpụpụta ala akọrọ na ihe nile gbara ya gburugburu. *** Ọ bụkwa otu okwu ọnụ Chineke ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nꞌiyi nꞌụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị nile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nꞌiyi. Ndị m hụrụ nꞌanya, unu echefula otu okwu a, nꞌanya Chineke, ọ dịghị ihe dị iche nꞌetiti otu ụbọchị na puku ụbọchị. Ha bụ otu ihe nꞌanya ya. Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa. Ma ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwadobere ga-abịa mgbe anyị na-eleghị anya ya. Nꞌụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe nile dị nꞌeluigwe ga-agba ọkụ, laa nꞌiyi. Ụwa na ihe nile dị nꞌime ya ka ọkụ ga-erepịakwa nꞌotu ntabi anya. Ebe ọ bụ na ihe nile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nꞌiyi, ụdị ndụ dị nsọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ibi? Ụdị ndụ ezi omume dịkwa aṅaa ka anyị kwesịrị ibi mgbe anyị nọ na-ele anya ọbịbịa nke oke ụbọchị ahụ? Gbalịsiekwanụ ike isite na ndụ unu mee ka ụbọchị ahụ bịa ngwangwa, ụbọchị ahụ Chineke ga-eji ọkụ repịa eluigwe, mee ka ihe nile dị nꞌeluigwe gbazee bụrụ ihe na-agaghị adịkwa. Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ Chineke kwere, nkwa inye anyị elugwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume nanị ga-adị. Bikonụ ndị m hụrụ nꞌanya, mgbe unu nọ na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, kwerekwanụ ka unu na ndị ọzọ biri nꞌudo, ka a hapụ ịchọta ntụpọ ọ bụla nꞌime unu mgbe unu ga-eguzo nꞌihu Chineke. Chetakwanụ ihe mere Onyenwe anyị adịghị eme ngwangwa ịlọghachi. Ọ na-enye anyị ohere ime ka ndị ọzọ nata ozi ọma ahụ ga-ewetara ha nzọpụta. Nwanna anyị Pọl ejirila amamihe Chineke nyere ya dee ihe banyere okwu a nꞌọtụtụ akwụkwọ ozi ọ na-ede. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta. Ma ọ bụ nꞌụdị okwu a ka a na-ahụ ọtụtụ ndị nzuzu, ndị na-akọwa okwu ndị a dị ka ha si chepụta nꞌobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere isi, mee ka a ghọta okwu ndị a nꞌụzọ na-abụghị ụzọ Pọl onye dere ha chọrọ ka anyị ghọta ha. Nke a bụkwa ihe ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ si otu a na-ewetara onwe ha ịla nꞌiyi. *** Ụmụnna m, ana m adọ unu aka na ntị banyere ihe ndị a, ime ka unu nọọ na nche, ka a ghara isite na njehie ndị ozizi ọjọọ a duhie unu, ime ka unu si nꞌọnọdụ unu dapụ. Bụrụnụ ndị na-eto eto nꞌime mmụọ unu, bụrụkwanụ ndị na-aga nꞌihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe nile ebighị ebi. Amin. Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị ndụ site na mmalite, nke anyị nụrụ banyere ya, nke anyị jikwa anya anyị hụ, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ. Mgbe e mere ka mmadụ nile hụ ndụ ahụ anya, anyị sokwa hụ ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ, nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. Anyị na-ekwusa banyere ihe ahụ anyị hụrụ, na nke anyị nụrụ, nꞌihi na anyị chọrọ ka unu soro anyị nwee nnwekọ, bụ nnwekọ ahụ anyị na Nna na Ọkpara ya nwekọrọ. Anyị na-edere unu ihe ndị a nꞌihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke. Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nꞌaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọ bụla adịkwaghị nꞌime ya. Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nꞌezi nnwekọ ma na-ebi nꞌime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu nke Chineke adịkwaghị nꞌime anyị. Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nꞌihè, dị ka ya onwe ya si nọọ nꞌihè na-ebi ndụ ya, mgbe ahụ anyị na ibe anyị ga-enwe ezi nnwekọ. Jisọs Ọkpara Chineke ga-asachapụkwa anyị site na mmehie anyị nile. Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eme onwe anyị ndị nzuzu. Anyị na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ Chineke na-ekwu banyere ndụ anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere. Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọ bụla, anyị na-akpọ Chineke onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nꞌime anyị. Ụmụ m, ana m edere unu ihe ndị a nile ka unu si nꞌime mmehie pụta. Ọ bụrụkwanụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee mmehie, anyị nwere Jisọs Kraịst, onye na-eguzo nꞌihu Chineke, bụ Nna anyị, arịọrọ anyị arịrịọ. Jisọs Kraịst pụrụ ime nke a nꞌihi na ọ dị ọcha bụrụkwa onye na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ nꞌụzọ nile. Jisọs bụ onye ahụ hụrụ ahụhụ nꞌihi mmehie anyị si otu a mee ka anyị bụrụ ndị nwere ike ịbịakwute Chineke. Ọ bụ Kraịst mere ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị nile, na mmehie ụwa nile. Ya mere anyị nwere ike ịmata na anyị bụ ụmụ Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-edebe iwu e nyere anyị. Dị ka ọ dị, onye ọ bụla na-ekwu sị, “Abụ m onye Kraịst”, ga-eme ihe Kraịst nyere nꞌiwu. Ma onye na-akpọ onwe ya onye Kraịst ma ọ dịghị eme ihe o nyere nꞌiwu bụ onye okwu ụgha. Ma ndị ahụ na-edebe iwu Kraịst, ndị na-eme ihe ọ chọrọ ga-amụta otu e si ahụ Chineke nꞌanya. Nke a bụkwa ụzọ e si ama onye bụ onye nke Kraịst nꞌezie. Ọ bụrụ na mmadụ asị na ya bụ onye nke Kraịst, o kwesịrị ibi ndụ dị ka Kraịst si bie. Ụmụnna m ndị m hụrụ nꞌanya, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-enye unu idebe kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ unu nwere site na mbụ. Ọ bụkwa otu iwu ahụ unu maara ihe banyere ya. Ma ọ bụ iwu na-adị ọhụrụ oge nile, nke nwekwara ike ịrụrụ unu ọrụ dị ka o si rụọra Kraịst ọrụ. Oge nile anyị na-eme ihe iwu ahụ kwuru, ya bụ ịhụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, mgbe ahụ ka ọchịchịrị nile dị nꞌime anyị na-apụ, na-enye ìhè ọhụrụ nke ndụ a na-ebi nꞌime Kraịst ohere ka o nwupụta. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị na ya na-ejegharị nꞌìhè Kraịst ma ọ dịghị ahụ nwanna ya nꞌime Kraịst nꞌanya onye dị otu a nọ nꞌime ọchịchịrị. Ma onye ọ bụla na-ahụ mmadụ ibe ya nꞌanya na-ejegharị ije ya nꞌime ìhè. Onye ahụ na-ahụ ụzọ nke ọma, matakwa ebe ọ na-eje. Ọ dịkwaghị asụ ngọngọ nꞌije ya. Nꞌihi na onye ọ bụla na-akpọ nwanna nꞌime Kraịst asị na-ejegharị nꞌime ọchịchịrị. Ọ makwaghị ebe ọ na-aga nꞌihi na ọchịchịrị ahụ ekpuchiela ya anya mee ka ọ hapụ ịhụkwa ụzọ. Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nꞌihi na a gbagharala unu mmehie nile site nꞌaha Jisọs Onye nzọpụta anyị. Unu ndị okenye ka m na-edere ihe ndị a, nꞌihi na unu maara Kraịst, onye ahụ na-adị ndụ site na mbụ, mgbe ọ na-adịghị ihe e kere eke dị. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka m na-edere unu ụmụ okorọbịa, nꞌihi na unu emeriela ekwensu. Ana m edekwara unu ihe a unu ụmụntakịrị nwoke na nwanyị nꞌihi na unu anụla, kwerekwa na Chineke onye bụ Nna anyị. Ana m agwa unu ndị bụ nna maara Chineke ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi, na-agwakwa unu ụmụ okorọbịa dị ike, ndị okwu Chineke juru obi, ndị na-emeri ekwensu nꞌọgụ ọ na-alụso unu sị kwụsịnụ ịhụ ụwa ọjọọ a nꞌanya, ya na ihe nile dị nꞌụwa nke unu na-ahụ anya. Nꞌihi na onye na-ahụ ihe ndị a nꞌanya na-egosi na ọ hụghị Chineke nꞌanya. Nꞌihi na ihe ndị a nile dị nꞌụwa, ọchịchọ ọjọọ nke mmekọrịta nwoke na nwanyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ọchịchọ ọjọọ nke ịzụkọrọ ihe nile anya hụrụ, na nganga nke akụ na ụba na-eweta, esighị nꞌebe Chineke nọ abịa, kama ha si nꞌụwa ọjọọ a bịa. Anyị makwaara na ụwa ga-emesịa gabiga. Ihe ọjọọ ndị a nile kwa ga-eso ya laa nꞌiyi. Ma onye ọ bụla na-edebe ihe Chineke nyere nꞌiwu ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, ọgwụgwụ ụwa abịaruola. Unu anụla ihe banyere onye iro Kraịst ahụ na-abịa a na-akpọ onye na-emegide Kraịst. Nꞌezie, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst ejupụtala ebe nile. Nke a na-egosi anyị na ọgwụgwụ ụwa adịla nso. Ndị a na-emegide Kraịst ugbu a si nꞌọgbakọ anyị pụọ. A sị na ha bụ ndị na-eso Kraịst nꞌezie ha agaraghị esite nꞌọgbakọ anyị pụọ. Ma ha hapụrụ anyị pụọ igosi na o nweghị oge ha ji bụrụ ndị na-eso Kraịst. Ma unu adịghị ka ndị ahụ si nꞌọgbakọ anyị pụọ, nꞌihi na Mmụọ Nsọ Chineke nọ nꞌime unu. Unu amụtakwala eziokwu Chineke. Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dị ka ndị ịmụta ihe bụ ezi ozizi dị mkpa, kama ọ bụ ka m dọọ unu aka na ntị ka unu bụrụ ndị na-asa anya unu mmiri ịchọpụta ihe bụ eziokwu nꞌoge a ajọ ozizi dị. Ònye bụ onye okwu ụgha ahụ kachasị ndị okwu ụgha nile? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye iro Kraịst, onye na-emegide Kraịst. Nꞌihi na o kwereghị na Chineke ma ọ bụ na Jisọs Ọkpara ya. Ya mere, onye ọ bụla naekweghị na Kraịst enwekwaghị Chineke ma ọlị. Ma onye ahụ nwere Kraịst nwere Chineke bụ Nna. Ya mere, nọgidenụ nꞌokwukwe unu, dị ka e ziri unu site na mbụ. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu na Chineke Nna na Kraịst Ọkpara ya gaenwe ezi nnwekọ na-adịgide. Kraịst nꞌonwe ya ekwela anyị nkwa inye anyị ndụ ebighị ebi. Ana m edere unu ihe ndị a ime ka unu mara ihe banyere ndị iro ahụ na-emegide Kraịst. Nꞌihi na ha na-agbalịsi ike iduhie ndị mmadụ. Ma unu anatala Mmụọ Nsọ, onye bụ otite mmanụ ahụ Chineke tere unu. Mmụọ Nsọ ahụ na-ebigidekwa nꞌime unu mgbe nile izi unu ihe bụ eziokwu. Onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Nanị ya bụ onye ozizi na-ezi ihe bụ eziokwu oge nile. Mmụọ Nsọ na-agwakwa unu sị unu nọgide nꞌime Kraịst. Ya mere, unu esitekwala nꞌime ya pụta. Ugbu a ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, nọgidesienụ ike nꞌime Kraịst. Mgbe ọ bịara ọzọ ka obi unu bụrụ ihe kwenyesịrị ike nꞌime ya. Nꞌụzọ dị ọtu a unu agaghị abụ ndị ihere ga-eme mgbe unu hụrụ ya. Unu agaghị abụkwa ndị na-adọghachi onwe ha azụ site nꞌebe ọ nọ. Ebe anyị maara na Chineke bụ onye na-eme ihe ziri ezi anyị pụrụ ịsị na ndị nile na-eme ihe ziri ezi bụ ụmụ Chineke. Lee ka Nna anyị bi nꞌeluigwe si hụ anyị nꞌanya, nꞌihi na o sitere nꞌamara ya mee ka a kpọọ anyị ụmụ ya. Nꞌezie, anyị bụkwa ụmụ Chineke. Ma ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ amaghị Chineke ha adịghị aghọta na anyị bụ ụmụ Chineke. Ya mere, ndị enyi m, anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị dị ka ụmụ Chineke ga-abụ nꞌoge dị nꞌihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka Kraịst pụta ìhè a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nꞌihi na anyị ga-ahụ ya dị ka ọ dị. Onye ọ bụla nwere olileanya dị otu a kwesịrị idebe onwe ya nsọ, nꞌihi na Kraịst nꞌọnwe ya dị nsọ. Ma ndị ahụ na-anọgide nꞌime mmehie na-emehie megide Chineke. Nꞌihi na mmehie ọ bụla mmadụ mere bụ mmehie megide ihe Chineke naachọ. Unu maara nke ọma na e mere ka Kraịst pụta ìhè iwepụ mmehie anyị nile. O dịkwaghị mmehie ọ bụla dị nꞌime ya, ọ dịghị mgbe ọ bụla o mere ihe Chineke na-achọghị. Ya mere, ọ bụrụ na anyị anọọ Kraịst nso na-eme ihe ọ chọrọ, anyị agaghị ebi ndụ mmehie. Ma ndị ahụ na-ebi ndụ mmehie na-ebi ndụ ahụ nꞌihi na ha amaghị onye Chineke bụ. Ha abụkwaghị ndị a zọpụtara azọpụta. Ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, unu ekwela ka onye ọ bụla duhie unu. Ọ bụrụ na ị na-ebi ndụ ime ezi ihe mgbe nile ọ bụ nꞌihi na ị bụ ezi mmadụ dị ka ya onwe ya si bụrụkwa onye na-eme ezi ihe. Ma ọ bụrụ na ị na-anọgide na-ebi ndụ ime mmehie oge nile, o gosiri na ị bụ nke ekwensu. Nꞌihi na ekwensu bụ onye na-emehie site na mmalite ihe dum. Mmehie bụkwa aka ọrụ ya. Ma Jisọs Ọkpara Chineke bịara nꞌụwa ịla ike na ọrụ nile nke ekwensu nꞌiyi. Onye a mụrụ ọzọ, nke a mụbatara nꞌezinụlọ Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie. Nꞌihi na ndụ Chineke dị nꞌime ya. Ọ pụghị ịnọgide nꞌime mmehie nꞌihi na ndụ ọhụrụ dị nꞌime ya na-achị ya. Ya mere, anyị pụrụ ịkọwa onye bụ nwa Chineke na nwa ekwensu. Onye ọ bụla na-ebi ndụ ime mmehie na nke na-ahụghị nwanna ya nꞌanya esiteghị nꞌezinụlọ Chineke. Nꞌihi na bido na mmalite ihe nile okwu a gwara anyị bụ na anyị kwesịrị ịhụ mmadụ ibe anyị nꞌanya dị ka onwe anyị. A chọghị ka anyị dịrị ka Ken onye weere onye nyefee nꞌaka ekwensu. Ken gburu Ebel nwanne ya nꞌihi na ọ maara na ndụ Ebel dị mma karịa nke ya. Ya mere, ka ọ ghara iju unu anya ma ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị. Ọ bụrụ na anyị ahụ ndị Kraịst ibe anyị nꞌanya, ọ na-ezipụta na a gbapụtala anyị site nꞌọkụ ala mmụọ nye anyị ndụ ebighị ebi. Onye ọ bụla kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ nꞌime obi ya. Anyị maara na o nweghị onye na-eche echiche igbu mmadụ pụrụ inwe ndụ ebighị ebi. Jisọs egosila anyị ihe bụ ịhụ mmadụ nꞌanya, nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ. Ya mere anyị kwesịkwara ịtọgbọ ndụ anyị nꞌihi ụmụnna anyị nꞌime Kraịst. Ọ bụrụ na otu nwanna nꞌime Kraịst mkpa na-akpa bịakwutere otu onye kpọrọ onwe ya onye Kraịst nwere akụ na ụba na ihe oriri, ma nwanna nwere akụ na ụba ahụ emechie obi ya nꞌebe nwanna ahụ nọ, jụ inyere ya aka, ịhụnanya Chineke ò si aṅaa dịrị nꞌime onye dị otu a? Ndị m hụrụ nꞌanya, ka ngosi anyị na-egosi ịhụnanya anyị nꞌebe ndị ọzọ nọ ghara ịbụ nanị nꞌegbugbere ọnụ anyị na ikwu okwu efu. Kama ka anyị na-egosi ya site nꞌokwu ọnụ anyị na omume anyị. Mgbe ahụ anyị pụrụ isite nꞌomume anyị mata nꞌezie na anyị na-eme ihe Chineke chọrọ. Mgbe ahụ kwa akọnuche anyị agaghị ama anyị ikpe, ọ bụladị ma anyị guzoro nꞌihu Chineke. Nꞌihi na ọ bụrụ na akọnuche anyị ama anyị ikpe Chineke dị ukwuu karịa akọnuche anyị, ọ mazukwara ihe nile. Ndị m hụrụ nꞌanya, ọ bụrụ na akọnuche anyị amaghị anyị ikpe anyị pụrụ iji ntụkwasị obi na obi dị ọcha bịakwute Chineke nata ya ihe ọ bụla anyị na-arịọ nꞌaka ya, nꞌihi na anyị na-erube isi nꞌiwu ya, na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. Nke a bụkwa ihe Chineke na-agwa anyị ka anyị mee. Ọ bụ ikwere nꞌaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst na ịhụ mmadụ ibe anyị nꞌanya. Ndị nile na-eme ihe Chineke kwuru na-anọgidesikwa ike nꞌime ya. Chineke nꞌonwe ya na-anọgidesikwa ike nꞌime onye ahụ. Anyị maara na nke a bụ eziokwu nꞌihi na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị na-agwa anyị otu ihe ahụ. Ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, unu ekwenyela okwu nile unu nụrụ nꞌihi na mmadụ sị na ọ bụ ozi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama nwapụtanụ ma ọ bụ okwu Chineke nꞌezie. Nꞌihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha na ndị ozizi ụgha ejupụtala ebe nile. Ụzọ unu ga-esi mata ma okwu unu nụrụ o si nꞌaka Mmụọ Chineke bụ nke a, ọ̀ na-ekwupụta na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke ghọrọ mmadụ jiri anụ ahụ mmadụ bịa nꞌụwa? Ọ bụrụ na okwu ahụ kwagidere na Jisọs bịara nꞌụdị mmadụ nꞌụwa mgbe ahụ okwu ahụ bụ nke si nꞌebe Chineke nọ bịa. Ma ọ bụrụ na nkwusa ahụ asị na Jisọs esighị otu a bịa, ọ bụghị nke si nꞌebe Chineke nọ pụta. Ọ bụ nkwusa okwu ụgha ahụ, nke si nꞌebe onye iro Kraịst bịa. Unu anụla ihe banyere ọbịbịa ya. Ndị ozi ya jupụtara ụwa taa. Ma unu bụ ụmụ Chineke, ndị enyi m. Unu emeriela ndị ozizi ụgha ndị a nile. Nꞌihi na onye ahụ bi nꞌime unu dị ike karịa onye ahụ nọ nꞌụwa. Nꞌihi na ndị a nile si nꞌime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ nanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. Ma anyị bụ ụmụ Chineke, ya mere, ọ bụ nanị ndị maara Chineke ga-ege anyị ntị. Ndị ụwa agaghị ege anyị ntị nꞌihi na ha amaghị Chineke. Nke a bụkwa ụzọ anyị pụrụ isi chọpụta onye si nꞌọnụ ndị nkwusa na-ekwu okwu. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke esi nꞌọnụ ha kwuo okwu ụwa agaghị anabata ya. Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-esi nꞌebe Chineke nọ abịa. Ndị nile na-ahụ ibe ha nꞌanya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma. Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya. Nꞌihi na Chineke gosiri anyị ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya site nꞌizite Ọkpara ya ka o wetara anyị ndụ ebighị ebi site nꞌọnwụ ọ nwụrụ. Site nꞌihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ nꞌanya nꞌezie. Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke nꞌanya kama ọ bụ na Chineke nꞌonwe ya hụrụ anyị nꞌanya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi nꞌihi mmehie anyị. Ndị enyi m, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nꞌanya, anyị kwesịrị ịhụrịta onwe anyị nꞌanya. Ọ bụ ezie na o nwebeghị mgbe ọ bụla anyị ji anyạ anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nꞌanya, Chineke na-ebi nꞌime anyị. Ịhụnanya ya kwa na-eto eto nꞌime anyị. O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nꞌime anyị igosi anyị na o bi nꞌime anyị, na anyị bikwa nꞌime ya. Karịsịa, anyị ejirila anya anyị hụ Ọkpara ahụ Chineke zitere. Ugbu a anyị na-akọrọ ụwa nile na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta ụwa. Chineke bi nꞌime onye ọ bụla kweere, na nꞌime onye bụla meghere ọnụ ya kwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nꞌime Chineke. Anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya nꞌihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na nꞌihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nꞌime Chineke. Chineke nꞌonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nꞌime Kraịst, ịhụnanya anyị gaaba ụba tutuu ruo mgbe ọ ghọrọ ihe zuru oke. Mgbe ahụ ihere agaghị eme anyị nꞌụbọchị ikpe ahụ. Kama anyị ga-eji ntụkwasị obi na ọṅu guzoro nꞌihi Chineke nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ ya nꞌanya. Anyị adịghị atụ onye hụrụ anyị nꞌanya ụjọ. Ezi ịhụnanya o nwere nꞌebe anyị nọ na-ewezụga ụjọ ọ bụla anyị nwere banyere ihe ọ ga-eme anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atụ ya ụjọ, o gosiri na anyị enweghị afọ ojuju na ọ hụrụ anyị nꞌanya nꞌezie. Ma ihe pụtara ìhè bụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya nꞌihi na o buru ụzọ gosi anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị, “Ahụrụ Chineke nꞌanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ nnọọ onye ụgha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nꞌanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ̀ ga-esi aṅaa hụ Chineke nꞌanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya? Chineke nꞌọnwe ya kwuru sị, “Onye na-ahụ Chineke nꞌanya kwesịkwara ịhụ nwanna ya nꞌanya.” Ọ bụrụ na i kwere nꞌezie na Jisọs bụ Kraịst onye nzọpụta gị na Ọkpara Chineke, ị bụ nwa Chineke. Ndị nile kwa hụrụ Chineke nꞌanya naahụkwa ụmụ Chineke nꞌanya. Anyị pụrụ isite nꞌụdị ịhụnanya anyị nwere nꞌebe Chineke nọ ya na ụdị nrube isi anyị na-erubere ya mata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nꞌanya. Gịnị bụ ịhụ Chineke nꞌanya? Ọ bụ ime ihe ahụ Chineke chọrọ ka anyị mee. Idebuzukwa iwu Chineke nile adịghị enye nsogbu. Nꞌihi na nwa Chineke ọ bụla emeriala ụwa. Nke a bụkwa ụzọ mmeri ahụ si abia, site nꞌokwukwe anyị. Onye pụrụ inwe ụdi mmeri a? Ọ bụ onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke nꞌezie. Onye matakwara na Jisọs bụ Okpara Chineke nꞌihi na Chineke si nꞌeluigwe kwuo na Jisọs bụ Ọkpara ya mgbe e mere Jisọs baptizim. Chineke kwukwara okwu dị otu a nꞌoge ọnwụ Jisọs. Ee, olu esiteghị nꞌeluigwe kwuo okwu nanị nꞌoge e mere Jisọs baptizim, kama o kwuru okwu nꞌoge ọnwụ ya. Mmụọ Nsọ, onye okwu ya nile bụ eziokwu, kwukwara otu ihe ahụ. Ya mere, anyị nwere ndị akaebe atọ: Olu Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu nꞌobi anyị, na olu ahụ si nꞌelu kwuo okwu nꞌoge e mere Jisọs baptizim, na nꞌoge ọnwụ ya. Olu ndị a nile na-ekwukwa otu ihe ahụ, na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Ha atọ kwekọtara nꞌotu ihe ahụ. Nꞌụlọ ikpe anyị, anyị na-anabata ọgụgba ama ndị mmadụ dị ka eziokwu. Anyị kwesịkwara ịnabata ama Chineke gbara. Nꞌihi na Chineke kwuru na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara ya. Anyị nile kweere okwu Chineke maara na ọ bụ eziekwu. Onye na-adịghị ekwenye nꞌihe Chineke kwure banyere Jisọs Kraịst na-akpọ Chineke onye okwu ụgha. Nꞌihi na onye dị otu a ekweghị nꞌama Chineke gbara banyere Jisọs Ọkpara ya. Gịnị bụ ihe ahụ Chineke kwuru? Chineke sị na ya enyela anyị ndụ ebighị ebi. Na ndụ ebighị ebi ahụ dị nꞌime Jisọs Ọkpara ya. Onye ọ bụla nabatara Jisọs nꞌime obi ya nwere ndụ. Ma onye na-anabataghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ ahụ. Ana m edere unu akwụkwọ a unu ndị kweere nꞌỌkpara Chineke ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na Chineke ga-anụ ekpere anyị mgbe ọ bụla anyị nịọrọ ya ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ ya si dị. Ọ bụrụ na anyị maara na ọ na-ege anyị ntị mgbe ọ bụla anyị kpọkuru ya chee mkpa anyị nꞌihu ya, anyị nwere ntụkwasị obi na ọ ga-aza ekpere anyị. Ọ bụrụ na ị hụ nwanna nꞌime Kraịst ka ọ na-eme mmehie na-adịghị edube onye na-eme ya nꞌọnwụ, kpee ekpere nꞌihi ya rịọ Chineke ka ọ gbaghara ya. Chineke ga-enyekwa ya ndụ. Ọ bụ nanị mgbe ị maara na mmehie ya bụ nke na-eduba onye mere ya nꞌọnkụ ka ị ga-ahapụ ikpere ya ekpere. Ihe ọ bụla na-ezighị ezi mmadụ mere bụ mmehie nꞌihu Chineke. Ma ihe m na-ekwu nꞌebe abụghị ihe banyere ụmụ mmehie ndị mmadụ na-eme. Ana m ekwu ihe banyere mmehie ahụ na-eduba ndị mere ya nꞌọnwụ. O nweghị onye ọ bụla a gbapụtara kpọbata nꞌezinụlọ Chineke ga-anọgide na-eme mmehie, nꞌihi na Kraịst Ọkpara Chineke na-echebe ya ka onye iro ahụ bụ ekwensu hapụ imetụ ya aka. Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, matakwa na ndị nọ nꞌụwa nọ nꞌokpuru ọchịchị ekwensu. Anyị matakwara na Kraịst Ọkpara Chineke abịala inyere anyị aka ịchọta Chineke. Ugbu a anyị na-anọgide nꞌime Chineke nꞌihi na anyị nọ nꞌime Jisọs Kraịst Ọkpara ya, onye nanị ya bụ Chineke nꞌezie, na onye bụkwa ndụ ebighị ebi. Ya mere, ụmụ m ndị m hụrụ nꞌanya, wezụganụ onwe unu site nꞌihe nile ahụ ga-achọ iwere ọnọdụ ahụ Chineke nọ nꞌime unu. Ọ bụ m Jọn, onye bụ okenye a họpụtara ilekọta nzukọ Kraịst na-edere gị akwụkwọ a, gị nwanyị Chineke họpụtara, na ụmụ gị, na ndị m hụkwara nꞌanya nꞌeziokwu dị ka ndị ọzọ nꞌụlọ nzukọ Kraịst si hụ ha nꞌanya. Ebe ọ bụ na eziokwu ahụ anyị maara ga-adịgide nꞌime obi anyị ruo mgbe ebighị ebi, Chineke Nna anyị na Jisọs Kraịst Ọkpara ya gaagọzi anyị site nꞌigosi anyị obi ọma ya na inye anyị udo ya nke dị ukwuu. Ọ ga-ejikwa eziokwu ya na ịhụnanya ya gọzie anyị. Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ ụmụ gị nꞌebe a chọpụta na ha na-ebi ụdị ndụ ha kwesịrị ibi, ndụ ịgbaso eziokwu na idebe ihe Chineke nyere nꞌiwu. Achọrọ m ichetara unu nke ọma nꞌebe a, ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, iwu ahụ dị ochie Chineke nyere anyị site na mmalite. Iwu ahụ na-ekwu sị, ndị Kraịst kwesịrị ịhụrịta onwe ha nꞌanya. Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke nꞌanya anyị ga-eme ihe ọ bụla ọ gwara anyị mee. Chineke agwakwala anyị site na mmalite sị anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya. Lezienụ anya banyere ndị ozizi ụgha jupụtara nꞌụwa taa. Ọtụtụ ha nọ nꞌetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nꞌụwa nꞌoyiyi mmadụ, na o ji ụdị anụ ahụ anyị nwere bịa. Ndị dị otu a bụ ndị iro eziokwu ahụ na ndị iro Kraịst kwa. Ya mere lezienụ anya ka unu ghara iso ha ghọọ ndị na-agaghị anata ụgwọ ọrụ nke ndị nile rụrụ ezi ọrụ na-ele anya inweta. Kama rụzienụ ọrụ unu nke ọma, ka unu nwee ike ịnata ụgwọ ọrụ unu site nꞌaka Onyenwe anyị. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu esite nꞌozizi Kraịst wezuga onwe unu, unu ahapụkwala Chineke. Ma ọ bụrụ na unu anọgidesie ike nꞌozizi Kraịst, unu gaenweta Chineke nꞌonwe ya. Mgbe ahụ unu ga-enwe Chineke Nna na Ọkpara ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ekwenyeghị na Kraịst abịa izi unu ihe ọ bụla, unu akpọbatala ya nꞌụlọ unu. Unu anọkwala ya nso ige ntị nꞌihe ọ na-ekwu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ekwenyere ya, unu ga-aghọ ndị enyi ya, soro ya nꞌomume mmehie ha nile. Otu ọ dị, enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ ikwu, ma achọghị m ide ha dum nꞌakwụkwọ a, nꞌihi na ọ bụ nkwadebe m ịbịa ịhụ gị nꞌoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ, anyị ga-anọ tulee okwu ndị a nile, nweekwa oge ime onwe anyị obi ụtọ. Ụmụ nwanne gị nwanyị, onye ọzọ ahụ Chineke họpụtara, na-ekele gị. Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Jọn, onye a họpụtara ilekọta nzukọ Kraịst. Ana m edere gị ya Gaiọs, onye m hụrụ nꞌanya nꞌezie. Enyi m, ana m ekpere gị ekpere mgbe nile na-arịọ Chineke ka o mee ka ihe na-agara gị nke ọma, ka ahụ sie gị ike, dị ka ihe si agara mkpụrụ obi gị nke ọma. Ụfọdụ nꞌime ụmụnna anyị nꞌime Kraịst ndị si nꞌebe a na-agafe akọọrọla m akụkọ mere ka obi tọọ m ụtọ. Akụkọ ha kọrọ bụ akụkọ banyere otu i si ebi ndụ dị ọcha na nke eziokwu, na otu ibi ndụ gị si bụrụ dị ka okwu Chineke si chọọ. Nꞌezie, gịnị ọzọ pụrụ inye m ọṅụ karịrị nke m nwere, mgbe m nụrụ na ụmụ m na-ebi ndụ dị ka eziokwu ahụ ha mụtara si chọọ. Ezi enyi m, ọ bụ ezi ọrụ ka ị na-arụrụ Chineke site nꞌilekọta ndị ozi ya naesite nꞌebe ahụ ị nọ na-agafe. Ha akọọrọla nzukọ Kraịst nọ nꞌebe a ihe banyere mmeso ọma ịhụnanya i mesoro ha. Biko, mgbe ha si nꞌebe ahụ na-apụ, nyekwara ha aka nꞌije ha dị ka ọ ga-esi tọọ Chineke ụtọ. Nꞌihi na ndị a bụ ndị na-ejegharị na-ekwusa ozi ọma Kraịst. Ha adịghị anakwa ndị ha na-ekwusara ozi ọma ihe oriri ọ bụla, ma ọ bụ uwe, ma ọ bụ ebe ndina. Ego nke ndị na-abụghị ụmụ Chineke adịghị abanye nꞌakpa ha. Nke a mere o ji kwesị ekwesị na anyị ga-elekọta ndị dị otu a ka anyị bụrụ ndị so ha naejikọta aka nꞌotu nꞌọrụ Chineke. Edere m akwụkwọ ntakịrị zigara nzukọ ahụ banyere ihe dị otu a, ma anụrụ m na Daitrifis onye nganga ahụ na-ebuli onwe ya elu, dị ka onyendu ndị Kraịst nọ nꞌebe ahụ, anabataghị ike m nwere nꞌebe ọ nọ. Nꞌihi ya, ọ jụrụ ime ihe m kwuru. Mgbe m bịara aga m agwa gị ihe nile ọ na-eme na ọtụtụ ihe nile ọ na-ekwu megide m, na ụdị okwu ọjọọ nile ọ na-ekwu imebi aha m. Ọ bụghị nanị na ọ jụrụ ịnabata ndị ozi a, kama ọ na-egbochi ndị ọzọ chọrọ inyere ha aka ime otu ahụ. Ihe ọ na-eme bụ isite nꞌụlọ chọọchị chụpụ ndị nile na-anabata ha. Ezi enyi m m hụrụ nꞌanya, ekwela ka ụdị omume ọjọọ dị otu a bata nꞌime gị. Bụrụ onye na-agbaso ihe ziri ezi na eziokwu mgbe nile. Cheta na ndị nile na-eme ezi ihe na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ma ndị ahụ na-anọgide na-adị ndụ nꞌime mmehie na-ezipụta na ha bụ ndị dị anya site nꞌebe Chineke nọ. Ma onye ọ bụla na-ekwu ezi ihe banyere Dimitriọs. Jisọs Kraịst, onye bụ eziokwu ahụ, na-ekwu ihe ọma banyere ya. Ma mụ onwe m na-ekwu otu ihe ahụ banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka m na-agba. Enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ ikwu, ma achọghị m ide ha nꞌakwụkwọ ozi a. Nꞌihi na ọ bụ nkwadebe m ịbịa ịhụ gị nꞌoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, anyị ga-anọdụ ala kwuo ihe nile dị ka enyi na enyi ya. Ya mere, ka ihe nile dịrị tutuu anyị ezute. Ndị enyi nile nọ nꞌebe a na-ekele gị. Kelekwaara m ndị nile nọ nꞌebe ahụ ezi ekele dị iche. Ọ bụ Jud, onyeozi Jisọs Kraịst, nwanne Jemes na-edetara unu akwụkwọ a, unu nile Chineke kpọrọ, họpụta, ndị na-adị ndụ nꞌime ịhụnanya ya, na ndị nọkwa nꞌokpuru nchebe Jisọs Kraịst. Ka ebere na udo na ịhụnanya Chineke bụrụ nke unu. Ka ha mụbaakwa nꞌetiti unu. Ndị m hụrụ nꞌanya, ọ gụọla m agụụ idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nꞌotu, ma a chọpụtara m na ọ dị mkpa ugbu a ịdọ unu aka na ntị ka unu na-agbalịsị ike ichebe okwukwe ahụ Chineke nyere ndị ya, ka a ghara ịgbanwe ya. Nꞌihi na ụfọdụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-amaghị Chineke, abatala nꞌetiti anyị. Ndị na-ezi na onye Kraịst ọ bụla pụrụ ibi ụdị ndụ ọ bụla ọ chọrọ na-atụghị egwu ịta ahụhụ nke Chineke na-enye. Ha ajụla Jisọs Kraịst, Nna anyị ukwu na Onyenwe anyị. Ndị a bụkwa ndị ahụ akwụkwọ nsọ gbararị ama banyere ọmụma ikpe dị na-eche ha. Ọ bụ ezie na unu ma ihe ndị a nile, ma achọrọ m ichetara unu otu Chineke si zọpụta ụmụ Izirel site nꞌala Ijipti, na otu o si mesịa laa ndị nile na-ekweghị ekwe nꞌiyi. Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe. Chetakwanụ Sodọm na Gomora na obodo nile dị ha gburugburu. Obodo ndị ahụ jupụtara nꞌajọ omume dị iche iche, na ịkwa iko. Chineke mere ka ọkụ si nꞌelu bịa laa ha nꞌiyi, ime ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị, na ahụhụ nke ọkụ ebighị ebi, ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ, dị na-eche ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a. Ma ndị ozizi ụgha a na-aga nꞌihu na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ rụrụ arụ ha. Ha na-emerụ anụ ahụ ha, na-eji ndị nọ ha nꞌisi eme ihe ọchị. Ha na-akparịkwa mmụọ ndị ahụ dị ebube, bụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ dị ike, ndị hapụrụ ebe obibi ha. Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”. Ma ndị a na-ekwulu ihe ọ bụla ha na-aghọtaghi. Dị ka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọ bụla dị ha mma nꞌanya si otu a na-emerụ mkpụrụ obi ha. Ahụhụ ga-adịrị ha nꞌihi na ha esorola nzọ ụkwụ Ken onye gburu nwanne ya. Ha enyefeela onwe ha nꞌaka ime ụdị ihe ọjọọ ahụ Belam mere nꞌihi ego. Dị ka Kora ha enupụla isi megide Chineke sị otu a bụrụ ndị ga-anwụ nꞌihi ọbụbụ ọnụ Chineke. Mgbe ndị a sooro unu nọdụ iri oriri ịhụnanya unu ha dị ka ntụpọ ọjọọ nꞌetiti unu. Ọchị na-eju ha ọnụ mgbe ha ji nri na-afọju ọnụ ha, na-eri nri dị ka ndị ihere na-adịghị eme. Ha anaghị echekwa echiche banyere ndị ọzọ. Ha dị ka igwe ojii nke ikuku na-ebugharị, nke na-adịghị ezo mmiri. Ha na-ekwe nkwa elu na ala, ma ihe ọ bụla adịghị esi ha nꞌaka apụta. Ha dị ka osisi na-adịghị amị mkpụrụ, ọ bụladị nꞌudu mmiri. Ha bụ ndị nwụrụ anwụ, ndị e fopụrụ efopụ site na mgbọrọgwụ ha ka a kpọọ ha ọkụ. Omume ha bụ nanị ihe na-eweta ihere na mmebọ, dị ka ụfụfụ ruru unyi nke ebili mmiri na-esi nꞌosimiri ebupụta nꞌelu ala. Ha na-ejegharị na-acha zaa dị ka kpakpando, ma ahụhụ dị na-eche ha bụ itiri na ọchịchịrị nke Chineke kwadobeere ha. Nke a bụ ihe Enọk onye bụ mmadụ nke asaa na-esota Adam buru nꞌamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na nde nde ndị mmụọ ozi ya. Ọ na-abịa ikpe mmadụ nile ikpe. Ọ ga-enye ndị mmehie ezi ikpe ọmụma ruuru ha, nꞌihi mmehie ha na okwu ọjọọ nile ha kwuru megide Chineke.” Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge nile. Ọ dịghị ihe na-adị ha mma. Ha na-eme ihe ọjọọ ọ bụla ha chọrọ ime. Ha na-anya isi, na-aja ndị ọzọ, ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nꞌaka ha. Ma unu ndị enyi m, chetanụ! Chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gwara unu na mgbe ochie. Ndị ozi a gwara unu sị, “Nꞌọgwụgwụ oge ahụ, ọ dị ndị ga-abịa jiri unu na-eme ihe ọchị. Ndị a bụ ndị ọchịchọ obi ha bụ nanị ime ihe ọjọọ ọ bụla na-atọ ha ụtọ. Ha bụ ndị na-eweta nkewa na ndị ọchịchọ anụ ahụ ha na-achị. Mmụọ Nsọ ebikwaghị nꞌime ha.” Ma unu ụmụnna m, nọgidenụ naewuli onwe unu elu nꞌime mmụọ unu, nꞌelu ntọ ala ahụ anyị kweere nꞌime ya. Na-ekpenụ ekpere site nꞌike Mmụọ Nsọ. Doonụ onwe unu nꞌokpuru ịhụnanya Chineke, ebe unu ga-anọ na-eche ịnata ndụ ebighị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esite nꞌebere ya nye unu. Gosinụ ndị na-enwe obi abụọ ebere. Gbalịanụ ịzọpụta ụfọdụ dị ka a ga-asị na ọ bụ site nꞌọkụ ka unu si azọpụta ha. Ma nyekwaranụ ndị ọzọ aka ịchọta nzọpụta site nꞌigosi ha obi ebere. Kama kpachapụnụ anya ịhụ na mgbe unu na-enyere ha aka na ha adọkpụrụghị unu banye nꞌime mmehie ha. Mgbe unu na-enyere ha aka kpọọnụ ajọ omume ha nile asị. Ugbu a ana m arara unu nye nꞌaka onye ahụ pụrụ ichebe unu, ime ka unu ghara ịda, onye ahụ pụrụ ịkpọbata unu nꞌihu ya dị ebube nꞌọnọdụ enweghị ntụpọ. Ka otuto na ịma mma, na ịdị ukwuu, na ike nile, na ọchịchị nile dịrị onye ahụ nanị ya bụ Chineke, onye zọpụtara anyị site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị siterị na mgbe ochie, ka ọ dịrị ya ugbu a na mgbe nile ebighị ebi. Amin. Ihe dị nꞌakwụkwọ a bụ mkpughe banyere ihe na-aga ime nꞌoge dị nꞌihu na ndụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ Chineke nyere ya ike ka o site nꞌọhụ kpughee ya nye Jọn ohu ya. E sitere nꞌeluigwe zite mmụọ ozi bịara kọwaara Jọn ihe ọhụ ndị a ọ hụrụ pụtara. Jọn nꞌonwe ya dere ihe nile ọ hụrụ na ihe nile ọ nụrụ nꞌakwụkwọ, bụ okwu ahụ nile Chineke na Jisọs Kraịst kwuru. Ngọzi na-adịrị onye ọ bụla ga-agụpụta ihe e dere nꞌakwụkwọ amụma a nꞌụlọ nzukọ. Ọ ga-anata ngọzi pụrụ iche site nꞌaka Onyenwe anyị. Ndị nile ga-egekwa ntị mgbe a ga-agụpụta ha, ma meekwa ihe e kwuru, ga-enwetakwa ngọzi. Nꞌihi na oge a ga-emezu ihe ndị a dị oke nso. Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a nye nzukọ asaa dị nꞌobodo Tọkị. Ka amara na udo Chineke, onye ahụ dị ndụ ugbu a, na onye ga-adịgide ndụ gaa nꞌihu dịrị unu. Ka amara na-esitekwa nꞌebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nꞌihu ocheeze ya dịrị unu. Ka amara sitekwara nꞌebe Jisọs Kraịst nọ, onye sitere nꞌikwesị ntụkwasị obi ya kpughee eziokwu a nye anyị dịrị unu. Ya onwe ya bụ onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilite. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọ dị elu karịa ndị eze nile nke ụwa. Ka otuto dịrị ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya, na nꞌihi na o sitere nꞌọbara ọ wụsịrị dọpụta anyị site na mmehie anyị nile. Mgbe o chịkọtasịrị anyị kpọbata anyị nꞌalaeze ya, o mere ka anyị bụrụ ndị nchụaja Nna ya bụ Chineke. Nꞌihi na ọ na-achị ruo mgbe nile ebighị ebi. Ka anyị nye ya otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. Lezie anya! Ọ na-abịa ọsịịsọ site nꞌigwe ojii. Anya nile ga-ahụkwa ya nꞌezie. Ee, ma ndị ahụ nile kpọrọ ya ntu, ha ga-ahụ ya. Mba nile dị nꞌụwa ga-eru uju kwaa akwa, maakwa jijiji nꞌụbọchị ahụ ọ ga-abịa. Ka ọ dịrịkwa otu a. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Ihe ndị a ka Chineke kwuru, onye bụ Onyenwe anyị, na onye nwezuru ike nile. Onye dị ugbu a, na onye dịrị site na mmalite, na onye gaje ịbịa ọzọ. Ọ bụ mụ onwe m nwanne unu nwoke Jọn, onye unu na ya na-ahụrịta ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị, na-edere unu akwụkwọ a. Mụ onwe m esorola keta oke nꞌime ntachi obi Onyenwe anyị Jisọs na-enye. Anyị nile ga-esorokwa keta alaeze ya. Ma ọ bụ nꞌihi okwu Chineke ka e ji site nꞌebe ndị mmadụ bi zipụ m ka m gaa biri nꞌala Patmọs, ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu. E zigara m nꞌebe ahụ nꞌihi na m kwusara okwu Chineke ma kọwaakwa eziokwu ahụ Jisọs kpughere nye anyị. Nꞌụbọchị Onyenwe anyị, nke bụ ụbọchị Sọnde, mgbe m nọ na-ekpe ekpere, na mberede, anụrụ m oke olu tiri mkpu nꞌakụkụ m. Olu a dara ụda dị ka opi ike. Olu ahụ tiri mkpu gwa m okwu sị, “Mụ onwe m bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile.” Mgbe ahụ olu ahụ gwakwara m okwu sị, “Detuo ihe nile ị hụrụ nꞌakwụkwọ. I dechaa ya, ziga ha nye nzukọ Kraịst asaa ahụ dị nꞌala Tọkị. Ya bụ, nzụkọ dị nꞌEfesọs, na Smarna, na Pegamọs, na Tiatira, na Sadis, na Filadelfia, na Laodesia.” Mgbe m chigharịrị lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m oriọna asaa e tinyere nꞌihe na-ejide oriọna e ji ọlaedo kpụọ. Nꞌetiti oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri Jisọs, onye kpọrọ onwe ya Nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere akwa ọzọ na-acha dị ka ọlaedo e ji dụchie gburugburu ebe ahụ obi ya dị. Agịrị isi ya na-acha vaa dị ka ogho. Anya ya abụọ na-enwụkwa dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya abụọ na-enwụ enwụ dị akpụkpọ ụkwụ e hichapụrụ nke ọma. Okwu si ya nꞌọnụ na-ada wụaa wụaa dị ka ụda nnugharị ebili mmiri. O jidere kpakpando asaa nꞌaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nꞌọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dị ka anyanwụ wapụtara nꞌike ya dum. Mgbe m hụrụ ya, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya dị ka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nꞌahụ gwa m okwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Abụ m onye ahụ nwụrụ anwụ, ma na-adị ndụ. Ugbu a ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ bụ m ji igodo ọkụ ala mmụọ na ọnwụ. Atụla egwu! Detuo ihe nile ị hụrụ na nke a ga-ekpughere gị malite ugbu a. Nke a bụ ihe kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nꞌaka nri m, na oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ ị na-edegara akwụkwọ a. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nꞌonwe ha. “Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nꞌEfesọs. Ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, “Akwụkwọ a m na-edere gị bụ nke m ji ezi gị ozi onye ahụ na-ejegharị nꞌụlọ nzukọ ziri, onye ahụ ji ndị ndu ụlọ nzukọ ndị a nꞌaka ya. Leenụ ihe o kwuru. Amaara m ihe nile banyere ọrụ ọma gị nile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachi obi gị. Amaara m na ị dịghị anabata ma na-anagịde mmehie nꞌetiti ndị gị. Ị nwapụtakwala okwu nke ndị nile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nꞌezie, na-ekwu. Ị chọpụtala ekwesịghị ntụkwasị obi ha. I jirila ntachi obi hujuo anya nꞌihi m, ma ike agwụghị gị. “Ma nke a bụ ihe m nwere megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere nꞌebe m bọ. Ị hụkwaghị m nꞌanya dị ka i hụrụ m na mmalite. Chee echiche nke ọma banyere ịhụnanya i nwere nꞌebe m nọ na mmalite, ma laghachi azụ nꞌime ya. Malite ịrụsị ọrụ ike dị ka i mere na mmalite. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịakwute gị wepụ oriọna nọchiri anya gị nꞌebe ọ dị nꞌetiti oriọna ndị ọzọ. “Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dị ka mụ onwe m si kpọọ ya asị. “Onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Onyenwe anyị kwesịrị ime ka ozi a baa ya nꞌime ntị. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye mkpụrụ mbụ sitere nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, nke bụ ebe izuike nke Chineke. “Degara mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smarna akwụkwọ a. Ozi dị nꞌakwụkwọ a sitere nꞌaka onye ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Onye nwụrụ anwụ ma na-adịkwa ndụ ọzọ. “Amaara m ụzọ nile i si taa ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị. Ọzọ kwa, amaara m ihe banyere ndọgbu i na-adọgbu onwe gị nꞌọrụ, na ọnọdụ ogbenye gị. Ma nꞌezie, i nwere akụ dị ukwuu nꞌeluigwe. Amaara m ihe banyere nkwutọ nile ndị na-emegide gị na-ekwutọ gị, nkwutọ nke ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Juu, na ụmụ Chineke, ndị na-abụghị ụmụ Chineke, kama ha bụ ndị na-akwagide ọrụ ekwensu. Atụkwala egwu nꞌihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nꞌime ndị gị nꞌụlọ mkpọrọ ka o jiri ya nwaa gị. A ga-akpagbu gị abalị iri. Ma guzosie ike, ọ bụladị mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, aga m enye gị okpu nke ndụ ahụ. Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ nke Onyenwe anyị. Ọnwụ nke ugbo abụọ agaghị emekpa onye ọ bụla na-emeri emeri ahụ. “Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Pegamọs sị ya, “Nke a bụ ozi si nꞌọnụ onye ahụ jidere mma agha ukwu ahụ nwere ihu abụọ ahụ nꞌaka ya. Amaara m nke ọma na i bi nꞌime obodo ebe ekwensu wukwasịrị ocheeze ya. Ọ bụkwa eziokwu na ekwensu gbara ofufe gị gburugburu. Ma ị na-anọgidesị ike nꞌime m. Ị jụrụ ịgọnarị m ọ bụladị nꞌoge Antipas ohu m ahụ kwesịrị ntụkwasị obi tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi m site nꞌaka ndị na-ejere ekwensu ozi. “Ma e wezụga ezi ama ndị a, enwere m ihe ụfọdụ megide gị. Ị na-akwagide ụfọdụ nꞌetiti ndị m bụ ndị na-eme omume dị ka Belam, onye ziri Balak otu ọ ga-esi merụọ ụmụ Izirel site nꞌiduba ha na mmehie ịkwa iko na oriri mmemme dị iche iche a na-emere arụsị. Nꞌezie, ụfọdụ nꞌime ndị gị na-ejidesi ozizi ọjọọ a aka ike. Ndị dị otu a bụ ndị na-eso ụzọ Belam nꞌetiti ndị gị. Ma ọ bụrụ na i chigharịghị site nꞌechiche na omume ọjọọ gị, aga m abịakwute gị na meberede jiri mma agha dị m nꞌọnụ tigbuo gị. “Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Kraịst. Ọ bụ nanị ndị na-emeri emeri ga-eri achịcha ahụ e zoro ezo, nke bụ ihe oriri ndị nọ nꞌeluige. Ha nile nꞌotu nꞌotu ka m ga-enye ezi nkume ọcha ahụ. A ga-edekwasị aha ọhụrụ nꞌelu nkume ahụ, nke onye ọ bụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ ga-anata ya. “Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira. Nke a bụ ozi sitere nꞌaka Ọkpara Chineke onye anya ya na-enwụba nꞌebe nile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka akpụkpọ ụkwụ e hichara nke ọma. “Nke a bụ ihe o kwuru. Amaara m ezi ọrụ gị nile, tinyere obi ebere i nwere nꞌebe ndị ogbenye nọ. Ahụkwara m onyinye ọma ị na-enye ha, na ije ozi ị na-ejere ha. E wezụga ihe ndị a, amaara m ịhụnanya gị, na okwukwe gị, na ntachi obi gị. Ahụkwara m ịnụ ọkụ nke obi gị, na ezi ọchịchọ dị nꞌime gị imezu ha. “Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezibel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị, onye na-akụziri ndị m na mmehie ịkwa iko bụ ihe ziri ezi. Ọ na-akwagide ha ka ha na-akwa iko, na-akụzikwara ha ka ha na-eri ihe a chụrụ nꞌịta nye arụsị. Enyela m nwanyị a oge kwesịrị ka o site nꞌechiche ọjọọ ya na omume amaghị Chineke ya pụta chegharịa. Ma o sitela na mpako nke obi ya hapụ ichegharị. Ugbu a gee ntị nꞌihe m chọrọ ikwu. Aga m etinye ya nꞌute ọrịa ebe ọ ga-anọ nꞌọrịa taa ahụhụ. Ịta ahụhụ a ga-adịkwara ya na ndị nile na-eso ụzọ ịkwa iko ya. Ọ bụrụ na ha echegharịghị site nꞌụzọ ọjọọ ha, ihe ndị a ga-abịakwasị ha. Ma nꞌebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ nile ga-amata na abụ m onye na-ahụzu echiche na ọchịchọ obi ụmụ mmadụ. Onye ọ bụla ga-anatakwa ụgwọ ọrụ kwesịrị ya. “Ma ndị nile fọdụrụ na nzukọ dị na Tiatira, ndị na-esoghị ozizi ụgha ahụ, o nweghị ihe ọzọ m chọrọ site nꞌaka unu. Kama, jidesienụ ihe ahụ dị nꞌaka unu aka ike tutuu ruo mgbe m ga-abịaghachi ọzọ. “Ma onye ọ bụla nọgidere na-eme ihe m chọrọ ruo ọgwụgwụ ihe nile, ka m ga-enye ike nꞌebe mba nile nọ. Unu ga-ejikwa mkpa nꞌaka igwe chịa ha, ọ bụladị dị ka Nna m si nye m ike ịchị ha. A ga-etiwasị ha dị ka ite aja e tiwasịrị nꞌala mee ka ọ dawasịa. Mụ onwe m ga-enyekwa ha kpakpando ụtụtụ. “Ya mere, ka ndị nile chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ ya. “Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis. Ọ bụkwa ozi a ka a na-ezi gị site nꞌaka onye ahụ nwe mmụọ asaa ahụ na kpakpando asaa ahụ. Amaara m ihe banyere ama ahụ a na-agbara gị na ị bụ nzukọ dị ezi ndụ, na nzukọ dị ike nke ukwuu, ma nꞌeziokwu ị bụ nzukọ nwụrụ anwụ. Ugbu a, si nꞌụra bilite! Mee ka ihe ntakịrị fọdụrụ dịrị ike. Nꞌihi na ọ bụladị ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ. Ọrụ gị nile etozughị oke dị ka ihe Chineke chọrọ ka i mee si dị. Ugbu a, laghachi mee ihe nile ahụ ị nụrụ na nke i kwenyere mgbe ị malitere na mbụ. Jidesie ya aka ike ma chigharịkwute m site nꞌụzọ ọjọọ gị nile. Ọ bụrụ na i meghị otu a, lee, aga m abịakwute gị na mberede dị ka onye ohi, taa gị ahụhụ dị ukwuu. “Ee, ọ bụladị otu a, ụfọdụ mmadụ nꞌime nzukọ gị emerụbeghị onwe ha site na njehie ụwa. Nꞌihi nke a, ha ga-esoro m jee ije nꞌime uwe ọcha ahụ, nꞌihi na ha kwesịrị ịnata nkwụghachi ziri ezi dị otu a. Onye ọ bụla na-emeri emeri ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dị otu a. Agaghị m ehichapụ aha ha nꞌakwụkwọ ndụ ahụ. Aga m ekwupụtakwa na ha bụ ndị m nꞌihu Nna m na nꞌihu ndị mmụọ ozi nile. “Nꞌihi nke a, ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ ya nile. “Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Filadelfia. Nke a bụ ozi e ziri gị site nꞌaka onye ahụ dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji igodi Devidi, nke o ji emeghepụ ihe onye ọ bụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọ bụla na-apụghị imeghe. “Amaara m gị nke ọma dị ka onye na-adịghị ike ma ọlị. Ma i jisịrị ike na-enye m nsọpụrụ. Ị gọnarịkwaghị aha m. Nꞌihi nke a, emegheelara m gị ụzọ nke onye ọ bụla na-apụghị imechi. “Achọrọ m ka ị mata na aga m eme ka ndị ahụ na-akwagide ụzọ ekwensu ma na-asị na ha bụ ndị dị nsọ mata na mụ onwe m họpụtara gị nye onwe m. Ha ga-abịa kpọọ isi ala nye m, kwupụta na ha aghọtala na ọ bụ gị ka m hụrụ nꞌanya. “Nꞌime nsogbu ndị a ha na-enye gị nꞌihi aha m, i sitela na ntachi obi sọpụrụ okwu m nile. Nꞌihi nke a, aga m ekpuchi gị site nꞌoke mkpagbu ahụ, ya na oke ọnwụnwa ahụ ga-abịakwasị ụwa. Ihe ndị a bụ ihe ga-anwapụta okwukwe ndị ga-adị ndụ. Ma mata nke a, na ana m abịa ọsịịsọ. Jidesiekwa okwukwe nta ahụ i nwere aka ike, ka onye ọ bụla ghara ịnapụ gị okpu eze ahụ a kwadobere inye gị. “Ma onye ọ bụla na-emeri emeri ka m ga-eme ka ọ bụrụ onyeisi nꞌime ụlọ nsọ Chineke m. A ga-ekpuchi ya nke ọma nꞌụzọ zuru oke. Ọ gaghị apụkwa apụ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nꞌahụ ya. Ọ ga-ebikwa nꞌime obodo nsọ Chineke m, nke bụ obodo Jerusalem ọhụrụ ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nꞌihu ya. “Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-ekwuru ụlọ nzukọ ya. “Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Laodisia. Ọzi a sitere nꞌaka onye ahụ a na-apụghị iwezụga nꞌọnọdụ ya. Ọ bụkwa onye àma kwesịrị ntụkwasị obi banyere ihe nile dị ugbu a, na nke dịrị na mgbe ochie, na nke gaje ịdị ruo mgbe ebighị ebi. Ya onwe ya bụkwa onye kachasị ihe nile elu, bụrụkwa isi mmalite ihe nile Chineke kere. “Amaara m gị nke ọma, na ị naghị ekpo ọkụ, ị jụkwaghị oyi. Ọ gaara adị m nnọọ mma ma asị na ị na-ekpo ọkụ ma ọ bụkwanụ na ị na-ajụ oyi. Nꞌihi nke a, ebe ị na-ajụghị oyi, i kpokwaghị ọkụ, ihe ị dị bụ naranara. Nꞌihi ya, aga m esi nꞌọnụ gbụpụ gi. “Nꞌihi na ị na-asị, ‘Abụ m ọgaranya, nwezuo ihe nile. Mkpa ihe ọ bụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ nꞌihe banyere ndụ ime mmụọ gị. Ị bụ onye e kwesịrị imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ. “A sị na ị maara ihe ị gaara achọsi ike ịzuta ezigbo, ọlaedo nꞌaka m. Bụ ọlaedo a nụchara anụcha nꞌime ọkụ. Mgbe ahụ ị ga-abụkwa ọgaranya nꞌezie. Ị gaara esitekwa nꞌaka zụta ezi akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ị gaara abịakwute m ka m nye gị ezi ọgwụ ga-agwọ ọrịa anya gị, ka i bido ịhụ ụzọ nke ọma. Onye ọ bụla m hụrụ nꞌanya ka m na-ezi ihe site nꞌịta ya ahụhụ. Nꞌihi nke a, aghaghị m ịta gị ahụhụ pụrụ iche ma ọ bụrụ na i chegharịghị site nꞌọrụ ọjọọ gị na enweghị nghọta dị nꞌime gị bụrụ onye nwere ịnụ ọkụ nꞌobi nꞌihe Chineke. “Lee, ana m eguzo ugbu a nꞌọnụ ụzọ obi gị na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ olu m mgbe m na-akpọ oku meghepụrụ m ụzọ, aga m abata bịakwute ya, sorokwa ya nwekọọ ihe. Ya onwe ya ga-esorokwa m nwekọọ ihe. Onye ọ bụla na-emeri emeri ka mụ na ya ga-anọkọ nꞌocheeze m. Ọ bụladị dị ka m si soro Nna m nọdụ nꞌocheeze ya mgbe m meriri. Ka ndị nile chọrọ ịnụ ihe gee nti nꞌihe Mmụọ Nsọ kwuru nye nzukọ Onyenwe anyị.” Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m elu hụ ọnụ ụzọ eluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ụda ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa nꞌebe a ka m gosi gị ihe gaje ime nꞌoge dị nꞌihu.” Mgbe ahụ, e mere ka m baa nꞌeluigwe nꞌime mmụọ m. Nꞌeluigwe, ahụrụ m ebube na ịma mma ya, hụkwa otu ocheeze na onye na-anọkwasị nꞌelu ya. Ìhè dị ukwuu, nke na-egbu nweghenweghe dị ka mkpụrụ mmiri si nꞌahụ onye ahụ nọkwasịrị nꞌocheeze ahụ na-achapụta. Eke na egwurugwu, nke na-egbukwa amụma, gbara ocheeze ahụ gburugburu. Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, ndị dị nta, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nꞌocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpu eze e ji ọlaedo kpụọ nꞌisi ha. Mgbe ahụ ụda yiri ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke egbuke sitere nꞌocheeze ukwu ahụ na-ada ma na-achapụtakwa. Nꞌihu ocheeze ukwu ahụ e nwere oriọna asaa na-enwụ ọkụ. Oriọna ndị a nọchiri ọnọdụ mmụọ asaa Chineke. Ala dị nꞌihu ocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dị ka ebe a tụsara enyo e hichaziri nke ọma. Nꞌetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ocheeze ahụ e nwere ihe e kere dị ndụ anọ dị ya. Ha nwere anya nꞌakụkụ ahụ ha nile, ihu na azụ. Otu nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere oyiyi dị ka ọdụm. Nke abụọ dị ka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dị dị ka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe. Nke ọ bụla nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere nku isii. Nku dị nꞌetiti nku ndị a nwere anyị hiri nne. Ehihie nile na abalị nile ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile dị. Bụ onye ahụ dịrị nꞌoge gara aga, onye dị ugbu a, na onye ga-adị ruo mgbe nile ebighị ebi.” Mgbe ihe e kere eke anọ ndị ahụ malitere inye onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi otuto nile, na nsọpụrụ nile, na ekele nile, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nꞌala nꞌihu ya na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adịgide ruo mgbe nile ebighị ebi. Ha nile nꞌotu nꞌotu na-atụda okpu eze ha nꞌihu ya na-abụ abụ na-asị, “Ọ bụ nanị gị Onyenwe anyị na Chineke anyị kwesịrị ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nꞌihi na ọ bụ gị kere ihe nile, ọ bụkwa site nꞌọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.” Emesịa, ahụrụ m akwụkwọ a pịakọtara apịakọta nke e dererị ihe nꞌime ya. Ọ dị nꞌaka onye ahụ nọkwasịrị nꞌelu ocheeze ahụ. A nyachikwara akwụkwọ a ụzọ asaa, kaakwa ya akara nꞌebe nile a nyachiri ya. Otu mmụọ ozi dị oke ebube pụtara tie mkpu, na-ajụ ajụjụ na-asị, “Ọ̀ bụ onye nwere ike ịnyakapụ akara e jiri kechie akwụkwọ a a pịakọtara apịakọta?” Ma ọ dịghị onye ọ bụla e nyere ike imeghepụ akwụkwọ ahụ nꞌime eluigwe ma ọ bụ nꞌime ụwa, ma ọ bụ site nꞌokpuru ụwa. O nweghị onye e nyere ike ịgụpụta ihe e dere nꞌime akwụkwọ ahụ. Nꞌihi na o nweghị onye nwere ike meghee ya, ma ọ bụ gụpụta ihe e dere nꞌime akwụkwọ ahụ, akwara m akwa. Ma otu onye nꞌime iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, nke nọkwasịrị nꞌocheeze nta ndị ahụ gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu gwara m okwu sị m, “Akwala akwa ọzọ. Lee ugbu a, Ọdụm ahụ si nꞌagbụrụ ndị Juda, nꞌime ezinụlọ Devidi, emeriela ndị iro ya nile. O gosila onwe ya dị ka onye nwere ike ịnyakapụ akara asaa ahụ dị nꞌakwụkwọ ahụ.” Mgbe m lere anya, ahụrụ m otu Nwa atụrụ ka o guzo nꞌihu iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, nꞌihu ocheeze ukwu ahụ, na nꞌihu ihe e kere eke anọ ahụ. Nwa atụrụ ahụ nwekwara apa dị iche nꞌahụ ya, bụ nke mere ka ọ nwụọ nꞌoge ọ nwụrụ. O nwekwara mpi asaa na anya asaa nke nọ ọnọdụ mmụọ asaa nke Chineke, nke a na-ezipụ ịga nꞌebe dị iche iche nꞌime ụwa. Nwa atụrụ a gara nꞌihu nke nta, nara akwụkwọ ahụ site nꞌaka nri onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ. Mgbe Nwa atụrụ ahụ naara akwụkwọ ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ndị gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu dara nꞌala nꞌihu Nwa atụrụ ahụ. Ha nile nꞌotu nꞌotu jikwa opi na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe na-esi isi ụtọ jupụtara nꞌime ha. Ihe na-esi isi ụtọ a bụkwa ekpere ndị nsọ. Ha bụkuru Nwa atụrụ ahụ abụ ọhụrụ na-asị, “Nanị gị kwesịrị ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara dị ya nꞌahụ. Nꞌihi na e gburu gị, ma i sitere nꞌọnwụ gị kpọtara Chineke ndị mmadụ, ndị si nꞌagbụrụ nile, na asụsụ nile, na ndị dị iche iche, na mba nile. Ị chịkọtaala ha mee ha otu alaeze, na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nꞌụwa.” Nꞌime ọhụ m, anụrụ m olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị gbara ocheeze ahụ na ndị okenye ahụ nile gburugburu, ka ha na-abụ abụ na-asị, “Nwa atụrụ ahụ e gburu kwesịrị ịnara ike nile, na akụ nile, na amamihe, na ume, na nsọpụrụ nile, na otuto nile na ngọzi nile!” Mgbe ahụ anụrụ m ka ndị nile nọ nꞌeluigwe na ndị nọ nꞌụwa na ndị nọ nꞌokpuru ụwa, na ndị nọ nꞌokpuru oke osimiri na-eti mkpu na-asị, “Ka ngọzi nile, na nsọpụrụ nile, na otuto nile, na ike nile dịrị Onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ, ha dịkwara Nwa atụrụ ahụ ruo mgbe ebighị ebi!” Ihe e kere eke anọ ndị ahụ zakwara sị “Amin!” Iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dakwara nꞌala nꞌihu ya kpọọ isi ala nye ya. Mgbe m nọ na-elegide ya anya, Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke mbụ dị nꞌakwụkwọ ahụ. Otu nꞌime ihe e kere eke anọ ahụ tiri mkpu dị ka a ga-asị na ọ bụ olu egbe eluigwe dara, gwa m okwu sị m, “Bịa”. Mgbe m lere anya nꞌihu m, ahụrụ m inyinya dị ọcha. Onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ya ji ụta nꞌaka ya. A tụkwasịkwara okpu eze nꞌisi ya. Ọ bụkwa nꞌebe nile ka ọ na-ejegharị ibu agha na imeri emeri. Emesịa, Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke abụọ dị nꞌakwụkwọ ahụ. Ngwangwa, anụrụ m ka ihe e kere eke nke abụọ tiri mkpu sị m, “Bịa”. Nꞌoge a, inyinya ahụ na-acha ọbara ọbara gbapụtara. E nyere onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ya mma agha dị ogologo nyekwa ya ike ime ka udo hapụ ịdịkwa nꞌụwa. E nyekwara ya ike iwebata ọchịchị nke ndị na-emegide emegie nꞌime ụwa. Mgbe ahụ ibu agha dị iche iche na igbu mmadụ jupụtara nꞌebe nile. Ma mgbe Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke atọ ahụ, anụrụ m olu nke ihe e kere eke nke atọ ka ọ na-akpọ m sị, “Bịa”. Ahụrụ m inyinya dị ojii. Onye na-anọkwasị nꞌelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nꞌaka ya. Mgbe ahụ otu olu dara site nꞌetiti ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ sị, “Otu ogbe achịcha ka a na-ere naịra abụọ. Ma ka onye ọ bụla hapụ imebi mmanya na mmanụ”. Mgbe a nyakapụrụ akara nke anọ ahụ, anụrụ m ka ihe e kere eke nke anọ ahụ gwara m okwu sị, “Bịa”. Ahụrụ m inyinya na-adịghị ezi ọcha. Aha onye na-anọkwasị ya nꞌelu bụ ọnwụ, Inyinya ọzọ nke onye ọzọ a na-akpọ ọkụ ala mmụọ nọkwasịrị na-esokwa ya nꞌazụ. E kere ụwa ụzọ anọ, nyefee ha otu ụzọ nꞌaka, ka ha jiri ọnwụ na ọrịa na anụ ọhia gbuchapụ ndị nile bi nꞌime ha. Ma mgbe a nyakapụrụ akara nke ise, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja. Nꞌokpuru ebe ịchụ aja ahụ ka m hụrụ mkpụrụ obi ndị nile nwụrụ anwụ nꞌihi ozi ọma nke Chineke na nꞌihi na ha guzosịrị ike ịgba ama nke eziokwu na nke ndụ zuru oke. Ha nile nọ na-eti oke mkpu na-akpọku Onyenwe anyị na-asị ya, “Gị Onyenwe anyị, Onyenwe ihe nile, Onye dị nsọ na Onye eziokwu, ọ̀ bu ruo ole mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nꞌime ya ikpe nꞌihi ajọ omume ha mesoro anyị? Ọ̀ bụ ruo ole mgbe ka ị na-eche ịbọrọ anyị ọbọ nꞌihi ọbara anyị ndị nile bi nꞌime ụwa wufuru?” Nꞌotu oge ahụ, e yikwasịrị ha uwe dị ọcha nꞌotu nꞌotu. A gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge, tutuu ruo mgbe ụmụnna ha a ga-egbu nꞌihi ozi ọma Jisọs Kraịst ga-abịa soro ha dịkọọ ndụ ọzọ. Anọkwa m na-ele anya mgbe Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dị ka ọbara. Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nꞌala dị ka mkpụrụ osisi na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efe. Otu a, mbara eluigwe ahụ nke kpakpando jupụtara adịkwaghị, dị ka a ga-asị na a pịakọtara ya dị ka ute, wepụ ya. Ugwu nta nile na ugwu ukwu nile, na agwa etiti nile makwara jijiji, site nꞌọnọdụ ha wezuga onwe ha. Ndị eze nile nke ụwa na ndị nọ nꞌọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nꞌọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ nile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha nile gara zoo onwe ha nꞌime ọgba nkume na nꞌokpuru ugwu, na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị ha, “Dakwasịnụ anyị, zoo anyị ka onye ahụ nọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ hapụ ịhụ anyị, ka iwe nke Nwa atụrụ ahụ hapụ ịbịakwasị anyị. Nꞌihi na, lee oke ụbọchị iwe ha abịala, onye pụrụ ịgbanarị ya?” Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nꞌakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọ bụla ghara ife nꞌelu ala, na nꞌelu osimiri, na nꞌelu osisi. Mgbe ahụ ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nꞌọwụwa anyanwụ na-apụta. Akara Chineke dị ndụ dịkwa nꞌaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri na ihe nile dị nꞌime ha, sị ha, “Cherenụ! Unu emekwala ihe ọ bụla ugbu a. Unu emekwala ihe ọjọọ nꞌụwa ma ọ bụ nꞌoke osimiri ma ọ bụ nꞌosisi ọ bụla, tutuu ruo mgbe anyị ga-akakwasị ndị nile na-ejere Chineke ozi akara Chineke nꞌegedege ihu ha.” Mgbe a kasịrị ha akara ndị a, anụrụ m ọnụ ọgụgụ ndị natara akara ahụ. Ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ. E sitere nꞌebo iri na abụọ nke ndị Izirel họpụta ha. Ndị sitere nꞌebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nꞌebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ. Puku mmadụ iri na abụọ sikwa nꞌebo Gad. E sitekwara nꞌebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nꞌebo Naftali dị puku mmadụ iri na abụọ. Ọ bụkwa puku mmadụ iri na abụọ ka e si nꞌebo Manase họpụta. Ndị si nꞌebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ. Otu a kwa a họpụtara puku mmadụ iri na abụọ site nꞌebo Livayị. Ndị si nꞌebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ. Ọ bụkwa puku mmadụ iri na abụọ ka e si nꞌebo Zebulọn họpụta. Puku mmadụ iri na abụọ si nꞌebo Josef. Ndị sikwa nꞌebo Benjamin pụta dị puku mmadụ iri na abụọ. *** *** *** *** Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nꞌọnụ ọgụgụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche, na asụsụ dị iche iche. Ha guzo nꞌihu ocheeze ahụ na nꞌihu Nwa atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe dị ọcha, jirikwa igu nkwụ nꞌaka ha. Ha nile nọ na-eti mkpu nke ukwuu na-asị, “Nzọpụta na-abịa site nꞌaka Chineke anyị onye nọ nꞌelu ocheeze ya. Ọ na-abịakwa site nꞌaka Nwa atụrụ ahụ.” Mgbe ihe ndị a na-eme, ndị mmụọ ozi nile bịara nso ocheeze ahụ na-agba ya gburugburu, na-agbakwa ocheeze ndị okenye ahụ gburugburu na ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ. Ndị mmụọ ozi ndị a nile na-akpọkwa isi ala nꞌihu Onye ahụ nọ nꞌocheeze ahụ. Ha na-efekwa Chineke ofufe, na-asị, “Amin! Ngọzi na amamihe nile na ekele nile na nkwanye ugwu nile, na ike nile, na ebube nile dịrị Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.” Mgbe ahụ, otu nꞌime iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ jụrụ m ajụjụ sị m, “Ị maara ndị ndị a bụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ? Ebee ka ha siri pụta?” Azara m sị ya, “Amaghị m, Onyenwe m, biko kọwaara m ndị ha bụ”. Ọ zara m sị m, “Ndị a bụ ndị sitere nꞌime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nꞌọbara Nwa atụrụ ahụ. Ọ bụ nke a mere ha ji guzoro nꞌihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nꞌime ụlọ nsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha, mee ka agụụ ghara ịgụ ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọ bụla. A ga-eche ha nche ka okpomọkụ ọ bụla ghara irute ebe ha nọ. Anyanwụ agaghị amakwasịkwa ha ọzọ. Nꞌihi na Nwa atụrụ ahụ guzo nꞌihu ocheeze ahụ ga-azụ ha dị ka atụrụ. Ọ ga-edurukwa ha jee nꞌisi mmiri nke ndụ ahụ. Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla site nꞌanya ha.” Mgbe Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke asaa ahụ, akụkụ nile nke eluigwe dara jụụ ruo ihe dị ka iri nkeji atọ. Ọ dịkwaghị mkpọtụ ọ bụla dị site nꞌihe ọ bụla Chineke kere. Nꞌoge na-adịghị anya, ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nꞌihu Chineke. E nyere ha opi ike nꞌotu nꞌotu. Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nꞌakụkụ ebe ịchụ aja. E nyere ya ihe ịchụ aja na-esi isi ụtọ nke ọ ga-eji gwakọta ya na ekpere ụmụ Chineke, were ya chụọ aja nꞌihu Chineke nꞌebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo nke dị nꞌihu ocheeze Chineke. Mgbe ahụ, isisi ụtọ nke ihe ahụ a chụrụ nꞌebe ịchụ aja ahụ, ya na ekpere ahụ ụmụ Chineke kpere, sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ mmụọ ozi ahụ jiri ya chụọ aja rigoro elu ruo nꞌebe Chineke nọ. Mgbe ahụ kwa mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ tinye ya nꞌime ite igwe ntakịrị ahụ o ji chụọ aja, tụda ya, ka ọ danye nꞌime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nꞌụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe nile nꞌụwa. Mgbe ahụ mmụọ ozi asaa ahụ jikeere onwe ha ịfụ opi ike ahụ. Mgbe mmụọ nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara nkume ọkụ na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nꞌime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ụwa nwuru ọkụ. Ihe nile dị nꞌime ya rechapụrụ ọkụ. E mere ka osisi ọhịa na ahịhịa nile rechapụ ọkụ. Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụkwara opi ike ya, a tụdara ihe yiri ugwu dị ukwuu na-enwụ ọkụ nꞌime osimiri. Nke a mere ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere osimiri nile chagharịa ghọọ ọbara. Ọzọ kwa, otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ụgbọ mmiri nile dị nꞌelu osimiri lara nꞌiyi. Otu a kwa e mekwara ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke azụ nile dị nꞌime osimiri nwụọ. Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu sitere na mbara eluigwe danye nꞌime otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere iyi nile na isi iyi nile, ebe ndị mmadụ si ekute mmiri ha na-aṅụ. Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Nꞌihi na o mere ka ihe ilu bịakwasị otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke iyi nile na isi iyi nile, mee ka ọtụtụ mmadụ nwụọ nꞌihi akpịrị ịkpọ nkụ. Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere kpakpando nile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nꞌuju dị ka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị. Mgbe m nọ na-ele ihe ndị a anya, ahụrụ m otu ugo buru ibu ka ọ na-efegharị na mbara eluigwe na-eti mkpu na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ nile bi nꞌụwa nꞌihi ihe ọjọọ dị iche iche gaje ịbịakwasị ha mgbe ndị mmụọ ozi atọ fọdụrụ fụrụ opi ike ha.” Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu onye si nꞌeluigwe daa nꞌala. E nyere ya ihe ntụghe ụzọ nke e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ. Mgbe o meghere olulu ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwuu sitere nꞌime ya pụta, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ. Iku ụme adịkwaghị mfe nye mmadụ ọ bụla nꞌihi anwụrụ ọkụ ahụ. Nꞌotu oge ahụ, e mere ka igurube dị ukwuu, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ site nꞌime anwụrụ ọkụ ahụ pụta. Igurube ndi a jupụtara ebe nile nꞌụwa. E nyekwara ha ike ịgba mmadụ ọ bụla dị ka akpị. E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọ bụla, ma ọ bụ osisi na ihe ọ bụla a kụrụ nꞌala, dị ka ihe ubi. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọ bụla na-enweghị akara Chineke nꞌegedege ihu ya. Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị mmadụ kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Ndị ha gbara ga-anọkwa nꞌime ahụ ụfụ na nhụju anya dị ka ndị akpị gbara. Nꞌime ụbọchị ndị ahụ ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nꞌebe ha nọ wezụga onwe ya. Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka inyinya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpu eze e ji ọlaedo kpụọ nꞌisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. Agịrị isi ha dị ogologo dị ka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze dị ha nꞌọnụ dịkwa ka eze ọdụm. Ha yikwasịrị onwe ha ihe mgbochi obi e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ a na-anụ mgbe ụsụ ndị agha na-aga ibu agha. Ha nwere ọdụdụ na-agba agba dị ka akpị. Ma ike nile e nyere ha imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise dị nꞌọdụdụ ha. Onye ahụ na-achịkọta ha bụ eze olulu ahụ omimi ya na-enweghị nsọtụ. Aha ya nꞌasụsụ Hiburu bụ Abadọn. Nꞌasụsụ Griik a na-akpọ ya Apọliọn. (Ma nꞌasụsụ Igbọ a ga-akpọ ya Onye mmebi.) Nꞌebe a ka ihe m buru ụzọ hụ jedebere. Kama e nwekwara ụzọ ihe abụọ na-abịa, nke na-aghaghị imezu. Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nꞌebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nꞌihu ocheeze Chineke, gwa mmụọ ozi nke isii ahụ okwu sị, “Tọpụ mmụọ ọjọọ anọ ndị ahụ e kere agbụ nꞌebe osimiri Yufretis dị.” A kwadebere ha ka ha jikere onwe ha nye afọ ahụ na ọnwa ahụ na ụbọchị ahụ, na oge ahụ a kara aka. A tọpụrụ ha ka ha gaa gbuo otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke mmadụ nile bi nꞌụwa. Mmụọ ọjọọ ndị ahụ du ndị agha ha ọnụ ọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị. Nꞌime ọhụ m, ahụrụ m inyinya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nꞌelu. Ndị nọ nꞌelu inyinya ndị a yi uwe igwe e ji ekpuchi obi, nke ụfọdụ nꞌime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dị ka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dị ka anwụrụ ọkụ. Isi inyinya ha dị ka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ si ha nꞌọnụ na-apụta. Ọ bụ ihe ndị a na-apụta ha nꞌọnụ ka ha ji gbuo otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke mmadụ nile bi nꞌụwa. Ike e nyere ha iji gbuo ndị mmadụ adịghị nanị nꞌọnụ ha, kama ọ dịkwa nꞌọdụdụ ha. Nꞌihi na ọdụdụ ha dị ka agwọ. O nwere isi nke ha ji ata ndị mmadụ, wetara ha ọnwụ. Ma ndị mmadụ ahụ nile e mere ka ha dịrị ndụ, ndị ọnwụ a na ihuju anya ndị a na-adakwasịghị, mechiri obi ha, jụ ịkpọ isi ala nye Chineke. Ha jụrụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha nile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị a nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, nke nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije. Ọ dịkwaghị mgbe ọ bụla ha chigharịrị site nꞌizu ọjọọ nke obi ha, nke igbu mmadụ na ikpere arụsị na ịkwa iko na izu ohi pụta. Emesịa, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nꞌeluigwe rịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nꞌisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dị ka anyanwụ. Ụkwụ ya na-enwukwa dị ka ọkpụrụkpụ ọkụ. O ji akwụkwọ ntakịrị a pịakọtara apịakọta nꞌaka ya. Otu ụkwụ ya, nke aka nri ya, ka ọ zọnyere nꞌime osimiri, ma ụkwụ nke aka ekpe ya ka ọ zọkwasịrị nꞌelu ala. Mgbe mmụọ ozi ahụ ji oke olu, nke dara ụda dị ka ịgbọ ụja nke ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ zaghachi ya. Mgbe m chọrọ idetu ihe egbe eluigwe ndị a kwuru, anụrụ m otu olu si nꞌeluigwe kpọọ m sị m, “Edela ihe ahụ nꞌakwụkwọ, nꞌihi na achọghị ka ndị ọzọ mata okwu ahụ egbe eluigwe ndị ahụ kwuru.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ dị ike nke zọkwasịrị ụkwụ ya nꞌelu osimiri, na nꞌala akọrọ ahụ, chiliri aka ya abụọ elu, were onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe nile dị nꞌime ha, na oke osimiri, na ndị nile bi nꞌime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesịkwaghị ka a tụfuo oge ọ bụla. Mmụọ ozi ahụ sịkwara na mgbe mmụọ ozi nke asaa ahụ fụrụ opi ike ya, a ga-eme ka ihe omimi nile zoro ezo, nke Chineke sitere nꞌọnụ ndị amụma kwuo nꞌọgbọ gara aga, bụrụ ihe e mezuru emezu. Mgbe ahụ otu olu sitere nꞌeluigwe gwa m okwu ọzọ sị, “Gaa napụta mmụọ ozi dị ike ahụ guzo nꞌelu oke osimiri na ala akọrọ akwụkwọ nta ahụ o ji nꞌaka ya.” Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ dị ike, rịọ ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ zara m sị, “Lee ya, were ya taa ya. Mgbe ị na-ata ya nꞌọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dị ka mmanụ aṅụ. Ma mgbe i lodara ya nꞌime afọ gị, ọ ga-elu gị ilu nꞌafọ.” Ya mere, anaara m ya akwụkwọ nta ahụ taa ya. Dị ka o kwuru, mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nꞌọnụ ma mgbe m lodara ya nꞌafọ m, afọ bidoro ịtakasị m. Emesịa mmụọ ozi ahụ gwara m okwu sị, “Ị ga-aga buo amụma nye ọtụtụ mmadụ, nꞌọtụtụ mba dị iche iche, nꞌime agbụrụ dị iche iche, nꞌasụsụ dị iche iche na nꞌihu ndị eze nile.” Emesịa, enyere m ihe ọtụtụ e ji atụ ihe. A gwara m sị m gaa tụọ ụlọ nsọ ukwu Chineke. A gwakwara m sị m tụọ ebe ịchụ aja dị nꞌụlọ nsọ ahụ. A gwakwara m ka m gụọ ọnụ ọgụgụ ndị nile na-akpọ isi ala nye Chineke nꞌime ya. Ma a gwara m sị m atụkwala ogige dị na mpụta ụlọ nsọ ukwu nꞌihi na e werela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ. “Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii. Nꞌoge a ha ga-eyi akwa mkpe.” Ndị amụma abụọ ahụ bụ osisi olivu abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ e debere nꞌihu Chineke onye kere ihe nile na mmadụ nile bi nꞌụwa. A ga-eme ka onye ọ bụla ga-achọ imejọ ha nwụọ. Ọ bụ ọkụ si ha nꞌọnụ pụta ka ha ga-eji rechapụ ndị dị otu a. A ga-enyekwa ndị àma abụọ ahụ ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzu ọ bụla ghara izo nꞌụwa nꞌime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta nile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa nile nꞌoge ọ bụla ha chepụtara nꞌobi ha. Nꞌọgwụgwụ afọ atọ na ọkara ahụ, mgbe ha rụsịrị ọrụ ịgba ama ha, onye nduhie ahụ, nke ga-esite nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta, ga-ebuso ha agha merie ha, gbuokwa ha. Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọ nꞌala, nꞌokporo ụzọ dị na Jerusalem ụbọchị atọ na ọkara. Ee, ozu ha ga-atọgbọ nꞌokporo ụzọ Jerusalem, obodo ahụ e kwuru ihe banyere ya sị na ọ bụ obodo Sodọm, na obodo a kpọkwara Ijipti. Nke a bụ obodo ahụ ebe a kpọgidere Onyenwe ha nꞌobe. A gaghị ekwenyekwa ka onye ọ bụla lie ozu mmadụ abụọ ahụ. Ma ndị nile dị iche iche nꞌụwa ga-agba ozu ha gburugburu nꞌebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya, nꞌihi na ha ga-abụ ihe ilere anya nye ụwa nile. Ụwa nile ga-emekwa ụbọchị e gburu ha ka ọ bụrụ ụbọchị izuike. Ndị ụwa nile ga-aṅụrị ọṅụ nyerịtaa ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nꞌihi ogbugbu e gburu mmadụ abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhuju anya. Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nꞌime mmadụ abụọ ndị a mee ka ha bilitekwa ọzọ. Mgbe ndị bi nꞌụwa ga-ahụ nke a, ha nile ga-amalitekwa ịtụ oke egwu. Mgbe ahụ otu olu dị ukwuu ga-esi nꞌeluigwe tie mkpu gwa mmadụ abụọ ahụ okwu sị, “Bilienụ, rigota nꞌelu.” A ga-ewelite ha elu na mbara eluigwe baa nꞌime igwe ojii. Ma ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya ka ha na-arigo nꞌeluigwe. Ma nꞌotu oge ahụ, nꞌotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu ga-adị, nke ga-eme ka otu akụkụ nꞌime akụkụ iri nke obodo ahụ nile daa. Ndị ga-anwụ nꞌoge ala ọma jijiji a ga-adịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị nile fọdụrụ ga-esite nꞌoke egwu ga-atụ ha nye Chineke nke eluigwe otuto. Ugbu a ahụhụ nke abụọ ahụ agafeela. Ma mgbe na-adịghị anya kwa, ahụhụ nke atọ na-amalite. Nꞌihi na mgbe ahụ kwa ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya. Mgbe ọ fụrụ opi ya oke olu dị iche iche sitere nꞌeluigwe na-ada nꞌike nꞌike na-asị, “Alaeze nile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, ya na Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa achị nꞌebe ihe nile e kere eke dị ruo mgbe nile ebighị ebi.” Mgbe ahụ kwa iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ndị ahụ dị nꞌihu ocheeze Chineke na-ada nꞌala, na-akpọ isi ala nye Chineke. Ha na-enyekwa ya otuto site nꞌife ya ofufe na-asị, “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile. Onye na-adị site na mmalite, onye dịkwa ugbu a, nꞌihi na i werela ike nile nꞌaka gị. Ị malitekwala ọchịchị gị. Ụwa nile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na ịkwụghachi ndị na-ejere gị ozi ụgwọ ọrụ ha, bụ ndị nile na-ezisa ozi ọma gị na ndị gị nile, bụ ndị na-atụ egwu gị. Ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nꞌiyi ga-abịakwasịkwa ndị nile e siri nꞌaka ha webata mmebi nꞌebe ihe Chineke kere dị.” Mgbe ahụ kwa e meghere ụlọ nsọ Chineke nke dị nꞌeluigwe. Ahụkwara m igbe ọgbụgba ndụ Chineke nꞌime ya. Nꞌotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe nke na-ala ihe nꞌiyi bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji dị egwu bidoro nꞌebe dị iche iche, mee ka ụwa nile mee mkpọtụ nke ukwuu. Mgbe ihe ndị a gasịrị, oke ihe ịrịba ama pụtara ìhè nꞌeluigwe nke na-egosi ihe gaje ime. Ahụrụ m otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dị ka uwe. Ọnwa dịkwa nꞌokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpu eze nke kpakpando iri na abụọ dị gburugburu ya, dịkwa ya nꞌisi. Nwanyị ahụ dị ime, na-etikwa mkpu dị ka nwanyị ime na-eme, nke na-ejikere ịmụpụta nwa ọhụrụ. Na mberede, agwọ ochie ahụ a na-akpọ Dragọn nꞌasụsụ bekee pụtara ìhè. O nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpu eze asaa nꞌisi ya. Nꞌazụ ya, o nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke kpakpando nile dị nꞌeluigwe, tụda ha nꞌala. Ọ bịara guzo nꞌihu nwanyị ahụ mgbe ọ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ nwanyị ahụ ga-amụpụta. Emesịa, nwanyị ahụ mụpụtara nwantakịrị ahụ, onye gaje ịchị achị nꞌelu ụwa dum. Onye ga-ejikwa aka dị ike chịa ọchịchị ya. Mgbe ahụ a mụpụtara ya, nꞌotu oge ahụ kwa, e si nꞌebe ahụ wepụ nwanta ahụ were ya gaa nꞌebe Chineke nọ nꞌeluigwe nꞌocheeze ya. Ma nwanyị ahụ si nꞌebe ahụ gbapụ gbalaa nꞌọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka Chineke ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii. Mgbe ihe ndị a gasịrị, agha dị oke egwu dapụtara nꞌeluigwe. Ma onyeisi ndị mmụọ ozi a na-akpọ Maikel na ụsụ ndị mmụọ ozi ya malitere ibuso agwọ ochie ahụ na ndị mmụọ ozi ya a chụdara achụda agha. Mgbe a lụchara ọgụ a, e meriri agwọ ochie ahụ nꞌagha, chụpụ ya site nꞌeluigwe. Agwọ ukwu a bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu, nke na-eduhie ndị nile bi nꞌụwa. A chụturu ya nꞌụwa, ya na ndị agha ya nile. Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌeluigwe na-ada sị, “O mezuola nꞌikpeazụ, nzọpụta Chineke na ike na ọchịchị na ịchị isi Kraịst, ha abụrụla ihe dị ire nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nꞌihu Chineke anyị. Ha lụgburu ya nꞌagha site nꞌọbara Nwa atụrụ ahụ na site nꞌama ha, nꞌihi na ha ahụghị ndụ ha nꞌanya karịa, kama ha tọgbọrọ ndụ ha kwere ịnwụ ọnwụ nꞌihi ya. Ṅụrịanụ ọṅụ ndị nile bi nꞌeluigwe. Unu ụmụ nke eluigwe ṅụrịanụ. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nꞌụwa, nꞌihi na ekwensu ejirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge o nwere ehighị nne.” Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nꞌụwa, o sogburu nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ. Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dị ka nku oke ugo, ka o jiri ya feba nꞌime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii ichedo ya site nꞌaka agwọ ahụ. Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nꞌọnụ ya sọpụta, nke ga-ebufu nwanyị ahụ ma ọ bụrụ na mmiri ahụ eruo ebe nwanyị ahụ nọ. Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda ide mmiri a. Mgbe ahụ agwọ ahụ nke iwe juru obi megide nwanyị ahụ, jikesịrị ike pụọ, ibu agha megide ụmụ nwanyị ahụ nile fọdụrụ, bụ ndị nile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị nke Jisọs. Mgbe ahụ, ahụrụ m otu anụ ọhia buru ibu, ka o si nꞌime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhia a nwere isi asaa na mpi iri. Okpu eze iri dịkwa nꞌelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nꞌisi asaa ahụ nꞌotu nꞌotu bụ aha ikwutọ na ikwuhie Chineke. Anụ ọhia a m hụrụ dị ka agụ, ụkwụ ya dị ka ụkwụ anụ bi na mmiri, o nwekwara ọnụ dị ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike, nyekwa ya ocheeze ya na ike ịchị isi. Ahụkwara m na otu nꞌime isi asaa ahụ o nwere bu ọnya nke pụrụ ime ka ọ nwụọ, ma e mere ka ọnya ahụ laa. Nke a juru ndị nile nọ nꞌụwa anya, mee ka ha na-esogharị anụ ọhia a ka ha leruo ya anya. Ha kpọrọ isi ala nye agwọ ochie ahụ nꞌihi na o nyere anụ ọhia ahụ ike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isi ala nye anụ ọhia ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya? Ònye pụkwara ibu agha megide ya?” Mgbe ahụ agwọ ochie ahụ gbara anụ ọhia ahụ ume ikwu okwu nkwulu megide Onyenwe anyị. O nyekwara anụ ọhia ahụ ike ịchị isi nꞌelu ụwa afọ atọ na ọnwa isii. Nꞌime afọ atọ na ọnwa isii ndị a anụ ọhia ahụ kwuluru aha Chineke na ụlọ nsọ ya na ndị nile bi nꞌeluigwe. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ibu agha megide ndị Chineke na imeri ha. O nyekwara ya ike ịchị ebo nile na asụsụ nile dị nꞌebe nile ụwa sọtụrụ. Mmadụ nile kpọrọ isi ala nye ya, bụ ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ, onye Chineke mere site na ntọ ala nke ụwa ka ọ bụrụ onye a ga-akpọgbu. Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe, ya nụrụ. Ụmụ Chineke ndị e buru ụzọ gbaa ama na a ga-adọta ha nꞌagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nꞌagha, ma ndị a gbara ama na ha ga-anwụ ka a ga-egbukwa. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nꞌihi na nke a bụ ohere unu nwere igosi ntachi obi unu na okwukwe unu. Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhia ọzọ dị iche nke nwere mpi nta abụọ dị ka mpi Nwa atụrụ ahụ. Kama olu ya yiri olu agwọ ochie ahụ. Ọ bụ anụ ọhia na-eme ka ụjọ tụọ ndị lekwasịrị ya anya. O sikwa nꞌime ala pụta. E nyere ya ike ịchị isi nke anụ ọhia ahụ ọnya dị nꞌotu isi ya nwere. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagịde ndị nile bi nꞌụwa ka ha kpọọ isi ala nye anụ ọhia ahụ. Anụ ọhia a si nꞌime ala pụta rụrụ ọtụtụ ọrụ ịtụ nꞌanya dị iche iche. O mere ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nꞌụwa nꞌihu mmadụ nile. Ọ na-arụ ọrụ ịtụnanya a mgbe ọ bụla anụ ọhia nke mbụ nọ na-ele ya anya. Ọ na-arụkwa ọrụ ndị a iji ya iduhie mmadụ nile nọ nꞌebe nile. O nyekwara iwu ka ndị nile bi nꞌụwa kpụọ ihe yiri anụ ọhia nke mbụ ahụ nwere ọnya gaara ewetara ya ọnwụ nꞌotu isi ya, bụ anụ ọhia e mekwara ka ọnya ya laa. E nyere anụ ọhia nke abụọ a ike ikunye ume ndụ nꞌime ihe ahụ a kpụrụ akpụ. E nyekwara ya ike ime ka o kwuo okwu. Mgbe a kpụsịrị ihe ahụ kunye ya ume ndụ, ihe a a kpụrụ akpụ nyere iwu ka e gbuo onye ọ bụla jụrụ ife ya onwe ya ofufe. O nyere iwu ka a kaa onye ọ bụla akara nꞌaka nrị ma ọ bụ nꞌegedege ihu, onye ọ bụla, ma onye ukwu ma onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya. Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike inweta ọrụ ma ọ bụ ịzụ ahia ma ọ bụ ree ahia ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhia ahụ, ma ọ bụ ihe e ji mara ya, nke bụ ọnụ ọgụgụ aha ya. Ihe dị nꞌebe a chọrọ ka e jiri amamihe nyochaa ya. Ka onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi jiri uche ya sụgharịa ihe ọnụ ọgụgụ a pụtara. Nꞌihi na ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya aha otu onye. Ihe ọnụ ọgụgụ ahụ nọchikwara aha ya bụ narị isii na iri isii na isii, ya bụ 666. Mgbe ahụ elere m anya hụ Nwa atụrụ ahụ ka o guzo nꞌugwu Zayọn nke dị na Jerusalem. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha Nwa atụrụ ahụ na aha Nna ya nꞌegedege ihu ha. Anụkwara m olu si nꞌeluigwe na-ada. Olu a na-ada ụda dị ka ụda mmiri si nꞌime nkume na-asọpụta, ma ọ bụ dị ka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu a bụ olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ. Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị a, bụ ndị na-abụ abụ ahụ. Ọ bụkwa abụ ọhụrụ ka ha na-abụ. Ha nọkwa nꞌihu ocheeze Chineke na nꞌihu ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ, na nꞌihu iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-abụ abụ a. O nweghị onye ọzọ maara abụ a karịa ndị a na-abụ ya. Nꞌihi na ha bụ ndị e si nꞌụwa gbapụta. Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nꞌebe ụmụ nwanyị dị, ndị dị nsọ nꞌime mmụọ ha dị ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa atụrụ ahụ na-aga ebe ọ bụla ọ na-aga. Ha bụ ndị e si nꞌetiti ndị mmadụ bi nꞌụwa gbapụta, ka ha bụrụ onyinye e doro iche nye Chineke na Nwa atụrụ ahụ. Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọ bụla a hụrụ nꞌọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta. Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nꞌime eluigwe. O bu ozi ọma nke ebighị ebi ahụ nꞌaka, nke ọ na-aga ikwusara mba nile, na ebo nile na asụsụ nile na mmadụ nile nọ nꞌụwa. Mmụọ ozi a were oke olu kwuo okwu sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto. Nꞌihi na oge ahụ eruola mgbe ọ ga-anọdụ dị ka onye ikpe. Kpọọkwanụ isi ala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri nile.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ọzọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala, lee, ọ daala, nꞌihi na o meela ka mba nile soro ya ṅụrụ mmanya nke ọnụma na ịkwa iko ya na mmehie ya.” Mgbe ahụ mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọ bụla na-akpọ isi ala nye anụ ọhia ahụ si nꞌime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nꞌegedege ihu ma ọ bụ nꞌaka ya, aghaghị isoro ṅụọ ihe si nꞌiko iwe Chineke. Iwe Chineke ahụ ka a ga-awụnyekwa, na-agwaghị agwa, nꞌime iko ọnụma Chineke. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nꞌihu Nwa atụrụ ahụ. Anwụrụ ọkụ si nꞌebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arigo elu ruo mgbe nile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị nꞌihi na ha kpọrọ isi ala nye anụ ọhia ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke ọnụ ọgụgụ ya. Ka nke a bụrụ ihe ịgba ume nye ndị Chineke, ime ha ka ha nwee ntachi obi nꞌọnwụnwa na nsogbu nile, nꞌihi na ha bụ ndị nsọ ya, ndị na-eguzosi ike bụrụ ndị na-erube isi nꞌiwu ya, na nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs ruo ọgwụgwụ ihe nile.” Anụkwara m olu nke si nꞌeluigwe daa gwa m okwu sị, dee ihe a nꞌakwụkwọ, “Oge eruola mgbe ndị nile e gburu nꞌihi okwu Chineke ga-anatazu ụgwọ ọrụ ha zuru oke. Nꞌezie, Mmụọ Nsọ na-ekwu na ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ugbu a ha ga-ezu ike site nꞌọrụ ha nile na ahụhụ ha nile, nꞌihi na ezi ọrụ ha rụrụ ga-eso ha baa nꞌeluigwe.” Mgbe ahụ ihe nile gbanwere. Na mberede ahụrụ m igwe ọcha, hụkwa otu onye na-anọkwasị nꞌelu ya. Onye a dị ka Jisọs onye a kpọrọ Nwa nke mmadụ. O kpu okpu eze e jiri nanị ọlaedo mee, jirikwa mma e ji ewe ihe ubi dị nkọ, nꞌaka ya. Mgbe ahụ otu mmụọ ozi sitere nꞌụlọ nsọ pụta, tikuo onye ahụ na-anọkwasị nꞌigwe ọcha sị ya, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nꞌihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nꞌụwa achaala.” Ya mere, onye ahụ na-anọkwasị nꞌigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nꞌime ụwa, ghọta ihe dị nꞌụwa dị ka ihe ubi. Mgbe nke a gasịrị, mmụọ ozi ọzọ sitekwara nꞌụlọ nsọ dị nꞌeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ. Otu mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ e nyere ike iji ọkụ mebie ụwa tikuru mmụọ ozi ahụ ji mma owuwe ihe ubi dị nkọ sị ya, “Were mma owuwe ihe ubi gị bipụ ụyọkọ osisi oroma nile dị nꞌụwa, nꞌihi na ha nile achaala ikpe ikpe.” Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nꞌụwa, bipụsịa ụyọkọ oroma ahụ chịkọtaa ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha. A zọchakwara mkpụrụ ndị a nꞌime mbadamba ala a na-anọ azọcha oroma nke dị nꞌazụ obodo. Ọbara sitere nꞌebe ahụ sọọ dị ka idee mmiri, ruo ihe dị ka narị kilomita atọ. Ịla elu nke ọbara a, ya bụ omimi ya, dịkwa ka site nꞌala ruo nꞌọnụ inyinya. Ahụkwara m ihe ịrịba ama ọzọ nke mere nꞌeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ọ na-ezipụta ihe gaje ịbịa. Ọ bụ ndị mmụọ ozi asaa ka a họpụtara iburu ihe otiti asaa nke ikpeazụ na-abịakwasị ụwa. Mgbe a wụkwasịrị ụwa ihe otiti asaa ndị a, mgbe ahụ ka iwe Chineke ga-ajụrụ. Ala dị nꞌihu m dị ka ebe a tụsara enyo a gwakọtara ya na ọkụ. Nꞌelu ya ka ha nile guzo, bụ ndị nile meriri anụ ọhịa ọjọọ ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, na akàra ya na ọnụ ọgụgụ ya. Ha nile ji ụbọ akwara Chineke. Ha na-abụ abụ Mosisi ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ. Nke a bụ abụ ha na-abụ:Ọrụ gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị, Chineke pụrụ ime ihe nile.Ụzọ gị nile ziri ezi bụrụkwa eziokwu.Gị eze mgbe ebighị ebi. Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị,Onye ga-agharakwa ito aha gị?Nꞌihi na ọ bụ nanị gị dị nsọMba nile ga-abịakwa ịkpọ isi ala nꞌihu gị,nꞌihi na e meela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè. Mgbe m lere anya ahụrụ m na e megheela ebe nsọ kachasị ebe nsọ nke ụlọ nsọ ukwu ahụ dị nꞌeluigwe. Mmụọ ozi asaa ndị ahụ e nyere ike ịwụkwasị ụwa ihe otiti asaa ahụ sitere nꞌụlọ nsọ ahụ pụta. Ha yi uwe dị nnọọ ọcha, nke na-enweghị ntụpọ. Ha jikwa akpụkpọ dị warara e ji ọlaedo mee kee gburugburu obi ha. Otu nꞌime ihe e kere eke anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe nile ebighị ebi. Mgbe ahụ ụlọ nsọ ahụ jupụtara nꞌanwụrụ ọkụ si nꞌebube na ike Chineke na-apụta. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike banye nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ tutuu ruo mgbe mmụọ ozi asaa ndị ahụ wụsara ihe otiti asaa ahụ. Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌụlọ nsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu sị, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nꞌefere ọnụma asaa Chineke ahụ nꞌelu ụwa.” Mmụọ ozi nke mbụ hapụrụ ụlọ nsọ ahụ gaa wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu ụwa. Mgbe ọ wụsara ya, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị ndị nile bi nꞌụwa, bụ ndị a kakwasịrị akara anụ ọhịa ahụ, na nꞌelu ndị na-akpọrọ oyiyi ya isi ala. Mmụọ ozi nke abụọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nꞌime efere nke ya nꞌelu osimiri nile. Otu mgbe ahụ osimiri nile chagharịrị na-acha dị ka ọbara onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe nile dị nꞌime ha nwụọ. Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu iyi na nꞌelu isi iyi nile. Nke a mere ka ha nile ghọọ ọbara. Mgbe ahụ anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri nile dị nꞌaka ya kwuru okwu sị, “I kpere ikpe ziri ezi, ebe i mere ka isi iyi ndị a ghọọ ọbara. Gị onye dị nsọ na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a. Nꞌihi na e gbuola ndị nsọ gị na ndị amụma gị, wụsakwa ọbara ha nꞌelu ụwa. Ma ugbu a gị onwe gị a wụsala ọbara ndị ahụ gburu ha. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesịrị ịnata.” Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nꞌebe ịchụ aja kwuru okwu sị, “Ee, Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile, ntaramahụhụ i nyere ha ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.” Mgbe ahụ mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu anwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo mmadụ nile. Okpomọkụ ahụ si nꞌanwụ bịa rere onye ọ bụla ọkụ nꞌahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye zidatara ihe otiti ndị a. Ma ihe otiti a emeghị ka ha chegharịa nꞌobi ha, o meghị ka ha bido inye Chineke otuto. Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nꞌiko nke ya nꞌelu ocheeze anụ ọhia ahụ si na mmiri pụta. Nke a mere ka ọchịchịrị jupụta nꞌalaeze ya. O mekwara ka ndị ọ na-achị tabie ire ha nꞌihi oke ahụ ụfụ. Ha kọchara Chineke nke eluigwe nꞌihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nꞌajọ ọrụ ha nile. Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nꞌefere ya nꞌelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nꞌime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị eze ahụ si nꞌọwụwa anyanwụ mfe ịchịrị ndị agha ya jeruo nꞌakụkụ ọdịda anyanwụ na-enweghị mgbochi ọ ụla. Mgbe ahụ kwa, ahụrụ mmụọ ọjọọ atọ ndị pụtara ìhè nꞌọdịdị awọ. Ha si nꞌọnụ agwọ ochie ahụ na nꞌọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta. Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịba ama. Ọ bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa nile ịchịkọta ha maka ibu agha nꞌụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe nile. “Lezie anya! Ana m abịa dị ka onye ohi! Ọṅụ dịrị ndị nile nọ na-eche maka ọbịbịa m, ndị na-edebe uwe ha na njikere, ndị na-agaghị ejegharị nꞌọṅọdụ ịgba ọtọ, nke na-eweta ihere.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ chịkọtara ndị eze ahụ nile nꞌotu ebe a na-akpọ Amagidọn nꞌasụsụ Hiburu. Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nꞌefere nke ya nꞌikuku. Mgbe ọ wụpụrụ ya, otu olu sitere nꞌocheeze dị nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “E mezuola ya!” Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nꞌụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ. Obodo ahụ bụ Babilọn kewara ụzọ atọ. Obodo ukwu nile dị nꞌụwa dara. Mgbe ahụ Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O mere ka ọ ṅụrụ site nꞌihe dị nꞌiko ọnụma nke oke iwe ya. Mgbe ahụ agwa etiti nile mikpuru, ugwu nile ghọrọ ala dị larịị. Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nꞌime ha ruru iri kilogram ise, sitere nꞌeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nꞌihi ihe otiti mkpụrụ mmiri ahụ, nꞌihi na ihe otiti ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu. Emesịa, otu nꞌime mmụọ ozi asaa ndị ahụ wụsara ihe dị nꞌefere ha nꞌelu ụwa bịara nꞌebe m nọ bido ịgwa m okwu. Ọ gwara m okwu sị, “Soro m ka anyị gaa, aga m egosi gị ihe ga-abịakwasị nwanyị ahụ ụwa nile maara dị ka akwụla, nwanyị ahụ na-anọkwasị nꞌelu ọtụtụ mmiri nke ụwa. Ndị eze ụwa esorola ya dinakọọ nꞌotu ihe ndina. E meekwala ka ndị bi nꞌụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ duuru m nꞌime mmụọ baa nꞌọzara. Nꞌebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nꞌelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Ihe e dere anụ ọhịa ahụ nꞌahụ bụ nanị okwu ikwulu Chineke. Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara. Ọ gbakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo na nkume dị oke ọnụ ahịa kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nꞌaka ya nke jupụtara nꞌihe arụ na ihe ure nile o ji na-akwa iko ya. Aha gbagwojuru mmadụ anya ka e dekwasịrị ya nꞌegedege ihu. Nke a bụkwa ihe ahụ e dere: “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn nne ndị na-akwa iko na nne ndị nọ nꞌebe nile nꞌụwa na-ekpere arụsị.” Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị àma Jisọs o gburu. Elere m ya anya nꞌoke egwu. Ma mmụọ ozi ahụ jụrụ m ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m agwa gị onye nwanyị a bụ, na ihe anụ a ọ na-anọkwasị nꞌelu ya nọchiri anya ya. Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ nwere mgbe o ji dị ndụ ma ugbu a ọ dịkwaghị ndụ. Ma ọ ga-emesịa site nꞌolulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta. Ma ọbịbịa ya ga-ewetara ya nanị ịla nꞌiyi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌime akwụkwọ ndụ ahụ na-adị tupuu e kee ụwa anya. “Ugbu a okwu a dịrị ndị nwere amamihe. Isi asaa anụ ọhịa ahụ nwere nọchiri anya otu obodo e wuru nꞌelu ugwu nta asaa ebe nwanyị a bi. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa. Ise nꞌime ha achịala gafee. Onye eze nke isii bụ onye na-achị achị ugbu a. Nke asaa ga-abịa ịchị nꞌoge dị nꞌihu. Ma ụbọchị ya agaghị adị tee anya. Anụ ọhịa ahụ nwụrụ anwụ nke na-acha ọbara ọbara bụ onye eze nke asatọ. Ọ chịalarị achị na mbụ dị ka otu nꞌime ndị eze asaa ndị a. Mgbe ọ bịakwara ọzọ nke ugboro abụọ ya onwe ya ga-agakwa nꞌebe ịla nꞌiyi. Mpi iri ahụ o nwere nọchiri anya eze ndị ahụ na-abịabeghị nꞌọchịchị. Ha ga-anata alaeze ha sorokwa anụ ọhịa ahụ chịa nwa oge nta. Ha nile ga-etinye aka nꞌakwụkwọ nye anụ ọhịa ahụ ike ha na ume ha. Mgbe he kwekọtarịtara, ha ga-ebu agha megide Nwa atụrụ ahụ. Kama Nwa atụrụ ahụ ga-emeri ha nꞌihi na ọ bụ onyeisi nꞌebe ndị nile nwe mmadụ nọ. Ọ bụkwa eze ndị eze nile. Ndị ya bụkwa ndị a kpọrọ na ndị a họpụtara, na ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.” Mmụọ ozi ahụ gwakwara m okwu si, “Osimiri ndi a, na iyi ukwu na iyi nta ndị a nwanyị a na-anọkwasị nꞌelu ha nọchiri anya ndị mmadụ dị iche iche, ndị si nꞌebe nile dị iche iche ma mba dị iche iche nke ụwa.” Anụ ọhịa ahụ na-acha ọbara ọbara nke nwekwara mpi iri, nke mpi ndị a nọchiri anya ndị eze iri, ya na ndị eze a kpọrọ nwanyị a asị. Ha ga-agbakwa ya ọtọ, kwanyekwa ọkụ ga-erechapụ ya. Nꞌihi na Chineke ga-eme ka ha zube ime otu ihe, ihe ga-emezu ọchịchọ obi ya. Ha nile ga-ekwekọtakwa iwere ike ọchịchị ha nyefee anụ ọhịa ahụ na-acha ọbara ọbara nꞌaka. A ga-esitekwa otu a mezuo okwu Chineke. Ma nwanyị a ị hụrụ nꞌime ọhụ gị nọchiri anya obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze nile dị nꞌụwa. Mgbe ihe ndị a nile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ nke si nꞌeluigwe bịa nꞌụwa. E nyere mmụọ ozi a ike dị ukwuu. Ebube ya mekwara ka ìhè jupụta nꞌụwa. Mmụọ ozi a jiri olu dị ukwuu tie mkpu sị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala. Ọ ghọọkwala ọgba ndị mmụọ ọjọọ na ebe obibi ndị mmụọ ọjọọ, na ebe obibi ụmụ nnụnụ rụrụ arụ. Nꞌihi na mba nile esorola ya ṅụọ site na mmanya ọnụma ahụ na-eweta ọnwụ, nke e mere ka ọ bịakwasị ya nꞌihi ịkwa iko ya. Ndị ọchịchị nile nke ụwa esorola nwanyị a nwekọọ obi ụtọ. Ndị na-azụ ahịa nꞌụwa aghọọkwala ndị ọgaranya site nꞌịba ụba nke nwanyị a.” Mgbe ahụ anụkwara m olu ọzọ si nꞌeluigwe na-akpọ oku na-asị, “Ndị m, sitenụ nꞌobodo ahụ pụta, unu esola ya keta oke na mmehie ya, nꞌihi na a ghaghị ịta unu ahụhụ ma unu soro ya mehie. Nꞌihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke ejikerekwala ikpe ya ikpe nꞌihi ajọ omume ya. Mesonụ ya mmeso dị ka o si mesoo unu. Kwụọnụ ya ụgwọ ọrụ ọjọọ okpukpu abụọ karịa ka o mere. O wetaara ọtụtụ mmadụ iru uju, wetakwaranụ ya iru uju okpukpu abụọ karịa nke a o wetaara ndị ọzọ. O biela ndụ ime onwe ya obi ụtọ, na inwezu ihe nile gụrụ ya agụụ, mee ka ọnọdụ ya ugbu a bụrụ nanị iru uju na ahụ mgbakasị. Ọ na-anya isi na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nꞌelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị ihe ọ bụla kọrọ, dị ka nwanyị di ya nwụrụ, iru uju ọ bụla adịghị nye m.’ Ebe okwu dị otu a si ya nꞌọnụ pụta, iru uju nke ọnwụ na-eweta, ya na obi ọjọọ, na ọnwụ ga-abịakwasị ya nꞌotu ụbọchị. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nꞌihi na Onyenwe anyị, onye na-ekpe ya ikpe, bụ onye pụrụ ime ihe nile.” Ndị eze nke ụwa, ndị sooro ya mee mmehie ịkwa iko, ndị ṅụrịkwara ọṅụ nꞌihi ihe ọma nke mmekọta ha na ya na-eweta ga-eru uju nꞌihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke na-apụta mgbe a na-akpọ ya ọkụ. “Ewoo Babilọn! Ọ bụ otu a ka ị si laa? Obodo ukwu a maara aha ya! Nꞌotu ntabi anya, ya bụ na ikpe Chineke adakwasịla gị?” Ndị ahia nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa uju nꞌihi ya, nꞌihi na ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ga-azụ ihe ahia ha. Nꞌihi na Babilọn a bụ nnọọ nnukwu obodo ebe a na-azụ ahia. Na Babilọn ka a na-azụ ọlaedo na ọlaọcha na nkume dị oke ọnụ ahia, na ọla, na ezi akwa rekereke, na akwa na-acha uhie uhie, na akwa dị ezi ọcha, na osisi ọ bụla na-esi isi ụtọ, ya na ihe nile ọ bụla e ji mpi enyi mee, na ihe nile ọ bụla e ji osisi pịa, ma ọ bụ ọla e ji igwe dị iche iche kpụọ, ma ọ bụ nkume. Ha na ụda dị iche iche na mmanụ otite dị iche iche, na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, a na-akpọ frankinsensi, na mmanya na mmanụ olivu, na ụtụ ọka na ọka, na anụ ụlọ, na atụrụ, na inyinya na ụgbọ ala, na ndị ohu, na mkpụrụ obi mmadụ. Ndị ahụ nọ na-ele Babilọn anya, ndị hụrụ ihe ndị a anya, kwakwara akwa sị, “Ihe ọma ahụ nile ị hụrụ nꞌanya agabigala. Ihe ọma nile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụ ahia nile i ji azụ afọ gị, agaghị abụkwa nke gị! Lee ka ha si laa ruo mgbe ebighị ebi!” Ya mere, ndị ahia ahụ ghọrọ ọgaranya site nꞌiresi ndị obodo Babilọn ahia ga-eguzo nꞌebe dị anya na-atụ egwu ihe ga-eme ha onwe ha, ma na-akwa akwa na-etikwa mkpu na-asị, “Ewoo! obodo ukwu ahụ mara mma dị ka nwanyị yi uwe na-acha odo odo na uhie uhie, nke nya ihe olu e ji ọlaedo na nkume dị oke ọnụ ahia mee, na nke gbakwa mgba nꞌaka e ji nkume dị oke ọnụ ahia kpụọ, ọ̀ bụ otu a ka i si laa? Ọ̀ bụ nꞌotu ntabi anya a ka akụ nile dị nꞌime gị ji laa nꞌiyi?” Ndị nile nwere ụgbọ na-aga nꞌoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahia nꞌoke osimiri, na ndị nile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nꞌebe tere anya na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu, na-asị, “Olee ọzọ nꞌụwa ka a ga-ahụ obodo dị otu a?” Ha ga-ekpokwasị aja nꞌisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “Ewoo! Ewoo! Leenụ ka obodo a si laa nꞌiyi o! Obodo ukwu ahụ mere anyị ka anyị bụrụ ndị ọgaranya site nꞌakụ dị nꞌime ya. Ma ugbu a nꞌotu ntabi anya, ihe nile dị nꞌime ya erechapụla ọkụ!” “Ma gị eluigwe ṅụrịa ọṅụ nꞌihi ihe a dakwasịrị obodo a, unu ụmụ Chineke, na unu ndị amụma ya na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọṅụ. Nꞌihi na Chineke ekpeela obodo a ikpe nꞌoge ikpeazụ a.” Mgbe ahụ otu mmụọ ozi tụtụlitere otu nkume nke dị ka nkume e ji akwọ ihe, tụba ya nꞌime oke osimiri, tie mkpu sị, “Otu a ka a ga-esi tụfuo Babilọn obodo ukwu ahụ, dị ka m si tụfuo nkume a. A gaghị ahụkwa ya anya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nꞌebe ahụ. A gaghị anụkwa olu oja, na une, na ụbọ akwara na ndị na-akpọ ha. A gaghị ahụkwa ndị nka ọ bụla nꞌime ya. A gaghị ahụkwa ndị na-akwọ ọka ma ọ bụ igwe e ji akwọ ọka nꞌime ya. Abalị nile ga-abụkwa nanị oge ọchịchịrị nꞌihi na a gaghị ahụ, ọ bụladị otu oriọna nꞌime ya. Ọṅụ nke oriri ọlụlụ di na nwụnye agaghị adịkwa ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌụwa nile ka a maara ndị ahia nile si nꞌobodo a, ọ bụkwa mgbaasị ya ka o ji ghọgbuo mba nile nke ụwa. Nꞌime ya ka a chọtara ọbara ndị amụma nile, na ọbara ndị nsọ Chineke nile, na ọbara ndị ọzọ ahụ nile e gburu nꞌụwa.” Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nꞌeluigwe. Ha nile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya, keleenụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nꞌaka Chineke anyị ka nzọpụta si bịa, ọ bụkwa nanị ya ka nsọpụrụ na ike nile dịrị. Nꞌihi na ikpe ikpe ya nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ taala nwanyị ahụ na-akwa iko, na onye jiri mmehie ya merụọ ụwa ahụhụ. Ọ bọọlara ndị ohu ya e gburu egbu ọbọ.” Olu iti mkpu ha gakwara nꞌihu na-ada, na-asị, “Ka otuto dịrị Onyenwe anyị. Nꞌihi na anwụrụ ọkụ si nꞌobodo ahụ a kpọrọ ọkụ na-arigo ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe ahụ iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na ihe e kere eke anọ ahụ dara nꞌala nꞌihu Chineke Onye nọkwasịrị nꞌelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Ka o si otu a dịrị! Haleluya! Toonụ Onyenwe anyị!” Otu olu sitekwara nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Toonụ Chineke unu ndị ohu ya, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.” Mgbe ahụ, anụkwara m ihe yiri ụzụ nke ọtụtụ ndị mmadụ. Nꞌezie, ụzụ a dara dị ka ụzụ nke mmadụ na-anụ mgbe ebili mmiri na-amagharị nꞌoke osimiri. Ọ dakwara dị ka ụzụ nke egbe eluigwe. Ma ihe ndị na-eme ụzụ a na-eti mkpu na-ekwu bụ, “Toonụ Onyenwe anyị. Nꞌihi na Onyenwe anyị Chineke anyị na-achị achị ugbu a. Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa anyị ụtọ. Ka anyị sọpụrụkwanụ ya nꞌihi na oge mmemme ọlụlụ di na nwụnye nke Nwa atụrụ ahụ eruola, nwụnye ya edoziekwala onwe ya. E nyela ya ike iyikwasị onwe ya akwa mara mma nke na-enweghị ntụpọ ọ bụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha. Nꞌihi na akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ọma nke ndị Chineke rụrụ.” Mmụọ ozi ahụ kwa gwara m okwu sị m dee ihe ndị a nꞌakwụkwọ: “Ngọzi na-adịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nꞌoriri ọlụlụ nwụnye Nwa atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Okwu a i deturu ugbu a bụ okwu Chineke nꞌonwe ya kwuru.” Mgbe ọ gwasịrị m okwu a, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya ịkpọ isi ala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesịghị ka ị kpọọ isi ala nye m nꞌihi na abụ m nanị onyeozi Chineke dị ka gị onwe gị, na dị ka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere okwukwe ha nwere nꞌime Jisọs. Ọ bụ nanị Chineke ka i kwesịrị ịkpọ isi ala nye. Nꞌihi na isi amụma nile na isi ihe ndị a nile m ziri gị bụ ịgwa gị ihe banyere Jisọs.” Mgbe ahụ kwa elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu inyinya dị ọcha guzo nꞌebe ahụ. Onye nọkwasịrị nꞌelu ya bụ onye a kpọrọ aha ya Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ebu agha na onye na-enye ahụhụ nꞌụzọ ziri ezi. Anya ya na-acha dị ka ire ọkụ. Ọtụtụ okpu eze dịkwa ya nꞌisi. Otu aha nke nanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nꞌegedege ihu. E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nꞌọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. Ụsụ ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe dị nnọọ ezi ọcha, nke na-enwụkwa enwụ, na-esokwa ya nꞌazụ. Ha nọkwasịrị nꞌelu inyinya na-acha ọcha. Ọ kpụ mma agha dị nkọ nꞌọnụ ya, nke o ji egbutu mba nile. Ọ ga-ejikwa aka ike chịa ha. Ọ bụkwa ọrụ ya ime ka mba nile nụrụ ụfụ iwe Chineke Onye pụrụ ime ihe nile. Nꞌihi na mmeso ọ ga-emeso ha ga-adị ka a ga-asị na o ji ụkwụ ya na-azọpịasị mkpụrụ vaịnị dị na mbadamba ala ebe a na-anọ azọcha mkpụrụ vaịnị. Otu aha ka e dere nꞌelu uwe ya na nꞌelu apata ya. Ọ bụ, Eze ndị eze nile, na Onyenwe ndị nwe mmadụ nile. Mgbe ahụ ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nꞌime anyanwụ na-eti mkpu nꞌoke olu na-akpọku ụmụ nnụnụ nile na-efe na mbara eluigwe na-asị ha, “Bịanụ! Zukọọnụ! Nꞌihi na Chineke dị ukwuu na-akpọ unu oriri anyasị. Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndị isi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ inyinya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nꞌelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nwere onwe ha.” Mgbe ahụ ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze nile dị nꞌụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nꞌelu inyinya ọcha ahụ, na megide ndị agha ya. Ma e jidere anụ ọhịa ọjọọ ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ nwere ike ime ihe ịtụnanya mgbe ọ bụla anụ ọhịa ọjọọ ahụ nọ nsọ. Ọrụ ịtụnanya nke o ji duhie ndị nile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị kpọrọ isi ala nye oyiyi ya. Ha abụọ, anụ ọhịa ahụ, na onye amụma ụgha ya, ka a tụnyere nꞌime ọdọ ọkụ ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye. Ndị agha ha nile ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nꞌọnụ onye ahụ nọ nꞌelu inyinya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe nile nke eluigwe rikwara ozu ha dị ka ha nwere ike iri. Mgbe ahụ kwa ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nꞌeluigwe rịda. O ji mkpịsị igodo e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ. O jikwa mkpọrọ igwe dị arọ nꞌaka ya. Mmụọ ozi a jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ aha ya bụkwa Onye ọnwụnwa na Ekwensu. O ji mkpọrọ igwe kee ya agbụ. Ọ ga-anọkwa nꞌọnọdụ a otu puku afọ. Emesịa, mmụọ ozi ahụ tụnyere agwọ ochie ahụ nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nꞌelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba nile dị nꞌụwa ọzọ tutuu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya hapụ ya ka ọ gagharịa nwa ntịntị oge. Mgbe ahụ ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nꞌelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụ obi ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi ịgba ama banyere Jisọs na nꞌihi ikwusa okwu Chineke, na ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi na ha akpọghị isi ala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a tụrụ atụ, ma ọ bụ kwere ka a kaa ha akara ya nꞌegedege ihu ha, ma ọ bụ nꞌaka ha. Ha esitela nꞌọnwụ ghọọ ndị dị ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst ugbu a na-achị isi otu puku afọ. Nke a bụ mbilite nꞌọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nꞌetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nꞌọnwụ nꞌoge a, kama ha ga-anọ nꞌọnọdụ ọnwụ ha tutuu ruo mgbe puku afọ gafesịrị. Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nꞌọnwụ nke mbụ ahụ, nꞌihi na ụjọ ọnwụ nke ugboro abụọ adịghị atụ ha, nꞌihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa achịa puku afọ. Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nꞌụlọ mkpọrọ ya pụta. Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba nile nọ nꞌakụkụ nile nke ụwa. Ọ ga-akpọkọta ha nꞌotu ebe. Gọg na Magọg ga-eso ha. Ha nile ga-ezukọ ibu agha. Ndị agha ha ga-adị nnọọ ukwuu, a pụghị ịgụta ọnụ ọgụgụ ha nꞌihi na ha ga-adị ukwuu dị ka aja dị nꞌọnụ mmiri osimiri. Ha nile ga-esi nꞌakụkụ nile nke ụwa zukọọ, gbaa obodo ndị Chineke gburugburu, ya bụ obodo Jerusalem ahụ Chineke hụrụ nꞌanya. Ma Chineke ga-eme ka ọkụ si nꞌeluigwe daa dakwasị ha, repịa ndị agha ahụ nile. Mgbe ahụ ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nꞌọdọ ọkụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nꞌọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi. Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, nke otu onye nọkwasịrị nꞌelu ya. Mgbe ụwa na mbara eluigwe nile hụrụ onye a nọ nꞌelu ocheeze ahụ ha gbara barịị fuo. Ma ha achọtaghị ebe ha ga-ezo onwe ha. Mgbe ahụ ahụrụ m ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nꞌihu Chineke. E meghere akwụkwọ, megheekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nꞌihe nile e dere nꞌakwụkwọ ahụ kpee ndị a nile nwụrụ anwụ ikpe, dị ka ọrụ ha rụrụ si dị. Oke osimiri nile nyeghachiri ndị nile nwụrụ anwụ nọ nꞌime ha. Otu a kwa ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nime ha. E kpekwara onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị. Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nꞌime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ. Onye ọ bụla a na-achọtaghị aha ya nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ ka a tụnyere nꞌime ọdọ ọkụ ahụ. Mgbe ahụ elere m anya hụ elu ụwa ọhụrụ nke osimiri na-adịghị nꞌime ya, na mbara eluigwe ọhụrụ, nꞌihi na elu ụwa mbụ na mbara eluigwe mbụ ahụ, bụ ndị dị ugbu a, adịkwaghị. Mụ onwe m bụ Jọn hụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nꞌeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ bụ ihe dị ebube ma e lee ya anya. Ọ mara mma dị ka nwagbọghọ e jikwara nke ọma maka ịgba akwụkwọ ya. Anụkwara m oke olu si nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nꞌetiti ụmụ mmadụ. Ya na ha ga-ebikwa. Ha ga-abụkwa ndị ya. Ee, nꞌezie, Chineke nꞌonwe ya ga-anọkwa nꞌetiti ha bụrụkwa Chineke ha. Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.” Onye ahụ nọ nꞌocheeze ahụ gwara m okwu sị, “Lee, ana m eme ka ihe nile dị ọhụrụ. Dee ihe ndị a nꞌakwụkwọ nꞌihi na ihe m na-agwa gị ugbu a bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. E mezuola ihe nile. Mụ onwe m bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Aga m enye ndị akpịrị na-akpọ nkụ isi iyi nke mmiri ndụ, dị ka ihe onyinye. Onye ọ bụla meriri ga-eketa ngọzi ndị a nile. Aga m abụkwa Chineke ya, ya onwe ya ga-abụ nwa m. Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.” Otu nꞌime mmụọ ozi asaa ahụ wụsara ihe dị nꞌefere ha ji bịakwutere m sị m, “Soro m ka m gosi gị nwagbọghọ ahụ bụ nwụnye Nwa atụrụ ahụ.” O buuru m nꞌime mmụọ buga m nꞌotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. Site nꞌebe ahụ o gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. O jupụtara nꞌebube Chineke, na-enwụ ma na-achakwa dị ka nkume dịkarịsịrị oke ọnụ ahịa, dị ka nkume jaspa, dị ka nkume kristal. Mgbidi ya nile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ e si abanye nꞌime ya. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izirel nꞌọnụ ụzọ ama ndị a nꞌotu nꞌotu. Ọnụ ụzọ atọ dị nꞌotu akụkụ mgbidi ahụ, atọ dị nꞌugwu, atọ na ndịda, atọ nꞌọwụwa anyanwụ, atọ nꞌọdịda anyanwụ. Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọ ala ya. Nꞌelu nkume ndị a nꞌotu nꞌotu ka e dere aha ndị ozi iri abụọ nke Nwa atụrụ ahụ. Mmụọ ozi ahụ ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nꞌaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ya, na mgbidi ya. Mgbe ọ tụchara ya, ọ chọpụtara na ogologo ya na obodobo ya bụ otu. Nꞌezie, o nweghị otu akụkụ nꞌime akụkụ anọ nke mgbidi a nwere ka ibe ya. Ogologo otu akụkụ nꞌime akụkụ anọ ndị a dị puku kilomita abụọ na narị kilomita anọ. Mmụọ ozi ahụ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ. Mgbe mmụọ ozi a na-atụ ihe ndị a ọ na-agwa m ihe ọnụ ọgụgụ ha bụ dị ka m nwere ike ịghọta. Ihe e ji rụọ mgbidi obodo ahụ bụ nkume dị oke ọnụ ahịa a na-akpọ jaspa. Ọ bụkwa ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwụ dị ka enyo, ka e ji rụọ obodo ahụ. E ji nkume dị oke ọnụ ahịa ndị a chọọ ntọ ala mgbidi obodo ahụ mma: Ntọ ala nke mbụ, nkume a na-akpọ jaspa, ntọ ala nke abụọ nkume a na-akpọ safaia, ntọ ala nke atọ nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ nkume a na-akpọ emeralụdụ, nke ise nkume a na-akpọ sadonks, nke isii nkume a na-akpọ sadiusu, nke asaa nkume a na-akpọ krisolait, nke asatọ nkume a na-akpọ beril, nke toolu nkume a na-akpọ topaazi, nke iri nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ nkume a na-akpọ ametisiti. E jikwa nkume dị oke ọnụ ahịa a na-akpọ paọl rụọ ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ. Ọnụ ụzọ ama ọ bụla ka e ji otu nkume a rụọ nꞌotu nꞌotu. Ihe e ji rụọ okporo ụzọ dị nꞌobodo ahụ bụ nanị ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwụ dị ka enyo e hichaziri nke ọma. O nweghị ụlọ nsọ bụla m hụrụ nꞌime obodo ahụ nꞌihi na Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile na Nwa atụrụ ahụ bụ ụlọ nsọ obodo ahụ nwere. Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ ma ọ bụ ọnwa nye ya ìhè nꞌihi na ebube Chineke na-enye ya ìhè. Nwa atụrụ ahụ bụkwa oriọna ya. Ọ bụkwa ìhè ya ga-enye mba nile dị nꞌelu ụwa ìhè. Ndị eze ụwa nile ga-abịakwa webata ebube ha nꞌime ya. A naghị emechi ọnụ ụzọ obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị nile. Abalị ọ bụla adịkwaghị nꞌebe ahụ. Ebube na nsọpụrụ nke mba nile ka a ga-ewebata nꞌime ya. Ọ dịkwaghị ihe ọ bụla rụrụ arụ ga-abata nꞌime ya. Otu a kwa ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, ma ọ bụ onye ụgha ga-abata nꞌime ya. Kama ndị ga-abata nꞌime ya bụ nanị ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ. Emesịa, mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri na-enye ndụ. Mmiri a na-acha nnọọ vaaa dị ka enyo. O sikwa nꞌokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta. O si ebe ahụ na-asọ bịa gafee nꞌetiti okporo ụzọ ahụ dị nꞌobodo ahụ. Nꞌakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọ bụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba nile. A gaghị achọpụta ihe ọ bụla Chineke bụrụ ọnụ nꞌime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nꞌobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe. Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nꞌegedege ihu ha. Abalị agaghị adịkwa nꞌebe ahụ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nꞌihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara m okwu sị m, “Okwu ndị a kwesịrị ka a tụkwasị ha obi. Ha bụkwa eziokwu. Onyenwe anyị Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya ịgwa gị ihe ndị ahụ ga-emezu nꞌoge na-adịghị anya. “Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzi na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nꞌakwụkwọ a!” Mụ onwe m bụ Jọn hụrụ ihe ndị a nile, nụkwa ha na ntị m. Mgbe m dara nꞌala ịkpọ isi ala nye mmụọ ozi a ziri m ozi ndị a, ọ gwara m okwu ọzọ sị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa onyeozi Jisọs dị ka gị onwe gị, na dị ka ụmụnna gị ndị amụma, na dị ka ndị ahụ nile na-edebe okwu nile e dere nꞌakwụkwọ a. Ọ bụ nanị Chineke ka ị ga-akpọ isi ala nye.” Mgbe ahụ ọ dọrọ m aka na ntị sị m, “Ekpuchila okwu amụma ndị a dị nꞌakwụkwọ a, nꞌihi na oge mmezu ha adịla nso. Ka ndị nile na-eme ajọ omume gaa nꞌihu na-eme ajọ omume ha, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nꞌihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nꞌihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nꞌihu bụrụ ndị dị nsọ.” “Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọ bụla dị ka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nꞌaka. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ, Onye buru ụzọ dịrị na onye na-adịgidekwa. Ngọzi na-adịrị ndị ahụ sara uwe ha mmiri, ka ha si otu a bụrụ ndị na-enweta òke na mkpụrụ si nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, ndị ga-enwe ike isite nꞌọnụ ụzọ baa nꞌobodo ahụ. Nꞌazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị nile na-agba aja, na ndị nile na-akwa iko, na ndị nile na-egbu mmadụ, na ndị nile na-ekpere arụsị, na ndị nile hụrụ ụgha nꞌanya ma na-emekwa ya. “Mụ onwe m bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gwa gị ihe ị ga-agwa nzukọ m nile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ ji Devidi ndụ, na onye si nꞌagbụrụ ya pụta. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ, nke na-enwụ ezi onwụnwụ.” Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọ bụla nụrụ ịkpọ oku ha kpọkuokwa ndị ọzọ sị ha, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa. Onye ọ bụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ nꞌefu, na-akwụghị ụgwọ ọ bụla. Ana m adọ onye ọ bụla nụrụ okwu amụma dị nꞌakwụkwọ a aka na ntị sị, Ọ bụrụ na onye ọ bụla atụkwasị ihe ọ bụla nꞌakwụkwọ a, Chineke ga-atụkwasịrị ya ihe otiti ahụ nile e kwuru okwu ha nꞌakwụkwọ a. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ewepụ okwu ọ bụla nꞌakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepu òke o nwere nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, na òke o nwere nꞌobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nꞌakwụkwọ a. Onye ahụ gbara ama ndị a nile na-asị, “Nꞌezie, ana m abịa ọsịịsọ.” Amin. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu nile. Amin.